MEE 25 RUO 31, 2026
ABỤ NKE 135 Jehova Ji Obiọma Na-arịọ: “Mara Ihe, Nwa M”
Na-egosi na Ị Na-aghọta Ihe Ka ‘Ihe Gaziere Gị’
“Ihe ga-agaziri mmadụ ma ọ bụrụ na e nwee okwu pụtaranụ, ya akpaa àgwà gosiri na ọ na-aghọta ihe.”—ILU 16:20.
IHE A GA-AMỤ
Otú nghọta ga-esi enyere anyị aka ime ihe anyị kwesịrị ime mgbe ihe siri ike.
1-2. Gịnị bụ nghọta? Oleekwa otú o si enyere anyị aka?
È NWETỤLA mgbe mmadụ kparịrị gị? È nweela mgbe mmadụ chere ihe na-adịghị mma gbasara gị ma ọ bụ mee gị ihe na-adịghị mma? Ka è nweela ihe menyere gị ụjọ? Ọ bụrụ na e nwetụla, i nwere ike ikweta na ime ihe dị mma na ikwu ihe dị mma anaghị adị mfe n’ụdị oge ahụ. Obi dị anyị ụtọ na Baịbụl mere ka anyị mata àgwà ga-enyere anyị aka ma ụdị ihe ndị a mee, ya bụ, nghọta.
2 Nghọta pụtara ịmata ihe merenụ ma ghara iji naanị ihe anya hụrụ eme mkpebi. Ọ na-eme ka anyị chọpụta ihe o nwere ike ịbụ ya mere ihe ji mee ma ọ bụ ihe nwere ike ime ka mmadụ mee ihe o mere. N’ihi ya, nghọta nwere ike inyere anyị aka ịkpa àgwà gosiri na anyị ma ihe. Dị ka ihe atụ, o nwere ike inyere anyị aka ‘ijide ọnụ anyị aka,’ nyekwara anyị aka ịma mgbe anyị ‘ga-agba nkịtị.’ (Ilu 10:19; Ọma 4:4) Ọ na-enyere anyị aka ijide onwe anyị ma a kpasuo anyị iwe, anyị elegharakwa ihe e mere anyị anya. O nwekwara ike inyere anyị aka ịnabata ndụmọdụ, kwekwa ka a gbazie anyị. (Ilu 19:20) Ọ bụrụ na anyị egosi na anyị nwere nghọta, ọ bụghị naanị na anyị ga-eme Jehova obi ụtọ, kamakwa ọ ga-abara anyị uru, bakwaara ndị ọzọ. Ọ bụrụ na nsogbu siri ike abịara anyị, anyị agaghị ekwe ka iwe mee ka anyị mee ihe na-adịghị mma. Ka anyị leba anya n’akụkọ atọ Baịbụl kọrọ ndị na-egosi na nghọta ga-eme ka anyị dị umeala n’obi, obi eruo anyị ala, anyị atụkwasịkwa Jehova obi kpamkpam.
DỊRỊ UMEALA N’OBI KAMA ỊDỊ MPAKO
3. Ònye bụ Neeman?
3 Anyị chọọ ka ihe gaziere anyị, anyị kwesịrị ịgbara mpako ọsọ. (1 Pita 5:5) Olee otú nghọta ga-esi enyere anyị aka ime ya? Ka anyị leba anya n’akụkọ Neeman. O bi na Siria, bụ́ obodo dị ná mpaghara ugwu ma e si Izrel gawa ya. Neeman bụ onye a ma ama. Ọ bụ ọchịagha ndị Siria. Ma, ọ na-arịa ọrịa ọjọọ a na-akpọ ekpenta.—2 Eze 5:1.
4. Olee otú Neeman si gosi na o nwetụrụ nghọta?
4 Nwunye Neeman nwere nwata nwaanyị Izrel bụ́ ohu ya. Ohu ya ahụ gwara ya na e nwere onye amụma nọ n’Izrel ga-agwọli di ya. (2 Eze 5:2, 3) Neeman gaara echewe, sị: ‘Nwata nwaanyị bụ́ ohu, nke sikwa n’obodo ndị iro anyị, ọ̀ ga-agwali m ihe ga-abara m uru?’ Ma Neeman gosiri na o nwetụrụ nghọta. Kama ikwe ka mpako mee ka o leghara ihe nwata nwaanyị ahụ gwara ya anya, o weturu obi gee ya ntị. Ọ natara ikike n’aka eze Siria ka o nwee ike ịga Izrel chọọ onye ga-agwọ ya.—2 Eze 5:4, 5.
5. Gịnị mere mgbe Neeman rutere Izrel?
5 Mgbe Neeman bịarutere n’obí Jehoram bụ́ eze Izrel, ọ nọ na-atụ anya ka a gwọọ ya ekpenta na-arịa ya. Ma Jehoram chere na eze Siria na-achọ ya okwu. Mgbe Ịlaịsha onye amụma nụrụ ihe a, ọ gwara Jehoram ka ọ gwa Neeman ka ọ bịakwute ya. (2 Eze 5:6-9) Ihe agaghị otú Neeman tụrụ anya ya. Ịlaịsha esighịdị n’ụlọ ya pụta bịa nabata ya ma ọ bụ gwa ya okwu. Kama, o zipụrụ onye ozi ya ka ọ gaa gwa Neeman ihe ọ ga-eme ka ahụ́ dị ya mma.—2 Eze 5:10.
6. (a) Gịnị ka o nwere ike ịbụ ya mere Neeman achọghị ige ntị n’ihe onye ozi Ịlaịsha gwara ya mee? (b) Olee otú ndị na-ejere Neeman ozi si gosi na ha nwere nghọta? Olee uru ọ bara? (2 Ndị Eze 5:13, 14)
6 Na mbụ, ihe ahụ a gwara Neeman adịghị ya mma. Ọ ‘kpasuru ya iwe,’ ya atụgharịa “jiri iwe lawa.” (2 Eze 5:11, 12) Maka gịnị? O nwere ike ịbụ n’ihi na o chere na Ịlaịsha akwanyereghị ya ùgwù e kwesịrị ịkwanyere ọchịagha ndị Siria. O nwekwara ike ịbụ na Neeman chere na ihe Ịlaịsha gwara ya mee bụ ịkparị ndị Siria. Nke ọ bụla ọ bụ, Neeman chọziri iburu ọrịa ya ahụ laghachi n’obodo ya. Ma ndị na-ejere ya ozi gosiri na ha nwere nghọta. Ha rịọrọ ya ka ọ ghara ịlawa. N’ikpeazụ, Neeman kwụsịrị ịdị mpako, wetuzie obi mee ihe Ịlaịsha gwara ya. A gwọkwara ya.—Gụọ 2 Ndị Eze 5:13, 14.
7. Gịnị ka anyị na-amụta n’akụkọ Neeman? (Ilu 22:4) (Kọwaakwa foto.)
7 Gịnị ka anyị na-amụta n’akụkọ a? Ọ bụghị mgbe niile ka ihe anyị chere ma ọ bụ ihe anyị hụrụ na-abụ eziokwu. N’ihi ya, anyị kwesịrị iche echiche nke ọma tupu anyị emee ihe ọ bụla. Anyị na-egosikwa na anyị nwere nghọta ma ọ bụrụ na anyị na-ejide onwe anyị mgbe a kpasuru anyị iwe. Nghọta na-enyere anyị aka ịdị umeala n’obi, ya emee ka anyị kweta na anyị amaghị ihe niile. O nwere ike ịdị mkpa ka ndị ọzọ nyere anyị aka. Ọ bụkwa Jehova ga-akacha enyere anyị aka. Neeman efewebeghị Jehova, ma o gosiri na o nwetụrụ nghọta. Otú o si mee ya bụ na o weturu obi gee ndị ọzọ ntị, ma nwata nwaanyị Izrel bụ́ ohu nwunye ya, ma ndị ohu ya, ma karịchaa, Ịlaịsha bụ́ onye na-anọchi anya Jehova. Neeman kwụsịrị ịdị mpako. O mere ka o mee mkpebi mere ka ihe gaziere ya. N’ihi ya, tupu anyị ekwuo ma ọ bụ mee ihe ọ bụla, anyị kwesịrị ịkwụsịtụ chee echiche. Dị ka ihe atụ, mmadụ nwere ike isi na Baịbụl nye anyị ndụmọdụ na-adịghị anyị mma ma ọ bụkwanụ na e nwere ntụziaka nzukọ Jehova nyere anyị na-aghọtachaghị. Ụdị ihe ahụ mee, anyị kwesịrị iche ma ihe anyị chọrọ ikwu ma ọ bụ mee ọ̀ na-egosi na anyị dị mpako ka ọ̀ bụ na anyị dị umeala n’obi.—Gụọ Ilu 22:4.
Otú ahụ Neeman dị umeala n’obi ma gee ndị ọzọ ntị, anyị kwesịrị ige ntị mgbe a na-enye anyị ndụmọdụ, mgbe ndị ọzọ na-akọrọ anyị nsogbu ha, ma ọ bụ mgbe nzukọ Jehova nyere anyị ntụziaka (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7)
DỊRỊ NWAYỌỌ KAMA IWE IWE
8. Olee mgbe o nwere ike isiri anyị ike ịdị nwayọọ?
8 Nghọta ga-enyere anyị aka ịdị nwayọọ, meekwa ka anyị ghara iji iwe kwuo okwu ma ọ bụ mebie ihe mgbe ihe siri ike. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụghị mgbe niile ka ọ na-adị mfe, karịchaa, mgbe mmadụ kwuru ma ọ bụ mee ihe na-adịghị anyị mma. (Efe. 4:26) Ka anyị lee otú Devid na Abigel si gosi na ha nwere nghọta n’oge e nwere nsogbu.
9. Olee otú Nebal si meso Devid?
9 Weregodị ya na ị na-ahụ ihe na-eme. Devid na ụmụ nwoke ya na ha so nọ n’ala ịkpa Peran mgbe ha na-agba ọsọ ndụ n’ihi Sọl. (1 Sam. 25:1) Ka ha nọ ebe ahụ, ha chebere ụmụ atụrụ otu nwoke bụ́ aka ji akụ̀ aha ya bụ Nebal na ndị na-azụrụ ya atụrụ. (1 Sam. 25:15, 16) N’oge a na-akpacha ajị atụrụ, Devid zigara ndị ozi ya ka ha gakwuru Nebal kelee ya ma rịọ ya ka o nyetụ ha nri. (1 Sam. 25:6-8) Ma, Nebal egosighị na obi dị ya ụtọ maka ihe Devid na ụmụ nwoke ndị ahụ meere ya. Ọ kparịrị Devid na ụmụ nwoke ndị ahụ.—1 Sam. 25:10, 11.
10. Olee otú Devid na Abigel si gosi na ha nwere nghọta? (1 Samuel 25:32, 33) (Kọwaakwa foto.)
10 Ọ bụrụ gị ka ihe a mere Devid mere, olee otú obi ga-adị gị? O doro anya na ị ga-aghọta ihe mere ezigbo iwe ji wee Devid. O were iwe nke na ọ chọrọ igbu Nebal. (1 Sam. 25:13, 21, 22) Ma, Abigel, bụ́ nwunye Nebal, ma ezigbo ihe. Ọ kwụsịrị Devid na ụmụ nwoke ya na ha so n’ụzọ mgbe ha na-aga igbu Nebal. Gịnị mere Abigel ji kwụsị ha? Ọ bụ n’ihi na ọ ghọtara na Devid bụ ezigbo mmadụ n’agbanyeghị na o were ezigbo iwe. N’ihi ya, o mere ike ya niile iji nyere ya aka ka ọ kwụsị iwe iwe. O wetaara ya ọtụtụ onyinye, wetuokwa obi nye ya ndụmọdụ ga-abara ya uru. (1 Sam. 25:18, 23-31) Devid gosiri na o nwere nghọta. Otú o si mee ya bụ na o gere Abigel ntị, chọpụtakwa na ihe ọ na-ekwu bụ otú Jehova si lee ihe ahụ anya. Ihe a mere ka Devid wetuo obi ma ghara ime mmehie dị oké njọ.—Gụọ 1 Samuel 25:32, 33.
