Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe n’Ọgọst: Ndị nkwusa nwere ike inyefe nke ọ bụla e nwere n’ime broshuọ ndị a dị peeji 32: Aha Nsọ Ahụ Nke Ga-adịru Ebighị Ebi, Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?, Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?, Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?, Idi Ndụ n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi!, Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!, Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ, Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ—Hà Pụrụ Inyere Gị Aka ka ọ̀ bụ Imerụ Gị Ahụ? Hà Dị Adị n’Ezie?, na Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi—Ị̀ Chọtawo Ya? Nyefee broshuọ ọ bụla merela ochie unu nwere n’ọgbakọ. Septemba: Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Gbalịa ka ị malitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl n’ụbọchị mbụ i ziri ha ozi ọma. Ọktoba: Magazin Ụlọ Nche na Teta! E nwee onye gosiri mmasị, nye ya traktị bụ́ Ị̀ Chọrọ Ịma nke Bụ́ Eziokwu?, gbalịakwa ịmalitere onye ahụ ọmụmụ Baịbụl. Nọvemba: Baịbụl—Gịnị Ka Ọ Na-ekwu? E mechaa, anyị ga-agwa unu ihe niile gbasara otú a ga-esi ekesa broshuọ a a ga-ekesa n’ụwa niile. Ka unu na-enyefe broshuọ ọhụrụ a, na-enyefekwanụ broshuọ ndị a: Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ—Hà Pụrụ Inyere Gị Aka ka ọ̀ bụ Imerụ Gị Ahụ? Hà Dị Adị n’Ezie?, Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!, na Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi—Ị̀ Chọtawo Ya?
◼ Malite n’ọnwa Septemba afọ a, isiokwu okwu ihu ọha ndị nlekọta sekit ga na-ekwu bụ, “Wepụ Anya Gị n’Ihe Na-abaghị Uru!”
◼ N’okpuru ebe a, ị ga-ahụ mgbanwe ndị e merela maka ebe ndị a ga-anọ enwe Mgbakọ Distrikti nke afọ 2010/2011:
Nọvemba 26-28, 2010
BADAGRI 9 (Bekee)
BINI SITI 9 (Asụsụ Ogbi)
Disemba 3-5, 2010
BADAGRI 10 (Asụsụ Ogbi)
BINI SITI 10 (Edo)
Jenụwarị 7-9, 2011
ULI 12 (Asụsụ Ogbi)