ONYE A KỌRỌ AKỤKỌ YA NA BAỊBỤL
Na-akata Obi ma Na-erubere Jehova Isi Ka Benaya
Benaya bụ dike obi kara. O jere ozi n’oge Eze Devid na Eze Solomọn na-achị. Ọ bụ nwa onye nchụàjà. Ndị nchụàjà anaghị abụ ndị agha. N’agbanyeghị ya, o so lụọrọ Jehova agha. O nwere ezigbo obi ike. Dị ka ihe atụ, o gburu ọdụm n’olulu mmiri, meriekwa onye iro gbara dimkpa nke ji ngwá agha. Devid tụkwasịrị Benaya obi nke na o mere ya onyeisi ndị nche ya.—2 Sam. 23:20-23.
Benaya ji obi ya niile kwado Devid n’oge Absalọm na Adọnaịja nupụụrụ Devid isi. (2 Sam. 8:18; 15:18; 1 Eze 1:8) Mgbe Devid mere agadi, Benaya so mee ka e chie Solomọn eze. (1 Eze 1:32-40) N’eziokwu, Benaya ji obi ya niile kwado Jehova na ndị o tere mmanụ, ma mgbe ndị ọzọ hapụrụ ha.
Anyịnwa kwesịrị ịkata obi ka anyị nwee ike ịlụso ajọ onye iro anyị bụ́ Ekwensu na ndị òtù ya ọgụ. Anyị kwesịkwara ikpebisi ike ịna-erubere iwu Jehova isi. (Efe. 6:11; 1 Pita 5:8, 9) Ọ bụrụgodị na ụfọdụ ndị ekpebie ịhapụ Jehova, anyị agaghị ahapụ ya. Obi siri anyị ike na ọ ga-akwụ anyị ụgwọ.—2 Sam. 22:26.