Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w26 Febụwarị p. 14-19
  • Na-agbasi Mbọ Ike Ka I Ruo Eruo Ime Baptizim

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Na-agbasi Mbọ Ike Ka I Ruo Eruo Ime Baptizim
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2026
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IHE NA-EGBOCHI ỤFỌDỤ NDỊ IME BAPTIZIM
  • IHE MERE I JI KWESỊ ỊNA-ECHETA NA ỌGWỤGWỤ ỤWA A ADỊLA NSO
  • URU IME BAPTIZIM UGBU A GA-ABARA GỊ
  • Ihe Baptizim Pụtara na Uru Ọ Bara
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2026
  • Ị̀ Dịla Njikere Inyefe Jehova Onwe Gị?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
  • “Na-eso” Jizọs ma I Mechaa Baptizim
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
  • Mee Baptizim n’Egbughị Oge
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2026
w26 Febụwarị p. 14-19

EPREL 20 RUO 26, 2026

ABỤ NKE 49 Ka Anyị Na-eme Ka Obi Jehova Ṅụrịa

Na-agbasi Mbọ Ike Ka I Ruo Eruo Ime Baptizim

“Ugbu a bụ oge Chineke na-emere anyị amara karịchaa.”​—2 KỌR. 6:2.

IHE A GA-AMỤ

Ọ bụ ugbu a ka i kwesịrị ịgba mbọ ka gị na Jehova bụrụ ezigbo enyi, gị emeekwa baptizim.

1. (a) Olee uru ụfọdụ anyị na-erite ma anyị mee baptizim? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a?

Ì NYEFEELA Jehova onwe gị ma mee baptizim? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ pụtara na ị rịọla Chineke ka o mee ka i nwee ezigbo akọnuche. (1 Pita 3:21) Baptizim i mere nwere ike ime ka ndị na-eto eto na ndị ọhụrụ na-abịa ọmụmụ ihe n’ọgbakọ unu chọọkwa ime baptizim. N’ihi ya, mkpebi i mere magburu onwe ya. Ma, gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na i mebeghị baptizim? O doro anya na ị hụrụ Jehova n’anya, chọọkwa ime uche ya. Ị ma na ị kwesịrị ime baptizim ma ọ bụrụ na ị chọrọ ka Chineke gbaghara gị mmehie gị, gị na ya adịkwa ná mma. (Ọrụ 2:38-40) Ma, o nwere ike ịna-esiri gị ike ikpebi ime baptizim. Olee ihe nwere ike inyere gị aka? N’isiokwu a, anyị ga-atụle (1) ihe na-egbochi ụfọdụ ndị ime baptizim, (2) ihe mere i ji kwesị ịna-echeta na ọgwụgwụ ụwa a adịla nso, na (3) uru ndị ị ga-erite ma ị gbaa mbọ mee baptizim n’egbughị oge.

IHE NA-EGBOCHI ỤFỌDỤ NDỊ IME BAPTIZIM

2. Gịnị na-egbochi ụfọdụ ndị ime baptizim?

2 Ihe na-egbochi ụfọdụ ndị ime baptizim bụ ụjọ. Dị ka ihe atụ, ọ bụ eziokwu na ha chọrọ ife Jehova, mana ha nwere ike ịna-atụ ụjọ na ha agaghị emeli ihe dị Jehova mma. Ọ bụrụ na ọ dị gị otú ahụ, gụọ amaokwu Baịbụl ndị nwere ike inyere gị aka ikweta na Jehova anaghị atụ anya ka i zuo okè nakwa na ofufe ị na-efe ya na-eme ya obi ụtọ ma ọ bụrụhaala na i ji ike gị niile na-efe ya. (Ọma 103:13, 14; Kọl. 3:23) Ọ bụrụ na ụjọ na-atụ gị na a ga-akpagbu gị, rịọ Jehova n’ekpere ka o nye gị ụdị obi ike o nyere ọbụ abụ ahụ sịrị: “Jehova nọnyeere m. Agaghị m atụ egwu. Gịnị ka mmadụ ga-emeli m?”​—Ọma 118:6.

3. Olee ihe ọzọ nwere ike igbochi ụfọdụ ime baptizim? (Kọwaakwa foto.)

3 Ụfọdụ ndị hụrụ Jehova n’anya ekwebeghị eme baptizim maka na ha chere na ha amatachabeghị Baịbụl. Ma, olee otú mmadụ ga-amataru Baịbụl tupu ya emee baptizim? Chegodị otu akụkọ Baịbụl kọrọ. Mgbe ala ọma jijiji mere n’ụlọ mkpọrọ Pọl onyeozi na Saịlas nọ, ha ziri onye na-elekọta ụlọ mkpọrọ ahụ na ndị ezinụlọ ya ozi ọma. Ọ ga-abụ na nwoke ahụ na ndị ezinụlọ ya matara na Chineke rụrụ ọrụ ebube. Ihe ọzọ bụ na ha mụtara ọtụtụ ihe n’abalị ahụ. N’ihi ya, ha kpebiri ime “baptizim n’egbughị oge.” (Ọrụ 16:25-33) Ọ bụrụ na ị ma Jehova ma jiri obi gị niile hụ ya n’anya, mata ihe ndị bụ́ isi Baịbụl na-akụzi, chegharịa ná mmehie gị, kpebisiekwa ike ịna-erubere Jehova isi, i jikerela ime baptizim.​—Mak 12:30.

Ebe Pọl na Saịlas na-ekwusara onye na-elekọta ụlọ mkpọrọ na ezinụlọ ya ozi ọma n’abalị. Ha niile nọ na-ege ntị nke ọma.

Pọl na Saịlas kwusaara onye na-elekọta ụlọ mkpọrọ na ndị ezinụlọ ya ozi ọma, ha ‘emee baptizim n’egbughị oge’ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 3)


4. Olee ihe ụfọdụ ndị na-eche na-egbochi ha ime baptizim? (Kọwaakwa foto.)

4 E nwere ndị chọrọ ime ihe dị Chineke mma, ma ha ana-echegbu onwe ha gbasara ihe ọ ga-efu ha. E nwee ihe anyị chọrọ ikpebi, ọ dị mma ka anyị chee ihe ọ ga-efu anyị. (Luk 14:27-30) Ma, ụfọdụ ndị na-echegbu onwe ha gbasara ihe ndị ha kwesịrị ịhapụ iji jeere Chineke ozi. Ọ bụ ihe a ka otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Candace mere. Mgbe ọ dị obere, ọ mụtara ihe mmadụ kwesịrị ime iji mee Jehova obi ụtọ. Mana, o kweghị eme ya. Ma, o mechara bidokwa ịmụ Baịbụl mgbe o toro. Ọ sịrị: “Ama m ihe m kwesịrị ịna-emere Jehova. Ma, otú m si ebi ndụ na-atọ m ụtọ n’agbanyeghị na m ma na ọ dịghị Chineke mma. Ama m na ọ ga-esiri m ike ịhapụ ihe ọjọọ ndị ahụ m na-eme.” E nwekwara ndị chere na ha agaghị emeli ihe Jehova na-atụ anya ka ndị mere baptizim na-eme. Obi ha na-agwa ha na ha mechaa baptizim, ha nwere ike ime mmehie dị oké njọ, e kewapụ ha n’ọgbakọ. Ọ bụrụ na ị na-eche ụdị ihe ahụ, olee ihe nwere ike inyere gị aka?

Ebe otu nwanna nwaanyị na-amụrụ otu nwaanyị Baịbụl. Mgbe nwanna nwaanyị ahụ na-ekwu okwu, nwaanyị ahụ ji uche ya na-ahụ ka ya na ndị enyi ya na-aṅụ mmanya na-aba n’anya ma na-agba egwu n’ụlọ oriri na nkwari n’abalị.

Ụfọdụ ndị chọrọ ime ihe dị Chineke mma na-echegbu onwe ha gbasara ihe ndị ha ga-ahapụ iji fee Chineke (A ga-akọwa ya na paragraf nke 4)


5. Olee ihe anyị kwesịrị ichebakwuru echiche ma anyị chewe ma ànyị ga-eme baptizim? (Matiu 13:44-46)

5 Anyị chọọ ịzụ ihe, anyị anaghị eche naanị ego ole anyị ga-azụ ya. Anyị na-echekwa uru ihe ahụ ga-abara anyị. Ọ bụrụ na uru ya karịrị ego ole anyị ga-azụ ya, anyị nwere ike ịzụ ya ozugbo. Otú ahụ ka ọ dịkwa ma anyị chewe ma ànyị ga-eme baptizim. Anyị ekwesịghị iche naanị otú ọ ga-esi siere anyị ike ịgbanwe ihe ndị anyị kwesịrị ịgbanwe. Anyị ga-echekwa nnukwu uru adịm ná mma anyị na Jehova ga-abara anyị. Jizọs ji ihe atụ abụọ kụzie ihe a. (Gụọ Matiu 13:44-46.) N’ihe atụ nke ọ bụla, ọ kọrọ gbasara otu nwoke rere ihe niile o nwere ka ọ zụta ihe bara ezigbo uru ọ hụrụ. Gịnwa enwetala ihe bara ezigbo uru, ya bụ, eziokwu banyere Alaeze Chineke. Ọ bụrụ na ị na-eche ma ibi ndụ otú dabara n’eziokwu Baịbụl ọ̀ ga-abara gị ezigbo uru, chee gbasara ihe atụ Jizọs ndị ahụ. Jụọ onwe gị, sị: ‘Obi ò siri m ike na eziokwu a m chọtara bara ezigbo uru? Èji m adịm ná mma mụ na Jehova, olileanya ịdị ndụ ebighị ebi, na ụmụnna hụrụ m n’anya o nyere m kpọrọ ezigbo ihe?’ Ihe ị zara n’ajụjụ ndị a nwere ike inyere gị aka ịmata ihe ị ga-eme ka i jiri eziokwu ị mụtara kpọrọkwuo ihe ma ọ bụ mata ihe na-egbochi gị ime ihe i kwesịrị ime.

6. Gịnị ga-enyere gị aka inwe ezigbo obi?

6 N’ihe atụ Jizọs mere gbasara ọgha mkpụrụ, ọ kọwara na ụfọdụ ndị nụrụ ozi ọma agaghị eme ihe ha nụrụ n’ihi ụdị obi ha nwere. Mana, Jizọs kwukwara na ụfọdụ ndị ‘ga-eji ezigbo obi nụ okwu ahụ’ ma mee ihe ha mụtara. (Luk 8:5-15) N’ihi ya, ọ bụrụ na obi esighị gị ike na ị ga-emeli ihe ị na-amụta, adala mbà. Jehova ga-enyere gị aka ‘ịgbanwe ụdị obi i nwere’ ka i nwee ike ịchọ irubere ya isi. Kpee ekpere rịọ Jehova ka o nyere gị aka iji ihe ị na-amụta kpọrọ ihe ma na-eme ya eme ná ndụ gị.​—Ezik. 18:31; 36:26.

7-8. Gịnị na-egbochi ụfọdụ ndị na-eto eto ime baptizim? (Kọwaakwa foto.)

7 Ụfọdụ ndị na-eto eto hụrụ Jehova n’anya anaghị agba mbọ ime baptizim n’ihi ihe ndị ọzọ kwuru. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị nkụzi nwere ike ịna-adụ ụmụ akwụkwọ ọdụ ka ha lewe omume ụfọdụ anya ka ihe dị mma n’agbanyeghị na Jehova sịrị na ha adịghị mma. Mana, ụdị ndụmọdụ ahụ na-akpata nsogbu. (Ọma 1:1, 2; Ilu 7:1-5) I nwere ike izere ụdị nsogbu ahụ ma ị na-eme ihe otu ọbụ abụ mere. Ọ sịrị Jehova: “M na-aghọta ihe karịa ndị nkụzi m niile maka na m na-echebara ihe ndị ị na-echetara m echiche.”​—Ọma 119:99.

8 Ihe ndị e kwuru gosiri na ụfọdụ ndị nne na nna bụ́ Ndịàmà Jehova na-eme ka o siere ụmụ ha ike ikpebi ime baptizim. Ihe na-aka ha mkpa bụ agụmakwụkwọ ụmụ ha na ihe ndị ha ga-emecha rụwa, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ha enyereghị ụmụ ha aka ka ofufe Jehova bụrụ ihe ka ha mkpa. Ì chere na e nwere ihe nne na nna gị ga-emekwu iji nyere gị aka ka i ruo eruo ime baptizim? Ọ bụrụ otú ahụ, gị na ha kwurịta ya. Ka obi sie gị ike na afọ ole ị dị ekwesịghị igbochi gị ime ka gị na Jehova dị n’ezigbo mma.​—Ilu 20:11.

Ebe otu nwanna na-eto eto na ndị mụrụ ya na-akparịta ụka, ya ana-egosi ha akwụkwọ “Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi” isi nke 23.

Gị na nne na nna gị kwurịta gbasara ime baptizim (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8)


9. Gịnị nwere ike ime ka ụfọdụ ndị gbuwe oge ime baptizim?

9 Ụfọdụ ndị rurula ka e mee ha baptizim nwere ike igbuwe oge maka na e nwere onye ha na-eche ka ha na ya mee baptizim n’otu oge. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ na ha chọrọ ka ha na enyi ha ma ọ bụ onye ezinụlọ ha mee baptizim n’otu ụbọchị. O doro anya na gị na onye gị na ya dị n’ezigbo mma nwere ike ime baptizim n’otu ụbọchị. Ma, ụdị ihe ahụ ò kwesịrị igbochi gị ime baptizim ugbu a? Cheta na ọ bụ naanị gị kwere Jehova nkwa mgbe i nyefere ya onwe gị. N’ihi ya, i kwesịghị ichewe ka onye ọzọ kpebie ime baptizim tupu gịnwa emee baptizim.​—Rom 14:12.

IHE MERE I JI KWESỊ ỊNA-ECHETA NA ỌGWỤGWỤ ỤWA A ADỊLA NSO

10. Gịnị nwere ike ime ka ụfọdụ ndị gbuwe oge ime baptizim?

10 E wezụga ihe ndị ahụ anyị kwurula, ụfọdụ ndị nwere ike igbuwe oge ime baptizim n’ihi na ha chere na oge fọrọ tupu e bibie ụwa ochie a ka buru ibu. Ma, echiche ahụ ọ̀ dabara adaba? Jizọs dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị, sị: “Dịrịkwanụ njikere, n’ihi na Nwa nke mmadụ na-abịa n’oge unu na-echeghị na ọ ga-abụ.”​—Luk 12:40.

11. Dị ka e kwuru n’Abụ Ọma 119:60, ọ bụrụ na anyị amatakwuo Jehova, olee otú anyị ga-esi na-ele iwu ya anya?

11 Ọ bụ otú anyị si hụ Jehova n’anya ga-eme ka anyị nyefee ya onwe anyị ma mee baptizim. Ọ bụrụ na anyị amatakwuo Chineke anyị hụrụ anyị n’anya, anyị ga na-achọkwu iji iwu ya kpọrọ ihe ma na-edebe ya ozugbo a kụziiri anyị ya. (Gụọ Abụ Ọma 119:60.) Jems bụ́ onye na-eso ụzọ Jizọs kwuru ihe ọzọ mere anyị ji kwesị irubere iwu Jehova isi ozugbo, ya bụ na o nweghị onye n’ime anyị ma ihe ga-eme echi. N’ihi ya, anyị kwesịrị iji ụbọchị ọ bụla “mee ihe dị mma,” nke bụ́ ihe anyị ma na Jehova chọrọ ka anyị mee.​—Jems 4:13-17.

12. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe atụ Jizọs mere banyere ubi vaịn?

12 Chegodị gbasara ihe atụ Jizọs mere banyere ubi vaịn. Ọ kọwara na ụfọdụ ga-arụ ọrụ naanị otu awa ma nweta ụgwọ ọrụ a kwụrụ ndị rụrụ ọrụ ụbọchị ahụ niile. Ma, gịnị mere na ndị ahụ rụrụ ọrụ naanị otu awa amaliteghị ọrụ n’oge? Ha sịrị: “N’ihi na ọ dịghị onye goro anyị ọrụ.” Ọ bụghị na ndị ọrụ ahụ achọghị ịrụ ọrụ ụbọchị ahụ niile, kama e nweghị onye goro ha ọrụ. Mgbe e goro ha ọrụ, ha bidoro ọrụ ozugbo. (Mat. 20:1-16) Taa, Jizọs akpọọla anyị ka anyị bụrụ ndị na-eso ụzọ ya ma soro na-ekwusa ozi ọma. Anyị kwesịrị ịmalite ozugbo anyị nụrụ òkù ahụ.

13. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe mere nwunye Lọt?

13 Ụfọdụ nwere ike ịna-egbu oge ịna-emekwu nke ọma n’ofufe Jehova n’ihi na ha chere na ha ga-agbanwe ma ọ fọ obere ka ọgwụgwụ bịa. Ma, ka ị na-egbukwu oge ka ọ ga-esikwuru gị ike ịgbanwe fewe Chineke. Jizọs ma ihe a. Ọ bụ ya mere o ji gwa ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Chetanụ nwunye Lọt.” (Luk 17:31-35) O doro nwunye Lọt anya na Jehova ga-ebibi Sọdọm na Gọmọra n’oge na-adịghị anya. Ma, ọ dịghị njikere ịhapụ ihe ndị o nwere. (Jen. 19:23-26) Ihe mere ya na-echetakwara anyị na e nwere oge Jehova wepụtara ka ndị mmadụ gbanwee ma bịa fewe ya. Oge ahụ zuo, o nweghịzi onye ga-abịali fewe ya.​—Luk 13:24, 25.

14. Gịnị ka amụma ndị Baịbụl buru banyere ọgwụgwụ ụwa ochie a kwesịrị ime ka i mee?

14 Ka ụbọchị ọ bụla na-agafe ka ihe ndị na-eme n’ụwa na-emezu amụma Baịbụl gbasara oge anyị a. Ọ bụrụgodị na ụfọdụ n’ime ha emewebeghị n’ebe i bi, ịhụ ihe ndị na-eme n’ebe dị iche iche kwesịrị ime ka ị mata na i kwesịghị igbuwe oge ime baptizim. Ka anyị legodị ihe mere n’oge ndịozi. Pita onyeozi gwara Ndị Kraịst ka ha ‘mụrụ anya’ n’ihi na “ọgwụgwụ ihe niile adịla nso.” (1 Pita 4:7 na ihe e dere n’ala ala peeji ya.) O yiri ka “ọgwụgwụ” o kwuru okwu ya n’amaokwu a bụ oge a ga-ebibi Jeruselem na ụlọ nsọ ya. Ndị Pita degaara akwụkwọ ozi ahụ bi n’ebe dị anya na Jeruselem. N’ihi ya, mbibi a ga-ebibi obodo ahụ agaghị akpa ha aka. (1 Pita 1:1) Ma, ozugbo ha hụrụ ka amụma ahụ na-emezu, obi ga-esikwu ha ike na nkwa ndị ọzọ Jehova kwere ga-emezu. Ka ị na-ahụkwa ka amụma ndị e buru gbasara oge ikpeazụ na-emezu, ọ ga-eme ka ị mụrụ anya ma na-agbasikwu mbọ ike ime baptizim.

15. Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị dị njikere maka ụbọchị Jehova? (2 Pita 3:10-13)

15 N’akwụkwọ ozi nke abụọ Pita dere, ọ kọwara otú anyị kwesịrị isi gosi na anyị dị njikere maka ụbọchị Jehova. Mgbe Pita dere ihe a, ụbọchị Jehova ka dị ezigbote anya. Ma ọ gwara Ndị Kraịst ndị ahụ ka ha ‘buru ya n’uche.’ (Gụọ 2 Pita 3:10-13.) Otú anyị ga-esi buru ụbọchị ahụ n’uche bụ ịdị njikere ma na-achọsi ike ka ọ bịa. Anyị na-egosi na anyị chọsiri ike ka ọ bịa ma anyị ‘na-akpa àgwà dị nsọ, na-efekwa Chineke.’ Chegodị otú ọ ga-esi masị Jehova ịhụ ka ị ‘na-efe ya.’ O doro anya na obi ga-adịkwu ya ezigbo ụtọ ma i nyefee ya onwe gị ma mee baptizim.

URU IME BAPTIZIM UGBU A GA-ABARA GỊ

16. Olee oge kacha mma ị ga-agba mbọ ka i mee baptizim? (2 Ndị Kọrịnt 6:1, 2) (Kọwaakwa foto.)

16 Ọ bụ ugbu a bụ oge kacha mma ị ga-agba mbọ mee baptizim. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 6:1, 2.) Mgbe nwoke Etiopia na Filip kwuchara okwu, nwoke ahụ chọpụtara na o kwesịrị ime baptizim n’egbughị oge. Ozugbo ọ ghọtara ozi ọma e ziri ya, hụkwa mmiri e nwere ike ịnọ mee ya baptizim, o cheweghị, sị: ‘M ga-achọ ka e zikwuo m ozi ọma. Anyị ga-ahụ mmiri ọzọ ma anyị gatụkwuo.’ Kama, ọ jụrụ Filip, sị: “Gịnị ga-egbochi ime m baptizim?” (Ọrụ 8:26, 27, 35-39) Ihe ahụ o mere magburu onwe ya. Mgbe o mechara baptizim, “ọ nọ na-aga ebe ọ na-aga na-aṅụrị ọṅụ.”

Foto ndị na-egosi: 1. Ebe nwoke Etiopia ahụ na-abanye ná mmiri ka Filip na-asị ya bịa ka o mee ya baptizim. 2. Ebe nwaanyị ahụ a na-amụrụ Baịbụl na nwanna nwaanyị na-amụrụ ya ihe e gosiri na foto bu ụzọ ji obi ụtọ na-agwa ndị okenye abụọ okwu n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.

Akụkọ nwoke Etiopia na-akụziri anyị na ugbu a bụ oge kacha mma mmadụ ga-agba mbọ ka o mee baptizim (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16)a


17. Olee ihe obi ga-esili anyị ike na ya?

17 Ọ bụrụ na ị na-egbu oge ime baptizim, obi sie gị ike na Jehova chọrọ inyere gị aka ka gị na ya dị n’ezigbo mma. (Rom 2:4) Ọ ga-enyeliri gị aka ma ọ bụrụ na ị na-atụ ụjọ, ma i chee na ọ ga-esiri gị ezigbo ike, ma ọ bụkwanụ na ndị ọzọ anaghị agba gị ume ka i mee baptizim. Ozugbo i mere baptizim ma nwee ezigbo akọnuche, i nwere ike ịchọpụta na e nweghịzi ihe i ji “ihe ndị garala aga” kpọrọ. (Fil. 3:8, 13) Ị ga-elekwasịzi anya ‘n’ihe ndị na-abịa n’ihu,’ ya bụ, mgbe Jehova ga-emezuru ndị nyefere ya onwe ha ma mee baptizim ihe ndị o kwere ná nkwa.​—Ọrụ 3:19.

GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

  • Gịnị nwere ike ịna-egbochi ụfọdụ ndị ime baptizim?

  • Gịnị mere na ọ dịghị mma ịna-egbu oge ime baptizim?

  • Olee oge kacha mma ị ga-agba mbọ ka i mee baptizim?

ABỤ NKE 38 Ọ Ga-eme Ka I Sie Ike

a NKỌWA FOTO: Ebe otu nwaanyị a na-amụrụ Baịbụl bịakwutere ndị okenye ka ọ gwa ha na ọ chọrọ ime baptizim otú ahụ nwoke Etiopia gwara Filip na ọ chọrọ ime baptizim.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya