JULAỊ 20 RUO 26, 2026
ABỤ NKE 133 Fee Jehova n’Oge Ị Na-eto Eto
Mee Ezigbo Mkpebi Gbasara Ịgụkwu Akwụkwọ
“Onye ma ihe na-echebara ihe ọ bụla ọ chọrọ ime echiche.”—ILU 14:15.
IHE A GA-AMỤ
Ihe ndị Baịbụl kwuru na ihe ndị ọzọ ị ga-echebara echiche mgbe ị chọrọ ikpebi ma ị̀ ga-agụkwu akwụkwọ.
1-2. (a) Olee ihe ndị na-eto eto ga-ekpebi? (b) Gịnị ka “ịgụkwu akwụkwọ” pụtara? (Kwuokwa ihe e dere ná “Nkọwakwu.”)
“OLEE ụdị ọrụ ị ga-achọ ịrụ ma i too?” Ọ bụrụ na ị ka dị obere, o nwere ike ịbụ na a jụọla gị ajụjụ a ọtụtụ ugboro? Ihe kacha mma ị ga-eji ndụ gị eme bụ iji ya jeere Jehova ozi oge niile. Ma, i kwesịkwara ịna-arụ ọrụ ka ị na-enweta ego ị ga-eji na-egbo mkpa gị. (2 Tesa. 3:10) O doro anya na i cheela gbasara ọrụ ị ga-arụ n’ọdịnihu.
2 Ụfọdụ ndị na-eto eto ekpebiela na ha gachaa ụlọ akwụkwọ sekọndrị, ha ga-agụkwu akwụkwọ ka ha nwee ike inweta ọrụ. Ha na-ekpebikarị ya ma ha na ndị mụrụ ha kwurịta gbasara ya.a Ọ ga-abụ na i cheela ma ị̀ ga-agụkwu akwụkwọ. Ọ bụrụ otú ahụ, olee ụdị nke ị ga-agụ? Isiokwu a ga-eleba anya n’ihe Baịbụl kwuru ga-enyere gị aka iche echiche nke ọma mgbe ị na-ekpebi ma ị̀ ga-agụkwu akwụkwọ. I chee echiche nke ọma, ị ga-eme ezigbo mkpebi. Ọ bụ eziokwu na ndị a na-ekwu gbasara ha n’isiokwu a bụ ndị na-eto eto, ma ihe e kwuru na ya ga-enyere Onye Kraịst ọ bụla na-eche ma ọ̀ ga-agụkwu akwụkwọ aka. Ọ ga-enyekwara ndị nne na nna aka inyere ụmụ ha aka ime ezigbo mkpebi.
Ì KWESỊRỊ ỊGỤKWU AKWỤKWỌ?
3. Gịnị nwere ike ime ka ụfọdụ Ndị Kraịst chọọ ịgụkwu akwụkwọ?
3 N’ebe ụfọdụ, mmadụ nwere ike inweta ọrụ ọ ga-eji na-egbo mkpa ya ọ bụrụgodị na ọ gụkwughị akwụkwọ. N’ebe ụfọdụkwa, ịgụkwu akwụkwọ nwere ike inyere mmadụ aka inweta ọrụ ga-akwụ ya ezigbo ụgwọ ma ọ bụ nke ga na-enye ya ohere. O nwere ike inyere Onye Kraịst aka inwe oge ọ ga-eji na-ekwusa ozi ọma ma ọ bụkwanụ na-eme ihe ndị ọzọ a na-eme n’ofufe Jehova. Ma, ịgụkwu akwụkwọ na-ewe oge, ego, na ihe ndị ọzọ. E nwekwara mkpebi ndị ọzọ dị mkpa mmadụ kwesịrị ime.
4. Ònye ga-ekpebi ma Onye Kraịst ọ̀ ga-agụkwu akwụkwọ? (Kwuokwa ihe e dere n’ala ala peeji.)
4 Baịbụl kwuru na onye ọ bụla “ga-ebu ibu nke ya.” (Gal. 6:5) N’ihi ya, Onye Kraịst ọ bụla toro eto ga-eji aka ya kpebie ma ọ̀ ga-agụkwu akwụkwọ.b Ọ bụkwa ndị nne na nna ka ọ dị n’aka ikpebi ma nwa ha ka na-eto eto ọ̀ ga-agụkwu akwụkwọ. (Efe. 6:1) Ha ga-enyeliri nwa ha aka ime mkpebi dị mma gbasara ịgụkwu akwụkwọ ma o too.—Ilu 22:6.
5. Olee mgbe mmadụ kwesịrị ibido chewe ma ọ̀ ga-agụkwu akwụkwọ? Maka gịnị? (Kọwaakwa foto.)
5 Ọtụtụ mgbe, ọ na-adị mkpa ka ndị na-eto eto kpebie ma hà ga-agụkwu akwụkwọ tupu ha agachaa ụlọ akwụkwọ sekọndrị. Ọ dịkwa mkpa ka onye na-eto eto na ndị mụrụ ya kparịta ya tupu ya emee mkpebi. Ọ ga-eme ka ha nwee oge ha ga-eji achọpụta ụdị nke ọ ga-agụ. Ha nwere ike inyere ya aka ịma ihe ndị ọ ga-agụ n’ụlọ akwụkwọ ka o nwee ike ịkwadebe ya maka ịgụkwu akwụkwọ ma ọ bụ ọrụ ọ ga-arụ n’ọdịnihu. Ọ̀ bụ iwu na ha ga-ekpebi ma nwa ha ọ̀ ga-agụkwu akwụkwọ tupu ya agachaa ụlọ akwụkwọ sekọndrị? Ọ bụghị iwu. (Ilu 21:5) Ụfọdụ ndị na-eto eto na-ekpebi ịgacha ụlọ akwụkwọ sekọndrị, chọta ọrụ, malitekwa ịsụ ụzọ tupu ha ekpebie ma hà ga-agụkwu akwụkwọ. Mmadụ nwekwara ike chewe ma ọ̀ ga-agụkwu akwụkwọ ọtụtụ afọ ọ gachara ụlọ akwụkwọ sekọndrị.
Ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst na-enyere nwa ha aka ime ezigbo mkpebi gbasara ịgụkwu akwụkwọ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5)
6. Gịnị ga-enyere mmadụ aka ime ezigbo mkpebi gbasara ịgụkwu akwụkwọ?
6 Gịnị ga-enyere gị aka ime mkpebi dị mma gbasara ịgụkwu akwụkwọ? Rịọ Jehova ka o nyere gị aka ime mkpebi dị mma gbasara ya. (Jems 1:5) Chebakwara ihe abụọ a echiche. Nke mbụ, jụọ onwe gị ihe mere i ji chọọ ịgụkwu akwụkwọ. (Ọma 26:2) Nke abụọ, chee gbasara uru na ọghọm dị n’ụdị nke i bu n’obi. (Ilu 14:15) Ka anyị lebara ihe abụọ a anya otu otu.
CHEE GBASARA IHE MERE I JI CHỌỌ ỊGỤKWU AKWỤKWỌ
7. Gịnị ka Ndị Kraịst kwesịrị ichebara echiche mgbe ha chọrọ ikpebi ma hà ga-agụkwu akwụkwọ?
7 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịgụkwu akwụkwọ, ajụjụ dị mkpa ị ga-ajụ onwe gị bụ: ‘Gịnị mere m ji chọọ ịgụkwu akwụkwọ?’ Ọtụtụ ndị na-agụkwu akwụkwọ ka ha nweta ọrụ ga-atọ ha ụtọ ma ọ bụ nke ga-akwụpụta ụgwọ. Ihe ndị a hà dị njọ? Mba. (1 Tim. 5:8) Ma, Baịbụl dọrọ anyị aka ná ntị ka anyị ghara iwere ego ka ihe kacha mkpa ma ọ bụkwanụ chee na ego ga-echebe anyị. (Ilu 23:4, 5; 1 Tim. 6:8-10; 1 Jọn 2:17) Ọ bụrụ na ị chọrọ ịgụkwu akwụkwọ maka na ị chọrọ ịba ọgaranya ma ọ bụ ka a na-akwanyere gị ùgwù, ị gaghị enwe obi ụtọ. O nwekwara ike ime ka gị na Jehova ghara ịdị ná mma.
8-9. (a) Olee otú Ndị Kraịst kwesịrị isi were agụmakwụkwọ? (Matiu 6:33) (b) Gịnị ka ị mụtara n’akụkọ ụmụnna nwaanyị aha ha bụ Josefina, Morine, na Iris?
8 Oleezi otú i kwesịrị isi were agụmakwụkwọ? E nweghị ihe kwesịrị ịdị anyị mkpa karịa ife Jehova. (Mat. 22:37, 38; Fil. 3:8) N’ihi ya, i kwesịrị iwere agụmakwụkwọ ka ihe ga-enyere gị aka ịna-egbo mkpa gị ka i nwee ike iji obi gị niile na-efe Jehova.—Gụọ Matiu 6:33.
9 Legodị ihe nyeere ụfọdụ Ndị Kraịst aka ile agụmakwụkwọ anya otú Jehova si ele ya. Nwanna Nwaanyị Josefina si Chili sịrị: “M gụkwuru akwụkwọ ka m nwee ike inweta ọrụ ga-enye m ohere iji oge buru ibu na-ejere Jehova ozi. Akwụkwọ m gụrụ abụghị ihe kacha m mkpa ná ndụ. Ihe kacha m mkpa bụ adịm ná mma mụ na Jehova.” Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Morine ji otu afọ mụọ ime isi n’ebe a na-akụzi ime isi. Maka gịnị? Ọ sịrị: “M chọrọ ịkwaga ebe a chọkwuru ndị nkwusa. N’ihi ya, m chọtara ihe m ga-amụ ga-enyere m aka ime ya. Mgbe m mụchara ya, m malitere ime ndị mmadụ isi ka m nweta ego m ga-eji kwaga ebe a chọkwuru ndị nkwusa. Mgbe m kwagakwara ebe a chọkwuru ndị nkwusa, ihe m mụrụ nyeere m aka ịchọta ọrụ ebe ahụ.” Nwanna nwaanyị ọzọ aha ya bụ Iris ji oge butụrụ ibu gụọ akwụkwọ ka ọ bụrụ dọkịta ezé. Ọ sịrị: “Ịgụkwu akwụkwọ nwere ike ịba uru. Ma, ọ gaghị eme ka i nwee ezigbo obi ụtọ. Ị chọọ inwe ezigbo obi ụtọ, i kwesịrị icheta na ọ bụrụ na i were ofufe Jehova ka ihe kacha mkpa, Jehova ga-eme ka i nwee ezigbo obi ụtọ, nyekwa gị ihe niile dị gị mkpa.” N’eziokwu, ọ bụrụ na ihe kacha anyị mkpa ná ndụ abụrụ adịm ná mma anyị na Jehova, anyị ga-eme mkpebi ga-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi.
CHEE GBASARA URU NA ỌGHỌM DỊ NA YA
10. Olee otú ihe e dere na Diuterọnọmi 32:29 nwere ike isi nyere gị aka ikpebi ma ị̀ ga-agụkwu akwụkwọ?
10 O nwere ike ịbụ na e nwere ụdị ọrụ i bu n’obi ịrụ mere i ji chọọ ịgụkwu akwụkwọ. Mana, o nwere ike ịdị mkpa ka i chee gbasara ọrụ ndị ọzọ, ma ọ bụ nke yiri ya ma ọ bụkwanụ ọzọ dị iche. (I nwere ike ịtụle Ilu 18:17.) Taa, e nwere ụdị agụmakwụkwọ na-adịghị n’oge gara aga, dị ka isi n’Ịntanet agụ akwụkwọ. Cheekwa ma ì nwere ike ịna-egboro onwe gị mkpa gị n’agụkwughị akwụkwọ. Dị ka ihe atụ, otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Johanna si Finland agụkwughị akwụkwọ. Ọ sịrị: “Mgbe m gachara ụlọ akwụkwọ sekọndrị, m malitere ịrụ ọrụ m ga na-eji ụbọchị ụfọdụ n’izu na-arụ, na-asụkwa ụzọ. Arụọla m ọtụtụ ọrụ, hụkwa otú Jehova si si n’ọtụtụ ụzọ mezuo nkwa o kwere igboro anyị mkpa anyị.” Chetakwa na mkpebi ọ bụla i mere gbasara ịgụkwu akwụkwọ nwere uru na ọghọm. N’ihi ya, jụọ onwe gị, sị: ‘Uru ya ọ̀ karịrị ọghọm ya?’ (Gụọ Diuterọnọmi 32:29; 1 Kọr. 10:23) Ka anyị leba anya n’ụfọdụ ihe ga-enyere gị aka ịza ajụjụ ahụ.
11. Gịnị mere i ji kwesị iche banyere oge ihe ị chọrọ ịgụ ga-ewe gị n’izu? (Kọwaakwa foto.)
11 Oge ọ ga-ewe gị kwa izu. Chee gbasara awa ole ọ ga-ewe gị kwa izu iji na-aga ya, na-emekwa ihe omume ụlọ akwụkwọ e nyere gị mee n’ụlọ. Ị̀ ka ga-enwe oge na-eme ihe ndị i kwesịrị ime n’ofufe Jehova, na-arụkwa ọrụ dịịrị gị n’ezinụlọ? (Fil. 1:10) Ịgụkwu akwụkwọ ọ̀ ga-eme ka ezigbo ike na-agwụ gị nke na ị gaghịzi na-enwe ike ị ga-eji na-akwadebe ọmụmụ ihe ma ọ bụ na-amụ ihe n’onwe gị? Ọ bụ ihe mere otu nwanna aha ya bụ Jeroz si India. Ọ sịrị: “O siiri m ike ịna-agachi ozi ọma anya nakwa ịna-ege ntị nke ọma n’ọmụmụ ihe. O nwedịrị oge ndị m na-agaghị ọmụmụ ihe. M chọpụtala na ihe ahụ m mere bụ ịla oge m na ike m n’iyi.” Mana, e nwere ihe ụfọdụ mmadụ ga-agụ ma ọ bụ ọrụ ụfọdụ mmadụ ga-amụ na-agaghị eri ya nnukwu oge. Dị ka ihe atụ, e nwere ndị nke a na-eji obere oge n’ụbọchị ma ọ bụkwanụ n’izu agụ, nweekwa ndị nke a na-anaghị enyekarị mmadụ ihe ọ ga-eme n’ụlọ. E nwere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Rabeca si Mozambik. Obi dị ya ụtọ maka ihe ọ họọrọ ịgụ. Ọ sịrị: “Ọ na-ewe m naanị awa abụọ n’ụbọchị. O mere ka m ghara ịkwụsị ịsụ ụzọ oge niile.”
Ọ bụrụ na ị na-eche ma ị̀ ga-agụkwu akwụkwọ, jide n’aka na ị ga-enwe oge ị ga-eji eme ihe ndị kacha mkpa (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11)
12. Olee ajụjụ ndị ị ga-ajụ onwe gị mgbe ị chọrọ ikpebi ma ị̀ ga-agụkwu akwụkwọ ka i nwee ike iji oge gị eme ihe kacha mkpa? (Ekliziastis 12:1)
12 Oge ọ ga-ewe gị ịgụcha. Chee gbasara ọnwa ole ma ọ bụ afọ ole ọ ga-ewe gị iji gụchaa. Ịgụkwu akwụkwọ ọ̀ ga-abụ iji oge gị eme ihe kacha mma? (Efe. 5:15-17) Ọ bụrụ na ị ka na-eto eto, ọ̀ ga-enye gị ohere ịna-eme ike gị niile n’ozi Jehova n’oge ị ka bụ okoro ma ọ bụ agbọghọ, dị ka ịsụ ụzọ oge niile? (Gụọ Ekliziastis 12:1.) È nwere ndị nke ị ga-eji obere oge gụọ? Dị ka ihe atụ, n’ụfọdụ ụlọ akwụkwọ ma ọ bụkwanụ n’ebe ụfọdụ a na-akụzi aka ọrụ, i nwere ike ịmụta aka ọrụ ngwa ngwa, ọ gaghịkwa eri gị nnukwu ego ka mahadum. Otu nwanna aha ya bụ Mario si Chili sịrị: “M kpebiri iji afọ abụọ mụọ aka ọrụ. O rirughị m ego ịga mahadum gaara eri m. M gara ya naanị ụbọchị anọ n’izu, ya enyekwa m ohere ịna-asụ ụzọ.”
13. Olee otú ebe mmadụ bi na-agụkwu akwụkwọ nwere ike isi kpaa ya aka?
13 Ebe ọ dị. I nwere ike ịhụ ebe ị ga-agụkwu akwụkwọ n’ebe dị nso n’ụlọ gị. Mana, ọ bụrụkwanụ na ọ bụ n’obodo ọzọ ma ọ bụ na ọ ga-adị mkpa ka i biri n’ụlọ akwụkwọ ahụ? Cheta na ịhapụ ndị ezinụlọ gị nwere ike ịkpa adịm ná mma gị na Jehova aka ọjọọ, karịchaa ma gị na onye na-anaghị efe Jehova biri n’ụlọ. (Ilu 22:3; 1 Kọr. 15:33) Otu nwanna aha ya bụ Matias si Mozambik gara gụkwuo akwụkwọ naanị otu afọ, o weghịkwa ya nnukwu ego. Ma, ọ na-akwara ya mmakwaara. N’ihi gịnị? Ọ sịrị: “N’oge ahụ niile, m bi n’ụlọ akwụkwọ. Kwa ụbọchị, ọnwụnwa na-abịara m ime ihe na-adịghị mma. M ga-agwa onye ọ bụla chọrọ ịgụkwu akwụkwọ ka ọ họrọ nke na-agaghị eme ka ọ hapụ ezinụlọ ya.” Otu nwanna nwaanyị si Rọshịa sịrị: “Mgbe m na-agụ akwụkwọ, m bi n’ụlọ anyị, ọ bụghị n’ụlọ akwụkwọ. O mere ka m zere ọnwụnwa ndị nwere ike ịbịara m.” I nwedịrị ike ịchọta ndị nke ị ga-esi n’Ịntanet gụọ.
14. Olee otú ihe e kwuru na Luk 14:28 ga-esi enyere gị aka mgbe ị na-ekpebi ma ị̀ ga-agụkwu akwụkwọ?
14 Ego ole ọ ga-efu. E nwere ụfọdụ ihe ị ga-agụ, ọ gaghị efu nnukwu ego ma ọ bụkwanụ ya abụrụ gọọmenti ga-akwụ ụgwọ ya. Ọ́ dị otú ahụ, i nwere ike ịmụta ihe ndị ga-enyere gị aka inweta ọrụ n’akwụghị nnukwu ego. Ma ọtụtụ mgbe, ịgụkwu akwụkwọ na-efu nnukwu ego. E nwekwara ike inwe ihe ndị ọzọ ị ga-akwụ ụgwọ ha, dị ka ịkwụ mmadụ ụgwọ ka ọ kụzikwuoro gị ihe ga-enyere gị aka ịba n’ụlọ akwụkwọ ahụ. E nwere ihe ụfọdụ mmadụ ga-agụ, ya ejide ụgwọ ga-ewe ya ọtụtụ afọ ịkwụ. Otu nwanna aha ya bụ Adilson si Mozambik kwara mmakwaara maka ihe o kpebiri ime. Ọ sịrị: “N’ime afọ anọ ahụ m gụrụ akwụkwọ, ndị ezinụlọ m hapụrụ iri nri mgbe ụfọdụ nakwa ihe ndị ọzọ dị ha mkpa ka ha nwee ike ịkwụrụ m ụgwọ akwụkwọ.” Ka ị na-eche gbasara ụdị akwụkwọ ị ga-agụkwu ma ọ bụ ụdị ọrụ ị ga-amụ, jụọ onwe gị, sị: ‘Ego ole ka ọ ga-efu m? Mụ na ndị ezinụlọ m ànyị ga-akwụli ya? È nwere nke na-agaghị efu nnukwu ego?’ (Gụọ Luk 14:28.) ‘Ọ bụrụ na ọ ga-eme ka m koro ụgwọ, afọ ole ka ọ ga-ewe m iji kwụchaa ya? Ọrụ m ga-enweta ma m gụchaa ọ̀ ga-enyeli m ego m ga-eji kwụchaa ụgwọ ahụ?’—Ilu 22:7.
15. Gịnị mere i ji kwesị iche ụdị ọrụ ị ga-enweta tupu gị ekpebie ihe ị ga-agụ na ọrụ ị ga-amụ?
15 Inweta ọrụ ọ̀ na-adị mfe? Chee gbasara ụdị ọrụ ị ga-enweta n’ebe i bi ma ọ bụkwanụ n’ebe ị ga-achọ ibi. Ihe ị chọrọ ịgụ ma ọ bụ ịmụ ọ̀ ga-enyere gị aka ịchọta ọrụ? Ụfọdụ ihe a na-agụ n’ụlọ akwụkwọ anaghị enyere mmadụ aka ịmụta ọrụ, kama ihe a na-eji ekpoju mmadụ isi bụ ihe ndị na-agaghị enyere ya aka ịmụta ọrụ. (Kọl. 2:8) Otu nwanna nwaanyị si India sịrị: “Ihe m gụrụ enyereghị m aka ịmụta ọrụ m chọrọ ịrụwa. Ihe a mere ka m ghara iji ihe m gụrụ nweta ọrụ.” Mgbe ụfọdụ, mmadụ nwekwara ike mụta ọrụ, mana ya abụrụ na inweta ọrụ ahụ na-esi ezigbo ike. Otu nwanna aha ya bụ Sublime si Sentral Afrịkan Ripọblik mụrụ otú e si arụzi ntụoyi. Ma, ọ sịrị: “N’ebe m bi, ọtụtụ ndị na-eji aka ha arụzi ihe ndị mebiri emebi. N’ihi ya, ọ na-esi ike inweta ọrụ.”
16. Gịnị mere o ji dị mma iche gbasara ụdị ọrụ ị ga-achọ ịrụ ma ị gụchaa akwụkwọ?
16 Cheekwa gbasara ụdị ọrụ i nwere ike inweta. Ọ̀ ga na-eme gị obi ụtọ? (Ekli. 3:12, 13) Olee ụdị ebe ị ga-anọ na-arụ ọrụ ahụ? Oleekwa ụdị ndị gị na ha ga na-arụkọ? Ọrụ ahụ ò nwere ike ịta isi mmadụ, ma ọ bụ ndị gị na ha ga na-arụkọ hà ga na-amarịta aka onye ga-aka ibe ya, ma ọ bụkwanụ ọ̀ ga-eme ka ike na-agwụkarị gị? Ego ole ka a na-akwụkarị ndị na-arụ ụdị ọrụ ahụ? Ọ̀ ga-ezuru gị ilekọta onwe gị? Ị̀ ga na-agụkwu akwụkwọ ka i nwee ike ịna-arụ ọrụ ahụ? Ajụjụ kacha mkpa bụ, ọ̀ ga-enye gị ohere ibu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke? (Ekli. 12:13) Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụrụ na ọrụ dị ụkọ, ọ gaghị adịrị anyị mfe inweta ụdị ọrụ anyị chọrọ. Mana, ihe i kpebiri gbasara ụdị akwụkwọ ị ga-agụ nwere ike inyere gị aka inweta ọrụ n’ọdịnihu. E nwere otu nwanna nwaanyị si India aha ya bụ Tabitha. O ji ọnwa isii mụọ ịkwa ákwà. Ọ sịrị: “M ma na ịkwa ákwà ga-enyere m aka ịsụ ụzọ. O nweghị mgbe ndị mmadụ ga-akwụsị iyi ákwà. M nwere ike ikpebi ụbọchị ole m ga na-arụ ọrụ n’izu. Ọ naghịkwa efu nnukwu ego ịmalite.” Ọrụ ahụ Nwanna Nwaanyị Tabitha mụrụ nyeere ya aka inweta ọrụ o ji egbo mkpa ya, na-asụkwa ụzọ.
17. (a) Olee otú Onye Kraịst nwere ike isi chọta ihe ndị ga-enyere ya aka ime mkpebi dị mma gbasara agụmakwụkwọ? (b) Olee amaokwu Baịbụl ndị ga-enyere gị aka ime mkpebi dị mma? (Kwuo ihe dị n’igbe isiokwu ya bụ “Ihe Baịbụl Kwuru Ị Ga-echebara Echiche.”)
17 Anyị ekwuola ihe ụfọdụ i kwesịrị ichebara echiche tupu gị ekpebie ma ị̀ ga-agụkwu akwụkwọ. Olee otú i nwere ike isi mata ihe dị gị mkpa tupu gị emee mkpebi dị mma? Mee nchọnchọ gbasara ihe ahụ ị chọrọ ịgụ ma ọ bụ ịmụ. I nwere ike ịga n’ụlọ akwụkwọ ahụ ma ọ bụ gị achọọ ya n’ebe ha na-edebe ihe n’Ịntanet. Chọpụta ma ndị gụrụ ihe ahụ ị chọrọ ịgụ hà na-enwetakarị ọrụ. Gị na ndị gụrụ ihe ahụ ị chọrọ ịgụ ma ọ bụ ndị na-arụ ụdị ọrụ ahụ ị chọrọ ịmụ nwere ike ikwurịta gbasara ya. (Ilu 13:10) Jụọ ha, sị: “Olee uru na ọghọm dị n’ihe m chọrọ ịmụ ma ọ bụkwanụ ịgụ?” Gị na ndị ji obi ụtọ na-efe Jehova kwurịtakwa ya. (Ilu 15:22) Olee ụdị agụmakwụkwọ ma ọ bụ ọrụ ha ga-atụrụ gị aro ya? Ha nwedịrị ike ịgwa gị gbasara ụdị ọrụ ị na-echetụbeghị n’echiche.
18. Gịnị ka anyị kwesịrị icheta?
18 Anyị amụtala na ịgụkwu akwụkwọ nwere uru na ọghọm. N’ihi ya, kpee ekpere mgbe ị na-echebara ụdị nke ị ga-agụ echiche. Cheta na ịgụkwu akwụkwọ nwere ike ime ka mmadụ nweta ọrụ ga-enye ya ego ga-ezuru ya igbo mkpa ya. Ma, naanị ihe ga-eme ka mmadụ na-enwe ezigbo obi ụtọ bụ ya na Jehova ịdị n’ezigbo mma. (Ọma 16:9, 11) Jehova ga na-elekọta ndị ya mgbe niile n’agbanyeghị ebe ha gụruru akwụkwọ. (Hib. 13:5) Ọ bụrụkwanụ na i kpebiela ịgụkwu akwụkwọ? Gịnị ga-enyere gị aka ka gị na Jehova dịrị ná mma n’oge ị na-agụkwu akwụkwọ? A ga-ekwu gbasara ya n’isiokwu na-eso nke a.
ABỤ NKE 45 Ihe M Na-atụgharị n’Uche
a NKỌWAKWU: N’isiokwu a nakwa na nke na-eso ya, “ịgụkwu akwụkwọ” bụ ụdị agụmakwụkwọ ọ bụla mmadụ gụrụ ma ọ bụ ọzụzụ ọ bụla mmadụ nwetara mgbe ọ gachara ụlọ akwụkwọ sekọndrị. Ihe ndị so na ya bụ ịga mahadum ma ọ bụkwanụ ịga ụlọ akwụkwọ a na-akụzi aka ọrụ.
b N’oge gara aga, akwụkwọ anyị anaghị agba Ndị Kraịst ume ịgụkwu ụdị akwụkwọ ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, isiokwu bụ́ “Ndị Nne na Nna—Olee Ihe Unu Chọrọ Ka Ụmụ Unu Bụrụ n’Ọdịnihu?” gbara n’Ụlọ Nche October 1, 2005, kwuru nsogbu ndị dị ná mmadụ ịga mahadum. Ọ bụ eziokwu na nsogbu ndị ahụ ka dịkwa taa, ma ọ bụ mmadụ ga-eji aka ya kpebie ma ọ̀ ga-agụkwu akwụkwọ. Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị ikpe ekpere ma chebara ihe Baịbụl kwuru na ihe ndị ọzọ o kwesịrị ịmata echiche nke ọma tupu ya ekpebie ma ọ̀ ga-agụkwu akwụkwọ. Onyeisi ezinụlọ ọ bụla ga-ekpebi ma nwa ya na-erubeghị afọ iri na asatọ ọ̀ ga-agụkwu akwụkwọ. E nweghị Onye Kraịst ọ bụla, ma ndị okenye, kwesịrị ikpe Onye Kraịst ibe ya ikpe maka ihe o kpebiri n’okwu a.—Jems 4:12.