Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w26 Febụwarị p. 20-25
  • Ì Jikerela Maka Nsogbu Ndị Nwere Ike Ịbịara Gị ma I Mechaa Baptizim?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ì Jikerela Maka Nsogbu Ndị Nwere Ike Ịbịara Gị ma I Mechaa Baptizim?
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2026
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • MGBE NWANNA MEJỌRỌ GỊ
  • MGBE IHE NDỊ Ị HAPỤRỤ GỤWARA GỊ AGỤỤ
  • MGBE NDỊ ỌZỌ HAPỤRỤ JEHOVA
  • Jehova “Na-akasi Ndị Obi Gbawara Obi”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
  • Dịrị Umeala n’Obi ma E Nwee Ihe Ị Na-amaghị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Na-echeta na Jehova Bụ “Chineke Dị Ndụ”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
  • Anyị na Ụmụnna Anyị Ịbụ Ezigbo Enyi Na-abara Anyị Uru
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2026
w26 Febụwarị p. 20-25

EPREL 27 RUO MEE 3, 2026

ABỤ NKE 99 Anyị Bụ Ìgwè Ụmụnna

Ì Jikerela Maka Nsogbu Ndị Nwere Ike Ịbịara Gị ma I Mechaa Baptizim?

“Nyere m aka ka m na-aga n’ụzọ gị.”​—ỌMA 17:5.

IHE A GA-AMỤ

Otú ndị e mere baptizim ọhụrụ ga-esi kwadebe maka nsogbu ndị nwere ike ịbịara ha ma ha mechaa baptizim.

1-2. Gịnị ka anyị nwere ike ime iji kwadebe maka nsogbu ndị nwere ike ịbịara anyị? Mee ihe atụ.

ANYỊ ma na nsogbu ga-abịara anyị n’ụwa Setan a. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: ‘A ga-enwerịrị ndị na-eme ka ndị ọzọ dapụ n’okwukwe.’ (Mat. 18:7) Iburu ihe ahụ Jizọs kwuru n’obi ga-enyere anyị aka ijikere maka nsogbu ndị nwere ike ịbịara anyị, ma nghọtahie anyị na ụmụnna anyị nwere ike inwe.

2 Ka anyị legodị otu ihe atụ. A na-agba ndị Jehova ume ka ha jikere ejikere maka ọdachi ndị na-emere onwe ha. Olee otú anyị si ejikere? Ihe mbụ anyị na-eme bụ ịchọpụta ụdị ọdachi ndị nwere ike ime n’ebe anyị bi. Ọ dị mkpa ka anyị mee ihe a karịchaa ma anyị kwaga ebe ọhụrụ. Anyị chọpụtachaa ụdị ọdachi ndị nwere ike ime, anyị ahazie ihe anyị ga-eme ma nke ọ bụla mee. (Ilu 21:5) Otú ahụkwa ka anyị kwesịrị ibu ụzọ chọpụta nsogbu ndị nwere ike ịbịara anyị ma anyị mechaa baptizim, anyị ebidozie ugbu a jikere maka nke ọ bụla n’ime ha. Anyị mee otú ahụ, nsogbu ndị ahụ agaghị akpa anyị aka ọjọọ. Ha agaghịkwa emebi adịm ná mma anyị na Jehova. (Ọma 17:5) N’ihi ya, ka anyị leba anya ná nsogbu atọ nwere ike ịbịara anyị nakwa otú anyị ga-esi akwadebe maka nke ọ bụla n’ime ha.a

