Ihe Ndị Dị Oké Ọnụ Ahịa nke Ikpere Osimiri
Site n’aka onye nta akụkọ Teta! na Spain
MGBE ọ bụla m na-akpagharị n’akụkụ osimiri ma ọ bụ iyiala, ana m achọ mgbe nile otu n’ime ihe ndị dị oké ọnụ ahịa ndị kasị amasị m—ọ pụrụ ịcha ọbara ọbara, anụnụ anụnụ, ma ọ bụ akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ. Mgbe ụfọdụ m na-ahụ otu nke bekwasịrị n’elu akwụkwọ n’emegharịghị ahụ; m pụrụ ịhụ ọzọ ka ọ na-efegharị n’elu mmiri ma ọ bụ ọbụna na-efefere n’ihu m. Ihe dị oké ọnụ ahịa m na-achọ bụ oji ọdụ aṅụ mmiri—“helikọpta” mara mma nke ụmụ ahụhụ.
Ihe ndị a dị oké ọnụ ahịa na-efe efe dọọrọ uche m nke mbụ ya ọtụtụ afọ gara aga mgbe m zutere na mberede otu iyi nke na-asọ nwayọọ nwayọọ n’ọhịa. Ọtụtụ oji ọdụ aṅụ mmiri na-efegharị n’ìhè anyanwụ—ụfọdụ na-acha anụnụ anụnụ na-egbuke egbuke, ndị ọzọkwa akwụkwọ ndụ a gwakọtara ya na odo odo na-egbukepụ egbukepụ. Eji m otu hour kirie ịgba egwú ha n’ikuku, ndị gbanwere ebe ghere oghe n’oké ọhịa ịbụ obere ụlọ ịgba egwú. Ha adọrọwo mmasị m eri mgbe ahụ.
Ka m na-amụtakwu banyere oji ọdụ aṅụ mmiri, otú a ka m na-aghọtakwu mma ha na uru ha. Nchọpụta mbụ m bụ na e nwere ihe dị iche n’etiti oji ọdụ aṅụ mmiri na ogube. Oji ọdụ aṅụ mmiri dị ike n’ufe, na-akakarịkwa ibu, ebe ogube na-ama mma karị, na-efe ufe dị nnọọ ala karị. Otu ọdịiche bụ isi bụ n’ụzọ ha si edebe nku ha. Oji ọdụ aṅụ mmiri na-ezuru ike na-agbasakarị nku ya anọ agbasa, ebe ogube na-afụkọ ha ọnụ n’azụ ya.a
Amalitere m iche otú oji ọdụ aṅụ mmiri pụrụ isi jide anwụnta n’ikuku n’ụzọ yiri ka ọ dị mfe. N’onwe m, ọ na-afọ nke nta ka ọ ghara ikwe m omume ịpịata nnukwu ahụhụ nke bekwasịrị n’ahụ ájá kichin ihe. ‘Gịnị,’ ka m jụrụ onwe m, ‘ka oji ọdụ aṅụ mmiri nwere m na-enweghị?’ Ihe abụọ: nkà zuru ezu n’ikuku na anya ga-eme ka onye nche nwee anyaụfụ.
Ufe Oji Ọdụ Aṅụ Mmiri
Ịkpọ oji ọdụ aṅụ mmiri helikọpta—utu aha a ma ama na Spain—bụ n’ezie ihe ntụnyere na-eweda ala. Ịkpọ ụgba ha n’ikuku na-adị nnọọ ngwa nke na mgbe ụfọdụ ọ dịghị ekwe anya omume iso ha. Ná mfepụ dị mkpirikpi, ụdị ha ụfọdụ pụrụ iru ọ̀tụ̀tụ̀ ọsọ kasị elu nke ihe dị ka kilomita 55 n’otu hour. Ha pụkwara ịkwụrụ otu ebe n’ikuku ma ọ bụ felaa azụ, ihu, ma ọ bụ akụkụ akụkụ n’otu ntabi anya. Ọzọkwa, mgbe oji ọdụ aṅụ mmiri mere ntụgharị mberede n’ikuku, ndị ọkà mmụta sayensị na-agbakọ na ọ ghaghị iguzogide ike ndọda ruru 2.5.
Oji ọdụ aṅụ mmiri nwere nku anọ pụrụ ịrịgọ arịgọ, ndị dị ka ákwà leesi. Ọ bụ ezie na nku ndị a yiri ihe na-esighị ike, ha pụrụ iferu ugbo 40 n’otu sekọnd, na-ejikwa ọ̀tụ̀tụ̀ dị ala nke mmebi anagide ịkụnye n’ihe. Onye ọkà ihe ndị dị ndụ bụ́ Robin J. Wootton na-akọwa ha dị ka “nkà ndị dị nta sitere n’ọgụgụ isi.”
“Ka anyị na-aghọtakwu otú nku ahụhụ si arụ ọrụ,” ka ọ na-agbakwụnye, “otú a ka ịdị nkọ na ịma mma ha na-apụta karị. . . . Ha nwere ihe nkà na ụzụ ole na ole yiri ha ma ọ bụrụ na ọ dị nke dịnụ.” N’ụzọ na-adịghị eju anya, ndị injinịa ụgbọelu nọ ugbu a na-amụ banyere ụzọ oji ọdụ aṅụ mmiri si efe.
Isi nke Jupụtara n’Anya
Ọ bụrụ na ufe oji ọdụ aṅụ mmiri pụrụ iche, a pụkwara ikwu otu ihe ahụ banyere ọhụhụ ụzọ ya. Anya abụọ buru ibu fọrọ nke nta ka o kpuchie isi oji ọdụ aṅụ mmiri. Nke ọ bụla n’ime anya ndị a nwere ihe ruru nkebi 30,000 nwere akụkụ isii ndị dịgasị ka ntakịrị anya ndị dị n’ime otu anya, ebe otu nke ọ bụla na-ebugara ụbụrụ onyinyo dị iche. Otú ọ dị, nke ahụ apụtaghị na oji ọdụ aṅụ mmiri na-ahụ ọtụtụ puku onyinyo dị iche iche, ha dum n’otu mgbe. Kama ịhụ onyinyo zuru ezu, dị ka anyị na-ahụ, ọ na-achọpụta mmegharị ahụ, oyiyi, ọdịiche, na ọdịdị.
Onyinyo ahụ nile chọrọ nkọwa. N’ihi ya, 80 pasent nke ụbụrụ oji ọdụ aṅụ mmiri bụ maka ịtụle ihe ndị a hụrụ. Usoro ole na ole maka ịhụ ụzọ dị nkọ ruo otú ahụ—oji ọdụ aṅụ mmiri pụrụ ịhụ anwụnta nọpụrụ ihe dị ka mita 20. Ọbụna n’uhuruchi, mgbe ìhè na-adịchakwaghị nke na ọ na-esiri mmadụ ike ịhụ ahụhụ ndị pere mpe, oji ọdụ aṅụ mmiri nke ebe okpomọkụ na-anwụde ha n’ụzọ dị mfe.
Mfepụ dị ngwa nke oji ọdụ aṅụ mmiri n’etiti ahịhịa dị n’akụkụ mmiri na-achọ ọtụtụ narị mkpebi dị oké ngwa. Ọ pụrụ ịrụ ọrụ a siri oké ike n’ihi na ọ pụrụ ịhụ ihe ruru otu narị onyinyo dị iche iche n’otu sekọnd, ihe ji okpukpu ise karịa ka anyị pụrụ. N’ihi ya, ihe nkiri sịnịma, nke na-ewepụta onyinyo 24 n’otu sekọnd, ga-adị nnọọ ka usoro foto na-adịghị emegharị ahụ nye oji ọdụ aṅụ mmiri.
Mgbanwe nke Ụzọ Ndụ
Mgbe oji ọdụ aṅụ mmiri malitere ndụ ya ọ dịghị ihe ọ bụla na-egosi ya ịbụ ihe ahụ mara mma, nke dị ike n’ufe ọ ga-emesị ghọọ. Mgbe ọ vụsịrị, ịkpakwuru mmiri ahụ na-anọ n’emegharịghị ahụ ruo n’ókè ụfọdụ n’iyiala ma ọ bụ n’iyi, na-eche ijide nri ọ bụla bịara ya nso. Ọtụtụ mgbanwe nke akpụkpọ ahụ mgbe e mesịrị—ọtụtụ ọnwa ma ọ bụ ọbụna afọ n’ihe banyere ụdị ha ụfọdụ—ịkpakwuru ahụ na-arịpụta rịgokwasị n’amị̀. N’ebe ahụ, mgbanwe pụrụ iche na-ewere ọnọdụ.
Akpụkpọ ahụ ya na-ekewa n’ebe ǹgụ̀ ya, oji ọdụ aṅụ mmiri zuru nnọọ ezu na-arịpụtakwa. Dị ka urukurubụba, nke ahụ toworo eto pụtara ọhụrụ aghaghị ichere hour ole na ole tupu nku ya esie ike, ndụ ọhụrụ ewee malite. N’ụbọchị ole na ole, amamihe ebumpụta ụwa ya na-eme ka o nwee ihe ịga nke ọma n’ịchụ nta na ịmụtacha ihe isi ike ndị dị n’ife efe.
N’oge na-adịghị anya oji ọdụ aṅụ mmiri ahụ a mụrụ ọhụrụ na-aghọ diọkà n’ijide ijiji na anwụnta ka ha na-efe n’elu. N’iripịa ahụhụ ndị ha na ya hà n’ịdị arọ kwa ụbọchị, ọ na-arụ ọrụ bara oké uru. Iji hụ na e nwere usoro inweta ihe oriri e ji n’aka, ọtụtụ oji ọdụ aṅụ mmiri nke oké na-azọrọ obere ókèala, bụ́ ndị ha na-eji ekworo efe gburugburu.
Ụdị oji ọdụ aṅụ mmiri ụfọdụ na-achụ nta irighiri ahụhụ ma ọ bụ ébé, ndị ọzọ na-ejide obere mbara, ma otu ogube nke ebe okpomọkụ na-eri ọbụna ududo. Ọ na-efe gburugburu ọnyà nnukwu ududo wee jide ududo ndị ka obere ndị na-abịa n’ọnyà ahụ iri iberibe nri ndị onye nwe ọnyà ahụ hapụrụ.
Ihe Akaebe Megide Evolushọn
Ọtụtụ ndị ọkà mmụta sayensị kwere n’evolushọn na-ewere oji ọdụ aṅụ mmiri dị ka ahụhụ na-efe efe kasị ochie. Otu fossil (ihe àmà e gwutere n’ala nke ihe ndị dịrị ndụ n’oge ochie) a chọpụtara na France bụ akara nku nke otu oji ọdụ aṅụ mmiri nwere nku dị sentimita 75 n’ịdị obosara! Ọ bụ ahụhụ kasị ibu a maara, na-eji ihe karịrị okpukpu atọ buo ibu karịa oji ọdụ aṅụ mmiri ọ bụla dị ndụ.
‘Olee otú ọ ga-esi kwe omume,’ ka m jụrụ onwe m, ‘ka otu n’ime usoro ufe kasị dị mgbagwoju anya mmadụ maara pụta nnọọ n’ụzọ zuworo okè?’ “E nweghị fossil ahụhụ ndị dị n’agbata ọnọdụ enweghị na inwe nku,” ka akwụkwọ bụ́ Alien Empire—An Exploration of the Lives of Insects kwetara. O doro anya na oji ọdụ aṅụ mmiri bụ aka ọrụ nke Omenkà Kasịnụ nwere ọgụgụ isi.
Oji ọdụ aṅụ mmiri enwewo ihe ịga nke ọma n’ibi n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ akụkụ nile nke ụwa. Ahụ ga-eru ha ala n’akụkụ ọdọ mmiri nke ebe ugwu alp, ala mmiri nke ebe etiti ụwa, ma ọ bụ ọbụna ebe igwu mmiri dị n’ógbè na-emepechabeghị emepe.
Ekiriwo m ìgwè oji ọdụ aṅụ mmiri n’ụsọ mmiri nke ebe okpomọkụ Africa tinyere ụdị oji ọdụ aṅụ mmiri bụ́ emperor nanị ha na-efe na-enweghị ike ọgwụgwụ na gburugburu iyiala dị na Europe na-aka amasị ha. Mgbe m jikwa ụgbọ epeepe gbafere otu ndagwurugwu jupụtara n’ahịhịa na Philippines, ogube ndị na-egbuke egbuke ghọrọ ndị nso n’azụ, ọbụna na-ebekwasị n’elu ogwe aka m nkịtị.
Ọ bụ ezie na oji ọdụ aṅụ mmiri pụrụ iso n’ime ihe ndị na-efe efe kasị mgbagwoju anya n’ụwa, ịdị ùgwù na mma ha adọrọwo mmasị m mgbe nile karịa ikike ife efe ha. Ọnụnọ ha na-atụkwasị mgbukepụ pụrụ iche n’iyiala na ikpere osimiri anyị. Ha bụ ihe ndị dị oké ọnụ ahịa bụ ịgba—nọ n’ebe ahụ mgbe nile ime anyị obi ụtọ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Mgbe ụfọdụ, oji ọdụ aṅụ mmiri na-eweda nku ha ala ma chee ahụ ha ihu gaa n’anyanwụ. Nke a bụ otú ha na-anọrọ iji mee ka ahụ jụọ ha oyi, ebe ọ na-ebelata akụkụ ahụ anyanwụ na-acha.
[Foto dị na peeji nke 16, 17]
Oji ọdụ aṅụ mmiri, ndị na-agbasa nku ha agbasa, na-akakarị ogube ibu, bụ́ ndị na-afụkọ nku ha ọnụ n’azụ ha