JUN 8 RUO 14, 2026
ABỤ NKE 8 Jehova Bụ Ebe Mgbaba Anyị
“Chineke, Onye Eziokwu,” Na-emezu Nzube Ya Mgbe Niile
“Ị napụtala m, Jehova Chineke, onye eziokwu.”—ỌMA 31:5.
IHE A GA-AMỤ
Anyị ga-amụ ihe mere obi ga-eji sie anyị ike na Jehova ga-emezu nkwa o kwere ime ka ụwa ghọọ Paradaịs nakwa na n’oge na-adịghị anya, ọ ga-ewepụ ụgha niile Setan mere ka ndị mmadụ kweta.
1. Dị ka e kwuru n’Abụ Ọma 31:2-5, gịnị mere anyị ga-eji tụkwasị Jehova obi?
ANYỊ bi n’ụwa Ekwensu na-achị. Ihe juru na ya bụ ụgha na aghụghọ. O siri ike ịmata onye a ga-atụkwasịli obi. Ndị ọchụnta ego na-aghọgbu ibe ha. Ọtụtụ ndị na-aghakarị ụgha banyere ngwá ahịa ha chọrọ ka ndị mmadụ zụọ. Ụfọdụ ndị achọpụtakwala na ha agaghị atụkwasịli ezigbo ndị enyi ha obi. Ma, obi dị anyị ụtọ na anyị ga-atụkwasịli Jehova obi mgbe niile. Ọ bụ “Chineke, onye eziokwu.” (Gụọ Abụ Ọma 31:2-5.) Jehova bụ Chineke eziokwu. E nweghị mgbe ọ na-agha ụgha. Anyị ga-atụkwasịli ya obi n’ihi na ọ ga-emezu ihe niile o kwuru.
2. Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu a?
2 N’isiokwu a, anyị ga-ebu ụzọ kwuo ihe ụfọdụ mere anyị ga-eji tụkwasị Jehova obi anyị niile. Anyị ga-ekwukwa otú Chineke ga-esi bibie Ekwensu na ụwa ọjọọ ya nakwa ihe ọ na-eme ugbu a iji mezuo nzube ya maka ụwa na ụmụ mmadụ. Isiokwu a ga-emekwa ka ọ gụsiwe anyị agụụ ike ịkọrọ ndị ọzọ eziokwu gbasara Jehova.
IHE MERE ANYỊ GA-EJI TỤKWASỊ JEHOVA OBI
3. Gịnị mere anyị ga-eji tụkwasị Jehova obi anyị niile?
3 Anyị ga-atụkwasịli Jehova obi n’ihi na ọ bụ ya kere anyị. Ọ bụ ya kere eluigwe na ụwa na ihe niile dị ndụ. (Jen. 1:1; Ọma 36:9; Mkpu. 4:11) O kere ụwa, keekwa ma ikuku anyị na-ekuru ma mmiri anyị na-aṅụ ka anyị nwee ike ịdị ndụ. Ihe niile dị n’eluigwe na n’ụwa dị n’aka ya. Ebe ọ bụ Jehova kere anyị, mara ihe niile, nweekwa ike na-enweghị atụ, obi ga-esili anyị ike na ọ ga na-eduzi anyị, meekwa ka anyị nweta ndụ kacha mma n’ọdịnihu.
4. Olee otú anyị si mara na Jehova hụrụ anyị n’anya?
4 Anyị ga-atụkwasịli Jehova obi n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya. O kere ụmụ mmadụ n’ihi na ọ chọrọ ka ha dịrị ndụ otú yanwa dị, ndụ ana-atọkwa ha ụtọ. Jehova kwuru ihe o bu n’obi kee mmadụ. Ọ sịrị: “Ka anyị kee mmadụ n’oyiyi anyị, ka ha dị ka anyị.” (Jen. 1:26) O kere anyị ka anyị nwee ike ikpebiri onwe anyị ihe, nyekwa anyị ebe mara mma anyị ga-ebi, ya bụ, ụwa anyị a. (Ọma 115:16) O nyere nne na nna anyị mbụ ọrụ magburu onwe ya, nke bụ́ ime ka ụwa bụrụ Paradaịs. (Jen. 1:28; 2:15) O nyere ha ezigbo nri juru eju bara abara, ọtụtụ ụmụ anụmanụ na ihe ndị a kụrụ akụ, nakwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ. O nyere ha ihe ndị a ka ha nwee ike ịna-enwe obi ụtọ. Ihe ndị a gosiri nnọọ na “Jehova na-ahụ ndị na-atụ egwu ya n’anya ruo mgbe ebighị ebi.”—Ọma 103:17.
5. (a) Olee otú Jehova si mezuo okwu ya n’agbanyeghị isi Adam na Iv nupụụrụ ya? (b) Olee ụfọdụ nkwa Jehova mezurulanụ? (Kwuo ihe dị n’igbe isiokwu ya bụ “Ihe Ndị Gosiri na Jehova Na-ekwu Eziokwu Mgbe Niile.”)
5 Anyị ga-atụkwasịli Jehova obi n’ihi na ọ na-emezu nkwa ya mgbe niile. Jehova ‘ekeghị ụwa a na nkịtị. Kama o kere ya ka ndị mmadụ biri na ya.’ (Aịza. 45:18, 19) Mgbe Adam na Iv nupụụrụ Jehova isi, ihe na-echezi ha bụ ọnwụ. N’ihi ya, o yiri ka nzube Jehova agaghịzi emezu. Ma e nweghị ihe ga-egbochi Jehova imezu nkwa ya niile. (Aịza. 46:10, 11) Nzube ya bụ ka ndị na-erubere ya isi biri n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi. Ọ gbanwebeghịkwa. Ọ bụ ya mere o ji kwe ka Adam na Iv mụọ ụmụ. O ziteziri Ọkpara ọ mụrụ naanị ya ka o jiri ndụ ya chụọ àjà ka ụmụ Adam nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi.—Jọn 3:16.
IHE JEHOVA NA-EME IJI MEZUO NZUBE YA
6. Mgbe Adam na Iv nupụchara isi, gịnị ka Jehova kwuru ga-eme?
6 Onye mere ka Adam na Iv nupụrụ Jehova isi bụ “agwọ mbụ ahụ, onye a na-akpọ Ekwensu na Setan.”a (Mkpu. 12:9; Jen. 3:4, 5; Jọn 8:44) Jehova mara ya ikpe na a ga-ebibi ya. (Jen. 3:15) Tupu e bibie ya, ọtụtụ ndị ga-esoro ya ma na-eme ka ya. Ma, a ga-enwe ndị ga na-erubere Jehova isi.
7. Ole ndị na-eso Ekwensu? Gịnịkwa ka a ga-eme ha?
7 Ndị na-eso Ekwensu bụ ndị mmụọ ozi nupụụrụ Jehova isi na ụmụ mmadụ na-ekweghị erubere Chineke isi. Ebe ọ bụ na ha na-agba nzube Chineke ụkwụ, ha mere onwe ha ụmụ Ekwensu. Ma, n’oge Chineke kara aka, a ga-ebibi Setan na ndị òtù ya niile.—Dan. 2:44; Rom 16:20.
8. Gịnị ka Jizọs mere n’afọ 1914? (Kọwaakwa foto.)
8 Gịnị mere obi ga-eji sie anyị ike na Chineke ga-ebibi Setan na ndị òtù ya otú ahụ o kwuru? N’afọ 1914, Jizọs malitere ịlụso Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya ọgụ. O sikwa n’eluigwe chụdata ha n’ụwa. (Mkpu. 12:7-9) Ọ bụ eziokwu na ọ bụ n’eluigwe ka a lụrụ ọgụ ahụ, ndị nọ n’ụwa hụrụ ihe gosiri na a lụrụ ya. Baịbụl sịrị: “Ụwa na oké osimiri ga-ata ahụhụ n’ihi na Ekwensu agbadatala ebe ha nọ. Ezigbo iwe ji ya maka na ọ ma na oge ya fọrọ ntakịrị.” (Mkpu. 12:12) Kemgbe afọ 1914, ebe Ekwensu lekwasịrị anya bụzi n’ụwa. Ihe a emeela ka ihe na-eme n’ụwa na-akakwu njọ. N’eziokwu, ‘ụwa ataala ahụhụ.’ N’oge na-adịghị anya, Jizọs ‘ga-emeri ruo n’isi.’ Ọ ga-ebibi Setan na ndị niile na-akwado ya. (Mkpu. 6:2) Jizọs ga-edo aha Chineke nsọ. (Ọma 45:4-6) Ọ ga-edo onye ọ bụla anya na Jehova bụ Chineke, onye eziokwu.—Ezik. 38:23.
Agha Ụwa Nke Mbụ: U.S. National Archives photo; bọmbụ: USAF photo; ọrịa na-efe efe: blvdone/stock.adobe.com; ọgba aghara: inhauscreative/E+ via Getty Images
Kemgbe afọ 1914, ihe ọjọọ ndị na-eme n’ụwa akala njọ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8)
CHINEKE NA-ACHỊKỌTA NDỊ HỤRỤ EZIOKWU N’ANYA
9. Olee ndị Jehova na-achịkọta taa?
9 Jehova na-achịkọta “ihe niile dị n’eluigwe na ihe niile dị n’ụwa, ka ha nọrọ n’okpuru Kraịst.” (Efe. 1:10) “Ihe niile dị n’eluigwe” bụ Ndị Kraịst e tere mmanụ ndị Jehova họọrọ ka ha soro Kraịst chịa n’eluigwe. “Ihe niile dị n’ụwa” bụ ndị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi na Paradaịs n’ụwa. Ndị a niile na-efe Chineke na-agba ụgha Setan n’anwụ ma na-enyere ndị nwere ezi obi aka ịmata eziokwu.
10. Olee otú Jehova si eme ka ndị mmadụ mata ụgha okpukpe ụgha na-akụzi? (Mkpughe 14:6, 7)
10 Ihe Jehova ji na-achịkọta ndị hụrụ eziokwu n’anya bụ ozi ọma a na-ekwusa n’ụwa niile. Ọ bụ ya bụ ozi ọma kachanụ e kwusatụrụla n’ụwa. (Gụọ Mkpughe 14:6, 7.) Ọ bụ eziokwu na ọ bụ ụmụ mmadụ ka Jehova na-eji ezi ndị ọzọ ozi ọma, ndị mmụọ ozi sokwa na-achịkọta ndị nwere ezi obi ka ha bata n’ọgbakọ Ndị Kraịst. E ji ozi ọma a na-eme ka a mata ụgha Babịlọn Ukwu, ya bụ, okpukpe ụgha niile e nwere n’ụwa, na-akụzi. Ọ bụ ha ka Ekwensu ji na-agbasa ụgha gbasara Jehova kemgbe ọtụtụ narị afọ. (Mkpu. 18:2, 4) N’oge na-adịghị anya, a ga-ebibi okpukpe ụgha niile kpamkpam. Ndị niile hụrụ Chineke, onye eziokwu, n’anya ga na-enyezi ya otuto kwesịrị ya.—Mkpu. 17:16.
11. Olee otú anyị ga-esi amata ndị na-efe Chineke otú ọ chọrọ?
11 Jehova na-akpọbata ụdị mmadụ dị iche iche si n’ebe niile n’ụwa n’ọgbakọ ya. (Mkpu. 7:9, 10) Ha nụ “ozi ọma,” ha na-aghọta na ha amatala eziokwu. Ha na-achọkwa isoro ndị Jehova. (Mak 13:10) Taa, a matala ndị na-efe Jehova otú ọ chọrọ. Malakaị onye amụma buru amụma, sị: “Unu ga-ahụkwa ọzọ ihe dị iche n’onye ezi omume na onye ajọ omume, n’onye na-ejere Chineke ozi na onye na-anaghị ejere ya ozi.” (Mal. 3:18) Ndị Jehova na-esi n’àgwà ha na-akpa nakwa n’ozi ọma ha na-ekwusa egosi na ha na-efe Chineke, onye eziokwu.
12. Olee otú ozi ọma anyị na-ekwusa si enye aka emezu nzube Chineke?
12 Anyị kwusawa ozi ọma, anyị na-erubere Jizọs isi, na-emezukwa amụma. (Mat. 24:14; 28:18-20) Ozi ọma a emeela ka ndị si n’ebe dị iche iche n’ụwa ghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs, nweekwa olileanya ife Chineke ruo mgbe ebighị ebi. Obi dị anyị ezigbo ụtọ na anyị so na-arụ ọrụ a Jehova ji na-emezu nzube ya.
OBI SIRI ANYỊ IKE NA JEHOVA GA-EMEZU NKWA YA
13. Olee ndị Setan kacha akpagbu? Maka gịnị?
13 Ezigbo iwe na-ewe Ekwensu n’ihi na ọ ma na ọ “fọrọ ntakịrị” ka e bibie ụwa ya. (Mkpu. 12:12, 13) Ndị ọ kacha akpagbu bụ ndị Chineke họọrọ ka ha soro Jizọs chịa n’eluigwe, ya bụ, “ndị na-edebe iwu Chineke, ndị e nyekwara ọrụ ịgba àmà banyere Jizọs.” (Mkpu. 12:17; 14:12) Setan na-akpagbukwa ndị ọ bụla na-enyere ha aka n’ọrụ ha.
14. Gịnị ga-eme mgbe Setan ga-alụso ndị Jehova ọgụ? (Kọwaakwa foto.)
14 E bibichaa Babịlọn Ukwu, Setan na ndị òtù ya ga-achọ ibibi ndị niile na-efe Jehova. Ọ ga-emezi ka agha Amagedọn malite. (Mkpu. 16:13, 14, 16) Jizọs na ndị agha nke eluigwe ga-anapụta ndị na-efe Jehova ma bibie ihe niile fọrọ n’ụwa Ekwensu kpamkpam. (Mkpu. 19:19-21) A gaghịzi enwe ndị na-eme ihe ọjọọ, ndị na-agha ụgha, na ndị na-aghọ aghụghọ. (Mkpu. 21:8) Onye ọ bụla ga-ama na Jehova na-eme ihe dị mma mgbe niile nakwa na ọ na-ekwu eziokwu.
Ebe Jizọs na ndị agha nke eluigwe na-aga ka ha lụọ agha Amagedọn iji bibie ndị iro Chineke (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14)
15. Gịnị mere obi ga-eji sie anyị ike na Jehova ga-emezu nkwa o kwere anyị maka ọdịnihu? (Aịzaya 65:16, 17) (Kọwaakwa foto.)
15 E nwetụbeghị mgbe ọ bụla ọzọ ndị mmadụ na-adịghị n’otu karịa otú ọ dị taa. Mana, Jehova mere ka ndị ya dịrị n’otu. Ọ ka na-achịkọta ndị hụrụ eziokwu n’anya ka ha soro n’ezinụlọ ya. E nweghị ihe ọ bụla ga-egbochili Jehova ịgọzi ndị ya na ọrụ ha na-arụ. (Gụọ Aịzaya 65:16, 17.) Obi siri anyị ike na Jehova ga-emezu nkwa ya. Ihe Pọl kwuru ná Ndị Rom 8:38, 39 na-eme ka obi sie anyị ike. Ọ sịrị: “Ọnwụ ma ọ bụ ndụ ma ọ bụ ndị mmụọ ozi ma ọ bụ ọchịchị ma ọ bụ ihe ndị dị ugbu a ma ọ bụ ihe ndị ga-abịa abịa ma ọ bụ ike ma ọ bụ ihe ndị dị n’elu ma ọ bụ ihe ndị dị n’okpuru ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ e kere eke agaghị enwe ike ime ka Chineke kwụsị ịhụ anyị n’anya, bụ́ ịhụnanya Kraịst Jizọs Onyenwe anyị nwekwara.”
N’ụwa ọhụrụ, a gaghịzi na-echeta nsogbu ndị dị n’ụwa taa (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15)
16. Gịnị mere i ji tụkwasị Jehova obi gị niile?
16 Anyị kwesịrị ịtụkwasị Jehova bụ́ Chineke onye eziokwu obi. Ọ bụ ya kere anyị. Ọ hụkwara anyị n’anya nke ukwuu. Ndị si ná mba niile na-abịa efe Jehova. Ọ na-eme ka oké ìgwè mmadụ na-amụba n’ike n’ike. (Aịza. 60:22; Zek. 8:23) Anyị ma na ọ na-emezu nkwa ya mgbe niile nakwa na n’oge na-adịghị anya, ọ ga-ebibi Setan na ndị òtù ya niile. Anyị na-ekpe ekpere Devid kpere. Ọ sịrị: “Ka e too Jehova Chineke, . . . onye naanị ya na-eme ihe ndị dị ebube. Ka e too aha ya dị ebube ruo mgbe ebighị ebi, ka ebube ya jukwa ụwa niile.”—Ọma 72:18, 19.
ABỤ NKE 2 Jehova Bụ Aha Gị
a A kpọghị aha onye ahụ bụ́bu mmụọ ozi. Ihe a kpọrọ ya na Baịbụl bụ “Ekwensu,” nke pụtara “onye nkwutọ,” na “Setan,” nke pụtara “onye mmegide.”