Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mrt isiokwu 134
  • Tigbuo Zọgbuo Anaghị Eme Ka Ihe Ka Mma

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Tigbuo Zọgbuo Anaghị Eme Ka Ihe Ka Mma
  • Isiokwu Ndị Ọzọ
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Jizọs kwuru
  • Ihe Jizọs mere nakwa ihe ọ ga-eme
  • Udo Ga-adị n’Ụwa Niile
    Isiokwu Ndị Ọzọ
  • Olee Otú Jizọs Kwuru Ka Anyị Si Na-emeso Ndị Ọzọ?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Na-emenụ Ihe Ọma
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Olee Otú Chineke Si Ele Ime Ihe Ike Anya?
    Teta!—2002
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Isiokwu Ndị Ọzọ
mrt isiokwu 134
Ebe Jizọs na-akụziri ụmụ nwoke, ụmụ nwaanyị na ụmụaka ihe.

MỤTA IHE N’AKA JIZỌS

Tigbuo Zọgbuo Anaghị Eme Ka Ihe Ka Mma

Ọtụtụ ndị taa kweere na e nwee esemokwu ma ọ bụ nsogbu, na ọ bụ ime tigbuo zọgbuo ga-akwụsị ya. Ma, ihe a abụghị ihe Jizọs Kraịst kụziri, ọ bụghịkwa ihe o mere. Chegodị gbasara ụfọdụ ihe ndị o kwuru na ihe ndị o mere.

Ihe Jizọs kwuru

Mgbe Jizọs na-akụzi ihe n’elu ugwu, o kwuru na iwe iwe, isesa ndị ọzọ okwu na tigbuo zọgbuo abụghị ihe ndị ga-eme ka esemokwu kwụsị. Ka anyị lee ụfọdụ n’ime ihe ndị ọ kụziri.

  • “Unu kwesịrị ịna-emere ndị mmadụ ihe niile unu chọrọ ka ha na-emere unu.” (Matiu 7:12; Luk 6:31) Ndụmọdụa a na-agba anyị ume ka anyị na-emeso ndị ọzọ otú anyị chọrọ ka e si mesoo anyị. Ebe ọ bụ na anyị niile chọrọ ka e jiri obiọma na-emeso anyị ihe, anyị kwesịrị ịgbalị na-akwanyere ndị mmadụ ùgwù, na-egosikwa ha obiọma, ọ bụrụgodị na anyị na ha ekweghị n’otu ihe.

  • “Onye ọ bụla nke mara gị ụra na ntì aka nri, tụgharịkwaara ya nke ọzọ.” (Matiu 5:38, 39; Luk 6:29) Jizọs anaghị ekwu na anyị kwesịrị ịgwa ndị ọzọ ka ha mesie anyị ike. Kama, o kwuru ihe a iji gbanwee echiche na-adịghị mma ụfọdụ ndị ndú okpukpe nọ na-akụzi. Ha na-akụziri ndị mmadụ na ọ dịghị njọ mmadụ imegwara ihe e mere ya. Jizọs nọ na-agwa ndị na-eso ụzọ ya ka ha ghara imegwara ihe e mere ha, kama ka ha jiri nwayọọ na-emeso ndị kpasuru ha iwe ihe.b

  • “Unu akwụsịla ịhụ ndị iro unu n’anya.” (Matiu 5:43, 44; Luk 6:27) Jizọs kụziri na anyị kwesịrị ịna-egosi ndị kpọrọ anyị asị ma ọ bụ ndị na-anaghị emeso anyị otú dị mma obiọma. Ihe a o kwuru apụtaghị na anyị ga-anabata ihe na-adịghị mma ha na-eme.c Ma, ọ bụrụ na anyị na-egosi ndị kpọrọ anyị asị obiọma, anyị nwere ike ime ka iwe ha na-ewe kwụsị ma ọ bụdị ya emee ka hanwa gosiwekwa anyị obiọma.

Ihe Jizọs mere nakwa ihe ọ ga-eme

Jizọs kụziri na tigbuo zọgbuo agaghị emeli ka nsogbu kwụsị, o mekwara ihe gosiri na o kwetara ihe a o kwuru. N’abalị ahụ e jidere Jizọs, otu n’ime ndị na-eso ụzọ ya gburu otu n’ime ndị bịara ijide Jizọs mma iji chebe Jizọs, ma Jizọs sịrị ya: “Mịghachi mma agha gị n’ọbọ ya, n’ihi na ndị niile na-egbu ndị ọzọ mma agha ga-esi ná mma agha laa n’iyi.” (Matiu 26:52) Jizọs gosiri na ọ hụrụ ndị iro ya n’anya. Otú o si gosi ya bụ ịgbaghara ndị mejọrọ ya. O kpedịrị ekpere maka ya.​—Luk 23:33, 34; 1 Pita 2:23.

Baịbụl kwere nkwa na Jizọs, bụ́ Onyeisi Udo, ga-eme ka tigbuo zọgbuo niile kwụsị n’oge na-adịghị anya. (Aịzaya 9:6, 7) Gụọ isiokwu bụ́ “Otú Agha Ga-esi Akwụsị” ka ị mụtakwuo otú ihe a ga-esi eme n’ọdịnihu.

a Gụọ isiokwu bụ́ “Olee Otú Jizọs Kwuru Ka Anyị Si Na-emeso Ndị Ọzọ?” ka ị matakwuo banyere ya.

b Gụọ isiokwu bụ́ “Gịnị Ka ‘Anya Laara Anya’ Pụtara?” ka ị matakwuo banyere ya.

c Gụọ isiokwu bụ́ “What Does It Mean to ‘Love Your Enemies’?” ka ị matakwuo banyere ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya