Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w25 Disemba p. 14-19
  • Dịrị Umeala n’Obi Ka Jehova

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Dịrị Umeala n’Obi Ka Jehova
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • JEHOVA CHỌRỌ KA ANYỊ NA-AGWA YA OKWU MGBE NIILE
  • JEHOVA NA-ELE IHE ANYA OTÚ KWESỊRỊ EKWESỊ
  • JEHOVA NA-ENWE NDIDI
  • JEHOVA NA-AKWANYERE NDỊ DỊ UMEALA N’OBI ÙGWÙ
  • Na-eche Echiche Ka Jehova na Jizọs
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Dịrị Umeala n’Obi ma E Nwee Ihe Ị Na-amaghị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Inye Ihe Ga-eme Ka Ị Na-enwekwu Obi Ụtọ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
  • Zụlite Ezi Ịdị Umeala n’Obi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
w25 Disemba p. 14-19

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 50

ABỤ NKE 48 Soro Jehova Na-eje Ije Kwa Ụbọchị

Dịrị Umeala n’Obi Ka Jehova

“Na-emenụ ka Chineke, maka na unu bụ ụmụ ya ọ hụrụ n’anya.”​—EFE. 5:1.

IHE A GA-AMỤ

Anyị ga-amụ ụzọ anọ anyị ga-esi dịrị umeala n’obi ka Jehova.

1. Gịnị mere o ji dị ịtụnanya na Jehova dị umeala n’obi?

I CHEE banyere ndị ọchịchị taa, ị̀ ga-asị na ha dị umeala n’obi? Mba. Ma, Jehova, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, dị umeala n’obi. (Ọma 113:5-8) Ịdị umeala n’obi bụ àgwà e ji mara Jehova. Ọ dịghị mpako chaa chaa. Ọ ga-abara anyị uru ma anyị tụlee ọmarịcha àgwà anọ Jehova nwere nakwa otú nke ọ bụla n’ime ha si egosi na ọ dị umeala n’obi. Anyị ga-elebakwa anya n’otú Jizọs si dị umeala n’obi ka Nna ya. Ileba anya n’ihe ndị a ga-enyere anyị aka ịbịarukwu Jehova nso na ịdịkwu umeala n’obi ka ya.

JEHOVA CHỌRỌ KA ANYỊ NA-AGWA YA OKWU MGBE NIILE

2. Gịnị ka Abụ Ọma 62:8 mere ka anyị mara gbasara ụdị onye Jehova bụ? (Kọwaakwa foto.)

2 Ọ naghị adịkarị mfe ịgwa ndị dị mpako okwu. Otú ha si ebuli onwe ha elu na-eme ka o siere ndị ọzọ ike ịgwa ha okwu ma ọ bụdị mee ka a na-agbara ha ọsọ. Jehova anatụdịghị eme otú ahụ. Ebe ọ bụ na ọ dị umeala n’obi, ọ na-agwa anyị ka anyị bịakwute ya ma kọọrọ ya ihe ọ bụla na-echegbu anyị. (Gụọ Abụ Ọma 62:8.) Otú ahụ nna hụrụ ụmụ ya n’anya na-ege ha ntị ma ha kọwa ihe na-echegbu ha, Jehova na-ege ntị n’ekpere ndị ohu ya na-ekpe. O medịrị ka e dee ọtụtụ n’ime ekpere ndị ahụ na Baịbụl. Ihe a gosiri na Jehova chọrọ ịna-anụ ekpere anyị. (Josh. 10:12-14; 1 Sam. 1:10-18) Ma, gịnị ka anyị ga-eme ma e nwee ihe mere ka anyị chee mgbe ụfọdụ na anyị erughị eru ịgwa Jehova okwu?

Ebe otu nwoke weturu obi na-ege nwa ya nwoke ntị mgbe ọ na-akọwara ya otú o si kụwaa ihe ha ji etinye okooko osisi mgbe o ji ụgbọelu ya na-egwu egwuregwu.

Ebe otu nna na-eme ka Jehova. O weturu obi na-ege nwa ya nwoke ntị. Nwa ya ahụ kụwara ihe e ji tinye okooko osisi mgbe ọ na-egwu egwuregwu (A ga-akọwa ya na paragraf nke 2)


3. Gịnị mere obi ji kwesị isi gị ike na Jehova chọrọ ka ị na-agwa ya okwu n’ekpere mgbe niile?

3 Anyị nwere ike ịgwa Jehova okwu n’ekpere ọ bụrụgodị na anyị chere na ọ gaghị ahụli anyị n’anya. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? N’akụkọ nwa mmefu, Jizọs ji Jehova tụnyere nna dị obi ebere, onye nwa ya nke chegharịrị n’ihe ọjọọ o mere chere na ya erughịzi eru ka a nabata ya n’ezinụlọ ha. Gịnị ka nna ahụ mere mgbe nwa ya lọtara? Jizọs kwuru na ozugbo nna ya hụrụ ya, ‘ọ gbaara ọsọ gaa makụọ ya ma jiri nwayọọ susuo ya ọnụ.’ (Luk 15:17-20) Jehova na-eme ka nna ahụ. Ozugbo ọ nụrụ ekpere ndị obi gbawara n’ihi otú ihe ọjọọ ha mere si ewute ha ma ọ bụkwanụ n’ihi ihe na-echegbu ha, ọ na-ege ha ntị nke ọma n’ihi na ọ dị umeala n’obi. (Ákwá 3:19, 20) Jehova na-enwere anyị ọmịiko. Dịkwa ka nna ahụ gbaara ọsọ gaa makụọ nwa ya, Jehova na-eme ka obi sie anyị ike na ọ hụrụ anyị n’anya ma na-akasi anyị obi. (Aịza. 57:15) Olee otú Jehova si ‘agbara ọsọ’ bịa makụọ anyị taa? Ọtụtụ mgbe, ọ na-esi n’aka ndị okenye, ndị ezinụlọ anyị nọ n’ọgbakọ, nakwa n’aka ụmụnna anyị ndị ọzọ eme ya. (Jems 5:14, 15) Jehova na-esi otú a enyere anyị aka n’ihi na ọ chọrọ ka anyị bịaruo ya nso.

4. Olee otú Jizọs si gosi na ọ chọrọ ka a na-agwa ya okwu?

4 Jizọs na-eme ka Nna ya. Jizọs dị umeala n’obi ka Nna ya nke eluigwe. N’ihi ya, mgbe ọ nọ n’ụwa, obi ruru ndị mmadụ ala ịbịakwute ya. Ụjọ atụghị ha ịjụ ya ajụjụ. (Mak 4:10, 11) Ọ jụọkwanụ ha ihe ha chere, ha na-agwa ya otú ọ dị ha n’obi. (Mat. 16:13-16) Ha mejọọ ihe, obi anaghị awụba ha n’afọ n’ihi na ha ma na Jizọs dị obiọma, na-eme ebere, nweekwa ndidi. (Mat. 17:24-27) N’ihi otú Jizọs si na-eme ka Nna ya, ndị na-eso ụzọ ya bịara matakwuo Jehova. (Jọn 14:9) Ha mụtara na Jehova adịtụdịghị ka ndị isi okpukpe n’oge ha, bụ́ ndị obi fere azụ, ndị dị mpako, na ndị ihe gbasara onye ọzọ na-anaghị emetụ n’ahụ́. Kama, ọ dị umeala n’obi, chọọkwa ka a na-agwa ya okwu.

5. Olee otú ịdị umeala n’obi si eme ka ọ dịrị ndị ọzọ mfe ịgwa anyị okwu?

5 Olee otú anyị ga-esi na-eme ka Jehova? Anyị mụtakwuo ịdị umeala n’obi, ọ ga-adịri ndị ọzọ mfe ịgwa anyị okwu. Ịdị umeala n’obi ga-eme ka anyị ghara inwe anyaụfụ, ịdị mpako, ma ọ bụ ịjụ ịgbaghara ndị ọzọ. Àgwà ndị a ga-eme ka a na-agbara anyị ọsọ. Ma, ịdị umeala n’obi ga-enyere anyị aka ịdị obiọma, inwe ndidi, na ịgbaghara ndị ọzọ. Àgwà ndị a ga-eme ka anyị na ndị ọzọ na-adị ná mma. (Kọl. 3:12-14) Ndị okenye kwesịrị ịgbalịsi ike mee ka ọ dịrị ndị ọzọ mfe ịbịakwute ha. Nke bụ́ eziokwu bụ na tupu a bịakwute ha, a ga-ebu ụzọ hụ ha anya. Ọ pụtara na ndị okenye ga-agbalịsi ike na-aga ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ha agaghị eche na ọ ka mma isi na Zoom sonyere. Mgbe ọ bụla o kwere omume, ha na-eso ụmụnna aga ozi ọma ụlọ n’ụlọ. Ọ ga-eme ka ụmụnna na-amatakwu ndị okenye, obi ana-erukwu ha ala ịgwa ha okwu mgbe ọ bụla ha chọrọ ka e nyere ha aka.

JEHOVA NA-ELE IHE ANYA OTÚ KWESỊRỊ EKWESỊ

6-7. Kwuo oge ụfọdụ Jehova gbanwere obi ya mgbe ndị ohu ya rịọrọ ya arịrịọ.

6 Ọtụtụ ndị mpako na-echekarị na ha kacha mara ihe. N’ihi ya, ha anaghị achọ ịgbanwe obi ha. Ma Jehova dị umeala n’obi. Ọ bụ ya mere na ọ naghị esi ọnwụ na a ga-emerịrị ihe o kwuru n’agbanyeghị na ọ ka onye ọ bụla mara ihe n’ụzọ niile. Ka anyị lee otú o si meso Miriam nwanne Mosis. Miriam na Erọn kwuru okwu ọjọọ banyere Mosis, bụ́ onye na-anọchite anya Jehova. N’ihi ya, e nwere ike ikwu na ọ bụ Jehova ka Miriam kparịrị. Ọ bụ ya mere Jehova ji wesa ya iwe ma mee ka ọ rịawa ekpenta. Ma mgbe Erọn rịọrọ Mosis ka o nyere Miriam aka, Mosis arịọkwa Jehova ka ọ gwọọ Miriam, gịnị ka Jehova mere? Ọ bụrụ na Jehova dị mpako, ọ garaghị agbanwe obi ya. Ma, ebe ọ bụ na Jehova dị umeala n’obi, o kwetara ma gwọọ Miriam.​—Ọnụ Ọgụ. 12:1-15.

7 Jehova gosikwara na ọ dị umeala n’obi n’otú o si meso Eze Hezekaya. Jehova si n’aka onye amụma ya gwa Hezekaya na ọ ga-anwụ. Hezekaya bere ákwá ma rịọ Jehova ka ọ gwọọ ya. N’ihi ya, Jehova meere ya ebere ma gwa ya na ọ ga-adị ndụ ruo afọ iri na ise ọzọ. (2 Eze 20:1, 5, 6) N’eziokwu, otú Jehova si dị umeala n’obi na-eme ka ọ na-emetere ụmụ mmadụ ebere ma na-ege ha ntị.

8. Olee ihe ndị gosiri na Jizọs na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị? (Mak 3:1-6)

8 Jizọs na-eme ka Nna ya. Mgbe ọ nọ n’ụwa, ọ na-emere ndị mmadụ ihe ọma mgbe ọ bụla ọ dabara adaba. Dị ka ihe atụ, ọ gwọrọ ndị ọrịa n’Ụbọchị Izu Ike n’agbanyeghị na ndị isi okpukpe obi kpọrọ nkụ chere na o kwesịghị ime otú ahụ. (Gụọ Mak 3:1-6.) Jizọs ka na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị ma na-eme ebere taa n’otú o si eduzi ọgbakọ ya. Dị ka ihe atụ, nwanna mee mmehie dị oké njọ, ọ na-enwere ya ndidi ma nye ya ezigbo ohere ichegharị ma gbanwee.​—Mkpu. 2:2-5.

9. Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị? (Kọwaakwa foto.)

9 Olee otú anyị ga-esi na-eme ka Jehova? Anyị kwesịrị ịgbalịsi ike mụta ịna-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị ka Jehova. (Jems 3:17) Dị ka ihe atụ, ndị nne na nna na-eme ka Jehova ma ghara ịtụ anya ka ụmụ ha mee ihe ha na-agaghị emeli. Ihe Baịbụl kọrọ na Jenesis 33:12-14 gosiri otú Jekọb si mee ya. Ndị nne na nna dị umeala n’obi ma na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị anaghị eji otu nwa ha atụnyere ibe ya. Ndị okenye ọgbakọ kwesịkwara ịna-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị. Otu ụzọ ha ga-esi eme ya bụ ịnabata ihe ọtụtụ ndị okenye kpebiri ma ọ bụrụ na o nweghị iwu Baịbụl o mebiri. (1 Tim. 3:2, 3) Anyị niile kwesịrị ịgbalị ghọta ihe ndị ọzọ chere na otú obi dị ha ọ bụrụgodị na ihe anyị chere dị iche. (Rom 14:1) N’eziokwu, onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ kwesịrị ịgbalịsi ike mee ‘ka mmadụ niile mara na ọ na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị.’​—Fil. 4:5.

Foto ndị na-egosi: Ebe obi dị otu nna ụtọ mgbe ya na ụmụaka ya nọ n’ozi ụlọ n’ụlọ. 1. Ebe ọ na-amụmụ ọnụ ọchị mgbe nwa ya nwoke na-enye otu nwoke broshọ bụ́ “Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi.” 2. Ebe o mechara na-amụmụkwa ọnụ ọchị mgbe nwa ya nwaanyị na-enye otu nwaanyị kaadị jw.org.

Nna na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị anaghị atụ anya ka ụmụ ya mee ihe ha na-agaghị emeli n’ozi ọma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 9)


JEHOVA NA-ENWE NDIDI

10. Olee ụzọ ndị Jehova si gosi na ọ na-enwe ndidi?

10 O nwere ike ịbụ na ị chọpụtala na ndị dị mpako anaghị achọ ichere ndị ọzọ. Mpako na-eme ka ahụ́ na-agbakasị ha. Ma, Jehova anaghị eme otú ahụ. Ọ bụ ya kacha enwe ndidi. Dị ka ihe atụ, n’oge Noa, Jehova kwuru na ọ ga-echere ruo otu narị afọ na iri abụọ (120) tupu ya ebibie ndị na-eme ihe ọjọọ. (Jen. 6:3) Noa ji ohere ahụ mụọ ụmụ, zụọ ha, ya na ndị ezinụlọ ya arụọ ụgbọ. Ka oge na-aga, otu mmụọ ozi nọchitere anya Jehova weturu obi gee Ebreham ntị mgbe ọ na-ajụ ya ajụjụ banyere ibibi Sọdọm na Gọmọra. A sị na ọ dị mpako, ọ gaara asị Ebreham, ‘Gịnị mere i ji ajụ m ajụjụ?’ Ma mmụọ ozi ahụ mere ka Jehova. O nweere Ebreham ndidi.​—Jen. 18:20-33.

11. Dị ka e kwuru na 2 Pita 3:9, gịnị mere Jehova ji enwe ndidi taa?

11 Jehova na-enwekwa ndidi taa n’ihi na ọ dị umeala n’obi. Ọ na-echere ka oge o kpebiri ibibi ụwa ochie a ruo. Gịnị mere o ji enwe ndidi? “N’ihi na o nweghị onye ọ chọrọ ka e bibie, kama ọ chọrọ ka mmadụ niile chegharịa.” (Gụọ 2 Pita 3:9.) Ndidi Jehova ọ̀ bụ na nkịtị? Mbanụ. O meela ka ọtụtụ nde ndị nwere ezi obi bịa fewe ya. Anyị na-atụkwa anya na ọtụtụ nde ndị ọzọ ka ga-eme otú ahụ. Ma, Jehova agaghị enwe ndidi ruo mgbe ebighị ebi. Ọ hụrụ ndị mmadụ n’anya. Mana, ọ gaghị ekwe ka onye ọ bụla mewe otú sọrọ ya ruo mgbe ebighị ebi. Ọ ga-ebibi ndị ọjọọ ma oge ruo.​—Hab. 2:3.

12. Olee otú Jizọs si enwe ndidi ka Jehova?

12 Jizọs na-eme ka Nna ya. Kemgbe ọtụtụ puku afọ, Jizọs nọ na-enwe ndidi ka Jehova. Ọ hụrụ ka Setan na-aghagide Jehova na ụmụ mmadụ na-erubere Jehova isi ụgha. (Jen. 3:4, 5; Job 1:11; Mkpu. 12:10) Jizọs ahụkwala ka ọtụtụ ndị na-ata ezigbo ahụhụ. Chegodị otú o si na-agụsi ya agụụ ike “ka o bibie ọrụ Ekwensu.” (1 Jọn 3:8) Gịnị na-enyere Jizọs aka inwe ndidi ma na-echere ka Jehova gwa ya ka o bibie ọrụ Ekwensu niile? Otu ihe na-enyere ya aka bụ na ọ dị umeala n’obi. O mere ka ọ mata na ọ bụ Jehova ga-ekpebi mgbe e kwesịrị ibibi ụwa ochie a.​—Ọrụ 1:7.

13. Olee otú Jizọs si nweere ndịozi ya ndidi? Oleekwa ihe mere o ji nweere ha ndidi?

13 Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o nweere ndịozi ya ndidi. Dị ka ihe atụ, mgbe ha rụrụ ụka ugboro ugboro gbasara onye kachanụ n’ime ha, ike ha agwụghị Jizọs. Kama, ọ nọkwa na-enwere ha ndidi. (Luk 9:46; 22:24-27) Obi siri ya ike na ha ga-emecha gbanwee. È nwetụla otu ihe i mejọrọ ugboro ugboro? Ọ bụrụ na e nwetụla, ọ̀ bụ na obi adịghị gị ụtọ na Eze na-achị gị na-enwe ndidi ma dịrị umeala n’obi?

14. Olee otú anyị ga-esi mụta inwe ndidi?

14 Olee otú anyị ga-esi na-eme ka Jehova? Ọ bụrụ na anyị amata “uche Kraịst,” anyị ga-enwe ike ịna-eche echiche ka Jehova ma na-eme ka ya. (1 Kọr. 2:16) Olee otú anyị ga-esi aghọta uche Kraịst nke ọma? O nweghị otú ọzọ anyị ga-esi eme ya ma e wezụga ịgụ akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn. Ihe ọzọ anyị ga-eme bụ iwepụta oge chee gbasara otú ihe anyị gụrụ si eme ka anyị ghọta otú Jizọs si eche echiche. O dokwara anya na anyị kwesịrị ịna-arịọ Jehova ka o nyere anyị aka ịdị umeala n’obi ma na-eche echiche ka Jizọs. Ka anyị na-amatakwu echiche Kraịst, ọ ga-adịkwuru anyị mfe ịna-eme ka Jehova ma na-enwere onwe anyị na ụmụnna anyị ndidi.​—Mat. 18:26-30, 35.

JEHOVA NA-AKWANYERE NDỊ DỊ UMEALA N’OBI ÙGWÙ

15. Olee otú Jehova si mezuo ihe e kwuru n’Abụ Ọma 138:6?

15 Gụọ Abụ Ọma 138:6. Obi dị anyị ezigbo ụtọ na Jehova, bụ́ onye kacha elu ma n’eluigwe ma n’ụwa, ji ndị dị umeala n’obi kpọrọ ihe. Ka anyị kwuo banyere ụfọdụ ndị a na-ejighị kpọrọ ihe Jehova kwanyeere ùgwù kemgbe ọtụtụ narị afọ. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị anyị na-agaghị echeta ozugbo, mana e dere banyere ha na Baịbụl. Jehova mere ka Mosis dee aha Debora bụ́ nwaanyị nyere Ribeka ara. O biri ndụ n’oge Aịzik na Jekọb. O ji obi ya niile rụọ ọrụ ya n’ezinụlọ Aịzik na nke Jekọb ruo ihe dị ka otu narị afọ na iri abụọ na ise (125). Ọ bụ eziokwu na e nweghị ọtụtụ ihe Baịbụl kọrọ banyere nwaanyị a, ma Jehova mere ka Mosis dee ihe gosiri na Jehova hụrụ ya n’anya. (Jen. 24:59; 35:8 na ihe e dere n’ala ala peeji ya.) Mgbe ọtụtụ narị afọ gachara, Jehova họọrọ Devid, bụ́ obere nwa na-azụ atụrụ, ma mee ya eze Izrel. (2 Sam. 22:1, 36) Obere oge a mụchara Jizọs, Jehova zigara ndị mmụọ ozi ka ha gakwuru ndị ọzụzụ atụrụ ma mee ka ha bụrụ ndị mbụ ga-amata na a mụọla Mezaya n’obodo Betlehem nke dị nso. (Luk 2:8-11) Mgbe Josef na Meri ku Jizọs bịa n’ụlọ nsọ, Jehova kwanyeere Simiọn na Ana bụ́ ndị agadi ùgwù, mee ka ha mata onye Ọkpara ya bụ. (Luk 2:25-30, 36-38) “Ọ bụ eziokwu na Jehova bi n’ebe dị elu, ọ na-ahụ onye dị umeala n’obi.”

16. Olee otú Jizọs si mee ka Nna ya n’otú o si meso ndị ọzọ?

16 Jizọs na-eme ka Nna ya. Jizọs kwanyeere ndị a na-eleda anya ùgwù otú ahụ Nna ya na-eme. Ọ kụziiri “ndị nkịtị na-agụghị akwụkwọ” eziokwu banyere Alaeze Chineke. (Ọrụ 4:13; Mat. 11:25) Ọ gwọkwara ndị ọrịa. Otú o si gwọọ ha mere ka ha ghọta na a hụrụ ha n’anya ma na-akwanyere ha ùgwù. (Luk 5:13) N’abalị bọtara ụbọchị ọ nwụrụ, ọ sara ụkwụ ndịozi ya, nke bụ́ ihe naanị ndị na-eje ozi na-eme. (Jọn 13:5) Tupu ya alaghachi eluigwe, o nyere ndị niile na-eso ụzọ ya, ma anyịnwa, ọrụ kacha mkpa, ya bụ, inyere ndị ọzọ aka inweta ndụ ebighị ebi.​—Mat. 28:19, 20.

17. Olee otú anyị ga-esi na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù? (Kọwaakwa foto.)

17 Olee otú anyị ga-esi na-eme ka Jehova? Anyị na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù mgbe anyị na-ezi mmadụ niile ozi ọma n’agbanyeghị ebe ha si, ụcha akpụkpọ ahụ́ ha, ma ọ bụ ebe ha gụruru akwụkwọ. Anyị na-akwanyekwara ụmụnna anyị ùgwù ma anyị na-ewere ya na ha ka anyị n’agbanyeghị nkà ọ bụla anyị nwere ma ọ bụkwanụ ọrụ anyị nwere n’ọgbakọ. (Fil. 2:3) Obi na-adị Jehova ụtọ ma anyị dịrị umeala n’obi ma ‘na-ebu ụzọ’ asọpụrụ ibe anyị n’ụzọ ndị a nakwa n’ụzọ ndị ọzọ.​—Rom 12:10; Zef. 3:12.

Ebe ụmụnna nwaanyị abụọ na-amụrụ otu nwaanyị a tụrụ mkpọrọ Baịbụl.

Anyị na-egosi na anyị dị umeala n’obi ka Jehova ma anyị na-ezi ụdị mmadụ niile ozi ọma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17)a


18. Gịnị mere i ji achọ ịna-adị umeala n’obi ka Jehova?

18 Ọ bụrụ na anyị ana-agbalịsi ike na-adị umeala n’obi ka Nna anyị nke eluigwe hụrụ anyị n’anya, ọ ga-adịkwuru ndị ọzọ mfe ịna-agwa anyị okwu, anyị ana-elekwu ihe anya otú kwesịrị ekwesị ma na-enwekwu ndidi. Anyị ga na-akwanyekwuru ndị ọzọ ùgwù ka Jehova. Ọ bụrụ na anyị agbalịsie ike na-eme ka Chineke anyị bụ́ onye dị umeala n’obi, ọ ga-eji anyị kpọrọkwuo ihe.​—Aịza. 43:4.

Ị DỊRỊ UMEALA N’OBI, OLEE OTÚ Ọ GA-ESI EME KA . . .

  • ọ na-adịrị ndị ọzọ mfe ịgwa gị okwu?

  • ị na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị?

  • ị na-enwe ndidi?

ABỤ NKE 159 Nye Jehova Otuto

a NKỌWA FOTO: Ebe ụmụnna nwaanyị gosiri na ha hụrụ ndị mmadụ n’anya ka Jehova mgbe ha na-akụziri ụmụ nwaanyị a tụrụ mkpọrọ Baịbụl.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya