Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w25 Nọvemba p. 8-9
  • M̀ Kwesịrị Ịkwụsị Ịnya Ụgbọala?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • M̀ Kwesịrị Ịkwụsị Ịnya Ụgbọala?
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • CHEE GBASARA OTÚ I SI ANYA ỤGBỌALA
  • JIRI IHE BAỊBỤL KWURU KPEBIE IHE Ị GA-EME
  • Ihe Mberede Ụgbọala—Ị̀ Nọ Ná Nchebe?
    Teta!—2002
  • Ihe I Nwere Ike Ime Ka Ị Ghara Inwe Ihe Ọghọm Mgbe Ị Na-anya Ụgbọala
    Teta!—2011
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
w25 Nọvemba p. 8-9
Ebe otu nwanna mere agadi nọ n’akụkụ windo na-ele ụgbọala ya. O ji mkpịsị ugodi ụgbọala ya n’aka na-eche echiche.

M̀ Kwesịrị Ịkwụsị Ịnya Ụgbọala?

KA E were ya na o teela ị nyawara ụgbọala. Obi dị gị ụtọ n’ihi na i nwere ike ịnyara ụgbọala gị gaa ebe masịrị gị mgbe masịrị gị. Mana, ndị ezinụlọ gị na ndị enyi gị na-echegbu onwe ha. Ha chere na ọ ga-akacha mma ka ị kwụsị ịnya ụgbọala. Ma, ị ghọtaghị ihe mere ha ji na-eche otú ahụ.

Ọ bụrụ otú ahụ ka ọ dị gị, gịnị ga-enyere gị aka ikpebi ma ị̀ ka kwesịrị ịna-anya ụgbọala?

N’obodo ụfọdụ, ọ bụrụ na ndị rurula afọ ụfọdụ achọọ imegharị akwụkwọ ikike ha ji anya ụgbọala, dọkịta na-ebu ụzọ lee ha ahụ́. Ndị Kraịst nọ n’obodo ndị a na-erube isi n’iwu obodo ha. (Rom 13:1) Ma, ọ bụrụgodị na e nweghị iwu dị otú ahụ n’ebe i bi, e nwere ihe ụfọdụ ga-enyere gị aka ịmata ma ị̀ ka kwesịrị ịna-anya ụgbọala.

CHEE GBASARA OTÚ I SI ANYA ỤGBỌALA

Otu ụlọ ọrụ na-ahụ maka ndị agadi kwuru na i nwere ike ịjụ onwe gị ajụjụ ndị a:

  • Ọ̀ na-esiri m ike ịgụ ihe ndị e dere n’ụzọ ma ọ bụkwanụ ịhụ ụzọ n’abalị?

  • Ọ̀ na-esiziri m ike ịtụgharị lee enyo ụgbọala m ma ọ bụkwanụ ebe ndị m na-agaghị esili n’enyo hụ?

  • Ihe mee, ọ̀ na-esiziri m ike ime ihe m kwesịrị ime ozugbo, dị ka ịkwụsị inye ụgbọala m ọkụ, jie brek?

  • M nyawa ụgbọala, m̀ na-arị ka eju nke na m na-anọchiri ndị ọzọ ụzọ?

  • È nweela oge ụfọdụ ọ fọrọ obere ka m nwee ihe mberede? È nwere ebe ndị ihe kụkpọrọ ụgbọala m ma ọ bụ kwokasịa ya n’ihi na m gara kụọ ihe nọọrọ onwe ya?

  • È nweela mgbe ndị uwe ojii kwụsịrị m n’ihi otú m si anya ụgbọala?

  • È nwetụla mgbe m nyagidere ụgbọala, ụra eburu m?

  • M̀ na-aṅụ ọgwụ ndị nwere ike ịkpa otú m si anya ụgbọala aka?

  • Ndị ezinụlọ m na ndị enyi m hà agwala m na ha na-echegbu onwe ha gbasara otú m si anya ụgbọala?

Ọ bụrụ na ị zara ee n’otu n’ime ajụjụ ndị a ma ọ bụ abụọ, o nwere ike ịbụ na i kwesịrị ịgbanwe ihe ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịkwụsịlata ịnya ụgbọala, karịchaa n’abalị. Ị nọtụkwa, chebara otú i si anya ụgbọala echiche. I nwere ike ịjụ onye ezinụlọ gị ma ọ bụ enyi gị ihe o chere gbasara otú i si anya ụgbọala. I nwekwara ike ịga ebe a ga-akụzikwuru gị otú ị ga-esi na-anya ụgbọala nke ọma. Ma, ọ bụrụ na ị zara ee n’ihe karịrị ajụjụ abụọ n’ajụjụ ndị ahụ a jụrụ, o nwere ike ịkacha mma ka ị kwụsị ịnya ụgbọala.a

JIRI IHE BAỊBỤL KWURU KPEBIE IHE Ị GA-EME

O nwere ike isiri anyị ike ịchọpụta na anyị anaghịzi anya ụgbọala nke ọma otú anyị sibu anya. Naanị iche n’echiche na anyị ga-akwụsị ịnya ụgbọala nwere ike ịna-ewe anyị iwe. N’ihi ya, olee ihe Baịbụl kwuru nwere ike inyere gị aka iche echiche nke ọma ma mee mkpebi dị mma? Legodị ihe abụọ.

Dịrị umeala n’obi. (Ilu 11:2) Nká bịawa, anyị agaghị na-ahụ ụzọ nke ọma ma ọ bụ na-anụ ihe nke ọma. Ike anyị ga na-agbadakwa. Anyị agaghịzi na-emeli ihe anyị na-emebu ma ihe mee na mberede. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị na-akwụsị ime egwuregwu ụfọdụ ma ha gbagotewe n’afọ ndụ n’ihi na ha ma na ha nwere ike imerụ ahụ́ ngwa ngwa. Mmadụ nwekwara ike ime ụdị ihe ahụ n’ihe gbasara ịnya ụgbọala. E nwere oge ọ ga-eru, onye dị umeala n’obi ejiri aka ya kwụsị ịnya ụgbọala ka ọ ghara imerụ onwe ya ahụ́. (Ilu 22:3) Ọ bụrụkwa na ndị ọzọ ekwuo na ha na-echegbu onwe ha maka otú anyị si anya ụgbọala, anyị kwesịrị ịdị umeala n’obi ma gee ntị.​—I nwere ike ịtụle 2 Samuel 21:15-17.

Zere ikpe ọbara ịma gị. (Diut. 22:8) Ụgbọala nwere ike imerụ mmadụ ahụ́ ma ọ bụdị gbuo mmadụ ma ọ bụrụ na a nyaghị ya nke ọma. Ọ bụrụ na mmadụ ana-anya ụgbọala mgbe ọ na-anaghịzi anya ya nke ọma, o nwere ike igbu onwe ya ma ọ bụ onye ọzọ. Ihe a nwere ike ime ka ikpe ọbara ma ya.

Echela na ndị ọzọ agaghịzi na-akwanyere gị ùgwù ma ị kwụsị ịnya ụgbọala. Jehova hụrụ gị n’anya maka ọmarịcha àgwà ndị i nwere, àgwà ndị dị ka ịdị umeala n’obi, ịma ebe ike gị ruru, na iche banyere ndị ọzọ. O kwekwara nkwa ịna-akwado gị ma na-akasi gị obi. (Aịza. 46:4) Ọ gaghị ahapụ gị. N’ihi ya, rịọ ya ka o nyere gị aka iji ezigbo amamihe na ndụmọdụ si na Baịbụl kpebie ma ị̀ ga-akwụsị ịnya ụgbọala.

Otú Ndị Ọzọ Nwere Ike Isi Nye Aka

Ọ bụ ndị ezinụlọ onye merela agadi ka ọ kacha daba adaba ka ha gwa ya gbasara otú o si anya ụgbọala. O nwekwara ike ịbụ na ị bụ enyi onye agadi ahụ, gị anụ ka ndị ọzọ na-ekwu na otú o si anya ụgbọala na-echu ha ụra. Ejikwala ihe ha kwuru egwu egwu. I nwere ike isonyere onye agadi ahụ n’ụgbọala ya. Ọ bụrụ na ọ dị mkpa, gwa ya gbasara otú o si anya ụgbọala. I kwuwe gbasara ya, chee otú ọ ga-adị gị ma ọ bụrụ gị ka onye ọzọ na-agwa gbasara ya. Meda obi gwa ya okwu. Ma, ezorola ya ọnụ. Ka ihe ga-aka gị mkpa ghara ịbụ afọ ole ọ dị, kama ka ọ bụrụ otú o si anya ụgbọala. I nwere ike ịsị ya, “Ụjọ m bụ ka ị ghara imerụ onwe gị ahụ́” kama ịsị ya, “Ị naghịzi anya ụgbọala nke ọma.” Chetara ya ihe ndị Baịbụl kwuru e kwuru gbasara ha n’isiokwu a. Meekwa ka obi sie ya ike na ị ma na ọ ga-eme ihe Baịbụl kwuru.

Anyị niile kwesịrị iche otú ọ na-adị onye agadi kwụsịrị ịnya ụgbọala. O nwere ike iche na ọ gaghịzi agali ebe masịrị ya mgbe masịrị ya. Olee otú ị ga-esi enyere ya aka? Gbalịa dịrị obiọma ma na-emere ya ihe ụfọdụ. (Ilu 17:17) Echela ka ọ sị gị bịa buru ya n’ụgbọala n’ihi na o nwere ike ịdị ya ka ọ̀ na-enye gị nsogbu. I nwere ike iwepụta oge buga ya ebe ọ chọrọ ịga, dị ka ọmụmụ ihe, ozi ọma, ahịa, na ụlọ ọgwụ. Mee ka obi sie ya ike na ị chọrọ inyere ya aka nakwa na ị chọrọ ka gị na ya na-anọ.​—Rom 1:11, 12.

a Ị chọọ ịmatakwu gbasara ya, gụọ isiokwu bụ́ “Ihe Mberede Ụgbọala​—Ị̀ Nọ ná Nchebe?” Ọ gbara na Teta! September 8, 2002.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya