Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w26 Eprel p. 20-25
  • Mụta Ihe n’Aka “Chineke nke Na-akasi Ndị Mmadụ Obi”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mụta Ihe n’Aka “Chineke nke Na-akasi Ndị Mmadụ Obi”
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2026
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IHE BAỊBỤL KWURU GBASARA NKASI OBI
  • OTÚ ANYỊ GA-ESI NA-AKASI NDỊ ỌZỌ OBI
  • IHE Ị GA-EME MGBE Ị CHỌRỌ KA A KASIE GỊ OBI
  • Ndokwa E Mere Maka Ịkasi Ndị Nọ na Betel Obi
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2023
  • E Nweghị Mgbe Anyị Nọ Naanị Anyị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • “Ịkasi Ndị Niile Na-eru Uju Obi”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Ịkasi Ndị E Metọrọ Mgbe Ha Bụ Ụmụaka Obi
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2019
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2026
w26 Eprel p. 20-25

JUN 22 RUO 28, 2026

ABỤ NKE 90 Ka Anyị Na-agbarịta Ibe Anyị Ume

Mụta Ihe n’Aka “Chineke nke Na-akasi Ndị Mmadụ Obi”

‘Ka anyị si otú ahụ Chineke si akasi anyị obi kasie ndị ụdị ọnwụnwa ọ bụla bịaara obi.’​—2 KỌR. 1:4.

IHE A GA-AMỤ

Anyị ga-amụ otú Jehova si akasi ndị mmadụ obi na otú ndị ọzọ si na-eme ka ya. Ọ ga-enyere anyị aka ịmata otú anyị ga-esi na-akasi ibe anyị obi.

1. Gịnị mere anyị ji kwesị ịkasi ndị ọzọ obi?

“ỌNWỤNWA dị iche iche” na-abịara anyị niile. N’ihi ya, e nwere mgbe ụfọdụ anyị ga-achọ ka a kasie anyị obi ma gbaa anyị ume. (1 Pita 1:6) Obi na-adị anyị ụtọ ma ndị ọzọ kasie anyị obi. N’ihi ya, anyị ekwesịghị igbu oge ịkasi ndị nsogbu bịaara obi. (Mat. 7:12) Jehova bụ “Chineke nke na-akasi ndị mmadụ obi n’ụdị ọnọdụ niile ha nọ.” Ọ na-egosi anyị otú anyị ga-esi ‘na-akasi ndị ụdị ọnwụnwa ọ bụla bịaara obi.’ Anyị ga-emeli ka ya ma anyị ‘na-akasi ibe anyị obi.’ (2 Kọr. 1:3, 4; 1 Tesa. 4:18) Anyị na-akasi ụmụnna anyị obi n’ihi na anyị hụrụ ha n’anya, ọ bụghị ka anyị mezuo iwu. N’isiokwu a, anyị ga-amụ (1) ihe Baịbụl kwuru gbasara nkasi obi, (2) otú anyị ga-esi na-akasi ndị ọzọ obi, na (3) ihe anyị ga-eme mgbe anyị chọrọ ka a kasie anyị obi.

IHE BAỊBỤL KWURU GBASARA NKASI OBI

2. Na Baịbụl, olee ihe dị iche iche “nkasi obi” nwere ike ịpụta?

2 Na Baịbụl, okwu Grik a sụgharịrị “nkasi obi” nwere ike ịpụta ihe dị iche iche. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịpụta ikwu ihe ga-eme ka obi dị mmadụ mma ma ọ bụ ịgba ya ume ka o mee ihe o kwesịrị ime. (Rom 12:8) E kwuo ya otú ndị Grik si ekwu ya, ọ pụtara “ịkpọta mmadụ ka ọ bịa n’akụkụ onye ọzọ nyere ya aka.” N’ihi ya, anyị nwere ike iche gbasara onye gbataara enyi ya ọsọ enyemaka n’egbughị oge. Mmadụ nwere ike isi n’ụzọ dị iche iche kasie enyi ya obi. Ma, ọ na-agbalịsi ike mgbe niile ka obi dị enyi ya mma.

3. Olee otú Banabas si kasie ndị ọzọ obi? (Kọwaakwa foto.)

3 Ka anyị kwuo banyere otu onye Baịbụl kọrọ akụkọ ya. Aha ya bụ Josef. Ọ na-akasi ndị ọzọ obi ma na-enyere ha aka. Ọ bụ ya mere ndịozi ji kpọwa ya Banabas, nke pụtara “Nwa Nkasi Obi.” (Ọrụ 4:36) Otú aha ahụ si daba adaba mere na e nweghịzi mgbe ọzọ Baịbụl kpọrọ ya Josef. Ọtụtụ mgbe, Banabas mere ihe dabara n’aha ya ahụ. Ọ gbataara ụmụnna ya ọsọ enyemaka mgbe e kwesịrị inyere ha aka. Dị ka ihe atụ, n’oge na-adịghị anya Sọl ghọchara Onye Kraịst, ọ gara Jeruselem, chọọkwa ka ya na Ndị Kraịst nọ ebe ahụ nọkọọ. Ha nọ na-atụ ya ụjọ n’ihi na ha ma na ọ kpagbuola ọtụtụ Ndị Kraịst. Ma, Banabas tụkwasịrị Sọl obi, meekwa ka ndịozi mata onye ọ bụ.​—Ọrụ 9:26-28.

Ebe Banabas kpọ Sọl na-abịa ka o gosi ya ụfọdụ n’ime ndịozi n’ụlọ otu n’ime ha. Ebe ndịozi ahụ na-ele Pọl anya ka ọ na-abịa izute ha, ya eju ha anya.

Banabas mere ihe dabara n’aha ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 3)


OTÚ ANYỊ GA-ESI NA-AKASI NDỊ ỌZỌ OBI

4. Olee otu n’ime ụzọ ndị kacha mma ị ga-esi kasie ndị ọzọ obi? (Ndị Rom 1:11, 12)

4 Gbalịa gaa leta ha. Jehova na-eji ndị ohu ya akasi ndị ọzọ obi. Dị ka ihe atụ, mgbe ike ụwa gwụrụ Ịlaịja onye amụma, Jehova ji otu mmụọ ozi kasie ya obi. (1 Eze 19:4-7) Pọl onyeozi chọkwara ịga leta ụmụnna ya ka ọ gbaa ha ume. (Gụọ Ndị Rom 1:11, 12.) Ị gaa ileta mmadụ, wepụta oge ga-ezuru gị ịkasi ya obi. (1 Kọr. 16:7) Ma, ọ bụrụ na ị gaghị agali leta onye ihe siiri ike, i nwere ike ịkpọ ya n’ekwentị, degara ya akwụkwọ ozi, ma ọ bụ zigara ya ozi n’ekwentị iji kasie ya obi. Ị̀ ga-ekwe ka Jehova jiri gị kasie ndị ọzọ obi?

5. Olee nsogbu ndị anyị nwere ike ịtụ anya ha?

5 Ka ihe na-esikwu ike n’oge ikpeazụ a, anyị kwesịrị ịtụ anya na ọ ga-esikwuru anyị ike ịna-akasi ụmụnna anyị obi ihu na ihu. Mgbe a tụrụ Pọl mkpọrọ na Rom, Onesịfọrọs si Efesọs gaa chọọ ya n’agbanyeghị na o nwere ike ime ka a tụọkwa yanwa mkpọrọ ma ọ bụdị gbuo ya. (2 Tim. 1:16-18) Ụmụnna anyị nọ na Rọshịa emeela ụdị ihe ahụ mgbe a na-akpagbu ụmụnna ha maka ihe ha kweere. A kpọpụ nwanna ụlọikpe, ụmụnna na-abịa ebe ahụ n’agbanyeghị na o nwere ike ime ka a nwụchiekwa hanwa. Gịnị ka ị ga-eme ka i nwee ike ijikere ịkasi ụmụnna gị obi? I nwere ike ịmụ otú ndị ohu Jehova ma n’oge a ma n’oge ochie si kasie ibe ha obi nakwa ihe ha mere iji na-enwe obi ụtọ n’agbanyeghị na a na-akpagbu ha.

6. Olee otú anyị ga-esi eme ka Jehova mgbe anyị na-akasi ndị ọzọ obi? (Kọwaakwa foto.)

6 Na-ege ha ntị. Mgbe Ịlaịja onye amụma chọpụtara na e nwere ike igbu ya, ọ kọọrọ Jehova otú ọ dị ya n’obi. Jehova gere ya ntị ka ọ na-akọ ihe na-echegbu ya n’agbanyeghị na ọ ma ihe ndị ahụ. O weturu obi gee Ịlaịja ntị ka ọ na-ekwughachi ihe o kwurula. (1 Eze 19:9, 10, 14) Habakọk onye amụma gwara Jehova otú obi dị ya gbasara ahụhụ na ihe ọjọọ ndị ọ na-ahụ. Jehova weturu obi gee ya ntị ma ghara iwesa ya iwe mgbe ọ na-ajụ ya ihe mere o ji kwe ka ihe ọjọọ na-eme. (Hab. 1:2, 3) Taa, Jehova na-ege ntị n’ekpere anyị n’agbanyeghị na ọ ma ihe bụ́ mkpa anyị. Anyị ga-emeli ka Jehova ma anyị na-ege ụmụnna anyị ntị nke ọma ma na-akwanyere ha ùgwù mgbe ha na-ekwu obi ha. Ha kwuwe okwu, anyị kwesịrị ‘ịna-anụ ihe ngwa ngwa.’ Anyị ekwesịghị ịnara ha okwu n’ọnụ ma ọ bụ wewe iwe ọ bụrụgodị na ha na-ekwu ihe nwere ike iwe anyị iwe ma ọ bụ na-ekwughachi ihe ha kwurula.​—Jems 1:19; Ekli. 7:9.

Ebe otu nwanna nwaanyị weturu obi na-ege nwanna nwaanyị ọzọ ihe na-enye nsogbu n’obi ntị ruo n’abalị ka ọ na-ekwu otú obi dị ya.

Na-eme ka Jehova. Otú ị ga-esi eme ya bụ ịna-ege ụmụnna gị ntị nke ọma ma ha na-ekwu okwu (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6)


7. Olee otú anyị ga-esi achọpụta ihe bụ́ mkpa onye nọ ná nsogbu?

7 Chọpụta ihe bụ́ mkpa mmadụ. Jehova na-enyocha obi. Ma, anyịnwa agaghị emeli ya. N’ihi ya, naanị otú anyị ga-esi amata ihe onye nọ ná nsogbu chọrọ bụ ige ya ntị nke ọma. Echela na ị ma mkpa ya maka na ị ma ihe ị ga-achọ ka e meere gị ma ọ bụrụ gị ka nsogbu ahụ bịaara. Anyị niile dị iche iche. N’ihi ya, wepụta oge gee onye ahụ ntị nke ọma, jirikwa akọ jụọ ya ajụjụ ndị ga-enyere gị aka ịmata ihe dị ya n’obi.​—Ilu 20:5.

8. Olee otú Jizọs si kasie Mata na Meri obi mgbe Lazarọs nwụrụ? (Kọwaakwa foto.)

8 Chegodị otú Jizọs si kasie Mata na Meri obi mgbe Lazarọs nwanne ha nwụrụ. Ha abụọ nọ na-eru uju ọnwụ nwanne ha. Ma, otú Jizọs si kasie Mata obi dị iche n’otú o si kasie Meri obi. Mgbe Mata gwachara Jizọs okwu, Jizọs gwara ya gbasara mbilite n’ọnwụ ma nyere ya aka ka o kwetasie ike na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ. Ma mgbe Meri beere ákwá bịakwute Jizọs, Baịbụl ekwughị na Jizọs gwara ya gbasara mbilite n’ọnwụ. Kama o so Meri bee ákwá ma jụọ ya ebe e liri Lazarọs. (Jọn 11:20-35) Gịnị ka ihe a na-akụziri anyị? Ọ na-akụziri anyị na anyị kasiwe ndị na-ata ahụhụ obi, anyị kwesịrị ịchọpụta ihe bụ́ mkpa ha kama iche na ihe anyị meere Okeke ka anyị ga-emere Okafọ.

Foto ndị na-egosi: Ebe otu okenye gara n’ụlọ ụmụnna abụọ nwunye ha nwụrụ leta ha. 1. Ebe okenye ahụ tụkwasịrị aka ya n’ubu nwanna ahụ ka ọ na-ebe ákwá. 2. Ebe ọ na-agụrụ otu nwanna mere agadi Baịbụl mgbe ha na-ele foto.

Ị kasiwe ndị ọzọ obi, gbalịa chọpụta ihe bụ́ mkpa ha (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8)a


9. Olee otú anyị ga-esi jiri Baịbụl kasie ndị mmadụ obi? (Ndị Rom 15:4, 5)

9 Gwa ya ihe Baịbụl kwuru. Ị gụọrọ onye nọ ná nsogbu amaokwu Baịbụl ga-akasi ya obi, ị na-enyere ya aka ime ka olileanya ya sie ike ná nkwa ndị Jehova kwere. (Gụọ Ndị Rom 15:4, 5.) Olileanya ahụ ga-akasikwu ya obi ma gbakwuo ya ume. (Aịza. 40:31) Olee otú ị ga-esi chọta amaokwu Baịbụl ndị ị ga-eji gbaa mmadụ ume? Ụfọdụ ụmụnna na-edepụta amaokwu Baịbụl ndị ha ga-eji gbaa mmadụ ume, dị ka ndị nke ahụ e dere n’isiokwu bụ́ “Nkasi Obi” n’akwụkwọ bụ́ Amaokwu Baịbụl Ndị Na-enyere Anyị Aka Ife Jehova. Rịọ Jehova ka o nyere gị aka iji Okwu ya gbaa mmadụ ume otú kacha mma. Mmụọ nsọ ya nwere ike inyere gị aka icheta amaokwu Baịbụl mgbe i kwesịrị iji ya gbaa mmadụ ume.​—Jọn 14:26.

10. Gịnị mere anyị ga-eji na-ekwu okwu ọma mgbe anyị na-agbalị ịgba mmadụ ume?

10 Gwa onye ahụ okwu ọma. Okwu Grik a sụgharịrị “nkasi obi” nwere ike ịpụta ‘ịgba mmadụ ume ka o mee ihe o kwesịrị ime.’ Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịdị mkpa ka ị gbaa onye ị na-akasi obi ume ka ọ gbanwee echiche ya. Ị chọọ ime ya, chee echiche nke ọma tupu gị ekwuwe okwu ka okwu gị gbaa ya ume kama ịgbawa ya obi. (Ilu 12:18) Jehova gosiri anyị otú e si eme ya. Mgbe Ịlaịja chere na ọ bụ naanị ya na-efe Jehova nakwa na mbọ niile ọ gbara kụrụ afọ n’ala, Jehova weturu obi nyere ya aka ka ọ gbanwee echiche ya. Ọ baraghị ya mba maka ihe ahụ na-ezighị ezi ọ na-eche. (1 Eze 19:15-18) Ị ga-emeli otú ahụ ma ị dịrị obiọma ma na-eche echiche nke ọma tupu gị ekwuwe okwu. Mgbe ọ bụla ị na-eme ihe omume ma ọ bụ na-aza ajụjụ n’ọmụmụ ihe, na-ekwu okwu ọma ka i nwee ike ịgba ụmụnna gị ume ma mee ka okwukwe ha sie ike.

11. Ọtụtụ mgbe, gịnị ka e kwesịrị imere ndị nsogbu bịaara? (1 Jọn 3:18)

11 Gbalịa gbooro onye ahụ mkpa ya. Nsogbu bịara nwanna, o nwere ike ịdị mkpa ka anyị mee ihe a hụrụ anya iji nyere ya aka, ọ bụghị naanị ịgwa ya ihe ga-agba ya ume. (Gụọ 1 Jọn 3:18.) Banabas mere otú ahụ mgbe o rere ala ya ma jiri ego o retere nye onyinye iji gboo mkpa ụmụnna ndị e mere baptizim ọhụrụ, bụ́ ndị ihe na-esiri ike. (Ọrụ 4:36, 37) Ọtụtụ ụmụnna anyị na-eme otú ahụ taa. Ha na-agbalịsi ike igboro ndị ihe na-esiri ike mkpa ha. E nwere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Gabriela bụ́ onye Poland. Obi gbawara ya mgbe idei mmiri mebisịrị ụlọ ya. Ọ sịrị: “Ụjọ ji m, mụ achịrịkwa obi n’aka. Otú ahụ ka ọ dịkwa papa m na mama m mụ na ha bi. M nọ na-eche otú anyị ga-esi arụzi ya. Ma, ụmụnna ndị si n’ọgbakọ ndị dị nso bịara otu ụbọchị rụọ nnukwu ọrụ n’ụlọ anyị. O mere ka okwukwe m sie ike na ọ bụ Jehova na-eme ka ndị ya kasie ndị na-ata ahụhụ obi.”

12. Ọ bụrụ na ị tachie obi ná nsogbu ndị bịaara gị, olee otú i nwere ike isi enyere ụmụnna gị aka?

12 Na-atachi obi ná nsogbu ndị na-abịara gị. Pọl gwara Ndị Kraịst nọ na Tesalonaịka na mgbe ọ nụrụ na ha na-atachi obi n’agbanyeghị na a na-akpagbu ha, o mere ya obi ụtọ, meekwa ka okwukwe ya sie ike. Ọ matara na mbọ niile ọ gbara inyere ha aka efughị ọhịa. (1 Tesa. 3:5-8) Pọl ma na ọ bụrụ na ya ejisie ike na-erubere Jehova isi, ọ ga-agba ụmụnna ya ume, ha anọsie ike n’ofufe Jehova, ma ndị nke ọ na-ahụtụbeghị. (Kọl. 2:1, 2) Anyị nwekwara ike ime otú ahụ. Ọ bụrụ na ụmụnna anyị ahụ otú Jehova si enyere anyị aka ịna-atachi obi mgbe nsogbu bịaara anyị, ọ ga-agba ha ezigbo ume.

13. Gịnị ka anyị kwesịrị ịna-eme mgbe anyị na-akasi ndị ọzọ obi?

13 Na-enwe ndidi. Anyị kasiwe nwanna ike ụwa gwụrụ obi, o nwere ike obi agaghị adịwa ya mma ozugbo. Ma, Baịbụl gwara anyị ka anyị ‘na-agba ibe anyị ume.’ Ihe ọ pụtara bụ na ọ bụghị ihe a ga-eme naanị otu ugboro. (1 Tesa. 5:11) Na-enwe ndidi ka ị na-akasi ndị nsogbu bịaara obi ma na-agba ha ume. (1 Tesa. 5:14) Ma, e nwere mgbe ụfọdụ onye ọ bụla n’ime anyị ga-achọ ka a kasie ya obi. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka a kasie anyịnwa obi?

IHE Ị GA-EME MGBE Ị CHỌRỌ KA A KASIE GỊ OBI

14-15. Gịnị ka anyị kwesịrị ime mgbe anyị na-echegbu onwe anyị ma ọ bụ mgbe nsogbu bịaara anyị?

14 Kpee ekpere. Rịọ Jehova ka ọ kasie gị obi mgbe ị na-echegbu onwe gị ma ọ bụ mgbe nsogbu bịaara gị. (Ọma 94:19) Gwa Jehova kpọmkwem otú obi dị gị. (Ọma 62:8) Ọ bụ eziokwu na Jehova ma otú obi dị gị tupu gị ekpewedị ekpere, ma ịgwa ya ihe ndị dị gị n’obi na-egosi na i nwere okwukwe n’ebe ọ nọ. E nweghị mgbe Jehova na-agaghị aza ekpere i ji okwukwe kpee. Ma, e nwere ike ọ gaghị esi otú ị tụrụ anya ya zaa ya. (Mak 11:24) Ndị Filipaị 4:6, 7 gwara anyị, sị: ‘Na-arịọsinụ Chineke arịrịọ ike. Ọ bụ otú unu ga-esi mee ka ọ mara ihe unu na-arịọ. Udo Chineke na-enye, nke karịrị nghọta mmadụ, ga-esi n’aka Kraịst Jizọs chee obi unu na echiche unu nche.’

15 Gwa ndị ọzọ ka ha nyere gị aka. Gwa enyi gị ma nke a na-akọ ma ọ bụkwanụ okenye ị tụkwasịrị obi otú obi dị gị. Ụmụnna gị ga-akasili gị obi. Ma, e nwere ike ha agaghị ama otú obi dị gị ma ọ bụ ihe bụ́ mkpa gị ma ọ bụrụ na ị gwaghị ha. (Ilu 14:10) I nwere ike ịgwa ha ka ha wetuo obi gee gị ntị ma ọ bụ gụọrọ gị amaokwu Baịbụl ma ọ bụ isiokwu ha ma nwere ike ịkasi mmadụ obi.

16. Gịnị nwere ike ime ma mmadụ kasiwe gị obi? Ma, gịnị ka i kwesịrị icheta?

16 Na-enwe ndidi ma na-agbaghara. Ụmụnna gị nwere ike imejọ ihe mgbe ha na-agbalị ịgba gị ume. Dị ka ihe atụ, ha nwere ike ikwu ma ọ bụ mee ihe ga-emebi gị obi, kama ime ka obi dị gị mma. Ụdị ihe ahụ mee, nweere ha ndidi. (1 Kọr. 13:4, 7) Cheta na Jems 3:2 sịrị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla anaghị emejọ ma o kwuwe okwu, ọ bụ onye zuru okè.” Cheta na ụmụnna gị chọrọ inyere gị aka. Burukwa n’obi na “ọ na-agụ mmadụ ime ihe dị mma, ma anụ ahụ́ ya adịghị ike.”​—Mat. 26:41.

17. Gịnị ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime?

17 E kwesịrị ịna-akasi anyị niile obi ma na-agba anyị ume n’ihi na anyị bi n’oge ikpeazụ. Anyị na-atụkwa anya na ihe ga na-esikwu ike ka chi na-eji, na-abọ. Iwe ga na-ewekwukwa ndị iro Chineke. N’ihi ya, e kwesịrị ịkasi anyị obi n’ọdịnihu karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Ka anyị kpebisie ike ịna-agbasi mbọ ike ịkasi ibe anyị obi.

GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

  • Na Baịbụl, gịnị ka “nkasi obi” pụtara?

  • Olee otú anyị ga-esi na-akasi ndị ọzọ obi?

  • Gịnị ka ị ga-eme mgbe ị chọrọ ka a kasie gị obi?

ABỤ NKE 130 Na-agbaghara Ndị Ọzọ

a NKỌWA FOTO: Ebe otu okenye na-ege ntị nke ọma ka otu nwanna nwunye ya nwụrụ n’oge na-adịbeghị anya na-ekwu otú ọ dị ya n’obi. Mgbe e mechara, okenye ahụ gara leta nwanna ọzọ nwunye ya nwụrụ afọ ụfọdụ gara aga, ha echeta ọtụtụ ihe ọma gbasara nwunye ya ahụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya