JULAỊ 13 RUO 19, 2026
ABỤ NKE 127 Ụdị Mmadụ M Kwesịrị Ịbụ
Jiri Ihe Baịbụl Kwuru Zụọ Akọnuche Gị
“Onye ọ bụla ga-ebu ibu nke ya.”—GAL. 6:5.
IHE A GA-AMỤ
Anyị ga-amụ otú ihe ndị e kwuru na Baịbụl ga-esi enyere anyị aka ịzụ akọnuche anyị ka ọ na-eduzi anyị nke ọma.
1-2. (a) Olee onyinye Jehova nyere Adam na Iv? (b) Olee otú ha gaara esi egosi na obi dị ha ụtọ maka onyinye ahụ?
ỤMỤ anụmanụ anaghị eche echiche tupu ha emee ihe. Ọtụtụ ígwè ọrụ na-arụkwa ihe e mere ha ka ha na-arụ. Ma, ụmụ mmadụ dị iche. E nwere onyinye pụrụ iche Jehova nyere anyị. Onye Kraịst ọ bụla na-ejikwa ya akpọrọ ihe. Onyinye ahụ bụ ikike Jehova nyere anyị ikpebi ihe anyị ga-eme. Baịbụl kwuru na e kere nwoke mbụ bụ́ Adam n’oyiyi Chineke. (Jen. 1:26, 27) Chineke nyere Adam na Iv ikike iji aka ha ekpebi ihe ha ga-eme.
2 Jehova enyeghị Adam na Iv ọtụtụ iwu. Naanị ihe ọ gwara ha bụ ka ha na-elekọta ụwa, mụjuo ụwa, kwetakwa na ọ bụ ya kwesịrị ikpebi ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. (Jen. 1:28; 2:16, 17) Olee otú Adam na Iv gaara esi egosi na obi dị ha ụtọ na Jehova nyere ha ikike iji aka ha ekpebi ihe ha ga-eme? N’ihi ihe ọma niile Jehova meere ha, ha gaara edebe iwu ndị a na-esighị ike o nyere ha n’ihi na ha hụrụ ya n’anya, chọọkwa ime ya obi ụtọ.—Ilu 23:15.
3. Gịnị ka Adam na Iv ji onyinye Jehova nyere ha ikpebiri onwe ha ihe mee?
3 Ihe Baịbụl kwuru gosiri na Adam na Iv ejighị onyinye ahụ Jehova nyere ha mee ihe dị mma. Ha kpebiri inupụrụ ya isi. Ihe mere ha ji kpebie ime otú ahụ bụ na ha hụrụ onwe ha n’anya, ọ bụghị Jehova. (Jen. 3:1-7) Anyị ka na-atakwa ahụhụ mkpebi ahụ ha mere kpatara.—Rom 5:12.
4. (a) Dị ka e kwuru ná Ndị Galeshia 6:5, gịnị ka anyị niile ga-emerịrị? (b) Olee onyinye ọzọ Chineke nyere anyị anyị ga-ekwu gbasara ya n’isiokwu a?
4 Ọtụtụ mgbe, ihe anaghị adịrị anyị mfe. Kwa ụbọchị, e nwere ọtụtụ ihe anyị kwesịrị ikpebi. (Gụọ Ndị Galeshia 6:5.) Ụfọdụ na-adị mfe, ụfọdụ ana-esi ike. Olee otú anyị ga-esi eme mkpebi ga-adị Jehova mma? Anyị kwesịrị ikweta na ọ dị mkpa ka Jehova nyere anyị aka. (Ilu 16:3; Jere. 10:23) Mgbe Jizọs bịara n’ụwa, o zuru okè. Ma, ọ makwa na enyemaka Chineke dị ya mkpa. (Hib. 5:7) Ebe ọ bụ na anyịnwa ezughị okè, enyemaka Chineke dị anyị ezigbo mkpa karịa ka ọ dị Jizọs. Ka anyị lebazie anya n’onyinye ọzọ Chineke nyere anyị ga-enyere anyị aka ịna-eme ezigbo mkpebi. Ọ bụ akọnuche anyị.
GỊNỊ BỤ AKỌNUCHE?
5. (a) Gịnị bụ akọnuche? (b) Olee otú akọnuche si enyere anyị aka? (Ndị Rom 2:14, 15)
5 Akọnuche bụ ihe Chineke kenyere n’ime anyị na-enyere anyị aka ịmata ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. Onye na-amaghịdị ihe ọ bụla gbasara iwu Chineke nwekwara akọnuche. (2 Kọr. 4:2) Akọnuche anyị dị ka onyeikpe nọ n’ime anyị na-agwa anyị ma ihe anyị na-eche ma ọ bụ na-eme ọ̀ bụ ihe ọma ka ọ̀ bụ ihe ọjọọ. (Gụọ Ndị Rom 2:14, 15.) Akọnuche anyị nwere ike ịgwa anyị ka anyị ghara ime ihe anyị ma dị njọ. (1 Sam. 26:8-11) O nwekwara ike ime ka anyị mee ihe anyị ma dị mma. Inwe ikike ikpebi ihe anyị ga-eme apụtaghị na mkpebi ọ bụla anyị mere ga-adị Jehova mma. Akọnuche anyị kwesịrị inyere anyị aka ịmata ihe dị iche n’ezigbo mkpebi na nke na-adịghị mma.
6. Gịnị mere na ọ bụghị mgbe niile ka akọnuche anyị na-enyere anyị aka ime mkpebi dị mma?
6 Ma e nwere nsogbu dịnụ. Otú ahụ anyị na-ezughị okè ka akọnuche anyị na-ezughị okè. Otú e si zụọ anyị, omenala anyị, nakwa ezughị okè anyị nwere ike ịkpa akọnuche anyị aka ọjọọ. Baịbụl kwuru na akọnuche nwere ike ịghọ nke “na-esighị ike,” nke “rụrụ arụ,” nke “nwụrụla ka ihe a dara ígwè ọkụ,” ma ọ bụdị nke “ọjọọ.” (1 Kọr. 8:12; Taị. 1:15; 1 Tim. 4:2; Hib. 10:22) Ụdị akọnuche ndị a anaghị eduzi mmadụ nke ọma. Ha yiri elekere na-anaghị arụ ọrụ nke ọma e kwesịrị ịrụzi. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịzụ akọnuche anyị nke ọma. (1 Pita 3:16) Olee otú anyị ga-esi eme ya?
OTÚ ANYỊ GA-ESI NA-AZỤ AKỌNUCHE ANYỊ
7-8. (a) Gịnị ga-enyere anyị aka ịna-azụ akọnuche anyị? (b) Olee otú ihe ndị anyị mụtara na Baịbụl si eduzi anyị? Mee ihe atụ. (Kọwaakwa foto.)
7 Olee otú anyị ga-esi na-azụ akọnuche anyị? Anyị kwesịrị ịna-agụ Baịbụl mgbe niile ka anyị mụta ihe Jehova kwuru na ọ dị mma na nke ọ sị na ọ dị njọ. Ịmụ iwu Jehova ga-enyere anyị aka ịghọta otú o si eche echiche. Ma, dị ka e kwuru n’isiokwu bu nke a ụzọ, ọ bụghị n’ihe niile ka iwu ga-enyere anyị aka. Ọ bụ ya mere anyị ji kwesị ịmata ihe mere Jehova ji nye anyị iwu. Ọ ga-enyere anyị aka ịghọtakwu otú Jehova si eche echiche na otú obi na-adị ya.—Aịza. 55:9.
8 E nwere ike iji ndụ anyị dị tụnyere ịga n’ala ịkpa. Chegodị otú ọ ga-adị ma ọ bụrụ na e nweghị ụzọ ma ọ bụ ihe ndị ga-enyere anyị aka ịmata ebe anyị na-aga. Ihe ga-aka enye aka bụ map na-egosi ihe ndị anyị ga-ahụ ga-enyere anyị aka ịmata ebe anyị ga-esi, dị ka osimiri ma ọ bụ ugwu. Ụdị map a ga-eme ka obi sie anyị ike na ụzọ anyị si bụ ụzọ anyị kwesịrị isi, nyekwara anyị aka ịmata mgbe anyị tinyere isi ebe ọzọ. Ihe dị anyị mkpa ná ndụ bụ ime ihe ga-adị Jehova mma. Baịbụl dị ka map na-enye anyị ntụziaka doro anya. Ọ bụrụ na anyị ejiri ihe anyị mụtara na Baịbụl gbasara otú Jehova si eche echiche na-ebi ndụ, obi ga-esi anyị ike na anyị na-aga n’ụzọ anyị kwesịrị ịga. Ọ ga-emekwa ka anyị na-eme Jehova obi ụtọ mgbe niile.
Ọ bụrụ na anyị ejiri ihe anyị mụtara na Baịbụl gbasara otú Jehova si eche echiche na-ebi ndụ, obi ga-esi anyị ike na anyị na-aga n’ụzọ anyị kwesịrị ịga (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8)
9. Dị ka e kwuru ná Ndị Rom 9:1, olee ihe ọzọ ga-enyere anyị aka ịzụ akọnuche anyị?
9 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịzụ akọnuche anyị ka ọ na-arụ ọrụ nke ọma, mmụọ nsọ Chineke dị anyị mkpa. (Gụọ Ndị Rom 9:1.) Mmụọ nsọ ga-enyere anyị aka ịmata otú Jehova si ele ihe anya. Ọ na-eme ka anyị chọọ ime ihe dị Jehova mma, nyekwa anyị ike anyị ji eme ya. (Fil. 2:13) Ma, gịnị ka anyị ga-eme ka mmụọ nsọ Chineke nyere anyị aka?
10. Gịnị ka anyị ga-eme ka mmụọ nsọ Chineke nyere anyị aka? (Luk 11:10, 13)
10 Rịọ Jehova ka o nye gị mmụọ nsọ ya. (Gụọ Luk 11:10, 13.) Obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova adịghị aka ntagide ma a bịa n’inye anyị mmụọ nsọ ya. (Jọn 3:34) Ọ na-eji obi ya enye ya ndị na-erubere ya isi. (Ilu 1:23; Jems 1:5) Ma, olee ihe ọzọ ga-enyere anyị aka ịzụ akọnuche anyị?
11. (a) Gịnị kwesịrị ịkacha anyị mkpa ná ndụ? (b) Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị zụọ akọnuche anyị ka ọ na-arụ ọrụ nke ọma?
11 Na-agbalị ime ihe dị Jehova mma mgbe niile. (Ilu 8:34, 35) Ọ bụ ya kwesịrị ịka anyị mkpa ná ndụ. Anyị buru ya n’obi n’ihe ọ bụla anyị na-eme ná ndụ, o nwere ike inyere anyị aka ịzụ akọnuche anyị. Ọ bụrụ na anyị ana-eche echiche otú Jehova si eche, na-agbalịkwa ka anyị ghara ime ihe ga-ewute ya, akọnuche anyị ga na-arụ ọrụ nke ọma. Akọnuche a zụrụ nke ọma dị anyị ezigbo mkpa n’ụwa a siri ike obibi. Ọtụtụ mgbe, a na-enwe ihe ndị anyị ga-ekpebi Baịbụl na-ekwughị ihe ọ bụla gbasara ha. Dị ka ihe atụ, anyị ga-ekpebi ihe anyị ga-ege na ihe anyị ga-ele mgbe anyị chọrọ izuru ike, ụdị ọrụ anyị ga-arụ, ebe anyị ga-agụru akwụkwọ, ma ọ bụ ụdị ndị anyị na ha ga na-akpa. N’ihi ya, olee otú anyị ga-esi jide n’aka na ihe anyị chọrọ ikpebi n’ihe ndị a dị Jehova mma?—2 Kọr. 1:12.
12. Gịnị ga-enyere anyị aka ịma ma akọnuche anyị ọ̀ na-eduzi anyị ime ihe dị mma? (Ndị Efesọs 5:10)
12 Na-echebara ihe ị gụrụ na Baịbụl echiche. (Ọma 49:3) Ị gụwa Baịbụl, chọpụta ihe ndị ga-enyere gị aka ịmata otú Jehova si eche echiche. (Gụọ Ndị Efesọs 5:10.) Ihe a ga-enyere anyị aka ịmata ma akọnuche anyị ọ̀ na-eduzi anyị ime mkpebi ndị dị mma ma anyị doziwe nsogbu ndị bịaara anyị. (Ilu 2:4-9, 11-13) Ọ ga-enyekwara anyị aka ịzụ akọnuche anyị ma na-eme ihe Jehova chọrọ ka anyị mee.—Hib. 5:14.
13. Gịnị ka anyị na-ekwesịghị ime? Mee ihe atụ.
13 Ebula ụzọ eme mkpebi, e mechazie gị achọwa ihe Baịbụl kwuru ị ga-eji akwado ya. Anyị achọghị ime ka ndị Izrel ka nọ na Juda mgbe e bibichara Jeruselem n’afọ 607 Tupu Oge Ndị Kraịst. Ha gwara Jeremaya, sị: “Ka Jehova bụ́ Chineke gị gwa anyị otú anyị kwesịrị isi na-akpa àgwà na ihe anyị kwesịrị ịna-eme.” (Jere. 42:3-6) Ma, ha ebula ụzọ kpebie ihe ha ga-eme. Mgbe ihe Jehova gwara ha na-adabaghị n’ihe ha kpebiri, ha mere ihe ahụ ha bu ụzọ kpebie. Ọ kpatakwaara ha ọtụtụ nsogbu. (Jere. 42:19-22; 43:1, 2, 4) N’ihi ya, tupu anyị emee mkpebi, anyị kwesịrị ibu ụzọ gụọ Baịbụl ka anyị mata ihe Jehova chọrọ ka anyị mee, anyị emezie ya.
14. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-eme ihe dabara n’otú Jehova si eche echiche ma anyị mewe mkpebi?
14 Na-eme mkpebi ndị dabara n’otú Jehova si eche echiche. (Mat. 7:24-29; Jems 1:23-25) Anyị mee mkpebi dabara n’otú Jehova si eche echiche, anyị na-ekwe ka mmụọ nsọ na-eduzi anyị. Ọ ga-emekwa ka Jehova na-enye anyị mmụọ nsọ ya. (Ọrụ 5:32) Ma, ọ bụrụ na anyị anaghị ekwe ka mmụọ nsọ Chineke na-eduzi anyị, anyị nwere ike ịna-eme “ihe ga-ewute mmụọ nsọ.” (Efe. 4:30; Aịza. 63:10; Ọrụ 7:51) Jehova nwedịrị ike ịnapụ anyị mmụọ nsọ ya. (Ọma 51:11; 1 Tesa. 5:19) Ihe a ga-akpatara anyị ezigbo nsogbu n’ihi na ike mmụọ nsọ na-enye dị anyị mkpa.—Efe. 3:16.
OTÚ ANYỊ GA-ESI ACHỌTA IHE NDỊ BAỊBỤL KWURU GA-ABARA ANYỊ URU
15-16. (a) Olee otú anyị ga-esi achọta ihe ndị Baịbụl kwuru ga-abara anyị uru? (b) Olee ihe ndị Baịbụl kwuru nwere ike inyere onye ị na-amụrụ ihe aka ịgba mbọ kwụsị ịṅụ sịga?
15 Ihe ndị anyị ji amụ ihe. Tupu anyị emee ihe Baịbụl kwuru, anyị ga-ebu ụzọ chọta ya. Dị ka ihe atụ, o nwere ike isiri onye ị na-amụrụ ihe ike ịkwụsị ịṅụ sịga. O nwere ike ịna-eche, sị: ‘Baịbụl ekwughị gbasara ịṅụ sịga. N’ihi ya, olee otú anyị si mara na ọ dị njọ?’ I nwere ike inyere ya aka ịchọta ihe ndị Baịbụl kwuru ga-enyere ya aka ịghọta na ịṅụ sịga dị njọ. Otu ihe ga-enyere gị aka bụ Akwụkwọ Ndịàmà Jehova Ji Eme Nchọnchọ. I nwere ike igosi ya isiokwu bụ́ “Ụtaba na Sịga.” N’ebe ahụ, e nwere isiokwu bụ́ “Mmadụ Ịṅụ Sịga Ọ̀ Dị Chineke Mma?” (Ọ gbara n’Ụlọ Nche Jun 1, 2014.) Ka ọ na-agụ isiokwu ahụ, olee amaokwu Baịbụl na ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru ọ ga-ahụ?
16 Legodị ihe ise e kwuru n’isiokwu ahụ. (1) Anyị ekwesịghị ịna-agbara ihe ga-egbu anyị ohu. (Rom 6:16) (2) Anyị kwesịrị izere ihe ọ bụla ga-emerụ anyị ahụ́. (2 Kọr. 7:1) (3) Jehova chọrọ ka anyị jiri obi anyị niile na-ejere ya ozi. (Mat. 22:37) (4) Ihe anyị na-eme ekwesịghị ịkpatara ndị ọzọ nsogbu. (Mat. 22:39; 1 Kọr. 10:24) (5) Jehova ga-enyeli anyị ike anyị ga-eji eme ihe dị mma. (Fil. 4:13) N’ihi ya, ọ bụ eziokwu na a kpọghị ịṅụ sịga aha na Baịbụl, ma ihe ndị e kwuru na ya ga-enyere onye ị na-amụrụ Baịbụl aka ịghọta otú Jehova si ele ịṅụ sịga anya.
17. Olee otú ndị chọrọ ịgba akwụkwọ ga-esi achọta ihe Baịbụl kwuru ga-enyere ha aka?
17 Olee otú Ndị Kraịst chọrọ ịgba akwụkwọ ga-esi achọta ihe ndị Baịbụl kwuru ga-enyere ha aka ime ezigbo mkpebi? Akwụkwọ Nchọnchọ ga-enyekwara ha aka. N’isiokwu bụ́ “Agbamakwụkwọ na Oriri Agbamakwụkwọ,” e nwere ọtụtụ isiokwu ndị kwuru ihe bụ́ uche Chineke gbasara ya. Legodị ihe isii ndị chọrọ ịgba akwụkwọ ga-elebara anya. (1) Ihe niile a ga-eme na ya kwesịrị ime ka e too Chineke. (1 Kọr. 10:31, 32) (2) Uwe anyị na ejiji anyị kwesịrị ịdị mma n’anya, o kwesịghịkwa ịkpasu ndị ọzọ iwe. (1 Tim. 2:9; 1 Pita 3:3, 4) (3) Anyị ekwesịghị iji agbamakwụkwọ anyị gosiwe ndị mmadụ ihe anyị nwere na ihe anyị ga-emeli, nke bụ́ ihe e ji mara agbamakwụkwọ n’ụwa Setan. (Jọn 17:14; Jems 1:27; 1 Jọn 2:15, 16) (4) E kwesịrị ịhazi ihe niile ahazi. (1 Kọr. 14:40) (5) Oriri agbamakwụkwọ ekwesịghị ịbụ oriri oké mkpọtụ, ebe ndị mmadụ ga na-aṅụ oké mmanya. (Gal. 5:21) (6) E kwesịrị inwe onye ga-ahụ na e mere ihe niile otú o kwesịrị.—Jọn 2:8, 9.
18-19. (a) Olee akwụkwọ ọzọ ga-enyere anyị aka? (b) Olee ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru ị ga-ahụ n’akwụkwọ a ga-enyere gị aka ikpebi ememme ndị ị ga-eme? (Kwuokwa ihe dị n’igbe isiokwu ya bụ “Ì Nwere Ike Ịchọpụta Otú Jehova Si Eche Echiche Gbasara Ihe Ndị A?”)
18 Ihe ọzọ nyeerela ọtụtụ ndị aka bụ akwụkwọ bụ́ Amaokwu Baịbụl Ndị Na-enyere Anyị Aka Ife Jehova. E depụtara ọtụtụ amaokwu Baịbụl n’isiokwu dị iche iche n’akwụkwọ a. Ị họrọ otu isiokwu, ị ga-ahụ ọtụtụ ajụjụ na amaokwu Baịbụl ndị ga-enyere gị aka ịghọta otú Jehova si eche echiche. Dị ka ihe atụ, Onye Kraịst nwere ike ịna-eche ma ò kwesịrị ịga otu ememme. Ọ gaa n’isiokwu bụ́ “Ememme,” ọ ga-ahụ isiokwu nta bụ́ “Ememme Ndị Kraịst na-anaghị eme.”
19 Legodị ihe ụfọdụ e kwuru n’ebe ahụ: “Gịnị mere na Ndị Kraịst ekwesịghị iso ndị okpukpe ụgha na-eme ememme ha? (1 Kọr. 10:21; 2 Kọr. 6:14-18; Efe. 5:10, 11).” E kwuziri ụfọdụ ememme ndị ahụ na-adịghị mma. N’okpuru isiokwu nta bụ́ “Ememme ndị e ji eto mba,” e nwere ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru e depụtara Onye Kraịst ga-echebara echiche mgbe ọ chọrọ ikpebi ma ọ̀ ga-eso eme ememme ụfọdụ e ji echeta ike ọchịchị kpara, agha mba lụrụ, na nke e ji efe ndị a ma ama. Obi dị anyị ụtọ na Jehova na nzukọ ya nyere anyị ihe ndị ga-enyere anyị aka ịzụ akọnuche anyị.
GOSI NA I NWERE AKỌNUCHE A ZỤRỤ NKE ỌMA
20. Olee otú anyị ga-esi egosi na anyị zụrụ akọnuche anyị nke ọma?
20 Obi dị anyị ụtọ na Jehova nyere anyị onyinye iji aka anyị ekpebi ihe anyị ga-eme. Ma, anyị kwesịkwara icheta na anyị kwesịrị ịzụ akọnuche anyị ka o nwee ike inyere anyị aka ịna-ekpebi ime ihe ndị dị mma. Akọnuche a zụrụ nke ọma ga-enyere anyị aka ime mkpebi ga-eme Jehova obi ụtọ, meekwa ka e too ya. Ka anyị nwee ike ime ya, ọ dị mkpa ka mmụọ nsọ Jehova nyere anyị aka. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-arịọ Jehova ka o nye anyị mmụọ nsọ ya. Anyị ga-ekwezi ka ọ na-edu anyị. Ihe ndị Baịbụl kwuru ga-enyekwara anyị aka ịzụ akọnuche anyị. Ka anyị mee ike anyị niile iji onyinye ndị a Jehova nyere anyị eme ihe bara uru. Anyị ga-ahụzi otú Okwu Chineke ga-esi na-enyere anyị aka.—2 Tim. 3:16, 17; Hib. 4:12.
ABỤ NKE 135 Jehova Ji Obiọma Na-arịọ: “Mara Ihe, Nwa M”