Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb23 Mee p. 13
  • Ị̀ Na-ege Baịbụl A Na-egere Egere?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Na-ege Baịbụl A Na-egere Egere?
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2023
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Otú Ihe Ndị A Na-egere Egere Dị n’Ịntanet Ga-esi Baara Anyị Uru
    Ozi Alaeze Anyi—2015
  • Ihe Ndị Ga-enyere Gị Aka Ịna-agụ Baịbụl Kwa Ụbọchị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Ihe Ga-enyere Ndị Ìsì Aka
    Isiokwu Ndị Ọzọ
  • Jiri Ihe Dị n’Ebe Anyị Na-edewe Ihe n’Ịntanet Nyere Ndị Na-asụ Asụsụ Ọzọ Aka
    Ozi Alaeze Anyi—2012
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2023
mwb23 Mee p. 13
Foto ndị na-egosi: Ndị na-egere Baịbụl a na-egere egere. 1. Ebe otu nwanna nwoke nọ n’èzí ji ihe a na-akwụnye ná ntị na-egere Baịbụl a na-egere egere n’ekwentị ya. 2. Ebe otu nwaanyị na obere nwa ya nwaanyị gwara ihe na-akpọpụta ụda ka ọ kpọwa Baịbụl a na-egere egere. Ha jikwa Baịbụl ha na-ele anya n’ebe a na-agụ. 3. Ebe otu nwanna nwaanyị ji ihe a na-akwụnye ná ntị na-egere Baịbụl a na-egere egere n’ekwentị ya mgbe ọ nọ n’ụgbọala ọhaneze.

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Ị̀ Na-ege Baịbụl A Na-egere Egere?

Gịnị bụ Baịbụl a na-egere egere? Baịbụl a na-egere egere bụ Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ a gụrụ agụ ma mepụta ya ka a na-egere ya egere. Anyị ji nwayọọ nwayọọ na-ewepụtakwu ya n’ọtụtụ asụsụ. Otu ihe magburu onwe ya na Baịbụl a a na-egere egere bụ na e ji olu dị iche iche gụọ okwu onye nke ọ bụla a kọrọ akụkọ ya na Baịbụl. E jikwa ụda olu kwesịrị ekwesị gụọ okwu ndị ahụ ka a ghara ịghọtahie ihe Baịbụl na-ekwu.

Olee uru Baịbụl a a na-egere egere na-abara ndị na-ege ya? Ọ na-atọ ọtụtụ ndị na-ege ya mgbe niile ezigbo ụtọ n’ihi na ọ na-eme ka akụkọ ndị dị n’Okwu Chineke dịkwuo ha ka ihe mere eme. Ha kwuru na otú ahụ e si jiri olu dị iche iche gụọ ihe onye nke ọ bụla a kọrọ akụkọ ya kwuru na-eme ka ọ dị ha ka hà nọ mgbe ihe ahụ a na-akọ na-eme, na-emekwa ka ha ghọtakwuo ihe e dere na Baịbụl nke ọma. (Ilu 4:5) Ọtụtụ ndị ekwuokwala na ige ya na-eme ka obi jụrụ ha ma ha chegbuwe onwe ha.​—Ọma 94:19.

Ịnụ ka a na-agụpụta Okwu Chineke nwere ike ịkpa ezigbo ike ná ndụ anyị. (2 Ihe 34:19-21) Ọ bụrụ na unu nwere Baịbụl a a na-egere egere nke zuru ezu ma ọ bụkwanụ nke na-ezughị ezu n’asụsụ unu, gbalịa mee ka ige ya soro n’ihe ndị ị na-eme mgbe niile ná ndụ gị.

LEENỤ VIDIO SI NA VIDIO BỤ́ OTÚ E SI AKWADEBE BAỊBỤL A NA-EGERE EGERE, ZAAKWANỤ AJỤJỤ A:

Gịnị masịrị gị banyere otú e si emepụta Baịbụl a na-egere egere?

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya