Nchịkọta nke Ihe Ọmụma Bara Ụba
Otú a ka ndị na-agụ Ụlọ Nche na Teta! na-esi ele magazin ndị a anya.
Mgbe ọ na-ede akwụkwọ n’aha ya onwe ya na ezinụlọ ya, otu nwoke si Philippines kelere Watch Tower Bible and Tract Society maka izitere ha mbipụta ndị gaworo aga, na-asị:
‘Dị ka ọ na-adị ná mbipụta nke ọ bụla nke magazin unu, ha na-enwe ihe ọmụma dị nnọọ ukwuu. Ọ bụghị nanị na ha na-eme ka e nwekwuo nghọta n’ihe banyere okpukpe, kama ha na-elebazi anya n’ihe ndị dị ka sayensị, ọgwụ na ahụ ike, akụkọ ihe mere eme, ọchịchị, na asụsụ. O yiri ka mbipụta nke ọ bụla na-enwe nnọọ isiokwu ndị na-amasị anyị n’ụzọ pụrụ iche.
‘Achọkwara m ikwu na anyị emewo ka a dụkọta mbipụta ochie nile anyị nke Ụlọ Nche na Teta! Anyị nwere ugbu a mpịakọta anọ dị otú ahụ ndị dị n’ebe ndebe akwụkwọ ezinụlọ anyị. Ha bụ ihe izo aka magburu onwe ha, anyị na-ejikwa ha eme ihe mgbe mgbe maka ndụmọdụ na mkpali bara uru.’
A pụrụ ịdị na-ezitere gị Ụlọ Nche na Teta! n’ụlọ gị. Nke a bụ akụkụ nke ọrụ nkuzi Bible zuru ụwa ọnụ, nke e ji onyinye afọ ofufo na-akwado.
Biko ziterenụ m ụtụ otu afọ, nke magazin Ụlọ Nche na Teta! (Degara address ahụ dị n’okpuru akwụkwọ maka ịmatakwu ihe banyere nke a.)