Ịghọta Ihe Di n’Akụkọ
Ikwupụta Amamikpe Ọbara Ha
Shingen Hosokawa, bụ odeakwụkwọ ukwu nke ulọ ọru Temple Office of the Buddhist True Pure Land Otani Sect na Japan, kwetara, sị, ‘Anyị kpọrọ agha ahụ [Agha ụwa nke Abụọ] agha dị nsọ wee dupụkwa ndị mmadụ gaa n’ihu agha. Ọ dịghị ihe ọzọ anyị pụrụ ime ma ọ bụghị ịbụ ndị ihere rikpuru n’ihu Buddha ahụ dị nsọ.’ N’otu ‘Ememe Ncheta maka Ndị Nile Nwụrụ n’Agha,’ nke e mere n’isi nso a mgbe 45 afọ gasịrị kemgbe a lụsịrị Agha Uwa nke Abụọ, òtù ahụ, nke nwere ihe karịrị nde mmadụ ise ndị kwere na ya, nakweere ụta dịịrị ya ‘n’ilezi anya nye aka ná [mgbalị agha nile e mere maka] Agha Uwa nke Abụọ.’ Akwụkwọ akụkọ Asahi Shimbun kwuru, sị, ‘Ọ dịbeghị mgbe ọ bụla o metụworo mbụ, bụ òtù ndị okpukpe Buddha ikwupụta hoo haa na ụta dịịrị ya n’oge ihe omume okpukpe.’
Otú ọ dị, ọ̀ bụ na o kwesịghị ka ‘ihere rikpuo’ ọtutụ okpukpe ndị ọzọ maka ịgba ọtụtụ ụmụ okorobịa ume ije agha? Dị ka akwụkwọ Kodansha Encyclopedia of Japan si kwuo, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ òtù okpukpe Buddha, ‘Kristian,’ na Shinto nile dị na Japan guzobere otu Njikọ Okpukpe na 1941 ‘iji nye mba ahụ nkwado ime mmụọ n’oge agha.’
Ọ bụghị ịhe ijuanya na n’izo aka n’ebe alaeze ụwa nke okpukpe ụgha dị dị ka ‘Babilọn Ukwu ahụ,’ Bible na-asị: ‘Ọ bụkwa n’ime ya ka a hụrụ ọbara nke ... ndị nile e gbuworo n’elu ụwa.’ (Mkpughe 18:2, 24) Jehova Chineke, bụ́ Onye Na-enye mmadụ ndụ, ọ̀ ga-ajụ ndị okpukpe ndị ahụ ajụjụ maka ikpe ọmụma ọbara ha? Otu isiakwụkwọ ahụ dị ná Mkpughe kọwara nke ọma ihe gaje ime Babilọn Ukwu ahụ, na-asị: ‘Otu mmụọ ozi nke dị ike wee buru nkume, dị ka oké nkume igwe nri, wee tụba ya n’ime oké osimiri, sị, Otú a ka a ga-atụda Babilọn, bụ obodo ukwu ahụ, n’oké ọdịda, a gaghị ahụkwa ya ọzọ ma ọlị’—Mkpughe 18:21.
Ụkọ Ndị Ụkọchukwu
Òtù dị iche iche nke okpukpe Buddha ndị dị na Japan na-enwe nsogbu nke ụlọ nsọ ndị a na-ejikwaghị eme ihe. Ọ na-ewute ndị bi nso ụlọ nsọ ndị na-enwekwaghị ndị ụkọchukwu bi ebi na ndị na-akpagharị n’enweghị ebe obibi ọ bula na-agagharị na gburugburu ụlọ nsọ ndị ahụ nakwa n’ihi ihe ize ndụ nke ọkụ ọgbụgba itiwapụ. Òtù okpukpe Buddha ndị Zen nke Myoshinji kpebiri ilebara nsogbu ahụ anya site n’ire ụlọ nsọ ndị ahụ ma ọ bụkwanụ ijikọta ha na ndị dị nsọ. Ihe karịrị 20 pasenti nke 3,500 ụlọ nsọ òtù Myoshinji ahụ nwere gburugburu Japan nọ n’enweghị ndị ụkọchukwu bi ebi ma ọ bụkwanụ bụrụ nke ndị ụkọchukwu si n’ụlọ nsọ ndị dị nsọ na-elekọta.
Gịnị kpatara ọnọdụ ọjọọ ahụ? Akwụkwọ akụkọ The Daiiy Yomiuri na-akọwa, sị, ‘Ọ na-esiri òtù ahụ ike ịchọta ndị ga-anọchi anya ndị ụkọchukwu ndị na-ala ezumike nká, ndị ụkọchukwu ka bu ụmụ okorobịa na-eguzogidekwa ịbụ ndị e zijere n’ógbè ebe ọtụtụ mmadụ na-ebighị.’ Òtù ahụ nwara ịzụ ndị ọrụ laworo ezumike nká dị ka ndị ụkọchukwu ma ọ gbakụtaworo atụmatụ ahụ azụ. Ọ bụ ezie na òtù Myoshinji ahụ na-ekwu na ‘nke a abụghị ọgbọ mgbe ọnụ ọgụgụ ụlọ nsọ ndị e nwere bụ ihe àmà nke ike e nwere,’ ọ bụ ihe a na-apụghị ịgọpụ agọpụ na ikike ha nwere n’ahụ ụmụ mmadụ na-adalata adalata.
Ọ bụ ihe na-akpali mmasị ịmara na akwụkwọ Bible bụ Mkpughe buru amụma na mmiri nile nke Yufretis, nke usoro okpukpe zuru ụwa ọnụ—’Babilọn Ukwu ahụ’—na-anọkwasị n’elu ya, ‘ga-atakọ.’ (Mkpughe 16:12; 18:2, 9, 11) Gịnị ka mmiri ndị ahụ nọchiri anya ha? ‘Mmiri nile ị hụrụ, . . . bụ ndị dị iche iche, na ìgwè mmadụ, na mba dị iche iche, na asụsụ dị iche iche.’ (Mkpughe 17:15) O doro anya na ntakọsị nke ‘mmiri’ nile, ma ọ bụ ndị nkwado, na-ewere ọnọdụ n’akụkụ Ọwụwa Anyanwụ nke Babilọn Ukwu ahụ.
Ihe Ngwọta Zuru Okè
Òtù Worldwatch Institute nke nwere isi ulọ ọrụ ya na Washington, D.C., U.S.A., kwuru, sị, ‘Ihe ize ndụ ndị anyị na-eche ihu ugbu a ... na-aga ọsọ ọsọ nke ukwuu nke na, ọ gwụlakwa ma à malitere ime ihe ugbu a iji kwụsị ha, ha aghaghị iduje n’ọdachi akụ na ụba ndị dị njọ nke ukwuu nke na ha ga-akwụsị ọganihu, dujekwa ná ndakpọ nke òtù ụmụ mmadụ na nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị iche iche.’ N’afọ gara aga, akụkọ kwa afọ nke òtù ahụ dọrọ aka ná ntị na ikuku ọkụ ndị na-egbu egbu, ụkọ mmiri ozuzo, na oké idei mmiri bụ nanị ihe mgbaàmà nke ọdachi ndị siri ike karị, ndị ka ga-abịakwasị ụwa nke e mekpaworo ahụ. Akụkụ ndị akụkọ ahụ kwuru ka e lebara anya ozugbo gụnyere ịchịkwa mmụba ọnụ ọgụgụ mmadụ, iji ihe ndị na-enye ike e ji arụ ọrụ mee ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị, ịkụghachi osisi n’ebe ndị e belataworo oké ọhịa, na igbochi ụnwụ nri. Otú ọ dị, òtù ahụ kwuru na ọ dị mkpa ozugbo inwe ‘atụmatụ ime ihe zuru ụwa ọnụ’ na ‘mgbanwe zuru ezu n’akparamagwa mmadụ’ iji wee rụpụta ihe ndị dị mma.
Ànyị pụrụ ịtụ anya ịhụ atụmatụ zuru ụwa ọnụ nke ga-eweta mgbanwe zuru ezu n’oge anyị a? Ee, ma ọ bughị site ná mgbalị nke mmadụ ọ bụla ma ọ bụ ìgwè ụmụ mmadụ ọ bụla. N’ihi gịnị ka ọ na-abụghị otú ahụ? N’ihi na n’ọtụtụ narị afọ gara aga, Jeremaịa onye amụma dere, sị: ‘Ọ bụghị n’aka ya onwe ya ka ụzọ mmadụ dị: ọ bụghị ọnye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwu ya guzosie ike.’ Kama nke ahụ, Bible na-ekwe nkwa na Jehova Chineke ‘[ga-emebi] ndị ahụ na-emebi ụwa,’ ọ ‘ga-edozikwa okwu’ n’ụzọ ga-abara ndị bi n’elu ala uru.—Jeremaịa 10:23; Mkpughe 11:18; Maịka 4:3, 4.