MGBE NWANNA MEJỌRỌ GỊ

3. Olee otu nsogbu nwere ike ịbịara anyị ma anyị mechaa baptizim?

3 Ì chetara otú obi dị gị mgbe mbụ ị gara ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova ma hụ otú ha si hụ ibe ha n’anya? Ò mere ka obi sie gị ike na ị chọtala eziokwu? (Jọn 13:35; Kọl. 3:12) Ọ bụ otú ahụ ka ọ dị Nwanna Nwaanyị Blanca.b Ma, ihe ọ na-atụghị anya ya mere mgbe o mechara baptizim. Ọ sịrị: “Otu nwanna nwaanyị mere m ihe na-adịghị mma. M chọpụtakwara na ọ na-ekwu ihe na-adịghị mma gbasara ndị ọzọ. Atụghị m anya ya. A kụziiri m na Ndịàmà Jehova na-agbalịsi ike ka ha na ndị ọzọ dịrị n’udo. Ha na-ahụkwa ibe ha n’anya.” Nke bụ́ eziokwu bụ na ụmụnna gị na-agba mbọ ka ha na-akpakwu àgwà ka Ndị Kraịst. Mana, ha ezughị okè. (Efe. 4:23, 24; 1 Jọn 1:8) N’ihi ya, otu onye n’ime ha nwere ike ikwu ma ọ bụ mee ihe ga-ewute gị. (Jems 3:8) Ọ dị mwute na ụdị ihe a emeela ka ụfọdụ ndị kwụsị ife Jehova.

4. Gịnị ka ị ga-eme ugbu a ka i jikere ejikere maka mgbe nwanna ga-eme ihe ga-ewute gị? (Ndị Efesọs 4:32)

4 Gịnị ka ị ga-eme ugbu a ka i jikere ejikere maka mgbe nwanna ga-eme ihe ga-ewute gị? Gbaa mbọ na-eme ihe e kwuru ná Ndị Efesọs 4:32. (Gụọ ya.) Ọ bụrụ na ị na-adị obiọma ma na-emere ndị ọzọ ebere, ọ ga-eme ka gị na ndị mmadụ ghara ịna-enwekarị nsogbu. Kpebie ịna-agbaghara ndị mmadụ kpamkpam ma ha mejọọ gị. Gịnị ga-enyere gị aka ime ya? Chee ugboro ole ị na-arịọ Jehova ka ọ gbaghara gị mmehie gị nakwa otú o si agbaghara gị kpamkpam. (Mat. 6:12) Ọ bụrụ na obi adịrị gị ụtọ maka otú Jehova si adị njikere ịgbaghara gị, ọ ga-adịrị gị mfe ịgbaghara ndị ọzọ.

5. Olee amaokwu Baịbụl ga-enyere anyị aka ma mmadụ mejọọ anyị? (Ilu 19:11) (Kọwaakwa foto.)

5 Gụọ Ilu 19:11. Baịbụl sịrị na e mejọọ anyị, nghọtac ga-eme ka anyị ghara iwe iwe ọsọ ọsọ. Ihe a nyeere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Rima aka. O tebeghị e mere ya baptizim. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na ụmụnna emee ihe wutere m, m na-echeta Ilu 19:11. M na-echebara otú ihe si dịrị ha na otú e si zụlite ha echiche. M na-eche ihe mere ha ji mee ihe ha mere. M na-agbalịkwa ka mụ na ha rụọ n’ozi ọma. Ọ na-enyere m aka ịmatakwu ha.” Ihe a nwanna nwaanyị a kwuru dị mma. I kwesịrị ịgbalị mata ụmụnna gị nke ọma ugbu a. Ka ị na-amatakwu ha, o nwere ike ịdịkwuru gị mfe ịgbaghara ha ma ha mee ihe wutere gị.

Foto ndị na-egosi: 1. Ebe iwe na-ewe otu nwanna maka ihe nwanna ọzọ gwara ya mgbe ha na-emezi ihe mebiri n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. 2. Mgbe e mechara, obi dị nwanna ahụ a kpasuru iwe ụtọ mgbe ya na nwanna ahụ kpasuru ya iwe na-arụ n’ozi ụlọ n’ụlọ.

Ọ bụrụ na gị na nwanna enwee nghọtahie, gbalịa ka gị na ya rụọ n’ozi ọma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5)


6. Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị na ụmụnna nọ n’ọgbakọ na-adị ná mma?

6 Olee ihe i nwere ike ime ka gị na ụmụnna gị na-adị ná mma? Ka ị na-amatakwu ụmụnna gị, gbalịa lekwasị anya n’àgwà ọma ha. (I nwere ike ịtụle Ilu 10:12; Rom 12:10; Fil. 2:2, 3) Ka anyị lee otú ime ihe a si nyere otu nwanna mere baptizim ọhụrụ aka. Aha ya bụ Mark. Ka ya na ụmụnna nọ n’ọgbakọ ha na-anọkwu, ọ malitere ịchọpụta àgwà ụfọdụ ha nwere na-adịghị ya mma. Gịnị nyeere Mark aka ka ihe ndị ahụ ọ hụrụ ghara ime ka ọ kwụsị ife Jehova? Ọ sịrị: “M bịara chọpụta na m na-elekwasị anya n’ụmụ obere ihe ha na-anaghị emeta. E nweghị oké ihe ha bụ ma e jiri ha tụnyere àgwà ọjọọ juru n’ụwa a. M ghọtara na ekwesịghị m ịna-eche gbasara ihe ndị ụmụnna m na-anaghị emeta. N’ihi ya, m lekwasịziri anya n’àgwà ọma ndị ha nwere.” Gịnwa mee ụdị ihe a, ọ ga-eme ka gị na ụmụnna nọ n’ọgbakọ na-adị ná mma.

MGBE IHE NDỊ Ị HAPỤRỤ GỤWARA GỊ AGỤỤ

7. Gịnị nwere ike ime ka ihe ndị anyị hapụrụ fewe Jehova gụwa anyị agụụ?

7 Mgbe mbụ ị mụtara eziokwu, o doro anya na obi tọrọ gị ụtọ ịhapụ ụwa Setan. I nwere ike ịna-eche, sị: ‘Olee otú ọ ga-esi gụwa mmadụ agụụ ọzọ?’ Ma, nsogbu bịara gị, i nwere ike ịmalite chewe gbasara ụfọdụ n’ime ihe ndị ị na-emebu ma ọ bụ ihe ndị i nwere tupu gị amalite ife Jehova. O nwekwara ike ịgụwa gị agụụ inwetaghachi ihe ndị ahụ. (I nwere ike ịtụle Ọnụ Ọgụgụ 11:4-6.) Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ụmụnna anyị kpebiri ịhapụ ọrụ mere ka a mara ha amara n’ihi na ọ naghị enye ha ohere ime ihe ndị gbasara ofufe Jehova. E nwekwara ndị nke ezigbo ndị enyi ha hapụrụ mgbe ha malitere ịmụ Baịbụl. Ndị ọzọkwa gbasiri mbọ ike kwụsị àgwà na-atọgbu ha atọgbu Jehova kpọrọ asị. Ọ ga-ajọgbu onwe ya ma Onye Kraịst kwe ka ihe ndị ahụ ọ hapụrụ mee ka ya na Jehova gharazie ịdị ná mma. Gịnị ka i nwere ike ime ugbu a ka ị ghara ịlaghachi n’ihe ndị ị hapụrụ fewe Jehova n’agbanyeghị nsogbu bịaara gị?

8. Gịnị ka anyị mụtara n’akụkọ Ebreham na Sera?

8 Baịbụl kọrọ gbasara ọtụtụ ndị ihe ndị ha hapụrụ fewe Jehova gaara agụwa agụụ. Dị ka ihe atụ, Ebreham na nwunye ya Sera rubeere Jehova isi mgbe ha hapụrụ obodo Ọọ gaa biri n’ụlọikwuu. Obodo ahụ mara ezigbo mma, mgbidi siri ezigbo ike gbakwara ya gburugburu. (Hib. 11:8, 9) O doro anya na e nwere mgbe ụfọdụ ha chetara ihe ndị ha nwere n’obodo Ọọ. Ma, “a sị na ha nọ na-echeta” ihe ndị ahụ ma ọ bụ na ihe ndị ahụ ha hapụrụ gụwara ha agụụ, ha nwere ike ikpebi ịlaghachi obodo ahụ. Kama ime otú ahụ, ha lekwasịrị anya n’ọdịnihu.​—Hib. 11:15, 16.

9. Olee otú Pọl onyeozi si were ihe ndị ọ hapụrụ? (Ndị Filipaị 3:7, 8, 13)

9 Pọl onyeozi gbanwere ihe ụfọdụ ná ndụ ya iji fewe Jehova. Dị ka ihe atụ, tupu ya aghọọ Onye Kraịst, ọ gụrụ gbasara Iwu ndị Juu. Ọ bụ Gameliel kụziiri ya ihe. (Ọrụ 22:3) Pọl gaara abụ nnukwu mmadụ n’okpukpe ndị Juu. (Gal. 1:13, 14) Ma, mgbe ọ nabatara ozi ọma gbasara Kraịst, ọ hapụrụ ihe ndị ahụ niile. Ihe ọ̀ dịịrị ya mfe mgbe ọ ghọrọ Onye Kraịst? Mba. E tiri ya ihe, tụọ ya mkpọrọ, ndị obodo ya kpọkwara ya asị. (2 Kọr. 11:23-26) Ọ bụrụ na ọ nọ na-eche mgbe niile gbasara otú ihe si dịrị ya tupu ya aghọọ Onye Kraịst, jiri ya tụnyere otú ihe sizi dịrị ya, ọ gaara akwa mmakwaara ihe mere o ji sowe Jizọs. Ma, Pọl emeghị otú ahụ. Kama, ọ nọ na-eche gbasara ihe ọma meere ya na ọ bụ onye na-eso ụzọ Jizọs, na-atụsikwa anya ike ụgwọ ọrụ magburu onwe ya ọ ga-enweta n’ọdịnihu. Obi siri Pọl ike na ngọzi ndị ahụ karịrị ihe ọ bụla ọ hapụrụ.​—Gụọ Ndị Filipaị 3:7, 8, 13.

10. Olee ihe anyị kwesịrị ịna-eche gbasara ya mgbe niile? (Mak 10:29, 30) (Kọwaakwa foto.)

10 Gịnị ka anyị na-amụta na ya? Ọ bụrụ na ị malite icheta ihe ndị ị hapụrụ tupu gị aghọọ Onye Kraịst, gbalịakwa cheta ihe mere i ji hapụ ha. (Ekli. 7:10) Jiri ihe ndị ị hapụrụ tụnyere ihe ọma ndị meerela gị n’ihi na ị mụtara eziokwu. Dị ka ihe atụ, gị na Ọkaakaa eluigwe na ụwa bụ ezigbo enyi. (Ilu 3:32) Ụmụnna gị zuru ụwa ọnụ hụrụ gị n’anya. (Gụọ Mak 10:29, 30.) I nwekwara olileanya magburu onwe ya. (Aịza. 65:21-23) Ọ bụrụ na ị na-eche mgbe niile gbasara ihe ọma ndị meerela gị n’ihi na ị na-efe Jehova, ị gaghị achọ ịlaghachi n’ihe ndị ahụ ị hapụrụ.

Kama ịnọ na-eche gbasara ihe ndị ị hapụrụ fewe Jehova, ka obi dị gị ụtọ n’ọrụ ikwusa ozi ọma Jehova nyere gị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10)e


11. Gịnị ka ị mụtara n’akụkọ Nwanna Nwaanyị Rosemary?

11 E nwere otu nwanna nwaanyị mere baptizim mgbe ọ dị ihe dị ka afọ iri ise. Aha ya bụ Rosemary. Legodị ihe o mere ka ihe ndị ọ hapụrụ bata n’ọgbakọ ghara ịgụwa ya agụụ. Ọ sịrị: “Mgbe m ghọrọ Onyeàmà Jehova ọhụrụ, obi anaghị adị m mma n’oge Krismas n’ihi na ọ bụ oge mụ na ndị ezinụlọ anyị na-ejibu anọrị. Inye ndị m hụrụ n’anya onyinye na-atọgbu m atọgbu. N’oge ahụ, obi na-adị m ụtọ ma m hụ ka ụmụaka gbara osisi Krismas gburugburu, ihu abụrụ ha ọchị ọchị ma ha mepee onyinye m nyere ha.” Gịnị nyeere ya aka? Ọ sịrị: “Achọtara m ihe m ga-eji dochie Krismas. Kwa afọ, n’ụbọchị na-abụghị Krismas, m na-akpọkọta ndị ezinụlọ m, nye ha onyinye, gwakwa ha ihe ha na-eme na-eme m obi ụtọ.” E nwekwara ihe ọzọ siiri Nwanna Nwaanyị Rosemary ike. Ọ sịrị: “Mgbe m mụtara eziokwu, ndị enyi m hapụrụ m. Oge ụfọdụ, obi na-ajọ m njọ n’ihi na mụ na ha anaghịzi anọrị. M chọkwara ndị mụ na ha ga na-anọrị.”d Gịnị nyeere ya aka? Ọ malitere ịhazi ka ya na ụmụnna nwaanyị dị iche iche na-arụ n’ozi ọma. Ọ sịrị: “M si otú ahụ meta ndị enyi ọhụrụ m hụrụ n’anya. M jikwa ha kpọrọ ihe.” Gịnị ka i nwere ike ịmụta n’aka ya? Ọ bụrụgodị na e nwere ihe ndị na-emebu gị obi ụtọ tupu gị abata n’ọgbakọ, cheta na i nwere ike iji ihe ụfọdụ ka mma, ndị nwekwara ike ime ka ị na-enwekwu obi ụtọ ugbu a, dochie ha. (Fil. 4:8, 9) Chetakwa na Jehova ga-enye gị ihe karịrị ihe niile ị hapụrụ iji fee ya.

MGBE NDỊ ỌZỌ HAPỤRỤ JEHOVA

12. Olee ihe nwere ike ịgbawa anyị obi n’ọgbakọ?

12 Mgbe ị ghọrọ Onyeàmà Jehova, o nwere ike ịbụ na obi dị gị ụtọ na ị hapụla ụwa ọjọọ a ma bata n’ebe a na-akụzi eziokwu nakwa n’ebe ndị nọ na ya na-agbalị ime ihe dị mma. (Aịza. 65:14) Ma mgbe ụfọdụ, i nwere ike ịnụ na nwanna nọ n’ọgbakọ mere mmehie dị oké njọ. E nwedịrị ike ikewapụ mmadụ n’ọgbakọ. (1 Kọr. 5:13) Legodị otú ihe a si kpaa otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Samar aka ọjọọ. Ọ sịrị: “Obere oge m mechara baptizim, otu okenye mere mmehie dị oké njọ, e kewapụkwa ya n’ọgbakọ. Ọ fọrọ obere ka m pụọ n’ọgbakọ n’ihi na ekwetaghị m na okenye ga-emehieli Jehova na ọgbakọ ya.” Nke bụ́ eziokwu bụ na obi kwesịrị isi anyị ike mgbe niile na ụmụnna anyị hụrụ Jehova n’anya, chọọkwa iji obi ha niile na-efe ya. (1 Kọr. 13:4, 7) Ma, ọ dị mwute na a na-ekewapụ ụfọdụ ndị n’ọgbakọ kwa afọ. O nwekwara ike ịka gbawaa anyị obi ma ọ bụrụ na onye anyị na ya dị n’ezigbo mma ma ọ bụkwanụ onye anyị na-akwanyere ùgwù kpebiri ime ihe ọjọọ.

13. Olee otú anyị ga-esi kwadebe onwe anyị ugbu a ka anyị ghara ịkwụsị ife Jehova ma onye anyị na ya dị ná mma hapụ Jehova?

13 Olee otú i nwere ike isi kwadebe onwe gị ugbu a ka ị ghara ịkwụsị ife Jehova ma onye gị na ya dị ná mma hapụ Jehova? Gbalịa na-eme ka gị na Jehova dịkwuo ná mma. (Jems 4:8) Ekwela ka ihe ga-eme ka gị na Jehova dịrị ná mma bụrụ maka na ya na onye ọzọ dị ná mma. Dị ka ihe atụ, ọ bụ eziokwu na anyị na ndị ezinụlọ anyị na ndị ọgbakọ anyị na-efekọkarị Jehova ọnụ, ma anyị kwesịkwara ịna-ekpe ekpere ma na-agụ Baịbụl n’onwe anyị.​—Ọma 1:2; 62:8.

14. Gịnị ka anyị na-amụta n’akụkọ Pita? (Jọn 6:66-68)

14 Anyị nwekwara ike ịmụta ihe n’ihe Pita onyeozi mere mgbe ọtụtụ ndị kwụsịrị iso Jizọs. Ọ ga-abụkwa na e nwere ihe na-edochaghị Pita anya n’oge ahụ. Ma, lee ihe o kwuru na Jọn 6:66-68. (Gụọ ya.) Kama Pita ime ihe ndị ọzọ mere, o lekwasịrị anya n’eziokwu ndị Jizọs kụziiri ha. Ihe a mere ka Pita ghara ịkwụsị iso Jizọs. Taakwa, ọ bụrụgodị na ndị ọzọ akwụsị ife Jehova, cheta na ọ bụ ọgbakọ a kụziiri gị eziokwu gbasara Jehova. Ahapụkwala eziokwu ahụ. Nwanna Nwaanyị Samar anyị kwuburu okwu ya sịrị, “M na-echetara onwe m mgbe niile na otu onye nọ n’ọgbakọ mee ihe ọjọọ, ọ pụtaghị na ndị niile nọ n’ọgbakọ na-eme ihe ọjọọ ma ọ bụ na ihe ọgbakọ Jehova na-akụzi abụghị eziokwu. M na-echetakwara onwe m na Jehova anaghị akwado àgwà ọjọọ.”

15. Gịnị ka ị mụtara n’akụkọ Emily?

15 Chegodị ihe mere Nwanna Nwaanyị Emily. Mgbe naanị otu izu gachara o mere baptizim, mama ya gbahapụrụ ezinụlọ ha, e kewapụkwa ya n’ọgbakọ. Ọ sịrị: “E nwetụbeghị mgbe m chere na ụdị ihe a ga-eme. Ọ bụ ya bụ ihe kacha siere m ike. Ọ na-ewutekwa m na mụ na mama m anọghịzi.” Gịnị nyeere nwanna nwaanyị a aka? Ọ sịrị: “Ọ bụghị naanị m nọ. Papa m hụrụ m n’anya nke ukwuu. Ọ na-elekọtakwa m nke ọma. Ụmụnna nọ n’ọgbakọ wekwaara m ka onye ezinụlọ ha. Onye ọ bụla n’ime anyị nwere ọnwụnwa nke ya. Ọ bụ ya mere o ji dị mkpa ugbu a ka anyị na ibe anyị dịrị ná mma nakwa ka anyị na-agba ibe anyị ume.” (1 Pita 5:9) Echela ka nsogbu bịa tupu gị emee ka gị na ụmụnna gị dịrịkwuo ná mma. Gbalịa na-eme otú ahụ ugbu a. Ọ ga-eme ka ụmụnna gị na-enyere gị aka ma na-agba gị ume n’agbanyeghị ihe ọ bụla merenụ.

16. Gịnị ka anyị kwesịrị icheta? (Kọwaakwa foto.)

16 Chetakwa na Jehova na-adọ ndị ọ hụrụ n’anya aka ná ntị. (Hib. 12:6) Ọ chọrọ ka ndị niile e kewapụrụ n’ọgbakọ lọghachite. (2 Pita 3:9) N’ihi ya, ọ bụrụ na e nwere onye gị e kewapụrụ n’ọgbakọ, obi sie gị ike na ndị okenye ga-eme ihe niile ha ga-emeli iji nyere ya aka ịlọghachikwute Jehova.​—2 Tim. 2:24, 25.

Ebe ndị okenye abụọ gara ileta otu nwoke e kewapụrụ n’ọgbakọ. Otu okenye ji Baịbụl e mepere emepe, okenye nke ọzọ ana-egosi nwoke ahụ otu isiokwu dị na broshọ bụ́ “Lọghachikwute Jehova.”

Ọ bụrụ na e kewapụ onye gị na ya dị ná mma n’ọgbakọ, cheta na ndị okenye chọrọ inyere ya aka ka ọ lọghachikwute Jehova (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16)f


17. Gịnị ka obi kwesịrị isi anyị ike na ya?

17 Anyị ekwuola gbasara nsogbu ole na ole i nwere ike inwe ma i mechaa baptizim. Nke bụ́ eziokwu bụ na ụfọdụ n’ime ha siri ike. Ma egwu atụla gị. E nwere ọtụtụ ihe ị ga-eme iji kwadebe onwe gị. Echefukwala na Jehova ga-enyere gị aka irubere ya isi. O bidola inyere gị aka. Ọ chọkwara inyere gị aka ruo mgbe ebighị ebi. (1 Pita 5:10) Ọ ga na-enye gị ike mgbe niile, meekwa ka ị na-atachi obi n’ọnwụnwa ọ bụla bịaara gị. Ọ bụrụ na i kwe ka Jehova na-enyere gị aka, ọ ga-enyere gị aka ka ọnwụnwa ọ bụla bịaara gị ghara ime ka ị kwụsị ife ya.​—Ọma 119:165; Rom 8:38, 39.

GỊNỊ KA ANYỊ NWERE IKE IME IJI KWADEBE MAKA NSOGBU NDỊ A NWERE IKE ỊBỊARA ANYỊ?

  • Nwanna kpasuo anyị iwe

  • Ihe ndị anyị hapụrụ gụwa anyị agụụ

  • E kewapụ mmadụ n’ọgbakọ

ABỤ NKE 154 Ịhụnanya Adịghị Ada Ada

a Ọ bụ eziokwu na ihe e dere n’isiokwu a bụ maka ndị e mere baptizim ọhụrụ, ma ọ ga-abara anyị niile uru.

b Aha a kpọrọ ndị mmadụ n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

c Nghọta na-eme ka anyị ghara iwe iwe ọsọ ọsọ ma mmadụ mee anyị ma ọ bụ gwa anyị ihe na-adịghị mma. Ọ na-eme ka anyị chee ihe mere onye ahụ ji kwuo ihe o kwuru ma ọ bụ mee ihe o mere. Ihe a ga-enyere anyị aka ịgbaghara nwanna mejọrọ anyị.

d Anyị niile nwere ike ime ka ahụ́ ruo ndị a na-amụrụ ihe na ndị e mere baptizim ọhụrụ ala n’ọgbakọ. Ọ bụghị naanị ndị na-amụrụ ha ihe ga-eme ya. Gụọ isiokwu bụ́ “Otú Ọgbakọ Ga-esi Enyere Ndị A Na-amụrụ Baịbụl Aka Iru Eru Ime Baptizim.” Ọ gbara n’Ụlọ Nche Mach 2021, paragraf nke 15 na nke 16.

e NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna nwaanyị nọ n’ozi ọma hụrụ ndị òtù egwuregwu na-agba bọl. O chetara oge yanwa so n’òtù egwuregwu. Mgbe e mechara, nwanna nwaanyị ahụ na-ezi otu nwaanyị so n’òtù egwuregwu ozi ọma. O nwere ike ịbụ na ha abụọ nọbu n’otu òtù egwuregwu.

f NKỌWA FOTO: Ebe ndị okenye abụọ gara na nke otu nwoke e kewapụrụ n’ọgbakọ, na-agba ya ume ka ọ lọghachikwute Jehova.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya