JUN 29 RUO JULAỊ 5, 2026
ABỤ NKE 131 “Ihe Chineke Kekọtara”
Na-eme Ka Gị na Di Gị Ma Ọ Bụ Nwunye Gị Na-adịkwu ná Mma
“E nwere enyi hụrụ enyi ya n’anya karịa nwanne ya.”—ILU 18:24.
IHE A GA-AMỤ
Ihe ga-eme ka di na nwunye na-enwe obi ụtọ bụ ma ha bụrụ ezigbo enyi, hụkwa Jehova n’anya.
1. Gịnị mere anyị ga-eji kwuo na ezigbo ndị enyi bụ onyinye si n’aka Jehova?
EZIGBO ndị enyi bụ onyinye si n’aka Jehova. (Jems 1:17) Ha hụrụ Chineke n’anya, hụkwa anyịnwa n’anya. Obi na-adị ha ụtọ ma anyị na-aṅụrị ọṅụ. Ha na-akasi anyị obi mgbe obi na-adịghị anyị mma, na-enyekwa anyị ezigbo ndụmọdụ mgbe ọ dị anyị mkpa. Ha na-akwado anyị mgbe niile, anyị tụkwasịkwara ha obi. Ụdị ndị enyi a “na-eme ka obi dị mmadụ ụtọ.”—Ilu 27:9.
2. Gịnị mere o ji dị mkpa ka ndị di na nwunye na-eme ka ha na-abụkwu ezigbo enyi? (Matiu 19:6)
2 Nwoke na nwunye ya kwesịrị ịbụ ezigbo ndị enyi. Ha ekwesịghị iji adịm ná mma ha egwu egwu. Ha kwesịrị ịna-agbalịsi ike ka ha na-adịkwu ná mma. Ọ bụrụ na ha eleghara ya anya, owu nwere ike ibido mawa ha, obi ana-ajọ ha njọ, ma ọ bụdị iwe ana-ewe ha. Ma, ọ bụrụ na ha ana-agba mbọ ka ha na-adịkwu ná mma, ha abụọ nwere ike ịdị ná mma karịa otú mmadụ abụọ ọ bụla ga-adịli. (Gụọ Matiu 19:6.) N’isiokwu a, anyị ga-ahụ otú ndị di na nwunye ga-esi eme ka ha na-adịkwu ná mma. Ma, ka anyị burugodị ụzọ leba anya n’otú Ndị Kraịst na-alụbeghị di na nwunye ga-esi achọta onye ga-abụ ezigbo enyi ha ná ndụ ha niile.
OTÚ Ị GA-ESI ACHỌTA ONYE GA-ABỤ ENYI GỊ NÁ NDỤ GỊ NIILE
3-4. Gịnị ga-enyere mmadụ aka ịchọta ezigbo di ma ọ bụ nwunye? (Ilu 18:22)
3 Tupu anyị ekpebie ihe ọ bụla dị mkpa, anyị kwesịrị ibu ụzọ chee uru na ọghọm nwere ike ịdị na ya nakwa ihe ndị o nwere ike ịkpata. Ihe anyị kpebiri nwere ike ịgbanwe ihe ná ndụ anyị, ma ọ̀ bụ nke ọma ma ọ̀ bụ nke ọjọọ. N’ihi ya, anyị kwesịrị iche echiche nke ọma tupu anyị ekpebie ihe ndị dị ezigbo mkpa.
4 Ịhọrọ onye ga-abụ enyi anyị ná ndụ anyị niile, ya bụ, onye anyị ga-alụ, bụ mkpebi dị ezigbo mkpa ná ndụ anyị. Ebe ọ bụ Jehova malitere alụmdi na nwunye, anyị kwesịrị isi n’aka ya mata ihe ndị anyị ga-echebara echiche tupu anyị ahọrọ onye anyị ga-alụ. Ọ chọrọ ka nwoke lụta ezigbo nwaanyị, chọọkwa ka nwaanyị lụta ezigbo di. Jehova ma ihe ga-akacha abara anyị uru mgbe niile. (Gụọ Ilu 18:22; Aịza. 48:17, 18) Ihe ndị dị na Baịbụl ga-enyeliri Onye Kraịst aka ịchọta ezigbo di ma ọ bụ nwunye.
5. Gịnị mere o ji dị mkpa ka onye anyị ga-ahọrọ ịlụ bụrụ Onye Kraịst e mere baptizim?
5 Anyị mee baptizim, anyị na-aghọ ndị enyi Chineke. (Ọma 25:14) Ọ bụrụ na ị ga-achọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye, i kwesịrị isi ná ndị enyi Jehova họrọ onye ị ga-alụ. (1 Kọr. 7:39) I mee otú ahụ, ị na-egosi na i ji iwu Jehova kpọrọ ihe. Ị ga-ewere onye ị lụrụ ka onyinye si n’aka ya. (Ilu 19:14) Ị ga-ezerekwa nsogbu ịlụ ‘onye na-ekweghị ekwe’ na-akpata. (2 Kọr. 6:14) Ọ gaghị adị mma ka gị na onye na-ekweghị ekwe kpawa n’ihi na ị na-eche na ọ ga-esiri gị ike ịchọta Onye Kraịst ị ga-alụ. Ọ gaghịkwa adị mma ka i chewe na gị na onye na-ekweghị ekwe kpawa, o nwere ike imecha ghọọ Onye Kraịst.
6-7. Olee ajụjụ ndị i kwesịrị ịjụ onwe gị n’oge gị na mmadụ na-akpa maka ọlụlụ?
6 Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụghị Onye Kraịst ọ bụla e mere baptizim ga-abụli ezigbo di ma ọ bụ nwunye. I kwesịrị ịsa anya ná mmiri ma ị họrọwa onye ị ga-alụ. Jụọ onwe gị, sị: ‘Olee otú o si emeso ndị ezinụlọ ya? Ọ̀ na-echebara ndị ọzọ echiche ma na-asọpụrụ ha? Olee ndị bụ́ ndị enyi ya? Ya na mmadụ nwee nghọtahie, gịnị ka ọ na-eme? Ọ̀ na-esi ọnwụ ka e mee ihe o kwuru, ka ọ̀ na-ekweta ka e mee ihe onye ọzọ kwuru ma ọ bụrụ na e nweghị iwu Baịbụl a dara? Olee otú o si ele ego anya?’a
7 I nwekwara ike ịjụ onwe gị, sị: ‘Enyi m a ò ji obi ya niile hụ Jehova n’anya? Ọ̀ na-agbalịsi ike iyiri “àgwà ọhụrụ”? Ọ̀ ga-enyere m aka ịna-efekwu Jehova nke ọma? Ihe ndị m kpebiri ime n’ozi Jehova hà bụ ihe ndị yanwa kpebiri? Mụ na ya ànyị ga-abụli ezigbo enyi, ọ bụghị naanị ịdị ná mma?’ (Kọl. 3:9, 10) Ọ bụrụ na ị bụ nwanna nwaanyị, jụọ onwe gị, sị: ‘Nwanna a mụ na ya na-akpa ọ̀ ga-abụli ezigbo enyi m na ezigbo onyeisi ezinụlọ?’ (1 Kọr. 11:3) Ọ bụrụ na ị bụ nwanna nwoke, jụọ onwe gị, sị: ‘Nwanna nwaanyị a mụ na ya na-akpa ọ̀ dị njikere iwere m ka onyeisi ya n’agbanyeghị ihe ndị m na-anaghị emeta?’ Ịza ajụjụ ndị a na-ewe oge. N’ihi ya, jiri oge ahụ unu na-akpa mata onye ị chọrọ ịlụ nke ọma.
8-9. Gịnị ga-enyere onye ya na mmadụ na-akpa maka ọlụlụ aka ime ezigbo mkpebi? (Kọwaakwa foto.)
8 Gị na mmadụ kpawa, ị ga-aka eme ezigbo mkpebi ma ị gbalịa chọpụta ụdị onye ọ bụ. Chọpụta otú ndị ọzọ si ele ya anya. I nwere ike ịjụ ndị ọzọ otú o si akpa àgwà na otú e si ele ya anya. Dị ka ihe atụ, à ma ya ka onye dị umeala n’obi, onye dị obiọma, na onye na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị? E nwere otu nwanna nwaanyị si French Gịyana aha ya bụ Sarah, aha di ya abụrụ Daniel. Ọ sịrị: “M jụtara ndị ọzọ gbasara di m. M jụrụ nwanna ya na ya na-asụkọ ụzọ, ya na ya bikwa n’otu ụlọ, jụọkwa otu okenye n’ọgbakọ ha, ndị enyi ya bụ́kwa ndị enyi m, na ụmụnna nwaanyị ndị nọ n’ọgbakọ ha.” I nwekwara ike iji akọ jụọ onye gị na ya na-akpa ma è nwere ihe mere ná ndụ ya n’oge gara aga ma ọ bụ ihe na-eme ná ndụ ya ugbu a i kwesịrị ịma. Ịjụ ya ihe a dị mkpa n’ihi na e nwere ihe ụfọdụ na-akpatara di na nwunye ezigbo esemokwu ma ha lụchaa.
9 E nwee ihe na-eme gị obi abụọ gbasara onye gị na ya na-akpa ma ọ bụ ihe na-adịghị mma ndị enyi gị ma nke a na-akọ n’ọgbakọ gwara gị gbasara ya, elegharala ya anya. Ọ ga-enyere gị aka ikpebi ma ùnu ka ga na-akpa, ka ùnu ga-akwụsị ịkpa.b Ka anyị kwuzie gbasara ndị di na nwunye.
Mgbe gị na mmadụ na-akpa maka ọlụlụ, gbalịa mata ụdị onye ọ bụ n’eziokwu (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8 na nke 9)
WEPỤTANỤ OGE NA-ANỌKỌ KA UNU DỊKWUO NÁ MMA
10. Gịnị mere di na nwunye ji kwesị ịna-ewepụta oge ha ga-eji na-anọrị?
10 Di na nwunye ga na-adịkwu ná mma ma ha na-ewepụta oge na-anọkọ ọ bụrụgodị na o yiri ka ha anaghị enwe ohere. Ọ ga-eme ka ha nwee ike ịna-ekwurịta ihe ndị mere n’ụbọchị, ihe ndị ha chere, nakwa otú obi dị ha, na-egosi ibe ha ịhụnanya, na-egwukọkwa egwu.
11. Gịnị nwere ike ime ka di na nwunye gharazie ịdị ná mma?
11 Di na nwunye bụrụ ezigbo enyi, ọ na-akara ha mma ịnọkọ kama ịnọ iche iche. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụghị mgbe niile ka ha ga na-anọkọ. Ma, ha ịnọ iche iche ruo ogologo oge nwere ike ịkpata nsogbu. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị anarala ọrụ mere ka ha hapụ ndị ezinụlọ ha gaa biri n’obodo ọzọ ruo ogologo oge. Ọ bụ eziokwu na o nwere ike ime ka ha nwetakwuo ego, ma, ha na ibe ha ịnọ iche iche ruo ogologo oge nwere ike ime ka ha gharazie ịdị ná mma.
12-13. (a) Gịnị ka ụfọdụ ndị di na nwunye merela ka ha nwee ike ịna-anọkọ? (Kọwaakwa foto.) (b) Olee otú adịm ná mma gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị dịruru gị ná mkpa? (Kwuo ihe dị n’igbe isiokwu ya bụ “Otú I Kwesịrị Isi Were Di Gị Ma Ọ Bụ Nwunye Gị.”)
12 Legodị ihe ụfọdụ ndị di na nwunye mere ka ha nwee ike ịna-anọkọ. Otu nwanna nwaanyị bi na Gụam aha ya bụ Leah sịrị: “Ọ na-amasị mụ na di m imekọ ọtụtụ ihe ọnụ. Ọtụtụ mgbe, anyị abụọ na-eso aga nnọkọ ma ọ bụ mkpapụ.” Nwanna nwaanyị ọzọ bi n’Amerịka aha ya bụ Roxanne sịrị: “N’ihi mere nke a mere nke ọzọ, anyị achọpụtala na anyị kwesịrị ịhazi mgbe anyị ga-anọkọ otú ahụ anyị si ahazi ihe ndị ọzọ dị mkpa.” (I nwere ike ịtụle Emọs 3:3.) Otu nwanna bi na Frans aha ya bụ Damien sịrị: “Anyị abụọ amụtala inwe mmasị n’ihe na-amasị onye nke ọzọ, ya ana-atọkwa anyị ụtọ.” (Mat. 7:12) Otu nwanna nwaanyị bikwa n’Amerịka aha ya bụ Katie sịrị: “Mgbe ụfọdụ, anyị na-edowe ekwentị anyị n’ebe ọzọ ka ha ghara ime ka uche anyị pụọ n’ebe ibe anyị nọ.”
13 Ihe kacha mkpa bụ ka di na nwunye na-emekọ ihe gbasara ofufe Jehova ọnụ. Otu nwanna nwaanyị bi na Frans aha ya bụ Myriam sịrị: “Ihe mbụ anyị na-eme n’ụbọchị bụ ịgụ Baịbụl, anyị ekwurịtazie ihe masịrị anyị n’ihe anyị gụrụ nakwa otú anyị ga-esi eme ya ná ndụ anyị. Oge ahụ na-atọgbu m atọgbu.” Ọ sịkwara: “Ihe ọzọ na-atọ m ụtọ bụ mgbe anyị na-ekpekọ ekpere ọnụ, mụ ahụ otú di m hụruru Jehova n’anya.” Nwanna Nwaanyị Katie anyị kwuburu okwu ya sịrị: “Oge anyị ji anọkọ na-akacha amasị anyị bụ ma anyị na-arụ n’ozi ọma. Mụ na di m na-adịkwu ná mma ma anyị nụ ka onye nke ọ bụla na-ekwu gbasara Jehova. Ọ na-emekwa ka anyị na-amụta ihe ọhụrụ gbasara ibe anyị.”—Ilu 27:17.
Na-emenụ ka unu abụọ na-adịkwu ná mma. Otú unu ga-esi eme ya bụ unu iwepụta oge na-anọkọ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12 na nke 13)
E NWEE NSOGBU, GBAKỌỌNỤ AKA ỌNỤ DOZIE YA
14-15. Gịnị mere di na nwunye ji kwesị ịna-agbalịsi ike ka ha dozie nsogbu ndị ha nwere? Nye ihe atụ.
14 N’ihi ezughị okè, di na nwunye ga-enwe nsogbu. Baịbụl kwuru hoo haa na di na nwunye “ga-enwe ọtụtụ nsogbu.” (1 Kọr. 7:28) Ihe e ji kọwaa amaokwu a kwuru na ihe a Baịbụl kwuru pụtara nsogbu na ọnwụnwa ndị nwere ike ịbịara di na nwunye. Ụdị nsogbu ahụ bịa, gịnị mere unu ga-eji gbalịsie ike dozie ya ma ka bụrụkwa ezigbo enyi?
15 Chegodị banyere ihe atụ a. Ọ bụrụ na ụlọ ma ọ bụ ihe ọzọ bara uru emebie, ndị nwe ya na-ekpebikarị ịrụzi ya. Ha nwere ike iwepụta ego buru ibu nakwa ihe ndị ọzọ rụzie ya. O nwekwara ike iwe ọtụtụ afọ. Maka gịnị? Ọ bụ maka na ha weere ya ka ihe bara ezigbo uru. Alụmdi na nwunye niile bakwara ezigbo uru otú ahụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na di na nwunye ndị bụ́ ezigbo enyi na-enwe nghọtahie mgbe ụfọdụ. Mana, ụlọ ma ọ bụ ihe ọzọ mebie, a ga-arụzili ya. Otú ahụ ka di na nwunye chọrọ itisa nwere ike ịdịwakwa ná mma otú ha dịbu. O nwere ike iwe oge, a ga-agbakwara ya mbọ. Ma, obi ga-adị Jehova ụtọ ịhụ ka di na nwunye na-agbalịsi ike ka ha na-adịkwu ná mma ma ghara itisa. (Mal. 2:16) Ha mee otú ahụ, ha na-egosi na ha hụrụ ibe ha n’anya, na-akwanyekwara ibe ha ùgwù. Nke kadị mkpa bụ na ọ ga-egosi na ha hụrụ Jehova, onye malitere alụmdi na nwunye, n’anya, na-akwanyekwara ya ùgwù.
16. Dị ka e kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 13:4-8a, gịnị nwere ike inyere di na nwunye nwere ezigbo nsogbu aka? (Kọwaa foto, kwuokwa ihe dị n’igbe isiokwu ya bụ “Ihe Ga-enyere Unu Aka Ịna-adịkwu ná Mma.”)
16 Gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị nwee nsogbu, ya adịla unu ngwa ngwa itisa. (1 Kọr. 7:10, 11) Kama jụọ onwe gị, sị: ‘È nwere ihe ndị m kwesịrị imekwu ka anyị dịkwuo ná mma?’ Mụọ ihe Baịbụl kwuru banyere igosi ịhụnanya, jụọkwa onwe gị ma è nwere otú ị ga-esi na-akpakwu àgwà ndị ahụ e kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 13:4-8a. (Gụọ ya.) Kama ịchọwa otú ị ga-esi hapụ di gị ma ọ bụ nwunye gị, gbalịa mata ihe ị ga-eme ka unu dịwakwa ná mma. Lekwasị anya n’ihe gịnwa ga-eme ka unu dịwakwa ná mma. Kpee ekpere rịọ Jehova ka o duzie gị. Chọta isiokwu nakwa vidio ndị nwere ike inyere unu aka ịma ihe unu kwesịrị ime. Gwa ndị okenye ma ọ bụ ụmụnna ndị ọzọ bụ́ di na nwunye na-eme ihe Baịbụl kwuru ka ha nyere unu aka. Baịbụl kwuru na alụmdi na nwunye dị ka ụdọ e ji “eriri atọ” tụọ. Ọ bụkwa Jehova bụ onye nke atọ na ya. N’ihi ya, unu mee ihe ọ chọrọ, unu ga na-adịkwu ná mma.—Ekli. 4:12.
Gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị nwee nsogbu, gbalịsienụ ike ka unu na-adịkwu ná mma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16)
17. Gịnị ga-eme ka ndị chọrọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye na ndị nke lụrụla alụ na-enwe obi ụtọ?
17 Jehova chọrọ ka ndị ohu ya niile na-enwe obi ụtọ, ma ndị na-achọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye ma ndị lụrụla alụ. N’ihi ya, ọ bụrụ na ị lụbeghị ma ya abụrụ na ị chọrọ ịlụ, saa anya ná mmiri họrọ onye ị ga-alụ. Ọ bụrụ na ị lụọla, na-agbalịsi ike ka unu na-adịkwu ná mma. Unu nwee nsogbu, gbalịsienụ ike dozie ya, ma tụkwasị Jehova obi ka o nyere unu aka. Gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị ị hụrụ n’anya mee ihe ndị a, unu ‘ga na-ekpori ndụ.’—Ekli. 9:9.
ABỤ NKE 132 Anyị Bụzi Di na Nwunye
a Ajụjụ ndị a a jụrụ gbasara ma nwoke ma nwaanyị.
b Ị chọọ ịhụ aro ndị ọzọ gbasara otú ị ga-esi matakwuo onye gị na ya na-akpa, gụọ isiokwu bụ́ “Otú Unu Ga-esi Eme Ka E Too Jehova Mgbe Unu Na-akpa Maka Ọlụlụ.” Ọ gbara n’Ụlọ Nche Mee 2024, n’isiokwu nta bụ́ “Matanụ Ibe Unu Nke Ọma.”