Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w26 Jenụwarị p. 20-25
  • Olee Otú Ị Ga-esi Gosi na Obi Dị Gị Ụtọ Maka Ihe Mgbapụta?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Otú Ị Ga-esi Gosi na Obi Dị Gị Ụtọ Maka Ihe Mgbapụta?
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2026
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • NDỊ A NA-AMỤRỤ BAỊBỤL
  • NDỊ KRAỊST E MERE BAPTIZIM
  • NDỊ BỤ́ ATỤRỤ KPAFURU AKPAFU
  • GỊNỊ KA Ị GA-EME?
  • Uru Anyị Na-erite Maka na Jehova Hụrụ Anyị n’Anya
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Gịnị Ka Ihe Mgbapụta Na-akụziri Anyị?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Ihe Mere Ihe Mgbapụta Ji Dị Anyị Mkpa
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2026
  • Ì Jikerela Maka Ụbọchị Kacha Mkpa n’Afọ?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2026
w26 Jenụwarị p. 20-25

MACH 23 RUO 29, 2026

ABỤ NKE 18 Anyị Na-ekele Chineke Maka Ihe Mgbapụta

Olee Otú Ị Ga-esi Gosi na Obi Dị Gị Ụtọ Maka Ihe Mgbapụta?

“Ịhụnanya Kraịst na-akpa ike n’ahụ́ anyị.”​—2 KỌR. 5:14.

IHE A GA-AMỤ

Otú anyị niile nwere ike isi gosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe mgbapụta.

1-2. Gịnị ka àjà ahụ Jizọs ji ndụ ya chụọ kwesịrị ime ka anyị mee? Maka gịnị? (2 Ndị Kọrịnt 5:14, 15) (Kọwaakwa foto.)

Ọ BỤRỤ na ụlọ dakwasịrị gị, e nwee onye bịara napụta gị, ọ̀ bụ na obi agaghị adị gị ụtọ maka onye ahụ zọrọ gị ndụ? Ọ bụrụgodị na e nwere ndị ọzọ onye ahụ dọpụtara, ị ga-achọ igosi ya na obi dị gịnwa ezigbo ụtọ maka ihe ọma o meere gị nakwa na i jighị ihe o meere gị egwu egwu.

2 Dị ka e kwuru n’isiokwu bu nke a ụzọ, anyị agaghị anapụtali onwe anyị ná nsogbu mmehie anyị ketara n’aka Adam kpataara anyị. Ma, e nwere ụzọ atọ àjà Jizọs chụrụ si anapụta anyị. Ọ na-eme (1) ka Chineke gbaghara anyị mmehie anyị, (2) ka anyị nwee olileanya na a ga-eme ka anyị zuo okè, nakwa (3) ka anyị na Chineke nwee ike ịdịghachi ná mma. N’ihi ya, anyị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ Chineke. N’eziokwu, ihe mgbapụta na-egosi na Jizọs hụrụ ụmụ mmadụ n’anya. Ọ hụrụ ndị mmadụ n’anya ogologo oge tupudị a mụọ ya n’ụwa. (Ilu 8:30, 31) Pọl onyeozi kwuru na “ịhụnanya Kraịst na-akpa ike n’ahụ́ anyị.” (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 5:14, 15.) Ọ pụtara na otú Jizọs si hụ anyị n’anya kwesịrị ime ka anyị hụ ya n’anya, gosikwa na anyị ejighị àjà ahụ o ji ndụ ya chụọ egwu egwu.

Ebe otu n’ime ndị na-adọpụta ndị ụlọ dakwasịrị na-adọpụta nwoke ahụ anyị kwuru okwu ya n’isiokwu bu nke a ụzọ n’ebe ọ tọrọ.

Mmadụ zọọ gị ndụ, i kwesịrị igosi ya na obi dị gị ụtọ. Anyị kwesịkwara igosi Jehova na Jizọs na obi dị anyị ezigbo ụtọ na ha napụtara anyị n’aka mmehie na ọnwụ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 1 na nke 2)


3. Gịnị mere otú otu onye si gosi na obi dị ya ụtọ maka ihe mgbapụta nwere ike iji dị iche n’otú onye ọzọ si gosi ya?

3 Olee otú ị ga-esi egosi na obi dị gị ụtọ maka ihe mgbapụta ahụ? Ihe ị ga-aza nwere ike ịdị iche n’ihe onye ọzọ ga-aza. Iji gosi ihe kpatara ya, chee banyere ihe atụ a. Ka e were ya na mmadụ atọ chọrọ ịga otu ebe, mana ebe onye nke ọ bụla si abịa dị iche. Ụzọ ha ga-esi ga-adị iche iche. Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ihe gbasara otú ị ga-esi egosi na obi dị gị ụtọ maka ihe mgbapụta. Ihe ga-ekpebi otú ị ga-esi egosi ya bụ otú gị na Jehova dịruru ná mma ugbu a. N’ihi ya, isiokwu a ga-ekwu banyere ụzọ ndị atọ: (1) ndị a na-amụrụ Baịbụl, (2) Ndị Kraịst e mere baptizim, na (3) ndị bụ́ atụrụ kpafuru akpafu.

NDỊ A NA-AMỤRỤ BAỊBỤL

4. Olee otú obi na-adị Jehova banyere ndị a na-amụrụ Baịbụl?

4 Ọ bụrụ na a na-amụrụ gị Baịbụl, chegodị banyere ihe a: Otú i si nabata ozi ọma gosiri na i so ná ndị Jehova na-adọta ka ha na ya dịrị ná mma. (Jọn 6:44; Ọrụ 13:48) “Ọ bụ Jehova na-enyocha obi.” Ọ pụtara na ọ na-ahụ mbọ ị na-agba ịmata ya. Obi na-adịkwa ya ụtọ ịhụ otú i si eme nke ọma ka ị na-agbanwe àgwà gị iji mee uche ya. (Ilu 17:3; 27:11) Ihe mgbapụta mere ka gị na Jehova nwee ike ịbụ enyi. (Rom 5:10, 11) Ejila adịm ná mma gị na ya gwuo egwu.

5. Olee otú ndị a na-amụrụ Baịbụl ga-esi mee ihe e kwuru ná Ndị Filipaị 3:16?

5 Ebe ị bụ onye a na-amụrụ Baịbụl, olee otú ị ga-esi gosi na obi dị gị ụtọ maka ihe mgbapụta? Otu ụzọ ị ga-esi eme ya bụ ime ihe Pọl onyeozi gwara ndị Filipaị. Ọ sịrị ha: “Otú ọ bụla anyị merurula nke ọma, ka anyị si otú ahụ mere nke ọma na-aga.” (Fil. 3:16) Otú e si kwuo ya na Baịbụl ọzọ bụ: “Ka anyị na-aga n’ebe ahụ anyị na-aga ugbu a.” N’ihi ya, ekwela ka ihe ọ bụla ma ọ bụ onye ọ bụla mee ka ị kwụsị ịga ije n’ụzọ ahụ na-eduba ná ndụ ebighị ebi.​—Mat. 7:14; Luk 9:62.

6. Gịnị ka ndị a na-amụrụ Baịbụl nwere ike ime ma o siere ha ike ikweta ihe a kụziiri ha ma ọ bụ ịgbanwe àgwà ha kwesịrị ịgbanwe? (Diuterọnọmi 30:11-14) (Kọwaakwa foto.)

6 Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ọ na-esiri gị ike ikweta otu ihe e si na Baịbụl kụziere gị n’oge na-adịbeghị anya? Mee nchọnchọ gbasara ya, kpeekwa ekpere ka Jehova nyere gị aka ịghọtakwu ya. (Ọma 86:11) Ọ bụrụ na ọ ka na-esiri gị ike ịghọta ya, hapụtụgodị ya. Mana akwụsịla ịmụ Baịbụl. Gịnị ka ị ga-eme ma o siere gị ike ịkwụsị ime ihe Baịbụl sịrị na ọ dịghị mma? Cheta na Jehova anaghị agwa ụmụ mmadụ na-ezughị okè ka ha mee ihe ha na-agaghị emeli. Ị ga-emeli ihe ọ gwara anyị mee. (Gụọ Diuterọnọmi 30:11-14.) Jehova kwere nkwa inyere gị aka. (Aịza. 41:10, 13; 1 Kọr. 10:13) N’ihi ya, adala mbà. Kama ịnọ na-eche banyere ihe siiri gị ike, chewe banyere ihe ọma niile Jehova na-emere gị, nke ka nke, otú o si zite Ọkpara ya ka ọ nwụọ maka gị. Ka ị na-ahụkwu Jehova n’anya, ị ga-achọpụta na ‘ihe ndị o nyere n’iwu esighị oké ike.’​—1 Jọn 5:3.a

Ebe otu nwoke na-agụ isi nke 40 n’akwụkwọ “Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi.” N’elu tebụl ya, e nwere mkpọ sịga na sịga ndị a ṅụchara aṅụcha juru n’ebe a na-etinye ha.

Jehova anaghị agwa anyị mee ihe anyị na-agaghị emeli. Ọ ga-enyere anyị aka ime ihe dị ya mma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6)


7. Gịnị ka ụmụaka nne na nna ha nọ n’ọgbakọ kwesịrị ichebara echiche?

7 Gịnị ka unu bụ́ ụmụaka nne na nna unu nọ n’ọgbakọ ga-eme? Unu sokwa ná ndị a na-amụrụ Baịbụl. Nke bụ́ eziokwu bụ na unu bụ ndị kacha mkpa nne na nna unu na-amụrụ Baịbụl. Baịbụl sịrị: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.” (Jems 4:8; 1 Ihe 28:9) Ọ bụrụ na gịnwa abịaruo Jehova nso, yanwa ga-abịarukwa gị nso. Ihe mere Jehova ji na-ahụ gị abụghị maka na nne na nna gị bụ Ndịàmà ya. Kama, ọ na-ahụ gị maka na ọ chọrọ ka ị bụrụ ezigbo enyi ya. Gịnị mere o ji kwe omume na ị bụ ezigbo enyi Jehova? Ọ bụ maka ihe mgbapụta. Ejikwala ya gwuo egwu. (Rom 5:1, 2) N’ihi ya, tupu gị agaa Ncheta Ọnwụ Jizọs nke afọ a, ọ ga-adị mma ka i chee banyere uru ọnwụ Jizọs baara gị. Ka iche banyere ya mee ka i mee ihe ọ bụla ọzọ i kpebiri ime iji gosi na obi dị gị ụtọ maka ihe mgbapụta Jehova si n’aka Ọkpara ya nye anyị.b

NDỊ KRAỊST E MERE BAPTIZIM

8. Olee otú Ndị Kraịst e mere baptizim sirila gosi na ha nwere okwukwe n’ihe mgbapụta?

8 Ọ bụrụ na ị bụ Onye Kraịst e mere baptizim, i sila n’ụzọ ụfọdụ gosi na i nwere okwukwe n’ihe mgbapụta. Dị ka ihe atụ, ị gbanweela àgwà gị ka i mee Jehova obi ụtọ nakwa ka ị bụrụ enyi ya. Ị na-ezi ndị ọzọ ozi ọma ma na-akụziri ha banyere Jehova na Jizọs otú ahụ Jizọs kwuru ka e mee. I nyefere Jehova onwe gị ma mee baptizim. O nwere ike ịbụ na a na-emegide gị n’ihi na ị na-efe Jehova. (2 Tim. 3:12) Otú i si na-atachi obi gosiri na ị hụrụ Jehova n’anya nakwa na obi dị gị ụtọ maka ihe mgbapụta o si n’aka Ọkpara ya nye anyị.​—Hib. 12:2, 3.

9. Olee nsogbu Onye Kraịst merela baptizim kwesịrị ịkpachara anya maka ya?

9 Ebe anyị bụ Ndị Kraịst e mere baptizim, anyị kwesịrị ịkpachara anya maka otu nsogbu. Ka oge na-aga, anyị nwere ike ịkwụsị iji ihe mgbapụta kpọrọ ihe. Olee otú o nwere ike isi eme? Legodị ihe Ndị Kraịst nọ n’Efesọs n’oge ndịozi mere. Ha gosiri na ha na-atachi obi. Jizọs jakwara ha mma maka ya. Ma, ọ sịrị ha: “Ihe na-adịghị mụ mma unu mere bụ na unu ahụghịzi Chineke n’anya otú unu hụrụ ya na mbụ.” (Mkpu. 2:3, 4) Ihe a Jizọs kwuru gosiri na Onye Kraịst nwere ike ịna-eme ihe ndị gbasara ofufe Jehova, mana o jighị obi ya niile na-eme ha. O nwere ike ịna-ekpe ekpere, na-aga ọmụmụ ihe, na-ekwusa ozi ọma naanị iji mezuo iwu. Ihe mere o ji na-eme ya abụghịzi maka na ọ hụrụ Jehova n’anya. Gịnị ka i nwere ike ime ma ị chọpụta na ị hụghịzi Jehova n’anya otú ị hụburu ya?

10. Olee otú i nwere ike isi ‘chebara’ ofufe ị na-efe Chineke echiche, meekwa ‘ka obi gị niile dịrị na ya’? (1 Timoti 4:13, 15)

10 Pọl onyeozi gwara Timoti ka ọ “na-echebara” ofufe ọ na-efe Jehova echiche nakwa ‘ka obi ya niile dịrị na ya.’ (Gụọ 1 Timoti 4:13, 15.) Gịnwa nwekwara ike iche gbasara ihe ndị i nwere ike ịna-eme ‘ka mmụọ Chineke mee ka ị na-anụ ọkụ n’obi’ n’ofufe Chineke. (Rom 12:11) Dị ka ihe atụ, i nwere ike iwepụtakwu oge na-akwadebe ọmụmụ ihe nke ọma. Ọ ga-enyere gị aka ịna-ege ntị nke ọma n’ọmụmụ ihe. Ị mụwa ihe n’onwe gị, i nwekwara ike ịga n’ebe naanị gị ga-anọ ka i nwee ike ichebara ihe ị na-amụ echiche nke ọma. Ọ ga-eme ka ihe ị na-amụ bakwuoro gị uru. Otú ahụ itinye nkụ n’ọkụ na-eme ka ọkụ ghara ịnyụ ka ime ihe ndị a ga-eme ka ị ghara ịkwụsị igosi na obi dị gị ụtọ maka ihe mgbapụta na ihe ọma ndị ọzọ Jehova na-emere gị. N’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs, i nwekwara ike iche banyere otú Jehova si agọzi anyị n’ihi na anyị bụ Ndịàmà ya. O doro anya na ọ ga-eme ka ị na-egosikwu na obi dị gị ụtọ maka ihe mgbapụta, bụ́ ihe mere ka gị na Jehova dị n’ezigbo mma.

11-12. Ọ bụrụ na ị naghịzi anụ ọkụ n’obi n’ofufe Jehova, ọ̀ na-egosi na i nweghịzi mmụọ Chineke? Kọwaa. (Kọwaakwa foto.)

11 Ọ bụrụ na ị naghịzi anụ ọkụ n’obi n’ofufe Jehova otú ị na-emebu, adala mbà ma ọ bụ chee na i nweghịzi mmụọ Chineke. Cheta ihe Pọl onyeozi degaara ndị Kọrịnt gbasara ozi ya. Ọ sịrị: “Ọ bụrụgodị na ọ bụghị ihe m chọrọ ime, m ga-emerịrị ya n’ihi na ọ bụ ọrụ Chineke họpụtara m ka m na-arụ.” (1 Kọr. 9:17) Gịnị ka ihe a o kwuru pụtara?

12 Mgbe ụfọdụ, ikwusa ozi ọma anaghị agụ Pọl agụụ. Ma, o kpebisiri ike ịna-ekwusa ozi ọma n’agbanyeghị otú obi dị ya n’oge ọ bụla. I nwere ike ikpebisi ike ịna-eme ka ya. Kpebie ịna-eme ihe dị mma, ma ọ̀ gụrụ gị agụụ ma ọ bụ na ọ gụghị gị. N’ihi ya, na-ekpe ekpere ka Chineke ‘mee ka i nwee mmasị ime ihe, nyekwa gị ike i ji eme ya.’ (Fil. 2:13) Na-eme ihe ndị gbasara ofufe Jehova. Ka obi sie gị ike na ka oge na-aga, ime ihe ndị ahụ ga-eme ka ị hụwa Jehova n’anya otú ị hụburu ya, gị anụwakwa ọkụ n’obi n’ofufe ya.

Ebe otu nwanna nwaanyị obi na-adịghị mma bu nwa ya n’ihe e ji akwagharị ụmụaka, ya na nwanna nwaanyị ọzọ ana-arụ n’ozi ọma. Nwanna nwaanyị ahụ konyere ya aka.

Na-eme ihe ndị gbasara ofufe Jehova ọ bụrụgodị na ọ naghị agụ gị agụụ ime ha mgbe ụfọdụ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11 na nke 12)


13. Olee otú anyị ga-esi na-enyocha onwe anyị ka anyị mara ma ‘okwukwe anyị ò sikwara ike’?

13 Anyị kwesịrị ịna-eme, anyị gụrụ gụrụ, anyị enyochaa onwe anyị. Ọ bụ ihe Pọl gwara anyị ka anyị mee ná 2 Ndị Kọrịnt 13:5. Ebe ahụ sịrị: “Na-enyochanụ onwe unu ka unu mara ma okwukwe unu ò sikwara ike. Na-egosinụ ụdị mmadụ unu bụ.” Anyị nọtụ, anyị nwere ike ịjụ onwe anyị ajụjụ ndị dị ka, ‘Ihe kacha mkpa ná ndụ m ọ̀ bụ ihe gbasara Alaeze Chineke?’ (Mat. 6:33) ‘Ihe ndị m ji atụrụ ndụ hà na-egosi na m kpọrọ ihe ọjọọ asị?’ (Ọma 97:10) ‘M̀ na-eme ka ọgbakọ dịrị n’otu nakwa ka udo dịrị na ya?’ (Efe. 4:2, 3) Oge Ncheta Ọnwụ Jizọs bụ oge dị mma iche banyere ihe mgbapụta Jehova nyere anyị. Anyị kwesịrị iji oge ahụ nyochaa onwe anyị ma gosi na anyị na-ebi ndụ otú Kraịst chọrọ, ọ bụghị otú anyịnwa chọrọ.c

NDỊ BỤ́ ATỤRỤ KPAFURU AKPAFU

14. Gịnị mere ụfọdụ ụmụnna ji kwụsị ịbịa ọmụmụ ihe?

14 Ụfọdụ Ndị Kraịst jirila obi ha niile fee Jehova ruo ọnwa ụfọdụ ma ọ bụdị ọtụtụ afọ akwụsịla ịbịa ọmụmụ ihe. N’ihi gịnị? Ụfọdụ bụ ndị “nchegbu nke ndụ” mere ka ha kwụsị. (Luk 21:34) E nwere ndị kwụsịrị n’ihi ihe nwanna kwuru ma ọ bụ ihe nwanna mere. (Jems 3:2) E nwekwara ndị mere mmehie dị oké njọ na-achọghị ikwu ka e nyere ha aka. N’agbanyeghị ihe kpatara ya, gịnị ka i nwere ike ime ma ọ bụrụ na ị kwụsịrị ịbịa ọmụmụ ihe? Gịnị ka ihe mgbapụta na otú Jehova na Jizọs si hụ gị n’anya nwere ike ime ka i mee?

15. Olee otú Jehova si egosi na ọ ka hụrụ atụrụ ya kpafuru akpafu n’anya? (Ezikiel 34:11, 12, 16)

15 Chee otú obi dị Jehova gbasara ndị kwụsịrịla ịbịa ọmụmụ ihe. Ọ jụbeghị ha. Kama, ọ na-achọ atụrụ ya kpafuru akpafu. Ọ na-enye ha nri, na-enyekwara ha aka ịlọghachikwute ya. (Gụọ Ezikiel 34:11, 12, 16.) Jehova ọ̀ na-emere gị otú ahụ? Ee. Ebe ọ bụ na ị na-agụ isiokwu a, ọ pụtara na ị ka chọrọ ime ihe dị ya mma. Jehova hụrụ ihe dị mma n’ebe ị nọ, nyere gị aka gị amata ya ma bata n’ọgbakọ. Ọ ka hụrụ ihe dị mma n’ebe ị nọ, chọọkwa ka ị lọghachikwute ya.

16. Gịnị nwere ike inyere atụrụ Jehova kpafuru akpafu aka ịlọghachikwute ya? (Kọwaakwa foto.)

16 Broshọ bụ́ Lọghachikwute Jehova kwuru ihe ndị a na-agba ume. Ọ sịrị: “Ka obi sie gị ike na Jehova ga-enyere gị aka ná mbọ ị na-agba ịlọghachikwute ya. Ọ ga-enyere gị aka ịkwụsị ịna-echegbu onwe gị na ịkwụsị ịna-ewe iwe maka ihe nwanna gị mere gị, nyekwara gị aka ka obi kwụsị ịna-ama gị ikpe. O nweziri ike ibidokwa gụwa gị agụụ isoro ụmụnna gị fewe Jehova.” Chetakwa na ọ na-agụsi ndị okenye agụụ ike inyere gị aka. Ha nwere ike ịbụ “ebe mmadụ na-agbaba ka o zere ifufe nakwa ebe mmadụ na-agbaba ka o zere nnukwu mmiri ozuzo.” (Aịza. 32:2) Iji gosi na obi dị gị ụtọ maka ihe mgbapụta, jụọ onwe gị, sị, ‘Gịnị ka m ga-eme ugbu a ka mụ na Jehova “kpezie”?’ (Aịza. 1:18; 1 Pita 2:25) Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịga ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. I nwekwara ike ịgakwuru otu okenye gwa ya na ị chọrọ ịlọghachikwute Jehova. O nwere ike ịhazi ka a mụọrọ gị Baịbụl ruo oge ụfọdụ. Ka obi sie gị ike na Jehova ga-agọzi mbọ niile ị na-agba ịlọghachikwute ya nakwa igosi na obi dị gị ụtọ maka ihe mgbapụta.

Ebe otu nwoke mere agadi ji Baịbụl n’aka, kwụrụ n’ebe dị nso n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ọ nọ na-ele ka ụmụnna ji obi ụtọ na-anabata ibe ha ka ha na-abịa ọmụmụ ihe.

Jụọ onwe gị, sị, ‘Olee ihe ndị m nwere ike ime ugbu a ka mụ na Jehova “kpezie”?’ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16)


GỊNỊ KA Ị GA-EME?

17-18. Olee ihe bara uru anyị nwere ike iji oge Ncheta Ọnwụ Jizọs nke afọ a mee?

17 Jizọs kwuru na ihe mere e ji nye ihe mgbapụta bụ “ka a ghara ibibi onye ọ bụla nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Jehova ji ihe mgbapụta anapụta anyị n’aka mmehie na ọnwụ. E nweghị onye n’ime anyị kwesịrị iji ya gwuo egwu. (Rom 3:23, 24; 2 Kọr. 6:1) N’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs, ka anyị wepụta oge chee banyere otú Jehova na Jizọs si gosi na ha hụrụ anyị n’anya. Ọ ga-eme ka anyị gosi na obi dị anyị ụtọ maka ịhụnanya ha.

18 Olee otú ị ga-esi gosi na obi dị gị ụtọ maka ihe mgbapụta? Otú ị ga-esi gosi ya nwere ike ịdị iche n’otú onye ọzọ ga-esi gosi ya. Ma, ka obi sie gị ike na Jehova ga-agọzi mbọ gị na ọtụtụ nde ụmụnna gị n’ụwa niile na-agba, bụ́ ndị na-anaghịzi ‘eme ihe masịrị ha, kama ha na-eme ihe masịrị onye nwụrụ maka ha.’​—2 Kọr. 5:15.

OLEE OTÚ NDỊ A NWERE IKE ISI GOSI NA OBI DỊ HA ỤTỌ MAKA IHE MGBAPỤTA?

  • Ndị a na-amụrụ Baịbụl

  • Ndị Kraịst e mere baptizim

  • Ndị bụ́ atụrụ kpafuru akpafu

ABỤ NKE 14 Anyị Na-eto Eze Ọhụrụ nke Ụwa

a Ebe e dere “Ihe ị ga-agba mbọ mee” ná ngwụcha isiokwu ọ bụla dị n’akwụkwọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi ga-enyere gị aka ime ihe ị mụtara na Baịbụl.

b Gụọ isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto, ‘Na-emenụ Ihe Ga-ewetara Unu Nzọpụta’” n’Ụlọ Nche Disemba 2017, ka ị hụ otú ị ga-esi na-eme ka gị na Jehova na-adịkwu ná mma.

c Ị chọọ ịhụ ihe ị ga-eme iji gosi na obi dị gị ụtọ maka ihe Jehova meere gị, gụọ isiokwu bụ́ “Gịnị Na-akpali Gị Ijere Chineke Ozi?” n’Ụlọ Nche June 15, 1995.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya