Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w25 Nọvemba p. 2-7
  • Otú Ndị Agadi Ga-esi Na-enwe Obi Ụtọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otú Ndị Agadi Ga-esi Na-enwe Obi Ụtọ
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IHE MERE O NWERE IKE IJI SIE IKE ỊNA-ENWE ỌṄỤ MA ANYỊ MEWE AGADI
  • OTÚ Ị GA-ESI NA-ENWE ỌṄỤ
  • OTÚ NDỊ ỌZỌ NWERE IKE ISI ENYE AKA
  • Jiri Ụmụnna Anyị Ndị Agadi Kpọrọ Ihe
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
  • Jehova Na-eji Obiọma Elekọta Ndị Ohu Ya Merela Agadi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Ihe Anyị Ga-amụta n’Okwu Ikpeazụ Ụmụ Nwoke Kwesịrị Ntụkwasị Obi Kwuru
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
  • Dịrị Umeala n’Obi ma E Nwee Ihe Ị Na-amaghị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
w25 Nọvemba p. 2-7

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 44

ABỤ NKE 138 Isi Awọ́ Mara Mma

Otú Ndị Agadi Ga-esi Na-enwe Obi Ụtọ

“Ha megodị agadi, ha . . . ga na-eme nke ọma.”​—ỌMA 92:14.

IHE A GA-AMỤ

Ihe mere ndị agadi ji kwesị ịna-enwe ọṅụ na otú ha ga-esi na-eme ya.

1-2. Olee otú Jehova si ele ndị ohu ya merela agadi anya? (Abụ Ọma 92:12-14) (Kọwaakwa foto.)

N’ỤWA niile, ihe ndị mmadụ na-eme ma ha mewe agadi na-adị iche iche. Chegodị banyere ihe atụ a. Ì chetara mgbe ị hụrụ awọ́ mbụ n’isi gị? O nwere ike ịbụ na ihe i mere bụ ifopụ ya ozugbo ka onye ọzọ ghara ịhụ ya. Ma, i mechara chọpụta na ifopụ isi awọ́ anaghị eme ka ndị ọzọ ghara ịpụta. Ihe atụ a na-egosi otú ọtụtụ ndị si agbalịsi ike ka ha ghara ime agadi.

2 Ma, otú Nna anyị nke eluigwe si ele ndị ohu ya mere agadi anya dị iche. (Ilu 16:31) O ji ha tụnyere osisi ndị mara mma. (Gụọ Abụ Ọma 92:12-14.) Gịnị mere o ji daba adaba? Osisi ndị nọterela ezigbo aka na-amakarị ezigbo mma n’ihi na ọtụtụ akwụkwọ ma ọ bụ okooko na-eju na ha. Dị ka ihe atụ, e nwere otu ụdị osisi na-ama ezigbo mma dị na Japan. Ọ na-anọ ọtụtụ afọ. Ụfọdụ ndị kacha maa mma n’ime ha anọfeela otu puku (1,000) afọ. E nwere ike iji ha tụnyere ndị ohu Jehova merela agadi. Jehova ji ha kpọrọ ezigbo ihe. Ọ na-ahụ ụdị ndị ha bụ n’agbanyeghị isi awọ́ ha. Ọ na-ahụ àgwà ọma ndị agadi nwere, ma otú ha si atachi obi ma otú ha si erubere ya isi ma ọtụtụ afọ ha jirila jeere ya ozi.

Ebe otu di na nwunye merela agadi nọ n’oche dị n’èzí, osisi ndị nwere okooko mara mma agbaa ha gburugburu.

Otú ahụ osisi nọrọla ọtụtụ afọ na-ama mma ma na-eme nke ọma ka ndị agadi na-efe Jehova mara ezigbo mma ma na-eme nke ọma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 2)


3. Olee otú Jehova sirila jiri ndị agadi mee uche ya?

3 Nká anaghị eme ka Jehova gharazie iji mmadụ kpọrọ ihe.a Ọtụtụ mgbe, Jehova na-eji ndị agadi eme uche ya. Dị ka ihe atụ, Sera akatala ahụ́ mgbe Jehova gwara ya na ọ ga-abụ nne nnukwu mba nakwa na Mezaya ga-esi n’agbụrụ ya. (Jen. 17:15-19) Mosis akatala ahụ́ mgbe Jehova dunyere ya ka ọ gaa si n’Ijipt kpọpụta ndị Izrel. (Ọpụ. 7:6, 7) Jọn onyeozi emeekwala agadi mgbe Jehova mere ka o dee akwụkwọ ise dị na Baịbụl.

4. Dị ka e kwuru n’Ilu 15:15, gịnị nwere ike inyere ndị agadi aka ịna-edi nsogbu ndị ha na ime agadi na-eso? (Kọwaakwa foto.)

4 E nwere ọtụtụ nsogbu ha na nká na-eso. Otu nwanna nwaanyị ji egwuregwu sị: “Ime agadi abụghị agwọ e ji akpụka mma egbu.” Ma, ọ bụrụ na onye agadi ana-enwe ọṅụ,b ọ ga-edili nsogbu ndị ha na nká so. (Gụọ Ilu 15:15.) N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe ndị agadi ga-eme ka ha na-enwe ọṅụ. Anyị ga-elebakwa anya n’ihe ụmụnna ga-eme iji nyere ndị agadi aka n’ọgbakọ ha. Ka anyị buru ụzọ kwuo gbasara ihe mere o nwere ike iji esiri anyị ike ịna-enwe ọṅụ ma anyị mewe agadi.

Ebe di na nwunye ahụ e gosiri na foto bu ụzọ ji ibe ha aka na-amụmụ ọnụ ọchị ka ha nọ n’okpuru osisi nwere okooko mara mma.

Inwe ọṅụ ga-enyere ndị agadi aka idi nsogbu ha na ime agadi so (A ga-akọwa ya na paragraf nke 4)


IHE MERE O NWERE IKE IJI SIE IKE ỊNA-ENWE ỌṄỤ MA ANYỊ MEWE AGADI

5. Gịnị nwere ike ime ka obi ghara ịna-adị ụfọdụ ndị agadi mma?

5 Gịnị nwere ike ime ka obi ghara ịna-adị gị mma? Obi nwere ike ịna-ajọ gị njọ maka na ị naghịzi emeli ihe ị na-emebu. O nwere ike ịna-adị gị ka ya bụrụ na ị ka bụ okorobịa ma ọ bụ agbọghọbịa nakwa na ahụ́ ka gbasiri gị ike. (Ekli. 7:10) Dị ka ihe atụ, otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Ruby sịrị: “Ọ na-esiri m ike mgbe ụfọdụ iyiri efe maka na anaghịzi m emegharị ahụ́ otú m na-emebu. Ahụ́ niile na-egbukwa m mgbu. Obere ihe, dị ka iwelite ụkwụ yiri sọks, na-esiri m ike. Aka m na-egbu m ezigbo mgbu, mkpịsị aka m anaghịkwa ekwe m mee ihe m chọrọ ime.” Otu nwanna aha ya bụ Harold jeburu ozi na Betel. Ọ sịrị: “Iwe na-ewe m mgbe ụfọdụ maka na anaghịzi m emeli ihe ndị m na-emebu. M na-awụbu gam gam. Ịkụ bezbọl na-atọkwa m ezigbo ụtọ. N’oge ahụ, ndị ọzọ na-asịkarị, ‘Nye Harold bọl ahụ n’ihi na ọ ga-akụta ya.’ Ma ugbu a, echeghị m na m ga-enwedị ike ịtụrụ mmadụ bọl ahụ.”

6. (a) Olee ihe ọzọ nwere ike ime ka ike na-agwụ ụfọdụ ndị agadi? (b) Olee ihe nwere ike inyere ndị agadi aka ikpebi ma hà ga-akwụsị ịnya ụgbọala ka hà ka ga na-anya? (Kwuo ihe dị n’isiokwu bụ́ “M̀ Kwesịrị Ịkwụsị Ịnya Ụgbọala?” dị n’Ụlọ Nche a.)

6 Ike nwere ike ịna-agwụ gị n’ihi na ị naghịzi emeli ihe ndị ị na-emeburu onwe gị. O nwere ike ịkacha dịrị gị otú ahụ ma ọ bụrụ na ọ bụzi onye ọzọ na-elekọta gị ma ọ bụ na otu n’ime ụmụ gị kpọọrọ gị. O nwekwara ike ịbụ na ị naghịzi anyali ụgbọala ma ọ bụ gaa ebe ndị ị chọrọ ịga n’onwe gị n’ihi na ahụ́ esichaghịzi gị ike ma ọ bụ na ị naghịzi ahụcha ụzọ. Ụdị ihe ahụ na-agbawa obi. Ma, ihe nwere ike inyere anyị aka bụ icheta na ihe na-eme ka Jehova ma ọ bụ ndị ọzọ jiri anyị kpọrọ ihe abụghị na anyị bi naanị anyị, na anyị na-elekọtali onwe anyị, ma ọ bụ na anyị na-anyali ụgbọala. Ka obi sie anyị ike na Jehova ghọtara otú obi dị anyị. Ihe dị ya mkpa bụ ụdị mmadụ anyị bụ, ya bụ na anyị ji obi anyị niile hụ ya na ụmụnna anyị n’anya.​—1 Sam. 16:7.

7. Gịnị nwere ike inyere gị aka ma obi na-ajọ gị njọ maka na e nwere ike ị gaghị anọ ndụ e bibie ụwa ochie a?

7 Obi nwere ike ịna-ajọ gị njọ ma i cheta na o nwere ike ị gaghị anọ ndụ e bibie ụwa ochie a. Ọ bụrụ na ọ dị gị otú ahụ, gịnị nwere ike inyere gị aka? Gbalịa na-echeta na Jehova na-enwe ndidi ugbu a tupu ya ebibie ụwa ochie a. (Aịza. 30:18) Ma, ndidi ya abụghị na nkịtị. Ndidi ya na-eme ka ọtụtụ nde mmadụ nwee ohere ịbịa mata ya ma fee ya. (2 Pita 3:9) N’ihi ya, obi jọwa gị njọ, gbalịa na-echeta otú ndidi Jehova ga-esi baara ọtụtụ ndị uru tupu ya ebibie ụwa ochie a. Ònye ma ma ụfọdụ n’ime ndị ahụ hà ga-abụ ndị ezinụlọ gị?

8. Olee nsogbu nká nwere ike ịkpatara ndị agadi?

8 N’agbanyeghị afọ ole anyị dị, ọ bụrụ na ahụ́ adịghị anyị, anyị nwere ike ikwu ma ọ bụ mee ihe anyị ga-akwara mmakwaara. (Ekli. 7:7; Jems 3:2) Dị ka ihe atụ, mgbe Job na-ata ahụhụ, o kwuru “okwu n’echeghị echiche.” (Job 6:1-3) Ihe ọzọ bụ na ọrịa nwere ike ime ka ndị agadi kwuo ihe ha na-anaghị ekwubu ma ọ bụ mee ihe ha na-anaghị emebu. O doro anya na e nweghị onye n’ime anyị kwesịrị ịkpachara anya rụsa mmadụ arụrụala ma ọ bụ tụọ anya ka a na-emere ya ihe mgbe niile naanị n’ihi na ọ katala ahụ́ ma ọ bụ na ahụ́ adịghị ya. Ọ bụrụ na anyị achọpụta na anyị gwara mmadụ okwu ọjọọ, anyị kwesịrị ịrịọ ya mgbaghara n’egbughị oge.​—Mat. 5:23, 24.

OTÚ Ị GA-ESI NA-ENWE ỌṄỤ

Alaka osisi nwere okooko mara mma; obere foto ndị dị na ya na-egosi ihe ndị dị iche iche ga-enyere ụmụnna merela agadi aka ịna-enwe obi ụtọ. E kwuru gbasara foto ndị ahụ na paragraf nke 9 ruo na nke 13.

Gịnị ga-enyere gị aka ịna-enwe ọṅụ n’agbanyeghị nsogbu ndị ha na nká so? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 9 ruo na nke 13)


9. Gịnị mere i ji kwesị ikwe ka ndị ọzọ nyere gị aka? (Kọwaakwa foto.)

9 Kwe ka ndị ọzọ nyere gị aka. (Gal. 6:2) O nwere ike isiri gị ike ná mmalite. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Gretl sịrị: “Ọ na-esiri m ike mgbe ụfọdụ ikwe ka e nyere m aka n’ihi na m na-eche na ọ bụ inye ndị ọzọ nsogbu. O gburu m oge ịgbanwe echiche m ma kweta na m kwesịrị ikwe ka ndị ọzọ nyere m aka.” I kwe ka ndị ọzọ nyere gị aka, ọ pụtara na ị na-ekwe ka ha nwee ọṅụ inye ndị ọzọ ihe na-eme ka mmadụ nwee. (Ọrụ 20:35) O doro anya na obi ga-adị gị ụtọ ịhụ otú ndị ọzọ hụruru gị n’anya ma na-eche banyere gị.

Ebe otu nwanna nwaanyị merela agadi ji otu nwanna nwaanyị na-eto eto aka mgbe ha na-azụ ihe.

(A ga-akọwa ya na paragraf nke 9)


10. Gịnị mere i ji kwesị icheta ikele onye meere gị ihe ọma? (Kọwaakwa foto.)

10 Na-ekele onye meere gị ihe. (Kọl. 3:15; 1 Tesa. 5:18) Obi na-adị anyị ụtọ ma e meere anyị ihe ọma. Mana, anyị nwere ike ichefu ikele onye meere anyị ya. Ma, ọ bụrụ na anyị amụmụọrọ onye ahụ ọnụ ọchị ma kelee ya, anyị na-eme ka ọ ghọta na anyị ji ya kpọrọ ihe. E nwere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Leah. Ọ na-elekọta ndị agadi na Betel. Ọ sịrị: “Otu n’ime ụmụnna nwaanyị m na-elekọta na-ede obere ihe n’akwụkwọ iji kelee m. Ihe ndị ọ na-ede anaghị eto ogologo, ma ha na-eru m n’obi. Ịgụ ha na-atọ m ụtọ. Ha na-eme ka m mata na o ji aka m na-enyere ya kpọrọ ihe.”

Ebe otu nwanna nwaanyị merela agadi na-ede ihe na kaadị o ji ekele onye meere ya ihe.

(A ga-akọwa ya na paragraf nke 10)


11. Olee otú i nwere ike isi nyere ndị ọzọ aka? (Kọwaakwa foto.)

11 Gbalịa na-enyere ndị ọzọ aka. Ọ bụrụ na i jiri oge gị na ike gị na-enyere ndị ọzọ aka, o nwere ike ime ka ị ghara ịna-eche banyere nsogbu nke gị. E nwere ike iji ndị agadi tụnyere ọ́bá akwụkwọ ihe juru ya bụ akwụkwọ ga-akụziri gị ezigbo ihe. Mana, akwụkwọ agaghị anọ ebe e dowere ya n’ọ́bá akwụkwọ na-akụziri mmadụ ihe ma ọ bụ na-akọrọ ya akụkọ. N’ihi ya, gbalịa na-akọrọ ndị na-eto eto ihe ị ma ka ha si na ya mụta ihe. Na-ajụ ha ajụjụ, na-egekwa ha ntị ma ha zawa gị ya. Kụziere ha ihe mere irubere Jehova isi ji aba uru mgbe niile, na-emekwa ka mmadụ nwee obi ụtọ. O doro anya na obi ga-adị gị ezigbo ụtọ ma ị na-akasi ndị enyi gị na-eto eto obi ma na-agba ha ume.​—Ọma 71:18.

Ebe otu nwanna merela agadi na-ege ntị ka otu nwanna bụ́ okorobịa na-akọrọ ya obi ya.

(A ga-akọwa ya na paragraf nke 11)


12. Dị ka e kwuru n’Aịzaya 46:4, gịnị ka Jehova kwere ndị agadi ná nkwa? (Kọwaakwa foto.)

12 Kpee ekpere ka Jehova nye gị ike. Ike nwere ike ịgwụ gị ma ọ bụ gị adaa mbà. Ma Jehova ‘anaghị ada mbà, ike anaghịkwa agwụ ya.’ (Aịza. 40:28) Gịnị ka Jehova na-eji ike ya na-anaghị agwụ agwụ eme? Otu ihe o ji ya eme bụ ịgba ndị agadi ji obi ha niile na-efe ya ume. (Aịza. 40:29-31) N’eziokwu, o kwere nkwa inyere ha aka. (Gụọ Aịzaya 46:4.) Jehova na-emezu nkwa ya mgbe niile. (Josh. 23:14; Aịza. 55:10, 11) Ọ bụrụ na i kpee ekpere ma ghọta na Jehova hụrụ gị n’anya ma na-akwado gị, obi ga-adị gị ezigbo ụtọ.

Ebe otu nwanna merela agadi na-ekpe ekpere.

(A ga-akọwa ya na paragraf nke 12)


13. Dị ka e kwuru ná 2 Ndị Kọrịnt 4:16-18, gịnị ka anyị kwesịrị icheta? (Kọwaakwa foto.)

13 Cheta na ị gaghị abụ agadi ruo mgbe ebighị ebi. Ọ bụrụ na anyị echeta na nsogbu bịaara anyị agaghị adịte aka, o nwere ike ịdịrị anyị mfe idi ya. Baịbụl kwere anyị nkwa na nká na ọrịa agaghị adịte aka. (Job 33:25; Aịza. 33:24) N’ihi ya, ka obi dị gị ụtọ ebe ọ bụ na ị ma na ọ bụ n’ọdịnihu ka ị ga-agbasi ike karịa otú ị gbasitụrụla. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 4:16-18.) Ma, olee otú ndị ọzọ ga-esi enye aka?

Ebe otu nwanna nwaanyị mere agadi nọ n’ígwè ndị ngwọrọ na-agụ Baịbụl. Ọ na-ahụ onwe ya na Paradaịs mgbe ọ ghọrọ agbọghọbịa si n’ígwè ndị ngwọrọ ahụ bilite na-apụ.

(A ga-akọwa ya na paragraf nke 13)


OTÚ NDỊ ỌZỌ NWERE IKE ISI ENYE AKA

14. Gịnị mere anyị ji kwesị ịga leta ndị agadi ma ọ bụ kpọọ ha n’ekwentị?

14 Na-aga eleta ụmụnna mere agadi mgbe niile, na-akpọkwa ha n’ekwentị. (Hib. 13:16) Obi nwere ike ịna-ajọ ndị agadi njọ n’ihi na naanị ha na-anọkarị. Otu nwanna na-anaghị apụta èzí aha ya bụ Camille sịrị: “M na-anọ n’ụlọ si n’ụtụtụ ruo n’abalị. N’ihi ya, ike na-agwụkarị m. Mgbe ụfọdụ, ọ na-adị m ka à tụrụ m mkpọrọ. Ahụ́ anaghị eru m ala, iwe ana-ewekwa m.” Anyị gaa leta ndị agadi, ọ na-eme ka obi sie ha ike na anyị ji ha kpọrọ ihe nakwa na anyị hụrụ ha n’anya. Anyị nwere ike icheta oge anyị chọrọ ịkpọ onye agadi nọ n’ọgbakọ anyị n’ekwentị ma ọ bụ gaa leta ya, mana anyị emechaghị mee ya. Anyị niile na-eji ọrụ n’aka. N’ihi ya, gịnị ga-enyere anyị aka ‘ịna-achọpụta ihe ndị ka mkpa,’ ma ileta ndị agadi? (Fil. 1:10) Otu ihe ga-enyere gị aka bụ idenye ya na kalenda gị ka i nwee ike icheta izigara ndị agadi nọ n’ọgbakọ unu ozi n’ekwentị ma ọ bụkwanụ ịkpọ ha. I nwekwara ike iyi oge ị ga-aga leta ha. Echekwala mgbe ohere dapụtara.

15. Gịnị ka ndị agadi na ndị na-akatabeghị ahụ́ nwere ike imekọ ọnụ?

15 Ọ bụrụ na ị katabeghị ahụ́, i nwere ike ịna-eche ihe gị na ndị agadi nwere ike ikwurịta ma ọ bụ imekọ ọnụ. Ma, echegbula onwe gị. Bụrụgodị ezigbo enyi ha. (Ilu 17:17) Wepụta oge ka gị na ndị agadi kwurịta okwu tupu ọmụmụ ihe ebido ma ọ bụkwanụ mgbe a gbasara. I nwere ike ịjụ ha amaokwu Baịbụl kacha amasị ha ma ọ bụ ihe na-atọ ọchị ha mere mgbe ha dị obere. I nwere ike ịkpọ ha ka ha soro gị lee Ihe Omume Tiivi Ndịàmà Jehova. I nwekwara ike imere ha ihe ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ilere ha ma ekwentị ha ma ọ bụ tablet ha ọ̀ na-arụ ọrụ nke ọma ma ọ bụkwanụ gị etinyere ha akwụkwọ ndị batara ọhụrụ e ji amụ ihe. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Carol sịrị: “Gwa ha ka gị na ha soro mee ihe ụfọdụ na-amasị gị. Ọ bụ eziokwu na mụ akatatụla ahụ́, m ka chọkwara ịna-ekpori ndụ. M chọrọ ịna-aga azụ ihe, mụ na ndị enyi m irikọ nri, nakwa ikiri ihe ndị magburu onwe ha Jehova kere.” Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Maira sịrị: “E nwere otu onye agadi bụ́ enyi m dị afọ iri itoolu. O ji afọ iri ise na asaa tọ m. Ma, m na-echefukarị na ọ tọruru m otú ahụ n’ihi na anyị na-achịkọ ọchị, na-elekọkwa fim. Otu onye nwee nsogbu, ya agwa ibe ya ka ọ tụọrọ ya aro.”

16. Gịnị mere o nwere ike iji adị mma ka anyị soro ndị agadi gaa ụlọ ọgwụ?

16 Soro ha gaa ụlọ ọgwụ. E wepụ ibu ndị agadi aga ụlọ ọgwụ, i nwekwara ike ijide n’aka na ndị na-arụ n’ụlọ ọgwụ na-emeso ha otú dị mma, na-elebakwara ha anya otú o kwesịrị. (Aịza. 1:17) Ihe ọzọ i nwere ike ime bụ ịna-edetu ihe dọkịta na-ekwu. Otu nwanna nwaanyị mere agadi aha ya bụ Ruth sịrị: “Ọtụtụ ugboro, naanị m gaa ụlọ ọgwụ, ndị dọkịta anaghị ekweta ihe m na-agwa ha. Ha nwere ike ịsị, ‘Ị na-eme ka è nwere ihe na-arịa gị, ma nke bụ́ eziokwu bụ na e nweghị ihe na-eme gị.’ Ma, ọ bụrụ na mmadụ esoro m gaa, ha na-aka elebara m anya. M na-ekele ụmụnna m maka otú ha si ewepụta oge ha na-eso m aga ụlọ ọgwụ.”

17. Gịnị ka anyị nwere ike ime ka anyị na ndị agadi rụọ n’ozi ọma?

17 Gị na ha na-arụ n’ozi ọma. O nwere ike isiri ụfọdụ ndị agadi ike ịga ozi ụlọ n’ụlọ. Ma, i nwere ike ịgwa nwanna nwaanyị mere agadi ka o soro gị jiri ihe nkwagharị kwusaa ozi ọma. I nwedịrị ike iwetara ya oche ka ọ nọrọ. I nwekwara ike ịgwa nwanna nwoke mere agadi ka o soro gị gaa mụọrọ mmadụ Baịbụl ma ọ bụkwanụ gị akpọrọ onye ị na-amụrụ ihe gaa na nke ya mụọrọ ya ihe. Ndị okenye nwere ike ịhazi ka a nọrọ na nke ụmụnna mere agadi mee nzukọ ozi ubi ka o nwee ike ịdịrị ha mfe iso kwusaa ozi ọma. Obi ga-adị Jehova ụtọ ma anyị gbalịa ike anyị na-akwanyere ndị agadi ùgwù.​—Ilu 3:27; Rom 12:10.

18. Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu na-eso nke a?

18 E chetarala anyị na Jehova hụrụ ndị agadi n’anya ma jiri ha kpọrọ ihe. Anyịnwa bụ́ ụmụnna ha jikwa ha kpọrọ ihe. Ịbụ agadi adịghị mfe. Ma, n’enyemaka Jehova, ị ga-enweli ọṅụ. (Ọma 37:25) Obi ga-adịkwa gị ụtọ ma i cheta na ọ bụ n’ọdịnihu ka ị ga-agbasi ike karịa otú ị gbasitụrụla. Mana, e nwere ndị nke ọrụ ha bụ ilekọta onye ezinụlọ ha merela agadi ma ọ bụ nwa ha ma ọ bụkwanụ enyi ha ahụ́ na-adịghị. Gịnị ga-enyere ha aka ịna-enwe ọṅụ? Anyị ga-aza ajụjụ a n’isiokwu na-eso nke a.

GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

  • Gịnị nwere ike ime ka ụmụnna anyị ndị mere agadi ghara ịna-enwe ọṅụ?

  • Olee otú ndị agadi nwere ike isi na-enwe ọṅụ?

  • Olee otú anyị nwere ike isi na-enyere ndị agadi nọ n’ọgbakọ anyị aka?

ABỤ NKE 30 Nna M, Chineke M na Enyi M

a Lee vidio bụ́ Ndị Agadi, Unu Bara Uru n’Ọgbakọ. Ọ dị na jw.org nakwa na JW Library®.

b NKỌWAKWU: Ọṅụ so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ. (Gal. 5:22) Ihe ga-eme ka anyị na-enwe ezigbo ọṅụ bụ ma anyị na Jehova dịrị ná mma.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya