Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
Akwukwo Igbo (1984-2027)
Pụọ
Banye
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Nnọọ.
Ihe a bụ ọ́bá akwụkwọ e ji eme nchọnchọ. O nwere akwụkwọ dị iche iche Ndịàmà Jehova bipụtara n'ọtụtụ asụsụ.
Ị̀ chọọ iwere ihe, biko, gaa na jw.org.
  • Taa

Fraịdee, Ọktoba 16

Ekwela ka obi gị duba gị n’ụzọ nwaanyị ahụ. Akpafula banye n’ụzọ ya.​—Ilu 7:25.

Akụkọ Solomọn kọrọ na-egosi ihe nwere ike ime ohu Jehova ọ bụla. O nwere ike ime mmehie dị oké njọ ma chee na ihe niile mere “na mberede” ma ọ bụkwanụ ya asị na ọ nọkatara mee. Ma, ọ bụrụ na o chee echiche nke ọma gbasara ihe merenụ, o nwere ike ịchọpụta na e nwere ihe ụfọdụ na-adịghị mma o mere nke mere ka o mee mmehie. O nwere ike ịbụ na ụfọdụ n’ime ha bụ iso ndị ọjọọ na-akpa, iji ihe ndị na-adịghị mma na-atụrụ ndụ, ma ọ bụ ịna-aga n’ebe Onye Kraịst na-ekwesịghị ịga ma ọ bụ n’Ịntanet ma ọ bụ n’ihu na ihu. O nwekwara ike ịbụ na ọ kwụsịla ikpe ekpere, ịgụ Baịbụl, ịga ọmụmụ ihe, ma ọ bụ ozi ọma. Dị ka nwa okorobịa ahụ a kọrọ akụkọ ya n’Ilu, o nwere ike ịbụ na o meghị mmehie ahụ na mberede. Gịnị ka anyị na-amụta na ya? Ihe anyị kwesịrị ịgbara ọsọ abụghị naanị mmehie, kamakwa ihe ndị nwere ike ime ka anyị mee mmehie. Solomọn kọwara ihe a mgbe ọ kọchara akụkọ ahụ.​—Mat. 5:29, 30. w24.07 16 ¶10-11

Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2026

Satọdee, Ọktoba 17

N’agbanyeghị na anyị dị ka ite ájá, anyị nwere akụ̀.​—2 Kọr. 4:7.

Gịnị bụ akụ̀ a? Ọ bụ ọrụ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke na-azọ ndụ. (2 Kọr. 4:1) Gịnịkwanụ bụ ite ájá ahụ? Ọ na-anọchi anya ndị ohu Chineke ndị na-ezi ndị mmadụ ozi ọma. N’oge Pọl, ndị ahịa na-eji ite ájá ebu ihe ndị dị mkpa, dị ka nri, mmanya, na ego. Otú ahụ ka Jehova nyere anyị ọrụ dị mkpa, nke bụ́ izi ndị mmadụ ozi ọma. Ọ ga-eme ka anyị nweta ike anyị ga-eji na-ekwusa ya. Mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike ịtụ ụjọ na ndị mmadụ agaghị ege anyị ntị ma ọ bụ tụọ ụjọ mmadụ. Olee otú anyị ga-esi emeri nsogbu a? Ka anyị tụlee ekpere ndịozi Jizọs kpere mgbe e nyere ha iwu ka ha kwụsị ikwusa ozi ọma. Kama ịtụrụ ụjọ kwụsị ikwusa ozi ọma, ha rịọrọ Jehova ka o nyere ha aka ịna-ekwu okwu n’atụghị egwu. Jehova zara ekpere ha ozugbo. (Ọrụ 4:18, 29, 31) Ọ bụrụ na ụjọ mmadụ atụọ gị mgbe ụfọdụ, rịọ Jehova ka o nyere gị aka ka otú i si hụ ndị mmadụ n’anya mee ka ị kwụsị ịtụ ụjọ mmadụ. w24.04 16 ¶8-9

Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2026

Sọnde, Ọktoba 18

Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ.​—Mat. 6:9.

Otú anyị si hụ Jehova n’anya na-eme ka anyị na-edo aha ya nsọ. Anyị chọrọ iso mee ka a mata na ihe Ekwensu kwuru gbasara Jehova bụ ụgha chara acha. (Jen. 3:1-5; Job 2:4; Jọn 8:44) Anyị nọrọ n’ozi ọma, ọ na-agụsi anyị agụụ ike ịgwa ndị niile chọrọ ige anyị ntị eziokwu gbasara Jehova na ụdị onye ọ bụ. Anyị chọrọ ka onye ọ bụla mara na àgwà ọ kacha nwee bụ ịhụnanya, na ọ na-ekpe ikpe ziri ezi, nakwa na Alaeze ya ga-eme ka nsogbu niile kwụsị, weta udo, meekwa ka ụmụ mmadụ na-enwe obi ụtọ. (Ọma 37:10, 11, 29; 1 Jọn 4:8) Ọ bụrụ na anyị ana-agwa ndị mmadụ gbasara Jehova, anyị na-edo aha ya nsọ. Obi na-adịkwa anyị ụtọ n’ihi na anyị na-arụ ọrụ mere ka a kpọọ anyị Ndịàmà Jehova. w24.05 18 ¶12

Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2026
Nnọọ.
Ihe a bụ ọ́bá akwụkwọ e ji eme nchọnchọ. O nwere akwụkwọ dị iche iche Ndịàmà Jehova bipụtara n'ọtụtụ asụsụ.
Ị̀ chọọ iwere ihe, biko, gaa na jw.org.
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya