MỤTA IHE N’AKA JIZỌS
Udo Ga-adị n’Ụwa Niile
Onye ọ bụla chọrọ ibi n’ụwa ebe udo dị. Kemgbe ọtụtụ afọ, ndị ọchịchị ụwa na-agbasi mbọ ike ịkwụsị esemokwu ma mee ka udo dị. Oge ụfọdụ, mbọ ha gbara na-eme ka udo dịrị obere oge. Ma ọ dị mwute na obere oge gafee, ndị mmadụ ebidokwa ise okwu. Udo ọ̀ ga-adịli n’ụwa niile? Ee. Iji hụ otú ọ ga-esi eme, chegodị banyere ihe Jizọs ga-eme na ihe ọ kụziri.
Ihe Jizọs ga-eme
Baịbụl gwara anyị ihe Jizọs ga-eme n’oge na-adịghị anya ka udo dị n’ụwa niile.
“A ga-akpọ [Jizọs] . . . Onyeisi Udo. Ọchịchị ya ga-eru ebe niile. Udo agaghịkwa akwụsị ịdị.” (Aịzaya 9:6, 7) Ebe Jizọs bụ Eze Alaeze Chineke, ọ ga-eme ka udo dịrị n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi.
“Ọ ga-anapụta ogbenye nke na-ebe ákwá ka e nyere ya aka . . . na onye ọ bụla na-enweghị onye na-enyere ya aka.” (Abụ Ọma 72:12-14) Jizọs ga-eji ikike o nwere mee ka a na-ekpe ikpe ziri ezi. Ihe a ga-emezi ka agha, tigbuo zọgbuo, na ahụhụ kwụsị.
“Mba agaghị eweli mma agha lụso mba ọzọ agha. Ha agaghịkwa amụ otú e si alụ agha.” (Aịzaya 2:4) Mgbe Jizọs ga-achịwa ụwa, mmadụ niile ga-amụta otú e si eme udo kama ịmụ otú e si alụ agha.
Lee vidio bụ́ Gịnị Bụ Alaeze Chineke? ka ị mata otú Jizọs ga-esi eme ka udo dịrị n’ụwa n’ọdịnihu nakwa ihe ị ga-eme ka i nwee ike ibi na ya.
Ihe Jizọs kụziri
Ihe ndị Jizọs kụziri na-enyere ọtụtụ nde mmadụ aka ịna-ebi n’udo, ma ugbu a. Mgbe Jizọs na-akụzi ihe n’elu ugwu, ọ kụziri eziokwu doro anya ndị na-enyere ndị mmadụ aka ka ha na ibe ha na-adị n’udo. Ka anyị kwuo banyere ụfọdụ n’ime ha.
“Ndị na-eme udo na-enwe obi ụtọ.” (Matiu 5:9) Jizọs gbara ndị na-eso ụzọ ya ume ka ha na-agbara nsogbu ọsọ nakwa ka ha na-eme udo.
“Buru ụzọ gaa ka gị na nwanne gị kpezie, gaghachizie, nye onyinye gị.” (Matiu 5:23, 24) Jizọs gbara ndị ọ kụziiri ihe ume ka ha na-edozi esemokwu ngwa ngwa. Ọ kụziri na ọ bụrụ na anyị chọrọ ka anyị na Chineke dịrị n’ezigbo mma, anyị na ndị ọzọ ga-adịrịrị n’udo.
“Kwụsịnụ ikpe ikpe, ka a ghara ikpe unu ikpe.” (Matiu 7:1) Jizọs dọrọ anyị aka ná ntị ka anyị ghara iji obi ọjọọ na-ekpe ndị mmadụ ikpe ma ọ bụ na-atụ anya ka ha mee ihe anyị na-anaghị eme. Ime ụdị ihe a na-akpata esemokwu. Kama ịchọwa ebe ndị ọzọ na-anaghị emetacha, Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha ‘na-agbaghara’ ndị ọzọ ma ha mejọọ ihe.—Luk 6:37.
Ndị bi n’ebe dị iche iche n’ụwa na-eme ihe Jizọs kụziri. Ma n’ebe a na-eme tigbuo zọgbuo ma n’ebe a na-ese okwu, ha amụtala iji obiọma na-edozi esemokwu, na-agbaghara ndị mejọrọ ha, na-egosikwa ndị ọzọ na ha hụrụ ha n’anya, ma mgbe ndị ahụ na-emeso ha otú na-adịghị mma.
Gụọ isiokwu bụ́ “Otú Obi Ga-esi Na-eru Mmadụ Ala n’Agbanyeghị Agha” ka ị hụ otú ihe Jizọs kụziri sirila nyere ụfọdụ ndị aka ka obi ruo ha ala.