JUN 1 RUO 7, 2026
ABỤ NKE 111 Ihe Mere Anyị Ji Enwe Ọṅụ
Ihe Mere Ị Ga-eji Na-enwe Obi Ụtọ ma A Kpọọ Gị Asị
“Unu na-enwe obi ụtọ mgbe ọ bụla ndị mmadụ kpọrọ unu asị.”—LUK 6:22.
IHE A GA-AMỤ
Ihe mere anyị ga-eji na-enwe obi ụtọ ma a kpọọ anyị asị n’ihi na anyị na-efe Jehova.
1. Gịnị ka Jizọs kwuru? Gịnị mere o nwere ike iji ju anyị anya?
MGBE Jizọs na-akụzi ihe n’elu ugwu, ọ sịrị: “Unu na-enwe obi ụtọ mgbe ọ bụla ndị mmadụ kpọrọ unu asị.” (Luk 6:22) Ọ ga-abụ na ihe a o kwuru juru ndị na-ege ya ntị anya n’ihi na e nweghị onye obi na-adị ụtọ ma a kpọọ ya asị. Gịnị mere Jizọs ji kwuo ihe ahụ? Anyị kwesịrị ịmata azịza ajụjụ a n’ihi na ọtụtụ ndị kpọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs asị taa. Anyị ga-eleba anya n’ihe mere e ji kpọọ anyị asị na ihe mere obi ga-eji adị anyị ụtọ ma a kpọọ anyị asị.
IHE MERE E JI KPỌỌ ANYỊ ASỊ
2-3. Olee otu ihe mere e ji akpagbu ezigbo Ndị Kraịst? Oleekwa otú o nwere ike isi eme ka anyị na-ele ndị na-emegide anyị anya? (Jọn 16:2, 3)
2 A kpọrọ anyị asị maka na anyị na-efe Jehova. Jizọs kwuru banyere ndị ga-akpagbu ndị na-eso ụzọ ya ma gbuodị ụfọdụ n’ime ha. Ọ sịrị: “Ha amatabeghị ma Nna m ma mụnwa.” (Gụọ Jọn 16:2, 3.) Ònye na-akpata mkpagbu a na-akpagbu ndị Jehova? Ọ bụ Setan. Ọ bụ ya bụ “chi nke oge a.” (2 Kọr. 4:3, 4) Ọ na-agbalị igbochi ndị mmadụ ịmụta banyere Jehova, na-emegidekwa ndị ma Chineke ma hụ ya n’anya. (Jọn 8:42-44) Olee otú ịmata ihe a ga-esi eme ka anyị na-ele ndị na-akpagbu anyị anya? Anyị ghọta na Setan eduhiela ha, ọ ga-eme ka anyị ghara ịkpọ ha asị.
3 Ka anyị kwuo banyere otu nwanna aha ya bụ Pavel.a O bi n’otu obodo a machiri Ndịàmà Jehova iwu. Ọ kwụsịghị iji obi ya niile na-efe Jehova. N’ihi ya, a nwụchiri ya, kụọ ya isi aba okpu, tụọkwa ya mkpọrọ ebe naanị ya nọ ruo ọtụtụ ọnwa. O kwuziri, sị: “O doola m anya ugbu a na ihe mere e ji na-akpagbu anyị bụ na Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya na-alụso ofufe Jehova ọgụ. O yiri ka ọtụtụ ndị na-arụ n’ụlọ mkpọrọ akpọghị anyị asị. Naanị ihe ha na-eme bụ ịrụ ọrụ ha.” E nwere otu nwanna bi na Kroeshia ndị mụrụ ya na-abụghị Ndịàmà Jehova nọ na-akpagbu. Ọ sịrị: “Amatala m na ọ bụ Setan bụ onye iro m, ọ bụghị papa m na mama m.”—Efe. 6:12.
4. Gịnị ka anyị na-amụta n’ihe Jizọs na Stivin mere? (Kọwaakwa foto.)
4 Anyị akpọghị ndị na-emegide anyị asị. Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị nwere ike ikpe ekpere maka ha. (Mat. 5:44) Anyị ga-amụtali ihe a n’aka Jizọs na Stivin onye na-eso ụzọ ya. Mgbe ndị agha Rom kpọgidere Jizọs n’elu osisi ịta ahụhụ, o kpere ekpere, sị: “Nna, gbaghara ha.” (Luk 23:34) Ihe Jizọs na-arịọ Jehova bụ ka ọ gbaghara ndị agha ahụ e nyere iwu ka ha gbuo ya. O nwekwara ike ịbụ na ọ na-eche banyere ìgwè mmadụ ahụ ndị isi okpukpe mere ka ha na-eti ka e gbuo ya. Jizọs ma na ndị ahụ amaghị ihe ha na-eme. Stivin mekwara ihe yiri ya. Ọ rịọrọ Chineke ka ọ gbaghara ndị ahụ ji okwute na-atụgbu ya. (Ọrụ 7:58-60) Jehova ọ̀ zara ekpere Jizọs na nke Stivin? Ee. Ọtụtụ ndị aka ha dị n’ogbugbu e gburu Jizọs mechara chegharịa, nwee okwukwe na ya, ma mee baptizim. (Ọrụ 2:36-41) Ọ dịkarịa ala, otu n’ime ndị kwadoro ogbugbu e gburu Stivin mechara ghọọ Onye Kraịst, kwaakwa mmakwaara maka ihe ọjọọ ahụ o mere n’amaghị ama. Aha ya bụ Sọl onye Tasọs.—1 Tim. 1:13.
Anyị nwere ike ikpe ekpere maka ndị na-akpagbu anyị otú ahụ Jizọs na Stivin bụ́ onye na-eso ụzọ ya mere (A ga-akọwa ya na paragraf nke 4)
5. Gịnị ka ị mụtara n’akụkọ Nwanna César?
5 Taa, Jehova ka na-aza ekpere anyị na-ekpere ndị na-akpagbu anyị. Ka anyị kwuo banyere otu nwanna aha ya bụ César. O bi na Venezuela. Papa ya nọ na-echi ya ọnụ n’ala maka na ọ bụ Onyeàmà Jehova. Nwanna César sịrị: “Mama m bụ ezigbo nne nakwa ezigbo nwaanyị. N’agbanyeghị na o bu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke mgbe niile, o nweghị mgbe o leghaara papa m anya. Ọ kụziiri mụ na ụmụnne m ka anyị na-akwanyere papa anyị ùgwù. Ọ kụzikwaara anyị ka anyị na-erubere ya isi ọ gwụkwala ma ọ̀ sị anyị mee ihe Chineke sị na ọ dịghị mma.” Mgbe afọ ole na ole gara, àgwà papa Nwanna César malitere ịgbanwe. Nwanna César sịrị: “Otu ụbọchị, mgbe m kpechara ekpere si m n’obi, m jụrụ papa m ma ọ̀ ga-achọ ka mụ na ya mụwa Baịbụl. Obi bụ m nnọọ sọ aṅụrị mgbe o kwetara.” Ka oge na-aga, papa ya mere baptizim. Ọ bụghị ndị niile na-akpagbu anyị na-esi otú ahụ agbanwe. Ma ụfọdụ na-agbanwe ma ha hụ otú anyị si agwa ha okwu ọma ma na-akwanyere ha ùgwù. Obi na-adị anyị ezigbo ụtọ ma ha gbanwee. Anyị na-atụsi anya ike ịhụ mgbe Jehova, bụ́ Onye na-eme ebere na “Onye na-ekpe ụwa niile ikpe,” ga-adọta ụdị ndị ahụ ka ha bịa fee ya.—Jen. 18:25.
6. Dị ka e kwuru na Mak 13:13, olee ihe ọzọ mere e ji kpọọ anyị asị?
6 A kpọrọ anyị asị maka na anyị na-akwanyere Jizọs ùgwù. Jizọs kwuru na mmadụ niile ga-akpọ ezigbo Ndị Kraịst asị “n’ihi aha [ya].” (Gụọ Mak 13:13.) Gịnị ka “aha” Jizọs nọchiri anya ya? Ọ nọchiri anya àgwà ya na ikike o nwere ịbụ Eze nke Alaeze Chineke. Ndị kpọrọ anyị asị bụ ndị tụkwasịrị ndị ọchịchị ụwa obi kama ịtụkwasị Jizọs Kraịst obi, bụ́ onye Jehova họọrọ ịchị eluigwe na ụwa. Jizọs bụ Eze na-achị n’Alaeze Chineke kemgbe afọ 1914. N’oge na-adịghị anya, ọ ga-ewepụ ọchịchị ndị ọzọ niile.
7-8. Olee ihe ọzọ mere e ji kpọọ Ndịàmà Jehova asị? (Jọn 15:18-20) (Kọwaakwa foto.)
7 A kpọrọ anyị asị maka na anyị jụrụ ụwa Setan. Jizọs kọwara na a ga-akpọ ndị na-eso ụzọ ya asị maka na ha “abụghị nke ụwa.” (Gụọ Jọn 15:18-20.) Anyị na-ajụ echiche ndị ụwa, àgwà ha, na okwu ha, otú ahụ Ndị Kraịst oge mbụ mere. Ọ bụ ya mere e ji akwa ọtụtụ ụmụnna anyị emo n’ụlọ ọrụ ma ọ bụ n’ụlọ akwụkwọ. (1 Pita 4:3, 4) Ma, obi dị anyị ụtọ na ụfọdụ ndị na-emegide anyị na-emecha gbanwee obi ha, bidozie ịkwanyere anyị ùgwù maka ihe anyị kweere.
8 Ka anyị kwuo banyere otu nwanna aha ya bụ Ignacio. O bi n’Ebe Ndịda Kọntinent Nọt Amerịka. N’ụlọ akwụkwọ ha, otu onye nkụzi kwara ya emo ruo ọtụtụ afọ n’ihi na ọ na-erubere iwu Chineke isi. Ma, tupu Nwanna Ignacio agụchaa, onye nkụzi ahụ jụrụ ya otú o si nwee ike ịna-eme ihe Baịbụl kwuru n’ụlọ akwụkwọ ọtụtụ ndị ji maka ya na-akparị ya. Nwanna Ignacio kọwaara ya na o weere iwu Chineke ka ihe na-echebe ya. Ọ gwaziri onye nkụzi ahụ ka ọ bịa ọmụmụ ihe. O juru ya anya mgbe onye nkụzi ahụ bịara. Otú ndị nọ n’ọgbakọ si gosi ya obiọma tọrọ ya ụtọ nke na ọ kwụsịghị ịna-abịa ọmụmụ ihe. Ka oge na-aga, a kpagbuwere onye nkụzi ahụ n’ihi na ọ na-amụ Baịbụl. Ma, ọ kwụsịghị ime nke ọma ma mechaa mee baptizim.
N’agbanyeghị afọ ole anyị dị, anyị nwere ike ịkata obi gwa ndị mmadụ ihe anyị kweere (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8)b
9-10. (a) Olee ihe ọzọ mere Ndị Kraịst ji dị iche n’ụwa Setan? (b) Gịnị ka anyị na-amụta n’akụkọ Pọl onyeozi?
9 Anyị dịkwa iche n’ụwa Setan a n’ihi na anyị anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị na agha. (Jọn 18:36) Anyị na-erubere iwu ndị ọchịchị isi dị ka e kwuru ná Ndị Rom 13:1. Ma ebe anyị bụ Ndị Kraịst, anyị anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. N’ihi ya, anyị anaghị eso azọ ọkwá ọchịchị ma ọ bụkwanụ tụnyere ndị mmadụ vootu. Maka gịnị? Ọ bụ maka na anyị ji obi anyị niile na-akwado Jehova na Alaeze ya nke Kraịst bụ Eze ya. A tụọla ọtụtụ Ndịàmà Jehova mkpọrọ maka ihe ha kweere. Mana ụmụnna anyị ndị a tụrụ mkpọrọ ka na-ekwusakwa ozi ọma. Ha na-esi otú ahụ eme ka Pọl onyeozi, bụ́ onye a tụrụ mkpọrọ ma n’ụlọ ya ma n’ụlọ mkpọrọ ruo ọtụtụ afọ. (Ọrụ 24:27; 28:16, 30) Ọ kwụsịghị izi ndị niile chọrọ ige ya ntị ozi ọma. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị nche ụlọ mkpọrọ, ndị na-arụ ọrụ n’ụlọikpe, ndị gọvanọ, ndị eze, nakwa ma e leghị anya, ndị na-arụrụ Eze Ukwu Niro ọrụ.—Ọrụ 9:15.
10 Ụmụnna anyị a tụrụ mkpọrọ na-ezikwa ndị ọ bụla chọrọ ige ha ntị ozi ọma, ma ndị ọkàikpe ma ndị ọnụ na-eru n’okwu n’ọchịchị ma ndị nche. Otu nwanna a tụrụ mkpọrọ ihe karịrị afọ isii maka na o kweghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị kwuru na ya ewereghị oge ahụ a tụrụ ya mkpọrọ ka oge e ji taa ya ahụhụ, kama o weere ya ka oge Jehova nyere ya ka ọ chọọ ndị yiri atụrụ. Obi ga-atọgbu anyị atọgbu ma ọ bụrụ na Jehova esi n’aka anyị zie ụdị ndị ahụ ozi ọma. (Kọl. 4:3) Ka anyị lebakwuo anya n’ihe ndị ọzọ mere anyị kwesịrị iji na-enwe obi ụtọ ma mgbe a kpọrọ anyị asị n’ihi na anyị na-efe Jehova.
IHE MERE ANYỊ GA-EJI NA-ENWE OBI ỤTỌ MGBE A KPỌRỌ ANYỊ ASỊ
11. Olee otú mkpagbu nwere ike isi mee ka okwukwe anyị sikwuo ike? Nye ihe atụ.
11 Anyị ma na otú e si kpọọ anyị asị na-emezu amụma Baịbụl. N’amụma mbụ e dere na Baịbụl, Jehova kwuru na Setan na ụmụ ya, ya bụ, ndị na-eso ya, ga-akpọ ndị hụrụ Jehova n’anya ma na-efe ya asị. (Jen. 3:15) N’Ozi Ọma Matiu, Mak, Luk, na Jọn, Jizọs kwuru ugboro ugboro na a ga-akpọ ndị na-efe Jehova asị. (Mat. 10:22; Mak 13:9-12; Luk 6:22, 23; Jọn 15:20) Ndị Kraịst ndị ọzọ so dee Baịbụl dekwara otu ihe ahụ. (2 Tim. 3:12; Jems 1:2; 1 Pita 4:12-14; Jud 3, 17-19) N’ihi ya, a kpagbuwe anyị, ọ naghị eju anyị anya. Kama, obi na-adị anyị ụtọ na ọ bụ amụma Baịbụl na-emezu. Ọ na-eme ka obi sie anyị ike na anyị na-efe ezi Chineke. Otu nwanna nwaanyị bi n’obodo a machiri Ndịàmà Jehova iwu sịrị: “Mgbe m nyefere Jehova onwe m, ama m na a ga-akpagburịrị m. N’ihi ya, mgbe a kpagburu m, o jughị m anya ma ọ bụkwanụ mee ka ụjọ tụwa m.” Ọtụtụ ndị nọ na-emegide ya. Di ya sokwa na-emegide ya. O mesiri ya ike, kpọọ Baịbụl ya na akwụkwọ ndị o ji amụ Baịbụl ọkụ. Ma, kama nwanna nwaanyị ahụ ịtụwa ụjọ, okwukwe ya sikwuru ike. (Hib. 10:39) Ọ sịrị: “Baịbụl buru amụma na a ga-emegide anyị. N’ihi ya, m ma na ọ ga-eme. Ịhụ ka ọ na-eme mere ka obi sie m ike na ihe m nọ na ya bụ ezigbo okpukpe.”
12. Gịnị nyeere otu nwanna aka idi mkpagbu?
12 Ọ bụ eziokwu na anyị na-atụ anya na a ga-emegide anyị, ọ ka nwere ike isiri anyị ike idi ya. Otu nwanna kwuru banyere oge a tụrụ ya mkpọrọ, sị: “Mgbe ụfọdụ, ike na-agwụ m ma ọ bụ mụ ana-echegbu onwe m. Ihe m na-emezi bụ ibewe ákwá.” Gịnị nyeere ya aka ịtachi obi? Ọ sịrị: “M na-ekpe ekpere mgbe niile. Ihe mbụ m na-eme n’ụtụtụ ọ bụla bụ ikpe ekpere. E nwee ihe ọ bụla siiri m ike n’ụbọchị, m na-ekpe ekpere. Mgbe ọ bụla mmadụ mere m ihe gbawara m obi, m na-abanye n’ebe a na-asa ahụ́, kpọchie ụzọ ma kpee ekpere.” Nwanna ahụ tụgharịkwara uche banyere ndị tachiri obi ma n’oge ochie ma n’oge anyị a. Ọ bụ ihe nyeere ya aka ịtachi obi mgbe a na-akpagbu ya, obi eruokwa ya ala otú ahụ Jizọs kwere ndị na-eso ụzọ ya ná nkwa.—Jọn 14:27; 16:33.
13. Gịnị nwere ike inyere anyị aka idi asị a kpọrọ anyị?
13 Ịhụnanya anyị siri ike karịa asị a kpọrọ anyị. Jizọs ji obi ya niile hụ Nna ya n’anya ruo n’ọnwụ. Ọ hụkwara ndị enyi ya n’anya. (Jọn 13:1; 15:13) Ọ bụrụ na anyị amụta ịhụ Jehova na ụmụnna anyị n’anya otú ahụ, anyị ga-enwe ike idi asị ọ bụla a kpọrọ anyị. Olee otú anyị ga-esi eme ya? Ileba anya n’akụkọ Pọl onyeozi ga-enyere anyị aka ịza ajụjụ a.
14. Gịnị nyeere Pọl aka irubere Jehova isi mgbe ọ fọrọ obere ka e gbuo ya?
14 Obere oge tupu e gbuo Pọl, o degaara ezigbo enyi ya bụ́ Timoti akwụkwọ ozi. Ọ sịrị ya: “Mmụọ nsọ Chineke nyere anyị anaghị eme ka anyị tụwa ụjọ, kama, ọ na-enye anyị ike, na-eme ka anyị hụ ndị ọzọ n’anya.” (2 Tim. 1:7) Gịnị ka ihe a Pọl kwuru pụtara? Ihe ọ na-ekwu bụ na ịhụ Jehova n’anya nke ukwuu nwere ike inyere Onye Kraịst aka idi nsogbu ndị tara akpụ. (2 Tim. 1:8) N’agbanyeghị na Pọl ma na e nwere ike igbu ya maka ife Jehova, otú o si jiri obi ya niile hụ Jehova n’anya nyeere ya aka inwe obi ike ma na-erubere ya isi.—Ọrụ 20:22-24.
15. Olee otú ụmụnna anyị si egosi ibe ha ezigbo ịhụnanya n’oge anyị a? (Kọwaakwa foto.)
15 Anyị hụrụ ụmụnna anyị ndị na-atachi obi ná mkpagbu a na-akpagbu ha n’anya. Ọtụtụ ndị taa na-egosi na ha ji obi ha niile hụ ụmụnna ha n’anya n’agbanyeghị na o nwere ike ime ka a kpagbuwe ha, otú ahụ Akwịla na Prisila mere ihe gaara ata isi ha n’ihi Pọl. (Rom 16:3, 4) Dị ka ihe atụ, na Rọshịa, ọtụtụ ụmụnna anyị na-aga n’ụlọikpe ka ha gbaa ụmụnna a nwụchiri ume. Mgbe otu nwanna nwaanyị a nwụchiri hụrụ ọtụtụ ụmụnna bịara n’ụlọikpe, o riri ya ọnụ. Ọ kasiri ya nnọọ obi. Otú ha si jiri obi ha niile gosi na ha hụrụ ya n’anya mere ka obi sie ya ike mgbe ọ dị ya mkpa. Obi ga-adịli anyị ụtọ na ịhụnanya anyị siri ike karịa asị a kpọrọ anyị.
Ọ bụrụgodị na a machiri Ndịàmà Jehova iwu, ụmụnna anyị na-egosi na ha ji obi ha niile hụ ụmụnna ha n’anya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15)c
16. Gịnị mere Pita onyeozi ji kwuo na ndị a na-akpagbu maka na ha na-efe Chineke kwesịrị ịna-enwe obi ụtọ? (1 Pita 4:14)
16 Anyị ma na otú anyị si atachi obi mgbe a kpọrọ anyị asị na-eme Jehova obi ụtọ. (Gụọ 1 Pita 4:14.) Pita onyeozi kwuru na ndị na-edi mkpagbu a na-akpagbu ha maka na ha na-efe Jehova kwesịrị ịna-enwe obi ụtọ. Maka gịnị? Mkpagbu ahụ na-egosi na mmụọ Chineke ‘dị n’ime ha.’ Pita ma otú ime Jehova obi ụtọ na ịtachi obi ná mkpagbu na-adị. Obere oge Pentikọst afọ 33 gachara, e zipụrụ ndị nche ụlọ nsọ ndị Juu ka ha nwụchie Pita na ndịozi ndị ọzọ n’ihi na ha na-ekwusa ozi ọma. Ma, Pita katara obi kwuo ihe o kweere. (Ọrụ 5:24-29) Mgbe a pịachadịrị ya na ndịozi ndị ọzọ ihe, ha akwụsịghị ikwusa ozi ọma. Kama ha ṅụrịrị ọṅụ maka na “Chineke gụrụ ha ná ndị e kwesịrị imenye ihere n’ihi aha Jizọs.” Anyịnwa ga-aṅụrịli ọṅụ mgbe anyị na-atachi obi ná mkpagbu.—Ọrụ 5:40-42.
17. Gịnị ka Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya n’abalị bọtara ụbọchị e gburu ya?
17 N’abalị bọtara ụbọchị e gburu Jizọs, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Onye ọ bụla hụrụ m n’anya, Nna m ga-ahụ ya n’anya. M ga-ahụkwa onye ahụ n’anya.” (Jọn 14:21) Anyị na-atụsi anya ike mgbe ndị mmadụ ga-ahụ anyị n’anya n’ihi na anyị na-efe Jehova kama ịkpọ anyị asị. (2 Tesa. 1:6-8) Tupu mgbe ahụ, ka anyị kpebisie ike na anyị ga na-echeta ọtụtụ ihe mere anyị ji kwesị ịna-enwe obi ụtọ mgbe a kpọrọ anyị asị.
ABỤ NKE 149 Abụ Mmeri
a Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.
b NKỌWA FOTO: Foto e ji egosi ebe Nwanna Ignacio na-ezi onye nkụzi ha ozi ọma.
c NKỌWA FOTO: Foto e ji egosi ebe ụmụnna na-akwado nwanna ha e duuru na-aga n’ụlọ mkpọrọ maka ihe o kweere.