MACH 2 RUO 8, 2026
ABỤ NKE 97 Okwu Chineke Na-enye Ndụ
Na-ekwe Ka Jehova ‘Na-eduzi Gị’
ISIOKWU AFỌ 2026: “Ndị ma na ọ bụ Chineke kwesịrị ịna-eduzi ha na-enwe obi ụtọ.”—MAT. 5:3.
IHE A GA-AMỤ
Ihe anyị ga-eme ka nri si n’Okwu Chineke, iyiri àgwà ọhụrụ ka uwe, na nchebe Chineke na-echebe anyị baara anyị uru.
1. Olee ihe ụfọdụ dị ụmụ mmadụ mkpa? (Matiu 5:3)
JEHOVA kere ụmụ mmadụ otú ihe ụfọdụ ga-adị ha mkpa. Dị ka ihe atụ, ka anyị nwee ike ịdị ndụ, anyị kwesịrị ịna-eri nri, ịna-eyi uwe, na ịna-ebi n’ụlọ. Ọ bụrụ na anyị enweghị nke ọ bụla n’ime ihe ndị a, ọ bụrụgodị ruo obere oge, anyị nwere ike ịnwụ ma ọ bụ ihe esiere anyị ezigbo ike. Mana e nwere ihe ọzọ dị ụmụ mmadụ mkpa. Jehova kere anyị ka anyị mara ya ma tụkwasị ya obi ka ọ na-eduzi anyị. (Gụọ Matiu 5:3.) Anyị chọọ ịna-enwe ezigbo obi ụtọ, anyị ga-aghọta na anyị na Chineke kwesịrị ịdị ná mma, anyị atụkwasịkwa ya obi.
2. Olee ihe atụ ị ga-eji akọwa ihe ‘ịma na ọ bụ Chineke kwesịrị ịna-eduzi anyị’ pụtara?
2 Gịnị ka ‘ịma na ọ bụ Chineke kwesịrị ịna-eduzi anyị’ pụtara? Otú e si dee ya n’asụsụ Grik pụtara ndị na-arịọ ka e nye ha mmụọ nsọ. Chegodị gbasara otu nwoke bụ́ onye arịrịọ. Uwe ya dọkara adọka, ya anọrọkwa n’ala n’okporo ámá. Ike gwụrụ ya n’ihi na o ribeghị nri. Ezigbo anwụ na-acha ya n’ehihie. N’abalịkwa, ezigbo oyi na-atụ ya. Ndị mmadụ na-agbara ya ọsọ. N’ihi ya, obi anaghị adị ya mma. Onye arịrịọ a ma na e kwesịrị inyere ya aka ka o nwee ike ịdịrị ndụ na-aga, ahụ́ agbasiekwa ya ike. Ọ bụkwa otú ọ dị ndị ma na ọ bụ Chineke kwesịrị ịna-eduzi ha ma ọ bụ ndị na-arịọ ka e nye ha mmụọ nsọ. Ha ma na ọ bụ enyemaka Chineke ga-eme ka ha dị ndụ. N’ihi ya, ọ na-agụsi ha agụụ ike irite uru n’otú Jehova si eduzi ndị hụrụ ya n’anya.
3. Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu a?
3 N’isiokwu a, anyị ga-ebu ụzọ tụlee ihe anyị ga-amụta n’aka otu nwaanyị bụ́ onye Finishia rịọrọ Jizọs ka o nyere ya aka. Akụkọ a ga-eme ka anyị ghọta àgwà atọ ndị ma na ọ bụ Chineke kwesịrị ịna-eduzi ha kwesịrị ịna-akpa. Anyị ga-elebazi anya n’ihe anyị ga-amụta n’aka Pita onyeozi, Pọl onyeozi, na Eze Devid. Ha atọ ma na ọ bụ Chineke kwesịrị ịna-eduzi ha.
ỊDỊ UMEALA N’OBI, ỊRỊỌSI ARỊRỊỌ IKE, NA INWE OKWUKWE
4. Gịnị ka otu nwaanyị Finishia chọrọ ka Jizọs meere ya?
4 Otu nwaanyị Finishia bịakwutere Jizọs otu ụbọchị. ‘Mmụọ ọjọọ ji nwa ya nwaanyị aka ọjọọ.’ (Mat. 15:21-28) Nwaanyị ahụ gburu ikpere n’ala n’ihu Jizọs, rịọ ya ka o nyere ya aka. E nwere àgwà ndị magburu onwe ha nwaanyị ahụ kpara mgbe ọ bịakwutere Jizọs. Ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime ha.
5. Olee àgwà ndị nwaanyị ahụ kpara? Gịnịkwa ka Jizọs meere ya? (Kọwaakwa foto.)
5 Nwaanyị Finishia ahụ dị ezigbo umeala n’obi. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na o weghị iwe maka ihe Jizọs zara ya. N’ihe atụ Jizọs mere, o ji nwaanyị ahụ tụnyere nwa nkịta, nke nwere ike ịbụ ụdị anụ ụlọ ndị na-abụghị ndị Juu na-edowe n’ụlọ ha. Gịnị ka ị gaara eme ma ọ bụrụ gị ka Jizọs gwara ihe ahụ? Ị̀ gaara ewere ya na ọ kparịala gị, kwụsị ịrịọ ya ka o nyere gị aka? Nwaanyị Finishia ahụ emeghị otú ahụ. Ọ bụghị naanị na ọ dị umeala n’obi, kama ọ kwụsịghị ịrịọsi arịrịọ ike. Otú o si na-arịọ Jizọs ka o nyere ya aka gosiri na ihe a bụ eziokwu. Gịnị mere o ji mee otú ahụ? Ọ bụ maka okwukwe o nwere na Jizọs. Mgbe Jizọs hụrụ na okwukwe ya siri ike, o kpebiri inyere ya aka. N’agbanyeghị na o bula ụzọ gwa nwaanyị ahụ na e zitere ya naanị “maka atụrụ furu efu, bụ́ mba Izrel,” o nyeere ya aka ma chụpụ mmụọ ọjọọ ahụ ji nwa ya nwaanyị.
Nwaanyị Finishia dị umeala n’obi. Ọ rịọsiri Jizọs arịrịọ ike, nweekwa okwukwe na ọ ga-enyeliri ya aka (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5)
6. Gịnị ka anyị na-amụta n’akụkọ nwaanyị Finishia?
6 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Chineke na-eduzi anyị, anyị kwesịrị ịmụta àgwà ndị ahụ nwaanyị ahụ kpara. Anyị ga-adị umeala n’obi, na-arịọsi Chineke arịrịọ ike, nweekwa okwukwe siri ike. Ọ bụ naanị onye dị umeala n’obi ga na-arịọsi Chineke arịrịọ ike ka o nyere ya aka. Anyị ga-enwekwa okwukwe siri ike na Jizọs Kraịst ma tụkwasị ndị o ji eduzi ndị na-eso ụzọ ya obi. (Mat. 24:45-47) Obi na-adị Jehova na Ọkpara ya ụtọ ma anyị nwee àgwà ndị ahụ. Anyị mee otú ahụ, ha ga-enyere anyị aka ma na-eduzi anyị. (I nwere ike ịtụle Jems 1:5-7.) Ka anyị lebazie anya n’otú Jehova si enye anyị ihe ndị e nwere ike iji tụnyere nri, uwe, na ụlọ. Anyị ga-ahụkwa ihe anyị ga-amụta n’aka Pita onyeozi, Pọl onyeozi, na Eze Devid. Ọ ga-enyere anyị aka ịna-erite uru n’ihe ndị ahụ Jehova na-enye anyị.
DỊ KA PITA, NA-ERIJU NRI SI N’OKWU CHINEKE AFỌ
7. Olee ọrụ Jizọs nyere Pita? Mana, gịnị ka Pita kwesịkwara ịna-eme? Kọwaa. (Ndị Hibru 5:14–6:1)
7 Chegodị banyere Pita onyeozi. O so ná ndị Juu mbụ matara na Jizọs bụ Mezaya, onye Jehova ji na-akụziri ndị ya ‘okwu na-enye ndụ ebighị ebi.’ (Jọn 6:66-68) Tupu Jizọs alaghachi eluigwe mgbe a kpọlitechara ya n’ọnwụ, o nyere Pita ọrụ ma sị ya: “Na-enye ụmụ atụrụ m nri.” (Jọn 21:17) Pita ji obi ya niile rụọ ọrụ ahụ. Jehova jidị ya dee akwụkwọ ozi abụọ dị na Baịbụl. Ma, Pita kwesịkwara ịna-eri nri si n’Okwu Chineke. Dị ka ihe atụ, ọ mụrụ akwụkwọ ozi ndị Pọl onyeozi dere tupu mgbe ahụ. Pita kwuru na ụfọdụ n’ime ihe ndị Pọl dere “siri ike nghọta.” (2 Pita 3:15, 16) Ma, o doro anya na ike agwụghị Pita ịna-eri “nri siri ike” dị n’akwụkwọ ozi ndị ahụ Pọl si n’ike mmụọ nsọ dee. O nwere okwukwe na Jehova ga-enyere ya aka ịghọta ya ma na-eme ihe ọ mụtara.—Gụọ Ndị Hibru 5:14–6:1.
8. Gịnị ka Pita mere mgbe Jehova si n’aka otu mmụọ ozi kụziere ya ihe ọhụrụ?
8 Pita nwere okwukwe na Jehova ma rube isi n’ihe ọ gwara ya mee. Dị ka ihe atụ, mgbe Pita nọ na Jọpa, bụ́ obodo nwere ọdụ ụgbọ mmiri, ọ hụrụ ọhụụ ebe otu mmụọ ozi gwara ya ka o gbuo ma rie anụ ndị Iwu Mosis kwuru na ha adịghị ọcha. Akpata oyi ga-awụ onye Juu ọ bụla a gwara ka o mee ihe ahụ. Pita bu ụzọ zaa, sị: “Onyenwe anyị, mbanụ, n’ihi na eritụbeghị m ihe rụrụ arụ ma ọ bụ ihe na-adịghị ọcha.” A gwaziri Pita, sị: “Kwụsị ịkpọ ihe Chineke mere ka ha dị ọcha ihe rụrụ arụ.” (Ọrụ 10:9-15) Pita ghọtara ihe a gwara ya. Olee otú anyị si mara? Ọ dịghị anya ọ hụchara ọhụụ ahụ, mmadụ atọ abịa n’ụlọ ya, gwa ya na nna ha ukwu Kọnịliọs na-akpọ ya ka ọ bịa. Tupu Pita ahụ ọhụụ ahụ, ọ gaaraghị ekwe aga n’ụlọ Kọnịliọs na-abụghị onye Juu. Ndị Juu weere ndị na-abụghị ndị Juu ka ndị na-adịghị ọcha. (Ọrụ 10:28, 29) Ma, ozugbo ahụ, Pita nabatara ihe ọhụrụ ahụ Jehova si n’ọhụụ kụziere ya. (Ilu 4:18) O ziri Kọnịliọs na ezinụlọ ya ozi ọma. Obi dịkwa ya ụtọ ịhụ ka ha nwere okwukwe na Jizọs, mmụọ nsọ adakwasị ha, e meekwa ha baptizim.—Ọrụ 10:44-48.
9. Olee uru abụọ ịmụ ihe ndị nwere ike isi ike nghọta ga-abara anyị?
9 Dị ka Pita, anyị kwesịrị ịna-amụ Okwu Chineke mgbe niile. Ọtụtụ mgbe, anyị na-agụ ihe ndị dị mfe nghọta. Anyị kwesịkwara ịgba mbọ na-amụ ihe ndị nwere ike isi ike nghọta. Anyị kwesịrị iwepụta oge ma dịrị njikere ịgbalịsi ike ghọtakwuo Okwu Chineke. Mana, mbọ ọ bụla anyị gbara ime otú ahụ agaghị efu ọhịa. Maka gịnị? Ma é nweghị ihe ọzọ, e nwere uru abụọ ọ ga-abara anyị. Nke mbụ, anyị ga-amụta ihe ndị ga-eme ka anyị hụkwuo Jehova n’anya ma na-akwanyekwuru ya ùgwù. Nke abụọ, ọ ga na-agụsikwu anyị agụụ ike ịgwa ndị ọzọ banyere Nna anyị nke eluigwe dị ịtụnanya. (Rom 11:33; Mkpu. 4:11) Ihe ọzọ anyị na-amụta n’ihe Pita mere bụ na a gbanwee otú anyị si ghọta ihe Baịbụl kwuru, anyị kwesịkwara ịgbanwe echiche anyị na omume anyị ozugbo. Ọ gwụla mgbe anyị mere otú ahụ ka Jehova ga na-eduzi anyị ma jiri anyị na-arụ ọrụ.
DỊ KA PỌL, YIRI ÀGWÀ ỌHỤRỤ KA UWE
10. Dị ka e kwuru ná Ndị Kọlọsi 3:8-10, gịnị ka anyị kwesịrị ime ka obi na-adị Jehova ụtọ?
10 Anyị chọọ ime ihe dị Chineke mma, anyị ga-anabata ihe ọzọ o nyere anyị, ya bụ, àgwà ọhụrụ ọ chọrọ ka anyị yiri ka uwe. Maka gịnị? Pọl onyeozi gwara anyị ka anyị ‘yipụ àgwà ochie anyị na-akpabu’ ma yiri “àgwà ọhụrụ.” (Gụọ Ndị Kọlọsi 3:8-10.) Iyiri àgwà ọhụrụ ahụ anaghị adị mfe. Ọ na-ewekwa oge. Chegodị banyere Pọl. Ọ malitere mgbe ọ bụ okorobịa gbalịsiwe ike ime ihe dị Chineke mma. (Gal. 1:14; Fil. 3:4, 5) Mana, ọ ghọtaghị otú Chineke chọrọ ka e si fee ya. N’ihi ya, ọ naghị efe Chineke otú ọ chọrọ. Ebe ọ bụ na ọ maghị eziokwu banyere Jizọs, dịrịkwa mpako, àgwà ọ na-akpa adịghị Chineke mma. O kwuru na ya ‘na-akparị ndị mmadụ.’—1 Tim. 1:13.
11. Olee àgwà na-adịghị mma Pọl gbalịsiri ike ịkwụsị? Kọwaa.
11 Tupu Pọl aghọọ Onye Kraịst, ọ na-ewe iwe ọkụ. Otu akụkọ a kọrọ n’Ọrụ Ndịozi kwuru na Pọl nọ na-ewesa ndị na-eso ụzọ Jizọs iwe nke na o ‘kpebiri imesi ha ike, chọọkwa igbuchapụ ha.’ (Ọrụ 9:1) Mgbe ọ ghọchara onye na-eso ụzọ Jizọs, o doro anya na ọ nọ na-agbalịsi ike ịna-ejide onwe ya ma iwe wewe ya. Ọ bịaziri dị obiọma ma na-enwe ndidi. (Efe. 4:22, 31) N’agbanyeghị ya, nghọtahie ya na Banabas nwere mere ka ‘ha abụọ see ezigbo okwu.’ (Ọrụ 15:37-39) O so n’ihe ndị Pọl na-emetaghị. Mana, ọ daghị mbà. Ọ ka nọkwa ‘na-ejidesi onwe ya ike,’ ya bụ, na-agbalịsi ike ka o merie ezughị okè ya ka ọ bụrụ ụdị onye Jehova chọrọ.—1 Kọr. 9:27.
12. Gịnị nyeere Pọl aka iyipụ àgwà ochie ya ma yiri àgwà ọhụrụ?
12 Pọl yipụliri àgwà ochie ya ma yiri àgwà ọhụrụ n’ihi na ọ tụkwasịghị ike nke ya obi. (Fil. 4:13) Dịkwa ka Pita, Pọl tụkwasịrị “ike Chineke” obi. (1 Pita 4:11) Ma, Pọl mejọrọ ihe mgbe ụfọdụ, obi adawakwa ya mbà. Mgbe ọ bụla ọ dị ya otú ahụ, ọ na-eche banyere ihe ọma ndị Nna ya nke eluigwe meere ya, ya emee ka o kpebisikwuo ike ịna-agbakwu mbọ.—Rom 7:21-25.
13. Olee otú anyị ga-esi eme ka Pọl?
13 Anyị ga-emeli ka Pọl ma anyị ghọta na n’agbanyeghị afọ ole anyị ferela Jehova, anyị ka kwesịrị ịna-agbalịsi ike ka anyị yipụ àgwà ochie ma yiri àgwà ọhụrụ. Ọ bụ ya bụ ọmarịcha àgwà Chineke chọrọ ka anyị yiri ka uwe. Anyị mee ihe anyị na-ekwesịghị ime, dị ka iwe iwe ọkụ ma ọ bụ ịgwa mmadụ okwu ọjọọ, anyị ekwesịghị iche na anyị agaghị emeli ihe dị Jehova mma. Kama iche otú ahụ, anyị kwesịrị ijisi ike na-agbanwe echiche anyị na omume anyị. (Rom 12:1, 2; Efe. 4:24) Ma, ka anyị na-eme otú ahụ, otu ihe dị mkpa anyị kwesịrị ịna-echeta bụ na àgwà ọhụrụ Jehova chọrọ ka anyị yiri ka uwe adịghị ka uwe nkịtị anyị nwere ike ịkpatụ aka ka o nwee ike ịba anyị. Ọ bụ anyịnwa ga-agbanwe ihe ụfọdụ ná ndụ anyị ka anyị nwee ike iyiri àgwà ọhụrụ ka uwe. N’ihi ya, anyị ga-agbanwe ụdị mmadụ anyị bụ iji mee ihe Chineke chọrọ.
DỊ KA DEVID, KWE KA JEHOVA NA-ECHEBE GỊ
14-15. Olee ụzọ dị iche iche Jehova si echebe ndị ya? (Abụ Ọma 27:5) (Kọwaakwa foto.)
14 Ọ bụghị naanị nri si n’Okwu Chineke na iyiri àgwà ọhụrụ ga-eme ka anyị nwee ezigbo obi ụtọ. Anyị kwesịkwara ikwe ka Jehova na-echebe anyị. Olee otú Jehova si echebe anyị? Gịnịkwa ka anyị ga-eme ka o nwee ike ịna-echebe anyị?
15 Eze Devid kwuru na Jehova ga-echebe ya mgbe ihe siri ike. (Gụọ Abụ Ọma 27:5.) Olee otú Jehova si echebe ndị ya? Jehova na-echebe ndị ya ka onye ọ bụla ma ọ bụ ihe ọ bụla ghara ime ka ha kwụsị inwe okwukwe na ya. O kwere nkwa na ngwá ọgụ ọ bụla a kpụrụ ka e jiri lụso ha ọgụ agaghị enwe isi. (Ọma 34:7; Aịza. 54:17) Ọ bụ eziokwu na Setan na ndị òtù ya siri ike, ma e nweghị ihe ọ bụla ha ga-eme anyị ga-adịru mgbe ebighị ebi. Ha gbugodị anyị, Jehova ga-akpọlite anyị n’ọnwụ. (1 Kọr. 15:55-57; Mkpu. 21:3, 4) Anyị chegbuwe onwe anyị, ọ na-enyekwara anyị aka ka anyị ghara ịkwụsị ife ya. (Ilu 12:25; Mat. 6:27-29) Nna anyị hụrụ anyị n’anya nyere anyị ụmụnna na-agba anyị ume ma na-akwado anyị mgbe ihe siri ike. O nyekwara anyị ndị okenye ga na-akụziri anyị ihe ma na-eme ka okwukwe anyị sie ike. (Aịza. 32:1, 2) Anyị gaa ọmụmụ ihe, a na-echetara anyị ụzọ ndị ọzọ anyị ga-esi kwe ka Jehova na-enyere anyị aka ma na-echebe anyị.—Hib. 10:24, 25.
Ebe otu nwanna nwaanyị so ụmụnna bịa ọmụmụ ihe maka na ọ chọrọ ka Chineke na-enyere ya aka (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14 na nke 15)
16. Olee ụzọ ụfọdụ Jehova si chebe Devid?
16 Mgbe Devid rubeere Jehova isi, o chebere ya ka nsogbu na-abịara ndị kpachaara anya na-eme mmehie ghara ịbịara ya. (I nwere ike ịtụle Ilu 5:1, 2.) Ma, mgbe Devid leghaara iwu Chineke anya, Jehova echebeghị ya ka ọ ghara ịta ahụhụ ya. (2 Sam. 12:9, 10) Gịnịkwanụ ka Devid mere n’oge ndị ọ tara ahụhụ n’ihi mmegbu ndị ọzọ megburu ya? O kpere ekpere kọọrọ Jehova otú obi dị ya. Jehova kasiri ya obi ma mee ka obi sie ya ike na ọ hụrụ ya n’anya nke ukwuu nakwa na ọ ga na-elekọta ya.—Ọma 23:1-6.
17. Olee otú anyị ga-esi mee ka Devid?
17 Otú anyị ga-esi mee ka Devid bụ ịchọ ndụmọdụ si n’aka Jehova ma anyị kpebiwe ihe anyị ga-eme. Anyị ga-aghọtakwa na ihe nwere ike isiri anyị ike mgbe ụfọdụ maka na anyị emeghị mkpebi dị mma, ọ bụghị maka na Jehova echebeghị anyị. (Gal. 6:7, 8) Ọ bụrụ na ihe ndị ọzọ mere akpatara anyị nsogbu, anyị ga-ekpe ekpere gwa Jehova otú ọ dị anyị n’obi, obi esiekwa anyị ike na ọ ga na-eche obi anyị na echiche anyị nche.—Fil. 4:6, 7.
KWE KA JEHOVA NA-EDUZI GỊ
18. Gịnị ka ọtụtụ ndị chere banyere nduzi si n’aka Chineke? Gịnịkwa ka anyị ga-eme ma anyị chọọ ka Jehova na-eduzi anyị? (Kọwaakwa foto.)
18 Isiokwu afọ 2026 sịrị: “Ndị ma na ọ bụ Chineke kwesịrị ịna-eduzi ha na-enwe obi ụtọ.” Ihe a Jizọs kwuru kacha dịrị ezigbo mkpa ugbu a. Maka gịnị? Ọ bụ maka na ọtụtụ ndị taa ekwetaghị na ọ bụ Chineke kwesịrị ịna-eduzi ha. E nwekwara ọtụtụ ndị kweere na Chineke ma kpebie ịna-efe ya otú masịrị ha. Ụfọdụ tụkwasịkwara amamihe mmadụ obi, nke na-eme ka obi ghara ịna-adị ha ụtọ. Anyị ekwesịghị ime ka ha. Gịnịkwanụ ka anyị ga-eme ka anyị nwee ike ikwe ka Jehova na-eduzi anyị? Ọ bụ ịna-eri nri si n’Okwu Chineke, na-eyiri àgwà ọhụrụ ka uwe ma kwe ka Jehova na-echebe anyị.
Anyị kwesịrị ịna-eri nri si n’Okwu Chineke, na-eyiri àgwà ọhụrụ ka uwe, kwekwa ka Chineke na-echebe anyị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 18)a
ABỤ NKE 162 Ọ Bụ Chineke Kwesịrị Ịna-edu M
a NKỌWA FOTO Dị n’Ihu Ụlọ Nche A: Ebe otu nwanna nwaanyị so ụmụnna bịa ọmụmụ ihe maka na ọ chọrọ ka Chineke na-eduzi ya. Peeji nke 6: Ebe nwanna nwaanyị ahụ nọ na foto bu ụzọ na-amụ Ụlọ Nche, ebe ọ na-emere ndị ọzọ obiọma, nke so n’àgwà ọhụrụ, nakwa ebe o kwere ka ndị okenye na-eduzi ya ma na-agba ya ume.