ỌGỌST 3 RUO 9, 2026
ABỤ NKE 113 Udo Anyị Nwere
Ekpela Mmadụ Ikpe Maka Ihe O Kpebiri Ime
“Unu ekpela ya ikpe maka otú o si ele ihe anya.”—ROM 14:1.
IHE A GA-AMỤ
Otú anyị ga-esi na-akwanyere ụmụnna anyị ùgwù ma ha mee mkpebi na-adịghị anyị mma.
1-2. Gịnị mere mkpebi anyị mere ji adị iche mgbe ụfọdụ na nke Ndị Kraịst ndị ọzọ?
È NWEELA mgbe mmadụ kwuru ihe na-adịghị mma gbasara gị maka mkpebi i mere? È nwetụla mgbe i kwuru ihe na-adịghị mma maka mkpebi onye ọzọ mere? Ọtụtụ n’ime anyị ga-aza ee na nke ọ bụla n’ime ajụjụ ndị a.
2 O kwesịghị iju anyị anya na mgbe ụfọdụ, ihe anyị kpebiri na-adị iche na nke Ndị Kraịst ndị ọzọ. Maka gịnị? Ọ bụ n’ihi na onye ọ bụla n’ime anyị dị iche. Onye ọ bụla n’ime anyị nwere otú o si ele ihe anya. Omenala obodo anyị, ezinụlọ anyị, ma ọ bụkwanụ ihe ndị merela anyị ná ndụ nwere ike ime ka anyị na-eche echiche otú anyị si eche. Ma, anyị ekwesịghị ikwe ka otú dị iche iche anyị si ele ihe anya mee ka anyị na ụmụnna nọ n’ọgbakọ ghara ịdị ná mma.—Efe. 4:3.
3. Gịnị nwere ike ime ka anyị kpee nwanna ikpe maka mkpebi o mere?
3 Ọ bụrụ na nwanna ekpebie ihe na-adịghị anyị mma, anyị nwere ike ịgbalịwa ime ka ọ gbanwee obi ya ma ọ bụ gwawa ndị ọzọ ihe anyị chere. O nwere ike ịbụ na anyị bu n’obi inyere ya aka. Anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya, chọọkwa ihe ga-akacha baara ha uru. (Ilu 17:17) N’ihi ya, anyị achọghị ka ha kpebie ihe ha ga-emecha kwaara mmakwaara ma ọ bụkwanụ ihe ga-eme ka ha na Jehova ghara ịdị ná mma.
4-5. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na nwanna ekpebie ime ihe dị iche n’ihe anyịnwa gaara eme?
4 Ànyị kwesịrị ịgwawa nwanna na mkpebi o mere adịghị anyị mma? E nwere ihe ụfọdụ ga-enyere anyị aka ikpebi ma ànyị ga-agwa ya. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị achọpụta na ọ na-eche echiche ime ihe Baịbụl na-akwadoghị, anyị kwesịrị inyere ya aka ịgbanwe echiche ya n’ihi na anyị hụrụ ya n’anya. (Ilu 27:5, 6) Ma, gịnị ka anyị kwesịrị ime ma nwanna kpebie ime ihe na-agaghị emebi iwu Baịbụl, mana ya abụrụ na ọ dị iche n’ihe anyị gaara eme? Azịza ajụjụ a dị n’amaokwu Baịbụl e si nweta isiokwu a. Ọ sịrị: “Ekpela ya ikpe maka otú o si ele ihe anya.”—Rom 14:1.
5 Ma, o nwere ike isiri anyị ike mgbe ụfọdụ ịhapụ nwanna ka o mee ihe o kpebiri. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe mere anyị kwesịrị iji hapụ ndị ọzọ ka ha mee ihe ha kpebiri nakwa otú anyị ga-esi eme ya. Ma, ka anyị burugodị ụzọ leba anya n’ihe ụfọdụ nwere ike ime ka anyị mawa nwanna ikpe maka mkpebi o mere.
OLEE IHE ỤFỌDỤ NWERE IKE IME KA ANYỊ MAWA MMADỤ IKPE MAKA MKPEBI O MERE?
6-7. Mee ihe atụ ndị na-egosi mgbe anyị nwere ike ịmawa mmadụ ikpe maka ihe o kpebiri.
6 Dị ka anyị kwuburu, omenala anyị ma ọ bụ ihe ndị merela anyị ná ndụ nwere ike ime ka anyị na-eche echiche otú anyị si eche. Anyị nwere ike iche na ọ bụkwa otú ahụ ka ndị ọzọ si eche. Ma, o nwere ike ịbụ na ọ bụghị otú ahụ ka ọ dị. Ka anyị leba anya n’ihe atụ ụfọdụ. Nke mbụ: Tupu otu nwanna abata n’ọgbakọ, ya na papa ya bụ́ onye aṅụrụma bi. Mgbe ọ gara oriri, ọ hụrụ ụmụnna ndị ọzọ ka ha na-aṅụ mmanya. Obi agbawaa ya, ya agwa ha na ihe ha na-eme adịghị mma. Nke abụọ: E nwere otu nwanna nwaanyị rịara otu ajọ ọrịa ma mechaa gbakee. O mechara mata na e nwere nwanna nwaanyị ọzọ na-arịa ọrịa ahụ. Ọ chọrọ inyere nwanna nwaanyị ahụ aka. N’ihi ya, ọ gwara ya ka o si otú ahụ e si gwọọ ya gwọọ onwe ya. O nwere ike ịbụ na ọ gwara ya ka ọ na-eri ụdị nri yanwa riri ma ọ bụkwanụ ka ọ ṅụọ ụdị ọgwụ yanwa ṅụrụ. Nke atọ: E nwere otu nwanna nọbu n’okpukpe ụgha. Ọ chọghịzi ihe ọ bụla ga-ejikọ ya na okpukpe ụgha. Mgbe ọ nụrụ na e nwere nwanna gara olili ozu na chọọchị, iwe bịara ya.a
7 Ka anyị lebakwa anya n’ihe atụ ndị ọzọ. Nke anọ: Otu nwanna toro n’oge ọtụtụ ndị chere na nwoke ibu afụ ọnụ adịghị mma ma ọ bụkwanụ na nwaanyị iyi traụza aga ọmụmụ ihe, mgbakọ, ma ọ bụ ozi ọma adịghị mma. Ọ bụ eziokwu na nwanna ahụ ma na e nwere mgbanwe na nso nso a gbasara ihe ndị a, ọ ka na-agwa ndị ọzọ na nwoke bụ́ Onye Kraịst ekwesịghị ibu afụ ọnụ nakwa na nwanna nwaanyị ekwesịghị iyi traụza aga ihe ndị gbasara ofufe Chineke. Nke ise: Otu okenye ma otu nwanna gụkwuru akwụkwọ ma mechaa pụọ n’ọgbakọ. Mana ugbu a, e nwere nwanna ọzọ na-eto eto n’ọgbakọ ha kpebiri ịgụkwu akwụkwọ. Ihe a na-echegbu okenye ahụ, ya agbalịwa ime ka nwanna ahụ na nne na nna ya gbanwee obi ha.
8. (a) Gịnị nwere ike ime ka nne ma ọ bụ nna kpewe ndị ọzọ bụ́ nne na nna ikpe? (b) Olee otú ikpe ndị ọzọ ikpe nwere ike isi kpaa ọgbakọ aka?
8 Ka anyị lee ihe atụ gbasara ndị nne na nna. Nke isii: Ebe ị bụ nne ma ọ bụ nna, ị na-agbalịsi ike ịzụ umụ gị, ‘na-agbazikwa ha otú Jehova chọrọ.’ (Efe. 6:4) Mana, o yiri ka ndị nne na nna ndị ọzọ bụ́kwa Ndị Kraịst na-ekwe ka ụmụ ha mee ihe ụfọdụ gịnwa na-anaghị ekwe ka ụmụ gị mee. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ na ị naghị ekwe ka ụmụ gị nọrọ n’èzí chi ejie, mana, hanwa na-ekwe ka ụmụ ha nọrọ n’èzí chi ejitụ. Ha na-ekwe ka ụmụ ha na-agba gem a na-anaghị eme tigbuo zọgbuo na ha ma ọ bụkwanụ zụtara ha ekwentị mgbe ha ka dị obere. Ihe ndị a mere ka nwa gị chee na ị dị aka ike, ya ajụọ gị, sị: “Gịnị mere na ị naghị eme ka nne na nna enyi m?” Ụdị ihe a nwere ike ime ka ị katọwa ndị nne na nna ahụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na Onye Kraịst ọ bụla kpebie ihe dị iche na nke anyị, o nwere ike iwe anyị iwe, anyị ekpewe ya ikpe. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike iche na otú o si emefu ego ya adịghị mma, na ọ na-agakarị ezumike, ma ọ bụkwanụ na ihe ndị o ji eme onwe ya obi ụtọ adịghị mma. Ma anyị ekwesịghị ikwe ka ihe anyị chere dịrị anyị mkpa karịa udo ịdị n’ọgbakọ.
9. Gịnị ka anyị kwesịrị icheta? (Kọwaakwa foto.)
9 Ọ bụ eziokwu na ihe otu Onye Kraịst kpebiri nwere ike ịdị iche na nke onye ọzọ, ma ọ pụtaghị na ihe otu onye mere dị mma, nke onye ọzọ mere adịrị njọ. (Rom 14:5) A gwara Ndị Kraịst ka ha ‘nwee otu obi’ n’ihe gbasara iwu Jehova, mana ọ pụtaghị na otú anyị niile si eche echiche n’ihe niile mmadụ ga-eji aka ya ekpebiri onwe ya ga-abụ otu. (2 Kọr. 13:11) Anyị nwere ike iji mkpebi ndị anyị na-eme tụnyere ihe anyị na-eme ma anyị mewe njem. Ọtụtụ mgbe, a na-enwe ọtụtụ ụzọ e si aga otu ebe. Onye ọ bụla na-ahọrọ nke kaara ya mma. Otú ahụ ka ime mkpebi dị. Ndị Kraịst nwere ike ime mkpebi dị iche iche n’ihe mmadụ ga-ekpebiri onwe ya. Ma, anyị niile bu otu ihe n’obi, ya bụ, ime Jehova obi ụtọ. N’ihi ya, anyị anaghị ekpe ndị ọzọ ikpe maka ihe ha nwere ike ikpebiri onwe ha.—Mat. 7:1; 1 Tesa. 4:11.
Ndị na-eme njem nwere ike ịhọrọ isi n’ụzọ dị iche iche aga otu ebe. Otú ahụ ka mkpebi ndị na-efe Jehova na-eme nwere ike ịdị iche iche (A ga-akọwa ya na paragraf nke 9)
GỊNỊ MERE ANYỊ KWESỊRỊ IJI AHAPỤ NDỊ ỌZỌ KA HA MEE IHE HA KPEBIRI?
10. Dị ka e kwuru na Jems 4:12, gịnị ka anyị na-enweghị ikike ime? Maka gịnị?
10 Baịbụl kwuru ihe ụfọdụ mere anyị kwesịrị iji hapụ ndị ọzọ ka ha mee ihe ha kpebiri. Ka anyị hụ ụfọdụ n’ime ha. Anyị enweghị ikike ikpe ndị ọzọ ikpe n’ihe ndị ha ga-ekpebiri onwe ha. (Gụọ Jems 4:12.) Ọ bụ Jehova bụ Onye na-enye iwu na Onyeikpe na-eme ezi omume. Ọ bụ naanị ya nwere ikike ịgwa anyị ihe anyị ga-eme na ihe anyị na-agaghị eme. N’ihi ya, ọ bụ Jehova ka ụmụnna anyị ga-aza ajụjụ, ọ bụghị anyịnwa. (Rom 14:10) Anyị enweghị ikike ịkatọ ihe ndị ọzọ kpebiri ime ma ọ bụ kpewe ha ikpe maka ya naanị n’ihi na ọ dịghị anyị mma.b
11. Olee otú anyị ga-esi mee ka ọgbakọ dịrị n’otu? (Kọwaakwa foto.)
11 Jehova chọrọ ka ndị na-efe ya dịrị n’otu, ọ bụghị ka ihe na-amasị ha bụrụ otu. Otú anyị niile si dị iche iche na-amasị Jehova. Ihe ndị o kere eke gosiri na ọ bụ eziokwu. Dị ka ihe atụ, e nweghị akwụkwọ abụọ ọ bụla dị n’otu osisi bụ nnọọ otu. Chegodị gbasara ụmụ mmadụ. E nwere ihe karịrị ijeri mmadụ asatọ (8,000,000,000) n’ụwa. Ma, e nweghị mmadụ abụọ ọ bụla bụ nnọọ otu ma ọ bụ na-akpa nnọọ otu àgwà. Jehova kere anyị ka anyị dịrị iche n’ibe anyị. Ọ chọghị ka anyị na ndị ọzọ bụrụ nnọọ otu ihe ahụ. Ma, ọ chọrọ ka anyị dịrị n’otu. N’ihi ya, anyị ekwesịghị ikwe ka otú anyị si dị iche n’ibe anyị mee ka anyị ghara ịdị n’otu. Kama, anyị kwesịrị ime ka udo dịrị. Ihe kwesịrị ịka anyị mkpa bụ ka ọgbakọ dịrị n’otu, ọ bụghị ihe anyị chere ma ọ bụ ihe na-amasị anyị.—Rom 14:19.
Jehova kere anyị ka anyị dịrị iche n’ibe anyị. Ma, ọ chọrọ ka anyị dịrị n’otu (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11)
OTÚ ANYỊ GA-ESI EGOSI NA ANYỊ MA NA MMADỤ GA-EJI AKA YA KPEBIE IHE Ọ GA-EME
12-13. Gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’obi ma anyị chee na nwanna ‘azọhiela ụkwụ’? (Ndị Galeshia 6:1; kwuokwa ihe dị n’igbe isiokwu ya bụ “Ọ Bụrụ na I Chere na Mkpebi Mmadụ Mere Adịghị Mma.”)
12 Mgbe ndị ọzọ mere mkpebi gbasara ihe ndị dịịrị ha. Jụọ onwe gị, sị, “Onye ahụ ọ̀ ‘zọhiere ụkwụ,’ ka ọ̀ bụ naanị na o mere ihe dị iche n’ihe mụnwa gaara achọ ime?” Ọ bụrụ na ọ zọhiere ụkwụ, ya bụ, na o mere ihe Baịbụl na-akwadoghị, jụọ onwe gị, sị, ‘Èruru m eru otú Akwụkwọ Nsọ kwuru inyere ya aka, ka ọ̀ ga-aka mma ka onye ọzọ nyere ya aka?’ Ọ bụrụ na i ruru eru inyere ya aka, gbalịa jiri obi nwayọọ gwa ya okwu. (Gụọ Ndị Galeshia 6:1.) Ma, ọtụtụ mgbe, i nwere ike ịchọpụta na ọ zọhieghị ụkwụ, kama o mere ihe dị iche n’ihe gịnwa gaara eme. Ọ bụrụ na ọ dị otú ahụ, echela na o bu ihe ọjọọ n’obi ma ọ bụ katọwa mkpebi o mere. Ghọta na ọ bụ ya ga-eji aka ya kpebie ihe ọ ga-eme. Amakwala ya ikpe.—Rom 14:2-4.
13 Chegodị banyere ihe atụ a. Ka e were ya na gị na enyi gị gara iri nri n’ebe a na-ere nri. Ị̀ ga-esi ọnwụ na ọ bụ ihe i riri ka enyi gị ga-eri? Mba. Ị ma na ọ bụ ya ga-eji aka ya kwuo ihe ọ chọrọ iri. A sị ka e kwuwe, e nweghị ihe ihe o riri ga-eme gị. Enyi gị siwekwanụ ọnwụ na ọ bụ ihe o riri ka ị ga-eri, o doro anya na obi agaghị adị gị mma. N’ihi ya, anyị na-egosi na anyị na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù ma ọ bụrụ na anyị ahapụ ha ka ha jiri aka ha kpebie ihe ha ga-ekpebiri onwe ha. Anyị ekwesịghị isiwe ọnwụ ka ha mee ihe anyị chere.
14. I kpebiwe ihe ị ga-eme, olee otú ị ga-esi eme ka gị na ụmụnna gị dịrị n’udo? (1 Ndị Kọrịnt 8:12, 13)
14 Mgbe ị na-ekpebi ihe ị ga-ekpebiri onwe gị. Ị ga-eme ka ọgbakọ dịrị n’otu ma ọ bụrụ na ị na-agbalịsi ike ka ị ghara ime ihe ga-ewe ndị ọzọ iwe. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 8:12, 13.) Mgbe ụfọdụ, i nwere ike ịma na ‘iwu egbochighị gị ime’ mkpebi ị chọrọ ime, ya bụ, na e nweghị ihe o mere. Ma, ọ bụrụ na ọ ga-ewe nwanna gị iwe, ọ̀ ‘ga-aba uru’?c (1 Kọr. 10:23, 24) Ụdị ihe ahụ mee, kama isiwe ọnwụ na ị ga-eme ihe ị chọrọ ime, ọ ga-aka mma ka i chee otú obi ga-adị ndị ọzọ. (Rom 15:1) Mana, ọ̀ kwa anyị ka kwuchara na ndị ọzọ kwesịrị ịhapụ anyị ka anyị jiri aka anyị kpebie ihe mmadụ kwesịrị ikpebiri onwe ya? Ee. Ha kwesịrị ịhapụ anyị ka anyị kpebie ihe anyị ga-eme otú anyịnwa kwesịkwara ịhapụ ha. Ma, anyị kwesịkwara iburu n’obi na Baịbụl dụrụ anyị ọdụ ná Ndị Rom 12:18, sị: “Ọ bụrụkwa unu ka ọ dị n’aka, unu na mmadụ niile dịrị n’udo.” N’ihi ya, anyị na-agbalịsi ike ka anyị na ndị ọzọ dịrị n’udo. Anyị anaghịkwa eme ihe ga-akpasu ha iwe.
15. Olee otú ndị okenye ga-esi eme ka ọgbakọ dịrị n’otu? (1 Ndị Kọrịnt 4:6)
15 Ndị okenye na-ahapụ ndị ọzọ ka ha kpebie ihe ha ga-eme. Ndị okenye na-enye aka eme ka ọgbakọ dịrị n’otu ma ọ bụrụ na ha anaghị enye ụmụnna iwu n’ihe mmadụ ga-eji aka ya kpebiere onwe ya, ‘na-emekwa naanị ihe e dere’ na Baịbụl. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 4:6.) Ọ pụtakwara na ha anaghị agafe ndụmọdụ si na Baịbụl e dere n’akwụkwọ anyị. Ọ bụrụkwa na nwanna abịakwute ndị okenye ka ha nyere ya aka, ha na-akpachara anya ka ndụmọdụ ha ga-enye ya ghara ịbụ ihe ha chere. Kama, ha na-esi na Baịbụl enye ya ndụmọdụ.—Aịza. 48:17, 18.
16. Olee otú okenye ga-esi egosi na ọ na-akwado mkpebi ndị okenye mere?
16 Okenye kwesịkwara ịna-akwado mkpebi ndị okenye mere. Ndị okenye kpechaa ekpere ka Chineke nye ha mmụọ nsọ, lebakwa anya n’ihe Baịbụl kwuru, ha na-agbakọ aka kpebie ihe a ga-eme. E nwegodị okenye a na-anabataghị ihe o chere, o kwesịrị ịkwado mkpebi ahụ. (Efe. 5:17) Ihe ọzọ bụ na ndị okenye na-akpachara anya ka ha ghara ikwu ihe karịrị ihe nzukọ Jehova kwuru. Dị ka ihe atụ, okenye agaghị eji naanị otu ahịrịokwu dị n’akwụkwọ anyị gosiwe na ihe o chere ziri ezi ma leghara ihe ndị ọzọ e kwuru n’isiokwu ahụ anya.
17. Olee uru ọ ga-aba ma ọ bụrụ na anyị na-akwado mkpebi ndị ọzọ mere?
17 Anyị amụtala na anyị dị iche iche. Onye ọ bụla n’ime anyị nwere ihe na-amasị ya na otú o si ele ihe anya. Ma, ọ dị mma otú ahụ. Otú omenala anyị na àgwà anyị si dị iche iche nwere ike ime ka ọgbakọ bụrụ ebe magburu onwe ya mmadụ ga-anọ, ahụ́ eruo ya ala. N’ihi ya, kama ikwe ka otú anyị si dịrị iche mee ka anyị ghara ịdị n’otu, anyị na-agbalị ka anyị na ibe anyị na-adị n’udo. Anyị na-akpachara anya ka anyị ghara ime ihe ga-ewute ndị ọzọ. Anyị na-ahapụ ndị ọzọ ka ha jiri aka ha kpebie ihe ha ga-eme n’ihe ndị dịịrị ha. Anyị mee otú ahụ, mbọ anyị gbara agaghị efu ọhịa. Obi ga na-atọ anyị ụtọ n’ọgbakọ, anyị niile adịrịkwa n’otu.—Ọma 133:1; Mat. 5:9.
ABỤ NKE 89 Gee Ntị, Rube Isi, Ka A Gọzie Gị
a E nwere ihe ụfọdụ Onye Kraịst kwesịrị ichebara echiche tupu ya ekpebie ma ọ̀ ga-aga olili ozu ma ọ bụ agbamakwụkwọ a ga-eme na chọọchị. Gụọ isiokwu bụ́ “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” n’Ụlọ Nche May 15, 2002.
b Mgbe ụfọdụ, ọ na-adị mkpa ka ndị okenye kpee ndị mebiri iwu Baịbụl ikpe. Ma, ndị okenye na-eburu n’obi na ọ bụ Jehova nyere ha ọrụ iji ihe o kwuru n’Okwu ya kpee ikpe, ọ bụghị ihe ha chere.—I nwere ike ịtụle 2 Ihe E Mere 19:6.
c Ị chọọ ịhụ ihe atụ ụfọdụ, gụọ akwụkwọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi, isi nke 35, nọmba nke 5.