Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w25 Disemba p. 2-7
  • Akwụkwọ Job Nwere Ike Inyere Gị Aka Mgbe Ị Na-ata Ahụhụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Akwụkwọ Job Nwere Ike Inyere Gị Aka Mgbe Ị Na-ata Ahụhụ
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • CHINEKE KWERE KA JOB TAA AHỤHỤ
  • OTÚ AKỤKỌ JOB SI ENYERE ANYỊ AKA ỊTACHI OBI
  • JIRI AKWỤKWỌ JOB NYERE NDỊ ỌZỌ AKA
  • Job Toro Aha Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • “Nwee Olileanya n’Ebe Jehova Nọ”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Job
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Job Tachiri Obi—Anyị Pụkwara!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
w25 Disemba p. 2-7

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 48

ABỤ NKE 129 Anyị Ga Na-atachi Obi

Akwụkwọ Job Nwere Ike Inyere Gị Aka Mgbe Ị Na-ata Ahụhụ

“N’eziokwu, Chineke anaghị eme ihe ọjọọ.”​—JOB 34:12.

IHE A GA-AMỤ

Ihe anyị ga-amụta n’akwụkwọ Job gbasara ihe mere Chineke ji kwe ka ụmụ mmadụ na-ata ahụhụ nakwa otú anyị ga-esi atachi obi ma anyị na-ata ahụhụ.

1-2. Olee ihe ụfọdụ mere anyị ji kwesị ịgụ akwụkwọ Job?

Ị̀ GỤỌLA akwụkwọ Job na nso nso a? Ọ bụ eziokwu na e dere akwụkwọ a kemgbe ihe dị ka puku afọ atọ na narị ise (3,500) gara aga, ma o so n’akwụkwọ ọtụtụ ndị weere ka akwụkwọ kacha mma. Ndị mmadụ na-ekwu okwu ọma gbasara onye dere akwụkwọ Job n’ihi na ọ dị mfe nghọta, na-atọ ụtọ, na-akpakwa ike. Ọ bụ Mosis dere ya. Ma onye ihe o dere si n’aka ya bụ Jehova.​—2 Tim. 3:16.

2 Akwụkwọ Job dị ezigbo mkpa na Baịbụl. Maka gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọ na-enyere anyị aka ịghọta na ndị mmụọ ozi na ndị mmadụ ga-ekpebi ma hà ga-efe Jehova n’ihi na ha hụrụ ya n’anya ma jiri aha ya kpọrọ ihe. Ọ na-akụzikwara anyị àgwà ndị magburu onwe ha Jehova nwere, àgwà ndị dị ka ịhụnanya, amamihe, ikpe ziri ezi, na ike. Dị ka ihe atụ, n’akwụkwọ Job, a kpọrọ Jehova “Onye Pụrụ Ime Ihe Niile” ugboro iri atọ na otu. Ọ karịrị ugboro ole ọ gbara n’akwụkwọ ndị ọzọ dị na Baịbụl ma a gụkọta ha. Akwụkwọ Job kọwara ihe mere Chineke ji kwe ka ụmụ mmadụ na-ata ahụhụ, zaakwa ajụjụ ndị ọzọ na-echu ọtụtụ ndị ụra.

3. Gịnị ka anyị ga-amụta n’akwụkwọ Job?

3 Ọ bụrụ na mmadụ anọrọ n’elu ugwu, ọ ga na-ahụ ihe ndị na-eme gburugburu ya nke ọma. Otú ahụ ka akwụkwọ Job si enyere anyị aka ịghọta otú Jehova si ele nsogbu anyị anya. Ka anyị chọpụta otú akwụkwọ Job ga-esi enyere anyị aka ma anyị na-ata ahụhụ. Anyị ga-achọpụtakwa uru ọ ga-abụ na akụkọ Job baara ndị Izrel nakwa uru ọ ga-abara anyị taa. Anyị ga-amụtakwa otú anyị ga-esi eji akụkọ a dị na Baịbụl enyere ndị ọzọ aka.

CHINEKE KWERE KA JOB TAA AHỤHỤ

4. Olee otú Job si dịrị ezigbo iche ná ndị Izrel bi n’Ijipt?

4 N’oge ụmụ Izrel nọ na-ata ahụhụ n’ihi na ha bụ ndị ohu n’Ijipt, e nwere otu nwoke aha ya bụ Job bi n’obodo Ọz. Ọ ga-abụ na obodo a dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Ala Nkwa ahụ nakwa n’ebe ugwu Arebia. N’oge ahụ, ụfọdụ ndị Izrel amalitela ife arụsị n’Ijipt. Mana, Job emeghị otú ahụ. O ji obi ya niile na-efe Jehova. (Josh. 24:14; Ezik. 20:8) Jehova kwuru gbasara Job, sị: “E nweghị onye dị ka ya n’ụwa.”a (Job 1:8) Job bara ezigbo ọgaranya. A na-akwanyekwara ya ezigbo ùgwù karịa onye ọ bụla nọ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ. (Job 1:3) O doro anya na obi jọrọ Setan ezigbo njọ ịhụ na nwoke a ọtụtụ ndị ma, na-akwanyekwara ùgwù, ji obi ya niile na-efe Jehova.

5. Gịnị mere Jehova ji kwe ka Job taa ahụhụ? (Job 1:20-22; 2:9, 10)

5 Setan kwuru na Job ga-akwụsị ife Jehova ma ọ taa ahụhụ. (Job 1:7-11; 2:2-5) Jehova hụrụ Job n’anya nke ukwuu. Ma, ọ hapụrụ Setan ka o gosi ma ihe o kwuru gbasara Job ọ̀ bụ eziokwu. (Job 1:12-19; 2:6-8) Setan gburu anụmanụ Job niile, gbuo ụmụ ya iri, meekwa ka ọ rịawa ọrịa ọjọọ zuru ya ahụ́ na-afụ ya ezigbo ụfụ. Mana ahụhụ a niile Setan tara Job emeghị ka ọ kwụsị iji obi ya niile na-efe Jehova. (Gụọ Job 1:20-22; 2:9, 10.) Jehova mechara gwọọ Job, mee ka o nwetaghachi akụnụba ya, a kwanyewekwara ya ùgwù. O mekwara ka Job mụta ụmụ iri ọzọ, meekwa ka ọ nọkwuo otu narị afọ na iri anọ (140), nke mere ka ọ hụ ụmụ ya na ụmụ ụmụ ya ruo n’ọgbọ nke anọ. (Job 42:10-13, 16) Gịnị ka ọ ga-abụ na ndị ohu Jehova n’oge gara aga mụtara n’akụkọ Job? Gịnịkwa ka anyịnwa ga-amụta na ya?

6. Olee otú ọ ga-abụ na akụkọ Job si nyere ndị Izrel aka ịmata ihe mere Chineke ji kwe ka ndị mmadụ na-ata ahụhụ? (Kọwaakwa foto.)

6 Uru ọ ga-abụ na ọ baara ndị Izrel. Ihe adịrịghị ndị Izrel mfe n’Ijipt. Dị ka ihe atụ, mgbe Joshụa na Keleb na-eto eto, ha bụ ndị ohu n’Ijipt. Ha mechakwara bie n’ala ịkpa ruo afọ iri anọ maka ihe ndị Izrel ndị ọzọ metara. Ọ bụrụ na ndị Izrel nụrụ akụkọ Job na otú Chineke si mechaa gọzie ya, o doro anya na o nyeere ma hanwa ma ndị nke a ka ga-amụta aka ịghọta na ọ bụ Setan na-eme ka ndị mmadụ na-ata ahụhụ, ọ bụghị Jehova. O nyekwaara ha aka ịghọta ihe mere Jehova ji ekwe ka ndị mmadụ na-ata ahụhụ nakwa na ọ hụrụ ndị na-erubere ya isi n’anya ma mgbe ihe siiri ha ike. Ọ na-akwụkwa ha ụgwọ.

Ebe otu onye Izrel na-atụgharị uche mgbe ọ na-ebu blọk n’Ijipt. N’akụkụ ya, ndị Ijipt ji ụtarị na-apịa ndị Izrel ndị ọzọ na-arụsi ọrụ ike.

O nwere ike ịbụ na ndị Izrel, bụ́ ndị gbara ohu n’Ijipt ruo ọtụtụ afọ, mechara mụta gbasara Job, ya enyere ha aka (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6)


7-8. Olee otú akwụkwọ Job nwere ike isi nyere ndị na-ata ahụhụ aka? Mee ihe atụ.

7 Uru ọ ga-abara anyị. Ọ dị mwute na ọtụtụ ndị taa enweghịzi okwukwe na Chineke n’ihi na ha amaghị ihe mere ihe ọjọọ ji eme ndị ezigbo mmadụ. Ka anyị kwuo gbasara otu nwaanyị aha ya bụ Hazel.b Ọ bụ onye Rụwanda. Mgbe ọ dị obere, o kweere na Chineke. Mana ihe gbanwere. Papa ya na mama ya gbara alụkwaghịm, mama ya alụọ di ọzọ. Di mama ya ahụ nọkwa na-emegbu ya. Ka ọ na-eto, otu nwoke dinara ya n’ike. Mgbe Hazel gara na chọọchị ha ka a kasie ya obi, e nweghị nke a kasiri ya. O mechara deere Chineke akwụkwọ ozi, sị: “Chineke, ọ bụ gị ka m kpeere ekpere, gbalịakwa ịna-eme ihe dị mma. Ma i ji ihe ọjọọ kwụọ m ụgwọ ihe ọma m mere. M na-ahapụ gị ugbu a. Ekpebiekwala m imewezi ihe ọ bụla ga-eme m obi ụtọ.” Obi na-agbawa anyị maka ndị ọ dị otú ọ dị Hazel, ndị kweere na ọ bụ Chineke na-akpata ahụhụ ha na-ata.

8 Ma, anyị esila n’akụkọ Job mata na ọ bụghị Chineke na-akpata ahụhụ ndị mmadụ na-ata. Ọ bụ Setan na-akpata ya. Anyị amụtakwala na anyị ekwesịghị iche na ndị na-ata ahụhụ na-aghọrọ mkpụrụ ha kụrụ. Baịbụl gwara anyị na “ọdachi” nwere ike ịbịara onye ọ bụla “n’oge a na-atụghị anya ya.” (Ekli. 9:11; Job 4:1, 8) Anyị amụtakwala na ọ bụrụ na anyị akwụsịghị ife Jehova ma ọnwụnwa bịara anyị, ọ ga-eme ka Jehova nwee ihe ọ ga-aza Setan. Ọ na-eso eme ka e doo aha Jehova nsọ. (Job 2:3; Ilu 27:11) Anyị ejighị ihe ndị a anyị mụtara egwu egwu n’ihi na o mere ka anyị mata ihe mere anyị na ndị anyị hụrụ n’anya ji ata ahụhụ. Ndịàmà Jehova mechara mụwara Hazel Baịbụl, ya aghọta na ọ bụghị Jehova kpatara ahụhụ ọ na-ata. Ọ sịrị: “M si n’obi m kpee ekpere ọzọ. M gwara Jehova na ọ bụ eziokwu na m kwuburu na m chọrọ ịkwụsị ife ya, mana ọ bụghị ihe m chọrọ ime. Ihe mere m ji kwuo otú ahụ bụ na amatabeghị m onye ọ bụ nke ọma. Ugbu a, aghọtala m na Jehova hụrụ m n’anya. Obi bụ m sọ aṅụrị ugbu a.” Obi dị anyị ezigbo ụtọ na anyị ma ihe mere Chineke ji kwe ka ụmụ mmadụ na-ata ahụhụ. Ugbu a, ka anyị lee otú akụkọ Job nwere ike isi nyere anyị aka ma anyị na-ata ahụhụ.

OTÚ AKỤKỌ JOB SI ENYERE ANYỊ AKA ỊTACHI OBI

9. Olee otú ihe si dịrị Job? (Jems 5:11)

9 Weregodị ya na ị na-ahụ ebe Job nọ ọdụ ná ntụ. Etuto toro ya ebe niile, ya ehuru ehuru, ahụ́ ana-afụkwa ya ụfụ. Ahụ́ ya na-ejizi oji n’ihi ọrịa ọjọọ a, na-ekpekapụkwa ekpekapụ. Ọ takwara ezigbo ahụ́. Ezigbo ike gwụrụ Job, ihe ọ ga-emeli abụrụ iji mpekere ite ụrọ kụwara akụwa na-akọ onwe ya ọkọ. Ọ na-ekwukwa otú ahụ́ si na-afụ ya ụfụ. Ma, ihe Job mere abụghị naanị idi ihe ahụ na-eme ya, ọ ka nọkwa na-erubere Chineke isi. (Gụọ Jems 5:11.) Gịnị nyeere ya aka ịtachi obi?

10. Gịnị gosiri na Job na Jehova dị n’ezigbo mma? Kọwaa.

10 Job gwara Jehova otú ọ dị ya n’obi. (Job 10:1, 2; 16:20) Dị ka ihe atụ, n’isi nke 3, Job kwuru otú obi si na-ajọ ya njọ n’ihi ihe mere ya. O chere na ọ bụ Jehova kpatara nsogbu ya. Ndị enyi ya atọ mechakwara kwuo ọtụtụ ugboro na Chineke na-ata ya ahụhụ n’ihi mmehie ya. Ma, Job nọ na-ekwu na aka ya dị ọcha. Ihe ụfọdụ Job kwuru gosiri na e nwere mgbe o weere na ya bụ onye ezi omume karịa Chineke. (Job 10:1-3; 32:1, 2; 35:1, 2) Job kwuru na ya kwuru okwu mgbe ụfọdụ “n’echeghị echiche” n’ihi na ọ nọ na-agbasi mbọ ike igosi na aka ya dị ọcha. (Job 6:3, 26) N’isi nke 31, Job kwuru na ọ chọrọ ka Chineke kwuo na aka ya dị ọcha. (Job 31:35) Ma, ihe Job mere adịghị mma. O kwesịghị isi ọnwụ ka Jehova gwa ya ihe mere o ji na-ata ahụhụ.

11. Gịnị ka Jehova mere mgbe Job nọ na-ekwu na aka ya dị ọcha?

11 Anyị aghọtala ugbu a na ihe mere Job ji si otú ahụ kwuo okwu bụ maka na ya na Jehova dị n’ezigbo mma. Ọ tụkwasịkwara Jehova obi na ọ ga-ekpe ya ikpe ziri ezi. Jehova mechara si n’oké ifufe zaghachi Job. Ma, ọ kọwaraghị ya ihe mere o ji na-ata ahụhụ. Ọ taghịkwanụ ya ahụhụ maka ikwu otú ọ dị ya n’obi ma ọ bụkwanụ maka na o kwuru na aka ya dị ọcha. Kama, Jehova ji obiọma gbazie Job otú nna na-eme nwa ya. Ọ bụ otú a kacha mma isi nyere Job aka. Ihe a mere ka Job dị umeala n’obi ma kweta na o nweghị ihe ọ bụla ọ ma, kwaakwa mmakwaara maka okwu ndị o kwuru n’echeghị echiche. (Job 31:6; 40:4, 5; 42:1-6) Olee otú ọ ga-abụ na akụkọ Job si baara ndị mmadụ uru n’oge gara aga? Oleekwa otú ọ ga-esi abara anyị uru taa?

12. Olee uru ọ ga-abụ na akụkọ Job baara ndị Izrel?

12 Uru ọ ga-abụ na ọ baara ndị Izrel. Ọ ga-abụ na ndị Izrel si n’akụkọ Job mụta ezigbo ihe. Dị ka ihe atụ, ka anyị kwuo gbasara Mosis. Ọ dịghịrị ya mfe idu ndị Izrel. Ọtụtụ mgbe, ha nupụụrụ Jehova isi, meekwa ihe wutere Mosis. Ma, Mosis emeghị ka ha. Ha na-akatọ Jehova ma ihe sie ike. Ma, ihe siere Mosis ike, ọ na-akọrọ ya Jehova. (Ọpụ. 16:6-8; Ọnụ Ọgụ. 11:10-14; 14:1-4, 11; 16:41, 49; 17:5) Ọ ga-abụkwa na akụkọ Job nyeere Mosis aka ịtachi obi mgbe Jehova gbaziri ya. Dị ka ihe atụ, mgbe ndị Izrel mara ụlọikwuu ha na Kedesh, ikekwe n’afọ nke iri anọ ha nọ n’ala ịkpa, Mosis ‘kwuru okwu n’echeghị echiche.’ O meghị ka e too aha Jehova. (Ọma 106:32, 33) Ihe a mere ka Jehova ghara ikwe ka ọ banye n’Ala Nkwa. (Diut. 32:50-52) Ihe a wutere Mosis. N’agbanyeghị ya, ọ dị umeala n’obi ma si n’aka ná ntị Jehova dọrọ ya mụta ihe. Ndị Izrel ndị biri ndụ mgbe oge Mosis gachara nwekwara ike isi n’akụkọ Job mụta idi nsogbu ha. Ọ bụrụ na ha echebara akụkọ ahụ echiche, ha ga-amụta otú ha ga-esi akọrọ Jehova otú obi dị ha. Ọ ga-enyekwara ha aka icheta na ha abụghị ndị ezi omume karịa Jehova. Ha nwekwara ike isi na ya mụta ịdị umeala n’obi ma gee ntị ma Jehova dọwa ha aka ná ntị.

13. Olee otú akụkọ Job nwere ike isi nyere anyị aka ịtachi obi? (Hib. 10:36)

13 Uru ọ ga-abara anyị. Ebe anyị bụ Ndị Kraịst, anyị kwesịrị ịna-atachi obi. (Gụọ Ndị Hibru 10:36.) O nwere ike ịbụ na ahụ́ adịghị anyị, na e nwere ihe na-echegbu anyị, na anyị nwere nsogbu n’ezinụlọ, na mmadụ nwụnahụrụ anyị, ma ọ bụkwanụ na anyị nwere nsogbu ọzọ tara akpụ. Mgbe ụfọdụ, ihe ndị ọzọ mere ma ọ bụ kwuo nwere ike ime ka o sikwuoro anyị ike ịtachi obi. (Ilu 12:18) Ma, akwụkwọ Job na-akụziri anyị na anyị nwere ike ịkọrọ Jehova otú ọ dị anyị n’obi, obi esie anyị ike na ọ ga-ege anyị ntị. (1 Jọn 5:14) Ọ gaghị ewesa anyị iwe ma anyị gwa ya otú ọ dị anyị n’obi, ọ bụrụgodị na anyị ‘kwuru okwu n’echeghị echiche’ mgbe ụfọdụ otú ahụ Job mere. Kama, Jehova ga-enye anyị ike na amamihe anyị ga-eji atachi obi. (2 Ihe 16:9; Jems 1:5) O nwekwara ike ịdọ anyị aka ná ntị otú kwesịrị ekwesị otú ahụ o mere Job. O nwere ike isi na Baịbụl, n’akwụkwọ anyị, n’aka okenye, ma ọ bụkwanụ n’aka enyi anyị dọọ anyị aka ná ntị. Akụkọ Job na-akụziri anyị na ọ bụrụ na Jehova adọọ anyị aka ná ntị, anyị kwesịrị ịtachi obi. (Hib. 12:5-7) Ọ baara Job uru mgbe o gere Jehova ntị. Ọ ga-abakwara anyị uru ma anyị dị umeala n’obi ma nabata aka ná ntị a dọrọ anyị. (2 Kọr. 13:11) Anyị amụtala ezigbo ihe n’akwụkwọ Job. Ka anyị lebazie anya n’otú anyị nwere ike isi jiri akụkọ Job nyere ndị ọzọ aka.

JIRI AKWỤKWỌ JOB NYERE NDỊ ỌZỌ AKA

14. Olee otu ụzọ anyị si akọwa ihe mere ndị mmadụ ji ata ahụhụ?

14 È nweela mgbe ị hụrụ mmadụ n’ozi ọma, ya ajụọ gị ihe mere ndị mmadụ ji ata ahụhụ? Gịnị ka ị zara ya? Ikekwe ị kọwaara ya ihe Baịbụl kwuru mere n’ogige Iden. O nwere ike ịbụ na ị gwara ya na otu ajọ mmụọ bụ́ Ekwensu ghaara di na nwunye mbụ ụgha ma mee ka ha nupụrụ Jehova isi. (Jen. 3:1-6) Ọ ga-abụ na ị kọwaara ya na isi ahụ Adam na Iv nupụụrụ Jehova mere ka ụmụ mmadụ na-ata ahụhụ ma na-anwụ anwụ. (Rom 5:12) O nweziri ike ịbụ na ị gwara ya na ihe mere Chineke ji kwe ka oge ụfọdụ gaa bụ ka o gosi ndị mmadụ na ihe Ekwensu kwuru abụghị eziokwu, nakwa na Chineke ji oge ahụ eme ka ndị mmadụ mara na ọ ga-ewepụ ahụhụ niile ma mee ka anyị dịrị ndụ ebighị ebi ma na-enwe obi ụtọ. (Mkpu. 21:3, 4) Otú ahụ i si zaa ya ajụjụ ahụ dị mma. O nwere ike ime ka ọtụtụ ndị ghọta ihe mere ndị ezigbo mmadụ ji ata ahụhụ.

15. Olee otú anyị nwere ike isi jiri akwụkwọ Job nyere mmadụ aka ma ọ jụọ anyị ihe mere anyị ji ata ahụhụ? (Kọwaakwa foto.)

15 Otú ọzọ anyị nwere ike isi akọwara mmadụ ihe mere anyị ji ata ahụhụ bụ ịgwa ya gbasara Job. Anyị nwere ike ibu ụzọ jaa ya mma maka ajụjụ ahụ dị ezigbo mkpa ọ jụrụ. Anyị nweziri ike ịgwa ya na Job, bụ́ ohu Jehova tara ezigbo ahụhụ, jụkwara ihe mere anyị ji ata ahụhụ. Job chere na ọ bụ Chineke kpatara ahụhụ ọ na-ata. (Job 7:17-21) Obi nwere ike ịdị onye ahụ jụrụ gị ajụjụ ahụ ụtọ na kemgbe ọtụtụ afọ, ndị mmadụ chọrọ ịmata azịza ajụjụ ya ahụ. I nweziri ike iji akọ kọwaara ya na ọ bụghị Jehova kpatara ahụhụ Job tara, kama na ọ bụ Ekwensu. Ihe mere Setan ji taa Job ahụhụ bụ na ọ chọrọ igosi na ihe mere ụmụ mmadụ ji na-efe Chineke bụ naanị maka ihe ha na-erite n’aka ya. I nwekwara ike ịgwa ya na ọ bụ eziokwu na ọ bụghị Chineke kpatara ahụhụ Job tara, ma ọ hapụrụ ya ka ọ taa ahụhụ. O si otú ahụ gosi na obi siri ya ike na ndị ji obi ha hụ ya n’anya ga-egosi na Ekwensu bụ onye ụgha. I nweziri ike ịkọwara ya na Chineke mechara gọzie Job maka na ọ kwụsịghị irubere ya isi. N’ihi ya, anyị ga-akasili ndị ọzọ obi ma anyị mee ka obi sie ha ike na ọ bụghị Chineke na-eme ka ha na-ata ahụhụ.

Foto ndị na-egosi: 1. Ebe otu nwaanyị obi gbawara ji foto ọ hụrụ mgbe ọ nọ na-abọghasị ihe ha ọkụ gbara. 2. Mgbe e mechara, nwaanyị ahụ kwụsịrị n’ebe ụmụnna ji ihe nkwagharị na-ekwusa ozi ọma, n’akụkụ ebe a na-agbatara ndị ọdachi dakwasịrị ọsọ enyemaka. Ọ nọ na-ege ntị mgbe otu nwanna nwaanyị na-agụrụ ya Baịbụl.

Olee otú i nwere ike isi jiri akwụkwọ Job mee ka obi sie ndị mmadụ ike na “Chineke emekataghị mee ihe ọjọọ”? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15)


16. Mee ihe atụ gosiri otú akwụkwọ Job nwere ike isi nyere onye na-ata ahụhụ aka.

16 Ka anyị lee otú akụkọ Job si nyere otu nwoke aha ya bụ Mario aka. Otu ụbọchị n’afọ 2021, otu nwanna nwaanyị ji ekwentị na-ekwusa ozi ọma. Onye mbụ ọ kpọrọ bụ Mario. Ọ gụụrụ ya otu ebe na Baịbụl ma kọwaara ya na Chineke na-anụ ekpere anyị, kọwaakwara ya ihe ọma o kwere nkwa imere anyị n’ọdịnihu. Mgbe ọ jụrụ Mario ihe o chere, Mario gwara ya na ọ na-ede akwụkwọ ozi o ji agwa ndị ezinụlọ ya na ọ hụrụ ha n’anya. O dechaa ya, ya egbuo onwe ya. Ọ sịrị: “M kweere na Chineke. Mana, n’ụtụtụ a, m nọ na-eche na Chineke agbakụtala m azụ.” N’oge ọzọ nwanna nwaanyị ahụ kpọrọ Mario n’ekwentị, ha kwurịtara gbasara ahụhụ Job tara. Mario kpebiziri na ya ga-agụ akwụkwọ Job niile. N’ihi ya, nwanna nwaanyị ahụ zigaara ya ihe ga-ebuga ya ebe ọ ga-agụ Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ na jw.org. Gịnị meziri? Mario kwetara ka a mụwara ya Baịbụl. Obi tọkwara ya ụtọ ịmụtakwu gbasara Chineke hụrụ ya n’anya.

17. Gịnị mere obi ji dị gị ụtọ na Chineke mere ka akwụkwọ Job soro n’akwụkwọ ndị dị na Baịbụl? (Job 34:12)

17 N’eziokwu, Okwu Chineke na-akpa ezigbo ike n’inyere ndị mmadụ aka, ma ndị na-ata ahụhụ. (Hib. 4:12) Obi dị anyị ezigbo ụtọ na Jehova mere ka e dee akụkọ Job n’Okwu ya bụ́ Baịbụl. (Job 19:23, 24) Akwụkwọ Job na-eme ka obi sie anyị ike na “n’eziokwu, Chineke anaghị eme ihe ọjọọ.” (Gụọ Job 34:12.) Ọ na-akụzikwara anyị ihe mere Chineke ji kwe ka anyị na-ata ahụhụ nakwa otú anyị ga-esi edi ya. Ọ na-enyekwara anyị aka ịkasi ndị na-ata ahụhụ obi. Isiokwu na-eso nke a ga-akọwara anyị ihe ndị ọzọ anyị ga-amụta n’akwụkwọ Job, dị ka otú anyị ga-esi enye ezigbo ndụmọdụ.

GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

  • Olee uru ọ na-abara anyị na anyị ghọtara ihe mere Jehova ji kwe ka Job taa ahụhụ?

  • Olee otú akụkọ Job ga-esi enyere anyị aka idi ọnwụnwa?

  • Olee otú anyị nwere ike isi jiri akwụkwọ Job nyere ndị ọzọ aka?

ABỤ NKE 156 Nwee Okwukwe

a Job dịrị ndụ mgbe Josef nwụcharala tupu Jehova eziga Mosis ka ọ gaa napụta ndị Izrel n’Ijipt. N’ihi ya, ọ ga-abụ n’agbata afọ 1657 Tupu Oge Ndị Kraịst na afọ 1514 Tupu Oge Ndị Kraịst ka Jehova na Ekwensu kwurịtara okwu ahụ e dere n’akwụkwọ Job, bụrụkwa oge Job tara ahụhụ.

b Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya