Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w26 Febụwarị p. 30-p. 31 para. 7
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2026
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Echiche Bible Banyere Udo na Ntụkwasị Obi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi Dị Nso!
    Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya?
  • Ile Anya Gabiga “Udo na Ntụkwasị” nke Mmadụ Guzobere
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2026
w26 Febụwarị p. 30-p. 31 para. 7
Ebe ndị ọchịchị ụwa kwụ n’akụkụ isi ụlọ ọrụ Òtù Mba Ụwa, na-agwa ìgwè mmadụ obi dị ụtọ na ‘udo adịla, na obi eruokwala ha ala.’

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Olee mgbe mba dị iche iche ga-asị: “Udo adịla, obi eruokwala anyị ala”?

Dị ka anyị hụrụ ‘n’Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ’ nke gbara n’Ụlọ Nche Nọvemba 2025, n’oge na-adịghị anya, Jehova ga-eme ka imezu “nzube ya” dịrị n’obi “mpi iri ahụ,” ya bụ, ndị ọchịchị niile. Nzube ya ahụ bụ ka ha nye ‘anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie,’ ya bụ, Òtù Mba Ụwa, ike na ikike ha. Ihe ọzọ a kpọrọ anụ ọhịa ahụ bụ ‘ihe yiri anụ ọhịa ahụ.’ (Mkpu. 13:14, 15; 17:3, 16, 17) “Mpi iri ahụ” na anụ ọhịa ahụ e nyere ikike ọhụrụ ga-ebibizi okpukpe ụgha n’ụwa niile. Ndị ọchịchị hà ga-ekwu na ‘udo adịla, na obi eruokwala ha ala’a tupu e bibie okpukpe ụgha, ka ọ̀ bụ mgbe e bibichara ya?​—1 Tesa. 5:3.

Anyị amaghị kpọmkwem mgbe mba dị iche iche ga-asị na ‘udo adịla, na obi eruokwala ha ala.’ Ọ bụrụ na anyị ma ihe niile gbasara ya, ọ gaghịzi adị mkpa ka anyị mụrụ anya ma na-eche nche. Ma, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ọtụtụ ugboro ka ha ‘na-eche nche.’ (Mat. 24:42; 25:13; 26:41) Ka anyị lebazie anya n’amụma Pọl onyeozi si n’ike mmụọ nsọ buo n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Tesalonaịka.

Pọl dere, sị: “Mgbe ọ bụla ha na-asị, ‘Udo adịla, obi eruokwala anyị ala!’ a ga-ebibi ha na mberede mgbe ha na-atụghị anya ya.” (1 Tesa. 5:2, 3) Otú akwụkwọ anyị si akọwa ihe a Pọl kwuru bụ: Ndị ọchịchị ga-asị na ‘udo adịla, na obi eruokwala ha ala’ obere oge tupu oké mkpagbu amalite. Ihe oké mkpagbu ahụ ga-eji amalite bụ mbibi a ga-ebibi Babịlọn Ukwu, ya bụ, okpukpe ụgha niile e nwere n’ụwa. Anyị kwukwara na ha kwuo na ‘udo adịla, na obi eruokwala ha ala,’ anyị ga-amata na oké mkpagbu achọwala ịmalite.

Ma, mgbe anyị lebakwuuru ihe a anya nke ọma, o yiri ka è nwere otú ọzọ e nwere ike isi ghọta ya. O nwere ike ịbụ na ha ga-ekwu na ‘udo adịla, na obi eruokwala ha ala’ mgbe e bibichara okpukpe ụgha. Gịnị mere anyị nwere ike iji kwuo otú ahụ? Legodị ajụjụ ndị a.

Olee otú okpukpe ụgha sirila tinye aka n’agha mba dị iche iche? Baịbụl sịrị: “A hụkwara ọbara . . . ndị niile e gburu n’ụwa n’ime gị [ya bụ, “oké nwaanyị akwụna ahụ,” bụ́ Babịlọn Ukwu].” (Mkpu. 17:1, 5; 18:24) Kemgbe ụwa, okpukpe ụgha na-akwado agha. Ọ bụkwa ya kpatara ọtụtụ tigbuo zọgbuo na ogbugbu e gburu ọtụtụ nde mmadụ. N’ihi ya, ihe okpukpe ụgha na-akpata bụ agha na tigbuo zọgbuo, ọ bụghị udo na obi iru ala. Ihe a emeela ka e nwee ajụjụ ọzọ a ga-aza: Mba dị iche iche hà ga-asị na ‘udo adịla, na obi eruokwala ha ala’ naanị mgbe ha bibichara Babịlọn Ukwu? O nwere ike. Ma anyị ejighị n’aka.

Gịnị ga-eme ma mba dị iche iche kwuchaa na ‘udo adịla, na obi eruokwala ha ala’? Pọl sịrị: “A ga-ebibi ha na mberede mgbe ha na-atụghị anya ya.” (1 Tesa. 5:3) Ihe a kọwara n’amaokwu a sịrị: “Ihe Pọl kwuru ebe a gosiri na a gaghị enwecha oge n’agbata mgbe mba dị iche iche ga-asị na ‘udo adịla, na obi eruokwala ha ala’ na mgbe a ga-ebibi ha. Ọ ga-eme na mberede. Ha agaghịkwa agbanahụli ya.” Ọ bụrụ na ndị ọchịchị ụwa ekwuo na ‘udo adịla, na obi eruokwala ha ala’ mgbe e bibichara okpukpe ụgha, ibibi mba ndị ahụ niile ga-esochizi na mberede.

Gịnị ka ndị Jehova ga-eme mgbe ihe ndị a e buru n’amụma ga-eme? Pọl sịrị: “Ma ụmụnna anyị, unu anọghị n’ọchịchịrị. N’ihi ya, ụbọchị ahụ agaghị abịa unu na mberede otú chi si abọkwute ndị ohi.” (1 Tesa. 5:4) Chegodị echiche: Ọ bụrụ na ha ekwuo na ‘udo adịla, na obi eruokwala ha ala’ mgbe e bibichara okpukpe ụgha, ndị Jehova ga-amatazi na oge a ga-ebibi mba dị iche iche eruola. Ma n’anya mba dị iche iche, mbibi ha ga-abịa otú chi si abọkwute ndị ohi, ya bụ, na mberede, mgbe ha na-atụghị anya ya.

E nwere otu ihe anyị ma: N’oge na-adịghị anya, “mpi iri ahụ” na anụ ọhịa ahụ e nyere nnukwu ikike ga-ebibi okpukpe ụgha. Ọ ga-abụ mmalite oké mkpagbu. Anyị makwa na e nwere oge ọ ga-eru, mba dị iche iche ekwuo na ‘udo adịla, na obi eruokwala ha ala.’ Olee mgbe ọ ga-eme? Anyị ekwuola oge abụọ o nwere ike ịbụ. Nke mbụ: Ha nwere ike ikwu ya tupu ha ebibie okpukpe ụgha. Nke abụọ: Ha nwere ike ikwu ya mgbe ha bibichara okpukpe ụgha. Anyị ga-echere ka anyị hụ otú ọ ga-esi eme. Mgbe a na-aghọtakarị amụma Baịbụl nke ọma bụ mgbe ọ na-emezu ma ọ bụ mgbe o mezuchara.​—I nwere ike ịtụle Jọn 12:16.

Ka ọ dịgodị, ihe kacha mkpa abụghị mgbe mba dị iche iche ga-asị na ‘udo adịla, na obi eruokwala ha ala,’ kama ọ bụ irubere Chineke isi. Anyị kwesịrị ‘ịmụrụ anya ma na-eche echiche nke ọma’ ka anyị nwee ike ịdị njikere n’agbanyeghị nke bu ụzọ mee n’ime ihe ndị a.​—1 Tesa. 5:6.

a Otú Pọl onyeozi si kwuo ya gosiri na e nwere ike ọ bụghị naanị otu ugboro ka ha ga-ekwu ihe a.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya