Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w26 Febụwarị p. 2-7
  • Otú Ị Ga-esi Na-enyere Ndị Ezinụlọ Gị Na-abụghị Ndịàmà Jehova Aka

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otú Ị Ga-esi Na-enyere Ndị Ezinụlọ Gị Na-abụghị Ndịàmà Jehova Aka
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2026
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • NA-EMETERE HA EBERE
  • GBALỊA GHỌTA NDỊ EZINỤLỌ GỊ
  • NA-ENWE NDIDI MA NA-ATỤ ANYA NA HA GA-ABỊA FEWE JEHOVA
  • GOSI HA NA Ị HỤRỤ HA N’ANYA
  • EKWELA KA IKE HA GWỤ GỊ
  • Eziokwu Na-eweta “Ọ Bụghị Udo, Kama Mma Agha”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
  • Gee Ntị Ka Ị Nụ Mgbe A Ga-aza Ajụjụ Ndị A
    2025-2026 Usoro Ihe Omume Mgbakọ Sekit nke Onye Nlekọta Sekit
  • Ka Mkpebi Ndị Ị Na-eme Gosi na Ị Tụkwasịrị Jehova Obi
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2023
  • Ị̀ Ka Nwere Ike Ịmụta Ihe n’Ihe Ndị Bụ́ Isi Ị Mụtarala na Baịbụl?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2026
w26 Febụwarị p. 2-7

EPREL 6 RUO 12, 2026

ABỤ NKE 82 “Meenụ Ka Ìhè Unu Na-enwu”

Otú Ị Ga-esi Na-enyere Ndị Ezinụlọ Gị Na-abụghị Ndịàmà Jehova Aka

“Ka ike ime ihe dị mma ghara ịgwụ anyị.”​—GAL. 6:9.

IHE A GA-AMỤ

Otú anyị ga-esi mee ka anyị na ndị ezinụlọ anyị na-abụghị Ndịàmà Jehova na-adị ná mma na otú anyị ga-esi nyere ha aka ka ha bịa fewe Jehova ma ọ bụrụ na o kwere omume.

1-2. Mgbe i bidoro ịmụ Baịbụl, olee ihe ụfọdụ ọ ga-abụ ha mere ka gị na ndị ezinụlọ gị na-abụghị Ndịàmà Jehova ghara ịdị ná mma?

JIZỌS gwara otu nwoke chọrọ ịbụ onye na-eso ụzọ ya, sị: “Lakwuru ndị ikwu gị, kọọkwara ha ihe niile Jehova meere gị nakwa ebere o meere gị.” (Mak 5:19) Ihe mere Jizọs ji kwuo ya bụ na ọ ma na ọtụtụ ndị na-achọ ịgwa ndị ezinụlọ ha ihe ọma meere ha.

2 Ì chetara otú obi dị gị mgbe i bidoro ịmụ Baịbụl? O nwere ike ịbụ na otú obi si dị gị ụtọ mere ka ị chọọ ịkọrọ ndị ezinụlọ gị niile ihe ọma ndị ị na-amụta. Mana o nwere ike ịbụ na ha achọghị ịnụ ya. O nwekwara ike ịbụ na otú i si na-agwa ha gbasara eziokwu Baịbụl mere ka okwu gị na ha dawa ájá ájá. Ọ bụrụ otú ahụ, isiokwu a ga-enyere gị aka ịma ihe ị ga-eme ka ị na-erubere Jehova isi, gị na ndị ezinụlọ gị adịrịkwa ná mma.

3. Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu a?

3 N’isiokwu a, anyị ga-ahụ: (1) Otú imetere ndị ezinụlọ anyị na-abụghị Ndịàmà Jehova ebere ga-esi mee ka anyị gosi ha na ihe gbasara ha na-emetụ anyị n’obi, ọ bụrụgodị na ha achọghị ige ntị; (2) ihe anyị ga-eme ma ha kwuo ma ọ bụ mee ihe na-adịghị mma; (3) otú anyị ga-esi nyere ha aka ma anyị nwee ndidi ma na-atụ anya na ha ga-ege ntị; na (4) otú anyị ga-esi gosi ha na anyị hụrụ ha n’anya.

NA-EMETERE HA EBERE

4. Gịnị ka Jizọs meere ndị na-achọghị ige ntị n’okwu ya?

4 Jizọs akwụsịghị ịgbalị inyere ndị na-achọghị ige ya ntị aka. O kwuru na ya dị ka onye na-arụ ọrụ n’ubi vaịn, onye si n’ụzọ dị iche iche na-agbalị inyere otu osisi aka ka ọ mịa mkpụrụ. (Luk 13:6-9) Mgbe Jizọs kwuru ihe ahụ, ọ karịala afọ atọ ọ nọ na-enyere ndị Juu aka inwe okwukwe na ya ma bụrụ ndị na-eso ụzọ ya. Gịnị mere na ọ kwụsịghị inyere ha aka? Ọ bụ maka na ọ na-emetere ha ebere, ya emee ka ọ na-enwere ha ndidi.

5. Gịnị mere Jizọs ji metere ndị Juu ibe ya ebere?

5 Jizọs meteere ndị Juu ibe ya ebere maka na ndị isi okpukpe ha anaghị enyere ha aka inwe ezigbo okwukwe na Chineke. Ọ hụrụ na ha dị ka “atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.” (Mak 6:34) Obere oge tupu Jizọs anwụọ, o bedịịrị Jeruselem ákwá maka na ọ ma na a ga-egbu ọtụtụ ndị bi na ya n’ihi na ha enweghị okwukwe. (Luk 19:41-44) Ọ bụrụ na anyị echee ihe mere ndị ezinụlọ anyị ji kwesị ịnụ ozi ọma, ọ ga-eme ka anyị chọsie ike inyere ha aka.

6. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-enwere ndị ezinụlọ anyị na-abụghị Ndịàmà Jehova ndidi? (Ndị Galeshia 6:9)

6 Gụọ Ndị Galeshia 6:9. Ọ bụrụgodị na ndị ezinụlọ anyị achọghị ịmụta gbasara Jehova ugbu a, anyị ka kwesịrị inwere ha ndidi. “Ike ime ihe dị mma” ekwesịghịkwa ịgwụ anyị. O nwee ihe na-abụghị eziokwu mmadụ kwetasiri ike na ya, anyị ma na ọ ga-ewe ya oge tupu ya agbanwee ma nwee okwukwe na Jehova. O nwekwara ike ịbụ na e nwere mgbe ị na-enweghị ‘olileanya, ị maghịkwa Chineke.’ (Efe. 2:12) Ma, mmadụ weturu obi nyere gị aka ịmụta gbasara Jehova. Ọ̀ bụ na o kwesịghị ime ka i nyere ndị ezinụlọ gị aka ịmụtakwu banyere Jehova?

GBALỊA GHỌTA NDỊ EZINỤLỌ GỊ

7. Olee ihe ndị ọ ga-abụ ha mere ụmụnne Jizọs enweghị okwukwe na ya?

7 Ọ ga-abụ na ụmụnne Jizọs nụrụ gbasara ọrụ ebube ndị ọ rụrụ na Galili. (Luk 4:14, 22-24) Na mbụ, ha enweghị okwukwe na ya. (Jọn 7:5) N’ihi gịnị? Baịbụl agwaghị anyị. Mana, e nwere ihe abụọ anyị si na Baịbụl mata mere ụfọdụ ndị Juu aghọghị ndị na-eso ụzọ Jizọs. Ụfọdụ na-atụ ụjọ na ndị obodo ha ga-ajụ ha. (Jọn 9:18-22) E nwere ndị ma Jizọs kemgbe ọ bụ nwata. O sikwaara ha ike ikweta na ọ bụ Ọkpara Chineke. (Mak 6:1-4) O nwere ike ịbụ na ụmụnne Jizọs nọ na-eche ụdị ihe a. Ụdị ihe a ò nwere ike ime ndị ezinụlọ anyị?

8. Olee ihe nwere ike ime ka ndị ezinụlọ anyị kwuo ma ọ bụ mee ihe ga-ewute anyị?

8 Chee ihe mere ha ji ekwu ihe ha na-ekwu ma ọ bụ eme ihe ha na-eme. Ọ ga-abụ na ụmụnne Jizọs so ná ndị ikwu ya nọ na-ekwu na “isi emebiela ya.” (Mak 3:21) Gịnị ka o nwere ike ịbụ ya mere ha ji kwuo otú ahụ? Akụkọ ahụ gosiri na ndị mmadụ ekweghị Jizọs zuo ike nke na o nweghịdị ohere iri nri. (Mak 3:20) Ndị ikwu ya hà chere na ozi ọma ọ na-ekwusa na-agbazi ya ara? Ọ ga-abụ ihe ha chere. Ndị ezinụlọ anyị nwere ike iche na okpukpe anyị na-agbazi anyị ara. Ọ bụrụ ihe ha na-eche, anyị kwesịrị isi n’àgwà anyị gosi ha na anyị na-eche echiche nke ọma.

9. Gịnị nwere ike ime ka ndị ezinụlọ anyị gbanwee otú ha si ele Ndịàmà Jehova anya? (1 Pita 3:1, 2) (Kọwaakwa foto.)

9 Ka àgwà gị na-ekwuchite ọnụ gị. Okwu ọma anyị na àgwà ọma anyị nwere ike ime ka ndị ezinụlọ anyị gbanwee otú ha si ele Ndịàmà Jehova anya. (Gụọ 1 Pita 3:1, 2.) Dị ka ihe atụ, di nwanna nwaanyị na-abụghị Onyeàmà Jehova nwere ike iwe iwe ma nwunye ya hapụ ya gaa ọmụmụ ihe ma ọ bụ ozi ọma. Ebe ọ bụ na nwanna nwaanyị ahụ achọghị ka iwe wee di ya, o nwere ike ịhazigharị oge o ji eme ihe ndị gbasara ofufe Jehova ka o nwee ike inwekwu oge ya na di ya ga-eji na-anọ. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịga ozi ọma mgbe e nwere ihe di ya na-eme ma ọ bụkwanụ mgbe ọ na-anọghị n’ụlọ. Ọ bụrụ na nwanna nwaanyị ahazigharịa oge o ji eme ihe ụfọdụ iji mee di ya obi ụtọ, o nwere ike inyere di ya aka ịgbanwe otú o si ele Ndịàmà Jehova anya.

Foto ndị na-egosi: 1. Ebe otu nwanna nwaanyị na-akwadebere di ya na-abụghị Onyeàmà Jehova nri ehihie na kọfị tupu di ya agawa ọrụ. 2. Mgbe e mechara, ya na nwanna nwaanyị ọzọ nọ n’ozi ọma, ya ejiri ekwentị ya na-agụrụ otu nwaanyị ha hụrụ Baịbụl.

Okwu ọma anyị na obiọma anyị nwere ike ime ka di anyị ma ọ bụ nwunye anyị na-abụghị Onyeàmà Jehova gbanwee otú o si ele Ndịàmà Jehova anya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 9)f


10. Olee otú anyị nwere ike isi mee ka Jizọs ma a katọọ anyị?

10 Echela na ị ga-azaghachi nkatọ ọ bụla ha katọrọ gị. Mgbe ndị mmadụ boro Jizọs ebubo na ọ na-aṅụ oké mmanya ma na-eri oké nri, o weghị iwe ma ọ bụ chọọ otú ọ ga-esi gọrọ isi ya. Kama, ọ chọrọ ka ha na-eleru anya ala iji chọpụta nke bụ́ eziokwu. (Mat. 11:19) O sikwa n’omume ya gosi na ya na-eche echiche nke ọma ma na-enwe obi ụtọ. (I nwere ike ịtụle Jọn 2:2, 6-10.) Dị ka Jizọs, ọ bụghị mgbe niile ndị mmadụ katọrọ gị ka ị ga-agbalịwa ịgọrọ isi gị. Kama ime otú ahụ, si n’omume gị gosi ha na ị na-eche echiche nke ọma ma na-enwe obi ụtọ ka ha jiri aka ha chọpụta nke bụ́ eziokwu. O nwere ike ime ka ha ghara ikweta ụgha ha nụrụ gbasara Ndịàmà Jehova.

NA-ENWE NDIDI MA NA-ATỤ ANYA NA HA GA-ABỊA FEWE JEHOVA

11. Olee otú Jizọs si meso ụmụnne ya na-enweghị okwukwe na ya?

11 Ihe ndị Baịbụl kọrọ gosiri na Jizọs nweere ụmụnne ya ndidi. Dị ka ihe atụ, o doro anya na ha nọ mgbe Jizọs rụrụ ọrụ ebube mbụ ya na Kena. (Jọn 2:11, 12) Dị ka anyị kwuburu, ụmụnne Jizọs enweghị okwukwe na ya. Ma, Jizọs akwụsịghị igosi ha na ihe gbasara ha na-emetụ ya n’obi. Baịbụl mere ka anyị mata na ihe dị ka afọ atọ ọ rụchara ọrụ ebube mbụ ya na Kena, o ji obiọma na-agwa ụmụnne ya okwu.​—Jọn 7:5-8.

12. Olee ihe nwere ike inyere anyị aka ịna-atụ anya na ụfọdụ ndị ezinụlọ anyị nwere ike ịbịa fewe Jehova?

12 Ọ bụrụ na anyị aghọta nke ọma otú Jehova si eme ebere, o nwere ike inyere anyị aka ịna-atụ anya na ndị ezinụlọ anyị ga-abịa fewe ya. E bibichaa okpukpe ụgha, ha nwere ike icheta na anyị gwara ha na a ga-ebibi okpukpe ụgha.a (Mkpu. 17:16) Ha nwedịrị ike ịbịa soro anyị fewe Jehova ma oké mkpagbu malitechaa. Ọ bụrụ na ihe na-esiri ndị ezinụlọ anyị ike ugbu a, anyị kwesịrị ime ihe niile anyị ga-emeli iji nyere ha aka. O nwere ike ịka dịrị ha mfe ịnabata eziokwu Baịbụl ma ha chọpụta na anyị ji obi anyị niile hụ ha n’anya ma na-enwere ha obiọma.

GOSI HA NA Ị HỤRỤ HA N’ANYA

13. N’agbanyeghị na e nwere ọtụtụ ihe anyị na-eme n’ofufe Jehova, olee ihe anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara ime?

13 N’agbanyeghị na e nwere ọtụtụ ihe anyị na-eme n’ofufe Jehova, anyị ekwesịghị ime ka ndị ezinụlọ anyị chee na anyị achọghị ka anyị na ha na-anọrị ma ọ bụ na anyị ahụghịzi ha n’anya. (Mat. 7:12) Olee otú anyị nwere ike isi gosi ha na anyị na-eche gbasara ha? Ka anyị leba anya n’ihe ụfọdụ anyị nwere ike ime.

14-15. Olee otu ụzọ anyị nwere ike isi egosi ndị ezinụlọ anyị na anyị hụrụ ha n’anya? Nye ihe atụ.

14 Na-akpọtụrụ ha ma na-egosi ha na ị hụrụ ha n’anya. Otu ụzọ anyị si egosi na anyị hụrụ ndị ezinụlọ anyị n’anya bụ ịna-agwa ha otú anyị mere. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike idegara ha ozi n’ekwentị, zigakwara ha foto ndị anyị sere mgbe anyị gara ezumike ma ọ bụ mgbe anyị na ndị enyi anyị na-ekpori ndụ. Anyị nwere ike inye ha obere onyinye ma ọ bụ degara ha akwụkwọ ozi. Ọ ga-egosi ha na anyị na-eche banyere ha, meekwa ka anyị na ha dịkwuo ná mma. Ime ihe ndị a nwere ike inyere ha aka ịmata na anyị hụrụ ha n’anya n’eziokwu.

15 Ka anyị kwuo banyere otu nwanna nwaanyị bi n’Aminia aha ya bụ Anna. Ndị ezinụlọ ha na-anọrịkarị, karịchaa n’oge ncheta ọmụmụ na n’oge ememme ndị ọzọ. Mgbe Anna mụtara eziokwu Baịbụl, ndị ezinụlọ ya bidoro ichegbu onwe ha gbasara otú okpukpe ọhụrụ ya ga-esi kpaa adịm ná mma ha na ya aka. Ihe ọzọ ha chere bụ na ịbụ Onyeàmà Jehova ga-eme ka ihe siere ya ike n’ọdịnihu. Gịnị ka Nwanna Nwaanyị Anna mere ka ha gharazie ịna-echegbu onwe ha? Ọ sịrị: “M gaa ileta ndị ezinụlọ anyị, m na-akọrọ ha otú ihe si dịrị m na ihe ndị m na-eme kemgbe. M na-akpọ ha ka ha bịa n’ụlọ m, gosikwa ha ndị enyi m. O meela ka ọtụtụ ndị ezinụlọ anyị mata ndị enyi m nke ọma. Ha anaghịzi ele ha anya ọjọọ.” Ọ sịkwara: “Ọtụtụ ndị ezinụlọ anyị ekwuola na ha achọpụtala na m na-enwe obi ụtọ. Ha anaghịzikwa echegbu onwe ha gbasara m.”

16. Olee otú Jizọs si gosi na ihe gbasara Jems nwanne ya na-emetụ ya n’obi? (Kwuokwa ihe e dere n’ala ala peeji.)

16 Gosi ha na ihe gbasara ha na-emetụ gị n’obi. Mgbe a kpọlitechara Jizọs n’ọnwụ, ọ pụtara n’ihu Jems nwanne ya ka o gosi ya na ihe gbasara ya na-emetụ ya n’obi. (1 Kọr. 15:7) Chegodị otú obi si tọọ Jems ụtọ mgbe ọ ghọtara na Jizọs ka hụrụ ya n’anya. Ọ ga-abụ n’oge ahụ ka obi bịara sie ya ezigbo ike na Jizọs bụ Mezaya. Mgbe ya na Jizọs hụchara, ọ ga-abụ na o nyeere ụmụnne ya ndị ọzọ aka ịghọta na Jizọs bụ Mezaya.b​—Ọrụ 1:14.

17. Olee otú anyị nwere ike isi mee ihe e kwuru ná Ndị Rom 12:15? (Kọwaakwa foto.)

17 Gụọ Ndị Rom 12:15. Ihe ọma nwere ike imere ndị ezinụlọ anyị ma ọ bụkwanụ ihe ọjọọ emee ha. Anyị gosi ha na anyị na-eche banyere ha, karịchaa mgbe anyị kwesịrị inyere ha aka, ha nwere ike ịgbanwe otú ha si ele Ndịàmà Jehova anya.c Dị ka ihe atụ, ha mụọ nwa ọhụrụ, anyị nwere ike ịga leta ha ma nye ha onyinye iji gosi ha na obi dị anyị ụtọ maka ihe ọma meere ha. E nwee ndị ezinụlọ anyị mmadụ nwụnahụrụ, anyị nwere ike ịgwa ha ihe ga-akasi ha obi, nyere ha aka, ma ọ bụkwanụ zigara ha akwụkwọ ozi. Anyị nwekwara ike ịna-akpọtụrụ ha, karịchaa mgbe ihe siiri ha ike.

Ebe nwanna nwaanyị ahụ anyị hụrụ na foto bu ụzọ ji ekwentị ya na-ese ma onwe ya ma di ya na-abụghị Onyeàmà Jehova ma nne di ya foto. Nne di ya nọ n’ígwè ndị ngwọrọ.

I gosi ndị ezinụlọ unu na ị hụrụ ha n’anya mgbe ọ kacha dịrị ha mkpa, o nwere ike ime ka ha gbanwee otú ha si ele gị na ihe i kweere anya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17)g


Ì Kwesịrị Ịga Agbamakwụkwọ Ma Ọ Bụ Olili Onye Ezinụlọ Unu Na-abụghị Onyeàmà Jehova?

Oge agbamakwụkwọ na olili ozu na-abụkarị oge ndị ezinụlọ ji anọkọ. Tupu gị ekpebie ma ị̀ ga-aga, chee gbasara ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru.

  • À ga-eme ihe ụfọdụ gbasara okpukpe ụgha n’ebe ahụ? (2 Kọr. 6:14, 15)

  • Ọ bụrụ na ị gaa, ị̀ ga-akatali obi ghara iso ha mee ihe ndị na-adịghị Jehova mma? (Ilu 22:3)

  • Ndị ezinụlọ unu na-abụghị Ndịàmà Jehova hà ma na ị gaghị eso ha eme ihe ọ bụla Baịbụl na-akwadoghị?

  • Ọ bụrụ na ị gaa ya n’ụlọ chọọchị, olee otú obi ga-adị ụmụnna gị? (Fil. 1:10)

Nke ọ bụla i kpebiri ime, gbalịa jiri akọ kọwaara ya ndị ezinụlọ unu otú ga-edo ha anya. Ihe kacha mkpa bụ ka ị gbalịsie ike mee ihe ga-eme Jehova obi ụtọ.e

18. Olee otú anyị nwere ike isi eme ka Andru?

18 Hazie ka ha na ụmụnna ndị ọzọ hụ. Mgbe Andru onye na-eso ụzọ Jizọs matara na Jizọs bụ Mezaya, ọ gakwuuru Pita nwanne ya ozugbo gwa ya ka ọ bịa hụ Jizọs. (Jọn 1:40-42) Ànyị nwere ike ime ụdị ihe ahụ? Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike ịkpọ onye ezinụlọ anyị ka ọ bịa ọmụmụ ihe ma ọ bụ soro anyị na ndị enyi anyị rie nri. Ọ bụrụ na ọ hụ ụmụnna ndị ọzọ, o nwere ike ịmata na Ndịàmà Jehova bụkwa ndị mmadụ ibe ya nakwa na ha dị obiọma.

19. Ọ bụrụgodị na ndị ezinụlọ anyị aghọtachaghị ihe ụfọdụ anyị kweere, olee otú anyị kwesịrị isi na-emeso ha? (1 Pita 3:15)

19 Gụọ 1 Pita 3:15. O nwere ike ịbụ na ndị ezinụlọ anyị aghọtachaghị ihe mere na anyị ekweghị eme ụfọdụ ihe. Mana ha ga na-echeta otú anyị si kwanyere ha ùgwù, meekwara ha obiọma. Obi nwekwara ike ịdị ha ụtọ maka na anyị gbara mbọ ka anyị na ha nọrịa ọ bụrụgodị na anyị na ha agaghị anọrị n’oge ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, anyị agaghị eme ememme na omenala ndị Baịbụl na-akwadoghị, ma anyị nwere ike ịga leta ha, soro ha rie nri, nyekwa ha onyinye n’oge ndị ọzọ.

EKWELA KA IKE HA GWỤ GỊ

20. Gịnị ka ihe Jems mere na-akụziri anyị?

20 Mgbe Jizọs na-eje ozi ya n’ụwa, Jems esoghị ụzọ ya. Ma, o mechara ghọọ onye na-eso ụzọ ya. Ọ ga-abụrịrị na ọ mụtara gbasara ọtụtụ ihe ndị Jizọs kụziri mgbe ọ nọ n’ụwa. (Gal. 1:18, 19; 2:9) Dị ka ihe atụ, o si n’ike mmụọ nsọ dee akwụkwọ ozi kwuru banyere ihe Jizọs kụziri n’elu ugwu.d

21. Gịnị mere na ike ndị ezinụlọ anyị ekwesịghị ịgwụ anyị?

21 N’agbanyeghị mbọ niile anyị na-agba igosi ndị ezinụlọ anyị na-abụghị Ndịàmà Jehova na ihe gbasara ha na-emetụ anyị n’obi, o nwere ike ha agaghị achọ ịmụta eziokwu Baịbụl ma ọ bụ gewe anyị ntị. Gịnị mere na ike ha ekwesịghị ịgwụ anyị? Ọ bụ n’ihi na mgbe ọ bụla anyị meteere ha ebere, anyị na-eme ka Jehova bụ́ Chineke onye na-eme ebere nakwa Jizọs bụ́ Ọkpara ya. (Luk 6:33, 36) Ka oge na-aga, otú anyị si hụ ha n’anya nwere ike ime ka ha gbanwee otú ha si ele Ndịàmà Jehova anya. Ha nwedịrị ike icheta ihe anyị gwara ha n’oge gara aga gbasara ihe anyị kweere. Ọ bụrụ na ike ha agwụghị anyị, anyị nwere ike ịhụ ka ụfọdụ n’ime ha so anyị fewe Jehova, obi abụrụ anyị sọ aṅụrị.

GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

  • Olee otú imetere ndị ezinụlọ anyị ebere ga-esi mee ka anyị nyere ha aka?

  • Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-enwe ndidi ma na-atụ anya na ndị ezinụlọ anyị ga-abịa fewe Jehova?

  • Olee otú anyị nwere ike isi gosi ndị ezinụlọ anyị na-abụghị Ndịàmà Jehova na anyị hụrụ ha n’anya?

ABỤ NKE 60 Ọ Ga-eme Ka Ha Nweta Ndụ

a Gụọ isiokwu bụ́ “Olee Ihe Anyị Ma Gbasara Otú Jehova Ga-esi Kpee Ndị Mmadụ Ikpe n’Ọdịnihu?” nke gbara n’Ụlọ Nche Mee 2024, peeji nke 11, paragraf nke 11 ruo na nke 13.

b Ọ dịkarịa ala, ụmụnne Jizọs abụọ, ya bụ, Jems na Jud, ghọrọ Ndị Kraịst mgbe Jizọs nwụchara, a kpọlitekwa ya n’ọnwụ.

c Gụọ igbe isiokwu ya bụ “Ì Kwesịrị Ịga Agbamakwụkwọ Ma Ọ Bụ Olili Onye Ezinụlọ Unu Na-abụghị Onyeàmà Jehova?”

d I nwere ike ịtụle Jems 1:2 na Matiu 5:11, 12; Jems 1:19 na Matiu 5:22; Jems 1:22; 2:24 na Matiu 7:21; Jems 2:13 na Matiu 5:7; 6:14, 15.

e Ị chọọ ịmatakwu ihe ị ga-eme n’ụdị ihe a, gụọ “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” nke gbara n’Ụlọ Nche May 15, 2002, na November 15, 2007.

f NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna nwaanyị ji obi ụtọ na-akwadebere di ya nri tupu ya agawa ozi ọma.

g NKỌWA FOTO: Ebe nwanna nwaanyị ahụ wepụtara oge gaa leta nne di ya na-abụghị Onyeàmà Jehova.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya