Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g97 9/8 p. 12-15
  • Ihe Dị Mma Karịa Ịbụ Onye A Ma Ama n’Ụwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Dị Mma Karịa Ịbụ Onye A Ma Ama n’Ụwa
  • Teta!—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Agụụ Ime Mmụọ
  • Ịbụ Onye A Ma Ama n’Ụwa Nile
  • Inwe Mmasị Ọzọ n’Okpukpe
  • Oge Oké Mgbanwe
  • Ịhazigharị Ihe n’Ọrụ
  • Ihe Ùgwù Dị Iche Iche nke Ozi Ndị Kraịst
  • Ịgbara Na-aga n’Ụwa Ọhụrụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Ihe Gafere Afọ 50 nke ‘Ịgabita’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Ijere Onye Omenka Kasị Ukwuu Ozi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
Teta!—1997
g97 9/8 p. 12-15

Ihe Dị Mma Karịa Ịbụ Onye A Ma Ama n’Ụwa

Ọtụtụ afọ mgbe m ghọsịrị onye a maara nke ọma n’ịkpụ ihe na Europe, otu onye nkà ibe m gwara m n’ụzọ ebubo, sị: “I mechuwo nkà ihu!” Tupu m kọọ ihe mere o ji bo m ebubo ahụ, ka m kọwaa otú m si ghọọ onye ọkpụ ihe.

N’OBODO nta Aurisina, ebe a mụrụ m, ihe ka ọtụtụ ná ndị nwoke rụrụ ọrụ n’ebe ochie a na-agbari nkume. Aurisina dị n’ebe ugwu Itali n’akụkụ Trieste ma dị nso n’ebe bụbu Yugoslavia. Mgbe m dị afọ 15, amalitekwara m ịrụ ọrụ n’ebe ahụ a na-agbari nkume n’obodo. Nke ahụ bụ na 1939, afọ Agha Ụwa nke Abụọ malitere. Iji nkume arụ ọrụ mere ka m chọọ ịghọ ọkpụ ihe a ma ama. Achọkwara m ka m ghara ịnwụ anwụ. Ọchịchọ abụọ ndị a yichara ihe aka na-agaghị eru.

Mgbe agha biri na 1945, agara m ibinyere nwanne m nwanyị na Rom. N’ebe ahụ, atụrụ m anya idebanye aha n’ụlọ akwụkwọ nkà. Lee oké ọṅụ m nwere mgbe ihe m chọrọ mere, e wee nabata m maka afọ atọ nke ọmụmụ ihe! A kwụrụ ụgwọ akwụkwọ m site n’enyemaka nke òtù ọrụ ebere dị iche iche.

Agụụ Ime Mmụọ

Achọkwara m imejụ agụụ ime mmụọ m site n’ịga ụka, gụnyere ndị nke Salvation Army na ndị òtù Waldo. Ọbụna na m naara ihe ọmụmụ na mahadum ndị Jesuit, otu ugbo agakwara m nzukọ ọmụmụ ihe were ụbọchị atọ nke otu bishọp kụziri. N’oge ọmụmụ ihe a e kweghị ka anyị na ibe anyị kwurịta okwu, kama anyị tinyere onwe anyị n’ekpere, ntụgharị uche, ime nkwupụta, na n’ihe ndị bishọp kwuru.

Ka e mesịrị, achọpụtara m na e wusibeghị okwukwe m ike. “N’ihi gịnị,” ka m jụrụ bishọp, “ka m na-ejibeghị zụlite okwukwe siri ike?”

“Okwukwe bụ onyinye Chineke,” ka bishọp ahụ zara, “ọ na-enyekwa ya onye ọ chọrọ.” Azịza ya kụdara m mmụọ nke ukwuu nke na m kwụsịrị ịchọ Chineke ma malite itinye onwe m kpam kpam n’ihe ọmụmụ nkà m.

Ịbụ Onye A Ma Ama n’Ụwa Nile

Mgbe m gụsịrị akwụkwọ na Rom na 1948, anatara m onyinye ịgụ akwụkwọ n’efu maka otu afọ n’ụlọ akwụkwọ nkà dị na Vienna, Austria. Agụsịrị m akwụkwọ n’ebe ahụ n’afọ na-esonụ ma nakwere onyinye ịgụ akwụkwọ n’efu maka otu afọ iji mụkwuo ihe na Ljubljana, Slovenia (ebe bụbu akụkụ Yugoslavia). Nzube m mgbe ahụ bụ ịkwaga Paris, France, ebe bụ isi maka nkà ise ihe.

Otú ọ dị, na 1951, e nyere m ohere ịrụ ọrụ na Stockholm, Sweden. Akwagara m ebe ahụ n’ebumnobi nke ịkpakọba ego iji nyere m aka ịmụkwu ọrụ nkà na Paris. Ma mgbe ahụ ezutere m Micky, anyị lụkwara di na nwunye na 1952 ma biri na Stockholm. Enwetara m ọrụ n’obere ụlọ ọrụ ebe m na-eji okwute, marble, na granite akpụ ihe ọkpụkpụ. E gosiri ụfọdụ n’ime ndị a na Millesgarden, ogige ntụrụndụ na ebe ngosi ihe mgbe ochie dị n’obodo Lidingö, dịdewere Stockholm.

Amụtawo m usoro oge ochie nke iji ọla nchara akpụ ihe na Rom—usoro wax nke e chefuworo—akụzikwara m iji ọla nchara akpụ ihe n’Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ n’Ọrụ Nkà na n’Ụlọ Akwụkwọ Nkà dị na Stockholm. Ka e mesịrị, e nyere m ikike iji ebe a na-eji ọla nchara akpụ ihe nke dị n’ebe ngosi ihe mgbe ochie ghere oghe nke Skansen dị na Stockholm eme ihe. N’ebe ahụ, mgbe mgbe n’ihu ndị nkiri, m ga-eji ọla nchara ma ọ bụ opu kpụpụta ihe. E gokwara m ọrụ idozighachi ihe ọkpụkpụ oge ochie nke eze Sweden n’oge ahụ, bụ́ Gustav VI. A na-egosipụta ndị a n’Obí Eze nakwa n’ụlọ ukwu nke Drottningholm dị na Stockholm.

N’agbata 1954 na 1960, ụlọ ọrụ mgbasa ozi na ndị na-akọwa nkà toro ọrụ m. E gosiri ọtụtụ n’ime ihe ọkpụkpụ m n’obodo ukwu ndị bụ isi nke Europe, gụnyere Stockholm, Rom, Ljubljana, Vienna, Zagreb, na Belgrade. Na Belgrade, Marshal Tito zụụrụ ụfọdụ n’ime ihe ọkpụkpụ m idebe. E gosiri otu nnukwute ihe oyiyi ogwe ahụ nwanyị m ji granite kpụọ n’Ebe Ngosi Ọrụ Nkà Ọgbara Ọhụrụ dị na Rom, ihe m kpụrụ dịkwa n’Ebe Ngosi Ihe Mgbe Ochie Albertina dị na Vienna. Ebe Ngosi Ihe Mgbe Ochie Ọgbara Ọhụrụ dị na Stockholm nwere otu n’ime ihe ọkpụkpụ m e ji ọla nchara na opu kpụọ, Ebe Ngosi Ọrụ Nkà Ọgbara Ọhụrụ dị na Ljubljana nwekwara otu ihe ọkpụkpụ e ji ọla nchara kpụọ.

Inwe Mmasị Ọzọ n’Okpukpe

N’afọ ole na ole ka anyị lụsịrị di na nwunye, Micky chọpụtara mmasị ọhụrụ m na-enweghachi n’okpukpe. Anọgidere m na-eche, sị, ‘Olee ebe okwukwe ahụ dị bụ́ nke ndị Kraịst oge mbụ dị njikere ịnwụ maka ya?’ Amaliteghachiri m ịga ụka, dị ka ndị nke Pentikọstal na Adventist. Enyochadịrị m okpukpe Alakụba na Buddha.

Na 1959, tupu mụ agaa ihe ngosi nkà e nwere na Milan, Itali, eletara m obodo m bụ́ Aurisina ruo ụbọchị ole na ole. Ndị obodo gwara m banyere otu nwoke bụ́ onye ha kwuru na ọ maara ọtụtụ ihe banyere Bible. Ọ bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Mgbe m nwere ohere iso ya kwurịta okwu, o gosiri m ihe dị iche iche dị na Bible ndị m na-ahụbeghị mbụ. Amụtara m na mmadụ bụ mkpụrụ obi—o nweghị mkpụrụ obi dị iche n’ahụ ya—nakwa na mkpụrụ obi mmadụ na-anwụ anwụ, ọ bụghị ihe na-adịghị anwụ anwụ dị ka okpukpe ndị ọzọ kụziri.—Jenesis 2:7; Ezikiel 18:4.

Ọzọ, nwoke ahụ gosiri m na nzube Chineke mgbe o kere Adam na Iv, abụghị na ha ga-anwụ, kama na ha ga-adị ndụ ebighị ebi n’obi ụtọ n’elu ala. Di na nwunye mbụ ahụ nwụrụ n’ihi na ha nupụrụ isi. (Jenesis 1:28; 2:15-17) Amụtara m na site n’inye Ọkpara ya dị ka ihe mgbapụta, Chineke mere ndokwa ka ụmụ mmadụ nwee olileanya nke ndụ ebighị ebi, nke a tụfuru n’ihi nnupụisi Adam. (Jọn 3:16) O wetaara m oké ọṅụ ịmụta ihe ndị a.—Abụ Ọma 37:29; Mkpughe 21:3, 4.

Oge Oké Mgbanwe

Nwa oge ka e mesịrị, alaghachiri m Sweden, mụ na Micky gbalịkwara ịchọta Ndịàmà Jehova. Ma anyị apụghị ịchọta adres ebe ha nọ. Otú ọ dị, ụbọchị ole na ole n’ihu, mgbịrịgba ụzọ anyị kụrụ, leekwa ha ka ha nọ n’ọnụ ụzọ anyị! Amalitere m ịgụ akwụkwọ ha hapụụrụ m, n’oge na-adịghịkwa anya o doro m anya na eziokwu dị na ya. Ma, achọrọ m ijide nkwenye m n’aka site n’isoro otu enyi m ochie, bụ́ achịbishọp ndị Katọlik, kwurịta okwu, bụ́ onye m matara n’oge ọmụmụ ihe m na Rom n’akụkụ ikpeazụ nke afọ ndị 1940. Ya mere, na January 1961, agara m ịhụ ya.

Na mgbe ahụ enyi m na-elekọta ọrụ ozi ala ọzọ nile nke ndị Katọlik gburugburu ụwa. Lee ihe ịtụnanya nọ na-echere m! O juru m anya ịmara na achịbishọp ahụ enwedịghị ihe ọmụma Bible bụ isi. Mgbe anyị kwurịtara banyere ihe na-eme n’ọnwụ, o kwuru, sị: “Ihe anyị kweere ugbu a nwere ike n’ikpeazụ bụrụ ihe megidere ya kpam kpam.” Mgbe anyị kwurịtakwara izo aka Pita ná nkwa Bible nke “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ,” ihe nkwa a pụtara edoghị ya anya.—2 Pita 3:13; Aịsaịa 65:17-25.

Mgbe m laghachiri Stockholm, amalitere m iso otu n’ime Ndịàmà mụ na nwunye m mataworo na-amụchi Bible anya. Ọ tọrọ m ụtọ ịhụ mmasị na-arị elu nke Micky nwere n’ọmụmụ ihe ahụ. N’ikpeazụ, na February 26, 1961, egosipụtara m nrara m nye Jehova site na baptism ime mmiri, e mekwara Micky baptism n’afọ na-esonụ.

Ịhazigharị Ihe n’Ọrụ

Anyị mụrụ otu nwa nwanyị na 1956 na otu obere nwa nwoke na 1961. Ebe ọ bụ na ugbu a anyị enwewo ezinụlọ ịkwado, ọrụ e ji n’aka dị m mkpa. Enwere m obi ụtọ ịnata ịkpọ òkù iwu otu nnukwute ihe ncheta n’obodo ebe a mụrụ m. Ọ gaje ịbụ ihe ncheta nke ndị agha okpuru nwụrụ n’Agha Ụwa nke Abụọ. Ihe ncheta ahụ gaara abụ ọrụ ga-enye m ego. Ma mgbe m tụlesịrị ihe dị iche iche—gụnyere eziokwu ahụ bụ na ruo ọtụtụ ọnwa m ga-ahapụ ezinụlọ m na n’ọgbakọ ndị Kraịst nakwa na m ga-ebi n’ala ebe ọchịchị ndị Kọmunist na-aga n’ihu na ebe ọ na-agaghị adị mfe ịchụso ọdịmma ime mmụọ—ajụrụ m ọrụ ahụ.

Ọrụ ọzọ kpataara m nsogbu akọ na uche. A gwara m ka m mee nnukwu ihe oyiyi maka ebe ọhụrụ a na-agba ozu ọkụ na Sweden. Mgbe m mesịrị ya, a kpọrọ m òkù ịbịa ememe mmepe ya. Ma mgbe m matasịrị na bishọp nke Stockholm gaje imepe ọrụ m, ekpebiri m ịghara isoro ndị ozizi na omenala ha na-emegide Okwu Chineke kpọmkwem kere òkè n’ememe ahụ.—2 Ndị Kọrint 6:14-18.

N’ihi ejighị n’aka ịdị na-enweta ọrụ oge nile dị ka onye ọkpụ ihe, ọ malitere isiri m ike igbo mkpa ihe onwunwe ezinụlọ m nke ọma. (1 Timoti 5:8) Ejiri m ekpere tụlee ihe m nwere ike ime iji na-enweta ihe e ji ebi ndụ. Ka e mesịrị, otu onye na-atụ ụkpụrụ ụlọ jiri otu ihe nlereanya nke ụlọ o sere bịakwute m. Ọ gwara m ka m see ya foto. Ebe m maara nkà ise foto nke ọma n’ihi ahụmahụ m nwere n’ise ihe ọkpụkpụ m foto, enwere m obi ụtọ ịnakwere ọrụ ahụ. N’afọ ndị ahụ ọrụ iwu ihe dị ukwuu na-aga n’ihu na Sweden, e nwekwara mkpa dị ukwuu maka ise ihe nlereanya dị iche iche foto. N’ihi ya, enwetara m ọtụtụ ọrụ site n’aka ọtụtụ ndị na-atụ ụkpụrụ ụlọ, apụkwara m ịkwado ezinụlọ m nke ọma.

Ọ bụ n’oge a ka m letara Ụlọ Ọrụ Ọdịbendị Itali dị na Stockholm iji kerịta ozi ọma nke Alaeze Chineke. (Matiu 24:14) Amaara m onye ntụzi nke ụlọ ọrụ ahụ, enwekwara m ike idokwa isoro ya kwurịta okwu. Ọ bụ mgbe ọ matasịrị na mụ adịkwaghị arụ ọrụ dị ka onye ọkpụ ihe ka o tiri mkpu, sị: “I mechuwo nkà ihu!” Akọwara m na m nwere ibu ọrụ ka elu n’ebe Chineke na ezinụlọ m nọ.

Aghaghị m ikwenye na ruo oge ụfọdụ nkà bụ ihe kasị mkpa ná ndụ m. Otú ọ dị, abịara m ghọta na nye m, a ga-eji ịnọgide na-achụso ọrụ m tụnyere ịgbalị ịbụ ohu nna abụọ. (Matiu 6:24) O doro m anya na ihe kasị mkpa m pụrụ ime bụ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Ya mere emere m mkpebi onwe onye ịhapụ ọrụ m dị ka onye ọkpụ ihe, Jehova Chineke agọziwokwa mkpebi m n’ụzọ dị ukwuu.—Malakaị 3:10.

Ihe Ùgwù Dị Iche Iche nke Ozi Ndị Kraịst

Ná mmalite afọ ndị 1970, ọtụtụ ndị si n’ebe ndịda na n’ebe ọwụwa anyanwụ Europe kwabata na Sweden malitere igosi mmasị n’eziokwu Bible. N’ihi ya, malite na 1973, enwere m ihe ùgwù nke isoro ndị si mba ọzọ kwabata mụọ Bible bụ́ ndị na-asụ Italian, Spanish, na Serbo-Croatian, enwekwara m ike inye aka guzobe ọgbakọ na ìgwè ọmụmụ ihe ndị ọhụrụ maka asụsụ ndị a. A họpụtara m ịhazi mgbakọ ndị Kraịst n’asụsụ Italian na iduzi ihe nkiri Bible na ha. N’otu oge, enwekwara m ihe ùgwù nke ileta ọgbakọ dị iche iche dị na Sweden dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị.

N’ihi inye aka ịhazi mgbakọ Italian na Sweden, mụ na alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Society dị na Rom zikọrịtara ozi. Ụmụnna ndị Itali ahụ gwara m na e nwere ụkọ ndị okenye ọgbakọ n’Itali n’ihi oké mmụba nke ọrụ nkwusa n’ebe ahụ. Ya mere na 1987, mụ na Micky kwagara Liguria, dịdewere Genoa, Itali. N’oge ahụ ụmụ anyị etowo ma nọkwaara onwe ha. Anyị biri afọ abụọ magburu onwe ha n’Itali ma kere òkè n’iguzobe ọgbakọ ọhụrụ na Liguria. Anyị hụrụ n’ụzọ zuru ezu eziokwu dị n’Ilu 10:22: “Ngọzi Jehova, nke ahụ na-eme mmadụ ọgaranya.”

Mgbe ụfọdụ mụ na Micky na-agbalị ịgụkọta ngọzi anyị site n’aka Jehova, ndepụta ahụ na-etokwa ogologo. E wezụga ikere òkè n’iguzobe ọgbakọ ọhụrụ, anyị enwewo ike inyere ọtụtụ ndị, gụnyere ụmụ anyị aka, iru n’ókè nke nraranye na baptism na mgbe ahụ ịghọ ndị Kraịst tozuru okè. Adịghị m akwa ụta ná mkpebi m ịhapụ ndụ m dị ka onye ọkpụ ihe a maara nke ọma, n’ihi na ahọrọwo m ọrụ na-enye ụgwọ ọrụ ka ukwuu nke ijere Chineke anyị na-ahụ n’anya, bụ́ Jehova, ozi. Mụ na ndị m hụrụ n’anya esiwo otú a nweta olileanya siri ike maka ndụ agwụghị agwụ, ekele dịrị Jehova.—Dị ka Celo Pertot si kọọ.

[Foto dị na peeji nke 13]

Ịrụ ọrụ n’otu ihe ọkpụkpụ na 1955

[Foto dị na peeji nke 15]

Mụ na nwunye m

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya