MỤTA IHE N’AKA JIZỌS
Tigbuo Zọgbuo Anaghị Eme Ka Ihe Ka Mma
Ọtụtụ ndị taa kweere na e nwee esemokwu ma ọ bụ nsogbu, na ọ bụ ime tigbuo zọgbuo ga-akwụsị ya. Ma, ihe a abụghị ihe Jizọs Kraịst kụziri, ọ bụghịkwa ihe o mere. Chegodị gbasara ụfọdụ ihe ndị o kwuru na ihe ndị o mere.
Ihe Jizọs kwuru
Mgbe Jizọs na-akụzi ihe n’elu ugwu, o kwuru na iwe iwe, isesa ndị ọzọ okwu na tigbuo zọgbuo abụghị ihe ndị ga-eme ka esemokwu kwụsị. Ka anyị lee ụfọdụ n’ime ihe ndị ọ kụziri.
“Unu kwesịrị ịna-emere ndị mmadụ ihe niile unu chọrọ ka ha na-emere unu.” (Matiu 7:12; Luk 6:31) Ndụmọdụa a na-agba anyị ume ka anyị na-emeso ndị ọzọ otú anyị chọrọ ka e si mesoo anyị. Ebe ọ bụ na anyị niile chọrọ ka e jiri obiọma na-emeso anyị ihe, anyị kwesịrị ịgbalị na-akwanyere ndị mmadụ ùgwù, na-egosikwa ha obiọma, ọ bụrụgodị na anyị na ha ekweghị n’otu ihe.
“Onye ọ bụla nke mara gị ụra na ntì aka nri, tụgharịkwaara ya nke ọzọ.” (Matiu 5:38, 39; Luk 6:29) Jizọs anaghị ekwu na anyị kwesịrị ịgwa ndị ọzọ ka ha mesie anyị ike. Kama, o kwuru ihe a iji gbanwee echiche na-adịghị mma ụfọdụ ndị ndú okpukpe nọ na-akụzi. Ha na-akụziri ndị mmadụ na ọ dịghị njọ mmadụ imegwara ihe e mere ya. Jizọs nọ na-agwa ndị na-eso ụzọ ya ka ha ghara imegwara ihe e mere ha, kama ka ha jiri nwayọọ na-emeso ndị kpasuru ha iwe ihe.b
“Unu akwụsịla ịhụ ndị iro unu n’anya.” (Matiu 5:43, 44; Luk 6:27) Jizọs kụziri na anyị kwesịrị ịna-egosi ndị kpọrọ anyị asị ma ọ bụ ndị na-anaghị emeso anyị otú dị mma obiọma. Ihe a o kwuru apụtaghị na anyị ga-anabata ihe na-adịghị mma ha na-eme.c Ma, ọ bụrụ na anyị na-egosi ndị kpọrọ anyị asị obiọma, anyị nwere ike ime ka iwe ha na-ewe kwụsị ma ọ bụdị ya emee ka hanwa gosiwekwa anyị obiọma.
Ihe Jizọs mere nakwa ihe ọ ga-eme
Jizọs kụziri na tigbuo zọgbuo agaghị emeli ka nsogbu kwụsị, o mekwara ihe gosiri na o kwetara ihe a o kwuru. N’abalị ahụ e jidere Jizọs, otu n’ime ndị na-eso ụzọ ya gburu otu n’ime ndị bịara ijide Jizọs mma iji chebe Jizọs, ma Jizọs sịrị ya: “Mịghachi mma agha gị n’ọbọ ya, n’ihi na ndị niile na-egbu ndị ọzọ mma agha ga-esi ná mma agha laa n’iyi.” (Matiu 26:52) Jizọs gosiri na ọ hụrụ ndị iro ya n’anya. Otú o si gosi ya bụ ịgbaghara ndị mejọrọ ya. O kpedịrị ekpere maka ya.—Luk 23:33, 34; 1 Pita 2:23.
Baịbụl kwere nkwa na Jizọs, bụ́ Onyeisi Udo, ga-eme ka tigbuo zọgbuo niile kwụsị n’oge na-adịghị anya. (Aịzaya 9:6, 7) Gụọ isiokwu bụ́ “Otú Agha Ga-esi Akwụsị” ka ị mụtakwuo otú ihe a ga-esi eme n’ọdịnihu.
a Gụọ isiokwu bụ́ “Olee Otú Jizọs Kwuru Ka Anyị Si Na-emeso Ndị Ọzọ?” ka ị matakwuo banyere ya.
b Gụọ isiokwu bụ́ “Gịnị Ka ‘Anya Laara Anya’ Pụtara?” ka ị matakwuo banyere ya.
c Gụọ isiokwu bụ́ “What Does It Mean to ‘Love Your Enemies’?” ka ị matakwuo banyere ya.