EPREL 13 ruo 19, 2026
ABỤ NKE 52 Ndị Kraịst Nyefere Chineke Onwe Ha
Ihe Baptizim Pụtara na Uru Ọ Bara
“Mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m. Na-eme ha baptizim.”—MAT. 28:19.
IHE A GA-AMỤ
Ihe baptizim pụtara, ihe mere o ji dị mkpa, na otú e si eme ya.
1. Gịnị gosiri na baptizim so n’ihe ndị dị ezigbo mkpa Baịbụl na-akụzi?
OBI na-abụ anyị sọ aṅụrị ma ndị ọhụrụ mee baptizim. Ị̀ ma na ọ bụ ụdị ọṅụ ahụ ka Ndị Kraịst oge mbụ nwere mgbe ha hụrụ ka ọtụtụ ndị mere baptizim na Pentikọst afọ 33? N’oge ahụ, Pita onyeozi kọwara na ime baptizim dị ezigbo mkpa. (Ọrụ 2:38, 40, 41) Pọl onyeozi kwuru na “ụdị baptizim dị iche iche” so ‘n’ihe ndị mbụ a kụziiri anyị banyere Kraịst.’ (Hib. 6:1, 2) N’ihi ya, baptizim so n’ihe ndị bụ́ isi anyị kwesịrị ịghọta nke ọma. N’ihi gịnị?
2. Gịnị mere anyị ji kwesị ịghọta nke ọma ihe baptizim pụtara?
2 A chọọ ka ụlọ sie ike, a ga-atọ ntọala ya ya esie ike. Otú ahụ ka anyị ịghọta ihe baptizim pụtara si eme ka okwukwe anyị sie ike. Anyị niile kwesịrị ịghọta ihe baptizim pụtara ma ànyị ka na-agba mbọ ime baptizim ma ọ bụ na anyị emeela baptizim kemgbe ọtụtụ afọ. N’ihi ya, n’isiokwu a, anyị ga-aza ajụjụ ndị a: Gịnị ka baptizim pụtara? Olee otú Ndị Kraịst si eme baptizim? Gịnị mere anyị ji eme baptizim n’aha Nna, na nke Ọkpara, na nke mmụọ nsọ?
IHE BAPTIZIM I MERE PỤTARA
3. Gịnị ka baptizim i mere gosiri ndị ọzọ?
3 Baptizim i mere na-egosi mmadụ niile na i kwetara eziokwu gbasara Jehova Chineke na Jizọs Kraịst, na i chegharịala ná mmehie gị ma gbanwee ndụ gị ka i nwee ike ife Jehova, na i kwetara na ọ bụ n’aka Jizọs ka Jehova si azọpụta anyị, nakwa na i kpeela ekpere gwa Chineke na i ji obi gị chọọ iso ọgbakọ ya na-eme uche ya. Ozugbo i kwere ya nkwa ahụ ma mee baptizim, ị malitere ife ya. I nwekwara ike ife ya ruo mgbe ebighị ebi.
4. Gịnị ka imikpu mmadụ ná mmiri n’oge a na-eme ya baptizim na ikulite ya na-egosi? (Kọwaakwa foto.)
4 Mgbe i mere baptizim, e mikpuru gị ná mmiri, kulite gị, ka à ga-asị na e liri gị, kpọlitekwa gị n’ọnwụ.a (I nwere ike ịtụle Ndị Kọlọsi 2:12.) Gịnị mere ihe atụ a ji daba adaba? Mgbe ahụ e mikpuru gị ná mmiri, ị na-egosi na ị kwụsịla otú i si ebi ndụ n’oge gara aga. Mgbe e kulitere gị, ị malitere ibi ndụ ọhụrụ. Ihe kachazi gị mkpa ná ndụ bụ ime uche Chineke.
I mee baptizim, ị na-ahapụ otú mbụ i si ebi ndụ, malitezie ibi ndụ ọhụrụ, ya bụ, ịna-eme uche Chineke (A ga-akọwa ya na paragraf nke 4)
5. Olee otú mbọ ị na-agba ka ị kwadebe maka baptizim si yie mbọ Noa gbara rụọ ụgbọ? (1 Pita 3:18-21)
5 Gụọ 1 Pita 3:18-21. E nwere ike iji mbọ ị gbara ka i ruo eruo ime baptizim tụnyere mbọ Noa gbara rụọ ụgbọ. Ọ bụrụ na ị ka malitere ịmụ gbasara Jehova, o nwere ike ịdị gị ka ọrụ dị na ya ọ̀ karịrị akarị. O nwedịrị ike iyi ihe siri ike otú ahụ ịrụ agadaga ụgbọ na-adịghịrị Noa mfe. Mbọ ahụ niile ị gbara ọ̀ bara uru? À na-ajụkwa ajụ? Mbọ Noa gbara baara ya ezigbo uru. Chineke gwara ya otú ọ ga-esi rụọ ụgbọ ahụ. Ọ bụrụkwa na ọ chọrọ ka a zọpụta ya na ezinụlọ ya n’Iju Mmiri ahụ, ọ ga-arụ ya otú Jehova gwara ya ka o si rụọ ya. Noa rụrụ ụgbọ ahụ maka na o nwere okwukwe na Jehova, rubere ya isi, Jehova akwadokwa ya. Dị ka Noa, ị ga-emeli ‘ihe niile Chineke nyere n’iwu.’—Jen. 6:22.
6. Olee otú baptizim si azọpụta anyị?
6 N’amaokwu nke 21, Pita onyeozi kwuru na baptizim ‘na-azọpụta anyị.’ Mana ọ pụtaghị na ọ bụ naanị ime baptizim na-azọpụta mmadụ ma ọ bụ mee ka a gbaghara ya mmehie ya. Ọ bụ naanị ọbara Jizọs ga-asachapụli mmehie anyị. (1 Jọn 1:7) Ma, ime baptizim dị ezigbo mkpa maka na Jehova nyere iwu ka anyị mee ya. Anyị meekwa baptizim, anyị na-arịọ ya ka ‘o mee ka anyị nwee ezigbo akọnuche.’ Obi ga-adị Jehova ụtọ ịgbaghara mmehie anyị n’ihi àjà Jizọs chụrụ. Ọ bụ otú ahụ ka baptizim si ‘azọpụta anyị,’ ya bụ, ime ka o kwe anyị omume ịdị ndụ ebighị ebi.
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EME BAPTIZIM
7. Olee otú e kwesịrị isi na-eme baptizim?
7 Baịbụl gwara anyị na ime baptizim pụtara na a ga-emikpu mmadụ ná mmiri. Mana o kwughị ọtụtụ ihe banyere otú e kwesịrị isi eme baptizim. Ma, o mere ka anyị mata ihe anyị kwesịrị ime ma e mewe baptizim. Dị ka ihe atụ, ihe ndị Baịbụl kwuru gosiri ụdị uwe ndị a na-eme baptizim kwesịrị iyi nakwa otú ndị na-ele ha kwesịrị isi kpaa àgwà. (1 Kọr. 14:40; 1 Tim. 2:9) Taa, ọ na-abụkarị okenye ọgbakọ na-emikpu mmadụ ná mmiri. Anyị anaghịkwa akwanyere ndị na-eme ndị mmadụ baptizim ùgwù pụrụ iche. (1 Kọr. 1:14, 15) Ihe ọzọ bụ na ihe dị mkpa abụghị ma ndị nọ mgbe e mere mmadụ baptizim hà buru ibu ma ọ bụ na ha ebughị ibu.—Ọrụ 8:36.
8. Olee ajụjụ abụọ a na-ajụ ndị chọrọ ime baptizim? Maka gịnị? (Ọrụ Ndịozi 2:38-42) (Kọwaakwa foto.)
8 Baịbụl kwuru na anyị kwesịrị ‘ikwupụta ihe anyị kweere n’ihu ọha ka e wee zọpụta anyị.’ (Rom 10:9, 10) Anyị na-ekwupụta ihe anyị kweere n’ihu ọha mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma nakwa karịchaa, n’ụbọchị anyị na-eme baptizim. N’ihi ya, a na-ajụ ndị na-eme baptizim ajụjụ abụọ. Nke mbụ, “Ì chegharịala ná mmehie gị, nyefee Jehova onwe gị, ma na-ebi ndụ gosiri na i kwetara na o si n’aka Jizọs Kraịst azọpụta anyị?” Ajụjụ ahụ na-ekwu gbasara ihe mmadụ na-eme tupu ya emee baptizim. O yikwara ihe Pita gwara ìgwè mmadụ na Pentikọst. Ajụjụ nke abụọ bụ, “Ị̀ ghọtara na baptizim a ga-eme gị na-egosi na ị ghọọla Onyeàmà Jehova nọ ná nzukọ Jehova?” Ajụjụ a na-echetara anyị na otú anyị si emezu nkwa anyị kwere Jehova bụ ịna-erube isi n’ihe nzukọ ya na-agwa anyị, nakwa iso ụmụnna anyị na-efe ya otú ahụ ndị na-eso ụzọ Jizọs mere n’oge ndịozi. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 2:38-42.) Ndị ọ bụla ji obi ha niile zaa ee n’ajụjụ abụọ ahụ ruru eru ka e mee ha baptizim.
N’oge i mere baptizim, ‘i kwupụtara ihe i kweere n’ihu ọha ka e wee zọpụta gị’ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8)d
9. Olee ihe onye ọ bụla kwesịrị ime iji mee Jehova obi ụtọ?
9 Tupudị gị amalite ịmụ Baịbụl, o nwere ike ịbụ na ị na-ebitụ ndụ dị mma, o nweghịkwa mgbe i mere mmehie dị oké njọ. O nwekwara ike ịbụ na nne na nna gị bụ Ndịàmà Jehova, ha enyere gị aka ịhụ Jehova n’anya. Ị̀ ka kwesịrị ichegharị ma mee baptizim iji mee Jehova obi ụtọ? Ee. N’agbanyeghị otú e si zụọ anyị, anyị niile ghọtara na anyị ketara mmehie nke mere ka anyị na Chineke ghara ịbụ enyi. (Ọma 51:5) Ma, ka anyị na-amụtakwu banyere Jehova, anyị kpebiri ime ihe ọ chọrọ, ọ bụghị ihe anyịnwa chọrọ. Ozugbo anyị mere otú ahụ, anyị ga-echegharịli n’ụdị ndụ anyị na-ebibu ma lọghachikwute Jehova, ya bụ, ibiwe ndụ ọhụrụ ga-eme Nna anyị nke eluigwe obi ụtọ. Ọ bụ mgbe ahụ ka anyị ga-emezi baptizim.—Ọrụ 3:19.
10. Gịnị ka i kwesịrị ime ma ọ bụrụ na i mere baptizim n’okpukpe ị na-ekpebu?
10 Ọ bụrụ na i mere baptizim n’okpukpe ị na-ekpebu, ị ka kwesịrị ime baptizim iji gosi na ị bụzi Onyeàmà Jehova. Maka gịnị? Ọ bụ n’ihi na ị ghọtachabeghị eziokwu banyere Jehova Chineke na Jizọs mgbe ahụ. Ọ bụrụgodị na i kpere ekpere nyefee Chineke onwe gị mgbe ahụ, ihe mere i ji kwe ya nkwa ahụ abụghị na ị ghọtara ihe bụ́ uche ya n’eziokwu. Mgbe Pọl onyeozi hụrụ ụfọdụ ụmụ nwoke n’Efesọs, ndị meburu baptizim mgbe ha na-aghọtabeghị ihe Ndị Kraịst na-akụzi, ọ haziri ka e mee ha baptizim ọzọ.b (Ọrụ 19:1-5) Taakwa, naanị ihe ga-eme ka Jehova nabata baptizim mmadụ mere bụ ma onye ahụ ghọta ihe bụ́ uche Chineke n’eziokwu.
“N’AHA NNA NA NKE ỌKPARA NA NKE MMỤỌ NSỌ”
11. Gịnị ka ime baptizim “n’aha Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ” pụtara? (Matiu 28:18-20)
11 Jizọs nyere iwu ka e mee ndị ga-abụ ndị na-eso ụzọ ya baptizim “n’aha Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ.” (Gụọ Matiu 28:18-20.) Gịnị ka ọ pụtara? Na Baịbụl, okwu bụ́ “aha” na-apụtakarị ụdị onye mmadụ bụ. O nwekwara ike ịpụta ọkwá mmadụ ma ọ bụ ikike ya. (I nwere ike ịtụle Matiu 10:41.) N’ihi ya, anyị mee baptizim n’aha Jehova na Jizọs, ọ pụtara na anyị ma na ọ bụ ha kwesịrị ịna-agwa anyị ihe anyị ga-eme. Anyị mee baptizim n’aha mmụọ nsọ, ọ pụtara na anyị na-ekwe ka ọ na-eduzi anyị. Ka anyị tụlekwuo otú anyị ga-esi eme ya.
12. Olee otú anyị si eme baptizim n’aha Nna? (Mkpughe 4:11) (Kọwaakwa foto.)
12 N’aha Nna. Ọ pụtara na obi siri anyị ike na Jehova bụ Nna anyị nke eluigwe, Onye nyere anyị ndụ. Ọ bụ ya bụ Chineke pụrụ ime ihe niile, Onye kere ihe niile. (Gụọ Mkpughe 4:11.) Anyị ma na ọ na-anụ ekpere anyị. Anyị na-akpọkwa aha ya mgbe anyị na-ekpe ekpere na mgbe anyị na-agwa ndị ọzọ gbasara ya. (Ọma 65:2) Ma, e nwere ihe ọzọ ime baptizim n’aha Nna pụtara. N’ụbọchị Pentikọst, ndị gere Pita ntị ma Jehova, ma ha kwesịrị ịghọta na ọ bụ ya si n’aka Jizọs Kraịst na-azọpụta anyị ka anyị dịrị ndụ ebighị ebi.—Rom 5:8.
I mechaa baptizim, akwụsịla ịna-erubere Jehova na Ọkpara ya isi. Na-ekwekwa ka mmụọ nsọ na-eduzi gị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12)
13. Olee otú anyị si eme baptizim n’aha Ọkpara? (Kọwaakwa foto.)
13 N’aha Ọkpara. Ọ pụtara na obi siri anyị ike na ọ bụ Jizọs bụ Ọkpara Chineke mụrụ naanị ya. Jizọs bụ “ụzọ,” ya bụ, naanị onye ọ ga-abụ anyị si n’aka ya, anyị na Jehova adị ná mma. (Jọn 14:6) Jizọs bụkwa Onye Mgbapụta anyị, onye nwụrụ ka anyị nwee ike inweta ndụ. Ọ bụ ihe mere anyị ji chọọ ịna-eso ụzọ ya kwa ụbọchị, ọ bụghị naanị n’ụbọchị ahụ e mere anyị baptizim. (1 Jọn 2:6) N’ihi ya, anyị na-eji ịnụ ọkụ n’obi ekwusa ozi ọma otú ahụ o mere, ma ghara ikwe ka ihe ọ bụla gbochie anyị. (Luk 4:43) Anyị na-adị njikere idi mkpagbu maka na anyị ji obi anyị niile na-efe Chineke. (2 Tim. 3:12) Anyị na-erubere Jizọs isi maka na ọ bụ “onyeisi ọgbakọ.” Ọ bụ ya mere obi ji adị anyị ụtọ ịna-eme ihe ndị o nyere ọrụ iduzi na ilekọta ndị na-eso ụzọ ya na-agwa anyị.—Efe. 4:8, 11, 12; 5:23.
I mechaa baptizim, akwụsịla ịna-erubere Ọkpara Chineke isi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13)
14. (a) Olee otú anyị si eme baptizim n’aha mmụọ nsọ? (Kọwaakwa foto.) (b) Olee baptizim ndị ọzọ a na-eme ndị e tere mmanụ? (Kwuo ihe dị n’igbe isiokwu ya bụ “Baptizim Ndị A Na-eme Ndị E Tere Mmanụ.”)
14 N’aha mmụọ nsọ. Ọ pụtara na anyị kwetara eziokwu banyere mmụọ nsọ. Mmụọ nsọ abụghị onye so n’Atọ n’Ime Otu, kama ọ bụ ike Chineke ji arụ ihe ndị ọ na-arụ. Anyị ma na Jehova ji mmụọ nsọ duzie ndị amụma na ndị dere Baịbụl. N’ihi ya, anyị na-agụ ya ma na-eme ihe ndị ọ na-akụziri anyị. (2 Pita 1:20, 21) Anyị anaghị eme mmehie dị oké njọ n’ihi na ụdị omume ahụ ga-eme ka anyị ghara inweta mmụọ nsọ Chineke, meekwa ka mmụọ nsọ ghara ịna-arụ ọrụ nke ọma n’ọgbakọ.—Efe. 4:30.
I mechaa baptizim, akwụsịla ikwe ka mmụọ nsọ na-eduzi gị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14)
15. Gịnị ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime?
15 Ọ bụrụ na ị bụ Onye Kraịst e mere baptizim, kpebisie ike ịghọta ihe niile gbasara “ụdị baptizim dị iche iche”c na imezu nkwa i kwere Jehova mgbe i nyefere ya onwe gị ma mee baptizim. Gịnịkwanụ ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na i mebeghị baptizim? Ọ̀ ga-abụ na e nwere ihe na-egbochi gị? Isiokwu na-eso nke a ga-ekwu otú i nwere ike isi na-agba mbọ ka i mee baptizim.
ABỤ NKE 161 Ime Uche Gị Na-atọ M Ụtọ
a Okwu Grik bụ́ ba’pti-sma, nke a sụgharịrị “baptizim,” pụtara “imikpu mmadụ ná mmiri.” N’ihi ya, baptizim pụtara imikpu mmadụ kpamkpam ná mmiri, ọ bụghị ifesa ya mmiri otú ahụ ụfọdụ okpukpe na-akụzi.
b Ihe e mere ụmụ nwoke ndị ahụ nọ n’Efesọs bụ “baptizim Jọn.” (Ọrụ 19:3) Jọn Onye Na-eme Baptizim gwara ndị Juu ka ha chegharịa ná mmehie ha n’ihi Iwu Mosis ha dara. Jọn mekwara ndị chegharịrịnụ baptizim. (Mak 1:4, 5) Ma, mgbe Iwu Mosis kwụsịrị, Jehova anaghịzi anabata baptizim ahụ. Si mgbe ahụ gawa, ihe Chineke na-anabatazi bụ naanị “otu baptizim” nke na-eme ka a zọpụta mmadụ.—Efe. 4:5.
c Gaa na jw.org nakwa na JW Library® gụọ isiokwu bụ́ “Gịnị Bụ Baptizim?” Ị ga-ahụ ya n’isiokwu bụ́ “Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara.”
d NKỌWA FOTO: Ebe ndị a chọrọ ime baptizim ná mgbakọ kwụ ọtọ ka ha kwupụta ihe ha kweere n’ihu ọha.