“Ụmụ Bụ Onyinye Si n’Aka Jehova”
È NWEELA onye nyere gị onyinye i ji kpọrọ ezigbo ihe? O nwere ike ịbụ onye ị hụrụ n’anya nke ukwuu nyere gị ya. Olee ihe ị ga-eji onyinye ahụ mee? O doro anya na ị gaghị eji ya egwu egwu.
Baịbụl kpọrọ ụmụ “onyinye si n’aka Jehova.” (Ọma 127:3) Ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst na-ewere ụmụ ha ka onyinye magburu onwe ya si n’aka Nna ha nke eluigwe. Ha na-agbalịkwa ike ha niile igboro ụmụ ha mkpa ha, ime ka ahụ́ gbasie ha ike, ịhụ na ha na-enwe obi ụtọ, nakwa inyere ha aka ka ha na Jehova dịrị n’ezigbo mma.
Ma, ọ dị mwute na ụfọdụ ndị nne na nna taa anaghị ewere ụmụ ha ka onyinye si n’aka Chineke. (Aịza. 49:15; 2 Tim. 3:1-3) E nwere ndị nke ji obi ha chọọ ilekọta ụmụ ha, ma ihe ụfọdụ ana-eme ka ọ na-esiri ha ike. Olee ihe ụfọdụ nwere ike ime ka ọ na-esiri ndị nne na nna ike ilekọta ụmụ ha? Gịnị ka Jehova chọrọ ka ndị nne na nna na-emere ụmụ ha? Oleekwa otú ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst ga-esi azụlite ụmụ ha nke ọma?
IHE NDỊ NA-EME KA O SIE IKE
Nsogbu ndị ezinụlọ na ndị obodo na-enye. N’obodo ụfọdụ, a na-aka akwanyere ndị nne na nna mụjuru ụlọ ùgwù. N’ihi ya, di na nwunye nwere ike iche na ha kwesịrị ịmụta ọtụtụ ụmụ karịa otú ha ga-elekọtali n’ihi ihe ndị ezinụlọ ha ma ọ bụ ndị agbata obi ha na-atụ anya n’aka ha.
Iche gbasara ọdịnihu. N’obodo ụfọdụ, ụmụaka na-anwụkarị n’ihi erighị ihe na-edozi ahụ́, ọrịa, nakwa enweghị ọtụtụ ụlọ ọgwụ. Ihe a mere ka ụfọdụ ndị nne na nna na-achọ ịmụ ọtụtụ ụmụ ka e nwee ndị ọnwụ ga-egbufọ. Ụfọdụ di na nwunye nwere ike ịmụ ọtụtụ ụmụ ka ha jide n’aka na e nwere onye ga-ele ha nká. Ọ na-adịkarị otú ahụ n’ebe ndị ọchịchị na-anaghị elekọta ndị agadi.
Inweta ihe e ji egbochi afọ ime. N’ebe ụfọdụ, ọ naghị adịrị ndị di na nwunye mfe inweta ihe ndị e ji egbochi afọ ime. Ụfọdụ ga-enwetali naanị ndị nke na-abụghị nke ezigbo ya, ya emee ka ụjọ ọrịa o nwere ike ịkpatara ha na-atụ ha. E nwekwara ndị nke na-agaghị azụtali ihe ndị ahụ n’ihi na ha dị oké ọnụ.a
GỊNỊ KA JEHOVA CHỌRỌ KA NDỊ NNE NA NNA NA-EME?
Na-ewepụtara nwa gị nke ọ bụla oge
Na-egboro ụmụ gị mkpa ha. Jehova chọrọ ka ndị nne na nna na-egboro ụmụaka ha mkpa ha. Ọ chọrọ ka ha na-arụsi ọrụ ike ka ha nye nwa ha nke ọ bụla nri, uwe, na ebe obibi. Ọ chọkwara ka ndị nne na nna na-akụziri ụmụ ha ihe. N’ihi ya, ihe Ndị Kraịst bụ́ ndị nne na nna na-eme abụghị ịnọkata ziga ụmụ ha n’ụlọ akwụkwọ a na-ebi ebi. Kama, ha na-agba mbọ ka ha na ụmụ ha biri ka ha na-eto, ka ha nwee ike ilebara nwa ha nke ọ bụla anya mgbe ọ na-aga akwụkwọ. Ọ ga-eme ka obi ruo ụmụ ha ala, obi esiekwa ha ike na a hụrụ ha n’anya. Ma, Jehova na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị. Ọ naghị atụ anya na nne na nna ga-abarịrị ọgaranya. Nne na nna Jehova họọrọ ilekọta Ọkpara ya abụghị aka ji akụ̀. Ma, ha gbasiri mbọ ike ịna-elekọta ya.—Mat. 13:55, 56; Luk 2:24.
Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “N’eziokwu, ọ bụrụ na mmadụ anaghị egboro ndị nke ya mkpa ha, nke ka nke, ndị ezinụlọ ya, onye ahụ ajụla Chineke, jọkarịakwa onye na-ekweghị na Chineke ná njọ.”—1 Tim. 5:8.
Jehova ma na o nwere ike ịdị mkpa ka e lekọta ndị nne na nna mgbe ha kara nká. Otu ụzọ ụmụaka nwere ike isi sọpụrụ nne na nna ha bụ ịhazi otú ha ga-esi ele ha nká. (Ọpụ. 20:12; 1 Tim. 5:4) Ma, obi na-adị Jehova ụtọ ma ọ bụrụ na ihe dị ndị nne na nna mkpa bụ otú ha ga-esi elekọta ụmụ ha karịa otú ụmụ ha nwere ike isi elekọta ha.—2 Kọr. 12:14.
Na-akụziri ụmụ gị gbasara Jehova. Ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst kwesịkwara ịna-akụziri ụmụ ha ka ha hụ Jehova n’anya ma na-efe ya. N’anya Jehova, ọ bụ ya bụ ihe kacha mkpa ndị nne na nna ga-akụziri ụmụ ha.—Diut. 6:6, 7.
Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Na-azụnụ [ụmụ unu], na-agbazikwanụ ha otú Jehova chọrọ.”—Efe. 6:4.
JEHOVA CHỌRỌ INYERE GỊ AKA
Burunụ ụzọ kparịta ụmụ ole unu ga-achọ ịmụ
Mee atụmatụ. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmụ ụmụ, chebara otú ihe si dịrị gị echiche nke ọma. Dị ka ihe atụ, ị mụọ ọtụtụ ụmụ, ị̀ ga-enwe ego ị ga-eji na-akpa afọ ha, na-azụtara ha efe, na-azụkwa ha n’ụlọ akwụkwọ? Ọ bụrụ na ị gaghị emeli ya, gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị kpaa ụmụ ole unu ga-amụ ka unu nwee ike ilekọta ha otú Jehova chọrọ. Nke bụ́ eziokwu bụ na Jehova ghọtara na ọ bụghị ihe niile na-eme ná ndụ ka a na-emere atụmatụ. (Ekli. 9:11) Ma, ọ ga-agọzi mbọ ị na-agba ịzụ ụmụ gị otú ọ chọrọ.
Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Atụmatụ onye na-arụsi ọrụ ike ga-eme ka ihe gaziere ya, ma ndị niile ọ na-adị ngwa ngwa na-ada ogbenye.”—Ilu 21:5.
“Ò nwere onye n’ime unu chọrọ ịrụ ụlọ elu, na-agaghị ebu ụzọ nọdụ ala gbakọọ ihe ọ ga-efu, ka ọ mara ma ò nwere ihe ga-ezu iji rụchaa ya?”—Luk 14:28.
Meenụ ofufe Jehova ihe kacha mkpa n’ezinụlọ unu. Gbalịanụ mee ka ife Jehova bụrụ ihe kacha mkpa n’ezinụlọ unu. Ọ bụrụ na i nwere ụmụaka, gbaa mbọ nyere onye nke ọ bụla n’ime ha aka ka ọ hụ Jehova n’anya. Nyere ha aka ka ha na-ege ntị ma na-amụta ihe n’ọmụmụ ihe. Na-enwenụ Ofufe Ezinụlọ kwa izu. Kụziere ụmụ gị otú e si ekwusa ozi ọma. Ihe ndị a bụ ọrụ unu bụ́ ndị nne na nna kwesịrị ịrụ. Unu ekwesịghị ịhapụrụ ya ụmụ unu ndị toro eto ma ọ bụ ndị ikwu unu. Ịkụziri ụmụaka ka ha hụ Jehova n’anya abụghị obere ọrụ, ọ na-ewekwa oge. Ma, uru dị na ya karịrị akarị.
Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “E nweghị ihe na-eme m obi ụtọ karịa ihe a: na m ga-anụ na ụmụ m nọgidere na-eje ije n’eziokwu ahụ.”—3 Jọn 4.b
Tụkwasị Jehova obi. Ma ị̀ na-eche echiche ịmụ ụmụ ma ọ bụ na ị mụọla amụọ, ka obi sie gị ike na ihe Jehova chọrọ ka i mee dị mkpa karịa ihe ndị obodo unu na-eme ma ọ bụ na-atụ anya ka i mee.
Ịkụziri ụmụaka ka ha hụ Jehova n’anya abụghị obere ọrụ, ọ na-ewekwa oge
I kpebie na ị gaghị amụ ọtụtụ ụmụ, obi sie gị ike na Jehova ga-egboro gị mkpa gị ma i mee agadi. N’agbanyeghị ihe ndị ọzọ chere, echela na ị ga-amụrịrị ụmụ naanị ka ọ bụrụ ha ga-ele gị nká. I kwesịghị ịtụwa ụjọ na e nweghị onye ga-elekọta gị ma ị kaa nká. Jehova kwere nkwa na ọ ga-elekọta gị. Ọ na-emezukwa nkwa ya niile.—Josh. 23:14.
Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Jiri obi gị niile tụkwasị Jehova obi, atụkwasịla amamihe gị obi. N’ihe niile ị na-eme, chọpụta ihe bụ́ uche ya, ọ ga-emekwa ka ihe gaziere gị.”—Ilu 3:5, 6.
“E nwere mgbe m bụ nwata. Ma ugbu a, abụzi m agadi. Ma ahụbeghị m ka a hapụrụ onye ezi omume ọ bụla, ahụbeghịkwa m ụmụ ya ka ha na-arịọ nri.”—Ọma 37:25.
“N’ihi ya, burunụ ụzọ na-achọ Alaeze Chineke na ezi omume Chineke, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị ọzọ a niile.”—Mat. 6:33.
Ụmụ bụ onyinye bara ezigbo uru Jehova nyere ndị nne na nna. Obi na-adị ya ezigbo ụtọ ma ndị nne na nna na-elekọta ụmụ ha otú ọ chọrọ. Ha na-eji obiọma egboro ụmụ ha mkpa ha, na-ahụ na ha na-enwe obi ụtọ, na-enyekwara ha aka ka ha na Jehova dịrị ná mma. Ha na-ekpebi ụmụ ole ha ga-amụ, werekwa ime uche Chineke ka ihe dị mkpa karịa omenala obodo ha. Ha na-esi otú ahụ egosi na ha ji ụmụ ha kpọrọ ezigbo ihe, ya bụ, na ha weere ụmụ ha ka “onyinye si n’aka Jehova.”
a Ọ bụ di na nwunye ga-ekpebi ụmụ ole ha ga-amụ, mgbe ha ga-amụ ya, nakwa ihe ha ga-eji gbochie afọ ime. E nweghị onye kwesịrị ikpe ha ikpe maka ihe ha kpebiri ime. (Rom 14:4, 10-13) O doro anya na ha agaghị eme ihe ọ bụla ga-ete ime. Ihe ọzọ bụ na di na nwunye kpebiwe ụdị ihe a, ha kwesịrị icheta ndụmọdụ dị ná 1 Ndị Kọrịnt 7:3-5.
b Ụmụ e kwuru okwu ha n’amaokwu a bụ ụfọdụ ndị na-eso ụzọ Jizọs Jọn kụziiri eziokwu. Ma, obi na-adị ndị nne na nna otú ahụ ọ dị Jọn ma ụmụ ha na-efe Jehova.