Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w25 Disemba p. 8-13
  • Akwụkwọ Job Nwere Ike Inyere Gị Aka Mgbe Ị Na-enye Ndụmọdụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Akwụkwọ Job Nwere Ike Inyere Gị Aka Mgbe Ị Na-enye Ndụmọdụ
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • OTÚ NDỊ ENYI JOB ATỌ SI NYE YA NDỤMỌDỤ
  • OTÚ ELAỊHU SI NYE JOB NDỤMỌDỤ
  • SI N’AKWỤKWỌ JOB NA-AMỤTAKWU IHE
  • Ihe Mmụta n’Ụzọ E Si Edozi Nsogbu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Ụgwọ Ọrụ Job—Isi Iyi nke Olileanya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Job
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Akwụkwọ Job Nwere Ike Inyere Gị Aka Mgbe Ị Na-ata Ahụhụ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
w25 Disemba p. 8-13

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 49

ABỤ NKE 44 Ekpere Onye Ọ Na-enweghị Ka Ọ Hà Ya

Akwụkwọ Job Nwere Ike Inyere Gị Aka Mgbe Ị Na-enye Ndụmọdụ

“Ugbu a, Job, biko nụrụ okwu m.”​—JOB 33:1.

IHE A GA-AMỤ

Otú akwụkwọ Job ga-esi enyere anyị aka ịma ihe anyị ga-ekwu na otú anyị ga-esi ekwu ya mgbe anyị na-enye mmadụ ndụmọdụ.

1-2. Olee ihe nwere ike ime ka o siere ndị enyi Job atọ na Elaịhu ike ịgba ya ume?

JOB bụ nwoke bara ezigbo ọgaranya. Mgbe ihe niile o nwere lara n’iyi, ọtụtụ ndị bi ebe ahụ nụrụ ihe merenụ. Ndị enyi ya atọ nụrụ ya, gawa Ọz ka ha kasie ya obi. Aha ha bụ Elifaz, Bildad, na Zofa. Mgbe ha rutere hụ otú ihe si dịrị Job, o juru ha anya.

2 Chegodịnụ ihe ha hụrụ. Job na-ata ahụhụ n’ihi na o nweghịzi ọtụtụ ihe dị ya mkpa ná ndụ. E zuuru ọtụtụ anụmanụ ya, gbuo ndị nke ọzọ. E gbukwara ọtụtụ ndị na-ejere ya ozi. Ụmụ ya niile nwụkwara mgbe ụlọ ha nọ na ya dakwasịrị ha. Ka a ka na-ekwu nke ahụ, etuto na-afụ ụfụ tojuru ya n’ahụ́. Mgbe ndị enyi ya atọ ahụ rutere, ọ nọ ọdụ ná ntụ, obi adịghịkwa ya mma. Gịnị ka ha mere? Ha sooro Job nọdụ ọdụ. Mana, ha atụpụrụghị ya ọnụ ruo ụbọchị asaa chara acha n’agbanyeghị na ha hụrụ na ahụ́ na-egbusi ya mgbu ike. (Job 2:12, 13) Ka oge na-aga, otu nwa okorobịa aha ya bụ Elaịhu bịakwara nọdụ ọdụ n’ebe dị ha nso. Job mechaziri kwuo okwu, bụọ ụbọchị a mụrụ ya ọnụ. Ọ dịkwa ya ka ọnwụ bịa gburu ya. (Job 3:1-3, 11) O doro anya na Job chọrọ ka ndị enyi ya nyere ya aka. Ihe ha ga-ekwu na otú ha ga-esi ekwu ya ga-egosi ma hà bụ ezigbo ndị enyi Job. Ọ ga-egosikwa ma ihe gbasara Job ọ̀ na-emetụ ha n’obi. Ka anyị hụ ihe ha mere.

3. Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu a?

3 Jehova mere ka Mosis dee ihe ndị enyi Job atọ na Elaịhu kwuru na ihe ha mere. I nwere ike icheta na Elaịhu kwuru ihe Jehova chọrọ ka o kwuo. Mana, ọ ga-abụ mmụọ ọjọọ gwara Elifaz ihe ụfọdụ o kwuru. (Job 4:12-16; 33:24, 25) N’ihi ya, ọ bụ eziokwu na anyị ga-ahụ ndụmọdụ mara ezigbo mma n’akwụkwọ Job, ma anyị ga-ahụkwa ndị nke jọrọ ezigbo njọ na ya. Anyị ga-amụta otú akwụkwọ Job ga-esi enyere anyị aka ma anyị chọọ inye mmadụ ndụmọdụ. Anyị ga-ebu ụzọ si n’aka ndị enyi Job atọ mụta ihe anyị na-ekwesịghị ikwu ma ọ bụ mee ma anyị nyewe mmadụ ndụmọdụ. Anyị ga-esizi n’aka Elaịhu mụta ihe anyị kwesịrị ikwu ma ọ bụ mee ma anyị nyewe mmadụ ndụmọdụ. Anyị ga-ahụkwa uru ọ ga-abụ na akwụkwọ Job baara ndị Izrel nakwa uru ọ ga-abara anyị taa.

OTÚ NDỊ ENYI JOB ATỌ SI NYE YA NDỤMỌDỤ

4. Gịnị mere ndị enyi Job atọ akasilighị ya obi? (Kọwaakwa foto.)

4 Baịbụl kwuru na ndị enyi Job atọ gara ka ha “sị Job ndo ma kasie ya obi” maka ihe ọjọọ ha nụrụ mere ya. (Job 2:11) Mana, ha akasighị ya obi ma otu. Maka gịnị? Ma é nweghị ihe ọzọ, e nwere ihe atọ kpatara ya. Nke mbụ, ha ewepụtaghị oge gee Job ntị ma ghọta otú ihe si dịrị ya. Dị ka ihe atụ, ha chere na Jehova na-ata Job ahụhụ maka ihe ọjọọ o mere.a (Job 4:7; 11:14) Nke abụọ, ọtụtụ ihe ha gwara Job abaraghị ya uru ọ bụla, ọ bụ eziokwu na o yiri okwu ndị ma ihe. (Job 13:12) Ha gwakwara Job okwu ọjọọ gbawara ya obi. Dị ka ihe atụ, Bildad gwara Job ugboro abụọ na ọ na-ekwu ọtụtụ okwu. (Job 8:2; 18:2) Mgbe ụfọdụ, okwu ha gosiri na ha dị obi ọjọọ. Dị ka ihe atụ, ihe Zofa kwuru gosiri na o weere Job ka “onye na-anaghị eche echiche.” (Job 11:12) Nke atọ, ọ bụ eziokwu na o yiri ka ha ejighị olu ike gwa Job okwu, ma otú ha si gwa ya okwu gosiri na ha akwanyereghị ya ùgwù, gosikwa na ha ahụghị ya n’anya. (Job 15:7-11) Ihe kazi ha mkpa bụ igosi na aka Job adịghị ọcha, ya emee ka ha ghara ịkasi ya obi.

Ebe otu n’ime ndị enyi Job atọ nọ na-agwa ya okwu ọjọọ, abụọ ndị ọzọ anọrọ na-ele n’anya. Etuto juru Job n’ahụ́, ahụ́ ana-afụ ya ụfụ ka ọ nọ n’ala na-ege ntị na ndụmọdụ a na-enye ya.

I nyewe mmadụ ndụmọdụ, ekwula okwu otú ga-eme ka ọ dị ya ka ị̀ na-eche na ị ka ya mma. Mkpa gị kwesịrị ịbụ inyere ya aka (A ga-akọwa ya na paragraf nke 4)


5. Olee ihe ndụmọdụ ndị enyi Job atọ nyere ya kpatara?

5 Ka a sịkwa ihe mere ndụmọdụ ndị enyi Job atọ nyere ya abaghị uru ọ bụla. Ha kwuru ihe gbawara ya obi. (Job 19:2) Ha nọ na-achọ igosi na Job mere ihe ọjọọ. Ọ bụ ya mere ihe kazi ya mkpa ji bụrụ igosi na aka ya dị ọcha. O meziri ka o kwuo ihe ụfọdụ na-adịghị mma. (Job 6:3, 26) Ihe ndị enyi Job kwuru adabaghị n’uche Jehova. Ha emetekwaraghị Job ebere. Ihe a mere ka Ekwensu jiri ha kwara ngwá ọrụ. (Job 2:4, 6) Olee uru ọ ga-abụ na akụkọ a baara ndị Izrel? Oleekwa uru ọ ga-abara anyị taa?

6. Olee ihe ụfọdụ ọ ga-abụ na ndị Izrel mụtara n’otú na-adịghị mma ndị enyi Job atọ si nye ya ndụmọdụ?

6 Uru ọ ga-abụ na ọ baara ndị Izrel. Mgbe Jehova nyechara ndị Izrel iwu ya, ọ họpụtara ndị okenye ga na-ekpe ndị ya ikpe ma nyere ha aka idebe iwu ya. (Diut. 1:15-18; 27:1) Ha kwesịrị ịna-ege ntị nke ọma tupu ha enyewe mmadụ ndụmọdụ ma ọ bụkwanụ kpee ikpe. (2 Ihe 19:6) Ha kwesịkwara ịna-ajụ ajụjụ ka ha mata otú ihe si mee kama iche na ha amarachaala ihe niile. (Diut. 19:18) Ha ekwesịghị ịna-agwa ndị bịara ka e nyere ha aka okwu ọjọọ. Maka gịnị? Ọ bụ n’ihi na a gwa ha okwu ọjọọ, o nwere ike ime ka ha ghara ikwu otú ọ dị ha n’obi. (Ọpụ. 22:22-24) Ihe a bụ ihe ụfọdụ ọ ga-abụ na ndị okenye Izrel mụtara n’akụkọ Job.

7. E wepụ ndị okenye Izrel, olee ndị ọzọ nwere ike inye mmadụ ndụmọdụ? Oleekwa uru ọ ga-abụ na akụkọ Job baara ha? (Ilu 27:9)

7 Ọ bụghị naanị ndị okenye Izrel ga na-enye ndị mmadụ ndụmọdụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na onye Izrel ọ bụla, ma nwata ma okenye, ma nwoke ma nwaanyị, nwere ike inye mmadụ ndụmọdụ. Ha nwere ike inyere enyi ha aka ka ya na Jehova dịrịkwuo ná mma ma ọ bụkwanụ gbazie enyi ha mere ihe na-adịghị mma. (Ọma 141:5) Ezigbo ndị enyi na-esi otú a enyere ibe ha aka. (Gụọ Ilu 27:9.) Ọ bụrụ na ndị Izrel echee gbasara otú ndị enyi Job atọ si gwa ya okwu, ọ ga-enyere ha aka ịma ihe ha na-agaghị ekwu na ihe ha na-agaghị eme ma ha nyewe mmadụ ndụmọdụ.

8. Olee ihe ndị anyị na-ekwesịghị ime ma anyị nyewe mmadụ ndụmọdụ? (Kọwaakwa foto.)

8 Uru ọ ga-abara anyị. Ebe anyị bụ Ndị Kraịst, ọ na-agụ anyị agụụ inyere ụmụnna anyị aka ma nsogbu bịara ha. Ma, anyị chọọ ime ya, anyị agaghị eme ihe ndị enyi Job atọ mere. Nke mbụ, anyị ekwesịghị iche na anyị amarachaala ihe niile merenụ. Kama, anyị kwesịrị ijide n’aka na anyị matara ihe niile anyị kwesịrị ịmata tupu anyị enye mmadụ ndụmọdụ. Nke abụọ, ndụmọdụ anyị kwesịrị isi n’Okwu Chineke, ọ bụghị ikwu ihe anyị chere otú ahụ Elifaz mere ọtụtụ ugboro. (Job 4:8; 5:3, 27) Nke atọ, anyị ekwesịghị ịgwa mmadụ okwu ọjọọ ma ọ bụ kwuo ihe ga-agbawa ya obi. Cheta na ụfọdụ ihe Elifaz na ndị enyi ya kwuru bụ eziokwu. Pọl onyeozi mechara kwughachi ihe ụfọdụ Elifaz kwuru. (I nwere ike ịtụle Job 5:13 na 1 Ndị Kọrịnt 3:19.) Ma, ha kwuru ọtụtụ ihe na-abụghị eziokwu gbasara Chineke, kwuokwa ihe ndị gbawara Job obi. N’ihi ya, Jehova kwuru na ha ghara ụgha. (Job 42:7, 8) Anyị nyewe mmadụ ndụmọdụ, anyị ekwesịghị ikwu ihe ga-eme ka o chee na Jehova dị obi ọjọọ ma ọ bụ na Jehova agaghị ahụli ya n’anya. Ka anyị tụlee ihe anyị ga-amụta n’aka Elaịhu.

Foto ndị na-egosi: Ebe otu nwanna ji obiọma na-enye nwanna ọzọ iwe ji ndụmọdụ. 1. Ebe otu nwanna ji obiọma na-ege nwanna ọzọ iwe ji ntị ka nwanna ahụ na-ekwu otú obi dị ya. Ha nọ n’èzí, ihe a na-aṅụtụ aṅụtụ adịrị n’ihu ha n’elu tebụl. 2. Ebe nwanna nke a na-agwa okwu mepere Baịbụl ya emepe. 3. Ebe nwanna ahụ ji obiọma na-agwa ya ihe Baịbụl kwuru ga-enyere ya aka, ya ana-ege ya ntị.

I nyewe mmadụ ndụmọdụ, (1) ka ihe ị ga-ekwu gosi na ị matara ihe niile i kwesịrị ịma, (2) si n’Okwu Chineke nye ya ndụmọdụ, na (3) meda obi nye ya ndụmọdụ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8)


OTÚ ELAỊHU SI NYE JOB NDỤMỌDỤ

9. Gịnị mere e kwesịrị iji nyere Job aka mgbe ndị enyi ya kwuchara okwu? Oleekwa otú Jehova si nyere ya aka?

9 Job na ndị enyi ya rụrịtara ụka ruo ogologo oge. Ha kwuru ọtụtụ okwu nke na a gụwa isi ole ihe ha kwuru juru, ọ dị iri abụọ na asatọ. Ọtụtụ ihe ha kwuru gosikwara na iwe ji ha. Ọ bụ ya mere na o jughị anyị anya na o meghị ka obi dị Job mma. E kwesịrị ịkasi ya obi ma gbazie ya. Olee otú Jehova si nyere Job aka? O mere ka Elaịhu nye Job ndụmọdụ. Gịnị mere Elaịhu ji chere ka ndị ọzọ kwuchaa tupu ya ekwuwe? Ọ sịrị: “Abụ m nwata, ma unu bụ ndị okenye. Ọ bụ ya mere m ji kwanyere unu ùgwù ghara ikwu okwu.” (Job 32:6, 7) Elaịhu ma na ndị agadi na-enwekarị amamihe n’ihi na ha ebiteela ndụ aka karịa ụmụ okorobịa, hụkwa ọtụtụ ihe ná ndụ karịa ha. Ma mgbe o nwechara ndidi nụ ihe Job na ndị enyi ya kwuru, o kwuziri okwu. Ọ sịrị: “Ọ bụghị naanị afọ ole mmadụ dị na-eme ka ọ mara ihe, ọ bụghịkwa naanị ndị mere agadi na-aghọta ihe dị mma.” (Job 32:9) Gịnị ọzọ ka Elaịhu kwuru? Oleekwa otú o si kwuo ya?

10. Gịnị ka Elaịhu mere tupu ya enyewe Job ndụmọdụ? (Job 33:6, 7)

10 Tupu Elaịhu enye Job ndụmọdụ, o bu ụzọ mee ka obi ruo ya ala ka o nwee ike ige ya ntị ma ọ gwawa ya okwu. Olee otú o si mee ya? Ihe ndị Elaịhu nụrụ mere ka iwe wee ya. Ma, o jidere onwe ya tupu ya agwawa Job okwu. (Job 32:2-5) Ihe a mere ka ọ ghara ịgwa Job okwu ọjọọ ma ọ bụ okwu ga-agbawa ya obi. Kama, ọ kasiri Job obi. Dị ka ihe atụ, ọ gwara Job, sị: “Mụ na gị bụ otu ihe n’anya ezi Chineke.” (Gụọ Job 33:6, 7.) Elaịhu meziri ka o doo anya na o gere Job ntị nke ọma. Tupu ya enyewe Job ndụmọdụ, o kwughachiri isi ihe ndị Job kwuru. (Job 32:11; 33:8-11) Elaịhu mekwara ụdị ihe ahụ n’oge ndị ọzọ o nyere Job ndụmọdụ.​—Job 34:5, 6, 9; 35:1-4.

11. Olee otú Elaịhu si nye Job ndụmọdụ? (Job 33:1)

11 Mgbe Elaịhu na-enye Job ndụmọdụ, ọ kwanyeere ya ùgwù. Dị ka ihe atụ, ọ kpọrọ Job aha ya, nke ọ ga-abụ na ndị enyi ya atọ ahụ emeghị. (Gụọ Job 33:1.) O nwere ike ịbụ na o chetara na ya chọsiri ike ikwu okwu mgbe Job na ndị enyi ya na-arụrịta ụka. N’ihi ya, o metaara Job ebere, nye ya ohere ka o kwuo otú obi dị ya mgbe ọ na-enye ya ndụmọdụ. (Job 32:4; 33:32) Elaịhu mekwara ka Job mata ihe mere na o kwesịghị ikwu ụfọdụ ihe o kwuru ma ọ bụ mee ụfọdụ ihe o mere. O jikwa nwayọọ chetara Job na Jehova nwere amamihe, dịrị ike, na-ekpe ikpe ziri ezi, nweekwa ịhụnanya. (Job 36:18, 21-26; 37:23, 24) Ezigbo ndụmọdụ a Elaịhu nyere Job mere ka o jikere maka ndụmọdụ ndị ọzọ Jehova ga-enye ya. (Job 38:1-3) Olee otú ọ ga-abụ na ihe Elaịhu mere si baara ụmụ Izrel uru? Oleekwa otú ọ ga-esi abara anyị uru taa?

12. Olee otú Jehova si jiri ndị amụma nyere ndị Izrel aka? Oleekwa uru ọ ga-abụ na ihe Elaịhu mere baara ha?

12 Uru ọ ga-abụ na ọ baara ndị Izrel. Jehova na-ejikarị ndị amụma akụziri ndị Izrel ihe ma na-agbazi ha. Dị ka ihe atụ, n’oge ndị ikpe, Jehova ji Debora bụ́ onye amụma nwaanyị nye ndị Izrel ndụmọdụ. O jikwa Samuel kụziere ha ihe malite mgbe ọ bụ nwata. (Ikpe 4:4-7; 5:7; 1 Sam. 3:19, 20) N’oge ndị eze, Jehova ji ọtụtụ ndị amụma nyere ndị Izrel aka ife ya ezigbo ofufe. Ọ na-ejikwa ha agbazi ha ma ha nupụrụ ya isi. (2 Sam. 12:1-4; Ọrụ 3:24) Ọ ga-abụ na ihe a Elaịhu mere nke e dere n’akwụkwọ Job nyeere ndị ji obi ha niile fee Jehova aka ịmata ihe ha ga-ekwu na otú ha ga-esi ekwu ya ma ha nyewe ndị ọzọ ndụmọdụ.

13. Olee otú Ndị Kraịst ga-esi na-agba ụmụnna ha ume taa?

13 Uru ọ ga-abara anyị. Ebe anyị bụ Ndị Kraịst, anyị na-eme ka ndị mmadụ mata uche Chineke ma anyị na-agwa ha ihe dị n’Okwu ya bụ́ Baịbụl. Otú ọzọ anyị si eme ya bụ iji okwu ọma na-akasi ụmụnna anyị obi ma na-agba ha ume. (1 Kọr. 14:3) Ndị okenye kwesịkwara ijide n’aka na ha “na-agụgụ” ụmụnna ha, ma ndị nke iwe na-ewe ma ndị nke na-ekwu “okwu n’echeghị echiche.”​—1 Tesa. 5:14; Job 6:3.

14-15. Olee otú ndị okenye nwere ike isi eme ka Elaịhu ma ha na-enye mmadụ ndụmọdụ?

14 Weregodị ya na otu okenye chọpụtara na otu nwanna nwaanyị nọ n’ọgbakọ ha dara mbà n’obi. Ya na nwanna ọzọ agaa ileta ya ka ha gbaa ya ume. Mgbe ha na ya na-ekwurịta okwu, ọ gwara ha na ọ bụ eziokwu na ọ na-aga ozi ọma na ọmụmụ ihe, ma obi anaghị adị ya mma. Gịnị ka okenye ahụ ga-eme?

15 Nke mbụ, o nwere ike ịchọpụta ihe mere obi ji dịrị nwanna nwaanyị ahụ otú ahụ. Ihe ga-enyere ya aka ime ya bụ ịjụ ya ajụjụ ma gee ya ntị nke ọma mgbe ọ na-ekwu otú obi dị ya. Ọ̀ na-eche na Jehova ahụghị ya n’anya? “Nchegbu nke ndụ” ọ̀ na-anyịgbu obi ya? (Luk 21:34) Nke abụọ, okenye ahụ ga-agbalị jaa ya mma maka ihe ọma ndị ọ na-eme. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịja ya mma maka otú o si abịachi ọmụmụ ihe na ozi ọma anya n’agbanyeghị na ọ dịrịghị ya mfe. Nke atọ, ọ bụrụ na okenye ahụ aghọta otú ihe si dịrị nwanna nwaanyị ahụ na ihe ndị mere ka obi daa ya mbà, ọ ga-enwe ike iji Baịbụl mee ka obi sie ya ike na Jehova hụrụ ya n’anya.​—Gal. 2:20.

SI N’AKWỤKWỌ JOB NA-AMỤTAKWU IHE

16. Olee otú anyị ga-esi na-amụtakwu ihe n’akwụkwọ Job?

16 O doro anya na e nwere ọtụtụ ihe anyị ga-amụta n’akwụkwọ Job. Dị ka anyị mụtara n’isiokwu bu nke a ụzọ, akụkọ Job na-akụziri anyị ihe mere Chineke ji kwe ka anyị na-ata ahụhụ nakwa otú anyị ga-esi na-edi ya. Isiokwu a akụziekwarala anyị na anyị niile ga-amụtali otú anyị ga-esi na-enye ezigbo ndụmọdụ. Anyị kwesịrị ịna-eme ka Elaịhu, ọ bụghị ka ndị enyi Job atọ. I nwere ike ịtụleghachi ihe ndị ị mụtara n’akwụkwọ Job tupu gị enye mmadụ ndụmọdụ. Ọ bụrụkwa na o teela ị gụrụ akwụkwọ Job, gbalịa gụghachi ya. I mee otú ahụ, i nwere ike ịchọpụta ọtụtụ ihe ndị ọzọ ga-abara gị uru.

GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

  • Gịnị ka ị mụtara n’aka ndị enyi Job atọ gbasara ihe ị na-ekwesịghị ime ma i nyewe mmadụ ndụmọdụ?

  • Olee otú Elaịhu si gosi na ọ ma ihe mgbe ọ na-enye Job ndụmọdụ?

  • Olee otú anyị ga-esi na-amụtakwu ihe n’akwụkwọ Job?

ABỤ NKE 125 “Ndị Na-eme Ebere Na-enwe Obi Ụtọ”

a O yiri ka ọ̀ bụ mmụọ ọjọọ mere ka Elifaz kwuo na e nweghị onye Jehova weere ka onye ezi omume, n’ihi ya, na e nweghị mmadụ ga-emeli ihe dị ya mma. Elifaz kwetara ihe a na-abụghị eziokwu. Ọ bụkwa ihe o kwuru ugboro atọ o kwuru okwu.​—Job 4:17; 15:15, 16; 22:2.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya