ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 45
ABỤ NKE 111 Ihe Mere Anyị Ji Enwe Ọṅụ
Na-enwe Ọṅụ Mgbe Ị Na-elekọta Onye Agadi Ma Ọ Bụ Onye Ọrịa
“Ndị ji anya mmiri na-agha mkpụrụ ga-eji mkpu ọṅụ ghọrọ ihe mkpụrụ ha mepụtara.”—ỌMA 126:5.
IHE A GA-AMỤ
Ihe ndị ga-enyere ndị na-elekọta onye agadi ma ọ bụ onye ọrịa aka ịna-enwe ọṅụ.
1-2. Olee otú obi na-adị Jehova gbasara ndị na-elekọta onye agadi ma ọ bụ onye ọrịa? (Ilu 19:17) (Kọwaakwa foto.)
OTU nwanna aha ya bụ Jin-yeol si Koria sịrị: “Mụ na nwunye m alụọla ihe karịrị afọ iri atọ na abụọ. Kemgbe afọ ise ugbu a, ọ na-arịa ezigbo ọrịa na-eme ka ọ ghara ịna-emegharị ahụ́. Ọ bụ m na-elekọta ya kemgbe ahụ. M hụrụ nwunye m n’anya, jirikwa ya kpọrọ ihe. Obi na-adịkwa m ụtọ ilekọta ya. N’abalị ọ bụla, ọ na-ehi n’àkwà pụrụ iche dị n’ụlọ anyị a rụụrụ ya maka ọrịa ya. M na-edina n’akụkụ ya, anyị abụọ ejikọta aka hie ụra.”
2 È nwere onye ị na-elekọta? O nwere ike ịbụ nne gị ma ọ bụ nna gị, di gị ma ọ bụ nwunye gị, nwa gị, ma ọ bụ enyi gị. Ọ bụrụ na e nwere, ọ ga-abụ na obi na-adị gị ụtọ inyere ya aka n’ihi na ị hụrụ ya n’anya. Otú ahụ i si elekọta ya na-egosikwa na ị hụrụ Jehova n’anya. (1 Tim. 5:4, 8; Jems 1:27) N’agbanyeghị ya, ọ naghị adị mfe ilekọta onye ị hụrụ n’anya. Mgbe ụfọdụ, e nwere nsogbu ndị ị na-enwe ndị ọzọ na-anaghị ama. O nwekwara ike ịdị gị mgbe ụfọdụ ka ọ̀ bụ naanị gị na-ata ahụhụ. Ndị ọzọ nwere ike ịhụ gị ka ị na-achị ọchị. Mana, ha amaghị na obi na-ajọ gị ezigbo njọ mgbe ụfọdụ. (Ọma 6:6) Ọ bụrụgodị na ndị ọzọ amaghị ihe gị na ya na-alụ, Jehova ma. (I nwere ike ịtụle Ọpụpụ 3:7.) O jighị anya mmiri gị na mbọ ị na-agba ilekọta onye gị egwu egwu. (Ọma 56:8; 126:5) Ọ na-ahụ ihe niile ị na-emere onye gị. Ọ na-ewere ya na ị na-agbazinye ya ihe. O kwekwara nkwa na ọ ga-akwụ gị ụgwọ.—Gụọ Ilu 19:17.
È nwere onye gị mere agadi ma ọ bụ onye gị na-arịa ọrịa ị na-elekọta? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 2)
3. Olee nsogbu ndị ọ ga-abụ na Ebreham na Sera nwere ka ha na-elekọta Tira?
3 Baịbụl kọrọ gbasara ọtụtụ ndị lekọtara onye ha mere agadi ma ọ bụ na-arịa ọrịa. Dị ka ihe atụ, chee gbasara Ebreham na Sera. Mgbe ha hapụrụ Ọọ, Tira bụ́ nna ha dị ihe dị ka narị afọ abụọ (200). N’agbanyeghị ya, o so ha pụọ. Ha gara ihe dị ka narị kilomita itoolu na iri isii (960) rute Heran. (Jen. 11:31, 32) O doro anya na Ebreham na Sera hụrụ Tira n’anya. Ma, ọ dịghịrị ha mfe ilekọta onye mere agadi otú ahụ, karịchaa mgbe ha na-eme njem. Ọ ga-abụ na ihe ha ji mee njem ahụ bụ kamel ma ọ bụ jakị. O nwere ike ịbụ na o siiri Tira ezigbo ike ịrịgoro n’elu anụmanụ ndị ahụ ma nọrọ na ha ruo ogologo oge. Ọ ga-abụ na e nwere oge ndị ezigbo ike gwụrụ Ebreham na Sera. Nke ọ bụla ọ bụ, Jehova mere ka ha nwee ike. Jehova ga-enyekwa gị ike ma nyere gị aka otú ahụ o meere Ebreham na Sera.—Ọma 55:22.
4. Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu a?
4 Ọ ga-adịrị gị mfe ilekọta onye agadi ma ọ bụ onye na-arịa ọrịa ma ị na-enwe obi ụtọ. (Ilu 15:13) Cheta na i nwere ike ịna-enwe obi ụtọ ma mgbe ihe siiri gị ezigbo ike. (Jems 1:2, 3) Olee otú ị ga-esi na-enwe obi ụtọ? Otu ihe ị ga-eme bụ ịna-ekpe ekpere ka Jehova nyere gị aka ịna-enwe obi ụtọ. N’isiokwu a, anyị ga-amụ gbasara ihe ndị ọzọ ndị na-elekọta onye agadi na onye ọrịa ga-eme iji na-enwe obi ụtọ. Anyị ga-ekwukwa otú ndị ọzọ ga-esi enyere ha aka. Ka anyị buru ụzọ kwuo ihe mere ndị na-elekọta ndị agadi na ndị ọrịa kwesịrị iji na-enwe obi ụtọ na ihe ndị nwere ike ime ka ha ghara ịna-enwe obi ụtọ.
IHE MERE ILEKỌTA ONYE AGADI NA ONYE ỌRỊA JI ESI IKE
5. Gịnị mere ndị na-elekọta onye agadi ma ọ bụ onye ọrịa ji kwesị ịna-enwe ọṅụ?
5 Ọ bụrụ na onye na-elekọta onye agadi ma ọ bụ onye ọrịa akwụsị inwe ọṅụ, o nwere ike ime ka ike gwụ ya. (Ilu 24:10) Ọ bụrụkwa na ike agwụ ya, o nwere ike ọ gaghịzi eji obiọma na-elekọta onye ahụ otú o kwesịrị. Olee ihe ndị nwere ike ime ka ndị na-elekọta onye agadi ma ọ bụ onye ọrịa kwụsị inwe ọṅụ?
6. Gịnị mere ezigbo ike ji na-agwụ ụfọdụ ndị na-elekọta onye agadi ma ọ bụ onye ọrịa?
6 Ezigbo ike nwere ike ịgwụ gị. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Leah sịrị: “Ọ bụrụgodị ụbọchị a na-enweghị ihe dapụtaranụ, ezigbo ike na-agwụ m n’abalị nke na e nweghị ihe ọzọ m ga-emeli. Mgbe ụfọdụ, ike anaghịdị adị m ịzaghachi ozi e ziteere m n’ekwentị.” E nwere ndị ọ na-esiri ike ịrahụ ezigbo ụra ma ọ bụ izu ike otú ha kwesịrị. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Inés sịrị: “Anaghị m arahụ ụra nke ọma. N’abalị, m na-etetakarị awa abụọ ọ bụla ka m lekọta nne di m. Kemgbe ọtụtụ afọ, mụ na di m enwebeghị ike ịga ebe masịrị anyị zurutụ ike.” Ụfọdụ ndị na-elekọta ndị agadi ma ọ bụ ndị ọrịa anaghịdị enwe ohere soro ndị enyi ha nọkọọ ma ọ bụ mee ụfọdụ ihe ná nzukọ Jehova n’ihi na ha ji oge ha niile na-elekọta onye ha. Ọ na-eme ka ha na-eche na ha nọ naanị ha, obi ana-ajọkwa ha njọ maka na ha anaghị emeli ihe niile ha gaara achọ ime.
7. Gịnị na-ewute ụfọdụ ndị na-elekọta onye agadi ma ọ bụ onye ọrịa ma ọ bụ na-eme ka obi na-ama ha ikpe?
7 Obi nwere ike ịna-ajọ gị njọ n’ihi ahụhụ onye gị na-ata ma ọ bụkwanụ na i chere na ị naghị emecha ihe niile i kwesịrị ime. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Jessica sịrị: “M chere na e nwere ihe m kwesịrị imere papa m m na-anaghị emere ya. M wepụta oge zurutụ ike, obi na-ama m ikpe n’ihi na ọ na-adị m ka m̀ na-eche naanị gbasara onwe m.” Ụfọdụ ndị na-elekọta onye ha nwere ike ịna-echegbu onwe ha na ha anaghị enyere ya aka otú ha kwesịrị. Mgbe ụfọdụkwa, ha nwere ike ịna-eche na ha agaghị elekọtalizi onye ha. Ha nwere ike ikwu okwu otú na-adịghị mma ma ọ bụ mee ihe ha na-ekwesịghị ime mgbe ike gwụrụ ha. Ihe a niile nwere ike ime ka obi na-ajọ ha ezigbo njọ. (Jems 3:2) Ọ na-ewutekwa ụfọdụ ndị ma ha hụ ka ọrịa jituru onye ha na-awụbu gam gam. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Barbara sịrị: “Otu n’ime ihe ndị kacha enye m nsogbu bụ ịhụ ka ọrịa enyi m na-akakwu njọ kwa ụbọchị.”
8. Kọọ akụkọ gosiri otú ikele onye na-elekọta onye agadi ma ọ bụ onye ọrịa na-eme ka obi dị ya.
8 I nwere ike ịna-eche na e nweghị ihe ndị ọzọ ji ihe ị na-arụ kpọrọ. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọtụtụ ndị anaghị ekele gị ma ọ bụ na-aja gị mma maka ihe ị na-eme. Ma, ọ bụrụ na mmadụ ekelee gị maka ihe ị na-eme, ọ na-eme gị obi ụtọ. (1 Tesa. 5:18) Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Melissa sịrị: “E nweela oge ndị m bere ákwá n’ihi na obi dara m mbà. Ma, ọ bụrụ na ndị m na-elekọta ekelee m maka ihe m na-emere ha, ọ na-eme m ezigbo obi ụtọ. Ọ na-emekwa ka m nwee ike m ga-eji na-elekọta ha.” Otu nwanna aha ya bụ Ahmadu kwuru uru ọ na-abara ya ma e kelee ya maka ihe ọ na-eme. Ya na nwunye ya na-elekọta nwa nwanne nwunye ya na-arịa akwụkwụ. Ọ sịrị: “Ọ bụ eziokwu na e nwere ike ọ gaghị aghọtacha mbọ niile anyị na-agba iji na-elekọta ya, ma obi na-atọ m ezigbo ụtọ ma o kelee anyị maka ihe ndị anyị na-emere ya ma ọ bụ gwa anyị na ọ hụrụ anyị n’anya.”
OTÚ Ị GA-ESI NA-ENWE ỌṄỤ
9. Gịnị ka onye na-elekọta onye agadi ma ọ bụ onye ọrịa ga-eme iji gosi na ọ ma ebe ike ya ruru?
9 Mara ebe ike gị ruru. (Ilu 11:2) Ọ bụghị mgbe niile ka anyị na-enwe ike na oge anyị ga-eji eme ihe niile anyị chọrọ ime. N’ihi ya, kpebie ihe ndị ị ga-emeli na ihe ndị ị na-agaghị emeli. E nwee ihe ị na-agaghị emeli, kwuo na ị gaghị emeli ya. Ọ dịghị njọ. Ọ na-egosi na ị ma ebe ike gị ruru. Ọ bụrụ na ndị ọzọ achọọ inyere gị aka, jiri obi ụtọ kwe ka ha nyere gị aka. Otu nwanna aha ya bụ Jay sịrị: “Ọ bụghị ihe niile ka anyị ga-emeli. Ịmata ebe ike anyị ruru, gharakwa ịgafe ya, ga-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ.”
10. Gịnị mere o ji dị mma ka ndị na-elekọta ndị agadi na ndị ọrịa na-aghọta ihe mere onye ha na-elekọta ji eme ihe ọ na-eme? (Ilu 19:11)
10 Na-aghọta ihe mere onye ị na-elekọta ji eme ihe ọ na-eme. (Gụọ Ilu 19:11.) Ịna-aghọta ya nwere ike ime ka iwe ghara iwe gị ma o kwuo ma ọ bụ mee ihe na-adịghị gị mma. Onye na-aghọta ihe na-achọ ịma ihe mere mmadụ ji eme ihe ọ na-eme. Ụfọdụ ọrịa nwere ike ime ka mmadụ mee ihe ọ na-agaraghị eme. (Ekli. 7:7) Dị ka ihe atụ, onye dịbu nwayọọ nwedịrị ike isesawa gị okwu ma ọ bụ malite ime mkpesa ma ọ bụkwanụ wewe iwe. Ọ bụrụ na ị na-elekọta onye na-arịa ọrịa ọjọọ, o nwere ike ịbara gị uru ma ị mụọ gbasara ọrịa ahụ. Ị mụtakwuo gbasara ọrịa ahụ, i nwere ike ịghọta na ọ bụ ọrịa ahụ mere o ji na-akpa àgwà otú o si akpa, ọ bụghị na ọ bụ onye ọjọọ.—Ilu 14:29.
11. Olee ihe ndị dị ezigbo mkpa onye na-elekọta onye agadi ma ọ bụ onye ọrịa kwesịrị iwepụta oge na-eme kwa ụbọchị? (Abụ Ọma 132:4, 5)
11 Wepụta oge na-eme ka gị na Jehova na-adị ná mma. Mgbe ụfọdụ, ọ ga-adị mma ka ị hapụtụ ihe ndị ị na-eme mee ihe ndị ọzọ “ka mkpa.” (Fil. 1:10) Otu n’ime ha bụ ime ka gị na Jehova na-adịkwu ná mma. E nwere ọtụtụ ihe Eze Devid na-eme. Mana, ife Jehova bụ ihe kacha ya mkpa. (Gụọ Abụ Ọma 132:4, 5.) Ọ dịkwa mkpa ka gịnwa na-ewepụta oge ụfọdụ n’ụbọchị na-agụ Baịbụl ma na-ekpe ekpere. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Elisha sịrị: “Ihe na-eme ka m na-enwe ọṅụ bụ na m na-ekpe ekpere, na-agụ akwụkwọ Abụ Ọma, na-atụgharịkwa uche n’ihe ndị na-akasi obi m gụtara na ya. Ihe na-akacha enyere m aka bụ ikpe ekpere. M na-ekpe ekpere ọtụtụ ugboro n’ụbọchị na-arịọ Jehova ka o nyere m aka ịnọrọ jụụ.”
12. Gịnị mere o ji dị mkpa ka ndị na-elekọta onye agadi ma ọ bụ onye ọrịa na-eme ihe ga-eme ka ahụ́ na-agbasi ha ike?
12 Wepụta oge na-eme ihe ndị ga-eme ka ahụ́ gbasie gị ike. O nwere ike ị gaghị enwe ohere ịga zụta ihe ndị ị ga-eji sie ezigbo nri ma ọ bụ ohere ị ga-eji sie ya. Iri ezigbo nri na imega ahụ́ dị ezigbo mkpa n’ihi na ọ ga-eme ka ahụ́ gbasie gị ike, isi ana-akpakọkwa gị ọnụ. N’ihi ya, ọ bụrụgodị na ị naghị enwe ohere, gbalịa wepụta oge na-eri ezigbo nri ma na-emega ahụ́. (Efe. 5:15, 16) Gbalịakwa na-ehi ezigbo ụra. (Ekli. 4:6) Ndị ọkachamara kwuru na ihi ụra na-eme ka ụbụrụ anyị jiri aka ya rụzie ihe ndị mebiri na ya. Otu isiokwu e dere gbasara ahụ́ ike kwuru na ọ bụrụ na mmadụ ana-ehi ezigbo ụra, ọ ga-eme ka ọ ghara ịna-echegbukarị onwe ya, nyekwara ya aka ịnọ jụụ ma ihe sie ike. I kwesịkwara iwepụta ohere mee ihe ndị na-amasị gị. (Ekli. 8:15) Otu nwanna nwaanyị kwuru ihe mere ka ọ na-enwe ọṅụ. Ọ sịrị: “Ụbọchị anwụ na-acha, m na-agbalị pụọ èzí ka anwụ chatụ m. M na-agbalịkwa wepụta oge mụ na otu enyi m ga-eji mee onwe anyị obi ụtọ, ọ dịkarịa ala, otu ugboro n’ọnwa.”
13. Gịnị mere o ji adị mma ịchị ọchị? (Ilu 17:22)
13 Na-achị ọchị. (Gụọ Ilu 17:22; Ekli. 3:1, 4) Ịchị ọchị ga-eme ka ahụ́ na-agbasi gị ike, gị aghara ịna-echegbu onwe gị. Ọ bụrụ na ị na-elekọta mmadụ, ọtụtụ mgbe, ihe anaghị aga otú ị tụrụ anya ya. Mana, ọ bụrụ na ị chịa ọchị mgbe ihe na-agaghị otú ị tụrụ anya ya, o nwere ike ime ka ihe ahụ ghara iwe gị iwe. Ọ bụrụkwa na gị na onye ị na-elekọta ana-achịkọ ọchị, o nwere ike ime ka unu abụọ na-adịkwu ná mma.
14. Olee otú ịkọrọ enyi gị otú obi dị gị nwere ike isi nyere gị aka?
14 Gwa otu ezigbo enyi gị otú obi dị gị. N’agbanyeghị otú i si gbaa mbọ, i nwere ike ịna-echegbu onwe gị mgbe ụfọdụ. Ụdị ihe ahụ mee, i nwere ike ịgwa ezigbo enyi gị otú obi dị gị. Ọ ga-abụ onye na-agaghị eme ka obi jọwa gị njọ maka ihe ị na-ekwu. (Ilu 17:17) Kama, ọ ga-ege gị ntị nke ọma ma gbaa gị ume. Ihe ahụ nwekwara ike ịbụ ihe ga-eme ka ị na-enwe obi ụtọ.—Ilu 12:25.
15. Olee otú ikwu gbasara Paradaịs ga-esi eme ka obi na-atọkwu gị ụtọ?
15 Chee otú ihe ga-adịrị gị na ya na Paradaịs. Gbalịa na-echeta na ọ bụ obere oge ka ị ga na-elekọta ya. Ọ bụghịkwa ọrụ Jehova bu n’obi ka ụmụ mmadụ na-arụ mgbe o kere ha. (2 Kọr. 4:16-18) “Ezigbo ndụ” ka dị n’ihu. (1 Tim. 6:19) Obi ga na-atọ gị ezigbo ụtọ ma gị na onye ị na-elekọta na-ekwu ihe ndị unu ga-emekọ ọnụ na Paradaịs. (Aịza. 33:24; 65:21) Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Heather sịrị: “M na-agwakarị ndị m na-elekọta na n’oge na-adịghị anya, anyị ga-akwakọ ákwà, gbakọọ ọsọ, gbakọọkwa ígwè. Anyị ga-eme achịcha, siekwara ndị anyị hụrụ n’anya a ga-akpọlite n’ọnwụ nri. Mụ na ha na-ekele Jehova maka olileanya anyị nwere.”
OTÚ NDỊ ỌZỌ GA-ESI ENYE AKA
16. Olee otú anyị nwere ike isi nyere nwanna na-elekọta onye agadi ma ọ bụ onye ọrịa aka n’ọgbakọ anyị? (Kọwaakwa foto.)
16 Nyere ndị na-elekọta ndị agadi ma ọ bụ ndị ọrịa aka ka ha zurutụ ike. Anyị niile nọ n’ọgbakọ nwere ike inyere nwanna aka ilekọta onye ya. Ihe a ga-eme ka nwanna ahụ nwee ohere ọ ga-eji zurutụ ike ma ọ bụ mee ihe ndị ọzọ o kwesịrị ime. (Gal. 6:2) Ụfọdụ ụmụnna ahaziela otú a ga-esi na-enyere ndị agadi ma ọ bụ ndị ọrịa aka kwa izu. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Natalya na-elekọta di ya na-anaghị agali ije. Ọ sịrị: “E nwere otu nwanna nọ n’ọgbakọ anyị na-abịa ka ya na di m nọrọ otu ugboro ma ọ bụ ugboro abụọ n’izu. Ya na ya na-ekwusa ozi ọma, na-akparịta ụka, na-elekwa fim. Oge ndị ahụ na-atọgbu di m atọgbu, na-enyekwa m ohere ime ihe ndị dịịrị m, dị ka ịgagharịtụ.” Ụfọdụ ndị n’ọgbakọ nwekwara ike ịga hie na nke nwanna na-elekọta onye ya ka nwanna ahụ nwee ike ihi ezigbo ụra n’abalị.
Olee otú i nwere ike isi nyere ndị na-elekọta onye agadi ma ọ bụ onye ọrịa aka n’ọgbakọ unu? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16)a
17. Olee otú anyị nwere ike isi nyere onye na-elekọta onye ya aka n’ọmụmụ ihe?
17 Na-enyere ndị na-elekọta onye ha aka n’ọmụmụ ihe. O nwere ike ụfọdụ ndị na-elekọta onye agadi ma ọ bụ onye ọrịa agaghị na-anụcha ihe a na-ekwu n’ọmụmụ ihe, ná mgbakọ sekit, ma ọ bụ ná mgbakọ ukwu n’ihi na ha na-elekọta onye ha. Ụmụnna nwere ike ịga ka ha na onye ahụ ọ na-elekọta nọrọ ruo oge ụfọdụ ma ọ bụ ruo mgbe a gbasara. Ọ bụrụ na onye ahụ a na-elekọta anaghị apụli èzí, i nwere ike ịga n’ụlọ ha ka gị na ya si n’Ịntanet na-ege ihe a na-eme n’ọmụmụ ihe. Ọ ga-eme ka onye na-elekọta ya nwee ike ịga ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.
18. Olee ihe ọzọ anyị ga-emere ndị na-elekọta onye agadi ma ọ bụ onye ọrịa?
18 Na-aja ndị na-elekọta onye agadi ma ọ bụ onye ọrịa mma, na-etinyekwa ha n’ekpere. Ndị okenye kwesịrị ịna-agara ndị na-elekọta onye agadi ma ọ bụ onye ọrịa nleta ọzụzụ atụrụ mgbe niile. (Ilu 27:23) N’agbanyeghị otú ihe si dịrị anyị, anyị niile nọ n’ọgbakọ nwere ike ịna-aja ha mma mgbe niile. Anyị nwekwara ike ịrịọ Jehova ka o nye ha ike nakwa ka o mee ka ha na-enwe ọṅụ.—2 Kọr. 1:11.
19. Gịnị ka anyị na-atụ anya ya?
19 N’oge na-adịghị anya, Jehova ga-ewepụ ihe niile na-eme ka anyị na-ata ahụhụ. Ọrịa na ọnwụ agaghịzi adị. (Mkpu. 21:3, 4) “Onye ngwọrọ ga-awụli elu ka mgbada.” (Aịza. 35:5, 6) N’oge ahụ, anyị agaghịzi na-aka nká ma ọ bụ na-ahụ ka onye anyị na-aka nká ma ọ bụ na-arịa ọrịa. “A gaghịzi echeta ihe niile mere na mbụ.” (Aịza. 65:17) Tupu oge ahụ eruo, ka obi sie anyị ike na Jehova agaghị agbakụta anyị azụ. Ọ bụrụ na anyị ana-atụkwasị ya obi ka o nye anyị ike, ọ ga-enyere anyị aka ka anyị “na-atachi obi n’ihe niile, jirikwa ọṅụ na-edi ihe niile.”—Kọl. 1:11.
ABỤ NKE 155 Ọ Bụ Gị Bụ Ọṅụ Anyị Ruo Ebighị Ebi
a NKỌWA FOTO: Ebe ụmụnna nwaanyị abụọ na-eto eto gara ileta otu nwanna nwaanyị mere agadi ka onye na-elekọta ya gagharịtụ.