ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 51
ABỤ NKE 132 Anyị Bụzi Di na Nwunye
Otú Ị Ga-esi Hazie Agbamakwụkwọ Gị Ka O Mee Ka E Too Jehova
“Na-emenụ ihe niile otú kwesịrị ekwesị nakwa n’usoro.”—1 KỌR. 14:40.
IHE A GA-AMỤ
Otú nwoke na nwaanyị bụ́ Ndị Kraịst chọrọ ịgba akwụkwọ ga-esi mee ka e too Jehova n’ụbọchị agbamakwụkwọ ha.
1-2. Gịnị ka Jehova chọrọ ka i mee n’ụbọchị agbamakwụkwọ gị?
È NWERE onye gị na ya kwekọrịtara na unu ga-alụ? Ọ bụrụ otú ahụ, o doro anya na obi atọgbuola gị. Ọ ga-abụ na unu ahaziwela otú unu ga-esi gbaa akwụkwọ. Ọlụlụ unu gbasara Jehova. Ọ chọrọ ka ụbọchị agbamakwụkwọa unu mee unu obi ụtọ nakwa ka unu abụọ na-enwe obi ụtọ ma unu lụchaa.—Ilu 5:18; Abụ Solo. 3:11.
2 Unu kwesịrị ịkwanyere Jehova ùgwù n’agbamakwụkwọ unu. Maka gịnị? Oleekwa otú unu ga-esi eme ya? Ọ bụ eziokwu na ndị e bu n’obi dee isiokwu a bụ ndị na-akwadebe ịgba akwụkwọ, ma ihe ndị e kwuru na ya nwere ike inyere anyị niile aka ịkwanyere Jehova ùgwù ma anyị gaa agbamakwụkwọ ma ọ bụkwanụ ma e nwee onye sịrị anyị tụọrọ ya aro otú ọ ga-esi hazie agbamakwụkwọ ya.
GỊNỊ MERE ANYỊ KWESỊRỊ IJI KWANYERE JEHOVA ÙGWÙ?
3. Gịnị ka ndị chọrọ ịgba akwụkwọ kwesịrị ichebara echiche mgbe ha na-ahazi agbamakwụkwọ ha? Maka gịnị?
3 Ndị Kraịst chọrọ ịgba akwụkwọ kwesịrị ịhazi agbamakwụkwọ ha ka ọ daba n’ihe Jehova kwuru n’Okwu ya bụ́ Baịbụl. Maka gịnị? Ọ bụ maka na ọ bụ Jehova malitere alụmdi na nwunye. Ọ bụ ya haziri agbamakwụkwọ mbụ, ya bụ, nke Adam na Iv. (Jen. 1:28; 2:24) N’ihi ya, ihe kwesịrị ịkacha ndị chọrọ ịgba akwụkwọ mkpa bụ ime ihe Jehova kwuru.
4. Gịnị mere ndị chọrọ ịgba akwụkwọ ji kwesị ịkwanyere Jehova ùgwù n’ụbọchị agbamakwụkwọ ha?
4 E nwere ezigbo ihe mere i ji kwesị ichebara ihe Jehova kwuru echiche n’ụbọchị agbamakwụkwọ gị. Jehova bụ Nna gị nke eluigwe, bụrụkwa Enyi gị kachanụ. (Hib. 12:9) O doro anya na ị chọrọ ka gị na ya na-adị ná mma. Ị gaghịkwa achọ ka ihe ọ bụla ga-eme n’ụbọchị agbamakwụkwọ gị ma ọ bụ n’ụbọchị ọ bụla ọzọ wute ya. (Ọma 25:14) I chee banyere ihe niile Jehova meere gị na ihe ndị ọ ka ga-emere gị, ọ̀ bụ na i kwesịghị ịkwanyere ya ùgwù n’agbamakwụkwọ gị?—Ọma 116:12.
OLEE OTÚ Ị GA-ESI AKWANYERE JEHOVA ÙGWÙ?
5. Olee otú Baịbụl nwere ike isi nyere ndị chọrọ ịgba akwụkwọ aka ịhazi agbamakwụkwọ ha?
5 Baịbụl enyeghị anyị iwu gbasara otú a ga-esi agba akwụkwọ ma ọ bụ hazie oriri agbamakwụkwọ. N’ihi ya, ndị chọrọ ịgba akwụkwọ nwere ike ịhazi agbamakwụkwọ ha ka ọ daba n’otú ihe si dịrị ha, n’omenala ha, ma ọ bụkwanụ otú ha chọrọ. Ezigbo Ndị Kraịst kwesịkwara irubere iwu ndị ọchịchị nyere gbasara alụmdi na nwunye isi. (Mat. 22:21) N’agbanyeghị ya, ọ bụrụ na e jiri ihe Baịbụl kwuru hazie agbamakwụkwọ, ọ ga-eme ka a kwanyere Jehova ùgwù, meekwa ya obi ụtọ. N’ihi ya, olee ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru i kwesịrị ichebara echiche?
6. Dị ka e kwuru ná Ndị Rom 13:1, 2, gịnị mere o ji dị mkpa ka ndị chọrọ ịgba akwụkwọ rube isi n’ihe iwu obodo kwuru?
6 Rube isi n’ihe iwu obodo unu kwuru. (Rom 13:1, 2) N’ọtụtụ obodo, e nwere ụfọdụ ihe iwu kwuru ndị chọrọ ịgba akwụkwọ ga-eme tupu ha agbaa akwụkwọ. Ndị Kraịst chọrọ ịgba akwụkwọ kwesịrị ịchọpụta ihe iwu obodo ha kwuru ka ha mee. Ọ bụrụ na ị chọrọ enyemaka, i nwere ike ịgwa ndị okenye ọgbakọ unu.b
7. Olee otú agbamakwụkwọ Onye Kraịst kwesịrị ịdị?
7 Gbalịsie ike ka agbamakwụkwọ gị mee ka e too Chineke. (1 Kọr. 10:31, 32) I kwesịrị ịgba mbọ ka agbamakwụkwọ gị gosi na ị bụ onye mmụọ Chineke na-edu, ọ bụghị mmụọ nke ụwa. (Gal. 5:19-26) Ebe ọ bụ nwoke na-agba akwụkwọ ga-abụ onyeisi ezinụlọ ọhụrụ ahụ, ọ bụ ya ga-ahụ na agbamakwụkwọ ya ga-atọ ụtọ, meekwa ka e too Chineke. Olee ihe ga-enyere ya aka ime ya? Ọ bụrụ na e kwuo okwu agbamakwụkwọ si na Baịbụl otú ga-agba ndị mmadụ ume ma gosi na a na-akwanyere ha ùgwù, ọ ga-eme ka ha ghọta na alụmdi na nwunye si n’aka Jehova. Ọ ga-enyekwara ndị niile bịara ya aka ịghọta na alụmdi na nwunye abụghị ihe egwuregwu. Ọ bụ ya mere ọtụtụ Ndị Kraịst chọrọ ịgba akwụkwọ ji anọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze eme ya ma ọ bụrụ na o kwere omume. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịnọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze gbaa akwụkwọ, i kwesịrị idegara ndị okenye akwụkwọ n’oge ma gwa ha na ị chọrọ ịnọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze gbaa akwụkwọ.
8. Olee otú ị ga-esi mee ka oriri agbamakwụkwọ gị mee ka e too Chineke? (Ndị Rom 13:13)
8 Gụọ Ndị Rom 13:13. Ọ bụrụ na ị chọrọ ime oriri agbamakwụkwọ, gịnị ka ị ga-eme ka ọ ghara igosi mmụọ nke ụwa? Okwu Grik a sụgharịrị “oriri oké mkpọtụ” pụtara oriri ebe a na-aṅụfe mmanya ókè ma kpọgide egwú ruo n’ime abalị. Ọ bụrụ na ị chọrọ inye ndị mmadụ mmanya na-aba n’anya n’oriri agbamakwụkwọ gị, mee ihe ndị i kwesịrị ime ka a ghara inwe onye ga-aṅụfe mmanya ókè.c Ọ bụrụ na a ga-akụ egwú, gbalịsie ike ka ọ ghara ịna-adachi ndị bịara ntị ka ha nwee ike ịna-akparịta ụka. Leruo ụdị egwú a ga-akpọ anya ka ihe ndị a na-ekwu na ha ghara inye akọnuche onye ọ bụla nsogbu.
9. Gịnị ka ndị na-akwadebe agbamakwụkwọ kwesịrị iburu n’obi gbasara ihe ndị a ga-ekwu ma ọ bụ ihe ndị ọzọ a ga-eji mee ndị bịaranụ obi ụtọ?
9 À ga-enwe ndị a ga-asị kwuo obere okwu n’oriri agbamakwụkwọ gị? À ga-egosi foto ma ọ bụ vidio, ma ọ bụkwanụ mee ihe ndị ọzọ a ga-eji mee ndị bịaranụ obi ụtọ? Ụdị ihe ndị a na-emekarị ka ụbọchị ahụ pụkwuo iche. Ma, gbalịa hụ na ihe ndị ahụ ga-agba ndị bịaranụ ume. (Fil. 4:8) Jụọ onwe gị, sị: ‘Ihe a ọ̀ ga-egosi na m na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù? Ọ̀ ga-eme ka a na-akwanyere alụmdi na nwunye ùgwù?’ Nke kadị mkpa bụ ịjụ onwe gị, sị: ‘Ọ̀ ga-eme ka e too Jehova?’ Ọ bụ eziokwu na ime ihe ọchị nwere ike ịdaba adaba, ma e kwesịrị izere ihe ọ bụla na-adịghị mma, dị ka iji ihe gbasara mmekọahụ ama njakịrị. (Efe. 5:3) Ọ bụrụ na ndị enyi gị ma ọ bụ ndị ezinụlọ gị ga-ekwu obere okwu, gbalịa hụ na ha ghọtara ụdị ihe ị na-achọghị ka ha kwuo.
10. Gịnị mere ndị chọrọ ịgba akwụkwọ ji kwesị ịghara imefe ihe ókè mgbe ha na-akwadebe agbamakwụkwọ ha? (1 Jọn 2:15-17)
10 Emefela ihe ókè. (Gụọ 1 Jọn 2:15-17.) Obi na-adị Jehova ụtọ ma ndị na-efe ya na-agbalịsi ike ime ka e too ya kama ime ka e towe hanwa. N’ihi ya, ezigbo Ndị Kraịst na-agbalị ka ha ghara imefu ego karịrị akarị na ‘igosi ihe ndị ha nwere.’ Olee uru ọ ga-abara gị ma ị ghara imefu ego karịrị akarị n’agbamakwụkwọ gị? O nwere ike ịbara gị uru ọ baara otu nwanna si Nọọwee aha ya bụ Mike. Ọ sịrị: “O mere ka anyị ghara iji ụgwọ, meekwa ka anyị ghara ịkwụsị ịsụ ụzọ. Anyị mere obere agbamakwụkwọ. Mana, ọ tọrọ ụtọ, na-emekwa anyị obi ụtọ ma anyị cheta ya.” Otu nwanna nwaanyị si India aha ya bụ Tabitha sịrị: “O mere ka anyị ghara ịgbagharị oké mgbagharị. Ebe ọ bụ na anyị mere obere agbamakwụkwọ, anyị enweghị ọtụtụ ihe anyị ga-ahazi na ọtụtụ ihe anyị ga-akpawara isiokwu.”
N’agbanyeghị ebe Onye Kraịst bi, ọ ga-emeli ka agbamakwụkwọ ya maa mma, tọọ ụtọ, ya agharakwa imefe ihe ókè (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10 na nke 11)
11. Olee otú nwoke na nwaanyị na-agba akwụkwọ ga-esi gosi na ha anaghị emefe ihe ókè n’ihe gbasara ihe ha ga-eyi n’ụbọchị agbamakwụkwọ ha? (Kọwaakwa foto.)
11 Ì kpebiela uwe ị ga-eyi? O doro anya na ị chọrọ ịkacha maa mma n’ụbọchị ahụ. N’oge a na-ede Baịbụl, nwoke na nwaanyị na-agba akwụkwọ anaghị eji ihe ha na-eyi n’ụbọchị agbamakwụkwọ ha egwu egwu. (Aịza. 61:10) Ihe ị ga-eyi n’ụbọchị agbamakwụkwọ gị nwere ike ịdị iche n’ihe ndị ị na-eyi n’oge ndị ọzọ. Ma, ọ ka kwesịrị ịdị mma n’anya. (1 Tim. 2:9) Ekwekwala ka uwe ị ga-eyi ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ bụrụ ihe kacha gị mkpa n’ụbọchị ahụ.—1 Pita 3:3, 4.
12. Gịnị mere ndị chọrọ ịgba akwụkwọ ji kwesị ịjụ omenala ọ bụla a na-eme n’ebe ha bi na-adabaghị n’ihe Baịbụl kwuru?
12 Etinyekwala aka n’omenala ọ bụla na-adabaghị n’ihe Baịbụl kwuru. (Mkpu. 18:4) N’ọtụtụ agbamakwụkwọ n’ụwa taa, a na-eme omenala ndị na-akwado okpukpe ụgha, mgbaasị, na nkụzi ụgha. Jehova gwara anyị hoo haa ka anyị ghara itinye aka n’ụdị ihe ndị ahụ na-adịghị ọcha. (2 Kọr. 6:14-17) Ọ bụrụ na e nwere ụfọdụ omenala n’ebe unu bi na-edoghị gị anya, chọpụta otú ha si malite na ihe ọ bụla Baịbụl kwuru nwere ike inyere gị aka ikpebi ma ị̀ ga-eme ha n’agbamakwụkwọ gị.
13. Olee otú ndị na-agba akwụkwọ ga-esi na-eme ka Jehova n’otú ha si ele onyinye ndị mmadụ nyere ha anya?
13 N’ebe unu bi, à na-enye ndị na-agba akwụkwọ onyinye? Otú akpa mmadụ hà nwere ike ikpebi ụdị onyinye ọ ga-enye. Baịbụl gbara Ndị Kraịst ume ka ha na-enye onyinye. Ọ na-emekwa ha obi ụtọ. (Ilu 11:25; Ọrụ 20:35) Ma, anyị agaghị achọ ime ka ndị bịara agbamakwụkwọ anyị chee na iwu ji ha inye anyị onyinye ma ọ bụ mee ihe ga-eme ka obi jọwa ha njọ na ha nyere obere onyinye. Ọ bụrụ na anyị egosi na obi dị anyị ụtọ maka onyinye ọ bụla mmadụ si n’obi ya nye anyị n’ụbọchị anyị na-agba akwụkwọ, anyị na-eme ka Jehova.—2 Kọr. 9:7.
OTÚ Ị GA-ESI EZERE NSOGBU MA Ọ BỤ MERIE YA
14. Olee nsogbu ndị ụfọdụ na-achọ ịgba akwụkwọ na-enwe?
14 E nwere ike inwe ihe ụfọdụ ga-eme ka o siere gị ike ịhazi agbamakwụkwọ gị otú ga-eme ka e too Jehova. Dị ka ihe atụ, o nwere ike isiri gị ike ịhazi obere agbamakwụkwọ. E nwere otu nwanna aha ya bụ Charlie bi na Solomọn Aịlandz. Ọ sịrị: “O siiri anyị ike ikpebi ndị anyị ga-akpọ ka ha bịa oriri agbamakwụkwọ anyị. Anyị nwere ọtụtụ ndị enyi. N’ebe anyị bi, onye ọ bụla na-atụ anya ka a kpọọ ya.” Nwanna Nwaanyị Tabitha anyị kwuburu okwu ya sịrị: “N’ebe m bi, ndị na-abịakarị oriri agbamakwụkwọ na-ebu ibu. O siri ike tupu ndị nne na nna anyị ekweta ka anyị kpọọ naanị ihe dị ka otu narị (100) mmadụ.” Nwanna Nwaanyị Sarah si India sịrị: “Ihe na-aka ụfọdụ ndị mkpa bụ ego ole ha nwere na otú ndị ọzọ si ele ha anya. Agbamakwụkwọ ụmụ ụmụnne papa m kpọtụrụ akpọtụ. N’ihi ya, a nọ na-agwa m ka m mee ka nke m kụpụ nke ha.” Gịnị nwere ike inyere gị aka imeri nsogbu ndị a na nsogbu ndị ọzọ?
15. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-ekpe ekpere gbasara nhazi ndị anyị na-eme maka agbamakwụkwọ anyị?
15 Na-ekpe ekpere gbasara nhazi ndị ị na-eme maka agbamakwụkwọ gị. I nwere ike ịgwa Jehova gbasara nsogbu ọ bụla i nwere ma ọ bụ otú ọ bụla obi dị gị. (Fil. 4:6, 7) I nwere ike ịgwa ya ka o nyere gị aka ka i kpebie ihe dị mma, ka ị ghara ịna-echegbu onwe gị, nakwa ka i nwee ike ịkata obi mgbe ihe i kpebiri dị iche n’ihe ndị ọzọ chọrọ ka i mee. (1 Pita 5:7) Ị ga-atụkwasịkwu Jehova obi ma ị hụ otú o si enyere gị aka. Nwanna Nwaanyị Tabitha anyị kwuburu okwu ya sịrị: “Mụ na onye m chọrọ ịlụ nọ na-echegbu onwe anyị na anyị abụọ nakwa anyị na ndị ezinụlọ anyị ga-enwe nghọtahie. N’ihi ya, anyị na-ekpe ekpere tupu anyị ekwurịtawa nhazi anyị na-eme gbasara agbamakwụkwọ anyị. Anyị chọpụtara na Jehova nyeere anyị ezigbo aka mee ka mụ na ya nakwa anyị na ndị ezinụlọ anyị ghara ise okwu.”
16-17. Olee otú ikwurịta okwu nke ọma si enye aka ma a na-akwadebe agbamakwụkwọ?
16 Wetuonụ obi kpaa ihe ndị unu kwesịrị ịkpa. (Ilu 15:22) E nwere ọtụtụ ihe gị na onye ị chọrọ ịlụ ga-ekpebi gbasara agbamakwụkwọ unu, dị ka ụbọchị ọ ga-abụ, ego ole unu ga-emefu, ndị unu ga-akpọ, nakwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ. Tupu unu ekpebie ihe ọ bụla, lebaranụ ihe ndị unu nwere ike ime anya, kwurịtakwanụ ihe ndị Baịbụl kwuru banyere ihe ndị ahụ nakwa aro ụmụnna ma nke a na-akọ tụụrụ unu. Gị na onye ị chọrọ ịlụ ma ọ bụ ndị ezinụlọ unu kwurịtawa ihe ndị unu chọrọ, wetuonụ obi, chebaranụ ha echiche, dịrịkwanụ njikere ịgbanwe ihe ndị unu ga-agbanweli. Ọ bụrụ na ndị ezinụlọ unu, dị ka nne na nna unu, achọọ ka e mee ihe ụfọdụ yiri ihe ga-adaba adaba, gbalịanụ gee ha ntị. Ụbọchị ahụ pụkwaara ha iche. Ọ bụrụ na unu agaghị emeli ihe ha kwuru, wetuonụ obi kọwaara ha ihe kpatara ya. (Kọl. 4:6) Meenụ ka o doo ndị ezinụlọ unu anya na ihe kacha unu mkpa bụ ka agbamakwụkwọ ahụ tọọ ụtọ ma mee ka e too Jehova.
17 E nwere ike ọ gaghị adịrị unu mfe ịkọwara nne na nna unu ihe ndị unu chọrọ ime n’agbamakwụkwọ unu, karịchaa, ma ọ bụrụ na ha anọghị n’ọgbakọ. Ma, unu ga-emeli ya. Otu nwanna bụ́ onye India aha ya bụ Santhosh sịrị: “Ndị ezinụlọ anyị chọrọ ka anyị mee ememme ụfọdụ ndị okpukpe Hindu na-eme. O were mụ na onye m chọrọ ịlụ ogologo oge ịkọwara ha ihe anyị kpebiri. Anyị mere ihe ụfọdụ ha chọrọ na-agaghị akpasu Jehova iwe. Dị ka ihe atụ, anyị gbanwere ihe a ga-eri n’oriri agbamakwụkwọ anyị, tinyezie ihe ga-amasị ha, kpebiekwa na a gaghị agụ egwú ma ọ bụ gbaa egwú n’ihi na ọ bụghị otú ha si eme.”
18. Gịnị nwere ike ime ka ihe gaa nke ọma n’ụbọchị agbamakwụkwọ unu? (1 Ndị Kọrịnt 14:40) (Kọwaakwa foto.)
18 Hazienụ ya nke ọma. Ọ bụrụ na unu ahazie agbamakwụkwọ unu nke ọma, o nwere ike ime ka isi ghara ịgba unu ghara ghara n’ụbọchị ahụ. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 14:40.) Otu nwanna si Taịwan aha ya bụ Wayne sịrị: “Ụbọchị ole na ole tupu agbamakwụkwọ anyị, anyị na ndị wepụtara onwe ha inyere anyị aka nwere obere nnọkọ. Anyị kwurịtara ihe ndị a haziri ime n’ụbọchị ahụ, mụgharịakwa ihe ụfọdụ na ya ka ihe niile anyị kwadebere nwee ike ịga nke ọma.” Gbalịanụ mee ihe n’oge unu kwuru na unu ga-eme ya n’ụbọchị ahụ. Ọ ga-egosi na unu na-akwanyere ndị unu kpọrọ ùgwù.
Ọ bụrụ na ị hazie agbamakwụkwọ gị nke ọma, o nwere ike ime ka ihe gaa siriri werere (A ga-akọwa ya na paragraf nke 18)
19. Gịnị nwere ike inyere unu aka ka ọ bụrụ ihe unu kwuru ka a ga-eme n’oriri agbamakwụkwọ unu?
19 Ọ bụrụ na unu echee gbasara nsogbu ndị nwere ike ịdapụta, o nwere ike ime ka unu zere ha. (Ilu 22:3) Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na unu bi ebe ndị mmadụ na-aga agbamakwụkwọ a na-akpọghị ha akpọ, cheenụ ihe unu nwere ike ime gbasara ya. Kọwaaranụ ndị ikwu unu na-abụghị Ndịàmà Jehova unu kpọrọ ihe ha ga-atụ anya ya nakwa otú unu si ele ụfọdụ omenala a na-eme n’agbamakwụkwọ anya. Unu nwekwara ike igosi ha isiokwu dị na jw.org bụ́ “Olee Otú Agbamakwụkwọ Ndịàmà Jehova Na-adị?” Unu chọọ ka ọ bụrụ ihe unu kwuru ka a ga-eme n’oriri agbamakwụkwọ unu, unu nwere ike ịgwa nwanna unu tụkwasịrị obi ka ọ bụrụ “onye na-ahazi oriri” ahụ. (Jọn 2:8) Unu kọwaara ya ihe niile unu haziri maka agbamakwụkwọ ahụ, ọ ga-enyere unu aka ịhụ na ihe niile gara otú unu chọrọ.
20. Gịnị ka ndị na-achọ ịgba akwụkwọ kwesịrị icheta gbasara ụbọchị agbamakwụkwọ ha?
20 I chewe gbasara ọtụtụ ihe ya na ịhazi agbamakwụkwọ so, o nwere ike ime ka i chegbuwe onwe gị. Ma, cheta na ọ bụ naanị otu ụbọchị ka ọ ga-ewe. Ọ bụ n’ụbọchị ahụ ka unu ga-amalite ifekọ Jehova, nke bụ́kwa ihe ga-eme unu ezigbo obi ụtọ. Gbalịanụ ka agbamakwụkwọ unu ghara ịbụ nke ndị oké ozu, ka o meekwa ka e too Jehova. Tụkwasịnụ Jehova obi. Ọ ga-enyere unu aka ka unu hazie agbamakwụkwọ ọ ga-abụ unu cheta, obi ana-atọ unu ụtọ, e nweghịkwa ihe unu ga na-akwara mmakwaara.—Ọma 37:3, 4.
ABỤ NKE 107 Ṅomie Ịhụnanya Chineke
a NKỌWAKWU: N’ọtụtụ obodo, a na-enwe nnọkọ mgbe a na-agba akwụkwọ, bụ́ ebe ndị na-agba akwụkwọ na-ekwe ibe ha nkwa n’ihu Chineke. Ụfọdụ na-eme oriri ma ha gbachaa akwụkwọ. N’obodo ndị a na-anaghị enwe ụdị nnọkọ ahụ ma ọ bụ oriri agbamakwụkwọ, ichebara ihe Baịbụl kwuru echiche ka nwekwara ike ịbara ndị na-achọ ịgba akwụkwọ uru n’ụbọchị agbamakwụkwọ ha.
b Ị chọọ ịmatakwu otú Onye Kraịst kwesịrị isi na-ele ihe ndị ọchịchị chọrọ ka o mee n’agbamakwụkwọ anya, gụọ isiokwu bụ́ “Agbamakwụkwọ Ndị Dị Ùgwù n’Anya Chineke na Mmadụ.” Ọ gbara n’Ụlọ Nche October 15, 2006.
c Gaa na jw.org lee vidio bụ́ M̀ Ga-enye Ndị Bịaranụ Mmanya Na-aba n’Anya?