Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w26 Mee p. 14-19
  • Mee Ezigbo Mkpebi Gbasara Ịgụkwu Akwụkwọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mee Ezigbo Mkpebi Gbasara Ịgụkwu Akwụkwọ
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2026
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ì KWESỊRỊ ỊGỤKWU AKWỤKWỌ?
  • CHEE GBASARA IHE MERE I JI CHỌỌ ỊGỤKWU AKWỤKWỌ
  • CHEE GBASARA URU NA ỌGHỌM DỊ NA YA
  • Gị na Jehova Dịrị n’Ezigbo Mma Mgbe Ị Na-agụkwu Akwụkwọ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2026
  • Bible Ọ̀ Na-akatọ Agụmakwụkwọ?
    Teta!—1998
  • Agụmakwụkwọ—Jiri Ya Nye Jehova Otuto
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Agụmakwụkwọ nke Nwere Nzube
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2026
w26 Mee p. 14-19

JULAỊ 20 RUO 26, 2026

ABỤ NKE 133 Fee Jehova n’Oge Ị Na-eto Eto

Mee Ezigbo Mkpebi Gbasara Ịgụkwu Akwụkwọ

“Onye ma ihe na-echebara ihe ọ bụla ọ chọrọ ime echiche.”​—ILU 14:15.

IHE A GA-AMỤ

Ihe ndị Baịbụl kwuru na ihe ndị ọzọ ị ga-echebara echiche mgbe ị chọrọ ikpebi ma ị̀ ga-agụkwu akwụkwọ.

1-2. (a) Olee ihe ndị na-eto eto ga-ekpebi? (b) Gịnị ka “ịgụkwu akwụkwọ” pụtara? (Kwuokwa ihe e dere ná “Nkọwakwu.”)

“OLEE ụdị ọrụ ị ga-achọ ịrụ ma i too?” Ọ bụrụ na ị ka dị obere, o nwere ike ịbụ na a jụọla gị ajụjụ a ọtụtụ ugboro? Ihe kacha mma ị ga-eji ndụ gị eme bụ iji ya jeere Jehova ozi oge niile. Ma, i kwesịkwara ịna-arụ ọrụ ka ị na-enweta ego ị ga-eji na-egbo mkpa gị. (2 Tesa. 3:10) O doro anya na i cheela gbasara ọrụ ị ga-arụ n’ọdịnihu.

2 Ụfọdụ ndị na-eto eto ekpebiela na ha gachaa ụlọ akwụkwọ sekọndrị, ha ga-agụkwu akwụkwọ ka ha nwee ike inweta ọrụ. Ha na-ekpebikarị ya ma ha na ndị mụrụ ha kwurịta gbasara ya.a Ọ ga-abụ na i cheela ma ị̀ ga-agụkwu akwụkwọ. Ọ bụrụ otú ahụ, olee ụdị nke ị ga-agụ? Isiokwu a ga-eleba anya n’ihe Baịbụl kwuru ga-enyere gị aka iche echiche nke ọma mgbe ị na-ekpebi ma ị̀ ga-agụkwu akwụkwọ. I chee echiche nke ọma, ị ga-eme ezigbo mkpebi. Ọ bụ eziokwu na ndị a na-ekwu gbasara ha n’isiokwu a bụ ndị na-eto eto, ma ihe e kwuru na ya ga-enyere Onye Kraịst ọ bụla na-eche ma ọ̀ ga-agụkwu akwụkwọ aka. Ọ ga-enyekwara ndị nne na nna aka inyere ụmụ ha aka ime ezigbo mkpebi.

Ì KWESỊRỊ ỊGỤKWU AKWỤKWỌ?

3. Gịnị nwere ike ime ka ụfọdụ Ndị Kraịst chọọ ịgụkwu akwụkwọ?

3 N’ebe ụfọdụ, mmadụ nwere ike inweta ọrụ ọ ga-eji na-egbo mkpa ya ọ bụrụgodị na ọ gụkwughị akwụkwọ. N’ebe ụfọdụkwa, ịgụkwu akwụkwọ nwere ike inyere mmadụ aka inweta ọrụ ga-akwụ ya ezigbo ụgwọ ma ọ bụ nke ga na-enye ya ohere. O nwere ike inyere Onye Kraịst aka inwe oge ọ ga-eji na-ekwusa ozi ọma ma ọ bụkwanụ na-eme ihe ndị ọzọ a na-eme n’ofufe Jehova. Ma, ịgụkwu akwụkwọ na-ewe oge, ego, na ihe ndị ọzọ. E nwekwara mkpebi ndị ọzọ dị mkpa mmadụ kwesịrị ime.

4. Ònye ga-ekpebi ma Onye Kraịst ọ̀ ga-agụkwu akwụkwọ? (Kwuokwa ihe e dere n’ala ala peeji.)

4 Baịbụl kwuru na onye ọ bụla “ga-ebu ibu nke ya.” (Gal. 6:5) N’ihi ya, Onye Kraịst ọ bụla toro eto ga-eji aka ya kpebie ma ọ̀ ga-agụkwu akwụkwọ.b Ọ bụkwa ndị nne na nna ka ọ dị n’aka ikpebi ma nwa ha ka na-eto eto ọ̀ ga-agụkwu akwụkwọ. (Efe. 6:1) Ha ga-enyeliri nwa ha aka ime mkpebi dị mma gbasara ịgụkwu akwụkwọ ma o too.​—Ilu 22:6.

5. Olee mgbe mmadụ kwesịrị ibido chewe ma ọ̀ ga-agụkwu akwụkwọ? Maka gịnị? (Kọwaakwa foto.)

5 Ọtụtụ mgbe, ọ na-adị mkpa ka ndị na-eto eto kpebie ma hà ga-agụkwu akwụkwọ tupu ha agachaa ụlọ akwụkwọ sekọndrị. Ọ dịkwa mkpa ka onye na-eto eto na ndị mụrụ ya kparịta ya tupu ya emee mkpebi. Ọ ga-eme ka ha nwee oge ha ga-eji achọpụta ụdị nke ọ ga-agụ. Ha nwere ike inyere ya aka ịma ihe ndị ọ ga-agụ n’ụlọ akwụkwọ ka o nwee ike ịkwadebe ya maka ịgụkwu akwụkwọ ma ọ bụ ọrụ ọ ga-arụ n’ọdịnihu. Ọ̀ bụ iwu na ha ga-ekpebi ma nwa ha ọ̀ ga-agụkwu akwụkwọ tupu ya agachaa ụlọ akwụkwọ sekọndrị? Ọ bụghị iwu. (Ilu 21:5) Ụfọdụ ndị na-eto eto na-ekpebi ịgacha ụlọ akwụkwọ sekọndrị, chọta ọrụ, malitekwa ịsụ ụzọ tupu ha ekpebie ma hà ga-agụkwu akwụkwọ. Mmadụ nwekwara ike chewe ma ọ̀ ga-agụkwu akwụkwọ ọtụtụ afọ ọ gachara ụlọ akwụkwọ sekọndrị.

Ebe otu nwanna nwaanyị na-eto eto chọrọ ịgụkwu akwụkwọ na ndị mụrụ ya na-ekwu banyere ihe ndị o nwere ike ịmụ. Ha na-atụle ihe e kwuru n’akwụkwọ ụlọ akwụkwọ ụfọdụ bipụtara, vidio si n’Ihe Omume Tiivi Ndịàmà Jehova, nakwa Baịbụl.

Ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst na-enyere nwa ha aka ime ezigbo mkpebi gbasara ịgụkwu akwụkwọ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5)


6. Gịnị ga-enyere mmadụ aka ime ezigbo mkpebi gbasara ịgụkwu akwụkwọ?

6 Gịnị ga-enyere gị aka ime mkpebi dị mma gbasara ịgụkwu akwụkwọ? Rịọ Jehova ka o nyere gị aka ime mkpebi dị mma gbasara ya. (Jems 1:5) Chebakwara ihe abụọ a echiche. Nke mbụ, jụọ onwe gị ihe mere i ji chọọ ịgụkwu akwụkwọ. (Ọma 26:2) Nke abụọ, chee gbasara uru na ọghọm dị n’ụdị nke i bu n’obi. (Ilu 14:15) Ka anyị lebara ihe abụọ a anya otu otu.

CHEE GBASARA IHE MERE I JI CHỌỌ ỊGỤKWU AKWỤKWỌ

7. Gịnị ka Ndị Kraịst kwesịrị ichebara echiche mgbe ha chọrọ ikpebi ma hà ga-agụkwu akwụkwọ?

7 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịgụkwu akwụkwọ, ajụjụ dị mkpa ị ga-ajụ onwe gị bụ: ‘Gịnị mere m ji chọọ ịgụkwu akwụkwọ?’ Ọtụtụ ndị na-agụkwu akwụkwọ ka ha nweta ọrụ ga-atọ ha ụtọ ma ọ bụ nke ga-akwụpụta ụgwọ. Ihe ndị a hà dị njọ? Mba. (1 Tim. 5:8) Ma, Baịbụl dọrọ anyị aka ná ntị ka anyị ghara iwere ego ka ihe kacha mkpa ma ọ bụkwanụ chee na ego ga-echebe anyị. (Ilu 23:4, 5; 1 Tim. 6:8-10; 1 Jọn 2:17) Ọ bụrụ na ị chọrọ ịgụkwu akwụkwọ maka na ị chọrọ ịba ọgaranya ma ọ bụ ka a na-akwanyere gị ùgwù, ị gaghị enwe obi ụtọ. O nwekwara ike ime ka gị na Jehova ghara ịdị ná mma.

8-9. (a) Olee otú Ndị Kraịst kwesịrị isi were agụmakwụkwọ? (Matiu 6:33) (b) Gịnị ka ị mụtara n’akụkọ ụmụnna nwaanyị aha ha bụ Josefina, Morine, na Iris?

8 Oleezi otú i kwesịrị isi were agụmakwụkwọ? E nweghị ihe kwesịrị ịdị anyị mkpa karịa ife Jehova. (Mat. 22:37, 38; Fil. 3:8) N’ihi ya, i kwesịrị iwere agụmakwụkwọ ka ihe ga-enyere gị aka ịna-egbo mkpa gị ka i nwee ike iji obi gị niile na-efe Jehova.​—Gụọ Matiu 6:33.

9 Legodị ihe nyeere ụfọdụ Ndị Kraịst aka ile agụmakwụkwọ anya otú Jehova si ele ya. Nwanna Nwaanyị Josefina si Chili sịrị: “M gụkwuru akwụkwọ ka m nwee ike inweta ọrụ ga-enye m ohere iji oge buru ibu na-ejere Jehova ozi. Akwụkwọ m gụrụ abụghị ihe kacha m mkpa ná ndụ. Ihe kacha m mkpa bụ adịm ná mma mụ na Jehova.” Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Morine ji otu afọ mụọ ime isi n’ebe a na-akụzi ime isi. Maka gịnị? Ọ sịrị: “M chọrọ ịkwaga ebe a chọkwuru ndị nkwusa. N’ihi ya, m chọtara ihe m ga-amụ ga-enyere m aka ime ya. Mgbe m mụchara ya, m malitere ime ndị mmadụ isi ka m nweta ego m ga-eji kwaga ebe a chọkwuru ndị nkwusa. Mgbe m kwagakwara ebe a chọkwuru ndị nkwusa, ihe m mụrụ nyeere m aka ịchọta ọrụ ebe ahụ.” Nwanna nwaanyị ọzọ aha ya bụ Iris ji oge butụrụ ibu gụọ akwụkwọ ka ọ bụrụ dọkịta ezé. Ọ sịrị: “Ịgụkwu akwụkwọ nwere ike ịba uru. Ma, ọ gaghị eme ka i nwee ezigbo obi ụtọ. Ị chọọ inwe ezigbo obi ụtọ, i kwesịrị icheta na ọ bụrụ na i were ofufe Jehova ka ihe kacha mkpa, Jehova ga-eme ka i nwee ezigbo obi ụtọ, nyekwa gị ihe niile dị gị mkpa.” N’eziokwu, ọ bụrụ na ihe kacha anyị mkpa ná ndụ abụrụ adịm ná mma anyị na Jehova, anyị ga-eme mkpebi ga-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi.

CHEE GBASARA URU NA ỌGHỌM DỊ NA YA

10. Olee otú ihe e dere na Diuterọnọmi 32:29 nwere ike isi nyere gị aka ikpebi ma ị̀ ga-agụkwu akwụkwọ?

10 O nwere ike ịbụ na e nwere ụdị ọrụ i bu n’obi ịrụ mere i ji chọọ ịgụkwu akwụkwọ. Mana, o nwere ike ịdị mkpa ka i chee gbasara ọrụ ndị ọzọ, ma ọ bụ nke yiri ya ma ọ bụkwanụ ọzọ dị iche. (I nwere ike ịtụle Ilu 18:17.) Taa, e nwere ụdị agụmakwụkwọ na-adịghị n’oge gara aga, dị ka isi n’Ịntanet agụ akwụkwọ. Cheekwa ma ì nwere ike ịna-egboro onwe gị mkpa gị n’agụkwughị akwụkwọ. Dị ka ihe atụ, otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Johanna si Finland agụkwughị akwụkwọ. Ọ sịrị: “Mgbe m gachara ụlọ akwụkwọ sekọndrị, m malitere ịrụ ọrụ m ga na-eji ụbọchị ụfọdụ n’izu na-arụ, na-asụkwa ụzọ. Arụọla m ọtụtụ ọrụ, hụkwa otú Jehova si si n’ọtụtụ ụzọ mezuo nkwa o kwere igboro anyị mkpa anyị.” Chetakwa na mkpebi ọ bụla i mere gbasara ịgụkwu akwụkwọ nwere uru na ọghọm. N’ihi ya, jụọ onwe gị, sị: ‘Uru ya ọ̀ karịrị ọghọm ya?’ (Gụọ Diuterọnọmi 32:29; 1 Kọr. 10:23) Ka anyị leba anya n’ụfọdụ ihe ga-enyere gị aka ịza ajụjụ ahụ.

11. Gịnị mere i ji kwesị iche banyere oge ihe ị chọrọ ịgụ ga-ewe gị n’izu? (Kọwaakwa foto.)

11 Oge ọ ga-ewe gị kwa izu. Chee gbasara awa ole ọ ga-ewe gị kwa izu iji na-aga ya, na-emekwa ihe omume ụlọ akwụkwọ e nyere gị mee n’ụlọ. Ị̀ ka ga-enwe oge na-eme ihe ndị i kwesịrị ime n’ofufe Jehova, na-arụkwa ọrụ dịịrị gị n’ezinụlọ? (Fil. 1:10) Ịgụkwu akwụkwọ ọ̀ ga-eme ka ezigbo ike na-agwụ gị nke na ị gaghịzi na-enwe ike ị ga-eji na-akwadebe ọmụmụ ihe ma ọ bụ na-amụ ihe n’onwe gị? Ọ bụ ihe mere otu nwanna aha ya bụ Jeroz si India. Ọ sịrị: “O siiri m ike ịna-agachi ozi ọma anya nakwa ịna-ege ntị nke ọma n’ọmụmụ ihe. O nwedịrị oge ndị m na-agaghị ọmụmụ ihe. M chọpụtala na ihe ahụ m mere bụ ịla oge m na ike m n’iyi.” Mana, e nwere ihe ụfọdụ mmadụ ga-agụ ma ọ bụ ọrụ ụfọdụ mmadụ ga-amụ na-agaghị eri ya nnukwu oge. Dị ka ihe atụ, e nwere ndị nke a na-eji obere oge n’ụbọchị ma ọ bụkwanụ n’izu agụ, nweekwa ndị nke a na-anaghị enyekarị mmadụ ihe ọ ga-eme n’ụlọ. E nwere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Rabeca si Mozambik. Obi dị ya ụtọ maka ihe ọ họọrọ ịgụ. Ọ sịrị: “Ọ na-ewe m naanị awa abụọ n’ụbọchị. O mere ka m ghara ịkwụsị ịsụ ụzọ oge niile.”

Foto ndị na-egosi: Ebe otu nwanna na-eche ma ịgụkwu akwụkwọ ọ̀ ga-enye ya ohere ịrụ ihe niile ọzọ o kwesịrị ịna-arụ. 1. Ebe ọ na-enye ụmụnna maịkrofon n’ọmụmụ ihe. 2. Ebe ọ na-ekwusa ozi ọma ụlọ n’ụlọ. 3. Ebe ọ na-arụ ọrụ n’ebe a na-ere kọfị. 4. Ebe ọ na-amụ ihe n’ụlọ akwụkwọ.

Ọ bụrụ na ị na-eche ma ị̀ ga-agụkwu akwụkwọ, jide n’aka na ị ga-enwe oge ị ga-eji eme ihe ndị kacha mkpa (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11)


12. Olee ajụjụ ndị ị ga-ajụ onwe gị mgbe ị chọrọ ikpebi ma ị̀ ga-agụkwu akwụkwọ ka i nwee ike iji oge gị eme ihe kacha mkpa? (Ekliziastis 12:1)

12 Oge ọ ga-ewe gị ịgụcha. Chee gbasara ọnwa ole ma ọ bụ afọ ole ọ ga-ewe gị iji gụchaa. Ịgụkwu akwụkwọ ọ̀ ga-abụ iji oge gị eme ihe kacha mma? (Efe. 5:15-17) Ọ bụrụ na ị ka na-eto eto, ọ̀ ga-enye gị ohere ịna-eme ike gị niile n’ozi Jehova n’oge ị ka bụ okoro ma ọ bụ agbọghọ, dị ka ịsụ ụzọ oge niile? (Gụọ Ekliziastis 12:1.) È nwere ndị nke ị ga-eji obere oge gụọ? Dị ka ihe atụ, n’ụfọdụ ụlọ akwụkwọ ma ọ bụkwanụ n’ebe ụfọdụ a na-akụzi aka ọrụ, i nwere ike ịmụta aka ọrụ ngwa ngwa, ọ gaghịkwa eri gị nnukwu ego ka mahadum. Otu nwanna aha ya bụ Mario si Chili sịrị: “M kpebiri iji afọ abụọ mụọ aka ọrụ. O rirughị m ego ịga mahadum gaara eri m. M gara ya naanị ụbọchị anọ n’izu, ya enyekwa m ohere ịna-asụ ụzọ.”

13. Olee otú ebe mmadụ bi na-agụkwu akwụkwọ nwere ike isi kpaa ya aka?

13 Ebe ọ dị. I nwere ike ịhụ ebe ị ga-agụkwu akwụkwọ n’ebe dị nso n’ụlọ gị. Mana, ọ bụrụkwanụ na ọ bụ n’obodo ọzọ ma ọ bụ na ọ ga-adị mkpa ka i biri n’ụlọ akwụkwọ ahụ? Cheta na ịhapụ ndị ezinụlọ gị nwere ike ịkpa adịm ná mma gị na Jehova aka ọjọọ, karịchaa ma gị na onye na-anaghị efe Jehova biri n’ụlọ. (Ilu 22:3; 1 Kọr. 15:33) Otu nwanna aha ya bụ Matias si Mozambik gara gụkwuo akwụkwọ naanị otu afọ, o weghịkwa ya nnukwu ego. Ma, ọ na-akwara ya mmakwaara. N’ihi gịnị? Ọ sịrị: “N’oge ahụ niile, m bi n’ụlọ akwụkwọ. Kwa ụbọchị, ọnwụnwa na-abịara m ime ihe na-adịghị mma. M ga-agwa onye ọ bụla chọrọ ịgụkwu akwụkwọ ka ọ họrọ nke na-agaghị eme ka ọ hapụ ezinụlọ ya.” Otu nwanna nwaanyị si Rọshịa sịrị: “Mgbe m na-agụ akwụkwọ, m bi n’ụlọ anyị, ọ bụghị n’ụlọ akwụkwọ. O mere ka m zere ọnwụnwa ndị nwere ike ịbịara m.” I nwedịrị ike ịchọta ndị nke ị ga-esi n’Ịntanet gụọ.

