Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Septemba 6
IZU NA-AMALITE NA SEPTEMBA 6
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: 2 Ndị Eze 12-15
Nke 1: 2 Ndị Eze 13:1-11
Nke 2: Ụzọ Ndị Anyị Nwere Ike Isi Nweta Mmụọ Nsọ
Nke 3: Otú Ndị Kraịst Si Ele Ememme Anya (td 43A)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma ọkwa.
Nkeji 10: Malitere Mmadụ Ọmụmụ Baịbụl n’Ụbọchị Mbụ I ziri Ya Ozi Ọma n’Ọnwa Septemba. Okwu ọkà okwu na ndị na-ege ntị ga-atụle. N’ọnwa Septemba, anyị ga-enyefe akwụkwọ Bible Na-akụzi, anyị ga-agbalịkwa ka anyị na onye anyị nyere akwụkwọ ahụ tụlee otu paragraf ma ọ bụ abụọ n’ụbọchị ahụ anyị nyere ya akwụkwọ ahụ. Gị na ndị na-ege ntị kwurịta otú e nwere ike isi mee ya. Gwa otu onye nkwusa ma ọ bụ ndị nkwusa abụọ ka ha mee ihe ngosi otú e nwere ike isi mee ya.
Nkeji 10: Lezie Anya Maka Ndị Amụma Ụgha. Okwu si n’Ụlọ Nche Febụwarị 1, 1992, peeji nke 3-7.
Nkeji 10: Mee Ka Uru Ozi Ọma Ị Na-ezi Bara Pụta Ìhè. Okwu ọkà okwu na ndị na-ege ntị ga-atụle, nke si n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 159. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ihe na-echegbu ndị bi n’ókèala unu. Gwakwa ha ka ha kwuo otú ha nwere ike isi jiri ihe ndị ahụ na-echegbu ha zie ha ozi ọma.