Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g97 3/8 p. 30-31
  • Ikiri Ụwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ikiri Ụwa
  • Teta!—1997
  • Isiokwu Nta
  • Inyere Ndị Ntị Chiri Aka n’Africa
  • Kwọọ Aka Gị!
  • Chịa Ọchị, wee Dị Ogologo Ndụ?
  • Chọọchị Katọlik Nọ ‘n’Oge Ihe Ize Ndụ’
  • Ọganihu Site n’Ileghachi Anya Azụ
  • Azụ̀ Dolphin Bụ́ Ndị Ngụpụta n’Ime Mmiri
  • Oriri Nsọ “Nri Ngwa Ngwa”
  • Kpalakwukwu Na-eme Njem
  • Gọọmenti Australia Enye Iwu Ịkwado Igbu Ndị Na-arịa Ọrịa Na-akpata Ọnwụ
  • A Gbanwee Chọọchị Dị Iche Iche
Teta!—1997
g97 3/8 p. 30-31

Ikiri Ụwa

Inyere Ndị Ntị Chiri Aka n’Africa

“UNAD NEWS na-aja mmasị na mgbalị achọghị ọdịmma onwe onye nke Ndịàmà Jehova ịmụta asụsụ maka ndị ogbi na ndị ntị chiri mma,” ka akwụkwọ akụkọ nke Òtù Mba Maka Ndị Ntị Chiri nke Uganda (UNAD) kwuru. Akwụkwọ akụkọ ahụ kwuru na otu ìgwè Ndịàmà na-anụ ihe nọ na Kampala, Uganda, amalitewo ịmụ asụsụ ndị ogbi na ndị ntị chiri n’ebumnobi nke inye ndị nwere nsogbu ịnụ ihe nọ n’ala ahụ nlekọta ime mmụọ. Akụkọ ahụ kwukwasịrị na mmadụ abụọ gaje ịghọ ndị ntụgharị okwu “bụ ndị ọsụ ụzọ oge nile ma ọ bụ [ndị ozi] oge nile n’otu n’ime okpukpe ndị kasị amụba ngwa ngwa na ndị a kasị akwanyere ùgwù n’ụwa, nke a maara ná mba nile n’ihi nrapara ọ rapaara kpam kpam n’ozizi Bible.”

Kwọọ Aka Gị!

Na nso nso a Òtù Maka Ihe Ndị Dị Ndụ Anya Nkịtị Na-adịghị Ahụ nke America hụrụ maka otu nnyocha iji chọpụta mmadụ ole na-akwọ aka ha mgbe ha jesịrị n’ụlọ mposi ọha na eze, ka The New York Times na-akọ. Dị ka ihe àmà na-egosi, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ nile maara na ha kwesịrị ịkwọ aka ha. N’otu nnyocha e ji telifon mee mmadụ 1,004 toworo eto, 94 pasent zọọrọ na ha na-akwọ aka mgbe nile ha jesịrị n’ụlọ mposi ọha na eze. Ma hà na-akwọ? Ndị nchọpụta nọ na-eleru anya n’ụlọ mposi ndị dị ná nnukwute obodo ukwu ise nke America chọpụtara na n’ime mmadụ 6,333, nanị 61 pasent nke ndị ikom na 74 pasent nke ndị inyom kwọrọ aka ha mgbe ha jesịrị n’ụlọ mposi. Aka ruru unyi na-agbasa ọrịa ngwa ngwa, nanị otu onye kwa ji aka a na-akwọghị akwọ bitụ ihe oriri pụrụ ime ka ọtụtụ mmadụ daa ọrịa. Otu ihe kpatara nsogbu ahụ pụrụ ịbụ enweghị nduzi ndị mụrụ ụmụ. “Ndị nne taa adịkebeghị agwa ụmụ ha ka ha kwọọ aka ha,” ka Dr. Gail Cassell kwuru. “Ụlọ akwụkwọ adịghị agwa ụmụaka banyere ya. Ọ dị anyị mkpa ka e chetara anyị na nke a dị mkpa.”

Chịa Ọchị, wee Dị Ogologo Ndụ?

E kwetawo eri ogologo oge na ọchị bụ ọgwụ ọma. Afọ iri gara aga ndị ọkà mmụta sayensị na Mahadum Steeti nke New York kpebiri ịchọpụta ihe mere o ji bụrụ. Ha kpughere nchọpụta ha na nso nso a na ọchị na-enye aka ịkpasu mmepụta nke mmiri ọgwụ hormone ndị dị ike ndị na-enye usoro nchebe ahụ mmadụ ike. A chọpụtawo na otu ìgwè mmiri ọgwụ hormone, nke a na-akpọ cytokine, na-akwalite ịrụ ọrụ nke mkpụrụ ndụ ọbara ọcha, bụ́ ndị a chọrọ iji gbochie ọrịa ndị nje virus na nje bacteria na-akpata, ndị na-ebibikwa mkpụrụ ndụ ndị pụrụ ịkpata ọrịa cancer. Ndị a bụ nanị “otu n’ime ihe ndị ọchị na-eme ka ọ̀tụ̀tụ̀ ha bukwuo ibu,” ka The Sunday Times nke London na-ekwu. Njikọ dị n’agbata ọchị na cytokine edujewo ndị nchọpụta ụfọdụ izo aka na ha dị ka mmiri ọgwụ hormone obi ụtọ. N’ihi ya, akwụkwọ akụkọ ahụ na-akpọ ọchị “ụzọ isi dị ogologo ndụ.”

Chọọchị Katọlik Nọ ‘n’Oge Ihe Ize Ndụ’

Otu ihe odide nke otu ìgwè gụnyere ndị bishọp asaa wepụtara na-akọwa Chọọchị Katọlik dị ka nke nọ ‘n’oge ihe ize ndụ,’ ka Star-Telegram, nke Arlington, Texas, na-akọ. Ihe odide ahụ “na-arịọ chọọchị ka o dozie nkewa ya ndị siri ike,” ka akwụkwọ akụkọ ahụ na-ekwu. Njụta echiche na-egosi na ọtụtụ n’ime nde 60 ndị Katọlik nọ na United States ekwetaghị n’ozizi chọọchị ndị dị ka ndị ụkọchukwu ịnọ n’alụghị nwunye na ichi ụmụ nwanyị ụkọchukwu. N’otu nzukọ ịgba ajụjụ nke ndị nta akụkọ ebe a nọ wepụta ihe odide ahụ, kadinal Joseph Bernardin nwụworo anwụ kwupụtara nchegbu ya banyere “nkewa na-arị elu dị n’ime chọọchị ahụ, mgbe ụfọdụkwa, ịkpọ obi nkụ” nke na-akpaghasị ọrụ chọọchị ahụ. “N’ihi ya, a na-eyi ịdị n’otu nke chọọchị ahụ egwu,” ka o kwuru. “Ike na-agwụ ndị òtù kwesịrị ntụkwasị obi nke chọọchị, a na-emebikwa àmà anyị na-agbara gọọmenti, ọha mmadụ na ọdịbendị.”

Ọganihu Site n’Ileghachi Anya Azụ

Tupu e mepụta ígwè transistor, e nwere vacuum tube. Ugbu a ndị nchọpụta na-eleghachi anya azụ. “Anyị na-enyochagharị vacuum tube ndị dị laa azụ n’afọ ndị 1940,” ka ọkà n’ihe ọmụmụ physics bụ́ Griff L. Bilbro, nke Mahadum North Carolina kwuru. “Ma ugbu a anyị na-eji ihe ndị ọhụrụ na ngwá ọrụ kọmpụta ndị e ji atụpụta ụkpụrụ eme ihe iji kpebie otú ha si arụ ọrụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ frequency dị elu, iji ya eme ihe na fon radar na cellular.” Otu ọdịiche dị n’agbata tube ndị ochie na ndị ọhụrụ bụ otú ha hà. Tube ndị ọhụrụ ahụ dị ntakịrị ma na-abịa n’ụdị dị iche iche n’ihe hà ka isi mkpa ọkụ. A na-eme ha site ‘n’iji diamond kpuchie electrode, mgbe ahụ wepụsịa ikuku n’ime ha,’ ka magazin bụ́ Science News na-akọ. “Nnukwute ọdịiche dị n’agbata vacuum tube ndị ọhụrụ e ji diamond mee na nnukwute bulb enyo nke afọ 50 gara aga bụ okpomọkụ. Tube ndị ochie aghaghị ịchakepụ dị ka ire ọkụ iji gbukepụ ụzarị electron. Tube ndị ọhụrụ na-emepụta ụzarị eletrik n’ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ nke ime ụlọ.” E wezụga ịnọte aka karịa ihe ndị ike eletrik na-adịghị esicha na ha agafe na chip kọmputa, tube ndị ọhụrụ ahụ na-arụkarịkwa ha n’ọrụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ, ike eletrik, na ụzarị ọkụ ndị dị elu.

Azụ̀ Dolphin Bụ́ Ndị Ngụpụta n’Ime Mmiri

Ọ pụrụ ịbụworị ìgwè azụ̀ dolphin zọpụtara otu nwoke na-egwu mmiri n’ime Osimiri Uhie, ka Journal of Commerce na-akọ. Mark Richardson, si Britain, nọ na-egwu mmiri ná mpụga ikpere mmiri Ijipt mgbe otu azụ̀ shark wakporo ya. Mgbe ọ tasịrị ya arụ n’akụkụ na n’ogwe aka ya, atọ n’ime ụdị azụ̀ dolphin nwere imi yiri nke karama gbara ya gburugburu “na-efegharị ntù na ọdụ ha iji chụpụ azụ̀ shark ahụ.” Mgbe ahụ azụ̀ dolphin ndị ahụ “nọgidere na-agba Mazị Richardson gburugburu ruo mgbe ndị enyi ya bịakwutere ya.” Dị ka Journal ahụ si kọọ, “a na-ahụkarị akparamàgwà dị otú ahụ nke azụ̀ dolphin mgbe ndị nke nne na-echebe ụmụ ọhụrụ ha.”

Oriri Nsọ “Nri Ngwa Ngwa”

Otu onye America na-achụ nta ego, bụ́ Jim Johnson, na-emepụta sakrament ndị e kechiri ekechi a pụrụ ịtụfu atụfu maka iji ha eme ihe n’ụka ịnata Oriri Nsọ, ka Christianity Today na-akọ. Ntakịrị iko plastik ahụ na-acha odo odo, nke hà ka ma dị n’ụdị iko kọfị ntakịrị, na-anagide otu nju akpịrị nke mmiri grape ma ọ bụ mmanya. Ha na-abịakọtakwa ha na achịcha ekoghị eko e kechiri n’ime ngwugwu nwere ọnụ abụọ a na-adọpe adọpe. Dị ka Johnson si kwuo, ngwá ahịa ahụ nwere uru nke nkwadebe ka ngwa ngwa na mbelata nke oge ihichasị ihe, mbelata mmefu, na ịdị ọcha. Ihe karịrị chọọchị 4,000 amaliteworị iji ngwá ahịa ọhụrụ ahụ na-eme ihe, ọ bụ ezie na e welitewo mkpesa ụfọdụ banyere ile Oriri Nsọ ahụ anya dị ka “ahịa ọha.” Johnson na-arụ ụka, sị: “Jisọs nyere nri ngwa ngwa mbụ mgbe ọ zụrụ ìgwè mmadụ.”

Kpalakwukwu Na-eme Njem

A hụwo kpalakwukwu nọ na London eri oge ka ha so ndị njem elu ala na-eme njem n’ụzọ okpuru ala, ka magazin bụ́ New Scientist na-akọ. Ọzọkwa, ụfọdụ ndị na-ekwu na nnụnụ ndị ahụ ọbụna maara ebe ha ga-arịda. Mgbe magazin ahụ kpọrọ òkù, ọtụtụ ndị na-agụ ya dere akwụkwọ ịkọ banyere ahụmahụ nke ha banyere ndị njem a nwere ábụ́bá. Dị ka ihe atụ, otu nwoke dere, sị: “Na 1974-1976, m na-ezutechi otu kpalakwukwu na-achatatụ uhie uhie anya ka ọ na-abanye n’ụzọ okpuru ala na Paddington ma na-arịda n’ebe nkwụsị na-esonụ.” Otu nwoke ọzọ hụkwara ihe yiri ya laa azụ na 1965. O yiri ka kpalakwukwu anọwo na-ezere ịkwụ ụgwọ ụgbọ n’usoro ime njem nke London ruo ihe dị ka afọ 30!

Gọọmenti Australia Enye Iwu Ịkwado Igbu Ndị Na-arịa Ọrịa Na-akpata Ọnwụ

Otu nwoke na Northern Territory nke Australia aghọọla onye mbụ nwụrụnụ n’okpuru iwu ọhụrụ gọọmenti nke na-enye ikike mmadụ igbu onwe ya site n’enyemaka nke dọkịta, ka akwụkwọ akụkọ The New York Times na-akọ. Nwoke ahụ nọ n’afọ ndị 60 ya ma na-arịa ọrịa cancer mkpụrụ amụ nke e weere dị ka nke na-akpata ọnwụ. “Nke a bụ nke mbụ mmadụ jirila aka ya gbuo onwe ya n’ụzọ iwu kwadoro,” ka Dr. Philip Nitschke kwuru, bụ́ onye dibịa nke gbara nwoke ahụ ọ̀tụ̀tụ̀ ọgwụ barbiturate gburu ya. “A kwụnyere n’ahụ nwoke ahụ ígwè ọrụ nke nyere ya ohere ịmalite usoro ọnwụ ya site n’ịpị aka n’otu bọtin dị ná ntakịrị kọmpụta dị n’akụkụ àkwà ya,” ka Nitschke kọwara. Otú ọ dị, iwu ọhụrụ ahụ na-eche mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ ihu. Òtù ndị ome iwu mba ahụ na-atụle imepụta iwu iji kagbuo iwu ahụ, ụfọdụ ndị dọkịta na chọọchị na-amakwa iwu ahụ aka n’ụlọikpe.

A Gbanwee Chọọchị Dị Iche Iche

Dị ka akwụkwọ akụkọ Netherlands bụ́ Het Overijssels Dagblad si kwuo, a gbanwewo ihe dị ka ụlọ chọọchị 300 ịghọ nnukwute ụlọ ahịa, ebe obibi, ụlọ ihe ngosi, na ụlọ ọfịs. Ebe ọnụ ọgụgụ ndị na-eje chọọchị jiworo ihe dị ka 50 pasent dalata n’ime afọ 15 gara aga, obi dị ọtụtụ chọọchị ụtọ ịhụ onye dị njikere ịnapụ ha ibu nlekọta nke na-efu ego. E rewo ụfọdụ ụlọ chọọchị nanị n’ọnụ ego dị nta nke otu guilder (ihe dị ka 60 cent, U.S.)! Otú ọ dị, ịgbanwe ebe bụbu chọọchị ịghọ ụlọ azụmahịa na-akpasu ihe mgbu dị ukwuu nke mmetụta uche, karịsịa n’etiti ndị meworo okenye karị. Otu onye ọnụ na-eru n’okwu kwuru, sị: “Ha ejewo ebe ahụ ruo ọtụtụ afọ. E mere ha baptism ma jikọta ha n’alụmdi na nwunye n’ebe ahụ, ugbu a kwa ha na-ahụ ndị mmadụ ka ha na-eme ihe ndị kasị bụrụ ihe nkịtị n’ebe ahụ . . . , ọbụna ịkpọ iyi.”

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya