MỤTA IHE N’AKA JIZỌS
“Unu Ga-anụ Mkpọtụ Agha”
“M malitere ọrụ nta akụkọ ihe dị ka afọ iri isii gara aga. Kemgbe ahụ, akọọla m akụkọ gbasara ihe karịrị agha iri anọ a lụrụ n’ebe dị iche iche n’ụwa. Ahụrụ m ka okwu Amerịka na Sọviet Yuniọn nọ na-ese nọ na-aka njọ, m hụkwara otú esemokwu ahụ si kwụsị n’otu ntabi anya. Ma, e nwebeghị afọ m chegburu onwe m ka afọ 2025. Otu ihe kpatara ya bụ na e nwere ọtụtụ agha ndị a nọ na-alụ n’ebe dị iche iche. Ihe ọzọ bụ na otu n’ime agha ndị ahụ nwere ike ịkpa ọtụtụ ebe n’ụwa aka ọjọọ otú na-emebeghị mbụ.”—John Simpson, onye nta akụkọ n’ụlọ ọrụ BBC, (ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ ná mkpụrụ akwụkwọ okpotokpo).
Ndị mmadụ na-echegbu onwe ha n’ihi agha a na-alụ n’ebe dị iche iche n’ụwa. Ọtụtụ ndị amaghị ma agha ọ̀ ga-emecha kwụsị. Gịnị ka Jizọs kwuru gbasara ihe a?
Ihe Jizọs kwuru
Jizọs buru amụma na ihe ndị na-eme taa ga-eme. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu ga-anụ mkpọtụ agha na akụkọ agha.”—Matiu 24:6.
Ọ bụ eziokwu na agha na tigbuo zọgbuo juru n’ụwa taa na-eme ka obi ghara iru anyị ala, e nwere ezigbo ihe mere anyị ga-eji nwee olileanya. Gịnị mere anyị ji kwuo ihe a? Ọ bụ n’ihi na Jizọs kwuru na ma agha ndị na-akpa ọtụtụ ndị aka ọjọọ ma ihe ndị ọzọ niile na-emenụ ma àgwà ndị mmadụ na-akpa so ‘n’ihe àmà’ na-egosi na anyị bi ‘n’ọgwụgwụ oge a.’ (Matiu 24:3; Luk 21:7) Ihe a pụtara na n’ọdịnihu, Jizọs ga-eme ka agha kwụsị kpamkpam. Olee otú ọ ga-esi eme ya?
Ihe Jizọs ga-eme
N’oge na-adịghị anya, Jizọs, bụ́ Eze Alaeze Chineke, ga-eme “ka agha kwụsị n’ebe niile n’ụwa.”—Abụ Ọma 46:9.
Gụọ isiokwu bụ́ “Otú Agha Ga-esi Akwụsị” ka ị matakwuo otú udo ga-esi adị n’ụwa n’ọdịnihu nakwa otú ndụ ga-adị n’oge ahụ.