Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w26 Febụwarị p. 26-29
  • “Ụmụ Bụ Onyinye Si n’Aka Jehova”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Ụmụ Bụ Onyinye Si n’Aka Jehova”
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2026
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IHE NDỊ NA-EME KA O SIE IKE
  • GỊNỊ KA JEHOVA CHỌRỌ KA NDỊ NNE NA NNA NA-EME?
  • JEHOVA CHỌRỌ INYERE GỊ AKA
  • Ndị Nne na Nna, Zụọnụ Ụmụ Unu Ka Ha Hụ Jehova n’Anya
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2019
  • Ndị Nne na Nna, Nyerenụ Ụmụ Unu Aka Ka Ha Hụ Jehova n’Anya
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Ndị Nne na Nna, Gboonụ Mkpa Ezinụlọ Unu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Ịzulite Ezinụlọ Siri Ike N’ụzọ Ime Mmụọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2026
w26 Febụwarị p. 26-29
Ebe otu nwoke na nwunye ya ji obi ụtọ kuru nwa ha nwaanyị.

“Ụmụ Bụ Onyinye Si n’Aka Jehova”

È NWEELA onye nyere gị onyinye i ji kpọrọ ezigbo ihe? O nwere ike ịbụ onye ị hụrụ n’anya nke ukwuu nyere gị ya. Olee ihe ị ga-eji onyinye ahụ mee? O doro anya na ị gaghị eji ya egwu egwu.

Baịbụl kpọrọ ụmụ “onyinye si n’aka Jehova.” (Ọma 127:3) Ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst na-ewere ụmụ ha ka onyinye magburu onwe ya si n’aka Nna ha nke eluigwe. Ha na-agbalịkwa ike ha niile igboro ụmụ ha mkpa ha, ime ka ahụ́ gbasie ha ike, ịhụ na ha na-enwe obi ụtọ, nakwa inyere ha aka ka ha na Jehova dịrị n’ezigbo mma.

Ma, ọ dị mwute na ụfọdụ ndị nne na nna taa anaghị ewere ụmụ ha ka onyinye si n’aka Chineke. (Aịza. 49:15; 2 Tim. 3:1-3) E nwere ndị nke ji obi ha chọọ ilekọta ụmụ ha, ma ihe ụfọdụ ana-eme ka ọ na-esiri ha ike. Olee ihe ụfọdụ nwere ike ime ka ọ na-esiri ndị nne na nna ike ilekọta ụmụ ha? Gịnị ka Jehova chọrọ ka ndị nne na nna na-emere ụmụ ha? Oleekwa otú ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst ga-esi azụlite ụmụ ha nke ọma?

IHE NDỊ NA-EME KA O SIE IKE

  • Nsogbu ndị ezinụlọ na ndị obodo na-enye. N’obodo ụfọdụ, a na-aka akwanyere ndị nne na nna mụjuru ụlọ ùgwù. N’ihi ya, di na nwunye nwere ike iche na ha kwesịrị ịmụta ọtụtụ ụmụ karịa otú ha ga-elekọtali n’ihi ihe ndị ezinụlọ ha ma ọ bụ ndị agbata obi ha na-atụ anya n’aka ha.

  • Iche gbasara ọdịnihu. N’obodo ụfọdụ, ụmụaka na-anwụkarị n’ihi erighị ihe na-edozi ahụ́, ọrịa, nakwa enweghị ọtụtụ ụlọ ọgwụ. Ihe a mere ka ụfọdụ ndị nne na nna na-achọ ịmụ ọtụtụ ụmụ ka e nwee ndị ọnwụ ga-egbufọ. Ụfọdụ di na nwunye nwere ike ịmụ ọtụtụ ụmụ ka ha jide n’aka na e nwere onye ga-ele ha nká. Ọ na-adịkarị otú ahụ n’ebe ndị ọchịchị na-anaghị elekọta ndị agadi.

  • Inweta ihe e ji egbochi afọ ime. N’ebe ụfọdụ, ọ naghị adịrị ndị di na nwunye mfe inweta ihe ndị e ji egbochi afọ ime. Ụfọdụ ga-enwetali naanị ndị nke na-abụghị nke ezigbo ya, ya emee ka ụjọ ọrịa o nwere ike ịkpatara ha na-atụ ha. E nwekwara ndị nke na-agaghị azụtali ihe ndị ahụ n’ihi na ha dị oké ọnụ.a

GỊNỊ KA JEHOVA CHỌRỌ KA NDỊ NNE NA NNA NA-EME?

Ebe otu nwoke na ndị ezinụlọ ya na-enwe obi ụtọ n’ebe ndị mmadụ na-aga ezurutụ ike. Nwoke ahụ weturu obi na-ege nwa ya nwaanyị ntị ka ọ na-ekwu uche ya, mama ha na nwa ya nwoke anọrọ na-atụ bọl.

Na-ewepụtara nwa gị nke ọ bụla oge

Na-egboro ụmụ gị mkpa ha. Jehova chọrọ ka ndị nne na nna na-egboro ụmụaka ha mkpa ha. Ọ chọrọ ka ha na-arụsi ọrụ ike ka ha nye nwa ha nke ọ bụla nri, uwe, na ebe obibi. Ọ chọkwara ka ndị nne na nna na-akụziri ụmụ ha ihe. N’ihi ya, ihe Ndị Kraịst bụ́ ndị nne na nna na-eme abụghị ịnọkata ziga ụmụ ha n’ụlọ akwụkwọ a na-ebi ebi. Kama, ha na-agba mbọ ka ha na ụmụ ha biri ka ha na-eto, ka ha nwee ike ilebara nwa ha nke ọ bụla anya mgbe ọ na-aga akwụkwọ. Ọ ga-eme ka obi ruo ụmụ ha ala, obi esiekwa ha ike na a hụrụ ha n’anya. Ma, Jehova na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị. Ọ naghị atụ anya na nne na nna ga-abarịrị ọgaranya. Nne na nna Jehova họọrọ ilekọta Ọkpara ya abụghị aka ji akụ̀. Ma, ha gbasiri mbọ ike ịna-elekọta ya.​—Mat. 13:55, 56; Luk 2:24.

Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “N’eziokwu, ọ bụrụ na mmadụ anaghị egboro ndị nke ya mkpa ha, nke ka nke, ndị ezinụlọ ya, onye ahụ ajụla Chineke, jọkarịakwa onye na-ekweghị na Chineke ná njọ.”​—1 Tim. 5:8.

Jehova ma na o nwere ike ịdị mkpa ka e lekọta ndị nne na nna mgbe ha kara nká. Otu ụzọ ụmụaka nwere ike isi sọpụrụ nne na nna ha bụ ịhazi otú ha ga-esi ele ha nká. (Ọpụ. 20:12; 1 Tim. 5:4) Ma, obi na-adị Jehova ụtọ ma ọ bụrụ na ihe dị ndị nne na nna mkpa bụ otú ha ga-esi elekọta ụmụ ha karịa otú ụmụ ha nwere ike isi elekọta ha.​—2 Kọr. 12:14.

Na-akụziri ụmụ gị gbasara Jehova. Ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst kwesịkwara ịna-akụziri ụmụ ha ka ha hụ Jehova n’anya ma na-efe ya. N’anya Jehova, ọ bụ ya bụ ihe kacha mkpa ndị nne na nna ga-akụziri ụmụ ha.​—Diut. 6:6, 7.

Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Na-azụnụ [ụmụ unu], na-agbazikwanụ ha otú Jehova chọrọ.”​—Efe. 6:4.

JEHOVA CHỌRỌ INYERE GỊ AKA

Ebe otu di na nwunye na-akparịta ụka n’ụlọ ha. Baịbụl mepere emepe dị na tebụl dị n’ihu ha.

Burunụ ụzọ kparịta ụmụ ole unu ga-achọ ịmụ

Mee atụmatụ. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmụ ụmụ, chebara otú ihe si dịrị gị echiche nke ọma. Dị ka ihe atụ, ị mụọ ọtụtụ ụmụ, ị̀ ga-enwe ego ị ga-eji na-akpa afọ ha, na-azụtara ha efe, na-azụkwa ha n’ụlọ akwụkwọ? Ọ bụrụ na ị gaghị emeli ya, gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị kpaa ụmụ ole unu ga-amụ ka unu nwee ike ilekọta ha otú Jehova chọrọ. Nke bụ́ eziokwu bụ na Jehova ghọtara na ọ bụghị ihe niile na-eme ná ndụ ka a na-emere atụmatụ. (Ekli. 9:11) Ma, ọ ga-agọzi mbọ ị na-agba ịzụ ụmụ gị otú ọ chọrọ.

Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Atụmatụ onye na-arụsi ọrụ ike ga-eme ka ihe gaziere ya, ma ndị niile ọ na-adị ngwa ngwa na-ada ogbenye.”​—Ilu 21:5.

“Ò nwere onye n’ime unu chọrọ ịrụ ụlọ elu, na-agaghị ebu ụzọ nọdụ ala gbakọọ ihe ọ ga-efu, ka ọ mara ma ò nwere ihe ga-ezu iji rụchaa ya?”​—Luk 14:28.

Meenụ ofufe Jehova ihe kacha mkpa n’ezinụlọ unu. Gbalịanụ mee ka ife Jehova bụrụ ihe kacha mkpa n’ezinụlọ unu. Ọ bụrụ na i nwere ụmụaka, gbaa mbọ nyere onye nke ọ bụla n’ime ha aka ka ọ hụ Jehova n’anya. Nyere ha aka ka ha na-ege ntị ma na-amụta ihe n’ọmụmụ ihe. Na-enwenụ Ofufe Ezinụlọ kwa izu. Kụziere ụmụ gị otú e si ekwusa ozi ọma. Ihe ndị a bụ ọrụ unu bụ́ ndị nne na nna kwesịrị ịrụ. Unu ekwesịghị ịhapụrụ ya ụmụ unu ndị toro eto ma ọ bụ ndị ikwu unu. Ịkụziri ụmụaka ka ha hụ Jehova n’anya abụghị obere ọrụ, ọ na-ewekwa oge. Ma, uru dị na ya karịrị akarị.

Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “E nweghị ihe na-eme m obi ụtọ karịa ihe a: na m ga-anụ na ụmụ m nọgidere na-eje ije n’eziokwu ahụ.”​—3 Jọn 4.b

Tụkwasị Jehova obi. Ma ị̀ na-eche echiche ịmụ ụmụ ma ọ bụ na ị mụọla amụọ, ka obi sie gị ike na ihe Jehova chọrọ ka i mee dị mkpa karịa ihe ndị obodo unu na-eme ma ọ bụ na-atụ anya ka i mee.

Foto ndị na-egosi: 1. Ebe nne na nna na nwa ha nwoke nọkọtara ọnụ n’ọmụmụ ihe. Nwa ha nwoke weliri aka ka ọ zaa ajụjụ. 2. Ebe otu nwanna na ezinụlọ ya nọ n’ozi ọma. Nwanna nwoke ahụ na nwa ha nwaanyị na-arụ, nwunye ya na ụmụ ha obere abụọ ndị ọzọ ana-arụ.

Ịkụziri ụmụaka ka ha hụ Jehova n’anya abụghị obere ọrụ, ọ na-ewekwa oge

I kpebie na ị gaghị amụ ọtụtụ ụmụ, obi sie gị ike na Jehova ga-egboro gị mkpa gị ma i mee agadi. N’agbanyeghị ihe ndị ọzọ chere, echela na ị ga-amụrịrị ụmụ naanị ka ọ bụrụ ha ga-ele gị nká. I kwesịghị ịtụwa ụjọ na e nweghị onye ga-elekọta gị ma ị kaa nká. Jehova kwere nkwa na ọ ga-elekọta gị. Ọ na-emezukwa nkwa ya niile.​—Josh. 23:14.

Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Jiri obi gị niile tụkwasị Jehova obi, atụkwasịla amamihe gị obi. N’ihe niile ị na-eme, chọpụta ihe bụ́ uche ya, ọ ga-emekwa ka ihe gaziere gị.”​—Ilu 3:5, 6.

“E nwere mgbe m bụ nwata. Ma ugbu a, abụzi m agadi. Ma ahụbeghị m ka a hapụrụ onye ezi omume ọ bụla, ahụbeghịkwa m ụmụ ya ka ha na-arịọ nri.”​—Ọma 37:25.

“N’ihi ya, burunụ ụzọ na-achọ Alaeze Chineke na ezi omume Chineke, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị ọzọ a niile.”​—Mat. 6:33.

Ụmụ bụ onyinye bara ezigbo uru Jehova nyere ndị nne na nna. Obi na-adị ya ezigbo ụtọ ma ndị nne na nna na-elekọta ụmụ ha otú ọ chọrọ. Ha na-eji obiọma egboro ụmụ ha mkpa ha, na-ahụ na ha na-enwe obi ụtọ, na-enyekwara ha aka ka ha na Jehova dịrị ná mma. Ha na-ekpebi ụmụ ole ha ga-amụ, werekwa ime uche Chineke ka ihe dị mkpa karịa omenala obodo ha. Ha na-esi otú ahụ egosi na ha ji ụmụ ha kpọrọ ezigbo ihe, ya bụ, na ha weere ụmụ ha ka “onyinye si n’aka Jehova.”

Ha Anaghị Akwa Mmakwaara

Ebe otu nwanna nwoke na-eduzi ofufe ezinụlọ. Ọ bụ ya na nwunye ya na obere ụmụ ha abụọ na-enwe ya.

Ihe ọ̀ na-esiri ndị nne na nna ike ma ha kpebie na ha agaghị amụ ọtụtụ ụmụ? Ọtụtụ ndị nne na nna bi n’obodo ihe na-esi ike na-eche gbasara ajụjụ a. Ka anyị hụ ihe ụfọdụ ndị nna bi n’ụdị obodo ndị ahụ kwuru.

È nwere ndị nyere gị nsogbu ka ị mụọ ọtụtụ ụmụ?

“Ee. Ma ụfọdụ ụmụnna. Otu di na nwunye sịrị anyị, ‘Gịnị mere o ji bụrụ naanị otu nwa nwoke ka unu mụtara? N’Afrịka ebe a, onye mụrụ naanị otu nwa nwoke yiri onye na-enweghị nke ọ mụtara. Onye mụrụ abụọ yiri onye mụtara naanị otu.’ Mgbe anyị mụdịrị nwa anyị nke abụọ bụ́ nwaanyị, a kwụsịghị inye anyị nsogbu ka anyị mụtakwuo ụmụ.”​—Jeremias

Ihe ò siiri gị ike maka na ị mụghị ọtụtụ ụmụ?

“Mba. O medịrị ka ihe dịrị anyị mfe. Ebe ọ bụ na mụ na nwunye m kpebiri na anyị agaghị amụ ọtụtụ ụmụ, o mere ka anyị nwee ike ịna-egbo mkpa anyị. Nke ka nke bụ na o mere ka anyị na Jehova dịrị n’ezigbo mma. A mụrụ anyị ọtụtụ. M na-echetakwa na ọ dịrịghị nne na nna m mfe inye anyị ihe ndị dị anyị mkpa nakwa ịzụ anyị n’ụlọ akwụkwọ.”​—Jeremias

Olee otú obi dị ụmụ gị gbasara mkpebi a unu mere?

“Obi dị ụmụ anyị ụtọ na ha anaghị ata ụdị ahụhụ ụmụaka ibe ha a mụrụ ọtụtụ na-ata n’ihi na nne na nna ha anaghị elekọta ha nke ọma.”​—Filipe

“Obi dị ụmụ anyị ụtọ n’ihi na obi ruru ha ala, ha amarakwa na anyị hụrụ ha n’anya. Anyị na ụmụnna ndị hụrụ Jehova n’anya nke ukwuu na-anọkarị. Ha gbakwara anyị ume ịna-emekwu nke ọma n’ofufe Jehova. Taa, ụmụ anyị na-eme ka ha.”​—Carlos

È nwere uru amụghị ọtụtụ ụmụ baara gị?

“O mere ka anyị nwee ike ịna-egboro ụmụ anyị mkpa ha nke ọma. Ihe dị ka afọ atọ gara aga, m kwụsịrị ịrụ ọrụ a na-akwụ m ezigbo ụgwọ. Ebe ọ bụ na anyị amụghị ọtụtụ ụmụ, o sicharaghị anyị ike inweta ihe ndị anyị ga-eji na-egbo mkpa anyị niile.”​—Jeremias

“Mkpebi anyị emeela ka anyị na-egboro ụmụ anyị mkpa ha ma na-eme ka okwukwe ha sie ike. O meekwala ka anyị nwee ike ịga nye aka n’ebe ndị a chọkwuru ndị nkwusa. Ọ dịkwuorola anyị mfe iwepụta oge na-akụziri nwa anyị nke ọ bụla ihe ma na-elekọta ya. Ụmụ anyị niile na-efe Jehova, na-achọkwa ụzọ ndị ha ga-esi na-agbakwu mbọ n’ozi ya.”​—Lenadi

Olee ihe ị ga-achọ ịgwa ndị nne na nna ndị ọzọ?

“Achọpụtala m na ihe Abụ Ọma 34:10 kwuru bụ eziokwu. Ọ sịrị: ‘Ihe ọma agaghị akọ ndị na-achọ Jehova.’ Jehova na-enye mụ na ezinụlọ m ihe niile dị anyị mkpa.”​—Rafael

a Ọ bụ di na nwunye ga-ekpebi ụmụ ole ha ga-amụ, mgbe ha ga-amụ ya, nakwa ihe ha ga-eji gbochie afọ ime. E nweghị onye kwesịrị ikpe ha ikpe maka ihe ha kpebiri ime. (Rom 14:4, 10-13) O doro anya na ha agaghị eme ihe ọ bụla ga-ete ime. Ihe ọzọ bụ na di na nwunye kpebiwe ụdị ihe a, ha kwesịrị icheta ndụmọdụ dị ná 1 Ndị Kọrịnt 7:3-5.

b Ụmụ e kwuru okwu ha n’amaokwu a bụ ụfọdụ ndị na-eso ụzọ Jizọs Jọn kụziiri eziokwu. Ma, obi na-adị ndị nne na nna otú ahụ ọ dị Jọn ma ụmụ ha na-efe Jehova.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya