JULAỊ 6 RUO 12, 2026
ABỤ NKE 98 Akwụkwọ Nsọ Si n’Ike Mmụọ Nsọ Chineke
Gịnị Mere Anyị Ji Kwesị Ịghọta Otú Jehova Si Eche Echiche?
“Ana m arịọ unu ka unu nyefee ya ahụ́ unu . . . Unu ga-esi otú a jiri echiche unu na-ejere ya ozi.”—ROM 12:1.
IHE A GA-AMỤ
Anyị ga-amụ otú anyị ga-esi eji Baịbụl aghọtakwu otú Jehova si eche echiche.
1-2. (a) Olee mgbe e dere Baịbụl? (b) Gịnị mere Baịbụl ka ji na-aba uru taa?
O TEELA e dere Baịbụl. A malitere ide ya ihe dị ka puku afọ atọ na narị ise (3,500) gara aga, dechaakwa ya ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ puku afọ abụọ (2,000) gara aga. N’agbanyeghị ya, “okwu Chineke” dị na ya ka na-abara anyị uru taa. (Hib. 4:12; 2 Tim. 3:16, 17) Ọtụtụ nde mmadụ taa ekwuola na Baịbụl na-enyere ha aka ime ezigbo mkpebi na ịna-enwe obi ụtọ.
2 Ma, gịnị mere akwụkwọ merela ochie otú a ka ji abara anyị uru taa? E nwere ihe abụọ kpatara ya. Nke mbụ, ihe e dere na ya si n’aka “Chineke dị ndụ,” bụ́ Onye kere anyị kacha mara ihe. (1 Tim. 4:10; Rom 16:26, 27) Nke abụọ, ihe dị na Baịbụl bụ eziokwu ndị na-anaghị agbanwe agbanwe si n’aka Chineke. Ọ bụ ya mere ndụmọdụ dị na ya ji enyere ndị mmadụ aka taa ma nsogbu bịara ha otú ahụ o nyeere ndị mmadụ aka n’oge gara aga.
3. Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza n’isiokwu a?
3 N’isiokwu a, anyị ga-aza ajụjụ ndị a: Gịnị mere Jehova ji enye anyị iwu? Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị ghọta ihe mere Jehova ji enye anyị iwu? Olee otú anyị ga-esi achọpụta otú Jehova si eche echiche ma anyị gụọ Baịbụl? Anyị ga-achọpụtakwa otú Jizọs si nyere ndị mmadụ aka ịghọtakwu otú Jehova si eche echiche.
GỊNỊ MERE JEHOVA JI ENYE ANYỊ IWU?
4. Gịnị na-enyere anyị aka ịghọta otú Jehova si eche echiche?
4 Baịbụl na-akụziri anyị eziokwu ndị dị mkpa na-enyere anyị aka ịghọta otú Jehova si eche echiche. Mgbe ụfọdụ, a na-ede eziokwu ndị a ka iwu. (Mat. 22:37) E nwere iwu ụfọdụ e nyere na Baịbụl n’oge pụrụ iche ma ọ bụ mgbe ihe pụrụ iche mere. Ma, ihe mere Jehova ji nye iwu ndị ahụ na-enyere anyị aka ịmata otú o si eche echiche na ihe o weere ka ihe dị mkpa. Ihe ndị ahụ emekataghị gbanwee. (Ọma 119:111) N’ihi ya, ọ bụrụgodị na iwu agbanwee ma ọ bụ na e nwere ihe a na-enyeghị iwu gbasara ya, anyị ka ga-amatali ihe dị mma na otú Jehova si ele ihe anya.—Aịza. 40:8.
5. Nye ihe atụ na-egosi ihe dị iche n’iwu na ihe mere e ji nye ya. (Kọwaakwa foto.)
5 Ka anyị nye otu ihe atụ na-egosi ihe dị iche n’iwu na ihe mere e ji nye ya. Ka e were ya na otu nwaanyị gwara obere nwa ya, sị, ‘Emetụla stoovu a aka.’ Ihe ahụ bụ iwu. Mana ihe mere o ji nye ya iwu ahụ bụ ka ọ ghara imetụ ihe ọ bụla dị ọkụ aka, ma ọ́ bụghị ya, ya emerụọ ya ahụ́. Ọ bụghị naanị stoovu ka ọ na-ekwesịghị imetụ aka. O kwesịghịkwa imetụ ihe ndị ọzọ dị ọkụ aka, dị ka mmiri ọkụ, ayọn e ji ede ákwà, ma ọ bụ ihe ọzọ. Ihe ahụ agbasaghị naanị ihe ndị dị n’ụlọ. Ọ gbasakwara ihe ndị dị n’ebe ndị ọzọ. Nke bụ́ eziokwu bụ na ka nwa ahụ na-eto, o nwere ike iji stoovu siwe nri. Ma, ọ ka kwesịkwara ịkpachara anya ka ọ ghara imetụ aka n’ebe dị ọkụ na stoovu ahụ. N’ihi ya, iwu ahụ e nyere ya mgbe ọ dị obere nwere ike ịgbanwe, ma ihe mere e ji nye ya iwu ahụ agaghị agbanwe.
Iwu nwere ike ịgbanwe, mana ihe mere e ji nye ya anaghị agbanwe agbanwe (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5)
GỊNỊ MERE O JI DỊ MKPA KA ANYỊ GHỌTA IHE MERE JEHOVA JI ENYE ANYỊ IWU?
6. (a) Gịnị ka Jehova ji Okwu ya nye anyị? (b) Olee otú Jehova si gosi na ọ na-akwanyere anyị ùgwù?
6 Jehova hụrụ anyị n’anya nke ukwuu. Ọ bụ ya mere o ji enye anyị iwu ka anyị ghara ịba ná nsogbu. (Jems 2:11) Ọ na-enyekwara anyị aka ịghọta otú o si eche echiche na ihe mere o ji enye anyị iwu ndị ahụ. Jehova enyeghị anyị iwu gbasara ihe niile. Ma, o ji Baịbụl nye anyị ntụziaka ga-enyere anyị aka ime mkpebi ndị dị mma ma na-eme ihe dị mma, ọ bụrụgodị n’ihe ndị a na-enyeghị iwu ọ bụla. Ihe mere na Jehova enyeghị anyị iwu gbasara ihe niile bụ na ọ chọrọ ịkwanyere anyị ùgwù. Ọ chọkwara ka anyị jiri aka anyị na-ekpebi ime ihe ga-egosi na anyị hụrụ ya n’anya, chọọkwa irubere ya isi.—Gal. 5:13.
7. Nye ihe atụ na-egosi uru ịghọta ihe mere Jehova ji nye iwu na-abara anyị. (Kọwaakwa foto.)
7 Olee uru ịghọta ihe mere Jehova ji nye iwu na-abara anyị? Chegodị banyere ihe atụ a. N’obodo ụfọdụ, a na-enwe ihe ndị dị n’akụkụ ụzọ na-egosi ndị na-anya ụgbọala ihe ha kwesịrị ime. Ọtụtụ n’ime ihe ndị ahụ na-eme ka ha mata iwu ndị ọ ga-abụ ha daa, a taa ha ahụhụ. Ụfọdụ n’ime ha nwere ike ime ka ha mata otú ha kwesịrị ịgbaru ọsọ ma ọ bụ ebe ha kwesịrị ịkwụsị. Ma, e nwekwara ndị nke na-eme ka ha mata nsogbu nwere ike ịdị n’ụzọ. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ime ka ha mata ebe ụzọ na-amị amị ma ọ bụ ebe anụmanụ nwere ike ịna-agafe n’okporo ụzọ. Ezigbo ọkwọ ụgbọala na-eji uche ya mata ebe ọ ga-akpachara anya ma ọ hụ ihe ndị ahụ dị n’akụkụ ụzọ. Ọ bụrụ na mmiri na-ezo ma ọ bụ na igirigi na-ada, ọkwọ ụgbọala ga-agbanwe otú o si anya ụgbọala ya ka ọ ghara ịba ná nsogbu. Ndị Kraịst na-eme ụdị ihe ahụ. Ha na-akpachara anya ka ha ghara ime ihe ọ bụla Baịbụl kwuru na ọ dịghị mma. Ha na-akpacharakwa anya ka ha ghara ime ma ọ bụ chee ihe ọ bụla nwere ike iwe Jehova iwe. Ịghọta otú Jehova si eche echiche ga-enyere ha aka ime ezigbo mkpebi.
Ọtụtụ ihe ndị dị n’akụkụ ụzọ na-agwa ndị ọkwọ ụgbọala nsogbu nwere ike ịdị n’ihu. Ịghọta otú Jehova si eche echiche ga-enyekwara anyị aka otú ahụ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7)
8. Dị ka e kwuru ná Ndị Rom 12:1, 2, olee uru ịmata ihe mere Chineke ji nye iwu na-abara anyị?
8 Olee ihe ọzọ mere Jehova enyeghị anyị iwu gbasara ihe niile? Ọ bụ n’ihi na ọ na-abara anyị ezigbo uru. Jehova ji ya akụziri anyị ka anyị gbalịa ghọta otú o si ele ihe anya. Anyị gụọ Baịbụl, anyị na-agbalị ịmụta ihe na ya ma chebara ya echiche nke ọma. Anyị na-ajụ onwe anyị ihe mere Jehova ji mee ka e dee ihe ahụ na Baịbụl nakwa otú ọ ga-esi baara anyị uru. Anyị na-esi otú ahụ amụta otú anyị ga-esi ‘jiri echiche anyị’ na-ejere Jehova ozi. Anyị na-achọpụtakwa “ihe bụ́ uche Chineke, nke dị mma, nke zuru okè, nke na-emekwa ya obi ụtọ.”—Gụọ Ndị Rom 12:1, 2.a
9. Olee uru ọzọ anyị na-erite ma anyị mee ihe anyị ma bụ́ echiche Chineke? (Ndị Hibru 5:13, 14)
9 Ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe anyị ma bụ́ echiche Chineke, ọ ga-eme ka anyị na-emekwu ka Jehova. Ebe ọ bụ na anyị na-aghọtakwu ihe dị Jehova mma na ihe na-adịghị ya mma, anyị ga na-emekwu ezigbo mkpebi, anyị na ya ana-adịkwu ná mma. (Gụọ Ndị Hibru 5:13, 14.) Ndị nne na nna na-enyekarị ụmụ ha ka dị obere ọtụtụ iwu ka ha nwee ike ime ihe dị mma ma ghara ime ihe na-adịghị mma. Ụmụaka nwere ike ịna-erube isi n’iwu ndị ahụ naanị maka na ha achọghị ka a taa ha ahụhụ. Ma, Jehova anaghị eme anyị otú ahụ maka na ọ ma na anyị etoola. Obi siri ya ike na anyị ga-eme mkpebi dabara n’uche ya. Anyị mee otú ahụ, anyị na-eme ka obi ya ṅụrịa nke ukwuu. —Ọma 147:11; Ilu 23:15, 26; 27:11.
OLEE OTÚ ANYỊ GA-ESI ACHỌPỤTA OTÚ JEHOVA SI ECHE ECHICHE?
10. Olee otú anyị ga-esi achọpụta ihe mere Jehova ji nye anyị iwu?
10 Anyị gụwa Baịbụl, anyị kwesịrị ịgbalị chọpụta ihe ndị ga-enyere anyị aka ịmata otú Jehova si eche echiche. Anyị nwekwara ike iche ihe mere Jehova ji nye anyị iwu ụfọdụ. Anyị ghọtakwuo ihe ndị mere Jehova ji nye anyị iwu, anyị ga na-aghọtakwu Jehova. Ma, ọ bụrụ na anyị chọrọ ịghọtakwu otú Jehova si eche echiche, anyị kwesịrị ịrịọ ya ka o nyere anyị aka, mụtakwa otú e si echebara ihe anyị gụrụ na Baịbụl echiche. (Ilu 2:10-12) Anyị nwere ike ịjụ onwe anyị ajụjụ ndị dị ka: ‘Gịnị mere Jehova ji nye iwu a? Ọ bụrụ na àgwà a adịghị Jehova mma, olee otú obi ga-adị ya ma m kpaa àgwà yiri ya? Gịnị ka m mụtara n’akụkọ a m gụrụ na Baịbụl? Oleekwa otú m ga-esi eme ya ná ndụ m?’ Ọ bụrụ na anyị aghọta ihe mere Jehova ji nye iwu ndị o nyere, ghọtakwa ihe akụkọ anyị gụrụ na Baịbụl na-akụziri anyị, anyị ga-emeli ezigbo mkpebi ga-eme ya obi ụtọ.
11. Mgbe Jizọs nọ n’elu ugwu na-akụzi ihe, olee otú o si kụziere anyị otú anyị ga-esi achọpụta ihe mere Jehova ji nye iwu? (Kọwaakwa foto.)
11 Mgbe Jizọs nọ n’elu ugwu na-akụzi ihe, ọ kụziiri anyị otú anyị ga-esi achọpụta ihe mere Jehova ji nye iwu. Anyị ga-eleba anya n’ihe atụ atọ. Na nke ọ bụla n’ime ha, Jizọs bu ụzọ kwuo iwu Jehova nyere, kwuzie ihe mere o ji nye ya. Anyị chebara ihe ndị ahụ Jizọs kwuru echiche, anyị ga-ahụ otú ha ga-esi enyere anyị aka ime ezigbo mkpebi taa.
Mgbe Jizọs na-akụzi ihe n’elu ugwu, o gosiri anyị otú anyị ga-esi achọpụta ihe mere Chineke ji nye iwu (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11)
12. Gịnị mere Jehova ji nye iwu e dere na Matiu 5:21, 22? (Kọwaakwa foto.)
12 Gụọ Matiu 5:21, 22. “Egbula mmadụ.” Gịnị mere Jehova ji nye iwu a? Jehova achọghị ka anyị kpọọ ndị ọzọ asị. Ọ chọghị ka anyị kwuo ma ọ bụ mee ihe ga-ewute ndị ọzọ. Ọ chọghịdị ka anyị chee ihe ọjọọ gbasara ha. Ihe Jizọs kwuru gosiri na e nwere ike mmadụ egbughị mmadụ, mana ọ bụrụ na ọ kpọrọ nwanne ya asị, o mebiela ihe mere e ji nye iwu ahụ. Ọ bụrụ na mmadụ “na-ewesa nwanne ya iwe,” ma ọ bụ na-agwa ya okwu ọjọọ, ọ ka ‘ga-aza Chineke ajụjụ.’ N’eziokwu, ọ bụ ihe ndị a na-eme ka mmadụ gbuo mmadụ.—1 Jọn 3:15.
13. Olee otú anyị nwere ike isi mee ihe e kwuru na Matiu 5:21, 22? (Kọwaakwa foto.)
13 Olee otú anyị ga-esi eme ihe e kwuru na Matiu 5:21, 22 taa? Anyị ekwesịghị iwesa mmadụ iwe ọkụ ma ọ bụ buoro ya iwe n’obi. (Lev. 19:18; Job 36:13) N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ime otú ahụ nwere ike ime ka anyị kpọọ mmadụ asị n’obi anyị, nke nwekwara ike ime ka anyị gwa ya okwu ọjọọ ma ọ bụ mee ya ihe ọjọọ. (Ilu 10:12) Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị na-ewesa mmadụ iwe, anyị nwere ike ịgwa ndị ọzọ ihe na-adịghị mma gbasara ya. Anyị nwedịrị ike ghagide onye ahụ ụgha. Ime otú ahụ nwere ike ime ka ndị ọzọ malite ịkpọ onye ahụ asị ma ọ bụkwanụ mesowe ya otú na-adịghị mma. (Ilu 20:19; 25:23) N’oge Jizọs kwuru ihe mere Jehova ji nye iwu gbasara ịkpọasị, e nweghị Ịntanet, ekwentị, ma ọ bụ kọmputa. Ma, ihe Jizọs kụziri gbasara iwu a na-egosi na anyị ekwesịghị iji ekwentị ma ọ bụ kọmputa na-ekwu ihe na-adịghị mma gbasara ndị ọzọ. N’ihi ya, ebe ọ bụ na anyị agaghị achọ igbu mmadụ, anyị ekwesịghị ikwu ma ọ bụ dee ihe ga-eme ka e lewe mmadụ anya ọjọọ.
(A ga-akọwa ya na paragraf nke 12 na nke 13)
14. Gịnị mere Chineke ji nye iwu e dere na Matiu 5:27, 28? (Kọwaakwa foto.)
14 Gụọ Matiu 5:27, 28. “Akwala iko.” Gịnị mere Jehova ji nye iwu a? Ihe Jehova kpọrọ asị abụghị naanị omume rụrụ arụ. Ọ kpọkwara echiche mmadụ na-eche nwere ike ime ka ọ kwaa iko asị. Jizọs kọwara na ọ bụrụ na nwoke lụrụ nwaanyị ana-ele nwaanyị ọzọ anya otú ga-eme ka ọ gụwa ya agụụ ka ya na ya nwee mmekọahụ, o meela mmehie. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ka anyị ghara iche gbasara omume rụrụ arụ. O nwekwara ike ịdị mkpa ka anyị gbaa ezigbo mbọ iji zere ya. (Mat. 5:29, 30) Ihe a gbasakwara Ndị Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye.
15. Olee otú anyị nwere ike isi eme ihe e kwuru na Matiu 5:27, 28 taa? (Kọwaakwa foto.)
15 Olee otú anyị ga-esi eme ihe e kwuru na Matiu 5:27, 28 taa? Anyị ekwesịghị iche gbasara omume rụrụ arụ. (2 Sam. 11:2-4; Job 31:1-3) Onye Kraịst ọ bụla ma nke a na-akọ anaghị ele ụdị ndị gba ọtọ ọ bụla. Ọ naghị eche na ebe ọ bụ na ihe o mere bụ naanị ile ndị na-eme omume rụrụ arụ, e nweghị ihe ọjọọ ọ bụla o mere. Anyị adịghịkwa ka ụfọdụ ndị nọ n’ụwa taa kweere na ọ bụghị ụdị ile ndị gba ọtọ niile dị njọ. N’oge Jizọs, e nweghị ekwentị na kọmputa, fim ma ọ bụ foto. N’agbanyeghị ya, ihe Jizọs kụziri mere ka anyị mata otú Jehova si ele ihe ndị e nwere ike ịna-egosi na kọmputa ma ọ bụ na fim anya. Ọ na-eme ka anyị ghọta na obi agatụdịghị adị Jehova ụtọ ma anyị zigara mmadụ foto ma ọ bụ vidio na-egosi omume rụrụ arụ ma ọ bụkwanụ jiri ekwentị gwawa mmadụ gbasara omume rụrụ arụ ma ọ bụ dee ya edee zigara ya. Irube isi n’ihe a Baịbụl kwuru ga-enyere mmadụ aka ka ọ ghara ịghọ di ya ma ọ bụ nwunye ya aghụghọ. (Mal. 2:15) Ọ na-enyekwara Ndị Kraịst niile aka ka ha ghara ime ihe ọ bụla ga-eme ka ha kwaa iko, ma hà alụọla ma ọ bụ na ha alụbeghị.—Ilu 5:3-14.
(A ga-akọwa ya na paragraf nke 14 na nke 15)
16. Gịnị mere e ji nye iwu dị na Matiu 5:43, 44? (Kọwaakwa foto.)
16 Gụọ Matiu 5:43, 44. “Hụ onye agbata obi gị n’anya.” Gịnị mere Jehova ji nye iwu a? Ọ chọrọ ka anyị were mmadụ niile ka ndị agbata obi anyị ma hụ ha n’anya. Ọ dị mwute na n’oge Jizọs, ndị Juu chere na iwu a pụtara na naanị ndị ha ga-ahụ n’anya bụ ndị Juu ibe ha nakwa na ha nwere ike ịkpọ ndị iro ha asị. Ma, Jizọs ma na ọ bụghị ihe mere e ji nye iwu ahụ. Ọ ma na Nna ya nke eluigwe chọrọ ka anyị hụ mmadụ niile n’anya n’agbanyeghị mba ma ọ bụ obodo ha si.—Mat. 5:45-48.
17. Olee uru ime ihe e kwuru na Matiu 5:43, 44 na-abara anyị? (Kọwaakwa foto.)
17 Olee otú anyị ga-esi eme ihe e kwuru na Matiu 5:43, 44 taa? Anyị hụ ndị agbata obi anyị n’anya, ọ ga-eme ka anyị ghara itinye aka n’agha ma ọ bụkwanụ n’esemokwu ụwa. (Aịza. 2:4; Maị. 4:3) Ọ ga-emekwa ka anyị na-emere ndị si n’obodo ọzọ ma ọ bụ ndị na-ekpe okpukpe ọzọ ihe ọma. (Ọrụ 10:34, 35) Ọ ga-emekwa ka anyị na-agbaghara ndị mere ihe wutere ndị anyị hụrụ n’anya ma ọ bụ anyịnwa.—Mat. 18:21, 22; Mak 11:25; Luk 17:3, 4.
(A ga-akọwa ya na paragraf nke 16 na nke 17)
KPEBISIE IKE IJI IHE NDỊ Ị MỤTARA N’OTÚ JEHOVA SI ECHE ECHICHE NA-EBI NDỤ
18. (a) Gịnị ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime? (b) Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu na-eso nke a?
18 Obi dị anyị ezigbo ụtọ na Jehova enyeghị anyị ọtụtụ iwu. Ọ chọrọ ka anyị jiri ihe ndị anyị mụtara na Baịbụl na-eme mkpebi dị mma mgbe niile. (1 Kọr. 14:20) N’ihi ya, anyị mewe mkpebi, ka anyị kpebisie ike ‘ịna-aghọta ihe Jehova chọrọ ka anyị na-eme.’ (Efe. 5:17) Anyị chọrọ ịna-eme ezigbo mkpebi n’ihi na anyị hụrụ Jehova n’anya ma chọọ ịna-eme ya obi ụtọ, ọ bụghị n’ihi na anyị achọghị ka ọ taa anyị ahụhụ. Ma, e nwere ihe ọzọ Jehova nyere anyị ga-enyere anyị aka ime ezigbo mkpebi. Ọ bụ akọnuche anyị. Anyị ga-amụ banyere ya n’isiokwu na-eso nke a.
ABỤ NKE 95 Ìhè Na-enwusikwu Ike
a E nwere ọtụtụ ihe Jehova na-enyeghị anyị iwu gbasara ha. N’ụdị ihe ndị ahụ, anyị kwesịrị iche gbasara ihe dị iche iche Baịbụl kwuru ma jiri ihe anyị mụtara na ha mee ezigbo mkpebi. Jehova mere ka anyị nwee ike ịna-eche echiche ka o nyere anyị aka ime mkpebi ga-adị ya mma, nke ọ ga-agọzikwa. Ọ bụ ihe ọtụtụ ndị Juu ghọrọ Ndị Kraịst n’oge ndịozi mụtara ime. Tupu ha aghọọ Ndị Kraịst, ha na-eso iwu dị iche iche ndị isi okpukpe ha meere ha.