14. Olee otú ihe e kwuru na Luk 14:28 ga-esi enyere gị aka mgbe ị na-ekpebi ma ị̀ ga-agụkwu akwụkwọ?

14 Ego ole ọ ga-efu. E nwere ụfọdụ ihe ị ga-agụ, ọ gaghị efu nnukwu ego ma ọ bụkwanụ ya abụrụ gọọmenti ga-akwụ ụgwọ ya. Ọ́ dị otú ahụ, i nwere ike ịmụta ihe ndị ga-enyere gị aka inweta ọrụ n’akwụghị nnukwu ego. Ma ọtụtụ mgbe, ịgụkwu akwụkwọ na-efu nnukwu ego. E nwekwara ike inwe ihe ndị ọzọ ị ga-akwụ ụgwọ ha, dị ka ịkwụ mmadụ ụgwọ ka ọ kụzikwuoro gị ihe ga-enyere gị aka ịba n’ụlọ akwụkwọ ahụ. E nwere ihe ụfọdụ mmadụ ga-agụ, ya ejide ụgwọ ga-ewe ya ọtụtụ afọ ịkwụ. Otu nwanna aha ya bụ Adilson si Mozambik kwara mmakwaara maka ihe o kpebiri ime. Ọ sịrị: “N’ime afọ anọ ahụ m gụrụ akwụkwọ, ndị ezinụlọ m hapụrụ iri nri mgbe ụfọdụ nakwa ihe ndị ọzọ dị ha mkpa ka ha nwee ike ịkwụrụ m ụgwọ akwụkwọ.” Ka ị na-eche gbasara ụdị akwụkwọ ị ga-agụkwu ma ọ bụ ụdị ọrụ ị ga-amụ, jụọ onwe gị, sị: ‘Ego ole ka ọ ga-efu m? Mụ na ndị ezinụlọ m ànyị ga-akwụli ya? È nwere nke na-agaghị efu nnukwu ego?’ (Gụọ Luk 14:28.) ‘Ọ bụrụ na ọ ga-eme ka m koro ụgwọ, afọ ole ka ọ ga-ewe m iji kwụchaa ya? Ọrụ m ga-enweta ma m gụchaa ọ̀ ga-enyeli m ego m ga-eji kwụchaa ụgwọ ahụ?’​—Ilu 22:7.

15. Gịnị mere i ji kwesị iche ụdị ọrụ ị ga-enweta tupu gị ekpebie ihe ị ga-agụ na ọrụ ị ga-amụ?

15 Inweta ọrụ ọ̀ na-adị mfe? Chee gbasara ụdị ọrụ ị ga-enweta n’ebe i bi ma ọ bụkwanụ n’ebe ị ga-achọ ibi. Ihe ị chọrọ ịgụ ma ọ bụ ịmụ ọ̀ ga-enyere gị aka ịchọta ọrụ? Ụfọdụ ihe a na-agụ n’ụlọ akwụkwọ anaghị enyere mmadụ aka ịmụta ọrụ, kama ihe a na-eji ekpoju mmadụ isi bụ ihe ndị na-agaghị enyere ya aka ịmụta ọrụ. (Kọl. 2:8) Otu nwanna nwaanyị si India sịrị: “Ihe m gụrụ enyereghị m aka ịmụta ọrụ m chọrọ ịrụwa. Ihe a mere ka m ghara iji ihe m gụrụ nweta ọrụ.” Mgbe ụfọdụ, mmadụ nwekwara ike mụta ọrụ, mana ya abụrụ na inweta ọrụ ahụ na-esi ezigbo ike. Otu nwanna aha ya bụ Sublime si Sentral Afrịkan Ripọblik mụrụ otú e si arụzi ntụoyi. Ma, ọ sịrị: “N’ebe m bi, ọtụtụ ndị na-eji aka ha arụzi ihe ndị mebiri emebi. N’ihi ya, ọ na-esi ike inweta ọrụ.”

16. Gịnị mere o ji dị mma iche gbasara ụdị ọrụ ị ga-achọ ịrụ ma ị gụchaa akwụkwọ?

16 Cheekwa gbasara ụdị ọrụ i nwere ike inweta. Ọ̀ ga na-eme gị obi ụtọ? (Ekli. 3:12, 13) Olee ụdị ebe ị ga-anọ na-arụ ọrụ ahụ? Oleekwa ụdị ndị gị na ha ga na-arụkọ? Ọrụ ahụ ò nwere ike ịta isi mmadụ, ma ọ bụ ndị gị na ha ga na-arụkọ hà ga na-amarịta aka onye ga-aka ibe ya, ma ọ bụkwanụ ọ̀ ga-eme ka ike na-agwụkarị gị? Ego ole ka a na-akwụkarị ndị na-arụ ụdị ọrụ ahụ? Ọ̀ ga-ezuru gị ilekọta onwe gị? Ị̀ ga na-agụkwu akwụkwọ ka i nwee ike ịna-arụ ọrụ ahụ? Ajụjụ kacha mkpa bụ, ọ̀ ga-enye gị ohere ibu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke? (Ekli. 12:13) Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụrụ na ọrụ dị ụkọ, ọ gaghị adịrị anyị mfe inweta ụdị ọrụ anyị chọrọ. Mana, ihe i kpebiri gbasara ụdị akwụkwọ ị ga-agụ nwere ike inyere gị aka inweta ọrụ n’ọdịnihu. E nwere otu nwanna nwaanyị si India aha ya bụ Tabitha. O ji ọnwa isii mụọ ịkwa ákwà. Ọ sịrị: “M ma na ịkwa ákwà ga-enyere m aka ịsụ ụzọ. O nweghị mgbe ndị mmadụ ga-akwụsị iyi ákwà. M nwere ike ikpebi ụbọchị ole m ga na-arụ ọrụ n’izu. Ọ naghịkwa efu nnukwu ego ịmalite.” Ọrụ ahụ Nwanna Nwaanyị Tabitha mụrụ nyeere ya aka inweta ọrụ o ji egbo mkpa ya, na-asụkwa ụzọ.

17. (a) Olee otú Onye Kraịst nwere ike isi chọta ihe ndị ga-enyere ya aka ime mkpebi dị mma gbasara agụmakwụkwọ? (b) Olee amaokwu Baịbụl ndị ga-enyere gị aka ime mkpebi dị mma? (Kwuo ihe dị n’igbe isiokwu ya bụ “Ihe Baịbụl Kwuru Ị Ga-echebara Echiche.”)

17 Anyị ekwuola ihe ụfọdụ i kwesịrị ichebara echiche tupu gị ekpebie ma ị̀ ga-agụkwu akwụkwọ. Olee otú i nwere ike isi mata ihe dị gị mkpa tupu gị emee mkpebi dị mma? Mee nchọnchọ gbasara ihe ahụ ị chọrọ ịgụ ma ọ bụ ịmụ. I nwere ike ịga n’ụlọ akwụkwọ ahụ ma ọ bụ gị achọọ ya n’ebe ha na-edebe ihe n’Ịntanet. Chọpụta ma ndị gụrụ ihe ahụ ị chọrọ ịgụ hà na-enwetakarị ọrụ. Gị na ndị gụrụ ihe ahụ ị chọrọ ịgụ ma ọ bụ ndị na-arụ ụdị ọrụ ahụ ị chọrọ ịmụ nwere ike ikwurịta gbasara ya. (Ilu 13:10) Jụọ ha, sị: “Olee uru na ọghọm dị n’ihe m chọrọ ịmụ ma ọ bụkwanụ ịgụ?” Gị na ndị ji obi ụtọ na-efe Jehova kwurịtakwa ya. (Ilu 15:22) Olee ụdị agụmakwụkwọ ma ọ bụ ọrụ ha ga-atụrụ gị aro ya? Ha nwedịrị ike ịgwa gị gbasara ụdị ọrụ ị na-echetụbeghị n’echiche.

Ihe Baịbụl Kwuru Ị Ga-echebara Echiche

  • Gịnị mere m ji chọọ ịgụkwu akwụkwọ? (Mat. 6:33; 1 Tim. 6:8-10)

  • Kwa izu, awa ole ka m ga-eji aga akwụkwọ ma na-eme ihe omume ụlọ akwụkwọ ndị e nyere m ime n’ụlọ? (Fil. 1:10)

  • Afọ ole ka ọ ga-ewe m ịgụcha? (Efe. 5:15-17)

  • Olee ebe m ga-ebi? (1 Kọr. 15:33)

  • Ego ole ka ọ ga-efu m ịgụkwu akwụkwọ? (Luk 14:28)

  • M gụchaa, m̀ ga-enweta ọrụ m ga-eji na-akpa afọ m, na-emekwa ihe ndị m kwesịrị ime n’ofufe Jehova? (Ekli. 12:13)

18. Gịnị ka anyị kwesịrị icheta?

18 Anyị amụtala na ịgụkwu akwụkwọ nwere uru na ọghọm. N’ihi ya, kpee ekpere mgbe ị na-echebara ụdị nke ị ga-agụ echiche. Cheta na ịgụkwu akwụkwọ nwere ike ime ka mmadụ nweta ọrụ ga-enye ya ego ga-ezuru ya igbo mkpa ya. Ma, naanị ihe ga-eme ka mmadụ na-enwe ezigbo obi ụtọ bụ ya na Jehova ịdị n’ezigbo mma. (Ọma 16:9, 11) Jehova ga na-elekọta ndị ya mgbe niile n’agbanyeghị ebe ha gụruru akwụkwọ. (Hib. 13:5) Ọ bụrụkwanụ na i kpebiela ịgụkwu akwụkwọ? Gịnị ga-enyere gị aka ka gị na Jehova dịrị ná mma n’oge ị na-agụkwu akwụkwọ? A ga-ekwu gbasara ya n’isiokwu na-eso nke a.

GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

  • Dị ka e kwuru ná Ndị Galeshia 6:5, ònye ka ọ dị n’aka ikpebi ma mmadụ ọ̀ ga-agụkwu akwụkwọ ma ọ bụ na ọ gaghị agụkwu?

  • Olee otú Ndị Kraịst si ele ịgụkwu akwụkwọ anya?

  • Gịnị na gịnị ka Onye Kraịst kwesịrị ichebara echiche ma o kpebiwe ma ọ̀ ga-agụkwu akwụkwọ?

ABỤ NKE 45 Ihe M Na-atụgharị n’Uche

a NKỌWAKWU: N’isiokwu a nakwa na nke na-eso ya, “ịgụkwu akwụkwọ” bụ ụdị agụmakwụkwọ ọ bụla mmadụ gụrụ ma ọ bụ ọzụzụ ọ bụla mmadụ nwetara mgbe ọ gachara ụlọ akwụkwọ sekọndrị. Ihe ndị so na ya bụ ịga mahadum ma ọ bụkwanụ ịga ụlọ akwụkwọ a na-akụzi aka ọrụ.

b N’oge gara aga, akwụkwọ anyị anaghị agba Ndị Kraịst ume ịgụkwu ụdị akwụkwọ ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, isiokwu bụ́ “Ndị Nne na Nna​—Olee Ihe Unu Chọrọ Ka Ụmụ Unu Bụrụ n’Ọdịnihu?” gbara n’Ụlọ Nche October 1, 2005, kwuru nsogbu ndị dị ná mmadụ ịga mahadum. Ọ bụ eziokwu na nsogbu ndị ahụ ka dịkwa taa, ma ọ bụ mmadụ ga-eji aka ya kpebie ma ọ̀ ga-agụkwu akwụkwọ. Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị ikpe ekpere ma chebara ihe Baịbụl kwuru na ihe ndị ọzọ o kwesịrị ịmata echiche nke ọma tupu ya ekpebie ma ọ̀ ga-agụkwu akwụkwọ. Onyeisi ezinụlọ ọ bụla ga-ekpebi ma nwa ya na-erubeghị afọ iri na asatọ ọ̀ ga-agụkwu akwụkwọ. E nweghị Onye Kraịst ọ bụla, ma ndị okenye, kwesịrị ikpe Onye Kraịst ibe ya ikpe maka ihe o kpebiri n’okwu a.​—Jems 4:12.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya