Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mrt isiokwu 131
  • Ihe Ga-enyere Ndị Ìsì Aka

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Ga-enyere Ndị Ìsì Aka
  • Isiokwu Ndị Ọzọ
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Otú Jehova si ele ndị kpuru ìsì anya
  • Otú Ndịàmà Jehova si enyere ndị ìsì aka
  • Olee ihe ndị e ji amụ Baịbụl anyị na-emepụta?
  • Kụziere Ndị Ìsì Okwu Jehova
    Ozi Alaeze Anyi—2015
  • Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu nke Ọma n’Ozi Ọma—Izi Ndị Ìsì Ozi Ọma
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2020
  • Otú Ihe Ndị A Na-egere Egere Dị n’Ịntanet Ga-esi Baara Anyị Uru
    Ozi Alaeze Anyi—2015
  • Ị̀ Na-ege Baịbụl A Na-egere Egere?
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2023
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Isiokwu Ndị Ọzọ
mrt isiokwu 131
Ebe otu nwoke kpuru ìsì nọ ọdụ n’oche dị n’èzí na-egere ihe a na-egere egere dị na “JW Library.”

Ihe Ga-enyere Ndị Ìsì Aka

N’ụwa niile, e nwere ihe dị ka nde mmadụ iri anọ na nde atọ kpuru ìsì nakwa narị nde mmadụ abụọ na nde iri itoolu na ise na-anaghị ahụ ụzọ nke ọma.a Ọ dị mwute na ụfọdụ na-emeso ọtụtụ n’ime ndị a otú na-adịghị mma ma ọ bụdị na-emegbu ha.

Olee otú Jehova si ele ndị kpuru ìsì anya? Gịnị ka Baịbụl kwuru gbasara ha? Oleekwa otú Ndịàmà Jehova si enyere ha aka taa?

Otú Jehova si ele ndị kpuru ìsì anya

Baịbụl kwuru na ihe gbasara ndị ìsì na-emetụ Jehovab n’obi nke ukwuu. Jehova chọrọ ka a na-emeso ha otú dị mma nakwa ka ha na-erite uru n’ihe ndị ọ na-akụzi. Ọ chọkwara ka ha nwee olileanya na ihe ga-aka mma n’ọdịnihu.

Ihe Baịbụl kwuru: “Onye na-eme ka onye ìsì gahie ụzọ, a ga-abụ ya ọnụ.”​—Diuterọnọmi 27:18.

Ihe ọ pụtara: N’oge ochie, Iwu Chineke nyere ndị ya mere ka a ghara ịna-emegbu ndị kpuru ìsì.

Ihe Baịbụl kwuru: “Chineke anaghị ele mmadụ anya n’ihu.”​—Ọrụ Ndịozi 10:34.

Ihe ọ pụtara: Chineke ji ndị kpuru ìsì kpọrọ ihe otú ahụ o ji ndị na-ahụ ụzọ kpọrọ ihe.

Ihe Baịbụl kwuru: Jizọs mere “ka ọtụtụ ndị ìsì hụwa ụzọ.”​—Luk 7:21.

Ihe ọ pụtara: Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o mere ka ụfọdụ ndị ìsì hụwa ụzọ. Ihe a gosiri ihe Alaeze Chineke ga-eme n’ọdịnihu.

Ihe Baịbụl kwuru: “A ga-emeghe anya ndị ìsì.”​—Aịzaya 35:5.

Ihe ọ pụtara: Jehova kwere nkwa na n’oge na-adịghị anya, mgbe Alaeze Chineke ga-achịwa ụwa, ndị ìsì ga-ahụwa ụzọ.

Otú Ndịàmà Jehova si enyere ndị ìsì aka

N’ụwa niile, anyị bụ́ Ndịàmà Jehova na-ekwusara ndị kpuru ìsì ozi ọma Alaeze Chineke nke ga-eme ka ha nwee olileanya. Olee otú anyị si eme ya?

  • Anyị na-emepụta Baịbụl, akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl, na vidio dị iche iche otú ndị ìsì ga-enwe ike ịgụ ha ma ọ bụ gere ha. Anyị na-emepụta akwụkwọ ndị ahụ ná mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì, ná mkpụrụ akwụkwọ okpotokpo, nakwa ná ụdị a na-egere egere.

  • Anyị na-enwe ọmụmụ ihe anyị kwa izu. Onye ọ bụla nwekwara ike ịbịa ya ma ndị ìsì.

  • Anyị na-agwa onye ọ bụla na anyị nwere ike ịhazi ka e nwee onye ga na-abịa ka ya na ya na-amụ Baịbụl.c

Ị gaghị akwụ ụgwọ maka nke ọ bụla n’ihe ndị a. Maka gịnị? Ọ bụ maka na Jizọs nyere iwu, sị: “Unu natara n’efu, na-enyenụ n’efu.”​—Matiu 10:8.

Ihe gbasara ndị ìsì na-emetụ Ndịàmà Jehova n’obi n’eziokwu. Ndị chọrọ iso anyị na-efe Chineke ga-enweta ezigbo ndị enyi, ndị ga-enyekwara ha aka. Lee ihe ụfọdụ ndị ìsì bụ́ Ndịàmà Jehova kwuru.

Talita Alnashi, onye bi na Swidin, anaghị ahụ ụzọ nke ọma kemgbe a mụrụ ya. Chọpụta otú nne na nna ya si kụziere ya Baịbụl na otú ndị enyi ha si na-akwado ya na ndị ezinụlọ ya, na-egosikwa ha na ha hụrụ ha n’anya.

James Ryan, onye bi na Amerịka, na-echi ntị mgbe a mụrụ ya, mechaakwa kpuo ìsì. Chọpụta ihe mere ndụ ya ji nwee isi, obi ana-atọkwa ya ụtọ.

Cynthia Pablo.

Cynthia Pablo, onye bi na Filipinz, na-echi ntị, kpuokwa ìsì. Olee otú ndị ya na ha na-efekọ Jehova si nyere ya aka mgbe ihe siri ike n’oge ọrịa koronavaịrọs? Gụọ isiokwu bụ́ “Otú Ọgbakọ Si Nyere Nwanna Nwaanyị Bụ́ Onye Ìsì na Onye Ntị Chiri Aka n’Oge Ọrịa Koronavaịrọs” ka ị chọpụta otú ha si nyere ya aka.

Olee ihe ndị e ji amụ Baịbụl anyị na-emepụta?

Ebe otu onye ìsì ji notetaker na-egere ihe.

Akwụkwọ ndị e dere ná mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì. Anyị na-ebipụta Baịbụl, ma ndị nke bụ́ Akwụkwọ Nsọ Hibru na Grik ma ndị nke bụ́ naanị Akwụkwọ Nsọ Grik, ná mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì n’ụfọdụ asụsụ. (E depụtara asụsụ ndị ahụ n’igbe bụ́ “Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ ndị dị ná Mkpụrụ Akwụkwọ Ndị Ìsì.”) Anyị na-ebipụtakwa ọtụtụ akwụkwọ anyị ndị e ji amụ Baịbụl ná mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì. Anyị bipụtara akwụkwọ bụ́ Learn to Read Braille maka ndị chọrọ ịmụ otú e si agụ mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì. E mere ya otú onye na-ahụ ụzọ ga-eji ya kụziere onye ìsì otú ọ ga-esi na-agụ mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì.

  • Gwa Onyeàmà Jehova ka o nye gị akwụkwọ e dere ná mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì ma ọ bụ gị kwuo ka Onyeàmà Jehova bịa na nke gị.

  • Gaa na jw.org were ihe ndị e nwere ike itinye n’ihe a na-akpọ notetaker.d

Akwụkwọ ndị e dere ná mkpụrụ akwụkwọ okpotokpo nakwa otú e si eme ka ihe na-apụta n’ekwentị ma ọ bụ ihe yiri ya gbaa okpotokpo. Anyị na-ebipụta ọtụtụ akwụkwọ anyị ná mkpụrụ akwụkwọ okpotokpo maka ndị na-anaghị ahụ ụzọ nke ọma. E mere jw.org, bụ́ ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet, otú ọ ga na-egosi nke ọma, ọ bụrụgodị na e mee ka ihe dị na ya gbaa okpotokpo. A rụkwara JW Library otú a ga-emeli ka ihe na-egosi na ya gbaa okpotokpo.

  • Gwa Onyeàmà Jehova ka o nye gị akwụkwọ e dere ná mkpụrụ akwụkwọ okpotokpo ma ọ bụ gị kwuo ka Onyeàmà Jehova bịa na nke gị.

  • Gaa na jw.org were akwụkwọ ndị e dere ná mkpụrụ akwụkwọ okpotokpo ndị ha na ndị e biri ebi bụ otu.

Ihe ndị a na-egere egere. Anyị na-emepụta Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke a na-egere egere n’ihe karịrị narị asụsụ abụọ. Anyị na-emepụtakwa ọtụtụ akwụkwọ anyị e ji amụ Baịbụl ndị a na-egere egere. A na-akọwakarị ihe ndị e sere n’akwụkwọ ndị ahụ.

  • Gaa na jw.org ma ọ bụ JW Library gere ihe ndị a na-egere egere ma ọ bụ were ha.

  • Gaa na jw.org were ihe ndị e nwere ike itinye na kọmputa ndị e mere otú ha ga na-agụpụta ihe na-egosi n’ihu ya na ndị na-agụpụta ihe e dere n’akwụkwọ.e

Foto na-egosi onye na-ekwu okwu.

Vidio ndị a na-akọwa ihe ndị a na-egosi na ha. Ndịàmà Jehova na-emepụta vidio ndị e ji amụ Baịbụl ndị a na-akọwa ihe a na-egosi na ha n’ihe karịrị otu narị asụsụ. Vidio ndị a na-enyere ndị mmadụ aka ịghọta ndụmọdụ si na Baịbụl, na-enyekwara ha aka ime ya.

Ị ga-ahụ vidio ndị a kọwara ihe ndị a na-egosi na ha n’ụfọdụ vidio ndị dị n’okpuru isiokwu ndị a:

  • Ime Ihe Baịbụl Kwuru

  • Baịbụl

  • Mgbakọ Ukwu Na-achọ Udo nke Afọ 2022

Nnọkọ anyị dị iche iche. N’ụwa niile, anyị na-ezukọ n’ọgbakọ anyị dị iche iche ka anyị mụọ Baịbụl ma fee Chineke. Kwa afọ, anyị na-ahazikwa nnọkọ ndị bụrụ ibu ebe anyị na-aga amụ Baịbụl. Ná nnọkọ anyị ndị a na-egosi vidio, anyị na-agba mbọ eme ka ndị kwesịrị ige vidio ndị a na-akọwa ihe a na-egosi na ha gere ha. Ọ bụrụkwa na e nwere ndị ntị chiri bụkwa ndị ìsì, anyị na-ahazi ka e nwee ndị ga-ejide ha aka n’aka ma jiri asụsụ ndị ogbi na-asụgharịrị ha ihe a na-ekwu. Onye ọ bụla nwere ike ịbịa nnọkọ ndị a, anyị anaghịkwa akpa ókè.

  • Chọta ebe anyị na-anọ amụ ihe.

  • Mata gbasara mgbakọ ndị anyị na-enwe kwa afọ.

  • Gaa Ncheta Ọnwụ Jizọs. Ọ bụ ya bụ nnọkọ kacha mkpa anyị na-enwe kwa afọ.

José Luis Ayala bi na Meziko. Ọ na-echi ntị mgbe a mụrụ ya, ya emechaakwa kpuo ìsì mgbe ọ dị afọ iri abụọ na itoolu. Chọpụta uru ọmụmụ ihe anyị na-abara ya nakwa otú e si nyere ya aka ịna-akụzi Baịbụl nke ọma.

Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ ndị dị ná Mkpụrụ Akwụkwọ Ndị Ìsì

Na Mee 1, 2025, Baịbụl dị mfe ọgụgụ ndị dị ná mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì dị n’asụsụ ndị a.

Chichewa

Dọch

Bekee

French

Jọjin

Jaman

Grik

Họngerian

Ịtalian

Japaniiz

Korian

Pọtugiiz (Brazil)

Rọshịan

Spanish

Yukrenian

a Ndị a kpọrọ ndị “na-anaghị ahụ ụzọ nke ọma” bụ ndị nwere nsogbu anya a na-agaghị agwọtali, ya ana-egbochikwa ha ime ihe ụfọdụ. N’isiokwu a, ọ bụ ndị na-anaghị ahụ ụzọ chaachaa na ndị na-anaghị ahụ ụzọ nke ọma ka a kpọrọ “ndị ìsì” ma ọ bụ “ndị kpuru ìsì.”

b Jehova bụ aha Chineke. (Abụ Ọma 83:18) Gụọ isiokwu bụ́ “Ònye Bụ Jehova?”

c I nwere ike ikwu ka e gosi gị otú anyị na ndị mmadụ si amụ Baịbụl na-akwụghị ụgwọ.

d Notetaker bụ ihe yiri obere kọmputa na-enyere ndị ìsì aka ịgụ ihe. O nwere ike inwe mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì ma ọ bụ olu na-agụpụta ihe, ma ọ bụkwanụ nwechaa ha abụọ. A gụchaa otu ahịrịokwu e dere ná mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì, e nwere ebe a ga-apị aka, ahịrịokwu ọzọ e dekwara ná mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì anọchie ya. Ọ bụrụ na mmadụ nwere notetaker, ọ baghịzi uru ka o nwee akwụkwọ ndị e biri ebi e dere ná mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì.

e E nwere kọmputa ndị e mere otú ha ga na-agụpụta ihe na-egosi n’ihu ha nakwa ndị na-agụpụta ihe e dere n’akwụkwọ ma ọ bụ ihe e tinyere n’ígwè a ga-egere egere. Ngwá ọrụ nkà na ụzụ ndị a na-eme ka ọ dịrị onye ji ya na-agụ ihe mfe ịga n’ebe dị iche iche n’akwụkwọ ọ na-agụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya