Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 9/15 p. 30-31
  • Ihe Mere Réunion Ji Nwee Ọtụtụ Ụlọ Nzukọ Alaeze

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Mere Réunion Ji Nwee Ọtụtụ Ụlọ Nzukọ Alaeze
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Gịnị Mere E Ji Nwee Ọtụtụ Ụlọ Nzukọ Alaeze?
  • E Meriri Ihe Mgbochi Dị Iche Iche
  • Ọ Bụ Jehova Ka Otuto Dịịrị
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 9/15 p. 30-31

Ihe Mere Réunion Ji Nwee Ọtụtụ Ụlọ Nzukọ Alaeze

IHE dị ka 400 maịlụ [640 kilomita] n’ebe ọwụwa anyanwụ Madagascar, agwaetiti nta nke Réunion na-ebilite na mberede n’ime mbara oké osimiri Indian Ocean ahụ. Ọ bụ ezie na ọ dị nanị 40 maịlụ [60 kilomita] n’ogologo na 30 maịlụ [50 kilomita] n’uhie, ihe e ji mara agwaetiti ahụ bụ volcano [ugwu ndị na-agbọpụta ọkụ site n’ime ala] dị iche iche na ọkụ ha na-agbọpụta site n’oge ruo n’oge. Ugwu nke kasị elu, nke ji 10,069 amaụkwụ [3,069 mita] karịa ọtụtụ elu mmiri, bụ volcano ahụ nke na-adịghị arụkwa ọrụ, bụ́ Piton des Neiges (Elu Ugwu nke Snow). N’ebe ndịda ọwụwa anyanwụ nke agwaetiti ahụ ka e nwere volcano ahụ na-arụ ọrụ nke dị 8,612 amaụkwụ [2,625 mita], nke a kpọrọ aha ahụ kwesịrị ekwesị bụ Piton de la Fournaise (Elu Ugwu nke Ọdọ Ọkụ). Lee nnọọ ihe nkiri mara oké mma ọ bụ ma ọ bụrụ na ọ gbọpụta ọkụ n’abalị! Ọtụtụ okporo ụzọ gara gburugburu oké ndagwurugwu dị iche iche, na-eme ka e nwee ihe nkiri mara mma nke ihe ahụ a kpọworo ịma mma dị egwu nke Réunion.

Gịnị Mere E Ji Nwee Ọtụtụ Ụlọ Nzukọ Alaeze?

Otú ọ dị, ezi ịma mma nke Réunion dabeere n’ụzọ ọtụtụ ndị bi n’agwaetiti ahụ si azaghachi ‘n’ozi ọma alaeze’ ahụ nke Ndịàmà Jehova na-akpọsa. (Matiu 24:14) Ọrụ nkwusa ha malitere na 1960, mgbe mmadụ abụọ na-eje ozi oge nile si France bịarute. Ugbu a, mgbe 30 afọ gasịworo, 1,665 Ndịàmà nọ n’ọrụ na-agbasa ozi Alaeze ahụ n’etiti 582,000 ndị bi n’ebe ahụ—nkezi nke 1 Onyeàmà n’isi 350 mmadụ ọ bụla nọ n’agwaetiti ahụ.

Ito uto dị otú ahụ emewo ka ọ dị mkpa iwu ebe ndị kwesịrị ekwesị ịnọ na-enwe nzukọ ka Ndịàmà ahụ wee nwee ike ime ihe ndị metụtara ofufe na ọrụ ozizi ihe ime mmụọ ha. (Ndị Hibru 10:24, 25) Ka ọ dị ugbu a, 13 n’ime 19 ọgbakọ ndị dị na Réunion ewuwo Ụlọ Nzukọ Alaeze nke ha. N’ihi oké ifufe a na-enwekarị n’akụkụ ebe a, ụlọ ndị a bụ ụlọ ndị e ji simenti wusie ike, ndị chọkwara itinye ogologo oge—na mmefu ego—iji wee wuo. Ya mere, olee otú o siworo kwe omume iwu ụlọ nzukọ ndị dị otú ahụ, ebe ọ bụ na ihe ka ọtụtụ ná Ndịàmà nọ n’agwaetiti a na-erite ụgwọ ọnwa ndị na-ebughị oké ibu, nweekwa ezinụlọ buru ibu ndị ha na-akwado? N’iji okwu dị na Bible mee ihe, azịza ya bụ na ‘aka Jehova adịghị mkpụmkpụ.’—Aịsaịa 59:1.

E Meriri Ihe Mgbochi Dị Iche Iche

Dị ka ihe atụ, tụlee otú Jehova si kpalie obi ụmụ mmadụ inye aka n’owuwu nke Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ dị n’obodo nta nke Saint-Louis, nke dị n’ebe ndịda ọwụwa anyanwụ nke Réunion. Mgbe mbụ a kwadosiri atụmatụ ihe owuwu ndị e mere, otu Onyeàmà ka na-eto eto gwara onye na-akụziri ha ọrụ owuwu ihe n’ụlọ akwụkwọ na a gaje iji ọrụ afọ ofufo wuo otu Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ọ bụghị nanị na onye nkuzi ahụ wepụtara onwe ya, kama ọ kpọrọkwara ụmụ klasị ahụ dum bịa igwu ntọala ụlọ ahụ. O mesịrị nye onyinye nke ígwè dị mkpa iji wuo ntọala ahụ.

Mgbe ihe karịrị otu narị ndị ọrụ afọ ofufo gbakọtara n’otu ụbọchị ezumike ndị ọrụ maka iwu kọnkịrị na mbara ala dị ihe dị ka 2,000 square amaụkwụ [190 square mita], ọ bụụrụ ha ihe ijuanya ịhụ na ndị obodo akpọchiwo mmiri. Olee otú ha ga-esi gwaa kọnkịrị ahụ n’ejighị mmiri? Otu n’ime ndị ọrụ ahụ, onye maara onyeisi ndị ọrụ na-emenyụ ọkụ ọgbụgba, kpebiri na ya ga-eje kọwaara nwoke nke a nwere obi ọma ihe isi ike ha nọ na ya. Mgbe nwa oge gasịrị, otu nnukwu moto ndị na-emenyụ ọkụ bịarutere n’ihu ọrụ ahụ. Moto ahụ bu mmiri zuru nnọọ ezu maka ọrụ ahụ, ụlọ ọrụ ndị mmenyụ ọkụ ahụ kwekwara ka moto ahụ nọgide ebe ahụ ogologo ụbọchị ahụ dum! N’ụzọ kwere nghọta, a kpaliri ndị ọrụ afọ ofufo ahụ dum itinye obi ha dum n’ọrụ ahụ.

Enyemaka Jehova pụtara ìhè n’ụzọ e sikwa merie ihe mgbochi ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, n’otu oge n’owuwu ihe ahụ, e dozisịwo ùkó ụlọ ahụ maka 22 ọkụ pụrụ iche a chọrọ itinye na ya, bụ́ ndị a tụworo ọda ha ọnwa asatọ tupu mgbe ahụ. Ma ụlọ ọrụ ahụ gwara ụmụnna ahụ na a kwụsịwo imepụta ụdị ọkụ ahụ ha chọrọ. Gịnị ka a pụrụ ime? Ọ̀ ga-adị mkpa ịgbanwe atụmatụ ahụ dum na ùkó ụlọ ahụ a rụworo arụ? Ee e, n’ihi na kpọmkwem n’oge kwesịrị ekwesị, ụmụnna ahụ nụrụ banyere otu onye ọrụ ngó bi n’ebe ahụ onye nwere ụdị ọkụ ahụ nke ọ chọburu iji rụọ otu ọrụ nke ọ na-emechaghị nweta.

A jụrụ ya, sị, ‘Ole ka i nwere?’

Ọ zara, sị, ‘Ihe dị ka 25.’

N’egbughị oge ọzọ, a zụtara ma tinye ọkụ ndị ahụ.

Ka ọrụ ahụ nọ na-aga n’ihu, otu onye nke ka malitere ọhụrụ iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible nwere mmasị dị ukwuu n’ọmarịcha ụlọ ahụ.

Ọ sịri, ‘Gwanụ m, ọ̀ dị ihe ọ bụla ọzọ dị unu mkpa?’

Otu nwanna zara, sị, ‘Ee. Anyị chọrọ inweta ígwè na-ekwu okwu.’

Mgbe ọ nụrụ nke ahụ, onye a nwere mmasị ọhụrụ wepụtara akwụkwọ cheeki ya ozugbo wee nye onyinye nke ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ego ga-ezu iji zụta usoro ígwè na-ekwu okwu ọhụrụ. Onyinye ndị dị otú ahụ tinyekwara ego mgbazinye isi ụlọ ọrụ Watch Tower Society dị na United States ji afọ ofufo gbazinye ọgbakọ ahụ nyeere ha aka iwucha Ụlọ Nzukọ Alaeze ọma nke a.

Iji tube ihe a nile ugo, Ọgbakọ Saint-Louis ahụ nwere ọṅụ n’ihi na Nwanna Carey W. Barber, onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova bịara wee rara Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ nye na December 1988. E mere ndokwa ka Nwanna Barber si n’isi ụlọ ọrụ Society dị na Brooklyn, New York, bịa ịrara alaka ụlọ ọrụ ọhụrụ dị n’agwaetiti agbata obi ha bụ Mauritius nye. Mgbe ụmụnna nọ na Saint-Louis nụrụ banyere nke a, n’ime nanị izu atọ, ha tụkọtara ego zuru iji gbaara ya na otu nwanna so na Kọmitii Alaka ụlọ ọrụ nke Mauritius ụgbọ elu site Mauritius bịa Réunion. N’ihi ito uto e nweworo eri mgbe ahụ, ọ dịwo mkpa ka ọgbakọ Saint-Louis kewaa. Ugbu a, ọgbakọ abụọ na-ekerịta Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ.

Ọ Bụ Jehova Ka Otuto Dịịrị

Gịnị banyere ọgbakọ ndị ọzọ dị na Réunion? N’ihi nzaghachi ọma a na-enweta n’ọrụ nkwusa Alaeze ahụ, ọnụ ọgụgụ ndị na-abịa nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị ahụ abụwo site na 150 ruo 200 pasenti nke ọnụ ọgụgụ Ndịàmà Jehova nọ n’agwaetiti ahụ. Ya mere, o doro anya ihe mere o ji dị mkpa inwe ọtụtụ Ụlọ Nzukọ Alaeze na Réunion. N’eziokwu, e wuwo atọ ndị ọzọ kemgbe e wusịrị nke ahụ dị na Saint-Louis, nke ahụ emewokwa ka ọnu ọgụgụ ahụ bịaruo 13 maka 19 ọgbakọ dị n’agwaetiti ahụ.

Ọ bụ Jehova ka otuto dịịrị maka ihe a nile, bụ́ onye buru amụma, sị: ‘Onye nta n’etiti ha ga-aghọ [otu puku], onye dịkarịsịrị nta ga-aghọkwa mba nwere ume: mụ onwe m, Jehova, ga-eme ka ọ bịa ọsọ ọsọ na mgbe ya.’ (Aịsaịa 60:22) Dị ka ọ dị n’akụkụ ụwa ndị ọzọ, amụma nke a emezuwo n’ọmarịcha agwaetiti nke a.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya