Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w26 Jenụwarị p. 8-13
  • Jehova Ga-enyeliri Gị Aka Mgbe Obi Na-adịghị Gị Mma

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jehova Ga-enyeliri Gị Aka Mgbe Obi Na-adịghị Gị Mma
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2026
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IHE NDỊ MERE KA OBI NA-AJỌ PỌL NJỌ MGBE ỤFỌDỤ
  • IHE PỌL NA-EME MGBE OBI JỌWARA YA NJỌ
  • IHE ANYỊ GA-EME MA OBI JỌWA ANYỊ NJỌ
  • KA OBI SIE ANYỊ IKE NA JEHOVA GA NA-ENYERE ANYỊ AKA
  • Olee Otú I Nwere Ike Isi Lụso Echiche Ndị Na-adịghị Mma Ọgụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Otú Ị Ga-esi Na-enwekwu Ọṅụ n’Ozi Gị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
  • Dịrị Umeala n’Obi ma E Nwee Ihe Ị Na-amaghị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Jehova “Na-akasi Ndị Obi Gbawara Obi”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2026
w26 Jenụwarị p. 8-13

MACH 9 RUO 15, 2026

ABỤ NKE 45 Ihe M Na-atụgharị n’Uche

Jehova Ga-enyeliri Gị Aka Mgbe Obi Na-adịghị Gị Mma

“Ahụsiela m anya!”​—ROM 7:24.

IHE A GA-AMỤ

Ihe anyị nwere ike ime mgbe obi na-adịghị anyị mma.

1-2. Olee otú obi na-adị Pọl onyeozi mgbe ụfọdụ? Gịnịkwa mere ihe o dere banyere onwe ya nwere ike iji baara anyị uru? (Ndị Rom 7:21-24)

I CHEWE banyere Pọl onyeozi, gịnị ka ị na-echeta? I nwere ike icheta na ọ bụ onye ozi ala ọzọ nwere obi ike, bụrụkwa aka ochie n’ịkụzi ihe. O dekwara ọtụtụ akwụkwọ dị na Baịbụl. O doro anya na o ji obi ya niile jeere Jehova ozi. Ma, e nwere mgbe ụfọdụ obi na-adịghị ya mma, ya ana-echegbukwa onwe ya. Ọ bụkwa otú ọ na-adị ọtụtụ n’ime anyị taa.

2 Gụọ Ndị Rom 7:21-24. N’akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Rom, o kwuru otú obi dị ya, nke bụ́kwanụ otú obi na-adị ọtụtụ n’ime anyị taa. Pọl bụ ezigbo Onye Kraịst, chọsiekwa ike ịna-erubere Chineke isi. Ma ezughị okè mere ka o siere ya ike ịna-eme ihe Chineke chọrọ mgbe niile. Ihe ọzọ bụ na Pọl cheta ihe ndị o mere n’oge gara aga, ọ na-ewuteru ya n’ọkpụkpụ. Mgbe ụfọdụkwa, obi anaghị adị ya mma maka na e nwere nsogbu na-anaghị ekwe ya ṅụọ mmiri tọgbọ iko.

3. Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu a? (Kwuokwa ihe dị ná “Nkọwakwu.”)

3 N’agbanyeghị na obi adịghị Pọl mma mgbe ụfọdụ, ọ gbalịsiri ike ka ọ ghara ịna-echekarị banyere ihe ndị ga-eme ka obi na-ajọ ya njọ.a N’isiokwu a, anyị ga-aza ajụjụ ndị a: Gịnị mere Pọl ji kwuo na ya ‘ahụsiela anya’? Gịnị nyeere ya aka ka ọ ghara ịna-echekarị banyere ihe ga-emebi ya obi? Olee ihe anyị ga-eme mgbe obi na-adịghị anyị mma?

IHE NDỊ MERE KA OBI NA-AJỌ PỌL NJỌ MGBE ỤFỌDỤ

4. Gịnị mere ka obi na-ajọ Pọl njọ?

4 Ihe ndị o mere n’oge gara aga. Tupu Pọl aghọọ Onye Kraịst, n’oge ahụ ọ na-aza Sọl, o mere ihe ndị o mechara kwaara mmakwaara. Dị ka ihe atụ, Pọl nọ mgbe e ji nkume tụgbuo Stivin, bụ́ onye ji obi ya niile fee Chineke. Ogbugbu e gburu ya dịkwa ya mma. (Ọrụ 7:58; 8:1) Ọ bụkwa Pọl butere ụzọ n’ịkpagbu Ndị Kraịst mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ.​—Ọrụ 8:3; 26:9-11.

5. Olee otú obi dị Pọl maka ihe ndị o mere n’oge gara aga?

5 Mgbe Pọl onyeozi ghọchara Onye Kraịst, ọ ka na-echeta ihe ọjọọ ndị o mere n’oge gara aga. Ọ ga-abụ na mkpagbu ọ kpagburu Ndị Kraịst nọ na-ewutekwu ya ka oge na-aga. Dị ka ihe atụ, mgbe o degaara ndị Kọrịnt akwụkwọ ozi nke mbụ n’ihe dị ka n’afọ 55 Oge Ndị Kraịst, ọ sịrị: ‘E kwesịghị ịkpọ m onyeozi, maka na akpagburu m ọgbakọ Chineke.’ (1 Kọr. 15:9) N’akwụkwọ ozi o degaara ndị Efesọs mgbe ihe dị ka afọ ise gachara, o kwuru na ya bụ “onye kacha ndị nsọ niile nta.” (Efe. 3:8) N’akwụkwọ ozi o degaara Timoti, o kwuru na n’oge gara aga, na ya ‘na-ekwulu Chineke, na-akpagbu ndị mmadụ, na-akparịkwa ndị mmadụ.’ (1 Tim. 1:13) Chegodị otú obi na-adị Pọl ma ọ gaa ileta ọgbakọ, hụ ndị ahụ ọ kpagburu ma ọ bụ ndị ezinụlọ ha.

6. Olee ihe ọzọ nọ na-ewute Pọl? (Kwuokwa ihe e dere n’ala ala peeji.)

6 Ihe na-adụ ya ka ogwu n’ahụ́. Pọl ji ihe na-ewute ya tụnyere ‘ogwu na-adụ ya n’ahụ́.’ (2 Kọr. 12:7) Ọ kpọghị ihe ahụ aha. Ma, otú o si kọwaa ya gosiri na ọ na-enye ya ezigbo nsogbu. O nwere ike ịbụ ọrịa ma ọ bụ nsogbu ọzọ na-eme ka ọ na-echegbu onwe ya.b

7. Olee otú obi dị Pọl n’ihi ezughị okè ya? (Ndị Rom 7:18, 19)

7 Ezughị okè ya. Ihe ọzọ ya na Pọl lụrụ bụ ezughị okè ya. (Gụọ Ndị Rom 7:18, 19.) Ọ bụ eziokwu na ọ chọrọ ime ihe dị mma, ma ezughị okè ya nọ na-awụnyere ya ájá na garị. O kwuru na ọ bụụrụ ya ọgụ na mgba ịhapụ ime ihe ọjọọ na-agụ ya ma na-eme ihe dị mma. Ma, ọ kwụsịghị ịgba mbọ ịna-emekwu nke ọma. (1 Kọr. 9:27) Chegodị otú obi ga-esi na-ajọ ya njọ mgbe ọ bụla o mere ihe na-adịghị mma ọ gbarala mbọ kwụsị.

IHE PỌL NA-EME MGBE OBI JỌWARA YA NJỌ

8. Gịnị ka anyị si n’akwụkwọ ozi ndị Pọl dere mata banyere ihe o mere gbasara ihe ndị ọ na-anaghị emeta?

8 Anyị si n’akwụkwọ ozi ndị Pọl dere ghọta na ọ tụgharịrị uche n’otú mmụọ nsọ Chineke nwere ike isi nyere Ndị Kraịst aka ịkwụsị iche banyere ihe ọjọọ na-agụ ha agụụ ma na-agba mbọ ka àgwà ha na-akakwu mma. (Rom 8:13; Gal. 5:16, 17) Pọl kwuru ugboro ugboro banyere ụdị àgwà na ihe ndị na-agụ mmadụ agụụ Ndị Kraịst kwesịrị ịgbara ọsọ. (Gal. 5:19-21, 26) O doro anya na Pọl chebaara ihe ndị ọ na-anaghị emeta echiche, chọọ ndụmọdụ si n’Akwụkwọ Nsọ, matakwa ihe ndị o kwesịrị ime iji na-agbanwe àgwà ya. Obi siri anyị ike na o mere ihe ọ dụrụ ndị ọzọ ọdụ ka ha mee.

9-10. Olee ihe nyeere Pọl aka mgbe obi na-adịghị ya mma? (Ndị Efesọs 1:7) (Kọwaakwa foto.)

9 Ọ bụ eziokwu na obi na-ajọ Pọl njọ mgbe ụfọdụ, ma e nwere ọtụtụ ihe mere ka obi na-adị ya ụtọ. Dị ka ihe atụ, obi na-adị ya ụtọ ma a kọọrọ ya ihe ọma ndị na-eme n’ọgbakọ ndị dị n’ebe dị anya. (2 Kọr. 7:6, 7) Adịm ná mma ya na ụmụnna ya na-eme ya obi ụtọ. (2 Tim. 1:4) Obi sikwara ya ike na ihe ya dị Jehova mma. N’eziokwu, obi na-adị Pọl ụtọ maka na ‘akọnuche ya anaghị ama ya ikpe’ ka ọ na-efe Chineke. (2 Tim. 1:3) Mgbe a tụdịrị ya mkpọrọ na Rom, ọ gwara ụmụnna ya ka ha ‘na-aṅụrị ọṅụ n’ihi Onyenwe anyị.’ (Fil. 4:4) Ihe ndị o kwuru anaghị ada ka okwu onye na-echekarị banyere nsogbu ya. O doro anya na mgbe ọ bụla o chewere ihe ndị ga-emebi ya obi, ọ na-agbalịsi ike chewe ihe ndị ga-eme ya obi ụtọ.

10 Ihe ọzọ nyeere Pọl aka ịna-enwe obi ụtọ n’agbanyeghị ihe ndị ọ na-emejọ bụ na o kwetasiri ike na ihe mgbapụta bụ onyinye Chineke nyere ya. (Gal. 2:20; gụọ Ndị Efesọs 1:7.) N’ihi ya, obi siri ya ike na àjà Jizọs Kraịst chụrụ emeela ka Jehova gbaghara ya mmehie ya. (Rom 7:24, 25) N’agbanyeghị ihe ndị ọ na-emejọ nakwa ezughị okè ya, o ji ọṅụ ‘na-ejere Chineke ozi dị nsọ.’​—Hib. 9:12-14.

Foto ndị na-egosi: 1. Ebe Pọl onyeozi na-atụgharị uche. 2. Ebe o chetara ihe mere ọtụtụ afọ gara aga mgbe o nyere iwu ka e si n’ụlọ otu nwoke bụ́ Onye Kraịst kpụrụ ya. 3. Ebe ọ na-atụgharị uche n’ọnwụ Jizọs nwụrụ n’osisi ịta ahụhụ.

Ọ bụ eziokwu na obi jọrọ Pọl njọ mgbe ụfọdụ o chetara ihe ndị o mere n’oge gara aga, ma iche banyere ihe mgbapụta mere ya obi ụtọ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 9 na nke 10)


11. Olee otú akụkọ Pọl si eme ka obi sie anyị ike?

11 Dị ka Pọl, o nwere ike ịdị anyị ka è nwere ọgụ anyị na-alụ mgbe niile n’ime obi anyị. O nwere ike ịbụ gbasara ihe anyị na-eche, ihe anyị na-eme, ma ọ bụ ihe anyị na-ekwu. O nwekwara ike ịdị anyị ka anyị kwuo ka Pọl, sị: ‘Ahụsiela m anya!’ Otu nwanna nwaanyị dị afọ iri abụọ na isii aha ya bụ Elizac kwuru otú obi na-adị ya. Ọ sịrị: “Iche banyere otú ọ na-adị Pọl na-eme ka obi sie m ike. Obi na-adị m mma ma m cheta na ọ gbara mbọ ịgbanwe àgwà ya otú a mụnwa na-agbakwa. Ọ bụ ihe ọzọ na-echetara m na Jehova ma ihe na-esiri ndị ya ike.” Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị nwee ezigbo akọnuche dị ka Pọl ma na-enwe obi ụtọ n’agbanyeghị na obi nwere ike ịjọ anyị njọ mgbe ụfọdụ?

IHE ANYỊ GA-EME MA OBI JỌWA ANYỊ NJỌ

12. Olee ihe ndị anyị kwesịrị ịna-eme mgbe niile ka anyị nwee ike ịna-enwekwu obi ụtọ?

12 Anyị kwesịrị ịna-eme ihe ndị ga-eme ka anyị na Jehova na-adịkwu ná mma. Anyị mee otú ahụ, ọ ga-adịrị anyị mfe ịna-eche banyere ihe ndị ga na-eme anyị obi ụtọ. E nwere ike iji ya tụnyere ihe ndị anyị na-eme ka ahụ́ nwee ike ịna-adị anyị mma. Ahụ́ na-aka adị anyị mma ma anyị na-eri ezigbo nri, na-emega ahụ́ mgbe niile, na-ehikwa ụra nke ọma. Otú ahụ ka obi ga na-adị anyị mma ma anyị na-agụ Okwu Chineke kwa ụbọchị, na-aga ozi ọma, na-akwadebe ọmụmụ ihe, na-aga ọmụmụ ihe ma na-aza ajụjụ. Ime ihe ndị a ga-enyere anyị aka ịna-eche banyere ihe dị mma kama ịna-eche banyere ihe ga-eme ka obi jọwa anyị njọ. Obi ga na-adịkwu anyị ụtọ.​—Rom 12:11, 12.

13-14. Olee uru ụmụnna ụfọdụ ritere maka na ha na-eme ihe ndị ga-enyere ha aka ka ha na Jehova na-adị ná mma?

13 Ka anyị kwuo banyere otu nwanna aha ya bụ John. Mgbe ọ dị afọ iri atọ na itoolu, a chọpụtara na ọ na-arịa ọrịa kansa. Ozugbo ahụ, ezigbo ụjọ bịara ya, ya ana-echegbukwa onwe ya. Ọ nọ na-eche, sị: ‘Olee otú ọrịa a si bịa m n’agbanyeghị na akatabeghị m ahụ́?’ N’oge ahụ, nwa ya nwoke dị naanị afọ atọ. Gịnị nyeere John aka ka obi ghara ịna-ajọ ya njọ mgbe niile? Ọ sịrị: “N’agbanyeghị na ike na-agwụ m, m gbalịsiri ike hụ na mụ na ndị ezinụlọ m na-eme ihe ndị ga-eme ka anyị na Jehova na-adị ná mma. Anyị gara ọmụmụ ihe niile, gaa ozi ọma kwa izu ma na-enwe ofufe ezinụlọ ma mgbe o siiri anyị ike.” Mgbe John chetara oge ahụ, ọ sịrị: “Nsogbu bịara anyị, o nwere ike iwuteru anyị n’ọkpụkpụ ná mbido. Ma, achọpụtala m na n’oge na-adịghị anya, anyị ga-ahụ otú Jehova ga-esi mee ka anyị dị ike, anyị amatakwa na ọ hụrụ anyị n’anya. Jehova ga-enyeliri gị aka otú o si nyere m.”

14 Nwanna Nwaanyị Eliza anyị kwuburu okwu ya sịrị: “Mgbe ọ bụla m gara ọmụmụ ihe, mụọkwa ihe n’onwe m, ọ na-eme ka m cheta na Jehova na-anụ olu m nakwa na ọ hụrụ m n’anya n’eziokwu. Ọ na-eme m obi ụtọ.” Otu onye nlekọta sekit n’Afrịka aha ya bụ Nolan kwuru ihe na-enyere ya na nwunye ya Diane aka. Ọ sịrị: “Ọ bụrụgodị na obi adịghị anyị mma, anyị na-eme ihe ndị ga-eme ka anyị na Jehova na-adị ná mma. Jehova na-eme ka anyị ghọta mgbe niile na ọ na-enyere anyị aka ịna-enwe obi ụtọ. Anyị na-agbalị icheta na Jehova ga-enyere anyị aka ma gọzie anyị. Anyị amaghị otú ọ ga-esi eme ya. Mana, anyị ma na ọ ga-eme ya.”

15. Olee ihe ọzọ anyị nwere ike ime ma obi jọwa anyị njọ? Mee ihe atụ.

15 Ọ bụrụ na obi na-ajọ anyị njọ mgbe niile, e nwere ihe ndị ọzọ anyị kwesịrị ime. Dị ka ihe atụ, ka e were ya na azụ na-egbu gị mgbu. Mmadụ nwere ike ịhịa gị aka n’azụ, ya adịtụ gị mma. Mana, ị chọọ ka ọ laa, e nwere ihe ọzọ o nwere ike ịdị mkpa ka i mee. I nwere ike ibu ụzọ gbalịa gụọ gbasara ya, gaakwa hụ dọkịta. Anyị nwere ike ime ụdị ihe ahụ ma obi jọwa anyị njọ mgbe niile. Anyị nwere ike ime nchọnchọ na Baịbụl nakwa n’akwụkwọ anyị ka anyị mata ihe kpatara ya na ihe anyị nwere ike ime ka obi dịwa anyị mma. Anyị nwekwara ike ịgwa nwanna ma nke a na-akọ ka o nye anyị ndụmọdụ nwere ike ịbara anyị uru. Ka anyị leba anya n’ihe ndị ọzọ anyị nwere ike ime.

16. Gịnị nwere ike inyere gị aka ịchọpụta ihe mere obi ji na-ajọ gị njọ? (Abụ Ọma 139:1-4, 23, 24)

16 Kpee ekpere ka Jehova mee ka ị ghọta ihe i kwesịrị ime. Eze Devid ma na Jehova ma ya nke ọma. Ọ bụ ya mere o ji rịọ Jehova ka o mee ka ọ mata ihe mere o ji ‘na-echegbu’ onwe ya. (Gụọ Abụ Ọma 139:1-4, 23, 24.) Gịnwa nwekwara ike ịrịọ Jehova ka o nyere gị aka ịchọpụta ihe mere obi ji na-ajọ gị njọ na ihe ị ga-eme ka obi dịwa gị mma. I nwekwara ike ịjụ onwe gị ajụjụ ndị dị ka, ‘Gịnị ka m na-echegbu onwe m banyere ya? È nwere ihe na-eme ka obi na-ajọ m njọ mgbe niile? M̀ na-echekarị banyere ihe ga-eme ka obi ghara ịna-adị m ụtọ kama ịgbalị wepụ ya n’obi m ozugbo?’

17. Olee isiokwu ndị i nwere ike ịmụ ga-enyere gị aka ịna-enwe obi ụtọ? (Kọwaakwa foto.)

17 Mụọ isiokwu nwere ike inyere gị aka ná nsogbu gị. O nwere ike ịbara gị uru ma ọ bụrụ na ị nọtụ, gị amụọ ụfọdụ àgwà Jehova nwere. Dị ka ihe atụ, ịtụgharị uche n’ihe mgbapụta nakwa n’otú Jehova si agbaghara mmehie baara Pọl onyeozi ezigbo uru. I nwere ike ime ihe ahụ Pọl mere. Jiri Akwụkwọ Ndịàmà Jehova Ji Eme Nchọnchọ ma ọ bụ akwụkwọ ndị ọzọ anyị ji amụ Baịbụl mee nchọnchọ gbasara ebere Chineke, mgbaghara ya, na ịhụnanya ya. Ozugbo ị chọtara isiokwu ndị ga-enyere gị aka, depụta ha niile n’akwụkwọ. Dowe akwụkwọ ahụ n’ebe ị ga na-ahụ ya, mụọkwa isiokwu ndị ahụ ma obi jọwa gị njọ. Gbalịakwa na-eme ihe ndị ị gụtara na ha.​—Fil. 4:8.

Ebe otu nwanna bụ́ okorobịa ji Baịbụl, tablet, na akwụkwọ o ji ede ihe na-amụ ihe n’onwe ya. Ọ na-ede ihe na Baịbụl ya.

Họrọ isiokwu ndị ị ga-amụ ga-eme ka obi kwụsị ịjọ gị njọ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17)


18. Gịnị ka ụfọdụ Ndị Kraịst mụrụla nke baara ha uru?

18 Nwanna Nwaanyị Eliza anyị kwuburu okwu ya mere nchọnchọ gbasara Job a kọrọ akụkọ ya na Baịbụl. Ọ sịrị: “Nsogbu zooro m ka mmiri. N’ihi ya, m mụrụ banyere Job. Ọtụtụ nsogbu bịaara ya, obi ana-ajọkwa ya ezigbo njọ. Ma, ọ kwụsịghị ịtụkwasị Jehova obi ka o nyere ya aka n’agbanyeghị na ọ maghị ihe mere o ji na-ata ahụhụ.” (Job 42:1-6) Nwanna Nwaanyị Diane anyị kwuburu okwu ya sịrị: “Mụ na di m ji akwụkwọ Bịaruo Jehova Nso na-amụ gbasara àgwà Jehova. Obi dị anyị ụtọ na Jehova na-akpụzi anyị otú ahụ ọkpụite si eji ụrọ akpụ ite. Kama ichegbuwe onwe anyị banyere ihe ndị anyị na-emejọ, anyị na-agbalị ịna-echeta na Jehova na-akpụzi anyị, anyị ana-agbasikwa mbọ ike ka àgwà anyị na-akakwu mma. Ihe a na-eme ka anyị na ya na-adịkwu ná mma.”​—Aịza. 64:8.

KA OBI SIE ANYỊ IKE NA JEHOVA GA NA-ENYERE ANYỊ AKA

19. Gịnị ka anyị kwesịrị ịtụ anya ya?

19 Ọ bụrụgodị na anyị ana-amụ ihe ndị ga-enyere anyị aka ná nsogbu anyị, na-emekwa ihe ndị ọzọ ga-eme ka anyị na Jehova na-adịkwu ná mma, anyị ekwesịghị ịtụ anya na e nweghị mgbe ọ bụla obi ga-ajọ anyị njọ. E nwere ike inwe ụbọchị ụfọdụ obi na-agaghị adị anyị mma. Ma, Jehova ga-enyeliri anyị aka ịkwụsị iche banyere ihe ndị ga-emebi anyị obi, obi adịwakwa anyị mma. Ka obi sie anyị ike na e nwere ọtụtụ ụbọchị ndụ anyị ga na-atọ anyị ezigbo ụtọ, obi ana-adịkwa anyị mma maka na akọnuche anyị anaghị enye anyị nsogbu. Anyị ga-enwekwa ezigbo ihe mere ozi anyị na-ejere Jehova ga-eji na-eme anyị obi ụtọ.

20. Gịnị ka i kpebisiri ike ime?

20 Ka anyị kpebisie ike na anyị agaghị ekwe ka ihe ndị mere n’oge gara aga, nsogbu ndị bịaara anyị, ma ọ bụ ezughị okè anyị mee ka anyị ghara ịna-enwe obi ụtọ. Jehova ga-emeli ka anyị ghara ịna-echegbu onwe anyị. (Ọma 143:10) Anyị na-atụ anya ibi n’ụwa ọhụrụ, bụ́ ebe iche banyere ihe ga-eme anyị obi ụtọ na-agaghịzi abụ ọgụ na mgba. Kama, anyị ga na-eteta ụra n’ụtụtụ ọ bụla n’enweghị ihe na-echegbu anyị. Obi ga na-adịkwa anyị ụtọ ife Jehova bụ́ Chineke anyị hụrụ anyị n’anya.

GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

  • Gịnị ka ọ ga-abụ ya mere obi ji na-ajọ Pọl onyeozi ezigbo njọ mgbe ụfọdụ?

  • Gịnị nyeere Pọl aka inwe ezigbo akọnuche ma jiri obi ụtọ na-ejere Jehova ozi n’agbanyeghị ihe ndị mere ka obi ghara ịna-adị ya mma?

  • Olee ihe anyị ga-eme ma obi jọwa anyị njọ?

ABỤ NKE 34 Ekpebiela M Ime Ezi Omume

a NKỌWAKWU: Ụdị ‘obi ịjọ anyị njọ’ a na-ekwu okwu ya n’isiokwu a bụ oge ụfọdụ obi na-anaghị adị anyị mma, nakwa mgbe ụfọdụ ọ na-abụ, anyị nọkata, obi ajọwa anyị njọ n’enweghị ihe kpatara ya. Ọ bụghị obi ịjọ mmadụ njọ mgbe niile, nke bụ́ ọrịa mmadụ kwesịrị ịgara ụlọ ọgwụ.

b Anyị si n’ihe ndị Pọl dere mata na o nwere nsogbu anya, nke nwere ike ime ka ọ na-esiri ya ike ide akwụkwọ ozi na ịna-eje ozi ya. (Gal. 4:15; 6:11) O nwere ike ịbụ na Pọl na-echegbu onwe ya maka ihe ndị nkụzi ụgha ụfọdụ kwuru banyere ya. (2 Kọr. 10:10; 11:5, 13) N’agbanyeghị na anyị amaghị kpọmkwem ihe bụ́ nsogbu ahụ Pọl kwuru okwu ya, anyị ma na o mere ka obi na-ajọ ya njọ mgbe ụfọdụ.

c Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya