MEE 18 RUO 24, 2026
ABỤ NKE 35 Na-achọpụta Ihe Ndị Ka Mkpa
Gịnị Ka Ị Ga-eme Ka Ihe Ọ Bụla Ghara Imegharị Gị Anya?
“Gbalịanụ na-aghọta ihe Jehova chọrọ ka unu na-eme.”—EFE. 5:17.
IHE A GA-AMỤ
Otú anyị ga-esi lekwasị anya n’ihe ndị gbasara ofufe Jehova n’agbanyeghị ihe ndị nwere ike imegharị anyị anya.
1-2. Olee otú ihe dị mkpa nwere ike isi megharịa anyị anya?
OLEE mgbe ikpeazụ ị gbara mbọ ka ihe ọ bụla ghara imegharị gị anya? O nwere ike ịbụ na e nwere ihe mere ka uche gị pụọ n’ihe ị na-eme, ya adị mkpa ka i kpebie ihe ka mkpa. Dị ka ihe atụ, ka e were ya na mmadụ kpọrọ gị n’ekwentị mgbe ị na-anya ụgbọala. O nwere ike ịbụ na ozi onye ahụ chọrọ izi gị dị mkpa, mana ị ghọtara na ịza ya mgbe ahụ nwere ike imegharị gị anya. Ịgba mbọ ka uche gị dịrị n’ụgbọala ị na-anya ka mkpa.
2 E nwere ọtụtụ ihe dị mkpa anyị kwesịrị ime. Anyị makwa na ilekwasị anya n’ihe ndị gbasara ofufe Jehovaa kacha mkpa. (Mat. 6:33) E nwere ike iji ndị Jehova tụnyere ọkwọ ụgbọala na-akpachara anya. Anyị na-agbalị ịmata ihe ndị nwere ike ime ka uche anyị niile ghara ịdị n’ụzọ na-eduga ná ndụ anyị nọ na ya.—Ilu 4:25; Mat. 6:22.
3. Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu a? Oleekwa uru ọ ga-abara anyị?
3 E nweghị onye n’ime anyị bu n’obi ka e nwee ihe ndị ga-eme ka uche ya pụọ n’ofufe Jehova. N’agbanyeghị ya, anyị niile nwere ihe ndị nwere ike imegharị anyị anya. (Luk 21:34-36) N’ihi ya, iji nyere anyị aka ilekwasị anya n’ozi anyị na-ejere Jehova, anyị ga-ekwu banyere (1) ihe ndị nwere ike imegharị anyị anya, (2) ihe ndị Jizọs mere ka ihe ọ bụla ghara imegharị ya anya, na (3) ihe anyị ga-eme ka ihe ọ bụla ghara imegharị anyị anya taa.
OLEE IHE NDỊ NWERE IKE IMEGHARỊ ANYỊ ANYA?
4-6. Olee ihe ndị nwere ike imegharị anyị anya?
4 Anyị niile nwere ọtụtụ ihe anyị kwesịrị ime. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike ịna-arịa ọrịa ma ọ bụ nwee nsogbu ezinụlọ ma ọ bụ nsogbu nke anyị anyị kwesịrị ilebara anya. Nke bụ́ eziokwu bụ na ihe ndị a dị mkpa. Anyị kwesịkwara ilebara ha anya. Ma, hà nwere ike imegharị anyị anya? Ha nwere ike, ma ọ bụrụ na anyị echewezie naanị banyere ha, ha ewekọrọwa oge anyị na ume anyị niile.
5 Ihe ọzọ bụ na ọtụtụ n’ime anyị bi n’ebe e nwere tigbuo zọgbuo, ihe isi ike, ma ọ bụ ọrịa na-efe efe, bụ́ ihe ndị e ji mara oge ikpeazụ a. (2 Tim. 3:1) Ihe ndị a nwere ike ime ka anyị chịrị obi n’aka, ya emee ka anyị na-echezi gbasara ha mgbe niile.
6 O nwere ike ịbụ na anyị ma ndị ụdị nsogbu ndị ahụ gbanwerela ndụ ha. O doro anya na ha ga na-echegbu onwe ha. Jehova ekeghị ụmụ mmadụ ka ha na-ata ahụhụ ma ọ bụ na-echegbu onwe ha. Ọ bụ ya mere o ji adị ụfọdụ ndị ka nke ha ọ̀ gwụla ma ụdị nsogbu ahụ bịara ha. Ụfọdụ ndị ụdị nsogbu ahụ bịaara na-eji oge buru ibu na-eme onwe ha obi ụtọ ka ha nwee ike ichefu ya. Olee ihe anyị nwere ike ime ma ọ dị anyị otú ahụ? Ka anyị lee ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka Jizọs nke ga-enyere anyị aka ka ihe ọ bụla ghara ime ka uche anyị pụọ n’ofufe Jehova.
OLEE IHE NDỊ JIZỌS MERE KA IHE Ọ BỤLA GHARA IMEGHARỊ YA ANYA?
7. Gịnị gaara emegharị Jizọs anya?
7 E nwere ọtụtụ ihe gaara emegharị Jizọs anya, dị ka esemokwu obodo na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. N’oge ya, ọtụtụ ndị dara ogbenye, na-arịakwa ọrịa. (Mat. 14:14; Mak 14:7) Ma ndị Rom ma ndị Juu ibe ha na-emegbu ha. Mgbe ndị mmadụ hụrụ na Jizọs na-arụ ọrụ ebube, ha chọrọ ime ya eze. (Jọn 6:14, 15) Ihe ọzọ bụ na Setan nwara Jizọs ma kwuo na ọ ga-eme ya onye na-achị ụwa. A sị na Jizọs chọrọ, ọ gaara echewe na ọ ga-amagbu onwe ya ma ya chịwa ụwa. (Mat. 4:8, 9) E nwekwara mgbe Pita onyeozi bụ́ ezigbo enyi Jizọs gwara ya ka ọ ghara ịta ahụhụ. Ọ sịrị ya: “Meere onwe gị ebere, Onyenwe anyị.”—Mat. 16:21, 22.
8. Gịnị nyeere Jizọs aka ka ihe ọ bụla ghara imegharị ya anya?
8 Gịnị nyeere Jizọs aka ka ihe ọ bụla ghara imegharị ya anya? E nwere ihe atọ nyeere ya aka. Nke mbụ, o lere ihe anya otú Jehova si ele ya. (Jọn 8:28; 14:9) Nke abụọ, ọ nọ na-agbasi mbọ ike n’ozi Jehova. (Mat. 9:35) Nke atọ, ọ ghọtara nke ọma ihe dị mkpa n’eziokwu. (Jọn 4:34) Ọ bụ ya mere o ji jụ ihe Setan chọrọ inye ya. Mgbe Pita meteere ya ebere, ọ ma na Pita bu n’obi inyere ya aka. Ma ihe Pita gwara ya mee abụghị ihe Jehova chọrọ. (Mat. 4:10; 16:23) Jizọs ekweghị ka ihe ndị mmadụ chere, ihe ha kwuru, ma ọ bụ ihe ha mere mee ka uche ya pụọ n’ime uche Jehova. Taa, ihe ndị nwere ike imegharị anyị anya nwere ike ịdị iche n’ihe ndị ahụ chọrọ imegharị Jizọs anya. Mana, anyị ga-emeli ihe atọ ndị ahụ Jizọs mere ka anyị nwee ike iwere ife Jehova ka ihe kacha mkpa ná ndụ anyị.
GỊNỊ KA ANYỊ GA-EME KA IHE Ọ BỤLA GHARA IMEGHARỊ ANYỊ ANYA?
9. Gịnị ka ‘ịna-aghọta ihe Jehova chọrọ ka ị na-eme’ pụtara? (Ndị Efesọs 5:17)
9 Mụta iche echiche ka Jehova. Ime otú ahụ ga-eme ka ‘ị na-aghọta ihe Jehova chọrọ ka ị na-eme.’ (Gụọ Ndị Efesọs 5:17.) Anyị ga-amụta ihe dị Jehova mma ma anyị na-agụ Okwu ya, na-atụgharịkwa uche na ya. Anyị ga-emeli ya ọ bụrụgodị na Baịbụl ekwughị banyere nsogbu bịaara anyị. Olee otú anyị ga-esi eme ya? Ọ bụ ịmata otú Jehova si eche echiche na ikwe ka ọ na-eduzi anyị.
10. Olee otú anyị ga-esi mụta iche echiche ka Jehova?
10 Anyị ga-amụta otú Jehova si eche echiche ma anyị gụọ Baịbụl ma chee gbasara otú Jehova si emeso ndị mmadụ ihe. (Jere. 45:5) Ka anyị na-agụ akụkọ ndị ahụ, anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị: ‘Gịnị ka ihe a na-akụziri m banyere Jehova? Olee otú m ga-esi jiri ya gbanwee otú m si eche echiche?’ Nke bụ́ eziokwu bụ na otú Jehova si eche echiche dị elu karịa otú anyị si eche echiche. (Aịza. 55:9) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịrịọ ya n’ekpere ka ọ kụziere anyị otú anyị ga-esi na-eme uche ya. (Ọma 143:10) Anyị ga-arịọkwa ya ka o nyere anyị aka ịghọta otú o si eche echiche ma na-eche echiche ka ya.—1 Jọn 5:14.
11. Gịnị ka Jehova chọrọ ka anyị mee?
11 Ka anyị na-amụta iche echiche ka Jehova, anyị ga-aghọta na ọ chọrọ ka anyị gbaara ihe ọ bụla nwere ike imegharị anyị anya ọsọ ka anyị nwee ike ijikere maka mbibi a ga-ebibi ụwa ochie a. (Mat. 24:44) Ọ chọghị ka nchegbu nyịgbuo obi anyị. (Mat. 6:31, 32) Ọ bụ ya mere o ji enye anyị ezigbo ndụmọdụ ka anyị mara ihe anyị ga-eme ma anyị na-eche gbasara otú ahụ́ ga-esi gbasie anyị ike, ọrụ anyị, ụlọ anyị, ma ọ bụ nsogbu ndị ọzọ anyịnwa ma ọ bụ ezinụlọ anyị nwere. Ọ gwara anyị ka anyị tụkwasị ya obi na ọ ga-enye anyị amamihe na ike anyị ga-eji die nsogbu ọ bụla bịaara anyị.—Ọma 55:22; Ilu 3:5-7.
12. Gịnị ga-enyere anyị aka ịna-enwe obi ụtọ n’agbanyeghị ihe ọjọọ ndị na-eme n’ụwa a? (Matiu 5:3)
12 Na-eme ihe ndị gbasara ofufe Jehova. Ihe ọjọọ ndị na-eme n’ụwa taa na-eche anyị niile uche. Mana, anyị agaghị egbochili ha ime. N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị achọghị ka ha megharịa anyị anya, anyị kwesịrị ịna-agbasi mbọ ike n’ozi Jehova. Obi ga-adị anyị ụtọ ma ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe niile anyị ga-emeli ka anyị na Jehova na-adị ná mma. Ọ bụ ihe Jehova kere anyị ka anyị na-eme. (Gụọ Matiu 5:3.) Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịna-amụ Okwu ya bụ́ Baịbụl ka anyị matakwuo ya, na-agbasikwa mbọ ike ijere ya ozi otú ike kwere anyị. Anyị mee otú ahụ, anyị ga na-eme Jehova obi ụtọ maka na anyị ji oge anyị na-eme ihe bara uru.—Ilu 23:15.
13. Olee otú anyị ga-esi ‘jiri oge anyị na-eme ihe kacha mkpa’?
13 Anyị bụ́ Ndị Kraịst kpebisiri ike ‘iji oge anyị na-eme ihe kacha mkpa.’ (Efe. 5:15, 16) Anyị ghọtara na ihe Baịbụl na-agwa anyị abụghị naanị otú anyị ga-esi jiri oge anyị na-eme ihe ndị dịịrị anyị kwa ụbọchị. Kama, ọ na-agba anyị ume ka anyị kpachara anya n’ihe ndị anyị ji oge anyị eme tupu Jehova ebibie ụwa ochie a. Olee otú anyị ga-esi jiri oge anyị na-eme ihe ndị kacha mkpa? Ọ bụrụ na anyị ejiri oge buru ibu na-agụ ma ọ bụ na-ege akụkọ ndị gbasara ihe ọjọọ niile na-eme ugbu a, o nwere ike ime ka obi daa anyị mbà, meekwa ka anyị ghara inwe ume anyị ga-eji na-ejere Jehova ozi. Ọ kacha mma ka anyị ghara ikwe ka ịgụ ma ọ bụ ige ụdị akụkọ ahụ wekọrọ oge anyị niile. Ọ ga-eme ka anyị ghara ịna-echegbu onwe anyị, meekwa ka anyị nwee ike na oge anyị ga-eji mee ihe ndị gbasara ofufe Jehova. Anyị kwesịkwara iche otú anyị ga-esi wepụta oge jekwuoro Jehova ozi, dị ka ịgakwu nletaghachi. Anyị ghọtara na ọ dị ezigbo mkpa ka anyị jiri ohere ọ bụla nyere ndị mmadụ aka ‘ka a zọpụta ha, ka ha marakwa eziokwu nke ọma.’—1 Tim. 2:4.
14. Olee uru ịgbasi mbọ ike n’ozi Jehova na-abara anyị? (Kọwaakwa foto.)
14 Ọ bụrụ na anyị ana-agbasi mbọ ike n’ozi Jehova, ọ ga-eme ka anyị ghara ichefu ihe mere ọtụtụ ihe ọjọọ ji na-eme n’ụwa a. Anyị agaghị na-echegbu onwe anyị ma anyị hụ tigbuo zọgbuo, ịda ogbenye ma ọ bụ ọrịa na-efe efe maka na anyị ma na Baịbụl buru amụma na ha niile ga-eme. Kama ịtụwa ụjọ, obi ga-esi anyị ike na Jehova ga-emezu nzube ya n’ọdịnihu. Obi ga-eru anyị ala ma anyị na-atụkwasị Jehova obi na ọ ga na-enyere anyị aka ịtachi obi.—Ọma 16:8; 112:1, 6-8.
N’agbanyeghị ihe ọjọọ ndị na-eme n’ụwa, na-eme ihe ndị gbasara ofufe Jehova (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14)b
15. Gịnị ka ‘ịna-ele ihe anya otú dị mma’ ga-enyere anyị aka ime? (1 Pita 4:7)
15 Echefula ihe ndị ka mkpa. Ihe ka ọtụtụ ndị mkpa n’ụwa taa bụ ikpori ndụ. Ha anaghị eche banyere ọgwụgwụ ụwa a ji ọsọ na-abịa. Ikpori ndụ adịghị njọ. Ma, anyị kwesịrị ‘ịna-ele ya anya otú dị mma’ ka anyị ghara ịna-ele ya anya otú ndị ụwa si ele ya. (Gụọ 1 Pita 4:7.) Ọ ga-enyere anyị aka ka anyị ghara iji oge buru ibu na-ekpori ndụ ugbu a, kama ka anyị na-eme ezigbo mkpebi. Ime otú a na-egosi na anyị na-eche echiche ka Jehova, na-egosikwa na anyị ma ihe kacha mkpa.—2 Tim. 1:7.
16. Gịnị ka Jizọs lekwasịrị anya na ya mgbe ọ fọrọ obere ka e gbuo ya?
16 Jizọs echefughị ihe kacha mkpa. Mgbe ọ fọrọ obere ka e gbuo ya, bụ́kwanụ oge kacha siere ya ike, ihe ka ya mkpa bụ ka ọ ghara ịhapụ Jehova nakwa ka o mee uche Chineke. Ọ bụ ya mere o ji kpesie ekpere ike. Mana ndị na-eso ụzọ ya emeghị otú ahụ. Kama ịnọ na-ekpe ekpere, ụra buuru ha. “Ihe na-ewute ha n’obi mere ka ike gwụ ha.”—Luk 22:39-46; Jọn 19:30.
17. Gịnị mere ọtụtụ ndị ji aga n’Ịntanet? Olee otú o nwere ike isi mee ka uche anyị pụọ n’ihe ndị dị mkpa? (Kọwaakwa foto.)
17 Ike nwere ike ịgwụ anyị mgbe ụfọdụ otú ahụ ọ gwụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Ihe ndị na-eme n’oge ikpeazụ a nwere ike ịna-eche anyị uche. Ihe ụfọdụ ndị na-eme taa ka ha chefuo nsogbu ha bụ ịna-aga n’Ịntanet. Dị ka ihe atụ, ha na-eji ya ezigara ndị enyi ha na ndị ezinụlọ ha foto na ihe ndị na-eme ná ndụ ha. Ha na-eji ya ele ọtụtụ vidio, na-agbakwa gem. Ma, e nwere ọtụtụ ihe ọhụrụ ha ga-agụ ma lee nke na ọ na-ewekọrọ oge ha kwa ụbọchị. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-ele Ịntanet anya otú kwesịrị ekwesị, anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, sị, ‘Ịntanet ọ̀ na-eme ka m nweta onwe m, ka ọ̀ na-eme ka m chefuo ihe ndị dị mkpa n’eziokwu?’
Anyị kwesịrị ịna-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị ka Ịntanet na ihe ndị mmadụ ji eme onwe ha obi ụtọ ghara ime ka uche anyị pụọ n’ofufe Jehova (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17)
18. Gịnị mere anyị kwesịrị iji kpachara anya mgbe anyị na-ahọrọ ihe ndị anyị ji eme onwe anyị obi ụtọ?
18 Anyị kwesịkwara ịna-ele ihe anya otú dị mma ma anyị na-ele fim na tiivi ma ọ bụ n’Ịntanet, ma ọ bụ na-ele obere vidio ndị na-adị n’Ịntanet, ma ọ bụkwanụ na-agba gem. Ihe ndị a nwere ike ịtọ anyị ụtọ ma ọ bụ nyere anyị aka inwetatụ onwe anyị. Ma, anyị kwesịrị ịkpachara anya n’oge anyị na-eji eme ha nakwa n’ụdị ndị nke anyị na-ele ma ọ bụ na-agba. A na-enwekarị ọtụtụ vidio n’ebe a na-ele vidio. I lechaa otu, ọzọ apụta. Ụfọdụ vidio ndị ahụ nwere ike ịna-egosi omume rụrụ arụ ma ọ bụ tigbuo zọgbuo. Ọ bụ ihe a mere otu nwanna nọ n’Eshia. Ọ malitere ịga n’otu ebe a na-egosi vidio n’Ịntanet na-ele obere vidio na-egosi ihe ụfọdụ e mere na fim. Ka ọ na-ele vidio ndị a na-ewepụtara ya, ọ chọpụtara na ọ na-elezi ebe a na-eme omume rụrụ arụ. O mechakwara malite ile ndị gba ọtọ. Obi dị anyị ụtọ na ndị okenye na ezigbo ndị enyi ya nyeere ya aka, ya akwụsị ile ya, wepụkwa ihe ahụ o ji ele vidio ndị ahụ n’ekwentị ya. O kpebikwara oge ọ na-agaghị anọfe ma ọ na-apị ekwentị ya. Akụkọ a na-egosi na anyị kwesịrị ịkpachara anya ma anyị na-ahọrọ ihe ndị anyị ji eme onwe anyị obi ụtọ.
19. Gịnị nwere ike ime ma ihe ka anyị mkpa bụrụ ikpori ndụ?
19 Anyị kwesịkwara ịkpachara anya n’ihe ndị anyị ji ekpori ndụ nakwa mgbe anyị na-aga ezumike. Anyị niile kwesịrị ịna-eme anyị rụtụ ọrụ, anyị ewepụta oge zurutụ ike. Ọ ga-abara anyị uru, mee ka ahụ́ na-agbasi anyị ike. Ma, ọ bụrụ na anyị ekwe ka ihe ndị a na-ewekọrọ oge anyị, o nwere ike ime ka anyị ghara inwe oge anyị ga-eji na-eme ihe ndị ka mkpa. (Fil. 1:10) Anyị niile kwesịrị ikpebi ihe anyị ga-eme na oge anyị ga-eji na-eme ya. I kpebiwe ụdị ihe ahụ, jụọ onwe gị, sị: ‘Oge m na-eji eme onwe m obi ụtọ na oge m ji ezu ike ọ̀ na-egosi na m na-eche echiche nke ọma? M̀ na-agbalịsi ike iwere ihe dị mkpa n’eziokwu ka ihe dị mkpa, na-akwadebekwa onwe m maka “ọgwụgwụ ihe niile”?’
20. Olee uru ọ ga-abara anyị ma anyị gbaa mbọ ka ihe ọ bụla ghara imegharị anyị anya n’ofufe Jehova?
20 Ọ ga-abara anyị uru ma ọ bụrụ na anyị ana-agba mbọ ka ihe ọ bụla ghara ime ka uche anyị pụọ n’ihe ndị gbasara ofufe Chineke. (Aịza. 48:17) N’enyemaka Jehova, anyị ga-emerili nsogbu ndị na-abịara anyị. Ihe ndị na-eme n’ụwa agaghị eme ka anyị na-echegbu onwe anyị. Ihe ka anyị mkpa agaghị abụ ikpori ndụ. N’ihi ya, ka anyị kpebisie ike na anyị ga na-eche echiche ka Jehova, na-eme ihe ndị gbasara ofufe ya, uche anyị adịrịkwa n’ihe ndị kacha mkpa. Anyị mee otú ahụ, anyị agaghị ekwe ka ihe ọ bụla mee ka uche anyị pụọ n’ofufe Jehova. Kama anyị ‘ga-ejidesi ndụ nke bụ́ ezigbo ndụ aka ike.’—1 Tim. 6:19.
ABỤ NKE 129 Anyị Ga Na-atachi Obi
a NKỌWAKWU: Ihe ndị gbasara ofufe Chineke bụ ihe ndị dị ka ịmụ Baịbụl, ịga ọmụmụ ihe, inwe ofufe ezinụlọ, na ịga ozi ọma. Anyị na-efekwa Jehova mgbe anyị na-eso arụ ebe ndị anyị na-anọ amụ ihe ma na-elekọta ya, na-agbatara ndị ọdachi dakwasịrị ọsọ enyemaka, na-arụ ọrụ ná mgbakọ, ma ọ bụ na-eje ozi na Betel.
b NKỌWA FOTO: Ebe di na nwunye na-ekwusa ozi ọma kama ikwe ka ihe ndị na-eme n’ụwa mee ka uche ha pụọ n’ofufe Jehova.