Ihe Ịtụnanya Na-akpali Akpali
Dana Folz dị afọ asatọ mgbe ọ matara na e kuchiri ya ekuchi. Ọtụtụ afọ n’ihu, ọ malitere iche, ‘Ònye bụ nne m? Olee otú ọ dị? N’ihi gịnị ka o ji wepụta m ka e kuchie m? M̀ nwere ụmụnne ndị nwoke ma ọ bụ ndị nwanyị?’ Gụọ ihe ndekọ Dana banyere otú o si mesịa chọta nne mụrụ ya na nke oké ihe ịtụnanya sochiri.
A MỤRỤ m n’August 1, 1966, na Ketchikan, Alaska, U.S.A. Nwanne m nwanyị bụ Pam ji afọ abụọ tọọ m. Nna anyị bụ onye ọrụ ebere na-arụrụ Ụlọ Ọrụ Ihe Metụtara Ndị India ọrụ, a na-atụgakarịkwa ya ebe dị iche iche. Anyị na-akwagharị site n’otu ebe gaa n’ebe ọzọ n’Alaska. E mesịa, anyị biri na Iowa, Oklahoma, Arizona, na Oregon.
Ka anyị nọ na-eleta ndị ikwu na Wisconsin n’oge okpomọkụ nke 1975, ụfọdụ ụmụ nwanne nna m kwuru ihe ndị na-adịghị mma banyere nwa nwanne nna m ọzọ. “E kuchiri ya ekuchi,” ka ha kwuru, “ya mere ọ bụghịkwa nwa Folz n’ezie.” Mgbe anyị lọtara ụlọ, ajụrụ m mama m banyere nke a, ihu ya gbarụrụnụ jukwara m anya. Ọ kọwara ihe nkuchi pụtara. N’abalị ahụ, ka anya mmiri na-erusịsị ya n’anya, ọ gwara m na e kuchiri m ekuchi nakwa na e kuchikwara nwanne m nwanyị ekuchi.
Nkuchi adịghị m ka oké ihe mgbe ahụ, ruokwa nwa oge, echebaraghị m ya ezi echiche ọzọ. Enwere m mama na papa, ndụ yikwara ka ọ dị otú o kwesịrị ịdị. Nne na nna m kpebiri ịkwụsị nkwagharị ma kwe ka ezinụlọ anyị gbanye mkpọrọgwụ. Mgbe m dị afọ itoolu, anyị biiri na Vancouver, Washington. Mụ na papa m dị nnọọ ná mma, ebe mụ na mama m na-adịchaghị. M na-eme otú ọ sọrọ m ma na-eme isi ike mgbe ụfọdụ, obi nkoropụ nke a kpatakwaara mama m pụrụ ịkọwa ihe mere o ji yie ka anyị na-aga iche iche.
Mmekọrịta Ịhụnanya na Kọleji
Mgbe m nọ n’ụlọ akwụkwọ dị elu, ezutere m Trina, anyị yịwakwara ozugbo. Mgbe m gụsịrị e nyere m ikike ịgụ akwụkwọ n’efu na Mahadum Oregon State, dị na Corvallis, Oregon. Eji m oge ọ na-adịghị ihe m na-eme na-aga Vancouver ka mụ na Trina, onye ka ga-anọ n’ụlọ akwụkwọ dị elu otu afọ, wee nọkọọ. Agụsighị m akwụkwọ ike ma chee na m ga-emekwarị nke ọma na kọleji. Rịpọt kaadị mbụ m na-awụ akpata oyi—ọ bụ nke kasị njọ m nwetụworo! Ihere mere m. Ma akwụsịghị m ileta Trina; nanị ihe m na-eme bụ iwere akwụkwọ m mgbe m na-aga ka m wee nwee ike ịgụ ha n’oge nleta m.
Mgbe ahụ, otu ụbọchị, ka m ji ọgba tum tum m si Vancouver na-alaghachi akwụkwọ, adabara m n’oké ihe ọghọm. N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị enwere m mmerụ ahụ ọbụna nke ka njọ mgbe otu ụgbọala kụturu m ka m na-agafe okporo ámá n’ebe ndị ji ụkwụ si agafe. Amalitere m ịrụ ọrụ ma ghara inwekwa ọchịchọ ịlaghachi kọleji.
Mmasị n’Okpukpe
Ka oge na-aga, mụ na Trina malitere ibikọ. Anyị kwenyere na Chineke ma chọọ ịmata ya. Otú ọ dị, anyị chere na chọọchị nile dị ihu abụọ. Ya mere anyị gbalịrị ịgụ Bible n’onwe anyị, ma anyị apụghị ịghọta ihe ọ bụla.
Otu ụbọchị, ka m na-arụ ọrụ na Portland, Oregon, ndị ọrụ ibe m malitere iji otu nwoke m na-ele anya dị ka otu n’ime ndị kasị bụrụ ezi mmadụ m zutetụworo eme ihe ọchị. Randy nagidere mmenye ihere ahụ n’ụzọ dị jụụ. E mesịa n’ụbọchị ahụ ajụrụ m ya: “Gịnị bụ ihe a m na-anụ banyere gị ịbụ onye ozi?”
“Ọ bụ eziokwu, abụ m,” ka o kwuru.
“Nke ole ndị?” ka m jụrụ.
“Abụ m otu n’ime Ndịàmà Jehova.”
“Olee ndị bụ Ndịàmà Jehova?”
“Ị̀ na-ekwu na ị maghị?” ka o ji ijuanya jụọ.
“Ee,” ka m kwuru. “Olee ndị bụ Ndịàmà Jehova? M̀ kwesịrị ịma?”
“Ee,” ka o ji ịmụmụ ọnụ ọchị zaa, “i kwesịrị ịma. Gịnị ka ị ga-eme n’oge nri ehihie?”
Nke ahụ bụ nke mbụ n’ọtụtụ nkwurịta okwu Bible n’oge nri ehihie. Otu abalị agwara m Trina banyere ha. “Ekwunyerela Ndịàmà Jehova okwu!” ka o tiri ná mkpu. “Ha gbara iche! Ha abụghịdị ndị Kraịst. Ha adịghị agba Krismas.” O wee gaa n’ihu ịgwa m ihe ndị ọzọ ọ nụworo banyere Ndịàmà Jehova.
“Ọ dịwo onye gwara gị ọtụtụ ihe na-abụtụdịghị eziokwu,” ka m kwuru. Mgbe ogologo nkwurịta okwu gasịrị, enwere m ike ime ka o kweta na ọ nụbeghị ihe bụ eziokwu. Mgbe nke ahụ gasịrị, ọ malitere ime ka m na-ajụ Randy ajụjụ, m ga-eweghachikwara ya azịza Akwụkwọ Nsọ doro anya mgbe mgbe. N’ikpeazụ, Trina sịrị: “Amabughị m na ihe a nile dị na Bible, ma aka m na-eche na ha gbara iche. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịnọgide na-ekwunyere ya okwu banyere Bible, nsogbu adịghị; ma nanị alọtala ma manye m ikwere ha.”
Oge Ihe Isi Ike
Ekwenyere m n’ihe m na-amụta na Bible, ma echere m na apụghị m nnọọ idebe ha. O yiri ka mụ na Trina na-alụ ọgụ karị. Ya mere mụ na otu enyi m kpebiri ịhapụ ndị enyi anyị nwanyị ma malite ndụ ọhụrụ n’Oklahoma. Emere m ndokwa maka ịga ezumike ọrụ. N’isi nso, mụ na enyi m kwabara n’otu ụlọ dị n’otu obodo nta dị nso n’ókèala Texas. O weghị ogologo oge tupu agụụ Trina amalite ịgụ m nke ukwuu, ma ekpebiri m na m ga-ekpori ndụ n’agbanyeghị ihe merenụ.
Achọpụtara m na afọ ndụ ịṅụ mmanya na Texas bụ 19, ya mere mgbe enyi m mere njem, agafere m ókèala n’otu abalị iji kporie ndụ n’otu ụlọ mmanya egwú rock ’n’ roll a ma ama. Aṅụbigara m nnọọ mmanya ókè, kpọkasịa ụgbọala m, a kpụgakwara m n’ụlọ nga. Ka oge na-aga, enwere m ike izi nna m ozi, ọ gbapụtakwara m. Ọzọkwa, Trina nabataghachiri m, enwekwara m ekele maka nke a! Alaghachiri m n’ọrụ m na-arụbu ma maliteghachi nkwurịta okwu Bible mụ na Randy.
Ịchịkwa Ndụ M
O ruwela afọ abụọ eri mgbe m nụrụ mbụ banyere Ndịàmà Jehova, ekpebikwara m itinyekwu uche n’ọmụmụ Bible m. Adị m afọ 20 ugbu a, ajụjụ ndị metụtara nkuchi m nke m hotara ná mmalite isiokwu a malitekwara inye m nsogbu. Ya mere amalitere m ịchọsi nne mụrụ m ike.
Akpọrọ m ụlọ ọgwụ dị n’Alaska ebe a mụrụ m ma jụọ otú m ga-esi gaa n’ihu. Mgbe m matasịrị ihe m ga-eme, enwetara m otu satifiketi ọmụmụ m, achọpụtakwara m na aha nne m bụ Sandra Lee Hirsch; ma ọ dịghị ihe e dere banyere nna m. Sandra dị nanị afọ 19 mgbe a mụrụ m, ya mere echere m na ọ ghaghị ịbụwo nwa agbọghọ egwu ji, nke na-enweghị di, bụ́ onye dabara ná nsogbu, o wee bụrụ na ọ ghaghị ime mkpebi siri ike. E nweghị ihe ọmụma zuru ezu na satifiketi ọmụmụ m nke m ga-eji chọta nne m.
Ka ọ dị mgbe ahụ, n’ihi ọmụmụ Bible mụ na Randy, o doro m anya na achọtawo m ezi okpukpe ahụ. Ma adara m ọtụtụ ugbo n’ịkwụsị iji ụtaba nke na-emerụ emerụ eme ihe. (2 Ndị Kọrint 7:1) Ọ dịrị m ka ike m ọ̀ gwụla Jehova. Mgbe ahụ, otu Onyeàmà n’Ụlọ Nzukọ Alaeze kwuru otu ihe nyeere m aka n’ezie. O kwuru na Setan bụ onye na-achọ ka anyị daa, na ọ bụkwa ihe mwute ịhụ ka ụfọdụ na-agbahapụ ndụ ebighị ebi site n’ịchịli aka. “Ọ dị anyị mkpa ịtụkwasị Jehova ibu anyị nile,” ka o kwuru, “ma dabere kpam kpam n’ebe ọ nọ inyere anyị aka gabiga oge anyị nwere nsogbu.”—Abụ Ọma 55:22.
Nke ahụ bụ kpọmkwem ihe dị m mkpa ịnụ! Amalitere m itinye ihe o kwuru n’ọrụ, na-ekpe ekpere ọtụtụ mgbe maka enyemaka Jehova. N’egbughi oge, akwụsịrị m iji ụtaba eme ihe, mụ na Trina lụkwara di na nwunye, m malitekwa ịdị na-enwechi ọmụmụ Bible m anya. Ka oge na-aga, Trina malitekwara ịmụ ihe. Egosipụtara m nraranye m nye Jehova site na baptism ime mmiri na June 9, 1991. Ihe na-erughị izu abụọ ka e mesịrị, a mụrụ nwa nwanyị anyị mbụ, Breanna Jean.
Mmekọrịta Mụ na Papa M
Mụ na papa m dị ná mma. Ọ bụ nnọọ onye nwere obiọma nke na-anọ ya mgbe nile inye agbamume mgbe m nwere obi nkoropụ. Ma, ọ na-eguzosi ike mgbe ịdọ aka ná ntị dị m mkpa. Ya mere, ọ bụ oge siri ike ná mmalite 1991 mgbe m matara na papa m na-arịa ọrịa cancer akpa ume na-eweta ọnwụ. Ka ọ dị mgbe ahụ papa m na mama m akwagawo na Hamilton, Montana. Anyị na-agakarị ebe ahụ ịhụ ya na ịgbalị inye mama m nkwado.
Anyị nwere ike inye papa m akwụkwọ Ndu Nka Ọ̀ Bu Nani Ndu Dinu? O kwere nkwa ịgụ ya ma kwuo na ya na-eche banyere ọdịmma ezinụlọ ya. Ná nleta ikpeazụ m, ọ gwara m otú o si jiri inwe m dị ka nwa ya nwoke na-anya isi na otú ọ hụruru m n’anya. Mgbe ahụ, ka anya mmiri malitere ịgba, o chere ihu na window. Anyị makụrụ onwe anyị ọtụtụ ugbo tupu m laa. Papa m gụrụ ihe dị ka otu ụzọ n’ụzọ atọ nke akwụkwọ ahụ tupu ọ nwụọ, na November 21, 1991.
Mgbe papa m nwụsịrị, anyị mesịakwa kwaga Moses Lake, Washington, enwere m ọchịchọ ọbụna nke ka sie ike ịmata banyere oge m gara aga. Ma n’agbanyeghị oge nile m tinyere n’ịchọ ya, anyị elegharaghị ọdịmma ime mmụọ anya. E mere Trina baptism na June 5, 1993, mgbe ọnwa isii gasịkwara ọ mụrụ nwa anyị nwanyị nke abụọ, Sierra Lynn.
Otú M Si Chọta Nne Mụrụ M
Anọgidere m na-achọ ihe ọmụma site n’usoro iwu Alaska, na-edegara ụlọ ọrụ dị iche iche ọtụtụ akwụkwọ ozi, na-emekwa nchọpụta nke onwe m na kọmputa. Ha dum enweghị isi. Mgbe ahụ, ka ọ na-eru ngwụsị afọ 1995, emere m ule ahụ ike nke kpughere na ọ dị ihe na-adịghị agazi agazi n’obi m. Adị m nanị afọ 29, dọkịta m chọkwara ịma banyere okwu ọgwụ na ahụ ike metụtara m n’oge gara aga.
Dọkịta ahụ dere akwụkwọ arịrịọ sara mbara, nke gara n’okwu, na-emesi ya ike na ihe ọmụma dị na faịlụ nkuchi m pụrụ ịdị mkpa maka ọdịmma elu ahụ m. Ka oge na-aga, anyị natara nzaghachi. Ihe dị ya bụ mkpebi ọkàikpe nke na-ekwu na o cheghị na mkpa ọgwụ na ahụ ike m dịruru njọ nke imepe faịlụ ndị ahụ. Ọ kụjasịrị m obi. Ma izu ole na ole n’ihu, akwụkwọ rutere site n’aka ọkàikpe nke abụọ. Iwu ụlọikpe enyewo m ikike ịhụ faịlụ nkuchi m!
Ndị bụ faịlụ nkụchi m n’ezie rutere ná mmalite January 1996. Ha kwuru obodo nne mụrụ m na akụkọ ezinụlọ ya. Ozugbo, emere m nchọpụta kọmputa banyere aha Sandra tinyere nke aha obodo ya ma nweta ndepụta nọmba telifon isii. Mụ na Trina kpebiri na ọ kasị mma ka Trina kpọọ òkù fon ndị ahụ. N’òkù nke atọ, otu nwanyị kwuru na Sandra bụ nwa nwanne ya nwoke, ma nye nọmba fon ya.
Ọkpụkpọ Òkù ahụ na Ihe Ịtụnanya Ya
Mgbe Trina kpọrọ nọmba ahụ, nwanyị zara jụrụ ikwu onye ọ bụ. N’ikpeazụ, Trina kwuru hoo haa, sị: “A mụrụ di m na Ketchikan, Alaska, n’August 1, 1966, ọ dịkwa m mkpa ịma ma ị̀ bụ onye m na-achọ.” E nwere ogologo oge nke idere duu, mgbe ahụkwa, n’olu na-ama jijiji, nwanyị ahụ jụrụ ihe bụ aha na nọmba fon Trina ma kwuo na ya ga-akpọghachi. Echeghị m na ọ ga-akpọghachi ozugbo ahụ, ya mere ekpebiri m ịga zụta ihe ụfọdụ dị anyị mkpa n’ụlọ ahịa.
Mgbe m lọtara, Trina nọ na fon, anya mmiri jukwa ya anya. O nyere m fon ahụ. Ka mụ na mama m na-ekele ma na-ekwurịta ụmụ ihe, Trina takwụnyere ngwa ngwa ná ntị sị, “Ọ chọburu ịzụlite gị n’ezie.” Emeere m nne m ebere ka ọ malitere ịgwa m banyere onwe ya. “Achọrọ m ikele gị maka ndụ i nyere m,” ka m kwuru. “Enwere m ndụ dị mma, enwewokwa m ihe nile dị m mkpa. Enwewo m nne na nna ọma na ịhụnanya bara ụba, nweekwa ugbu a nwunye magburu onwe ya na ụmụ ndị inyom abụọ mara mma. Obi dị m ụtọ nke ukwuu.”
Ọ malitere ibe ákwá. Ka anyị nọgidere na-ekwu okwu, ọ gwara m banyere ya ịbụ onye e dinara n’ike, ọ tụrụ ime, ma nweta nrụgide iwepụta m maka nkuchi; ọ gwaziri m na ya mesịrị gaa di nakwa ka oge ụfọdụ gasịrị, ka ọ nọ n’ụlọ ọgwụ na-agbake n’ahụ a wara ya, ọkụ gbagburu nwa ya nwanyị na nne ya. Ọ sịrị na ka ọ dị n’oge ahụ ọ dị ya ka Chineke akpọrọwo ndị a a hụrụ n’anya iji kwụọ ụgwọ nwa nwoke o wepụtara maka nkuchi. “Ee e,” ka m zara ngwa ngwa, “Chineke adịghị eme otú ahụ!” O kwuru na ya maara nke ahụ ugbu a, n’ihi na mgbe ihe ọghọm ahụ gasịrị ọ malitewo “ịchọgharị eziokwu Bible,” ọ bụkwa “onye mmụta Bible” ugbu a.
Amalitere m iche, ‘Nke a apụghị ịbụ eziokwu,’ ka m na-ajụ sị: “Ole ndị ka i so mụọ ihe?” E nwere ogologo oge idere duu. Mgbe ahụ ọ sịrị: “Ndịàmà Jehova.” Akpata oyi wụrụ m nke ukwuu nke na ekwulighị m okwu. N’anya mmiri, emesịrị m gbalịa ikwu, “Abụkwa m Onyeàmà.” Mgbe m kwughachiri ya n’ụzọ doro anya karị, ọṅụ gbuwere ya ka mmanya. Ihe dum amagbuo onwe ya!
Nne m ghọrọ Onyeàmà na 1975, oge ụfọdụ mgbe nwa ya nwanyị nwụsịrị. Mgbe di ya malitere inwe ọganihu ime mmụọ, ọ gwara ya banyere m. Ọ kasiri ya obi ma gwa ya na ha ga-achọ m. Ma ọ dịteghị anya, ọ nwụrụ n’ihe ọghọm ụgbọala, na-ahapụrụ ya ụmụaka atọ ịzụlite. Anyị kwurịtara okwu ruo ọtụtụ hour n’ọtụtụ uhuruchi mgbe nke ahụ gasịrị. N’ikpeazụ, anyị kpebiri izute na Phoenix, Arizona, n’izu nke abụọ na February 1996. Nne m emeworị ndokwa ịga ebe ahụ ya na nwanna nwanyị ọzọ bụ́ onye Kraịst.
Ndịghachi n’Otu A Gaghị Echefu Echefu
Maka njem a mụ na Trina hapụrụ ụmụ anyị n’ụlọ. Ka m si n’ụgbọelu na-arịtu, ahụrụ m nne m wee nwee ike n’ikpeazụ ịmakụ ya. Mgbe anyị makụrụ, ọ sịrị na ya echerewo afọ 29 iji jide m aka, o jidekwara m ruo ogologo oge. Nnọkọ anyị tọrọ oké ụtọ, anyị serịtakwara foto ma kọrịta akụkọ. Otú ọ dị, ihe kasị dị ịrịba ama bụ mụ ịnọdụ n’akụkụ mama m n’Ụlọ Nzukọ Alaeze na Phoenix! Anyị gekọrọ ntị ná nzukọ ahụ ma guzo n’akụkụ onwe anyị ka anyị na-abụ abụ Alaeze. Ọ bụ mmetụta tọgburu onwe ya n’ụtọ nke m ga na-echeta ruo ebighị ebi.
N’April 1996, nwanne m nwanyị bụ́ Laura si n’ebe obibi ya dị na Iowa bịa ileta anyị. Lee ka o si magbuo onwe ya iso ya nwee mkpakọrịta ndị Kraịst! Mụ na ụmụnne m abụọ ndị nwoke m chọtara ọhụrụ akparịtawokwa na fon. Mụ na ezinụlọ m ịdịghachị n’otu magburu onwe ya, ma ịdị n’otu n’ịhụnanya n’ime nzukọ Jehova bụ onyinye nke nanị Chineke ukwu anyị, bụ́ Jehova, pụrụ inye.—Dị ka Dana Folz si kọọ.
[Foto dị na peeji nke 29]
Mụ na nne mụrụ m