Devid na Abigel gosiri na ha nwere nghọta mgbe e nwere nsogbu, ya emee ka Devid ghara ime ihe dị oké njọ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10)
11. Olee otú ị ga-esi gosi na i nwere nghọta ma a kpasuo gị iwe? (Ilu 19:11)
11 Gịnị ka anyị na-amụta n’akụkọ a? Ọ bụrụgodị na e nwere ihe kpasuru anyị iwe, nghọta ga-eme ka anyị ghara iji iwe emebi ihe. O nwere ike inyere anyị aka iche gbasara nsogbu ihe anyị chọrọ ikwu na ihe anyị chọrọ ime nwere ike ịkpata. (Gụọ Ilu 19:11.) Mgbe Abigel chetaara Devid otú Jehova si lee ihe ahụ ọ chọrọ ime anya, iwe ya dajụrụ. E nwee ihe kpasuru gị iwe, gbalịa ka ị ghara ime ma ọ bụ kwuo ihe na-adịghị mma. (Jems 1:19) Kpee ekpere ka Jehova nyere gị aka. Wepụtakwa oge chebara ihe ahụ echiche. O nwere ike inyere gị aka ịkwụsị iwe iwe.
12. Olee otú ndị ọzọ nwere ike isi nyere anyị aka inwe nghọta na ịna-adị nwayọọ?
12 Jehova nwere ike iji ndị ọzọ nyere gị aka ka ị ghọta otú o si ele ihe anya otú ahụ o ji Abigel nyere Devid aka. N’ihi ya, e nwee ihe kpasuru gị iwe, gbalịa kọsara ya onye na-ele ihe anya otú Jehova si ele ya, onye ga-enyekwara gị aka ime otú ahụ. (Ilu 12:15; 20:18) E nweekwa ihe kpasuru enyi gị iwe, ì nwere ike ime ka Abigel? Ì nwere ike inyere ya aka ka ọ mata otú Jehova si ele ihe anya? Jehova ga-enyere gị aka ma ị na-agba mbọ inyere ndị ọzọ aka ịna-enwe nghọta na ịna-adị nwayọọ.
TỤKWASỊ JEHOVA OBI MA ỤJỌ TỤWA GỊ
13. Olee otú nghọta nwere ike isi nyere anyị aka ma ụjọ tụwa anyị?
13 Mgbe ụfọdụ, nsogbu nwere ike ime ka ụjọ tụwa anyị. Nghọta nwere ike inyere anyị aka ịkwụsị ịtụ ụjọ ma cheta na ihe ọ bụla na-emenye ụjọ n’ụwa a enweghị ihe ọ bụ ma e jiri ya tụnyere ike Jehova na-enweghị atụ. (Ọma 27:1) Jehova ga-enyeliri anyị aka n’agbanyeghị ụdị nsogbu ọ bụla bịaara anyị, ma ndị nke yiri ka e nweghị ihe ọ bụla a ga-emeli gbasara ha. Ọ bụ ihe akụkọ Jona na-akụziri anyị. Ọ hụrụ Jehova n’anya nke ukwuu. Ma ụjọ bịara ya mgbe Jehova nyere ya ọrụ siri ike.
14. Gịnị ka ọ ga-abụ ya mere ụjọ ji tụwa Jona ime ihe Jehova gwara ya?
14 Jehova nyere Jona ọrụ siri ezigbo ike. Ọ gwara ya ka ọ gaa gwa ndị Ninive na ọ ga-ebibi ha. (Jona 1:1, 2) Olee otú obi ga-adị gị ma ọ bụrụ gị ka e nyere ọrụ ahụ? Iji ụkwụ si Izrel gaa Ninive ga-ewe Jona ihe dị ka otu ọnwa. Ndị Jona ga-agwa okwu bụ ndị Asiria e ji tigbuo zọgbuo mara. Baịbụl kpọdịrị Ninive “obodo na-egbu mmadụ.” (Nehọ. 3:1, 7) Kama Jona ime ihe Jehova gwara ya, o riri mbọmbọ.—Jona 1:3.
15. Gịnị nyeere Jona aka ịtụkwasịkwu Jehova obi? (Jona 2:6-9)
15 Jona hapụrụ ịga Ninive, banye ụgbọ mmiri gawa ebe ọzọ dị ezigbo anya. A tụbara ya n’ime oké osimiri, Jehova arụọ ọrụ ebube napụta ya. Ihe ahụ chetaara ya na Jehova dị ezigbo ike. (Jona 1:15, 17) Jona mụtara ihe na ya. Ọ chọpụtara na o kwesịghị ịtụ ụjọ ịga Ninive n’ihi na Jehova ga-echebeli ya ná nsogbu ọ bụla. (Gụọ Jona 2:6-9.) Mgbe Jehova gwara ya nke ugboro abụọ ka ọ gaa Ninive, o rubere isi. Ndị ebe ahụ gekwara ya ntị, a zọpụta ha.—Jona 3:5.
16. Olee otú nghọta ga-esi enyere anyị aka ma ụjọ bịa anyị? (Ilu 29:25) (Kọwaakwa foto.)
16 Gịnị ka anyị na-amụta n’akụkọ a? Anyị achọghị ka ihe ọ bụla, karịchaa egwu mmadụ, mee ka anyị nupụrụ Jehova isi. (Gụọ Ilu 29:25.) Nghọta nyeere Jona aka ịchọpụta na o kwesịrị ilekwasị anya n’otú Jehova si enyere ya aka kama ịna-eche gbasara ihe nwere ike ime ya. Taakwa, anyị nwere ike ịkwụsị ịtụ ụjọ ma ọ bụrụ na anyị echee gbasara otú Jehova si nyere anyị aka ma chebe anyị n’oge gara aga. Anyị nwekwara ike iche gbasara ụmụnna anyị Jehova nyeere aka n’oge ha nwere nsogbu ma ọ bụ n’oge e nyere ha ọrụ siri ike n’ihi na ha tụkwasịrị ya obi kpamkpam.a (Hib. 13:6) Ka anyị tụkwasị Jehova obi anyị niile, nyekwara ndị ọzọ aka ime otú ahụ. Ọ ga-egosi na anyị nwere nghọta.
Akụkọ Jona na-akụziri anyị na nghọta ga-enyere anyị aka irubere ntụziaka Chineke nyere anyị isi, nyekwara anyị aka ịrụ ọrụ siri ike o nyere anyị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16)
MỤTA ICHE ECHICHE KA JEHOVA
17. Olee otú anyị ga-esi na-enwekwu nghọta?
17 Dị ka anyị kwurula, nghọta ga-enyere anyị aka ime ihe anyị kwesịrị ime ma nsogbu bịara anyị. Olee otú anyị ga-esi na-enwekwu nghọta? Ọ bụ Jehova ga-akacha enyere anyị aka. O ji Okwu ya na mmụọ nsọ ya na-enyere anyị aka inwe nghọta. (Nehe. 9:20; Ọma 32:8) Ọ na-enye anyị ndụmọdụ ndị ga-enyere anyị aka ime ihe dị mma ma dịrị nwayọọ. (Ọma 119:97-101) N’ihi ya, anyị ga na-enwekwu nghọta ma ọ bụrụ na anyị echebara ihe ndị e kwuru na Baịbụl echiche ma rịọ Jehova ka o nye anyị mmụọ nsọ ya dị ike. Ọ ga-enyere anyị aka ịna-ele ihe anya otú Jehova si ele ihe anya nakwa ịna-eme ihe Jehova chọrọ ka anyị na-eme.—Ilu 21:11, na ihe e dere n’ala ala peeji ya.
18. Gịnị ka i kpebisiri ike ime?
18 Ka anyị na-arịọ Jehova ka o mee ka anyị nwee nghọta, jirikwa ya kpọrọ ezigbo ihe. (Ọma 14:2) Ọ bụrụ na anyị ana-eme otú ahụ, anyị agaghị ‘akwụsị ịghọta ihe.’ (Ilu 21:16) Anyị ga-ekpebisikwu ike ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ ịna-egosi na anyị nwere nghọta n’oge ọ bụla nakwa n’ụdị ọnọdụ ọ bụla. Ọ ga-eme ka ‘ihe gaziere anyị.’
ABỤ NKE 42 Ekpere Ohu Chineke
a Dị ka ihe atụ, gụọ akụkọ Nwanna Georgiy Porchulyan n’isiokwu bụ́ “Akụkọ Ndụ Ndịàmà Jehova,” nke na-agba n’isiokwu dị iche iche na JW Library® nakwa na jw.org.