MỤTA IHE N’AKA JIZỌS
Wepụtara Chineke Oge
Ndụ gị ga-akakwu mma ma i wepụta oge ị ga-eji na-amụ gbasara Chineke nakwa ka gị na ya bụrụ enyi. I mee otú ahụ, ọ pụtara na ị ma na ọ bụ Chineke kwesịrị ịna-eduzi gị. Chebara ihe Jizọs kwuru banyere ihe a echiche.
Ihe Jizọs kwuru
“Ndị ma na ọ bụ Chineke kwesịrị ịna-eduzi ha na-enwe obi ụtọ.”—Matiu 5:3.
Anyị niile chọrọ ịmata azịza ajụjụ ndị dị ka: Gịnị mere anyị ji dịrị ndụ? Gịnị mere ahụhụ ji ju ebe niile? Gịnị na eme mmadụ ma ọ nwụọ? Ịmata azịza ajụjụ ndị a ga-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ.
“Ọ bụghị naanị achịcha ga-eme ka mmadụ dị ndụ, kama ọ bụ okwu niile si n’ọnụ Jehovaa pụta.”—Matiu 4:4.
Otú ahụ nri nkịtị dị anyị mkpa ka nri nke si n’Okwu Chineke dịkwa anyị mkpa, ya bụ, ịmata azịza ajụjụ ndị na-echu anyị ura nakwa ịmata ihe ndị ga-eme ka anyị na Chineke dịrị ná mma. Jizọs mere ka o doo anya na anyị kwesịrị ịchọ enyemaka Chineke ka o nwee ike ịna-eduzi anyị.
“Okwu gị bụ eziokwu.”—Jọn 17:17.
Jizọs gosiri na ọ bụ Okwu Chineke bụ́ Baịbụl bụ ụzọ bụ́ isi Chineke si eduzi anyị.
Anyị na-agba gị ume ka i wepụta oge na-amụ gbasara Chineke, si otú ahụ gosi na ị chọrọ ka ọ na-eduzi gị. Ime ihe a ga-eme ka ị na-enwe ezigbo obi ụtọ. Lee ihe ụfọdụ ga-enyere gị aka:
Gụọ Baịbụl n’efu.
Kwuo ka mmadụ bịa ka gị na ya mụwa Baịbụl.
a Jehova bụ aha Chineke. (Abụ Ọma 83:18) Gụọ isiokwu bụ́ “Ònye Bụ Jehova?”