M̀ Kwesịrị Ịkwụsị Ịnya Ụgbọala?
KA E were ya na o teela ị nyawara ụgbọala. Obi dị gị ụtọ n’ihi na i nwere ike ịnyara ụgbọala gị gaa ebe masịrị gị mgbe masịrị gị. Mana, ndị ezinụlọ gị na ndị enyi gị na-echegbu onwe ha. Ha chere na ọ ga-akacha mma ka ị kwụsị ịnya ụgbọala. Ma, ị ghọtaghị ihe mere ha ji na-eche otú ahụ.
Ọ bụrụ otú ahụ ka ọ dị gị, gịnị ga-enyere gị aka ikpebi ma ị̀ ka kwesịrị ịna-anya ụgbọala?
N’obodo ụfọdụ, ọ bụrụ na ndị rurula afọ ụfọdụ achọọ imegharị akwụkwọ ikike ha ji anya ụgbọala, dọkịta na-ebu ụzọ lee ha ahụ́. Ndị Kraịst nọ n’obodo ndị a na-erube isi n’iwu obodo ha. (Rom 13:1) Ma, ọ bụrụgodị na e nweghị iwu dị otú ahụ n’ebe i bi, e nwere ihe ụfọdụ ga-enyere gị aka ịmata ma ị̀ ka kwesịrị ịna-anya ụgbọala.
CHEE GBASARA OTÚ I SI ANYA ỤGBỌALA
Otu ụlọ ọrụ na-ahụ maka ndị agadi kwuru na i nwere ike ịjụ onwe gị ajụjụ ndị a:
Ọ̀ na-esiri m ike ịgụ ihe ndị e dere n’ụzọ ma ọ bụkwanụ ịhụ ụzọ n’abalị?
Ọ̀ na-esiziri m ike ịtụgharị lee enyo ụgbọala m ma ọ bụkwanụ ebe ndị m na-agaghị esili n’enyo hụ?
Ihe mee, ọ̀ na-esiziri m ike ime ihe m kwesịrị ime ozugbo, dị ka ịkwụsị inye ụgbọala m ọkụ, jie brek?
M nyawa ụgbọala, m̀ na-arị ka eju nke na m na-anọchiri ndị ọzọ ụzọ?
È nweela oge ụfọdụ ọ fọrọ obere ka m nwee ihe mberede? È nwere ebe ndị ihe kụkpọrọ ụgbọala m ma ọ bụ kwokasịa ya n’ihi na m gara kụọ ihe nọọrọ onwe ya?
È nweela mgbe ndị uwe ojii kwụsịrị m n’ihi otú m si anya ụgbọala?
È nwetụla mgbe m nyagidere ụgbọala, ụra eburu m?
M̀ na-aṅụ ọgwụ ndị nwere ike ịkpa otú m si anya ụgbọala aka?
Ndị ezinụlọ m na ndị enyi m hà agwala m na ha na-echegbu onwe ha gbasara otú m si anya ụgbọala?
Ọ bụrụ na ị zara ee n’otu n’ime ajụjụ ndị a ma ọ bụ abụọ, o nwere ike ịbụ na i kwesịrị ịgbanwe ihe ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịkwụsịlata ịnya ụgbọala, karịchaa n’abalị. Ị nọtụkwa, chebara otú i si anya ụgbọala echiche. I nwere ike ịjụ onye ezinụlọ gị ma ọ bụ enyi gị ihe o chere gbasara otú i si anya ụgbọala. I nwekwara ike ịga ebe a ga-akụzikwuru gị otú ị ga-esi na-anya ụgbọala nke ọma. Ma, ọ bụrụ na ị zara ee n’ihe karịrị ajụjụ abụọ n’ajụjụ ndị ahụ a jụrụ, o nwere ike ịkacha mma ka ị kwụsị ịnya ụgbọala.a
JIRI IHE BAỊBỤL KWURU KPEBIE IHE Ị GA-EME
O nwere ike isiri anyị ike ịchọpụta na anyị anaghịzi anya ụgbọala nke ọma otú anyị sibu anya. Naanị iche n’echiche na anyị ga-akwụsị ịnya ụgbọala nwere ike ịna-ewe anyị iwe. N’ihi ya, olee ihe Baịbụl kwuru nwere ike inyere gị aka iche echiche nke ọma ma mee mkpebi dị mma? Legodị ihe abụọ.
Dịrị umeala n’obi. (Ilu 11:2) Nká bịawa, anyị agaghị na-ahụ ụzọ nke ọma ma ọ bụ na-anụ ihe nke ọma. Ike anyị ga na-agbadakwa. Anyị agaghịzi na-emeli ihe anyị na-emebu ma ihe mee na mberede. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị na-akwụsị ime egwuregwu ụfọdụ ma ha gbagotewe n’afọ ndụ n’ihi na ha ma na ha nwere ike imerụ ahụ́ ngwa ngwa. Mmadụ nwekwara ike ime ụdị ihe ahụ n’ihe gbasara ịnya ụgbọala. E nwere oge ọ ga-eru, onye dị umeala n’obi ejiri aka ya kwụsị ịnya ụgbọala ka ọ ghara imerụ onwe ya ahụ́. (Ilu 22:3) Ọ bụrụkwa na ndị ọzọ ekwuo na ha na-echegbu onwe ha maka otú anyị si anya ụgbọala, anyị kwesịrị ịdị umeala n’obi ma gee ntị.—I nwere ike ịtụle 2 Samuel 21:15-17.
Zere ikpe ọbara ịma gị. (Diut. 22:8) Ụgbọala nwere ike imerụ mmadụ ahụ́ ma ọ bụdị gbuo mmadụ ma ọ bụrụ na a nyaghị ya nke ọma. Ọ bụrụ na mmadụ ana-anya ụgbọala mgbe ọ na-anaghịzi anya ya nke ọma, o nwere ike igbu onwe ya ma ọ bụ onye ọzọ. Ihe a nwere ike ime ka ikpe ọbara ma ya.
Echela na ndị ọzọ agaghịzi na-akwanyere gị ùgwù ma ị kwụsị ịnya ụgbọala. Jehova hụrụ gị n’anya maka ọmarịcha àgwà ndị i nwere, àgwà ndị dị ka ịdị umeala n’obi, ịma ebe ike gị ruru, na iche banyere ndị ọzọ. O kwekwara nkwa ịna-akwado gị ma na-akasi gị obi. (Aịza. 46:4) Ọ gaghị ahapụ gị. N’ihi ya, rịọ ya ka o nyere gị aka iji ezigbo amamihe na ndụmọdụ si na Baịbụl kpebie ma ị̀ ga-akwụsị ịnya ụgbọala.
a Ị chọọ ịmatakwu gbasara ya, gụọ isiokwu bụ́ “Ihe Mberede Ụgbọala—Ị̀ Nọ ná Nchebe?” Ọ gbara na Teta! September 8, 2002.