Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w26 Jenụwarị p. 14-19
  • Ihe Mere Ihe Mgbapụta Ji Dị Anyị Mkpa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Mere Ihe Mgbapụta Ji Dị Anyị Mkpa
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2026
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IHE MGBAPỤTA NA-EME KA CHINEKE GBAGHARA ANYỊ MMEHIE ANYỊ
  • IHE MGBAPỤTA MERE KA ANYỊ NWEE OLILEANYA IZU OKÈ
  • IHE MGBAPỤTA NA-EME KA ANYỊ NA JEHOVA DỊGHACHI NÁ MMA
  • IHE MGBAPỤTA NA-EGOSI NA JEHOVA NA-EME EBERE
  • Gịnị Ka Ihe Mgbapụta Na-akụziri Anyị?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Olee Otú Ị Ga-esi Gosi na Obi Dị Gị Ụtọ Maka Ihe Mgbapụta?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2026
  • Uru Anyị Na-erite Maka na Jehova Hụrụ Anyị n’Anya
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Ihe Mere Obi Ji Dị Anyị Ụtọ na Jehova Na-agbaghara Anyị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2026
w26 Jenụwarị p. 14-19

MACH 16 RUO 22, 2026

ABỤ NKE 20 I Nyere Anyị Ọkpara Ị Hụrụ n’Anya

Ihe Mere Ihe Mgbapụta Ji Dị Anyị Mkpa

“Ònye ga-anapụta m n’ahụ́ a nke na-akpatara m ọnwụ a?”​—ROM 7:24.

IHE A GA-AMỤ

Otú ihe mgbapụta si eme ka Jehova gbaghara anyị mmehie anyị, anyị enwee olileanya izu okè, anyị na ya adịghachikwa ná mma.

1-2. Gịnị ka e kwesịrị ịnapụta anyị na ya? Maka gịnị? (Ndị Rom 7:22-24) (Kọwaakwa foto.)

WEREGODỊ ya na ị hụrụ ka ụlọ dara, dakwasị otu nwoke. Ọ ka dị ndụ. Mana, ọ gaghị apụtali ma ọ bụrụ na e nyereghị ya aka. Naanị ihe ọ ga-emeli bụ iti mkpu ka e nyere ya aka ma nwee olileanya na a ga-abịa dọpụta ya.

2 Otú ahụ ka ọ dị onye ọ bụla n’ime anyị. Maka gịnị? Mgbe Adam nupụụrụ Chineke isi, ọ ghọrọ onye mmehie. O mechara bufeere ụmụ ya mmehie ahụ. Mmehie ahụ mere ka anyị yie ndị tọrọ n’ụlọ dara ada. Anyị agaghị anapụtali onwe anyị ná nsogbu mmehie na-akpata. N’akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Rom, ọ kọwara nke ọma otú mmehie mere ka obi na-adị anyị. (Gụọ Ndị Rom 7:22-24.) Ọ rịọrọ ka a napụta ya ‘n’ahụ́ a nke na-akpatara ya ọnwụ.’ Pọl yiri onye tọrọ atọ n’ihi mmehie o ketara n’aka Adam, nke na-akpatara ya ọnwụ. (Rom 6:23) Ọ bụ otu nsogbu ahụ ka anyị nọ na ya. E kwesịrị ịnapụta anyị.

Otu nwoke tọrọ atọ maka na ụlọ dakwasịrị ya, merụọ ya ahụ́, ya amatịa aka ya ka a bịa dọpụta ya.

Otú ahụ onye ụlọ dakwasịrị tọrọ atọ, kwesịkwa ka a bịa dọpụta ya ka mmehie anyị ketara n’aka Adam mere ka anyị bụrụ ndị tọrọ atọ e kwesịrị ịnapụta (A ga-akọwa ya na paragraf nke 1 na nke 2)


3. Olee otú ihe mgbapụta si anapụta anyị?

3 Obi dị anyị ụtọ na mgbe Pọl kwuchara banyere nsogbu ọ nọ na ya, o kwukwara ihe mere ka anyị nwee olileanya. Mgbe ọ jụchara, sị: “Ònye ga-anapụta m n’ahụ́ a nke na-akpatara m ọnwụ a?” o ji aka ya zaa ajụjụ ahụ. Ọ sịrị: “Esi m n’aka Jizọs Kraịst Onyenwe anyị na-ekele Chineke.” (Rom 7:25) Pọl na-ekwu banyere àjà ahụ Jizọs chụrụ nke bụ́ ihe mgbapụta.a Otú ihe mgbapụta ahụ si anapụta anyị bụ na (1) ọ na-eme ka Jehova gbaghara anyị mmehie anyị, (2) ọ na-eme ka anyị nwee olileanya izu okè n’ọdịnihu, na (3) ọ na-eme ka anyị na Jehova dịghachi ná mma. Ka anyị na-atụle ihe ndị a, anyị ga-amụta ihe ga-eme ka anyị hụkwuo Jehova n’anya. Baịbụl kpọrọ ya “Chineke onye na-eme ka anyị nwee olileanya.” (Rom 15:13) Obi ga-adịkwu anyị ụtọ maka Jizọs, “onye e si n’aka ya jiri ihe mgbapụta gbapụta anyị.”​—Kọl. 1:14.

IHE MGBAPỤTA NA-EME KA CHINEKE GBAGHARA ANYỊ MMEHIE ANYỊ

4-5. Gịnị mere ihe mgbapụta ji dị anyị niile mkpa? (Ekliziastis 7:20)

4 Ọ bụ ihe mgbapụta ga-eme ka Jehova gbaghara anyị mmehie anyị. Mmadụ ọ bụla na-ezughị okè na-eme mmehie, ma n’okwu ọnụ ma n’omume. (Gụọ Ekliziastis 7:20.) E nwere mmehie ndị dị oké njọ. Dị ka ihe atụ, Iwu Mosis kwuru na e kwesịrị igbu onye Izrel ọ bụla kwara iko ma ọ bụ gbuo mmadụ. (Lev. 20:10; Ọnụ Ọgụ. 35:30, 31) Nke bụ́ eziokwu bụ na e nwere ọtụtụ mmehie na-erughị nke igbu onye mere ha. Mana, ha ka bụkwa mmehie. Dị ka ihe atụ, Devid sịrị: “M ga-akpachara anya ka m ghara ikwu ihe ọjọọ.” (Ọma 39:1) Ihe a gosiri na ihe anyị kwuru nwedịrị ike ịbụ mmehie.​—Jems 3:2.

5 Chegodị banyere ihe ndị i kwuru na ihe ndị i mere n’oge gara aga. È nwetụla ihe ị gwara ndị ọzọ, ya emechaa dị gị ka ya bụrụ na i kwughị ya? Ì metụla ihe i mechara kwaara mmakwaara? O doro anya na ị ga-aza ee. Baịbụl sịrị: “Ọ bụrụ na anyị asị, ‘Anyị anaghị eme mmehie,’ anyị na-aghọgbu onwe anyị, eziokwu adịghịkwa anyị n’ime.”​—1 Jọn 1:8.

6-7. Olee ebe Jehova ga-agbakwasị ụkwụ gbaghara anyị mmehie anyị? (Kọwaakwa foto.)

6 Ihe mgbapụta mere ka Jehova nwee ike ịgbaghara anyị mmehie anyị. (Efe. 1:7) Ma, ọ pụtaghị na Jehova na-eleghara mmehie anyị anya ka à ga-asị na o nweghị ihe o mere. Jehova kpọrọ mmehie asị. (Aịza. 59:2) N’ihi ikpe ziri ezi ọ na-ekpe, e kwesịrị inwe ebe ọ ga-agbakwasị ụkwụ gbaghara anyị mmehie anyị.

7 Iwu Mosis gwara ndị Izrel ka ha jiri anụmanụ na-achụ àjà iji kpuchie mmehie ha. (Lev. 4:27-31; 17:11) Àjà ndị ahụ ha chụrụ nọchiri anya àjà ka ukwuu Jizọs ji ndụ ya chụọ, nke ga-eme ka ụmụ mmadụ nweta ngọzi. Àjà ahụ ọ chụrụ ga-eme ka Jehova gbaghara anyị mmehie anyị. Akwụkwọ ozi Pọl degaara Ndị Kraịst nọ na Kọrịnt gosiri na ọ ghọtara uru àjà ahụ Jizọs chụrụ ga-abara ndị mmadụ. Mgbe o dechara banyere ihe ọjọọ ndị ha mere n’oge gara aga, ọ sịrị ha: “Chineke asachaala unu, doo unu nsọ, kpọọkwa unu ndị ezi omume n’aha Onyenwe anyị Jizọs Kraịst nakwa n’ike mmụọ nsọ.”​—1 Kọr. 6:9-11.

Ebe otu ezinụlọ bụ́ ndị Izrel ji obi ụtọ na-enye onye nchụàjà atụrụ n’ụlọ nsọ.

Anụmanụ ndị e ji chụọ àjà iji kpuchie mmehie nọchiri anya àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ nakwa ngọzi ndị anyị ga-esi na ya nweta (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6 na nke 7)


8. Gịnị ka i kwesịrị ichebara echiche ka ị na-akwadebe ịga Ncheta Ọnwụ Jizọs nke afọ a?

8 Ka ị na-akwadebe ịga Ncheta Ọnwụ Jizọs nke afọ a, wepụta oge chee banyere uru mgbaghara Jehova baara gị. Dị ka ihe atụ, n’ihi ihe mgbapụta, obi ekwesịghị ịna-ama gị ikpe maka mmehie ndị i mere n’oge gara aga ma chegharịa. Gịnị ka ị ga-eme ma o siere gị ike ikweta ihe a? I nwere ike ịna-eche, sị: ‘Aghọtara m na Jehova ga-agbagharali m. Mana, agaghị m agbagharali onwe m.’ Ọ bụrụ na ị na-eche otú ahụ, cheta na ọ bụ Jehova na-agbaghara mmehie. Ọ bụkwa Ọkpara ya ka o nyere ikike ikpe ikpe. Ọ bụghị gị ma ọ bụ mmadụ ọ bụla ọzọ ka Jehova nyere ọrụ ikpebi onye ọ ga-emere ebere ma ọ bụ onye ọ na-agaghị emere ebere. Baịbụl sịrị: ‘Ọ bụrụ na anyị na-eje ije n’ìhè otú yanwa nọ n’ìhè, ọbara Jizọs bụ́ Ọkpara ya na-asachapụ anyị mmehie niile.’ (1 Jọn 1:6, 7) Ka obi sie anyị ike na ihe a bụ eziokwu otú ahụ ihe ndị ọzọ Baịbụl na-akụzi bụkwa eziokwu. Ihe mgbapụta bụ ebe Jehova na-agbakwasị ụkwụ emere anyị ebere. Baịbụl kwukwara na ọ ‘dị njikere ịgbaghara mmehie.’​—Ọma 86:5.

IHE MGBAPỤTA MERE KA ANYỊ NWEE OLILEANYA IZU OKÈ

9. Na Baịbụl, gịnị ka okwu bụ́ “mmehie” pụtara? (Abụ Ọma 51:5)

9 Na Baịbụl, okwu bụ́ “mmehie” apụtaghị naanị ime ihe ọjọọ, kama ọ pụtakwara ezughị okè anyị bu pụta ụwa. (Gụọ Abụ Ọma 51:5.) Nsogbu ezughị okè na-akpatara anyị abụghị naanị na ọ na-eme ka anyị na-eche banyere ihe ọjọọ mgbe ụfọdụ ma na-eme ya, kama ọ na-emekwa ka ahụ́ anyị ghara ịna-arụ ọrụ otú Jehova bu n’obi kee ya, anyị ana-arịa ọrịa, na-aka nká, na-anwụkwa anwụ. Ọ bụ ya mere ụmụaka a mụrụ ọhụrụ na-emebeghị ihe ọjọọ ọ bụla ji arịa ọrịa, na-anwụkwa anwụ. Ọ bụkwa ya mere ma ndị ezigbo mmadụ ma ndị ajọ mmadụ ji ata ahụhụ ma na-anwụ anwụ. Ọ bụ mmehie Adam kpataara anyị niile nsogbu a.

10. Olee otú obi dị Adam na Iv mgbe ha mehiechara?

10 Chegodị otú obi dị Adam na Iv mgbe ha mehiechara ma gharazie izu okè. Obi jọwara ha ezigbo njọ. Ozugbo ha mehiechara, akọnuche ha malitere ịpịa ha ụtarị maka ịda iwu Chineke, nke bụ́ iwu ‘e dere n’obi ha.’ (Rom 2:15) Ha matara ozugbo na e nweela ihe gbanwere n’ime ha, mana ọ bụghị ihe ọma. Obi ha gwara ha ka ha kpuchie ahụ́ ha, nakwa ka ha zoo ka ndị omekome ka Onye kere ha ghara ịhụ ha. (Jen. 3:7, 8) Ọ bụ ya bụ mgbe mbụ obi mara Adam na Iv ikpe, ha echegbuwe onwe ha, obi ekoro ha n’elu, ihere emewekwa ha. Ọ bụ ihe ha na ha ga na-alụ ruokwa n’ọnwụ.​—Jen. 3:16-19.

11. Gịnị ka ezughị okè na-akpatara anyị?

11 Otu ihe ahụ mmehie mere Adam na Iv ka ọ na-emekwa anyị taa. Ọ na-akpatara anyị obi ezughị ike na ahụ́ mgbu. Anyị gbachaakwa lịka lịka ka ihe ka mma, o nweghị ebe anyị ji azụ aga. Maka gịnị? Ọ bụ n’ihi na, dị ka Baịbụl kwuru, ‘e mere ka anyị bụrụ ihe efu.’ (Rom 8:20) E nweghị onye ọ bụla a gụpụrụ, ma onye ukwu ma onye nta. Dị ka ihe atụ, ndị mmadụ agbaala mbọ ichebe ụwa anyị a, ịkwụsị mpụ na ịda ogbenye, nakwa ime ka udo dị n’ụwa niile. Ma, mbọ ndị ahụ akụọla afọ n’ala. Olee otú ihe mgbapụta si anapụta anyị n’aka mmehie anyị bu pụta ụwa?

12. Olee olileanya ihe mgbapụta mere ka anyị nwee?

12 Ihe mgbapụta mere ka anyị nwee olileanya na ‘a ga-eme ka ihe e kere eke nwere onwe ya n’ohu ọ na-agbara ire ure.’ (Rom 8:21) N’ụwa ọhụrụ, mgbe anyị ga-ezu okè, anyị agaghịzi na-arịa ụdị ọrịa ọ bụla. Obi agaghị na-ama anyị ikpe ma ọ bụ koro anyị n’elu. Anyị agaghịkwa na-echegbu onwe anyị ma ọ bụ ihere ana-eme anyị. Ihe ọzọ bụ na onye ga na-achị mgbe ahụ bụ Jizọs Kraịst, Onyeisi Udo, onye nwụrụ ka a gbapụta anyị. Ọ ga-enyere ụmụ mmadụ aka imezi ihe niile ha na-agaghị emezili n’onwe ha.​—Aịza. 9:6, 7.

13. Olee ihe ọzọ i kwesịrị ichebara echiche ka ị na-akwadebe ịga Ncheta Ọnwụ Jizọs nke afọ a?

13 Chegodị otú ndụ gị ga-adị mgbe ị ga-ezu okè. Chee otú ọ ga-adị gị ma i teta ụra n’ụtụtụ ọ bụla, ahụ́ adị gị mma. Ị gaghịkwa na-echegbu onwe gị na gịnwa ma ọ bụ ndị ị hụrụ n’anya ga-anọ agụụ, rịawa ọrịa, ma ọ bụ nwụọ. Obi nwedịrị ike irutụ gị ala ugbu a ma ọ bụrụ na ‘ị kwụsịghị inwe olileanya anyị nwere, nke ji ndụ anyị otú nko e ji ejide ụgbọ mmiri si ejide ụgbọ mmiri. O siri ike, e jikwa ya n’aka.’ (Hib. 6:18, 19) Otú ahụ nko e ji ejide ụgbọ mmiri si eme ka ụgbọ mmiri kwụrụ chịm ka iche banyere olileanya gị mgbe niile ga-eme ka okwukwe gị sie ike, nyekwara gị aka idi nsogbu ọ bụla na-abịara gị ugbu a. Ka obi sie gị ike na Jehova ‘ga-akwụ ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.’ (Hib. 11:6) Ọ bụ ihe mgbapụta mere ka a na-akasi gị obi ugbu a, gị enweekwa ezigbo olileanya.

IHE MGBAPỤTA NA-EME KA ANYỊ NA JEHOVA DỊGHACHI NÁ MMA

14. Gịnị ka mmehie Adam na Iv mere adịm ná mma anyị na Chineke? Maka gịnị?

14 Kemgbe Adam na Iv mehiechara, ụmụ mmadụ na Chineke adịghịzi ná mma. Baịbụl kwudịrị na e nweghị ihe jikọrọ ụmụ mmadụ na Chineke. (Rom 8:7, 8; Kọl. 1:21) Maka gịnị? Ọ bụ n’ihi na Jehova zuru okè. Ọ naghị anabata mmehie. Baịbụl kwuru banyere Jehova, sị: “Anya gị dị ezigbo nsọ nke na ọ naghị ele ihe ọjọọ. I nweghịkwa ike ịhapụ ihe ọjọọ ka ọ dịrị na-aga.” (Hab. 1:13) Mmehie ụmụ mmadụ mere ka ọ dị ka è nwere ihe kewara ha na Chineke. O nweghị onye n’ime anyị ya na Chineke ga-adịli ná mma ma ọ bụrụ na e wepụghị ihe ahụ kewara anyị na ya. Ọ bụ ihe mgbapụta wepụrụ ihe ahụ kewara anyị na Chineke.

15. Olee otú ọnwụ Jizọs si mee ka ụmụ mmadụ na Jehova dịghachi ná mma?

15 Baịbụl kwuru na Jizọs bụ “àjà a chụrụ maka mmehie anyị ka anyị na Chineke wee dị n’udo.” (1 Jọn 2:2) Okwu Grik a sụgharịrị ‘àjà a chụrụ ka anyị na Chineke wee dị n’udo’ nwere ike ịpụta ‘ihe e ji mee ka obi jụrụ Chineke.’ Olee otú ihe mgbapụta si mee ka obi jụrụ Jehova? Anyị agaghị echewe na e nwere otú ọnwụ Ọkpara ya si kasie ya obi. Kama, ịkwụ ihe mgbapụta ahụ dabara n’otú Jehova si ekpe ikpe ziri ezi. Ọ bụzi ebe Jehova ga-agbakwasị ụkwụ mee ka ya na ụmụ mmadụ dịghachi ná mma. (Rom 3:23-26) O nwedịrị ike ịkpọ ndị ji obi ha niile fee ya tupu Jizọs anwụọ ndị ezi omume. (Jen. 15:1, 6) Maka gịnị? Ọ bụ maka ihe mgbapụta ahụ a ka ga-akwụ. Obi siri Jehova ezigbo ike na Ọkpara ya bụ́ Jizọs ga-akwụ ya. (Aịza. 46:10) Ihe mgbapụta ahụ mere ka o kwe omume ụmụ mmadụ na Chineke ịdịghachi ná mma.

16. Olee ihe ọzọ i nwere ike ichebara echiche ka ị na-akwadebe ịga Ncheta Ọnwụ Jizọs nke afọ a? (Kọwaakwa foto.)

16 Chegodị gbasara otú ndụ gị si dị mma ugbu a n’ihi na gị na Jehova dị n’ezigbo mma. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịkpọ Jehova “Nna” gị otú ahụ Jizọs gwara anyị ka anyị mee. (Mat. 6:9) Mgbe ụfọdụ, i nwedịrị ike ịkpọ Jehova “Enyi” gị. Anyị kpọọ ya “Nna” ma ọ bụ “Enyi,” anyị kwesịrị igosi na anyị na-akwanyere ya ezigbo ùgwù nakwa na anyị dị umeala n’obi. Maka gịnị? Ọ bụ n’ihi na ebe anyị bụ ndị mmehie, anyị na Jehova ịdị ná mma abụghị na o ruuru anyị. Ọ bụ naanị ihe mgbapụta ahụ ga-emeli ka anyị na Jehova dị ná mma. Jehova si n’aka Jizọs “mee ka ya na ihe ndị ọzọ niile dị ná mma. . . . Ọ bụkwa ọbara Kraịst wụsịrị n’osisi ịta ahụhụ ka Chineke ji mee ka ya na ihe ndị ọzọ niile dịrị n’udo.” (Kọl. 1:19, 20) Ọ bụ ya mere anyị na Jehova ji nwee ike ịdị ná mma n’agbanyeghị na anyị bụ ndị na-ezughị okè ugbu a.

Ebe ndị agha Rom na-akwadebe ịkpọgide Jizọs n’osisi ịta ahụhụ. Ndị agha Rom abụọ kpụ Jizọs bịa n’osisi ịta ahụhụ, onye agha Rom ọzọ ejiri hama na ntu n’aka.

Ọ bụ naanị ọnwụ Jizọs mere ka e nwee ebe a ga-agbakwasị ụkwụ mee ka ụmụ mmadụ na Jehova dịghachi ná mma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16)


IHE MGBAPỤTA NA-EGOSI NA JEHOVA NA-EME EBERE

17. Olee otú ihe mgbapụta si eme ka o doo anya na Jehova na-eme ebere? (Ndị Efesọs 2:4, 5)

17 Ihe mgbapụta na-eme ka o doo anya na ‘ebere Chineke enweghị atụ.’ “O mere ka anyị dịrị ndụ . . . n’agbanyeghị na anyị dị ka ndị nwụrụ anwụ n’ihi mmehie anyị.” (Gụọ Ndị Efesọs 2:4, 5.) Ndị “na-akpa àgwà otú na-egosi na ha chọrọ inweta ndụ ebighị ebi” na-eti mkpu enyemaka n’ihi na ha ghọtara na ha dị ka ndị tọrọ atọ ná mmehie anyị ketara n’aka Adam, nakwa na e kwesịrị ịnapụta ha. (Ọrụ 13:48) Jehova si n’ozi ọma Alaeze na-agbatara ha ọsọ enyemaka ka ha nwee ike ịmata ya na Ọkpara ya bụ́ Jizọs. (Jọn 17:3) Ọ bụrụ na Setan chere na nnupụisi Adam na Iv akụghasịala nzube Chineke, ọ dara ya.

18. Ka anyị na-atụgharị uche n’ihe mgbapụta ahụ, olee ihe dị mkpa anyị kwesịrị ịna-echeta?

18 Ka anyị na-eche banyere uru ihe mgbapụta baara anyị, anyị kwesịrị ịna-echeta ihe kadị mkpa mere Jehova ji nye anyị ihe mgbapụta. Kama iwere ihe mgbapụta ahụ ka ihe baara naanị anyị uru, anyị kwesịrị ịna-echeta na ọ bụ ihe Jehova ji zaghachi ebubo ahụ Setan boro ya n’ogige Iden. (Jen. 3:1-5, 15) Jehova ji ihe mgbapụta ahụ mee ka e doo aha ya nsọ, wepụ nkọcha niile Setan kọchara ya. Ọ zọpụtakwara anyị n’aka mmehie na ọnwụ ma gosi na ọ bụ Chineke ịhụnanya. N’agbanyeghị ezughị okè anyị, Jehova meere anyị amara kwe ka anyị soro gosi na ihe Setan kwuru banyere ya bụ ụgha. (Ilu 27:11) Olee otú ị ga-esi gosi na obi dị gị ụtọ maka ihe mgbapụta ahụ? Anyị ga-aza ajụjụ a n’isiokwu na-eso nke a.

OLEE OTÚ IHE MGBAPỤTA SI MEE . . .

  • ka a gbaghara anyị mmehie anyị?

  • ka anyị nwee olileanya na anyị ga-ezu okè?

  • ka anyị na Chineke dịghachi ná mma?

ABỤ NKE 19 Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị

a NKỌWAKWU: Ihe mgbapụta bụ ụgwọ a kwụrụ iji napụta onye e ji eji. Àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ bụ ihe mgbapụta n’ihi na ọ na-anapụta ụmụ mmadụ na-erubere Chineke isi n’aka mmehie na ọnwụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya