JULAỊ 27 RUO ỌGỌST 2, 2026
ABỤ NKE 56 Ka Eziokwu Bamie Gị n’Obi
Gị na Jehova Dịrị n’Ezigbo Mma Mgbe Ị Na-agụkwu Akwụkwọ
“Otú ọ bụla anyị merurula nke ọma, ka anyị si otú ahụ mere nke ọma na-aga.”—FIL. 3:16.
IHE A GA-AMỤ
Ihe anọ Baịbụl kwuru ga-enyere gị aka ka gị na Jehova na-adị ná mma ma ọ bụrụ na ị chọrọ ịgụkwu akwụkwọ.
1-2. (a) Ọ bụrụ na i kpebiri ịgụkwu akwụkwọ, gịnị ka i kwesịrị ịna-eme? (b) Gịnị ka ‘isi otú ahụ mere nke ọma na-aga’ pụtara? (Ndị Filipaị 3:16)
ỤFỌDỤ ndị ohu Jehova ekpebiela na ha ga-agụkwu akwụkwọ mgbe ha gacharala nke ndị ọchịchị kwuru na mmadụ ga-agarịrị. Ha nwere ike iche na ịgụkwu akwụkwọ ga-enyere ha aka ịchọta ọrụ ha ga-eji na-egbo mkpa ha ka ha na-ejere Jehova ozi. Ọ bụrụ na i kpebiri ịgụkwu akwụkwọ, gịnị ka ị ga-eme ka gị na Jehova na-adị ná mma? (Jems 4:8a) O doro anya na e nwere ọnwụnwa ndị i meriri n’oge mbụ ị gara akwụkwọ. Ugbu a, i kwesịkwara ‘isi otú ahụ mere nke ọma na-aga,’ ya bụ, iferekwa Jehova na-aga otú ị na-emebu.—Gụọ Ndị Filipaị 3:16.
2 A na-ejikarị okwu Grik a sụgharịrị “mere nke ọma na-aga” akọwa ndị agha na-azọ ije na-aga ụkwụ na ụkwụ. Ọ bụrụ na i kpebiri ịgụkwu akwụkwọ, ọ ga-adị mkpa ka ị zọrọ ije na-aga n’ozi Jehova. Ị gaghị akwụrụ otu ebe ma ọ bụ laghachiwe azụ. N’isiokwu a, anyị ga-ekwu ihe anọ Baịbụl kwuru ga-enyere gị aka. Ihe ndị a abụghịrị gị ihe ọhụrụ. I meela ha n’oge gara aga. I kwesịkwara ịna-eme ha ka ị na-agụkwu akwụkwọ nakwa mgbe ị gụchara.
NA-EMECHI IHE NDỊ GBASARA OFUFE JEHOVA ANYA
3. Ka ị na-agụkwu akwụkwọ, olee ihe ndị nwere ike isiri gị ike ịna-eme?
3 Ihe mere o ji esi ike. Mmadụ ịgụkwu akwụkwọ nwere ike ime ka a na-enwe ọtụtụ ihe ọ na-eme kwa ụbọchị. Ebe ọ bụ na ị chọrọ ime nke ọma n’ụlọ akwụkwọ, o nwere ike ime ka i were ofufe Jehova ka ihe na-adịchaghị mkpa. I nwere ike kwụsị ịgachi ọmụmụ ihe na ozi ọma anya, ma ọ bụ gharazie iji ịgụ Baịbụl na ikpe ekpere akpọrọ ihe.—Mkpu. 2:4.
4. Gịnị ga-enyere gị aka inwe ‘ọtụtụ ihe ị na-arụ mgbe niile n’ọrụ Onyenwe anyị’? (1 Ndị Kọrịnt 15:58)
4 Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 15:58. Onye na-agba ígwè ga na-azọ ya ka o nwee ike ịgbara ya na-aga. Ọ bụrụkwa na gịnwa chọrọ ka gị na Jehova na-adị ná mma, i kwesịrị inwe ‘ọtụtụ ihe ị na-arụ mgbe niile n’ọrụ Onyenwe anyị.’ Ihe ọ pụtara abụghị naanị na ị ga na-eji oge ụfọdụ eme ihe ndị gbasara ofufe Jehova. Ọ bụ ya kwesịrị ịkacha gị mkpa. I kwesịrị ịna-echeta na ife Jehova bụ ihe kacha mkpa ná ndụ, ọ bụghị ịgụkwu akwụkwọ. (Mat. 22:37) Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Samantha sịrị, “M gwara onwe m na ọ bụrụ na akwụkwọ m na-agụ achọọ ịkpa ofufe m na-efe Jehova aka ọjọọ, m ga-akwụsị.”
5. Gịnị ka ị ga-eme ka ị na-emechi ihe ndị gbasara ofufe Jehova anya?
5 Ihe ị ga-eme tupu gị ebido ịgụkwu akwụkwọ. Jide n’aka na ife Jehova bụ ihe kacha mkpa ná ndụ gị. Jụọ onwe gị, sị, ‘Olee ihe ndị m ga-eme ka m nwee ike na-akwadebe maka ọmụmụ ihe, na-agachi ọmụmụ ihe anya, na-aga ozi ọma, na-agụchikwa Baịbụl anya?’ (Josh. 1:8; Mat. 28:19, 20; Hib. 10:25) Cheekwa echiche: Olee ihe ndị i mere n’oge mbụ ị gara akwụkwọ ka ihe gbasara ofufe Jehova bụrụ ihe kacha gị mkpa? Ọ bụrụ na i chere na i kwesịrị imekwu nke ọma, olee ihe ndị ị ga-emekwu nke ọma na ha? Kpebisie ike na ị ga na-emechi ihe ndị gbasara ofufe Jehova anya ka ị na-agụkwu akwụkwọ. Tinye uche gị n’akwụkwọ ị na-agụ, ma ekwekwala ka o mee ka ị ghara iwere ofufe Jehova ka ihe kacha gị mkpa.a—Mat. 6:24.
6. Olee ajụjụ ndị i nwere ike ịjụ onwe gị iji chọpụta ma ofufe Jehova ọ̀ ka bụkwa ihe kacha gị mkpa ná ndụ? (Kọwaakwa foto.)
6 Ka ị na-agụkwu akwụkwọ, ị gụrụ gụrụ, gị ajụọ onwe gị ajụjụ ụfọdụ. O nwere ike ịbụ kwa ọnwa. Jụọ onwe gị, sị: ‘Ofufe Jehova ọ̀ ka bụkwa ihe kacha m mkpa?’ I nwere ike ịchọpụta na ọ bụghịzi ọmụmụ ihe niile ka ị na-aga ma ọ bụkwanụ na ị naghịzi aga n’oge, ị na-eche gbasara ihe omume e nyere gị n’ụlọ akwụkwọ mgbe ọmụmụ ihe na-aga n’ihu, ma ọ bụkwanụ na ọ bụzi naanị n’Ịntanet ka ị na-esi aga ọmụmụ ihe. I nwekwara ike ịjụ onwe gị, sị, ‘M̀ selatala aka n’otú m si agụ Baịbụl na otú m si ekpe ekpere? M̀ na-aga ozi ọma naanị iji mezuo iwu, laakwa ngwa ngwa?’ Ọ bụrụ na ị chọpụta na ọ bụ ihe ị na-emezi, gbalịa gbanwee n’egbughị oge. Ekwela ka akwụkwọ ị na-agụ mee ka ofufe Jehova gharazie ịbụ ihe kacha gị mkpa ná ndụ.
Ekwela ka agụmakwụkwọ gị mee ka ị ghara iwere ofufe Jehova ka ihe kacha mkpa (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6)
“KPACHAPỤRỤ OTÚ I SI ECHE ECHICHE ANYA”
7. Olee otú ịgụkwu akwụkwọ nwere ike isi kpaa otú i si eche echiche aka ọjọọ?
7 Ihe mere o ji esi ike. Ihe ị na-amụ n’ụlọ akwụkwọ nwere ike ime ka a na-akụziri gị ihe ndị Baịbụl sị na ha dị njọ, ya bụ, ihe ndị Baịbụl kpọrọ “amamihe ụwa na ihe ndị na-abụghị eziokwu,” dị ka na Chineke adịghị nakwa na e keghị mmadụ eke. (Kọl. 2:8) Ha nwekwara ike ịna-akụziri gị na ọ bụrụ na ị chọrọ ka ihe gaziere gị, i kwesịrị ịtụkwasị onwe gị obi. Otu nwanna sịrị: “Ihe a kụziiri anyị abụghị naanị ịmụta nkà ndị dị anyị mkpa. A kụzikwaara anyị otú e si eche echiche nke na-adabaghị n’otú Jehova si eche. Dị ka ihe atụ, a kụziiri anyị na ọ bụ naanị nkà anyị ga-eme ka ihe gaziere anyị ná ndụ. Isi otú a eche echiche na-eme ka mmadụ chefuo Jehova. O mere ka o siere m ike ịtụkwasị ya obi.”
8. Gịnị mere i ji kwesị ‘ịkpachapụrụ otú i si eche echiche anya’? (Ilu 5:1, 2)
8 Gụọ Ilu 5:1, 2. Baịbụl gwara gị ka ị “kpachapụrụ otú i si eche echiche anya.” A sị mmadụ kpachapụ anya, ọ pụtara na o kwesịrị ịnọ na nche ka ihe ghara ime. Setan na ụwa ya chọrọ ka anyị na-eche echiche ka ha. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịkpachara anya ka ha ghara inweta anyị. (1 Pita 5:8) Otú ụwa si eche echiche nwere ike ịkpa anyị aka ọjọọ, anyị echewe na ihe Jehova sịrị na ọ dị njọ enweghị ihe o mere, na e keghị ihe ndị dị ndụ eke, ma ọ bụkwanụ na Chineke adịghị. Ndị mmadụ nwere ike ịna-ekwu na ọ bụ otú ahụ ka ndị ma ihe si eche echiche. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụ ndị na-amaghị ihe na-eche otú ahụ. Baịbụl kwudịrị na ọ “bụ ihe nzuzu n’anya Chineke.”—1 Kọr. 3:18-20.
9. Gịnị ka ị ga-eme ka ị kpachara anya n’otú i si eche echiche?
9 Ihe ị ga-eme tupu gị ebido ịgụkwu akwụkwọ. Gbalịa mee ka obi sie gị ike na ihe Baịbụl na-akụzi bụ eziokwu tupu gị amalite ịgụkwu akwụkwọ. Jụọ onwe gị ajụjụ ndị dị ka: ‘Gịnị mere m ji kwere na Chineke? Olee otú m si mara na Baịbụl bụ Okwu ya? Gịnị mere obi ji sie m ike na ihe ndị Baịbụl kwuru bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ ka nke ụwa mma?’ Ihe ọzọ ga-enyere gị aka bụ iche gbasara oge mbụ ị gara akwụkwọ. Otú ndị mmadụ si kwere na e nweghị Chineke kere ihe niile ọ̀ kpara okwukwe gị aka? Ihe ọjọọ ụmụ klas gị nọ na-eme n’oge ahụ ọ̀ nọ na-agụ gị agụụ? Ọ bụrụ na i chere na ị gaara emekwu nke ọma n’oge ahụ, gịnị ka ị ga-eme ka obi sie gị ike na ihe Baịbụl na-akụzi bụ eziokwu nakwa na ọ bụ ihe ga-akacha baara gị uru? Kpebisie ike na ị ga-akpachara anya n’otú i si eche echiche ka ị na-agụkwu akwụkwọ.—2 Tim. 2:16-18.b
10. Gịnị ka ị ga-eme ka i nwee ike ịna-akpachapụrụ otú i si eche echiche anya?
10 Ka ị na-agụkwu akwụkwọ, na-echebara onwe gị echiche. Jụọ onwe gị, sị: ‘Otú na-adịghị mma ndị mmadụ si ebi ndụ gburugburu m ọ̀ na-akpa m aka? M̀ na-achọpụtali mgbe ihe ha na-akụzi bụ amamihe ụwa? Obi ò siri m ike na ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-ewepụrụ ụmụ mmadụ nsogbu ha?’ Ka i nwee ike ịna-akpachara anya n’otú i si eche echiche, i kwesịrị ịna-amụ Baịbụl nke ọma, na-echebara ya echiche, ma na-eme ihe o kwuru. I mee otú ahụ, e nweghị ihe ga-eme ka i nwewe obi abụọ ma ihe Baịbụl kwuru ọ̀ bụ eziokwu.—1 Tim. 4:15.
JIRI OGE GỊ NA-EME IHE NDỊ KACHA MKPA
11. Mgbe ị na-agụkwu akwụkwọ, gịnị nwere ike ime ka o siere gị ike iji oge gị na-eme ihe ndị kacha mkpa?
11 Ihe mere o ji esi ike. Ịgụkwu akwụkwọ nwere ike ịna-ewekọrọ oge gị, karịchaa, ma ị kwadebewe maka ule ma ọ bụ ma e nwee ihe ndị e nyere gị ka ị rụchaa ozugbo ozugbo. Ọ bụrụ na i jighị oge gị eme ihe ndị kacha mkpa, ezigbo ike nwere ike ịna-agwụ gị mgbe niile. Ọ bụ ya mere i ji kwesị iwepụta oge ị ga-eji na-elekọta onwe gị.
12. Olee ihe ndị i kwesịrị iwepụtara oge ka i nwee ike iji ‘oge gị na-eme ihe kacha mkpa’? (Ndị Efesọs 5:15, 16)
12 Gụọ Ndị Efesọs 5:15, 16. O nwere ike isiri gị ike iji ‘oge gị na-eme ihe kacha mkpa.’ Ihe kpatara ya bụ na e nwere ọtụtụ ihe ị na-eme. Dị ka ihe atụ, ọ bụ eziokwu na i kwesịrị ịna-agụ akwụkwọ nke ọma, ma i kwesịrị iwepụta oge gị na ụmụnna gị na ndị ezinụlọ gị ga-eji na-anọrị. (Ọma 133:1; Ilu 18:1) Nke kacha mkpa bụ na i kwesịrị ịna-eme ihe ndị ga-eme ka gị na Jehova na-adịkwu ná mma. (Mat. 6:33) O nwekwara ike ịbụ na e nwere ọrụ ị na-arụ n’ezinụlọ unu ma ọ bụ ọrụ i ji akpa afọ gị. Ihe ọzọ bụ na i kwesịrị ịna-ezu ike nke ọma, na-emegakwa ahụ́ ka ahụ́ nwee ike na-agbasi gị ike. (Ekli. 4:6; 1 Tim. 4:8) I kwesịrị ịhazi oge gị nke ọma ka i nwee ike ime ihe a niile.
13. Gịnị ka ị ga-eme ka i nwee ike iji oge gị na-eme ihe kacha mkpa?
13 Ihe i nwere ike ime tupu gị ebido ịgụkwu akwụkwọ. Baịbụl kwuru na ihe na-agaziri mmadụ ma o mee atụmatụ. (Ilu 21:5) N’ihi ya, hazie oge gị nke ọma tupu gị amalite ịgụkwu akwụkwọ. Iji mee ya, chee otú i si jiri oge gị mee ihe kacha mkpa n’oge mbụ ị gara akwụkwọ. Ọ bụrụ na i chere na e nwere ihe i kwesịrị imekwu nke ọma na ya, olee ihe ndị ị ga-eme ugbu a ka i nwee ike ime ya? Kpebisie ike na ọ bụ gị ga-ahazi ihe ị ga-eji oge gị eme, ọ bụghị oge ga na-atụrụ gị ụka.c
14. Olee ajụjụ ndị nwere ike inyere gị aka ichebara onwe gị echiche?
14 Ka ị na-agụkwu akwụkwọ, chebara ihe ndị i ji oge gị eme echiche. Jụọ onwe gị, sị: ‘Otú m si hazie oge m ọ̀ na-eme ka m nwee oge m na-eji ezu ike, na-emegakwa ahụ́? M̀ ka na-enwe oge mụ na ụmụnna m na-eji anọrị? M̀ na-emecha ihe omume ndị nkụzi nyere m mee n’ụlọ n’oge? Ọ bụrụ na anaghị m emecha ha n’oge, ọ̀ bụ maka na ihe m ji n’aka karịrị akarị, ka ọ̀ bụ maka na anaghị m ebido n’oge? Ndị ezinụlọ m na ndị ọzọ hà ga-ekweta ihe m zara n’ajụjụ ndị a?’ Ọ bụrụ na ọ dị mkpa ka ị hazigharịa ihe i ji oge gị eme ma ọ bụkwanụ ka ị mụta ịmalite n’oge eme ihe ndị i kwesịrị ime, mee ya ozugbo. Gị na ndị ọzọ haziri oge ha nke ọma nwere ike ikwurịta ya.—Ilu 11:14.
GỊ NA NDỊ MA IHE “NA-AKPA”
15. Ka ị na-agụkwu akwụkwọ, olee nsogbu nwere ike ịbịara gị?
15 Ihe mere o ji esi ike. Ka ị na-agụkwu akwụkwọ, ụmụ akwụkwọ ibe gị nwere ike ịchọ ka i soro ha na-eme ihe ndị ha na-eme ma ha gbasaa akwụkwọ. O nwere ike ịdị gị ka i soro ha. Ihe kpatara ya bụ na o nwere ike ịbụ na gị na ha bụ ọgbọ, ihe na-amasị ha na-amasị gị, gị na ha na-anọkwa ogologo oge na klas. O nwedịrị ike ịdị gị ka ihe ọ̀ na-adabara gị na ha karịa gị na ụmụnna gị. Ma, i kwesịrị ịkpachara anya. Ọ bụ eziokwu na gị na ụmụ klas gị na-anọ na klas mgbe niile, gị na ha ekweghị n’otu ihe. Ọ bụrụ na gị na ha ana-anọkwu, i nwere ike ibido iche echiche ka ha. (1 Kọr. 15:33) Otu nwanna aha ya bụ Michael ji afọ anọ mụọ ịwaya ọkụ. Ọ chọpụtara na ihe a bụ eziokwu. Ọ sịrị: “Mụ na ndị ọrụ ibe m na-anọkọ ihe karịrị awa iri anọ kwa izu. Otú ha si ele onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ha anya, ụdị egwú ha na-ege, nakwa okwu rụrụ arụ ha na-ekwu malitere ịkpa m aka ọjọọ.”
16. Gịnị ka Ilu 13:20 na-akụziri anyị?
16 Gụọ Ilu 13:20. Baịbụl gwara anyị gbasara nsogbu dị n’iso ndị na-anaghị efe Jehova akpakọrịta. O kwukwara na “onye ya na ndị ma ihe na-akpa ga-ama ihe.” Ihe ọ na-akụziri anyị doro anya. Anyị na-amụtakarị àgwà ndị anyị na ha na-anọkarị, ma ọ̀ bụ nke ọma ma ọ̀ bụ nke ọjọọ. Ka ndị enyi gị bụrụ ndị na-echere gị echiche ọma, ya bụ, ndị ji obi ha niile na-efe Jehova.—Ọma 101:6, 7; 119:63.
17. Gịnị ka ị ga-eme ka ị gbaara mkpakọrịta ọjọọ ọsọ?
17 Ihe i nwere ike ime tupu gị ebido ịgụkwu akwụkwọ. Kpebie ebe mkpakọrịta gị na ụmụ klas gị na-agaghị agafe na otú gị na ha ga-adịru ná mma. Otu nwanna aha ya bụ Trenton sịrị: “Mụ na ụmụ klas anyị dị ná mma. Ma, mụ na ha anaghị anọrị ma a gbasaa akwụkwọ. M weere ha ka ụmụ klas m, ọ bụghị ezigbo ndị enyi m.” Gịnị na gịnị ka ị ga-eme ka mkpakọrịta gị na ha ghara ịgafe ókè? Iji nyere gị aka ịza ajụjụ a, chegodị echiche: Olee ihe ndị i kpebiri na ị gaghị eme n’oge mbụ ị gụrụ akwụkwọ? Ọ bụrụ na i chere na e nwere ebe ndị i kwesịrị imekwu nke ọma, olee mgbanwe ndị ị ga-eme ugbu a? Kpebisie ike na ọ bụ ‘gị na ndị ma ihe ga na-akpa’ nakwa na gị na ndị na-ahụghị Jehova n’anya agaghị na-akpa.d
18. Olee ajụjụ ndị i kwesịrị ịjụ onwe gị? (Kọwaakwa foto.)
18 Ị nọtụ, chebara onwe gị echiche. Jụọ onwe gị, sị: ‘Mụ na ụmụ klas m ànyị na-akpachi anya gafee ókè? Àmụtawala m otú ha si ekwu okwu, otú ha si eche echiche, ma ọ bụ otú ha si akpa àgwà? Olee otú Jehova si ele adịm ná mma mụ na ha anya?’ (Ọma 1:1) Ị chọpụta ihe ndị i kwesịrị ịgbanwe, gbanwee ha ozugbo. Gbasie mbọ ike ka ndị bụ́ ezigbo enyi gị bụrụ ndị hụrụ Jehova n’anya otú ị hụrụ ya. Ihe ọzọ bụ na i kwesịghị igbu oge izi ụmụ klas gị ozi ọma. Ebe ọ bụ na ha ma gị, bụrụkwa ụmụ akwụkwọ ibe gị, ọ bụ gị ga-akacha enyere ha aka ịmụta gbasara Jehova.
Egbula oge izi ụmụ klas gị ozi ọma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 18)e
JIKERE EJIKERE
19. Olee otú ị ga-esi jikere maka nsogbu ndị nwere ike ịbịara gị mgbe ị na-agụkwu akwụkwọ? Mee ihe atụ.
19 Onye na-aga ịkpa nkụ n’ọhịa na-ebu ụzọ jikere ejikere tupu ya agawa. Dị ka ihe atụ, ọ ga-eji mma na ụdọ, marakwa ebe ọ na-aga. Ọ bụ eziokwu na ọ maghị ihe niile nwere ike ime n’ọhịa nkụ, ma ihe ndị a ga-abara ya ezigbo uru. I nwere ike ime ụdị ihe ahụ mgbe ị na-akwadebe ịgụkwu akwụkwọ. Gbaa mbọ ka okwukwe gị sie ike. Yiri ‘ekike agha zuru ezu nke Chineke nyere gị.’ Chetakwa ihe mere i ji chọọ ịgụkwu akwụkwọ. Ọ bụghị ka ị bụrụ onye a ma ama n’ụwa, kama ọ bụ ka i mee ka e too Jehova n’ihe niile ị na-eme.—Efe. 6:11-13; 1 Kọr. 9:26, 27; 10:31.
20. Olee otú ị ga-esi ‘na-enyocha onwe gị ka ị mara ma okwukwe gị ò sikwara ike’?
20 Baịbụl gwara anyị, sị: “Na-enyochanụ onwe unu ka unu mara ma okwukwe unu ò sikwara ike. Na-egosinụ ụdị mmadụ unu bụ.” (2 Kọr. 13:5) Ị ga-emeli ya mgbe ị na-agụkwu akwụkwọ. Ị gụrụ gụrụ, gị echebara onwe gị echiche ka ị mara ma ị̀ na-emekwa nke ọma n’ihe ndị e kwuru n’isiokwu a. Ị̀ na-emechi ihe ndị gbasara ofufe Chineke anya? Ị̀ na-akpachapụ anya ka a ghara iji amamihe ụwa megharịa gị anya? Ị̀ na-eji oge gị eme ihe ndị kacha mkpa? Ị̀ na-emeta Ndị Kraịst enyi ma na-agbara mkpakọrịta ọjọọ ọsọ? I kwesịrị ịjụ onwe gị ajụjụ ndị a ma ị̀ nọ n’ụlọ akwụkwọ, n’ụlọ ọrụ, ma ọ bụ n’ebe ọzọ. Kpebisie ike ịna-agba mbọ ka okwukwe gị sie ike n’ebe ọ bụla ị nọ. Ka obi sie gị ike na Jehova ga-agọzi mbọ ị na-agba ime otú ahụ.—Ilu 3:5, 6.
ABỤ NKE 87 Bịa Ka A Gbaa Gị Ume
a Ị chọọ ịhụ aro ndị ga-enyere gị aka ịna-agbasi mbọ ike n’ozi Jehova, gụọ isiokwu dị na jw.org bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị, . . . Gịnị Ka M Kwesịrị Ime ma M Mechaa Baptizim?—Nke 1: Nọgide Na-eme Ihe Ndị Ị Na-emebu.”
b Ị chọọ ịhụ aro ndị ga-enyere gị aka ịna-akpachapụ anya n’otú i si eche echiche, gụọ isiokwu bụ́ “Ekwela Ka E Jiri ‘Amamihe nke Ụwa A’ Megharịa Gị Anya,” nke gbara n’Ụlọ Nche Mee 2019.
c Ị chọọ ịhụ aro ndị ga-enyere gị aka ịhazi ihe ndị ị na-eme kwa ụbọchị, gụọ isiokwu dị na jw.org bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị . . . Olee Otú M Ga-esi Na-ahazi Oge M?”
d Ị chọọ ịhụ aro ndị ga-enyere gị aka ịsa anya ná mmiri họrọ ndị ga-abụ ezigbo enyi, gụọ akwụkwọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi, isi nke 48 isiokwu ya bụ “Saa Anya ná Mmiri ma A Bịa n’Ụdị Ndị Ị Na-emete Enyi.”
e NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna nwaanyị ji akọ na-ezi nwa klas ya ozi ọma mgbe ha na-amụ gbasara ime isi.