Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w26 Eprel p. 14-19
  • Na-ele Nsogbu Anya Otú Kwesịrị Ekwesị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Na-ele Nsogbu Anya Otú Kwesịrị Ekwesị
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2026
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • OTÚ ANYỊ KWESỊRỊ ISI NA-ELE NSOGBU ANYA
  • IHE ILE NSOGBU ANYA OTÚ NA-ADỊGHỊ MMA NWERE IKE IME ANYỊ
  • IHE NDỊ I NWERE IKE IME MA NSOGBU BỊARA GỊ
  • Nsogbu Ndị Ị Na-enwe Hà Bụ Ntaramahụhụ Si n’Aka Chineke?
    Teta!—2009
  • Na-echeta na Jehova Bụ “Chineke Dị Ndụ”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
  • Otú Jehova Si Enyere Anyị Aka Ịtachi Obi
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Dịrị Umeala n’Obi ma E Nwee Ihe Ị Na-amaghị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2026
w26 Eprel p. 14-19

JUN 15 RUO 21, 2026

ABỤ NKE 122 Ka Anyị Guzosie Ike, Kwụrụ Chịm

Na-ele Nsogbu Anya Otú Kwesịrị Ekwesị

“Ọ bụ eziokwu na m na-ata ahụhụ, ihe ana-esikwara m ike, ma iwu gị ka na-eme m obi ụtọ.”​—ỌMA 119:143.

IHE A GA-AMỤ

Ile nsogbu anya otú kwesịrị ekwesị ga-enyere anyị aka idi ya.

1-2. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ka anyị nwee ike idi nsogbu bịaara anyị? (Kọwaakwa foto.)

IHE i kweere ò mere ka a na-emegbu gị, ndị ezinụlọ gị ana-akpagbu gị ma ọ bụ ndị ọchịchị ana-emegide gị? È nwere ọrịa ị na-arịa, ka gị na nká ọ̀ na-alụ? È nwere ọdachi dakwasịrị gị, dị ka ihe atụ, è nwere onye nwụnahụrụ gị? “Nsogbu na ahụhụ” nwere ike iju ná ndụ gị otú ahụ o juru ná ndụ ọtụtụ ndị ohu Jehova ọ hụrụ n’anya.​—Ọma 90:10.

2 Ọ bụrụ na anyị chọrọ idi nsogbu, anyị kwesịrị ịna-ele ya anya otú kwesịrị ekwesị. Gịnị ka ọ pụtara? Ka anyị weregodị ihe atụ kọwaa ya. Nsogbu ndị na-abịara gị dị ka ihe ndị nwere ike ịnọchiri gị ụzọ ma ị na-anya ụgbọala. Ụfọdụ nwere ike ime ka ị gaa n’aka nri ma ọ bụ n’aka ekpe, ka i jiri ya nwayọọ ma ọ bụkwanụ kwụsịtụ. Ma, ka i nwee ike ịma nke ị ga-eme, ị ga-ahụ ihe ahụ nọchiri ụzọ nke ọma. Ị gaghị ahụ ya ma ọ bụrụ na igirigi ma ọ bụ mmiri apịtị kpuchiri ihu ụgbọala gị. Ọ bụrụkwa na anyị chọrọ idi nsogbu bịaara anyị, anyị kwesịrị ile ya anya otú Jehova si ele ya. N’isiokwu a, anyị ga-atụle (1) otú anyị kwesịrị isi na-ele nsogbu anya, (2) otú ile nsogbu anya otú na-ekwesịghị ekwesị ga-esi mee ka ihe ka njọ, nakwa (3) ihe ndị anyị ga-eme iji na-ele nsogbu bịaara anyị anya otú kwesịrị ekwesị.

Ebe otu nwoke na-anya ụgbọala, unyi juru ihu ụgbọala ya, ya ahụ ihe e ji tụchie ụzọ na mberede.

Anyị kwesịrị ịna-ele nsogbu anyị anya otú kwesịrị ekwesị ka anyị nwee ike idi ha (A ga-akọwa ya na paragraf nke 2)


OTÚ ANYỊ KWESỊRỊ ISI NA-ELE NSOGBU ANYA

3. Gịnị mere nsogbu ji abịara anyị?

3 Anyị agaghị agbaliri nsogbu ọsọ n’ụwa Setan a. Ebe anyị ka bi n’ụwa a Ekwensu na-achị, nsogbu ga-erute anyị aka. Ihe ọzọ bụ na nsogbu ga na-abịakwuru anyị ka ọgwụgwụ ụwa ochie a na-eru nso. E nwere ike inwe ọdachi ndị na-emere onwe ha ma ọ bụkwanụ ndị nke mmadụ kpatara. (Mat. 24:8; 2 Tim. 3:13) Ọ bụrụ na Jehova ewepụ nsogbu ndị ahụ niile ugbu a, ọ ga-adịzi ka ọ̀ na-enyere Setan aka ịchị ụwa. Ebe ọ bụ Setan na-achị ụwa a, ọdachi ga na-abịara anyị.​—Ekli. 9:12.

4. Olee nsogbu ọzọ na-abịara Ndị Kraịst?

4 Nsogbu na-abịakwara anyị n’ihi na anyị bụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ọtụtụ ugboro na a ga-akpagbu ha n’ihi na ha na-eme ihe o kwuru. (Mat. 24:9; Jọn 16:2) Ihe a na-enyere anyị aka ka mkpagbu a na-akpagbu anyị ghara ime ka okwukwe anyị gharazie isi ike. (1 Tesa. 3:3, 4) Anyị die ọnwụnwa n’ihi na anyị nwere okwukwe siri ike, ọ ga-eme ka obi sie anyị ike na anyị ka nọ n’ụzọ nke na-eduga ná ndụ ebighị ebi. Ihe ọzọ bụ na anyị die ọnwụnwa, ọ na-egosi na anyị họọrọ ife Jehova n’ihi na ọ bụ ya bụ onye ọchịchị kacha mma. Ọ na-egosikwa na Setan bụ onye ụgha. Otu n’ime ụgha ndị Setan na-agha bụ na ụmụ mmadụ na-efe Jehova naanị n’ihi ihe ndị ọ na-emere ha. Ọ bụ ya mere ọ na-eji akpagbu ndị ohu Chineke nke ukwuu iji gosi na ha agaghị anọgide na-efe Chineke. (Job 1:9-11) Ọ bụrụ na anyị atachie obi n’ihi na anyị hụrụ Jehova n’anya, ọ na-eme Jehova obi ụtọ.​—Ilu 27:11.

5. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe e kwuru n’Ekliziastis 7:13, 14? (Kọwaakwa foto.)

5 Jehova kwere ka nsogbu na-abịara anyị. Jehova anaghị eme ihe ọjọọ ma ọ bụkwanụ jiri ihe ọjọọ na-anwa anyị. (Jems 1:13) Eze Solomọn kwuru na “ọ bụ Chineke kwere ka e nwee . . . ụbọchị ọjọọ.” (Gụọ Ekliziastis 7:13, 14.) N’ihi ya, Jehova nwere ike ikwe ka ihe ọjọọ mee. Ma, ọ bụghị ya na-akpata ya. Solomọn nyere anyị ezigbo ndụmọdụ ga-enyere anyị aka ịna-ele ọnwụnwa anya otú kwesịrị ekwesị. Nke mbụ, anyị kwesịrị ịma na ebe anyị bi n’ụwa Ekwensu, a ga-enwe ụbọchị ihe ọma ga-eme, nweekwa ụbọchị ihe ọjọọ ga-eme. “N’ụbọchị ihe ọma mere,” anyị nwere ike igosi Chineke na obi dị anyị ụtọ maka ihe ọma ndị ọ na-emere anyị, werekwa ya ka onyinye o nyere anyị. Nke abụọ, Solomọn na-echetara anyị na anyị agaghị ‘amata ihe ga-eme n’ọdịnihu.’ N’ihi ya, anyị agaghị amali ụbọchị ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ ga-eme anyị. Nsogbu ndị a na-atụghị anya ha nwere ike ịbịara ma onye ezi omume ma onye ajọ omume.

Foto ndị na-egosi: Ebe ihe ọjọọ na ihe ọma mere n’ubi otu nwoke. 1. Ebe obi dị ya ụtọ ka ọ na-aghọrọ tomato ya mere nke ọma. 2. N’ụbọchị ọzọ ọ gara n’ubi ya, obi adịghị ya mma ka ọ na-ele tomato ya mebiri emebi, ubi ya achanwụọkwala.

Anyị kwesịrị ịghọta na ebe anyị ka bi n’ụwa Setan, ihe ọma nwere ike imere anyị mgbe ụfọdụ, mgbe ụfọdụkwa, ihe ọjọọ emee anyị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5)


6. Gịnị mere Jehova nwere ike iji ekwe ka ọnwụnwa bịara anyị? (Ndị Hibru 12:7, 11)

6 Ọ bụrụ na anyị elee nsogbu bịaara anyị anya otú kwesịrị ekwesị, anyị ga-achọpụta na Jehova ji ya na-akụziri anyị ka anyị tụkwasị ya obi, ọ bụghị onwe anyị. Ma, Jehova na-ahụ ahụhụ anyị na-ata. Ọ na-ewutekwa ya. Ọ ga-enyekwara anyị aka. Ọ bụrụgodị na o kwe ka anyị ‘jee ije na ndagwurugwu gbara oké ọchịchịrị,’ ọ ka ga na-eduzi anyị, na-eme ka obi sie anyị ike na ọ hụrụ anyị n’anya, na-enyekwa anyị ike anyị ga-eji na-edi ya. (Ọma 23:4) Nsogbu ga-emeli ka anyị chọpụta ebe anyị na-adịghị ike, Jehova enyekwara anyị aka imekwu nke ọma. (Gụọ Ndị Hibru 12:7, 11.) Dị ka ihe atụ, Job kwesịrị ịmụtakwu ịdị umeala n’obi. Ọ bụ eziokwu na ọ bụghị Jehova kpatara ọnwụnwa bịaara Job, ma o kwere ka ọ bịara ya, jirikwa ya mee ka ọ mụta ihe ndị bara uru. (Job 42:1-6) N’agbanyeghị nsogbu nwere ike ịbịara anyị, anyị ma na ọnwụnwa ọ bụla Jehova kwere ka ọ bịara anyị agaghị akpatara anyị nsogbu ga-adịru mgbe ebighị ebi. Ọ bụrụ na anyị atachie obi mgbe ọnwụnwa bịaara anyị, ‘anyị ga-emeri.’​—Rom 8:35-39.

7. Gịnị mere ị ga-eji na-enwe obi ụtọ ọ bụrụgodị na a na-akpagbu gị maka ihe i kweere?

7 Anyị ga-enweli obi ụtọ mgbe a na-akpagbu anyị. Ọ bụrụ na a na-akpagbu gị maka ihe i kweere, echela na ọ na-egosi na Jehova anaghịzi agọzi gị. Kama, cheta na mkpagbu a na-akpagbu gị na-egosi na ihe gị dị Jehova mma. (Mat. 5:10-12) Ọ bụrụ na i si otú ahụ lewe mkpagbu anya, ị ga na-enwe ụdị ọṅụ ahụ ndịozi Jizọs nwere mgbe a na-akpagbu ha. (Ọrụ 5:40-42) Ihe ọzọ bụ na i nwere ike iji ohere ahụ nyere ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova aka ịmụta eziokwu ma “too Chineke.” (1 Pita 2:12) Dị ka Josef, ihe ga-agaliri gị nke ọma n’oge nsogbu bịaara gị, ọ bụghị naanị mgbe ọ gafere.​—Jen. 39:3, 23.

8. Olee ihe ọzọ kwesịrị ime ka anyị na-atachi obi mgbe nsogbu bịaara anyị?

8 Nsogbu bịaara anyị ga-emecha kwụsị. Akụkọ Job na-akụziri anyị na nsogbu bịaara anyị ga-emecha kwụsị. Nke bụ́ eziokwu bụ na “Jehova gọziri ngwụcha ndụ Job karịa mmalite ya.” (Job 42:12) Otú ahụkwa ka Jehova ga-esi agọzi anyị n’ụwa ọhụrụ. Ndụ anyị dị taa, nke nsogbu nwere ike iju na ya, dị mkpụmkpụ ma e jiri ya tụnyere ndụ ebighị ebi anyị ga-adị n’ọdịnihu. Iburu ihe a n’uche kwesịrị ime ka anyị tachie obi ruo ọgwụgwụ.​—Mat. 24:13.

IHE ILE NSOGBU ANYA OTÚ NA-ADỊGHỊ MMA NWERE IKE IME ANYỊ

9. Olee otú ile nsogbu anyị anya otú na-ekwesịghị ekwesị nwere ike isi mee ka nsogbu anyị ka njọ?

9 N’agbanyeghị nsogbu bịaara anyị, anyị kwesịrị ịna-ele ya anya otú kwesịrị ekwesị ma ọ bụrụ na anyị achọghị ịkpatakwuru onwe anyị nsogbu. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike iche na ọ bụ Jehova kpatara nsogbu anyị. E nwere mgbe Job chere na ọ bụ Jehova kpatara nsogbu ndị bịaara ya. O mekwara ka ọ ‘gbalịwa igosi na ya bụ onye ezi omume kama igosi na ọ bụ Chineke bụ onye ezi omume.’ (Job 32:2) Naomi takwara Jehova ụta ná mmalite maka nsogbu ndị bịaara ya. (Rut 1:13, 20, 21) A sị na Job na Naomi akwụsịghị iche otú ahụ, ha gaara ewewe iwe, kwụsịzie ife Jehova. (Ilu 19:3) Ma, Jehova nyeere ha aka ka ha lewe nsogbu ha anya otú kwesịrị ekwesị, gọziekwa ha maka irubere ya isi.

10. Nsogbu bịara anyị, gịnị ka anyị nwere ike ichewe?

10 Ọ bụrụgodị na obi siri anyị ike na ọ bụghị Jehova kpatara nsogbu bịaara anyị, anyị nwere ike ichewe ma ihe banyere anyị ọ̀ ka na-emetụ ya n’obi. Iche otú ahụ nwere ike ime ka ike gwụwa anyị. (Ilu 24:10) Ọtụtụ nsogbu bịaara Eze Devid na onye amụma bụ́ Habakọk. E nwekwara mgbe obi na-esighị ha ike na Jehova na-anụ ákwá ha na-ebe ka o nyere ha aka. (Ọma 10:1; Hab. 1:2) Ma, ha akwụsịghị ikpe ekpere. Jehova mere ka obi sie ha ike na ọ na-akwado ha. Ọ ga-emekwara gị otú ahụ.​—Ọma 10:17.

11. Olee ihe nwere ike ime anyị ma ọ bụrụ na anyị anaghị ele nsogbu anya otú kwesịrị ekwesị?

11 Ọ bụrụ na anyị anaghị ele nsogbu anya otú kwesịrị ekwesị, nsogbu bịaara anyị nwere ike iju anyị anya. Anyị nwedịrị ike ichewe na o kwesịghị ịbịara anyị. (1 Pita 4:12) Anyị ga-amụtali ihe n’aka ndị na-eso ụzọ Jizọs. Mgbe Jizọs gwara ha na a ga-akpagbu ya ma gbuo ya, ha ekwetaghị. (Luk 18:33, 34) N’agbanyeghị na ọ gwara ha hoo haa na a ga-ata ya ụdị ahụhụ ahụ, Pita onyeozi chere na Chineke agaghị ekwe ka Jizọs taa ahụhụ. Jizọs ma na iche otú ahụ nwere ike igbochi ya ime uche Jehova. N’ihi ya, ọ baara Pita mba. (Mak 8:31-33) Mgbe Jizọs nwụchadịrị, ndị na-eso ụzọ ya aghọtaghị ozugbo ihe mere e ji gbuo ya. Ma, ike ha agwụghị Jizọs. N’okwu ọ gwara ha mgbe a kpọlitechara ya n’ọnwụ, o nyeere ha aka ịghọta ihe mere o ji taa ahụhụ. Otú o si mee ya bụ ‘ịkọwara ha Akwụkwọ Nsọ nke ọma.’ (Luk 24:25-27, 32, 44-48) Ọ bụrụ na ha atụgharịa uche n’ihe Jizọs kụziiri ha, ọ ga-enyere ha aka ijikere maka mkpagbu a ga-ebido ịkpagbu ha n’oge na-adịghị anya. Iche banyere eziokwu Baịbụl ga-enyekwara anyị aka ijikere maka nsogbu.

12. Gịnị ka anyị nwere ike iche ma anyị lewe nsogbu anyị anya otú na-adịghị mma?

12 Ile nsogbu anyị anya otú na-ekwesịghị ekwesị nwere ike ime ka anyị chee na ọ dị njọ karịa otú ọ dị n’eziokwu. N’ihe atụ Jizọs mere banyere ndị ọrụ ubi vaịn, o gosiri otú ụdị ihe ahụ nwere ike isi mee anyị. Obi adịghị ụfọdụ n’ime ha mma maka na ha chere na a kwụghị ha ụgwọ e kwesịrị ịkwụ ha. Ma onye nwe ubi ahụ sịrị otu n’ime ha: “Enyi, ọ dịghị ihe ọjọọ m mere gị.” (Mat. 20:10-13) Ndị ọrụ ahụ chere na nwoke ahụ mere ha ihe ọjọọ. Mana, ọ bụghị eziokwu. Ihe mere obi adịghị ha ụtọ bụ na ha tụrụ anya ihe ha na-ekwesịghị ịtụ anya ya. Ụfọdụ ụmụnna nwere ike iche ụdị ihe ahụ taa. Dị ka ihe atụ, ha nwere ike iche na ihe e mere ha adịghị mma ma ọ bụrụ na ha enwetaghị ọrụ ha tụrụ anya inweta ná nzukọ Jehova ma ọ bụkwanụ na ha ga-ahapụ nke ha na-arụ. Olee ihe ndị anyị nwere ike ime ka anyị nwee ike ịna-ele nsogbu anya otú kwesịrị ekwesị?

IHE NDỊ I NWERE IKE IME MA NSOGBU BỊARA GỊ

13. Gịnị nwere ike ime ma nsogbu bịara anyị?

13 I nwere ike ịma ihe Baịbụl kwuru gbasara nsogbu. O nwere ike ịbụ na ị gwala ya ndị ọzọ nsogbu bịaara. Ma, nsogbu bịara gịnwa, o nwere ike isiri gị ike ile ya anya otú kwesịrị ekwesị. Dị ka ihe atụ, i nwere ike iche na Jehova na-ata gị ahụhụ ihe ọjọọ i mere ma ọ bụ na ọ naghị anụ ekpere gị. Ọ bụrụ na i chewe otú ahụ, gịnị ka i nwere ike ime?

14. Gịnị ka i nwere ike ikpe n’ekpere ma nsogbu bịara gị? (Ndị Filipaị 4:13)

14 Rịọ Jehova ka o nyere gị aka. Kọọrọ Jehova nsogbu ahụ nakwa otú ọ dị gị. I nwere ike ịgwa ya otú ị chọrọ ka o si nyere gị aka. I nwere ike ịrịọ ya ka o nye gị mmụọ nsọ ya ka i nwee ike idi ya, nyekwa gị amamihe ị ga-eji mee mkpebi dị mma. Ma, cheta na Jehova nwere ike isi otú ị na-atụghị anya ya zaa ekpere gị. (Efe. 3:20) O nwere ike iji ndị mmụọ ozi ma ọ bụ ụmụnna gị nyere gị aka. (Ọma 34:7) N’ihi ya, nabata otú ọ bụla Jehova chọrọ isi nyere gị aka. Ka obi sie gị ike na ọ ga-enye gị mmụọ nsọ ya mgbe ọ bụla ọ dị gị mkpa.​—Gụọ Ndị Filipaị 4:13.

15. Gịnị ga-enyere gị aka idi nsogbu? (Kọwaakwa foto.)

15 Na-eme ihe ndị ga-eme ka gị na Jehova na-adị ná mma. Na-eme ihe ọ bụla ga-eme ka gị na Jehova na-adị ná mma ọ bụrụgodị na ị gaghị emeli ihe niile ị na-emebu. I kwesịrị ịgbalịsi ike ịna-eche echiche ka Jehova, karịchaa n’oge ‘ị na-ata ahụhụ, ihe ana-esikwara gị ike.’ (Ọma 119:143) Akwụsịla ịna-agụ Baịbụl mgbe niile, ịna-amụ ya, na ịna-echebara ya echiche. Na-aga ozi ọma otú ọ bụla i nwere ike. Na-agakwa ọmụmụ ihe ma na-aza ajụjụ. Gị na ụmụnna gị na-anọrị. Anọrọla onwe gị ọ bụrụgodị na ọ bụ ihe na-agụ gị agụụ n’oge ahụ.​—Ilu 18:1.

Ebe otu nwanna nọ n’ụlọ ọgwụ si n’Ịntanet sonyere n’Ọmụmụ Ihe “Ụlọ Nche.” O ji “Ụlọ Nche” na Baịbụl nke ya.

Gbalịa na-eme ihe ndị ga-eme ka gị na Jehova na-adị ná mma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15)


16. Olee ihe ndị nwere ike ịna-eme gị obi abụọ ma nsogbu bịara gị? Gịnịkwa ga-enyere gị aka ịkwụsị inwe obi abụọ? (2 Ndị Kọrịnt 10:4, 5)

16 Kwụsị inwe obi abụọ. Nsogbu bịara gị, i nwere ike ikwetawa ihe ndị na-abụghị eziokwu gbasara onwe gị ma ọ bụ gbasara Jehova. Ụdị ihe ahụ mee, gịnị nwere ike inyere gị aka? (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 10:4, 5.) Ihe nwere ike inyere gị aka ịkwụsị inwe obi abụọ bụ “ịma Chineke.” Otú ị ga-esi amata ya bụ ịna-agụ Baịbụl nakwa ihe ndị nzukọ Jehova na-ewepụta. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịna-eme gị obi abụọ ma ihe gị ọ̀ ka na-amasị Jehova. Ọ bụrụ otú ahụ, mụọ gbasara Pọl onyeozi. Mgbe ọ na-eje ozi ya, ọtụtụ nsogbu kpụ ọkụ n’ọnụ bịaara ya. Ma, nsogbu ndị ahụ mere ka obi sikwuo ya ike na ọ bụ onye ozi Kraịst ihe ya masịrị Chineke. (2 Kọr. 11:23-27) Ị̀ na-eche ma Jehova ọ̀ gbagharala gị mmehie i mere n’oge gara aga? Ọ bụrụ otú ahụ, depụta amaokwu Baịbụl ndị na-egosi na Jehova na-agbaghara mmehie. (Aịza. 43:25) Gụzie amaokwu ndị ahụ ma chebara ha echiche. (Ọma 119:97) È nweela ihe na-agbawa obi mere ka i chewe ma Jehova ọ̀ na-emezu nkwa o kwere ichebe ndị ohu ya? Ọ bụrụ otú ahụ, mee nchọnchọ n’ihe mere Chineke ji kwe ka ahụhụ dịrị nakwa otú ọ ga-esi chebe ndị ohu ya ka ihe ọ bụla ghara ime ka ha na ya gharazie ịdị ná mma. (Ọma 91:9-12) Gụọkwa akụkọ ụmụnna anyị ndị nsogbu bịaara, ha edie ya.a

17. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma nsogbu bịara anyị?

17 Ihe bịaara gị ugbu a ọ̀ bụ ụbọchị ihe ọma, ya bụ, na e nweghị nnukwu nsogbu gị na ya na-alụ? Ọ bụrụ otú ahụ, kelee Jehova ma na-eto ya maka ihe ọma ndị o nyere gị. (Ekli. 7:14) Ma, ọ bụrụ na nsogbu abịara gị, gbalịa na-ele ya anya otú kwesịrị ekwesị ma na-atụkwasịkwu Jehova obi. I mee otú ahụ, Jehova ‘ga-enyere gị aka idi ya.’ (1 Kọr. 10:13) Ma, gịnị ka anyị kwesịrị ime ma nsogbu bịara ụmụnna anyị? Anyị ga-aza ajụjụ a n’isiokwu na-eso nke a.

GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

  • Gịnị ga-enyere anyị aka ịna-ele nsogbu anyị anya otú kwesịrị ekwesị?

  • Olee otú ile nsogbu anya otú na-ekwesịghị ekwesị ga-esi mee ka ihe ka njọ?

  • Gịnị ka anyị ga-eme ma nsogbu bịara anyị?

ABỤ NKE 150 Chọọ Chineke Ka O Chebe Gị

a Dị ka ihe atụ, akụkọ ndụ bụ́ “Ezinụlọ Ọdachi Dakwasịrị ma Ha Emechaa Nwewekwa Obi Ụtọ” dị na jw.org kọrọ otú Nwanna David Maza na ezinụlọ ya si die ọnwụ nwa ya nwoke.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya