IHE I NWERE IKE ỊMỤ
Otú Ị Ga-esi Aghọta Ihe Atụ Ndị E Mere na Baịbụl
Ihe atụ juru eju bara abara na Baịbụl. Ma ọ na-esiri ọtụtụ ndị na-agụ Baịbụl ike ịghọta ha. (Mat. 13:13) Olee ihe nwere ike inyere gị aka ịghọta ihe ihe atụ e mere na Baịbụl pụtara n’eziokwu? I nwere ike ime ihe ndị a:
Chọpụta isi ihe a na-ekwu na ihe e ji ya tụnyere. E mewe ihe atụ, a na-eji otu ihe tụnyere ihe ọzọ. Dị ka ihe atụ, ná Mkpughe 3:3, Jizọs kwuru na ya ga-abịa ka onye ohi. N’ihi ya, isi ihe a na-ekwu bụ ọbịbịa Jizọs. E ji ya tụnyere onye ohi.
Chee gbasara otú isi ihe ahụ a na-ekwu na ihe atụ ahụ si yie. Gbalịa chee ihe mere e ji jiri otu ihe tụnyere ihe ọzọ na otú ha abụọ si yie.
Gbalịa chọpụta ihe e ji ya akụzi. Mgbe ụfọdụ, e nwere ike imecha ihe atụ, mmadụ aghọta ihe ọzọ. N’ihe atụ ahụ e bu ụzọ mee, Jizọs anaghị abịa izuru ihe ọ bụla. Ihe ihe atụ ahụ pụtara bụ na otú ahụ onye ohi na-abịa mgbe ndị mmadụ na-atụghị anya ya ka ọbịbịa Jizọs ga-adị.