Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w25 Disemba p. 26-30
  • Ndị Agadi, Unu Na-abara Ọgbakọ Ezigbo Uru

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Agadi, Unu Na-abara Ọgbakọ Ezigbo Uru
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IHE JEHOVA CHỌRỌ KA I MEE
  • I NWERE IKE INYERE NDỊ ỌZỌ EZIGBO AKA
  • JEHOVA JI OZI Ị NA-EJERE YA KPỌRỌ IHE
  • NA-EME IHE NIILE I NWERE IKE IME
  • O Nwetara Ọchịchọ Obi Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Jehova Na-eji Obiọma Elekọta Ndị Ohu Ya Merela Agadi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Na-enwe Obi Ụtọ ma I Meere Jehova Ike Gị Niile
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Jiri Ụmụnna Anyị Ndị Agadi Kpọrọ Ihe
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
w25 Disemba p. 26-30
Foto ndị na-egosi: Ebe ụmụnna mere agadi ji obi ụtọ na-ejere Jehova ozi. 1. Ebe otu nwanna na-amụmụ ọnụ ọchị ka o ji obi ike na-elepụ anya. 2. Ebe otu nwanna nwaanyị nọ n’oche nkwagharị na-enye nọọsụ traktị. 3. Ebe otu nwanna nwaanyị na-aza ajụjụ n’ọmụmụ ihe. 4. Ebe otu nwanna nwaanyị jidere otu nwanna bụ́ nwa okorobịa aka ka ha nọ n’ozi ọma. 5. Ebe otu nwanna na ụmụaka abụọ na mama ha nọkọrọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.

Ndị Agadi, Unu Na-abara Ọgbakọ Ezigbo Uru

“Ọ na-eju m anya ma m cheta ihe ndị m rụrụ n’oge gara aga. Ugbu a, nká ekweghịzi m mee ihe ndị m na-emebu.”​—Nwanna Connie, dị afọ iri asatọ na atọ.

O nwekwara ike ịbụ na nká anaghịzi ekwe gịnwa mee ihe ndị ị na-emebu. Ikekwe, i jirila obi gị fee Jehova ruo ọtụtụ afọ. N’agbanyeghị ya, i nwere ike ịna-ele onwe gị anya otú na-adịghị mma n’ihi ihe ndị ị na-anaghị emelizi. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịna-achọ iji ihe ndị ị na-eme ugbu a na-atụnyere ihe ndị i mere n’oge gara aga. Ọ bụrụ otú ahụ, gịnị ga-enyere gị aka ịna-enwe ọṅụ ugbu a?

IHE JEHOVA CHỌRỌ KA I MEE

Jụọ onwe gị, sị: ‘Gịnị ka Jehova chọrọ ka m mee?’ Ihe e kwuru na Diuterọnọmi 6:5 nwere ike ịkasi gị obi. Ebe ahụ sịrị: “Jiri obi gị niile na mkpụrụ obi gị niile na ike gị niile hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.”

Ihe amaokwu ahụ kwuru gosiri na Jehova chọrọ ka i jiri obi gị niile, mkpụrụ obi gị niile, na ike gị niile fee ya. Ihe a ga-enyere gị aka ka ị ghara ịna-eji onwe gị atụnyere ndị ọzọ ma ọ bụkwanụ jiri ihe ndị i mere n’oge gara aga atụnyere ihe ndị ị na-eme ugbu a.

Chegodị gbasara ihe a: Mgbe ị ka bụ okorobịa ma ọ bụ agbọghọbịa, gịnị ka i meere Jehova? Ọtụtụ ndị ohu Jehova na-ekwu na ha meere ya ike ha niile. Ihe i mere n’oge ahụ bụ ihe ị ga-emeli. Olee ihe ndị ị na-emeliri Jehova ugbu a? Ọ ga-abụ na ihe ị na-eme bụ ihe ị ga-emeli ugbu a n’ihi otú ihe si dịrị gị. Ọ bụrụ na i si otú a na-ele ya anya, i nwere ike ikweta na ihe i meere Jehova n’oge gara aga bụkwa ihe ị na-emere ya ugbu a. I meere ya ike gị niile n’oge ahụ. Ị na-emekwara ya ike gị niile ugbu a.

Foto ndị na-egosi: Otu nwanna nwaanyị ji obi ya niile na-efe Jehova kemgbe ọtụtụ afọ. 1. Ebe ọ na-agwa otu nwaanyị okwu n’ozi ụlọ n’ụlọ ọtụtụ afọ gara aga mgbe ọ ka bụ agbọghọbịa. 2. Ebe nwanna nwaanyị ahụ merela agadi ugbu a ji telefon na-ezi ozi ọma, ya na otu nwanna nwaanyị ka bụ́ agbọghọbịa.

I meere Jehova ike gị niile n’oge ị bụ okoro ma ọ bụ agbọghọ. Ị na-emekwara ya ike gị niile ugbu a i mere agadi

I NWERE IKE INYERE NDỊ ỌZỌ EZIGBO AKA

Kama ịna-eche gbasara ihe ndị ị na-anaghị emeli ugbu a, chee gbasara ohere ndị i nwere ike iji nyere ndị ọzọ aka. Ugbu a i merela agadi, e nwere ihe ndị ị ga-emeli ị na-emelighị n’oge ị bụ okorobịa ma ọ bụ agbọghọbịa. Dị ka ihe atụ, ị ga-emeli ihe ndị a:

Kọọrọ ndị ọzọ ihe ndị ị mụtarala ná ndụ. Legodị ihe ụfọdụ e kwuru na Baịbụl:

Eze Devid sịrị: “E nwere mgbe m bụ nwata. Ma ugbu a, abụzi m agadi. Ma ahụbeghị m ka a hapụrụ onye ezi omume ọ bụla, ahụbeghịkwa m ụmụ ya ka ha na-arịọ nri.”​—Ọma 37:25.

Joshụa sịrị: “Ugbu a, oge ọnwụ m eruwela. Unu makwa nke ọma na o nweghị otu n’ime ọmarịcha nkwa niile Jehova bụ́ Chineke unu kwere unu nke na-emezughị. Ha niile emezuolara unu. O nweghị nke n’ime ha na-emezughị.”​—Josh. 23:14.

O nwere ike ịbụ na gịnwa ekwuola ụdị ihe ndị a. Ihe Devid na Joshụa kwuru bụ ihe mere n’oge ha dị ndụ. Mmadụ abụọ a bụ́ ndị ji obi ha niile fee Jehova kwuru ihe ndị ha ji anya ha hụ na ihe ndị ha ji ntị ha nụ n’ọtụtụ afọ ha biri ndụ. N’ihi ya, ihe ha kwuru bakwuru uru.

Ọ bụrụ na o teela i fewere Jehova, i nwere ike ịkọrọ ndị ọzọ uru ị hụrụla ọ baara gịnwa ma ọ bụ ndị ọzọ. È nwere oge ị na-echeta Jehova si n’ụzọ pụrụ iche nyere ndị ohu ya aka? Ọ bụrụ na e nwere, na-akọrọ ya ndị ọzọ. O nwere ike ịbụ na ị chọpụtala na ọ na-agba ndị ọzọ ume. Ọ bụrụ na ị kọọrọ ụmụnna gị ihe ndị merela ná ndụ gị, o nwere ike ịgba ha ume.​—Rom 1:11, 12.

Otú ọzọ i nwere ike isi gbaa ndị ọzọ ume bụ ịga ọmụmụ ihe ihu na ihu otú ike kwere gị. I mee otú ahụ, ị ga na-agba ụmụnna gị ume, hanwa ana-agbakwa gị ume. Nwanna Connie anyị kwuburu okwu ya sịrị: “Ịga ọmụmụ ihe na-eme ka m ghara ịda mbà n’obi. Olee otú m ga-esi dawa mbà n’obi ebe ọ bụ na ụmụnna ji obi ha niile na-egosi m ịhụnanya n’Ụlọ Nzukọ Alaeze? Otú m si egosi ndị ọzọ na obi dị m ụtọ bụ ịgbalị na-enye ha obere onyinye. M na-agbalịsi ike ka m soro ụmụnna m na-eme ihe gbasara ofufe Jehova.”

JEHOVA JI OZI Ị NA-EJERE YA KPỌRỌ IHE

Baịbụl kọọrọ anyị banyere ọtụtụ ndị Jehova hụrụ n’anya n’agbanyeghị na otú ihe si dịrị ha ekweghị ha mee ihe niile ha chọrọ ime n’ozi ya. Chee banyere Simiọn bụ́ onye Izrel merela agadi n’oge a mụrụ Jizọs. Ọ gaa n’ụlọ nsọ, o nwere ike ịbụ na ọ na-ahụ ụmụ okorobịa na-arụ ọrụ ndị dị mkpa n’ebe ahụ. Yanwa kwanụ? O nwere ike ịna-eche na o nweghịzi uru ya na-abara Jehova ebe ọ bụ na ọ gaghị emelizi ihe ụmụ okorobịa ndị ahụ na-eme. Ma, Jehova eleghị ya anya otú ahụ. N’anya Jehova, ọ bụ “onye ezi omume na onye na-asọpụrụ Chineke.” Jehova gọzikwara ya mee ka ọ hụ Jizọs mgbe ọ ka bụ nwa ọhụrụ. O sikwa n’ọnụ Simiọn buo amụma banyere onye a ga-abụ Mezaya. (Luk 2:25-35) O doro anya na Jehova elekwasịghị anya n’ihe Simiọn na-agaghị emeli. Kama, o lekwasịrị anya n’otú okwukwe ya si sie ike nakwa n’otú ‘mmụọ nsọ si na-edu ya.’

Ebe Josef na Meri ji obi ụtọ na-egosi Simiọn Jizọs mgbe ọ ka bụ nwa ọhụrụ.

Jehova gọziri Simiọn mee ka ọ hụ Jizọs mgbe ọ ka bụ nwa ọhụrụ, sikwa n’ọnụ ya buo amụma na ọ ga-abụ Mezaya

Ka obi sie gị ike na Jehova ji ozi i ji obi gị na-ejere ya kpọrọ ihe n’agbanyeghị ihe ọ bụla ị na-anaghị emelizi. “Onyinye Chineke kacha anabata bụ onyinye si mmadụ n’obi, n’ihi na Chineke na-atụ anya ka mmadụ nye ihe ọ ga-enyeli, ọ bụghị ihe ọ na-agaghị enyeli.”​—2 Kọr. 8:12.

N’ihi ya, lekwasị anya n’ihe ị ga-emeli. Dị ka ihe atụ, chee banyere ụzọ dị iche iche i nwere ike isi kwusaa ozi ọma, ọ bụrụgodị ruo obere oge. Ì nwere ike ịkpọ mmadụ n’ekwentị ma ọ bụ zigara ya akwụkwọ ozi? Obere ihe e meere ụmụnna iji gosi ha ịhụnanya nwere ike ịkpa ezigbo ike, karịchaa ma ọ bụrụ na onye mere ya ejeerela Jehova ozi ọtụtụ afọ.

E nwere ndị nká ma ọ bụ ọrịa na-anaghị ekwe mee ihe ndị ha chọrọ ime. Gụọ akụkọ si n’Ọwụwa Anyanwụ Afrịka n’igbe isiokwu ya bụ “Ihe Zọrọ Otu Nwa Agbọghọ Ndụ.”

Na-echeta na okwukwe gị na otú i si erubere Jehova isi kemgbe ọtụtụ afọ nwere ike ịgba ndị ọzọ ume. Ị bụ onye e ji ama atụ n’ịtachi obi. Obi kwesịkwara isi gị ike na “Chineke abụghị onye ajọ omume. Ọ gaghị echefu ọrụ unu na otú unu si gosi na unu ji aha ya kpọrọ ihe n’ihi na unu jeere ndị nsọ ozi ma ka na-ejere ha ozi.”​—Hib. 6:10.

NA-EME IHE NIILE I NWERE IKE IME

Nchọpụta e mere na-egosi na ahụ́ na-aka agbasi ọtụtụ ndị agadi ike ma ha na-enyere ndị ọzọ aka. Ha na-aka eche echiche nke ọma, na-akakwa ebite ndụ aka.

O doro anya na imere ndị ọzọ ihe ọma agaghị ewepụ nsogbu niile ha na nká so. Ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-eme ya. Otú ọ ga-esi eme ya bụ iwepụ ihe kpatara nká na ọnwụ, ya bụ, ezughị okè anyị.​—Rom 5:12.

N’agbanyeghị ya, ozi i ji obi gị na-ejere Jehova, nke inyere ndị ọzọ aka so na ya, ga-eme ka olileanya gị sikwuo ike. O nwedịrị ike ime ka ahụ́ sikwuo gị ike. Ndị agadi, biko maranụ na Jehova ji ozi unu na-ejere ya kpọrọ ihe. Ọgbakọ ejighịkwa okwukwe unu egwu egwu.

Ebe otu nwanna nwaanyị merela agadi so jiri ihe nkwagharị na-ekwusa ozi ọma. Ọ na-agụrụ otu nwa agbọghọ anya mmiri na-agba otu amaokwu Baịbụl.

Ihe Zọrọ Otu Nwa Agbọghọ Ndụ

E nwere otu nwa agbọghọ gafere n’ebe otu nwanna nwaanyị mere agadi ji ihe nkwagharị na-ekwusa ozi ọma. Nwanna nwaanyị ahụ kelere ya ma gwa ya ka ọ gụọrọ ya otu amaokwu Baịbụl ga-agba ya ume. Ọ gụụrụ ya Jeremaya 29:11, ebe kwuru na Jehova chọrọ ka udo dịrị anyị, ọ bụghị ka ọdachi dakwasị anyị. Nwanna nwaanyị ahụ jụrụ ya, sị, “Ị̀ hụrụ otú Jehova chọrọ ka ọdịnihu gị dịrị?”

Obi tọgburu nwa agbọghọ ahụ atọgbu. Anya mmiri juru ya anya, ya asị: “Ọ chọrọ ka m nwee olileanya nakwa ka udo dịrị m. I meela gụọrọ m ebe a. Obi siri m ike na ọ bụ otú Chineke si za m ekpere. Nsogbu na-ezoro m ka mmiri. Otu gachaa, nwanne ya abịa. Otú ihe si siere m ike mere ka m chewe echiche igbu onwe m. N’ụtụtụ a, m kpere ekpere ka Chineke gosi m na ihe gbasara m ka na-emetụ ya n’obi. Ugbu a m pụtara, mụ ahụ gịnwa bụ́ onye m na-ahụtụbeghị, gị akwụsị m gụọrọ m otu amaokwu Baịbụl gosiri m ihe Chineke na-echere m. O meghị ná ndaba.”

Nwanna nwaanyị ahụ gosiri ya isiokwu ụfọdụ dị na jw.org kọwara ihe Baịbụl kwuru mmadụ ga-eme ma o chewe echiche igbu onwe ya. Nwanna nwaanyị ahụ kọwaara ya otú anyị na ndị mmadụ si amụ Baịbụl, kpọọkwa ya ka ọ bịa ọmụmụ ihe. N’izu na-eso izu ahụ, nwa agbọghọ ahụ bịara ọmụmụ ihe ngwụcha izu. O bidokwala ịmụ broshọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi.

N’agbanyeghị afọ ole ị dị, ì nwere ike iwepụta onwe gị jiri ihe nkwagharị na-ekwusa ozi ọma?

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya