MACH 30 RUO EPREL 5, 2026
ABỤ NKE 76 Olee Otú Ọ Na-adị Gị?
Ka Otú I Si Akụzi Eziokwu Na-atọ Ụtọ
“ Jehova Chineke, onye eziokwu.”—ỌMA 31:5.
IHE A GA-AMỤ
Otú anyị ga-esi na-agwa ndị ọzọ eziokwu otú ga-abara ha ezigbo uru.
1. Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị soro n’ezinụlọ Jehova?
OTU n’ime ajụjụ ndị anyị na-ajụ ụmụnna anyị n’oge mbụ anyị hụrụ ha bụ, “Olee otú i si nata eziokwu?” Ihe ụfọdụ na-aza bụ na nne na nna ha kụziiri ha eziokwu Baịbụl. Ụfọdụ nwekwara ike ịsị na ọ dịbeghị anya ha “natara eziokwu.” Ihe mere anyị ji etinye eziokwu n’ihe anyị na-aza bụ na ọ bụ eziokwu Baịbụl na-eduzi anyị n’ihe niile anyị na-eme ná ndụ. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na anyị ma na naanị ihe ga-eme ka anyị soro n’ezinụlọ Jehova bụ anyị igosi na anyị ji eziokwu Baịbụl kpọrọ ihe ma na-ebi ndụ dabara na ya. Otu ụzọ anyị ga-esi eme ya bụ ịna-ekwu eziokwu na ịna-akwụwa aka ọtọ.—Ọma 15:1-3.
2. (a) Gịnị ka e ji mara Jizọs? (b) Gịnị ka ndị mmadụ ga-eme gbasara eziokwu Jizọs kụziri?
2 Ihe niile Jizọs kwuru bụ eziokwu. Ndị iro ya kwuru na ọ na-ekwu eziokwu n’agbanyeghị na ọ bụghị mgbe niile ka ihe ọ gwara ha na-adị ha mma. (Mat. 22:16) Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ihe ndị mmadụ ga-eme ma ha nụ eziokwu ọ na-akụzi. Ọ sịrị: “M bịara ikewa ezinụlọ. Nwoke ga na-emegide nna ya, nwa nwaanyị ana-emegide nne ya, nwunye nwa ana-emegidekwa nne di ya.” (Mat. 10:35) Jizọs achọghị ka ndị mmadụ jụ eziokwu ya na ndị na-eso ụzọ ya na-ekwusa. Ma, ọ ma na ụfọdụ ga-ajụ ya. (Mat. 23:37) Ọ ma na eziokwu ọ na-akụzi ga-ekewa ụwa ụzọ abụọ. Ụfọdụ ga-anabata ya, ụfọdụ ajụ ya.—2 Tesa. 2:9-11.
3. Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza n’isiokwu a?
3 Dị ka Jizọs, anyị na-agbalịsi ike ịna-ekwu eziokwu mgbe niile, ọ bụrụgodị na ọ bụghị ihe ndị mmadụ chọrọ ịnụ. Anyị na-ekwusa eziokwu Baịbụl ma na-akụzi ya n’agbanyeghị na o nwere ike iwe ụfọdụ ndị iwe. Ihe a ọ̀ pụtara na anyị ekwesịghị iche gbasara otú anyị si agwa ha nke bụ́ eziokwu na mgbe anyị ga-agwa ha ya? Mbanụ. N’isiokwu a, e nwere ajụjụ dị mkpa anyị ga-ebu ụzọ zaa, ya bụ: Ebee ka anyị ga-esi amata nke bụ́ eziokwu? Ajụjụ ndị ọzọ anyị ga-azazi bụ: Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-ekwu eziokwu? Olee otú anyị ga-esi ekwu ya? Oleekwa mgbe anyị ga-ekwu ya? Azịza ajụjụ ndị a ga-eme ka okwu anyị na-atọkwu ụtọ ma anyị na-agwa ndị mmadụ nke bụ́ eziokwu n’ozi ọma, ya bụ, iji akọ na-agwa ha ya n’oge kwesịrị ekwesị.
EBEE KA ANYỊ GA-ESI AMATA NKE BỤ́ EZIOKWU?
4. Gịnị mere anyị ga-eji kwuo na eziokwu si n’aka Jehova?
4 Ọ bụ Jehova ka eziokwu si n’aka. Ihe niile ọ na-ekwu bụ eziokwu. Dị ka ihe atụ, ihe ndị ọ na-agwa anyị banyere ihe ọma na ihe ọjọọ bụ eziokwu. (Ọma 19:9; 119:142, 151) Ihe niile ọ na-ekwu gbasara ọdịnihu na-emezu. (Aịza. 55:10, 11) Ọ naghịkwa ahapụ imezu nkwa o kwere. (Ọnụ Ọgụ. 23:19) N’eziokwu, Jehova emekataghị ghaa ụgha. (Hib. 6:18) Ka a sịkwa ihe mere Baịbụl ji kpọọ Jehova “Chineke, onye eziokwu.”—Ọma 31:5.
5. Gịnị mere na ịchọta “Chineke, onye eziokwu” esighị ike? Kọwaa. (Ọrụ Ndịozi 17:27)
5 N’agbanyeghị ihe ụfọdụ ndị na-ekwu, ịchọta Jehova “Chineke, onye eziokwu” esighị ike. Ihe ndị na-egosi na Jehova dị adị gbara anyị gburugburu. (Rom 1:20) Mgbe Pọl onyeozi na-agwa ndị Grik gụrụ akwụkwọ okwu n’Atens, o kwuru na Chineke chọrọ ka anyị “chọọ ya,” nakwa na “ọ nọ onye ọ bụla n’ime anyị nso.” (Gụọ Ọrụ Ndịozi 17:27.) N’eziokwu, Jehova na-adọta ndị dị umeala n’obi chọrọ ịma nke bụ́ eziokwu n’ebe ọ nọ.—Jọn 6:44.
6. Olee eziokwu ụfọdụ dị na Baịbụl? Gịnịkwa mere obi ji dị gị ụtọ na ị matara eziokwu ndị ahụ?
6 Otu ụzọ anyị nwere ike isi chọta Jehova bụ ịmụ Baịbụl. Ọ bụ mmụọ nsọ Chineke duziri ụmụ nwoke dere Baịbụl. (2 Pita 1:20, 21) N’ihi ya, ihe niile e dere na Baịbụl bụ eziokwu. Anyị ga-atụkwasịlikwa ya obi. Dị ka ihe atụ, anyị ga-atụkwasịli ihe o kwuru gbasara otú eluigwe na ụwa na ihe ndị dị ndụ n’ụwa si malite obi. (Jen. 1:1, 26) Anyị kwesịrị ikweta ihe o kwuru gbasara ihe mere anyị niile ji emehie na ihe mere ahụhụ na ọnwụ ji dịrị. (Rom 5:12; 6:23) Anyị kwesịkwara ikweta ihe o kwuru na Jehova ga-eji Ọkpara ya mezie ihe niile Ekwensu bụ́ “nna ụgha” mebiri. (Jọn 8:44; Rom 16:20) Obi kwesịrị isi anyị ike na nkwa o kwere ga-emezu, ya bụ, na Jizọs ga-ebibi ndị ọjọọ, kpọlite ndị nwụrụ anwụ, mee ka ụwa ghọọ Paradaịs, meekwa ka anyị zuo okè. (Jọn 11:25, 26; 1 Jọn 3:8) Ọ bụ ezigbo ihe ọma ka Jehova meere anyị. Ọ kụziiri anyị eziokwu, nyekwa anyị ohere ịkụziri ya ndị ọzọ.—Mat. 28:19, 20.
IHE MERE ANYỊ JI KWESỊ ỊNA-EKWU EZIOKWU
7-8. Ihe anyị bu n’obi ekwu eziokwu ọ̀ dị mkpa? Nye ihe atụ. (Mak 3:11, 12) (Kọwaakwa foto.)
7 Dị ka anyị kwuburu, anyị kwesịrị ịna-ekwu eziokwu ma ọ bụrụ na anyị chọrọ iso n’ezinụlọ Jehova. Ma, ọ bụrụ na anyị chọrọ ime ihe dị ya mma, ihe anyị ga-eme abụghị naanị ikwu eziokwu. Ihe anyị bu n’obi ekwu eziokwu dị Jehova mkpa. Ka anyị kwuo banyere ihe mere mgbe Jizọs na-eje ozi ya n’ụwa. (Gụọ Mak 3:11, 12.) Mgbe Jizọs nọ na-ekwusa ozi ọma n’ebe dị nso n’Oké Osimiri Galili, ìgwè mmadụ gbara ya gburugburu. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị mmụọ ọjọọ ji. Ha dara n’ala n’ihu Jizọs ma jiri oké olu na-asị ya: “Ị bụ Ọkpara Chineke.” Gịnị mere ndị mmụọ ọjọọ ji kwuo eziokwu banyere Jizọs? O nwere ike ịbụ na ha chọrọ ka ndị nụrụ ihe ha na-ekwu tụkwasị ha obi, ya emezie ka ha ghara ịbịa fewe Jehova. Ihe ahụ ndị mmụọ ọjọọ ahụ kwuru bụ eziokwu, mana ihe ha bu n’obi kwuo ya adịghị mma. Ha aghọgbughị Jizọs ma ọ bụ mee ka obi dị ya mma. Jizọs nyedịrị ndị mmụọ ọjọọ ahụ iwu ka ha ghara ikwusa gbasara ya.
8 Gịnị ka akụkọ a na-akụziri anyị? Ọ na-akụziri anyị na ihe anyị bu n’obi ekwu eziokwu dị Jehova mkpa. Ọ bụ ya mere o ji dị ezigbo mkpa ka ihe anyị bu n’obi akụziri ndị mmadụ eziokwu bụrụ ezigbo ihe, anyị emeekwa ka otuto ọ bụla e toro anyị gaara Jehova, ọ bụghị onwe anyị.—Mat. 5:16; i nwere ike ịtụle Ọrụ Ndịozi 14:12-15.
Ị kụziwe eziokwu Baịbụl, ònye ka ị na-eme ka e too? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7 na nke 8)
9. Gịnị ka anyị na-ekwesịghị ime? Maka gịnị?
9 Ka anyị lee oge ọzọ anyị na-ekwesịghị ịchọ ka e too anyị. Ka e were ya na otu okenye gwara anyị ihe anyị na-ekwesịghị ịgwa ndị ọzọ, ma anyị agwa ya ndị ọzọ. Ndị anyị gwara ya mechaa chọpụta na ihe anyị gwara ha bụ eziokwu, obi nwere ike ịdị ha ụtọ maka ihe ndị anyị ma, ha echeekwa na anyị ma ọtụtụ ihe anyị na-ekwesịghị ịgwa ndị ọzọ. O nwere ike ime ka ndị ọzọ lewe anyị anya ka ndị bụ́ nnukwu mmadụ. Ma, ọ gaghị eme Jehova obi ụtọ. (Ilu 11:13) Maka gịnị? Ọ bụghị naanị maka na anyị gwara ndị ọzọ ihe anyị na-ekwesịghị ịgwa ha, kama anyị bukwa ihe na-adịghị mma n’obi kwuo ihe bụ́ eziokwu.
OTÚ ANYỊ GA-ESI EKWU EZIOKWU
10. Gịnị ka ikwu okwu ‘na-atọ ụtọ’ pụtara? (Ndị Kọlọsi 4:6)
10 Gụọ Ndị Kọlọsi 4:6. Pọl onyeozi chetaara Ndị Kraịst bi na Kọlọsi na okwu ha kwesịrị ‘ịna-atọ ụtọ mgbe niile.’ Gịnị ka ihe a o kwuru pụtara? Okwu Grik e si sụgharịta ya pụtara na ihe anyị na-ekwu kwesịrị ịbara ndị ọzọ uru, anyị ejirikwa obiọma kwuo ya otú ọ ga-atọ ha ụtọ ná ntị.
11-12. Gịnị mere anyị ji kwesị ịkpachara anya mgbe anyị na-akụziri ndị mmadụ eziokwu? Mee ihe atụ. (Kọwaakwa foto.)
11 Anyị kwesịrị ime ihe ahụ Pọl kwuru mgbe anyị na-akụziri ndị ọzọ eziokwu Baịbụl. Baịbụl kwuru na eziokwu ndị dị na ya yiri mma agha dị nkọ nke nwere ike ikewa mkpụrụ obi na mmụọ. Otú ọzọ e nwere ike isi kwuo ya bụ na o nwere ike ime ka anyị na ndị ọzọ mata otú obi dị anyị n’eziokwu nakwa ihe anyị bu n’obi mee ihe anyị mere. (Hib. 4:12) Ma, ọ bụrụ na anyị ejighị Baịbụl kụzie ihe nke ọma, anyị nwere ike ịkpasu ndị ọzọ iwe ma ọ bụkwanụ mee ka anyị na ha sewe okwu. Olee otú o nwere ike isi eme?
12 Chegodị banyere ihe atụ a. Ka e were ya na anyị gara ozi ọma hụ otu nwoke ji obi ya niile na-ekpere ihe a kpụrụ akpụ, ya na ndị ezinụlọ ya ịgba Krismas na Ista na-atọgbukwa ya atọgbu. Anyị nwere ike iji Baịbụl gosi ya na ikpere ihe a kpụrụ akpụ na-adịghị ndụ bụ ịda iberiibe, gosikwa ya na Krismas na Ista bụ ememme ndị na-ekpere arụsị. (Aịza. 44:14-20; 2 Kọr. 6:14-17) Anyị mee otú ahụ n’oge mbụ anyị na ya kwurịtara okwu, ihe anyị gwara ya bụ eziokwu, ma anyị ejighị Baịbụl kụzie ihe nke ọma.
Olee otú ị ga-esi na-akụzi eziokwu Baịbụl nke ọma? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11 na nke 12)a
13. Olee otú anyị ga-esi mee ka okwu anyị na-atọ ka ihe e tinyere nnu?
13 Pọl kwukwara na anyị kwesịrị ime ka okwu anyị na-atọ ka ihe e tinyere nnu. Ọ pụtaghị na anyị ga-agbalịwa ịgbanwe eziokwu ma ọ bụ izochi ya. Kama, ihe ọ na-ekwu bụ na anyị kwesịrị ime ka okwu anyị na-atọ ka ihe e tinyere nnu ka anyị nwee ike ịkụzi eziokwu otú ọ ga-adị ndị anyị na-akụziri ya ụtọ ná ntị. (Job 12:11) Ime otú ahụ anaghị adịcha mfe. Ọ bụrụ nri nkịtị, anyị nwere ike iche na ihe na-atọ anyịnwa ụtọ na-atọkwa ndị ọzọ ụtọ. Anyị nwekwara ike iche ụdị ihe ahụ n’ihe gbasara otú anyị si ekwu okwu. Anyị nwere ike iche na ọ na-atọ onye ọ bụla ụtọ, mana ya abụrụ na ọ bụghị otú ọ dị. Dị ka ihe atụ, ndị si n’obodo ụfọdụ nwere ike ịna-ekwu ihe ha chere n’ezoghị ọnụ, ọ bụrụgodị na ndị ha na-agwa ya tọrọ ha. Ma, ndị na-esighị n’obodo ha nwere ike iwere ụdị okwu ahụ ka ihe na-adịghị mma ma ọ bụdị mkparị. Pọl kwuru na anyị kwesịrị ịmata ‘otú anyị ga-esi azaghachi onye ọ bụla.’ Ọ pụtara na anyị ga-eme ka okwu anyị na-atọ ụtọ ná ntị ndị anyị na-agwa ya, ọ bụghị naanị ná ntị anyị ma ọ bụ ntị ndị obodo anyị.
MGBE ANYỊ GA-EKWU EZIOKWU
14. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ̀ kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ihe niile ọ ma? Kọwaa.
14 Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya okwu na-atọ ụtọ mgbe niile, jirikwa obiọma kụziere ha ọtụtụ ihe. (Mak 6:34) Ma, a ka nwere ọtụtụ ihe a ga-akụziri ha. Jizọs agbalịwaghị ka ọ kụziere ha ihe niile ọ ma. Ọ ma na e nwere ihe ha na-agaghị aghọtali mgbe ahụ. Ọ makwa na e nwere eziokwu ụfọdụ ọ na-ekwesịghị ịkụziri ha n’oge ahụ. N’eziokwu, ọ sịrị na ha enweghị ike ịghọta eziokwu ndị ahụ mgbe ahụ. (Jọn 16:12) Gịnị ka ihe a o mere na-akụziri anyị?
15. Ànyị kwesịrị ịkụziri ndị anyị na-amụrụ Baịbụl ihe niile anyị ma n’otu oge? Kọwaa. (Ilu 25:11) (Kọwaakwa foto.)
15 Ihe Jizọs mere gosiri na ịma eziokwu apụtaghị na anyị kwesịrị ịkụziri mmadụ ihe niile anyị ma n’otu oge. Olee otú anyị nwere ike isi mee ka Jizọs? Anyị kwesịrị ichebara otú ihe si dịrị ndị mmadụ echiche. Ọ̀ kwa i chetara nwoke ahụ anyị kwuru na ya na ndị ezinụlọ ya ịgba Krismas na Ista na-atọgbu atọgbu? Anyị ma na ememme ndị ahụ bụ nke ndị na-ekpere arụsị nakwa na ha adịghị Jehova mma. Ma, ka e were ya na ị malitere ịmụrụ nwoke ahụ ihe otu izu ma ọ bụ abụọ tupu Krismas. I gosi ya ihe Baịbụl kwuru banyere ememme ndị na-ekpere arụsị ma tụọ anya ka ọ kwụsị ịgba Krismas ozugbo, à ga-asị na otú i si kụzie eziokwu tọrọ ụtọ? Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ ndị a na-amụrụ Baịbụl nwere ike ime ihe niile ha mụtara n’egbughị oge, ma ụfọdụ nwere ike ịchọ ka e nyetụkwuo ha oge ka ha nwee ike ịgbanwe ihe ha chere nakwa ihe ha na-eme. Anyị nwere ike inyere ndị anyị na-amụrụ Baịbụl aka ịna-eme nke ọma ma ọ bụrụ na anyị ana-agwa ha ihe ha kwesịrị ịmata n’oge e kwesịrị ịgwa ha ya, ya bụ, mgbe ha ga-aghọtali ya.—Gụọ Ilu 25:11.
Na-eme ka Jizọs ma i kpebiwe mgbe ị ga-ekwu eziokwu na ebe ị ga-ekwuru ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15)
16. Olee otú anyị ga-esi enyere ndị anyị na-amụrụ Baịbụl aka ‘ịna-eje ije n’eziokwu ahụ’?
16 Inyere ndị mmadụ aka ịmụta eziokwu banyere Jehova so n’ihe kacha eme anyị obi ụtọ. Ị ga-enyeliri ha aka ‘ịna-eje ije n’eziokwu ahụ’ ma ị na-eme ihe ndị a: Na-eme ihe ha ga-amụta ihe na ya. (3 Jọn 3, 4) Gbalịsie ike ka otú i si ebi ndụ gị na-egosi na i kwetara na nkwa ndị dị na Baịbụl ga-emezu. Buru ihe ọma n’obi na-ekwu nke bụ́ eziokwu. Ị kụziwe eziokwu, na-ekwu okwu ga-atọ ụtọ ná ntị, jirikwa nwayọọ na obiọma na-ekwu ya n’oge i kwesịrị ikwu ya. Na-eme ka otuto ọ bụla e toro gị gaara Jehova. I mee otú ahụ, ị ga-egosi na ị na-efe Jehova, Chineke onye eziokwu.
ABỤ NKE 160 “Ozi Ọma”
a NKỌWA FOTO: Foto nke mbụ na-egosi ebe otu nwanna hụrụ osisi Krismas dị n’ụlọ nwoke ọ bịara izi ozi ọma ma gosi ya otu isiokwu kọwara na Krismas bụ ememme ndị na-ekpere arụsị. Foto nke abụọ na-egosi ebe nwanna ahụ na-egosi nwoke ahụ otu isiokwu kwuru ihe ndị ga-abara ndị nna uru. N’ime ụzọ abụọ ahụ, olee nke ga-aka baa uru?