Ijere Onye Omenka Kasị Ukwuu Ozi
MGBE m bụ nwa agbọghọ nta dị afọ asaa, amalitere m ịjụ onwe m, sị: ‘N’ihi gịnị ka m na-aghaghị ịnwụ anwụ? Ò kwere omume izere ịnwụ anwụ?’ A gwawo m na Chineke na-akpọrọ ndị ezi mmadụ n’ihi na ọ chọrọ ka ha na ya nọrọ n’eluigwe. Aka m na-echeta mgbe otu nwa mụ na ya nọ na klasị tiri mkpu kwuo, sị: “Ọ ka mma ịbụ ajọ mmadụ n’ihi na ndị ezị mmadụ na-ebu ụzọ anwụ!”
Enwere m mmasị n’ise ihe, ya mere, amalitere m ịmụ otú e si ese ihe. Mgbe m nọ n’ụlọ akwụkwọ, enweghị m ohere ọ bụla ịtụle okwu banyere okpukpe, ma ọ bụkwanụ ohere itinye mmasị m na ha. N’eziokwu, ana m agwa ndị enyi m na iji bụrụ onye nwere mmasị n’okpukpe, ọ dị mkpa ka mmadụ nwee ọgụgụ isi dị ala. Mgbe m mụzuru ihe ọmụmụ m banyere ise ihe, e nyere m ọkwa ịbụ onye nkuzi nke osise ihe na kọleji.
Enwere m mmasị dị n’ọrụ m, enwekwara m mmasị n’akwụkwọ ọgụgụ ndị Italy na nke ndị mba ọzọ, egwú chamber na symphony, na opera. Nanị ihe metụtara okpukpe nke m mụrụ n’oge ahụ bụ ihe osise okpukpe ndị ọkà n’ise ihe sepụtara n’oge dị iche iche. Mgbe ahụ, amatara m ihe ọ pụtara bụ ịnọ ebe mmadụ nile na-elekwasị gị anya, ụdị mmetụta mmadụ na-enwe mgbe ọ na-eme ihe ngosi nke ihe ndị o sepụtara, ihe ọ pụtara ịbụ onye e ji kpọrọ ihe nke ukwuu, onye a na-enye otuto, onye a na-ajakwa mma dị ka onyeọkà n’ise ihe.
N’oge ahụ, ihe metụtara ise ihe dị oké mkpa nye m, ebe ọ bụ na ya ka m hụrụ ihe ka ukwuu mere m ji dịrị ndụ. Ma ajụjụ ndị ahụ m jụrụ mgbe m dị afọ asaa ka dịkwa n’ime uche m. Anọgidere m na-achọ ihe dị omimi karị, bụ́ ihe m na-enwebeghị ike ịkọwa. Abụ m onye nwere mmasị n’ịgụ akwụkwọ, arịọkwara m ndị ọkà ihe ọmụma dị iche iche maka nkọwa. N’agbanyeghị ihe ọ ga-ewe m, achọrọ m inweta azịza ndị doro anya banyere ihe ịrụ ụka ndị m na-enwe.
Aka m nwekwara mgbagwoju anya ahụ mgbe m lụrụ di. Mgbe m mụsịrị nwa m nwanyị, achọsikwuru m eziokwu ahụ ike. Agbalịrị m ịchọta ya site n’ise ihe osise, ide abụ dị iche iche, ige ntị n’egwú otiti, ịgụ akwụkwọ dị iche iche. Mgbe ọ bụla m jere n’ebe a na-eti egwú wee gee ntị n’ụda egwú ndị mbụ e ji amalite, uche m na-aga ozugbo ahụ n’ebe Chineke nọ, bụ́ Onye ahụ Kasị Elu nke m na-amaghị, ana m ekelekwa ya. N’oge ahụ, ana m enyekarị Chineke otuto maka ọmarịcha ihe ndị ahụ m nwere mmasị na ha—obere nwa m nke na-ehi ụra, àgwà dị iche iche nke mbara ala. “Lee nnọọ ka o si dị njọ,” ka m na-ekwukarị, “na ọkà ihe osise, nke pụrụ inwe nnọọ ọtụtụ ihe mara mma dị ka isiokwu ya, na-abụkarị nke a na-eji eme ihe iji kọwaa ọnwụ kama iji kọwaa ndụ!” Ụfọdụ n’ime abụ ndị kasị mma e deworo na ihe ngosi ihu ọha ndị e meworo na-abụkarị ndị e ji akọwa olileanya ihe ọjọọ ma ọ bụ akụkọ ọdachi; ụfọdụ n’ime ihe osise ndị kasị mma na-ebuli ọnwụ elu kama ibuli ndụ na ịma mma ya elu. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị?
Mmetụta ndị a na-emegiderịta onwe ha kụdara m obi nke ukwuu, m wee jiri nwayọọ nwayọo na-ejerukwa n’ọnọdụ nke enweghị mmasị n’ihe ọ bụla. Ọ bụ n’oge ahụ ka Ndịàmà Jehova bịarutere n’ụlọ m. Ka m na-ege ha ntị, o yiri ka ha ji asụsụ ọhụrụ na-agwa m okwu. Nkwa Chineke nke ime ka ala ghọọ paradaịs dara m ụda egwú dị ụtọ ná ntị. Amalitere m ịgụ Bible. N’ebe ahụ, emesịrị m nweta azịza nye ajụjụ ndị ahụ m na-akwụsịbeghị ịjụ eri mgbe m dị afọ asaa. Chineke achọghị ka mmadụ nwụọ anwụ, kama ọ chọrọ ịgọzi ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi site n’inye ha ndụ ebighị ebi n’elu ala!
Nke ahụ bụ na 1973. N’afọ na-eso ya, araara m onwe m nye Jehova, meekwa baptism. Ọ bụghị ihe dị mfe iji mmụọ nke ezi ịhụnanya ụmụnna dochie anya oké mkpali na oké mmetụta m na-enwe, iji àgwà nke achọghị ọdịmma onwe onye dochie anya ọchịchọ onwe onye m na-enwe, na iji mmụọ nke ịchụ àjà dochie anya ọchịchọ m na-enwe maka ọdịmma onwe onye! Aghaghị m ịjụ onwe m ajụ. Ndịàmà Jehova enyewo aka nke ukwuu, dịkwa ka nzukọ ndị a na-enwe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.
Onye Omenka ahụ Dị Ukwuu ewepụsịwo ihe ịrụ ụka na mgbagwoju anya nile m na-enwe. Lee ka m si nwee obi ekele nye ya! Ọ bụ ya mere na, kemgbe September 1984, ewerewo m ozi ọsụ ụzọ oge nile, na-etinye 90 awa kwa ọnwa n’ikwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke.
Iso Ezinụlọ m na-ejere Onye Omenka Ukwu ahụ na Onye Okike bụ Jehova ozi bụ ihe na-enye afọ ojuju n’ezie. Anyị ji oké olileanya na-echere oge mgbe ọ ga-ese ihe osise ndị kasị mma e setụworo mgbe ọ bụla; mgbe ọ ga-emesịa wepụ ajọ usoro ihe ochie nke a nke na-emetọ ma na-erikpukwa ụwa nke a. Ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ, ọrụ ihe osise ga-abụkwa nke a raara kpam kpam nye ndụ. Mgbe ahụ, ọ ga-abụ nanị ịma mma ka a ga na-esepụta, n’ihi na site n’usoro ihe ọhụrụ nke ezi omume Chineke, a ga-ewepụsịworị ịta ahụhụ na ihe mgbu ruo mgbe ebighị ebi.—Ọ bụ onye ọzọ dere nke a.